Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 28

1 Ọ gēru kwa, ọ buru na i ge nti nke-ọma n’olu nke Jehova, bú Chineke-gi, ilezi anya ime ihe nile O nyere n’iwu, bú nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta, na Jehova, bú Chineke-gi, gēme gi ka i kachasia mba nile nke uwa elu:

2 ngọzi ndia nile gābiakwasi kwa gi, we rue gi aru, mb͕e i gēge nti olu Jehova, bú Chineke-gi.

3 Onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu n’obodo, onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu kwa n’ọhia.

4 Ihe agọziri agọzi ka ọ gābu, bú nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, na nkpuru nke anu-ulo-gi, bú umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu gi.

5 Ihe agọziri agọzi ka abọ-gi na ihe-gi iji agwọ achicha gābu.

6 Onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu na nbata-gi, onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu kwa n’ọpupu-gi.

7 Jehova gēme ka etib͕ue n’iru gi ndi-iro-gi ndi nēbili imegide gi: n’otù uzọ ka ha gāpukuru gi, ma n’uzọ asa ka ha gāb͕alaga n’iru gi.

8 Jehova gēnye ngọzi-Ya iwu n’ebe i nọ n’ọba-gi nile, na nime nseti aka-gi nile; Ọ gāgọzi kwa gi n’ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.

9 Jehova gēme ka i guzosiere Ya ike ibu ndi nsọ, dika Ọ ṅuru gi iyi; mb͕e i gēdebe ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyere n’iwu, mb͕e i gēje kwa ije n’uzọ-Ya nile.

10 Ndi nile nke uwa gāhu kwa na ọ bu aha Jehova ka anākpọkwasi gi; ha gātu kwa egwu gi.

11 Jehova gēme kwa ka i babiga uba okè bayere ezi ihe, nime nkpuru nke afọ-gi, na nime nkpuru nke anu-ulo-gi, na nime nkpuru nke ala-ubi-gi, n’elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi.

12 Jehova gēmeghere gi ezi ulo-àkù-Ya, bú elu-igwe, inye miri-ozuzo nke ala-gi na mb͕e-ya, na igọzi omume nile nke aka-gi; i gēbinye kwa ọtutu mba ihe, ma gi onwe-gi agaghi-ebiri ihe.

13 Jehova gēme kwa gi isi, ọ bughi ọdudu; i gādi nání n’elu, i gaghi-adi kwa n’okpuru; mb͕e i gēge nti ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyere n’iwu, nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta, idebe na ime ha;

14 ma ewezugala onwe-gi n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe n’okwu nile ọ bula nke mu onwem nēnye unu n’iwu ta, ijeso chi di iche iche ọzọ ifè ha òfùfè.

15 Ma ọ gēru, ọ buru na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi, ilezi anya ime ihe nile O nyere n’iwu na ukpuru-Ya nile nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta; na nkọcha nile ndia gābiakwasi gi, we rue gi aru.

16 Onye anābu ọnu ka i gābu n’obodo, onye anābu ọnu ka i gābu kwa n’ọhia.

17 Ihe anābu ọnu ka abọ-gi na ihe-gi iji gwọ achicha gābu.

18 Ihe anābu ọnu ka ọ gābu, bú nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi.

19 Onye anābu ọnu ka i gābu na nbata-gi, onye anābu ọnu ka i gābu kwa n’ọpupu-gi.

20 Jehova gēzikwasi gi ọbubu-ọnu, na ob͕ub͕a-aghara, na ibasi-nba-ike, nime nseti aka-gi nile nke i nēme, rue mb͕e agēkpochapu gi, ru kwa mb͕e i gāla n’iyì ngwa ngwa; n’ihi ihe ọjọ nke omume-gi nile nke i ji rapum.

21 Jehova gēme ka ajọ ọria nke nēfe efe rapara n’aru-gi, rue mb͕e Ọ gēme ka i gwupu n’elu ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.

22 Jehova gēwere ọtita-aru, were kwa aru-ọku, were kwa nruru-ọku, were kwa oké okpom-ọku, were kwa mma-agha, were kwa nchakpọ, were kwa ọmuma-ebù, tib͕ue gi; ha gāchu kwa gi rue mb͕e i gāla n’iyì.

23 Elu-igwe-gi nke di n’elu isi-gi gābu kwa ọla, ala nke di n’okpuru gi gābu kwa ígwè.

24 Jehova gēme ka miri-ozuzo nke ala-gi buru uzuzu na ájá: ọ gēsi n’elu-igwe dakwasi gi, rue mb͕e agēkpochapu gi.

25 Jehova gēme ka etib͕ue gi n’iru ndi-iro-gi: n’otù uzọ ka i gāpukuru ha, ma n’uzọ asa ka i gāb͕alaga n’iru ha: i gāghọ-kwa-ra ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.

26 Ozu-gi gābu-kwa-ra anu-ufe nile nke elu-igwe, bu-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri, onye-nchuli adighi kwa.

27 Jehova gēwere ihe-ofifi Ijipt, were kwa emerod, were kwa àb͕à, were kwa ọkọ, tib͕ue gi, nke anāpughi ime ka aru-gi di nma na ya.

28 Jehova gēwere ara-ọwiwi, were kwa ikpu-ìsì, were kwa ihe ngbu nke obi, tib͕ue gi:

29 i gāsọghari kwa ìsì n’etiti ehihie, dika onye-ìsì nāsọghari n’ọchichiri, i gaghi-eme kwa ka ije-gi ọ bula ga nke-ọma: i gābu kwa nání onye anēmeb͕u na onye anānapu ihe-ya n’ike ubọchi nile, onye-nzọputa adighi kwa.

30 I gēkwe nkwa ilu nwunye, ma ya na nwoke ọzọ gēdina: i gēwu ulo, ma i gaghi-ebi nime ya: i gāku ubi-vine, ma i gaghi-eme ka ọ pua na nsọ anāsọ ya.

31 Agēb͕u ehi-gi n’anya-gi, ma i gaghi-eri nime anu-ya: agānapu gi inyinya-ibu-gi n’iru gi, ma agaghi-eweghachiri gi ya: agēnye ndi-iro-gi ìgwè ewu na aturu-gi, ma i gaghi-enwe onye-nzọputa.

32 Agēnye ndi ọzọ umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ma anya-gi ganēle, we dala n’isi n’ichọ ha ogologo ubọchi nile: ma ọ dighi ihe gādiri ike aka-gi.

33 Nkpuru ala-ubi-gi na ndọb͕u-n’ọlu-gi nile ka otù ndi nke i nāmaghi gēri; ma i gābu nání onye anēmeb͕u emeb͕u na onye anāzọpia azọpia ubọchi-gi nile:

34 i we buru onye nāwi ara n’ihi ihe-ọhuhu anya-gi abua, nke i gāhu.

35 Jehova gēwere ihe-otiti ọjọ, nke anāpughi ime ka aru-gi di nma na ya, tie gi n’ikperè-ukwu-gi abua na n’ogwe-ukwu-gi abua, site n’ọbu-ukwu-gi we rue opu-n’isi-gi.

36 Jehova gēme ka gi na eze-gi, nke i gēguzo ka ọ buru eze-gi, jerue otù mba nke i nāmaghi, ma gi onwe-gi ma nna-gi-hà; i gēfè kwa chi di iche iche ọzọ n’ebe ahu, bú osisi na nkume.

37 I gāghọ kwa ihe-iju-anya, na ilu, na ihe-àkùkù, n’etiti ndi ahu nile ebe Jehova gēdu gi je.

38 I gēwere ọtutu nkpuru-ọghigha pua je n’ubi, ma ọ bu nwantī ka i gāchikọta; n’ihi na igurube gērichapu ya.

39 I gāku ubi-vine di iche iche, lu kwa ha, ma ọ dighi manya-vine i gāṅu, i gaghi-aghọ kọta kwa nkpuru-vine; n’ihi na ikpuru gēri ha.

40 I gēnwe osisi olive n’ókè-ala-gi nile, ma ọ dighi manu i gēte; n’ihi na nkpuru olive gi gādakwosi.

41 I gāmu umu-ndikom na umu-ndinyom, ma ha agaghi-abu nke gi; n’ihi na agādọta ha n’agha.

42 Osisi-gi nile na nkpuru ala-ubi-gi ka ndi ọzọ gēnweta.

43 Ọbìa ahu nke nọ n’etiti gi gārigo n’elu kari gi, nārigo, nārigo; ma gi onwe-gi ganārida ala ala.

44 Onye ahu gēbinye gi ihe, ma gi onwe-gi agaghi-ebinye ya: onye ahu gābu isi, ma gi onwe-gi gābu ọdùdù.

45 Ọbubu-ọnu nile ndia gābiakwasi gi, chu kwa gi, we rue gi aru, rue mb͕e agēkpochapu gi; n’ihi na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ihe nile O nyere n’iwu na ukpuru-Ya nile nke O nyere gi n’iwu:

46 ha gādikwasi kwa gi ibu ihe-iriba-ama na ibu ihe-ebube, dikwasi kwa nkpuru-gi-rue mb͕e ebighi-ebi:

47 n’ihi na i fèghi Jehova, bú Chineke-gi, òfùfè n’ọṅu, na n’obi-utọ, n’ihi iba-uba nke ihe nile:

48 i gēfè kwa ndi-iro-gi, ndi Jehova gēzì megide gi, n’agu, na n’akpiri-ikpọ-nku, na n’ib͕a-ọtọ, na n’ukọ ihe nile: ọ gētiye kwa yoke ígwè n’olu-gi, rue mb͕e ọ gēkpochapu gi.

49 Jehova gēsi n’ebe di anya bulie otù mba imegide gi, site na nsọtu uwa, dika ugo si efe; bú mba nke i nānughi asusu-ya;

50 mba nke nwere iru di egwu, nke nāhughi okenye iru-ọma, nke nēmeghi kwa nwata amara:

51 ọ gēri kwa nkpuru nke anu-ulo-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, rue mb͕e agēkpochapu gi: ọ gaghi-ekwe kwa ka ọka, na manya-vine ọhu, na manu, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, fọduru gi, rue mb͕e ọ gēme ka i la n’iyi.

52 Ọ gānọchigide kwa gi n’agha n’ọnu-uzọ-ama-gi nile, rue mb͕e mb͕idi-gi nile gāda, bú mb͕idi ahu di elu nke ewusi-kwa-ra ike, nke gi onwe-gi nātukwasi obi na ha, n’ala-gi nile: ọ gānọchigide kwa gi n’agha n’ọnu-uzọ-ama-gi nile n’ala-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.

53 I gēri kwa nkpuru nke afọ-gi, bú anu-aru umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi; nime nnọchigide-n’agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-gi nākpab͕u gi.

54 Nwoke nke di nro n’etiti gi, nke di kwa pekepeke nke-uku, anya-ya gājọ njọ n’aru nwa-nne-ya, na n’aru nwunye nke obi-ya, na n’aru umu-ya fọduru nke ọ kwere ka ha fọdu:

55 ọ we ghara inye onye ọ bula nime ha ufọdu nime anu-aru umu-ya nri ọ ga-eri, n’ihi na ọ dighi ihe ọ bula fọduru ya; nime nnọchigide-n’agha na nime nkpab͕u, nke onye-iro-gi nākpab͕u gi n’ọnu-uzọ-ama-gi nile.

56 Nwanyi nke di nro n’etiti gi, nke di kwa pekepeke, nke nādighi-anwa iguzo ọbu-ukwu-ya n’ala n’ihi idi-pekepeke na n’ihi idi-nro, anya-ya gājọ njọ n’aru di nke obi-ya, na n’aru nwa-ya nwoke, na n’aru nwa-ya nwayi;

57 na n’aru ichi-ya nke nēsi apata ukwu-ya puta, na n’aru umu-ya nke ọ nāmu; n’ihi na ọ gēri ha na nzuzo n’ukọ ihe nile: nime nnọchigide-n’agha na nime nkpab͕u, nke onye-iro-gi nākpab͕u gi n’ọnu-uzọ-ama-gi nile.

58 Ọ buru na i lezighi anya ime okwu nile nke iwu a nke edeworo n’akwukwọ a, ka i we tua egwu aha nka nke di nsọpuru di kwa egwu, JEHOVA, bú CHINEKE-GI;

59 Jehova gēme kwa ka ihe-otiti-gi nile na ihe-otiti nile nke nkpuru-gi di ebube, ha gābu ihe-otiti uku, nke nānọgide kwa anọgide, na ọria ọjọ, nke nānọgide kwa anọgide.

60 Ọ gēme kwa ka nriaria nile nke Ijipt biaghachi n’aru gi, bu nke i turu ujọ; ha gārapara kwa n’aru gi.

61 Ọria ọ bula kwa, na ihe-otiti ọ bula, nke anēdeghi n’akwukwọ iwu a, ha ka Jehova gēme ka ha rigo n’aru gi, rue mb͕e agēkpochapu gi.

62 Unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole, n’ebe unu diri ka kpakpando elu-igwe n’uba; n’ihi na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi.

63 Ọ gēru kwa, na dika obi tọrọ Jehova utọ n’aru unu ime unu nma, na ime ka unu ba uba; otú a ka obi gātọ Jehova utọ n’aru unu ime ka unu la n’iyì, na ikpochapu unu; ewe ropu unu n’elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.

64 Jehova gēme kwa ka i b͕asa n’etiti ndi nile, site n’otù nsọtu uwa we rue nsọtu uwa nke-ọzọ; i gēfè kwa chi di iche iche ọzọ òfùfè n’ebe ahu, nke i nāmaghi, ma gi onwe-gi ma nna-gi-hà, bú osisi na nkume.

65 Ma i gaghi-enwe atughi-ujọ n’etiti mba ndia, ọbu-ukwu-gi agaghi-enwe kwa izu-ike: ma Jehova gēnye gi n’ebe ahu obi nāma jijiji, na ndala-n’isi nke anya, na ọtita-aru nke nkpuru-obi:

66 ndu-gi ganākwu kwa èfè n’iru gi; i gātu kwa oké egwu abali na ehihie, i gaghi-eji kwa ndu-gi aka:

67 I gāsi n’ututu, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ọ bu anyasi! i gāsi kwa n’anyasi, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ọ bu ututu! n’ihi oké egwu nke obi-gi nke i gātu, na n’ihi ihe-ọhuhu anya-gi nke i gāhu.

68 Jehova gēme kwa ka i were ub͕ọ laghachi n’Ijipt, n’uzọ nke m’siri gi, I gaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli: unu gēwere kwa onwe-unu renye ndi-iro-unu n’ebe ahu ibu orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, ma onye-ọb͕ub͕a agaghi-adi.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 29

1 Ndia bu okwu ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Jehova nyere Moses n’iwu ka ya na umu Israel b͕a n’ala Moab, nāgughi ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Ya na ha b͕ara nime Horeb.

2 Moses we kpọ Israel nile òkù, si ha, Unu onwe-unu ahuwo ihe nile nke Jehova mere Fero, me kwa ndi-orù-ya nile, me kwa ala-ya nile, n’anya-unu n’ala Ijipt;

3 ọnwunwa uku nile nke anya-gi huru, ihe-iriba-ama nile, na ihe-ebube uku ahu nile:

4 ma Jehova enyeghi unu obi imara ama, na anya ihu ahu, na nti inu anu, rue ta.

5 Emewokwam ka unu je ije ọgu arọ abua n’ọzara: uwe-unu akapughi nká n’aru unu, akpukpọ-ukwu-gi akapughi nká n’ukwu-gi.

6 Ọ dighi achicha unu riworo, ọ dighi kwa manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nke nābà n’anya unu ṅuworo: ka unu we mara na mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

7 Unu we biarue ebe a, Saihon, bú eze Heshbon, na Og, bú eze Beshan, we puta izute ayi ibu agha, ayi we tib͕ue ha:

8 ayi we were ala-ha, were ya nye ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, n’ihe-nketa.

9 Debe-kwa-nu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, me kwa ha, ka unu we nwe uche n’ihe nile nke unu nēme.

10 Unu onwe-unu nēguzo ta, unu nile, n’iru Jehova, bú Chineke-unu; ndi-isi-unu, na ebo nile unu, na ndi-okenye-unu, na ndi-odozi-okwu-unu, bú nwoke ọ bula nke Israel,

11 umu-ntakiri-unu, na ndinyom-unu, na ọbìa-gi nke nọ n’etiti ọmuma-ulo-ikwū-gi nile, site n’onye nāwa nkú-gi rue onye nēsere miri-gi:

12 ka i we gabiga ba n’ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-gi, na n’iṅu-iyi-Ya, nke gi na Jehova, bú Chineke-gi, nāb͕a ta:

13 ka O we me ka i guzosiere Ya ike ta ibu otù ndi, ka Ya onwe-ya we buru-kwa-ra gi Chineke, dika Ọ gwara gi, na dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob.

14 Ọ bughi kwa nání unu ka mu onwem nāb͕a ọb͕ub͕a-ndu a na iṅu-iyi a nye;

15 kama ọ bu onye nọ n’ebe a n’etiti ayi nēguzo ta n’iru Jehova, bú Chineke-ayi, ọ bu kwa onye nānọghi n’ebe a n’etiti ayi ta:

16 (n’ihi na unu onwe-unu mara otú ayi biri n’ala Ijipt; na otú ayi gabigara n’etiti mba nile nke unu gabigara agabiga;

17 unu ahuwo kwa ihe-árú nile ha, na arusi nile ha, bú osisi na nkume na ọla-ọcha na ọla-edo, nke di n’etiti ha:)

18 ka nwoke, ma-ọbu nwayi, ma-ọbu ab͕uru, ma-ọbu ebo, we ghara idi n’etiti unu, nke obi-ya nēchigharí pua ta n’ebe Jehova, bú Chineke-ayi, nọ, ije ifè chi nile nke mba ahu nile òfùfè; ka nkpọrọgwu nke nāmi ńsí na wormwood we ghara idi n’etiti unu;

19 o we rue, mb͕e ọ gānu okwu nile nke ọb͕ub͕a-iyi a, na ọ gāgọzi onwe-ya n’obi-ya, si, Udo ka m’gēnwe, ọ bu ezie na n’isi-ike nke obim ka m’nēje ije, ka m’we were iṅubiga-ihe-okè tukwasi n’akpiri-ikpọ-nku:

20 Jehova agaghi-ekwe ib͕aghara ya, kama mb͕e ahu iwe Jehova na ekworo-Ya gākwu anwuru-ọku imegide nwoke ahu, ọb͕ub͕a-iyi nile edeworo n’akwukwọ a gāmakpu kwa n’aru ya, Jehova gēhichapu kwa aha-ya n’okpuru elu-igwe.

21 Jehova gākpaputa kwa ya n’ebo nile nke Israel rue ihe ọjọ, dika ọb͕ub͕a-iyi nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke edeworo n’akwukwọ iwu a.

22 Ọb͕ọ ahu nke di n’iru, bú umu-unu ndi gēbili inọchi unu, na onye ala ọzọ nke gēsi n’ala di anya bia, gāsi, mb͕e ha nāhu ihe-otiti nile nke ala ahu, na ọria nile ya, nke Jehova jiworo me ka ọ nāria ọria;

23 mb͕e ha nāhu kwa na ala-ya nile bu brimstone, na nnú, na orire-ọku, na adighi-agha ya nkpuru, na ọ dighi-eme kwa ka ihe pue, na ọ dighi kwa ihe-ọkukú ọ bula nētolite nime ya, dika nkwatu Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, nke Jehova kwaturu n’iwe-Ya na n’ọnuma-Ya:

24 ọbuná mba nile ahu gāsi, N’ìhi gini ka Jehova meworo ala nka otú a? gini bu isi idi-ọku iwe uku a?

25 Ha gāsi kwa, Ọ bu n’ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, nke Ya na ha b͕ara mb͕e O mere ka ha si n’ala Ijipt puta;

26 ha we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ha, bú chi nke ha nāmaghi, nke Ọ nēkèghi n’òkè nye ha:

27 iwe Jehova we di ọku megide ala nka, ime ka nkọcha nile nke edeworo n’akwukwọ a biakwasi ya:

28 Jehova we ropu ha n’ala-ha n’iwe, na’ọnuma, na n’oké iwe, we tubà ha n’ala ọzọ, otú ọ di ta.

29 Ihe nile ezoro ezo diri Jehova, bú Chineke-ayi: ma ihe nile ekpughere ekpughe diri ayi, di-kwa-ra umu-ayi rue mb͕e ebighi-ebi, ka ayi we me okwu nile nke iwu a.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 30

1 Ọ gēru kwa, mb͕e ihe ndia nile gābiakwasi gi, bú ngọzi ahu na nkọcha ahu nke m’tiyeworo n’iru gi, mb͕e i gēme kwa ka ha biaghachi n’obi-gi n’etiti mba nile, ebe Jehova, bú Chineke-gi, nupuworo gi,

2 mb͕e i gēwere kwa obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile laghachikuru Jehova, bú Chineke-gi, ge kwa nti olu-Ya dika ihe nile si di nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta, gi onwe-gi na umu-gi;

3 na Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka ndi-gi adọtara n’agha lata, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n’aru gi, laghachi, chikọputa gi nime ndi ahu nile, ebe Jehova, bú Chineke-gi, meworo ka i b͕asa.

4 Ọ buru na onye nke gi enupuru enupu anọ na nsọtu elu-igwe, n’ebe ahu ka Jehova, bú Chineke-gi, gāchikọputa gi, n’ebe ahu ka Ọ gēweputa kwa gi.

5 Jehova, bú Chineke-gi, gēme kwa ka i ba n’ala ahu nke nna-gi-hà nwetara, i gēnweta kwa ya; Ọ gēme kwa gi nma, me kwa ka i ba uba kari nna-gi-hà.

6 Jehova, bú Chineke-gi, gēbì kwa n’obi-gi, na obi nkpuru-gi, úgwù, iwere obi-gi nile, na iwere nkpuru-obi-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n’anya, ka i we di ndu.

7 Jehova, bú Chineke-gi, gētiyekwasi ọb͕ub͕a-iyi ndia nile n’isi ndi-iro-gi, na n’isi ndi nākpọ gi asì, ndi churu gi.

8 Gi onwe-gi gālaghachi kwa, ge nti olu Jehova, me ihe nile O nyere n’iwu, nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta.

9 Jehova, bú Chineke-gi, gēme kwa ka i babiga uba okè n’omume nile nke aka-gi, nime nkpuru nke afọ-gi, na nime nkpuru nke anu-ulo-gi, na nime nkpuru nke ala-ubi-gi, bayere ezi ihe: n’ihi na obi gātọ kwa Jehova utọ ọzọ n’aru gi ime gi nma, dika obi tọrọ Ya utọ n’aru nna-gi-hà:

10 mb͕e i gēge nti olu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ihe nile O nyere n’iwu na ukpuru-Ya nile nke edeworo n’akwukwọ iwu a; mb͕e i were obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, chigharikute Jehova, bú Chineke-gi.

11 N’ihi na ihe a enyere n’iwu nke mu onwem nēnye gi ‘niwu ta, ọ bughi ihe kariri gi ime ka ọ bu, ọ bughi kwa ihe diri gi anya ka ọ bu.

12 Ọ dighi n’elu-igwe, ka i we si, Ònye gārigoro ayi n’elu-igwe, wetara ayi ya, me ka ayi nuru ya, ka ayi we me ya?

13 Ọ dighi kwa n’ofè oké osimiri, ka i we si, Ònye gāgabigara ayi n’ofè oké osimiri, wetara ayi ya, me ka ayi nuru ya, ka ayi we me ya?

14 Kama okwu ahu di gi ezi nso, n’ọnu-gi, na n’obi-gi, ka i we me ya.

15 Le, etiyewom n’iru gi ta ndu na ezi ihe, na ọnwu na ihe ọjọ;

16 n’ihi na mu onwem nēnye gi iwu ta ihu Jehova, bú Chineke-gi, n’anya, na ije ije n’uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n’iwu, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, ka i we di ndu, ba kwa uba, ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzi kwa gi n’ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.

17 Ma ọ buru na obi-gi echigharia, i we ghara inu anu, kama eduhie gi, we kpọ isi ala nye chi ọzọ, we fè ha òfùfè;

18 egosiwom unu ta, na unu aghaghi ila n’iyì; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n’elu ala ahu, ebe gi onwe-gi nāgabiga Jọdan ibà ka i nweta ya.

19 Emewom ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide unu ta, na ọ bu ndu na ọnwu, ngọzi ahu na nkọcha ahu, ka m’tiyeworo n’iru gi: gi rọrọ kwa ndu, ka i we di ndu, gi onwe-gi na nkpuru-gi:

20 ihu Jehova, bú Chineke-gi, n’anya, na ige nti olu-Ya, na irapara n’aru Ya: n’ihi na Ya onwe-ya bu ndu-gi, na ogologo nke ubọchi-gi: ka i we biri n’elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob, inye ha.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 31

1 Moses we je gwa Israel nile okwu ndia.

2 Ọ we si ha, Ọgu arọ isi ka m’b͕ara ta; apughm ipu apu na ibata abata ọzọ: Jehova asiwokwam, I gaghi-agabiga Jọdan nka.

3 Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya nāgabiga n’iru gi, Ya onwe-ya gēkpochapu mba ndia n’iru gi, i gēnweta kwa ha: Joshua, ya onwe-ya nāgabiga n’iru gi, dika Jehova kwuworo.

4 Jehova gēme kwa ha dika O mere Saihon, me kwa Og, bú ndi-eze ndi-Amorait, me kwa ala-ha; ndi O kpochapuru.

5 Jehova gāra kwa ha nye n’iru unu, unu gēme kwa ha dika ihe nile enyere n’iwu si di, nke m’nyeworo unu n’iwu.

6 Dinu ike, nwe-kwa-nu ume, unu atula egwu, unu ama-kwa-la jijiji n’iru ha; n’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye gi na Ya nēje; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi.

7 Moses we kpọ Joshua òkù, si ya n’anya Israel nile, Di ike, nwe kwa ume: n’ihi na gi onwe-gi gēsoro ndi nka ba n’ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi ínye ha; gi onwe-gi gēme kwa ka ha keta ya.

8 Jehova kwa, Ya onwe-ya bu onye nēje n’iru gi; Ọ gānọyere gi, Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi: atula egwu, atu-kwa-la ujọ.

9 Moses we de iwu a n’akwukwọ, were ya nye ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ọ nye kwa ndi-okenye nile nke Israel.

10 Moses we nye ha iwu, si, N’ọgwugwu arọ asa, na mb͕e akara àkà nke arọ nrapu ahu, n’ememe ulo-ntu,

11 mb͕e Israel nile gābia ka ahu ha anya n’iru Jehova, bú Chineke-gi, n’ebe ahu nke Ọ gārọputa, i gāgu iwu a n’iru Israel nile na nti-ha.

12 Kpọkọta ndi Israel, bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ka ha we nu, ka ha we muta kwa, we tua egwu Jehova, bú Chineke-unu, lezi kwa anya ime okwu nile nke iwu a;

13 umu-ha, ndi nāmaghi, gānu kwa, we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi nile nke unu onwe-unu nādi ndu n’elu ala ebe unu nāgabiga Jọdan inweta ya.

14 Jehova we si Moses, Le, ubọchi-i gānwu nābiaru nso: kpọ Joshua, guzo-kwa-nu onwe-unu n’ulo-ikwū nzute, ka M’we nye ya iwu. Moses na Joshua we je, guzo onwe-ha n’ulo-ikwū nzute.

15 Ewe hu Jehova anya n’Ulo-ikwū ahu n’ogidi igwe-oji: ogidi igwe-oji ahu we guzo n’elu ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu.

16 Jehova we si Moses, Le, gi na nna-gi-hà ganēdina; ndi nka gēbili kwa, soro chi ala ọzọ nile nke ala ahu kwa iko, bú ebe ha onwe-ha nābà n’etiti ya, ha gārapukwam, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum nke Mu nà ha b͕ara.

17 Iwem gādi kwa ọku megide ha n’ubọchi ahu, M’gārapu kwa ha, zopu irum n’aru ha, ha gābu kwa ihe agēri eri, ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta kwa ha; ha gāsi kwa n’ubọchi ahu, Ọ̀ bughi n’ihi na Chineke-ayi anọghi n’etiti ayi ka ihe ọjọ ndia chọtaworo ayi?

18 Mu onwem aghaghi kwa izo irum n’ubọchi ahu n’ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo, n’ihi na ha echewo chi di iche iche ọzọ iru.

19 Ma ub͕u a, Derenu onwe-unu abù a, gi zí kwa ya umu Israel: tiye ya n’ọnu-ha, ka abù a we burum ihe-àmà megide umu Israel.

20 N’ihi na mb͕e M’gēmewori ka ha ba n’ala ahu nke M’ṅuru ndi bu nna-ha iyi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya; mb͕e ha gēriwo-kwa-ri ihe, afọ eju kwa ha, ha we ma abuba; ha gēche kwa chi ọzọ iru, fè ha òfùfè, we leliam anya, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum.

21 O gēru kwa, mb͕e ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta ha, na abù a gāb͕a àmà n’iru ha dika ihe-àmà; n’ihi na agaghi-echezọ ya pua n’ọnu nkpuru-ha: n’ihi na amawom ncheputa-ha nke ndi ahu nēme ta, tutu Mu eme ka ha ba n’ala ahu nke M’ṅuru iyi inye ha.

22 Moses we de abù a n’akwukwọ n’ubọchi ahu, zí kwa ya umu Israel.

23 O we nye Joshua nwa Nun iwu, si, Di ike, nwe kwa ume: n’ihi na gi onwe-gi gēme ka umu Israel ba n’ala ahu nke M’ṅuru ha iyi inye ha: Mu onwem gānọye-kwa-ra gi.

24 O rue, mb͕e Moses debisiri okwu nile nke iwu a n’akwukwọ, rue mb͕e edezuru ha,

25 na Moses nyere ndi Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, iwu, si,

26 Were akwukwọ iwu a, tiye ya n’akuku ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, ka o we di n’ebe ahu ibu ihe-àmà megide gi.

27 N’ihi na mu onwem amawo nnupu-isi-gi, na nkwesi-olu-ike-gi: le, mb͕e m’nānọ ndu n’etiti unu ta, unu aburuwo ndi nānupu isi n’okpuru Jehova; ùnu gēsi aṅa ghara inupu isi kari nke-uku mb͕e ọnwum gasiri?

28 Kpọkọtaranum ndi-okenye nile nke ebo nile unu, na ndi-odozi-okwu-unu, ka m’kwu kwa okwu ndia na nti-ha, me ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide ha.

29 N’ihi na amawom na mb͕e ọnwum gasiri unu gēbibi onwe-unu nke-uku, wezuga onwe-unu n’uzọ ahu nke m’nyeworo unu n’iwu; ihe ọjọ gādakwasi kwa unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia; n’ihi na unu gēme ihe ọjọ n’anya Jehova, ikpasu Ya iwe n’omume aka-unu.

30 Moses we kwue na nti nkpọkọta nile nke Israel okwu nile nke abù a, rue mb͕e ekwuzuru ha.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 32

1 Ṅanu nti, unu elu-igwe, ka m’kwu kwa ihe;

Ka uwa nu kwa okwu ọnum:

2 Nmutam gātasi dika miri-ozuzo,

Okwu-ọnum ganēruputa dika igirigi;

Dika nshansha-miri n’elu ahihia ndu,

Di kwa ka oké miri-ozuzo n’elu ihe-ọkukú:

3 N’ihi na aha Jehova ka m’gākpọsa:

Nyenu Chineke-ayi idi-uku.

4 Oké nkume ahu, ihe zuru okè ka ọlu-Ya bu:

N’ihi na uzọ-Ya nile bu ikpé ziri ezi:

Chineke Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke nēnweghi ajọ omume,

Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bu.

5 Ha ebibiwo onwe-ha, ọ bughi nke umu-Ya ka ọlu nke di ha n’aru bu.

Ha bu ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke rọ-kwa-ra arọ.

6 Ùnu nēnyeghachi Jehova otú a,

Unu ndi-nzuzu ndi nāmaghi ihe?

Ọ̀ bughi ya onwe-ya bu nna-gi onye nwetaworo gi?

Ya onwe-ya emewo gi, me kwa ka i guzosie ike.

7 Cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga,

Ghọta arọ nke ọtutu ọb͕ọ:

Jua nna-gi, ọ gēgosi kwa gi;

Jua ndi-okenye-gi, ha gāgwa kwa gi.

8 Mb͕e Onye kachasi ihe nile elu mere ka mba nile keta ihe-ha,

Mb͕e O kesara umu madu,

O guzoro ókè nile nke ndi nile

Dika ọnu-ọgugu umu Israel si di.

9 N’ihi na òkè Jehova bu ndi-Ya;

Jekob bu akuku ihe-nketa-Ya.

10 Ọ chọtara ya n’ala ọzara,

Na n’ihe tọb͕ọrọ nkití, bú ala tọb͕ọrọ n’efu nke nāb͕ọ uja.

Ọ nāb͕a ya buruburu, Ọ nēme ka ọ ghọta ihe,

Ọ nēchezi ya dika nwantanta anya-Ya:

11 Dika ugo nākpọte umu di n’akwu-ya,

Nērughari n’elu umu-ya,

Nāb͕asa nkù-ya, nāghọrọ ha,

Nēbu ha n’elu nkù-ya:

12 Otú a Jehova, nání Ya, nēdu ya,

Ọ dighi kwa chi ala ọzọ diyere ya.

13 Ọ nēme ka ebe di elu nke uwa būru ya dika inyinya,

Ọ we rie ihe-ọmume nke ubi;

O me-kwa-ra ya ka ọ mia manu-aṅu site na nkume di elu,

Na manu site n’oké nkume ọ́mú;

14 Miri-ara nke raru araru nke ìgwè ehi, na miri-ara nke ìgwè ewu na aturu,

Ya na abuba umu-aturu,

Na ebulu àb͕ọ̀ Beshan, na ewu,

Tiyere abuba obi ọka wheat;

Ọbara nkpuru-vine ka i nāṅu kwa, bú manya-vine.

15 Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu:

I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi:

O we rapu Chineke nke mere ya,

We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.

16 Ha nēwere ndi ala ọzọ me ka O kwo ekworo,

Ha nēwere ihe-árú di iche iche kpasue Ya iwe.

17 Ha nāchuru ndi-mọ ọjọ aja, ndi nābughi Chineke,

Bú chi ha nāmaghi,

Ndi ọhu ndi si n’ebe di nso bata,

Ndi nna-unu-hà nātughi ujọ.

18 Oké Nkume ahu nke muru gi ka i nēchefu,

I chezọwo kwa Chineke nke muputara gi.

19 Jehova we hu ya, we lelia ha anya,

N’ihi nkpasu-iwe nke umu-Ya ndikom na umu-Ya ndinyom.

20 O we si, Ka M’zopu irum n’ebe ha nọ,

M’gāhu ihe gābu ikpe-azu-ha:

N’ihi na ọb͕ọ nke nāb͕akuta azu ka ha bu,

Umu ndi nēkwesighi okwukwe.

21 Ha onwe-ha ewerewo ihe nābughi Chineke mem ka M’kwo ekworo;

Ha ewerewo ihe-efu nile ha kpasuem iwe:

Mu onwem gēwere kwa ndi nābughi ndi me ha ka kwo ekworo;

Mba nzuzu ka M’gēwere kpasue ha iwe.

22 N’ihi na amuyewo ọku n’iwem,

Ọ nēre kwa rue ala-mọ nke dichasi ala,

Ọ nēripia kwa uwa na ihe-ọmume-ya,

Nēme kwa ka ntọ-ala nile nke ugwu nile nwuru ọku.

23 M’gēkpokwasi kwa ha ihe ọjọ;

M’gāb͕apusi àkúm nile n’aru ha:

24 Ha gābu ndi tara aru n’agu, na ndi nruru-ọku rub͕uworo,

Ya na nbipu di ilu;

Ezé anumanu ka M’gēzikwasi kwa ha,

Ya na edide nke ihe nākpu akpu nke ájá.

25 Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n’èzí,

Oké ujọ gāb͕aba kwa n’ime-ulo nile;

Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke,

Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ.

26 Asiwom, M’gāfupu ha,

Me ka ncheta-ha kwusi n’etiti madu:

27 Ma ọ buru na atughm ujọ nkpasu-iwe onye-iro,

Ka ndi nākpab͕u ha we ghara ichehie,

Ka ha we ghara isi, Aka-ayi di elu,

Ọ bughi Jehova meworo ihe a nile.

28 N’ihi na mba nke furu efu n’ebe idu-ọdu di ka ha bu,

Nghọta adighi kwa nime ha.

29 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka,

Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha!

30 Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri,

Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga,

Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha,

Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ?

31 N’ihi na oké nkume-ha adighi ka Oké Nkume-ayi,

Ndi-iro-ayi bu kwa ndi-ikpe.

32 N’ihi na ọ bu n’osisi vine nke Sọdọm ka osisi vine ha sitere,

Site kwa n’ubi Gọmọra:

Nkpuru-vine-ha bu nkpuru-vine ńsí,

Uyọkọ di ilu ka ha nwere:

33 Edide agwọ di ogologo ka manya-vine-ha bu,

Na ńsí di irè nke aju-ala.

34 Ǹka abughi ihe akwakọbaworo n’ebe m’nọ,

Ihe akaworo akàrà n’ulo-àkùm?

35 Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi,

Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu:

N’ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso,

Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa.

36 N’ihi na Jehova gēkpeputa ndi-Ya,

Cheghari kwa ncheghari bayere ndi-orù-Ya;

Mb͕e Ọ nāhu na ihe-iye-aka-ha alawo,

Ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọbu onye arapuru arapu fọduru.

37 Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ?

Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya;

38 Nke nēri abuba àjà nile ha,

Nāṅu kwa manya-vine nke àjà-ihe-ọṅuṅu-ha;

Ka ha bilie, yere unu aka,

Ka ọ buru ebe-nzuzo n’elu unu.

39 Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya,

Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ:

Mu onwem nēme ka anwua, M’nēme kwa ka adi ndu;

M’tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike:

Ọ dighi kwa onye nānaputa n’akam.

40 N’ihi na anameweli akam elu nye elu-igwe,

We si, Mu onwem nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi,

41 Ọ buru na amuam mma-agham nēb͕upu àmùmà,

O buru kwa na akam ejide ikpé;

M’gābọghachi ọ́bọ̀ n’aru ndi nēmegidem,

M’gākwughachi kwa ndi nākpọm asi.

42 M’gēme ka àkúm nile ṅubiga ọbara okè,

Mma-agham gēri kwa anu-aru;

Site n’ọbara ndi eb͕uru eb͕u na ndi adọtara n’agha,

Site n’isi ndundu onye-iro.

43 Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya ti nkpu ọṅu:

N’ihi na Ọ gābọ̀ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya,

Ọ́bọ̀ ka Ọ gābọghachi kwa n’aru ndi nēmegide Ya,

O gēkpuchi kwa nmehie ala-Ya na ndi-Ya.

44 Moses we bia, kwue okwu nile nke abù a na nti ndi Israel, ya onwe-ya, na Hoshea nwa Nun.

45 Moses we gwabìe Israel nile okwu nile ndia:

46 o we si ha, Tukwasi obi-unu n’okwu nile nke mu onwem nāb͕ara unu àmà ta; nke unu gēnye umu-unu n’iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a.

47 N’ihi na ọ bughi ihe efu ka ọ bu n’ebe unu nọ; n’ihi na nka bu ndu-unu, ọ bu kwa ihe a ka unu gēwere me ka ubọchi-unu di anya n’elu ala, ebe unu onwe-unu nāgabiga Jọdan inweta ya.

48 Jehova we gwa Moses okwu n’otù ubọchi ahu, si,

49 Rigo n’ugwu a nke Abarim, bú ugwu Nebo, nke di n’ala Moab, nke di n’irú Jeriko; le kwa ala Kenean anya, bú nke Mu onwem nēnye umu Israel n’ihe-onwunwe:

50 gi nwu kwa n’ugwu ahu ebe i nārigo, ka achikọta kwa gi na umu-nna-gi n’ala-mọ; dika Eron, bú nwa-nne-gi, nwuru n’ugwu Hoa, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n’ala-mọ:

51 n’ihi na unu mekpuru ihe-nmekpu megidem n’etiti umu Israel na miri Meriba Kedesh, n’ọzara Zin; n’ihi na unu edoghm nsọ n’etiti umu Israel.

52 N’ihi na ọ bu na ncherita-iru ka i gāhu ala ahu; ma i gaghi-abà n’ebe ahu n’ala ahu nke Mu onwem nēnye umu Israel.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 33

1 Nka bu kwa ngọzi ahu, nke Moses, bú onye nke Chineke, gọziri umu Israel tutu ọnwu-ya.

2 Ọ we si,

Jehova siri na Sainai bia,

Si kwa na Sia walitere ha;

O siri n’ugwu Peran nwuputa,

O si-kwa-ra na ndi nsọ anāpughi iguta ọnu bia:

Ọku di n’aka-nri-Ya, bú iwu enyere ha.

3 E, Ọ nāhu ndi nke Ya nile n’anya;

Ndi nsọ Ya nile di n’aka-gi:

Ndi ahu we nọdu ala n’ukwu-gi;

Onye ọ bula gānata ufọdu nime okwu-gi.

4 Iwu ka Moses nyere ayi,

Bú ihe-nnweta nke nkpọkọta Jekob.

5 Ọ we buru eze nime Jeshurun,

Mb͕e ndi-isi ndi Israel chikọtara onwe ha,

Ebo nile nke Israel n’otù.

6 Ka Reuben di ndu, ghara kwa inwu;

Ma ka ndikom-ya di ole-na-ole.

7 Nka bu kwa ngọzi nke Juda: ọ we si,

Jehova, nu olu Juda,

Me kwa ka ọ bakute ndi-ya:

Aka-ya abua aluworo ya onwe-ya ọ̀gù;

Onye-iye-aka megide ndi nākpab͕u ya ka I gābu.

8 Ọ we kwue ihe bayere Livai, si,

Izu-okè-Gi na Ìhè-Gi diri onye-ebere-Gi,

Onye I nwara na Masa,

Onye Gi na ya nēse okwu n’akuku miri Meriba;

9 Onye ahu nke nēkwu okwu bayere nna-ya, baye-kwa-ra nne-ya, si, Ahughm ya;

Umu-nne-ya ka ọ nāmataghi kwa;

Umu-ya ka ọ nāmaghi kwa;

N’ihi na ha edebewo okwu-ọnu-Gi,

Ọb͕ub͕a-ndu-Gi ka ha nēchezi kwa.

10 Ha gēzí Jekob ikpé-Gi nile,

Iwu-Gi ka ha gēzí kwa Israel:

Ha gētiye ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’imi-Gi,

Tiye kwa àjà-nsuresi-ọku n’elu ebe-ichu-àjà-Gi.

11 Jehova, gọzie àkù-ya,

Ka ọlu aka-ya abua tọ kwa Gi utọ:

Mapue úkwù ndi nēbili imegide ya,

Na nke ndi nākpọ ya asì, ka ha ghara ibili ọzọ.

12 O kwuru ihe bayere Benjamin, si,

Onye Jehova huru n’anya gēbi na ntukwasi-obi n’akuku Ya;

O nēkpuchi ya ogologo ubọchi nile,

Ọ bu kwa n’etiti ubu-Ya abua ka o nēbi.

13 Ọ we kwue ihe bayere Josef, si,

Ihe Jehova nāgọzi ka ala-ya bu;

Site n’ihe di oké ọnu-ahia nke elu-igwe, site n’igirigi,

Site kwa n’ob͕u-miri nke nāmakpu n’okpuru.

14 Site kwa n’ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-ọmume anyanwu,

Site kwa n’ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-npuputa nke ọnwa nile.

15 Site kwa n’isi ihe nke ugwu nke di site na mb͕e ochie,

Site kwa n’ihe di oké ọnu-ahia nke ugwu ntà di mb͕e ebighi-ebi.

16 Site kwa n’ihe di oké ọnu-ahia nke uwa na ùjú-ya,

Na obi-ọma nke Onye bi n’osisi ntà:

Ka ngọzi ahu biakwasi n’isi Josef,

Na n’opu-n’isi nke onye ekewapuru n’etiti umu-nne-ya.

17 Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya;

Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa:

Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa:

Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim,

Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.

18 Ọ we kwue ihe bayere Zebulun, si,

Zebulun, ṅuria ọṅu n’ọpupu-gi;

Isaka, ṅuri kwa ọṅu n’ulo-ikwū-gi nile.

19 Ha gākpọ ndi nile bia n’ugwu;

N’ebe ahu ka ha gāchu àjà ezi omume:

N’ihi na njuputa nke oké osimiri nile ka ha gāmí dika ara,

Ya na ihe nile zoro ezo nke ezoro n’ájá.

20 Ọ we kwue ihe bayere Gad, si,

Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye nēme ka Gad sa mbara:

Dika nne-ọdum ka ọ nēbi,

Ọ nādọka kwa ogwe-aka, ya na opu-n’isi.

21 Ọ nāhuta-kwa-ra onwe-ya ihe mbu,

N’ihi na ebe ahu ka ekpuchiri òkè onye nēnye iwu;

Ọ we soro ndi-isi ndi Israel bia,

Ezi omume nke Jehova ka o mere,

Na ikpé-Ya nile n’ebe Israel nọ.

22 O we kwue ihe bayere Dan, si,

Dan bu nwa ọdum,

Ọ nēsi na Beshan maputa.

23 O we kwue ihe bayere Naftali, si,

Naftali, onye ewere ihe-utọ me ka afọ ju gi,

Onye juputa-kwa-ra na ngọzi Jehova:

Gi nweta Ọdida-anyanwu na Ndida.

24 O we kwue ihe bayere Asha, si,

Onye agọziri agọzi n’umu ka Asha bu;

Ka ihe-ya tọ umu-nne-ya utọ,

Ka ọ zọye kwa ukwu-ya na manu.

25 Ígwè na ọla ka akpukpọ-ukwu-gi gābu;

Dika ubọchi-gi nile si di kwa, otú a ka ume-gi gādi.

26 Ọ dighi onye di ka Chineke, gi Jeshurun,

Onye elu-igwe nēbu dika inyinya n’iyere gi aka,

Onye mbara-ígwé nēbu kwa nime nbili-elu-Ya.

27 Ebe-obibi-gi ka Chineke nke di site na mb͕e ochie bu,

N’okpuru ka ogwe-aka mb͕e ebighi-ebi di kwa:

Ọ chupu-kwa-ra onye-iro n’iru gi,

We si, Kpochapu.

28 Israel we biri na ntukwasi-obi,

Isi-iyi Jekob nání ya iche,

N’ala ọka na manya-vine ọhu;

Ọzọ, elu-igwe-ya nātasi igirigi.

29 Onye ihe nile nāgara nke-ọma ka i bu, Israel:

Ònye di ka gi? bú ndi Jehova zọputaworo,

Onye bu ọta nke iye-aka-gi,

Onye bu kwa mma-agha nke nbili-elu-gi!

Ndi-iro-gi gērube kwa isi aghughọ n’okpuru gi;

Gi onwe-gi gāzọkwasi kwa ebe di elu nke ha ukwu.

Categories
DEUTERONOMI

DEUTERONOMI 34

1 Moses we si n’ala ihe nādighi nke Moab rigorue ugwu Nebo, rue elu Pisga, nke di n’iru Jeriko. Jehova we me ka ọ hu ala ahu nile; Gilead, rue Dan;

2 na Naftali nile, na ala nke Efraim na Manase, na ala nile nke Juda, rue oké osimiri nke di n’azu;

3 na Negeb, na Buruburu-ala nke ndagwurugwu Jeriko, bú obodo nkwu, rue Zoa.

4 Jehova we si ya, Nka bu ala ahu nke M’ṅuru Abraham iyi, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, si, Ọ bu nkpuru-gi ka M’gēnye ya: emewom ka i were anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-agabiga n’ebe ahu.

5 Moses, bú orù Jehova, we nwua n’ebe ahu n’ala Moab, n’okwu-ọnu Jehova.

6 O we lìe ya na ndagwurugwu ahu n’ala Moab na ncherita-iru Bet-peoa: ma ọ dighi onye mara ílì-ya rue ta.

7 Moses b͕ara ọgu arọ isi mb͕e ọ nwuru: anya-ya adighi-ahu inyoghi-inyoghi, ume-ya apughi n’aru-ya.

8 Umu Israel we kwara Moses ákwá n’ala ihe nādighi nke Moab orú ubọchi na iri: ubọchi nile nke ikwa-ákwá, bú oruru-újú Moses, we zue.

9 Joshua nwa Nun we juputa na mọ nke amam-ihe; n’ihi na Moses ebikwasiwo ya aka-ya abua: umu Israel we ge ya nti, me kwa dika Jehova nyere Moses iwu.

10 Ọ dighi kwa onye-amuma biliri ọzọ n’Israel dika Moses, onye Jehova mara iru na iru;

11 bayere ihe-iriba-ama nile na ihe-ebube nile, nke Jehova zigara ya ime n’ala Ijipt, ime Fero, na ime ndi-orù-ya nile, na ime ala-ya nile;

12 baye-kwa-ra aka ahu di ike nile, baye-kwa-ra ihe egwu uku ahu nile, nke Moses mere n’anya Israel nile.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 1

1 O rue, mb͕e ọnwu Moses, bú orù Jehova, gasiri, na Jehova gwara Joshua nwa Nun, bú onye nējere Moses ozi, okwu, si,

2 Moses, bú orùm anwuruwo; ma ub͕u a bilie, gabiga Jọdan nka, gi onwe-gi, na ndi nke a nile, rue ala ahu nke Mu onwem nēnye ha, bú umu Israel.

3 Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi, unu ka M’nyeworo ya, dika M’gwara Moses okwu.

4 Site n’ọzara, na Lebanon nka, we rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis, ala nile nke ndi Het, we rue oké osimiri chere iru n’ọdida-anyanwu, ka ókè-ala unu gādi.

5 Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n’iru gi ubọchi nile nke ndu-gi: dika M’nọyere Moses, otú a ka M’gānọyere gi: M’gaghi-ara gi aka, M’gaghi-arapu kwa gi.

6 Idi ike, nwe kwa ume: n’ihi na gi onwe-gi gēme ka ndi nka keta ala ahu nke M’ṅuru nna-ha iyi inye ha.

7 Nání, di ike, nwe kwa ume nke-uku, ilezi anya ime dika iwu ahu nile si di, nke Moses, bú orùm, nyere gi n’iwu: ewezugala onwe-gi na ya n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe, ka i we nwe uche n’ebe ọ bula i nēje.

8 Akwukwọ iwu a agaghi-apu n’ọnu-gi, kama i gātughari uche nime ya ehihie na abali, ka i we lezie anya ime dika ihe nile si di nke edeworo nime ya: n’ihi na mb͕e ahu i gēme ka ije-gi ga nke-ọma, mb͕e ahu i gēnwe kwa uche.

9 Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n’ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n’ebe ọ bula i nēje.

10 Joshua we nye ndi-ọchi-agha ndi Israel iwu, si,

11 Gabiganu n’etiti ọmuma-ulo-ikwū, nye ndi Israel iwu, si, Doziere onwe-unu ihe unu gēri n’uzọ; n’ihi na ọ fọduru ubọchi atọ unu ewe gabiga Jọdan nka, ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu inweta ya.

12 Joshua gwa-kwa-ra ndi Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, okwu, si,

13 Chetanu okwu ahu nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n’iwu, si, Jehova, bú Chineke-unu, nēme ka unu zuru ike, Ọ gēnye kwa unu ala nka.

14 Ndinyom-unu na umu-ntakiri-unu na anu-ulo-unu gānọdu n’ala ahu nke Moses nyere unu n’ofè Jọdan; ma unu onwe-unu gāgabiga n’iru umu-nne-unu, chiri ihe-ekike-agha, ndi-dike nile, bú dìnkpà, unu gēye-kwa-ra ha aka;

15 rue mb͕e Jehova gēme ka umu-nne-unu zuru ike, dika O meworo unu, ha we nweta, ọbuná ha onwe-ha, ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye ha: unu we laghachi n’ala nke ihe-nnweta-unu, we nweta ya, bú nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n’ofè Jọdan n’uzọ ọwuwa-anyanwu.

16 Ha we za Joshua, si, Ihe nile nke I nyeworo ayi n’iwu, ayi gēme ya, ebe ọ bula i gēziga ayi, ayi gēje ya.

17 Dika ihe nile si di nke ayi gere Moses nti nime ya, otú a ka ayi gēge gi nti: nání, Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi, dika Ọ nọyere Moses.

18 Onye ọ bula nke gānupu isi n’okwu-ọnu-gi, nke nānughi kwa okwu-gi nile n’ihe nile nke i nēnye ya n’iwu, agēme ka ọ nwua: nání, di ike, nwe kwa ume.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 2

1 Joshua nwa Nun we si na Shitim zipu ndikom abua na nzuzo, bú ndi-nledo, si, Jenu, le ala ahu, na Jeriko. Ha we je, ba n’ulo otù nwayi nākwa iko, aha-ya bu Rehab, ha we dina n’ebe ahu.

2 Ewe gwa eze Jeriko okwu, si, Le, ndikom batara n’ebe a n’abali a sitere n’umu Israel ileputa ala-ayi.

3 Eze Jeriko we zigara Rehab ozi, si, Me ka ha puta, bú ndikom ahu ndi bakutere gi, ndi bara n’ulo-gi: n’ihi na ọ bu ileputa ala nka nile ka ha biaworo.

4 Nwanyi ahu we kuru ndikom abua ahu, zobe ha; o we si, Ọ bu otú a, ndikom ahu bakuterem, ma amaghm ebe ha si bia:

5 o rue, mb͕e agaje imechi ọnu-uzọ-ama, n’ọchichiri, na ndikom ahu puru: amaghi ebe ndikom ahu jere: chuanu ha ngwa ngwa; n’ihi na unu gēru ha aru.

6 Ma ya onwe-ya mere ka ha rigo n’elu-ulo, o we zobe ha n’ókpòrò flax, nke edoro n’uso nye ya n’elu-ulo.

7 Ndikom ahu we nāchu ha n’uzọ Jọdan rue ngabiga-miri: ha we mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ndi nāchu ha n’azu pusiri.

8 Ma tutu ha onwe-ha edina ala, nwayi ahu we rigokuru ha n’elu-ulo;

9 ọ si ndikom ahu, Amawom na Jehova enyewo unu ala nka, amawokwam na oké ujọ-unu adakwasiwo ayi, amawokwam na ndi nile nēbi n’ala nka ab͕azewo n’iru unu.

10 N’ihi na ayi anuwo otú Jehova mere ka miri Oké Osimiri Uhie takọrọ n’iru unu, mb͕e unu siri n’Ijipt puta; na ihe unu mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi bi n’ofè Jọdan, bú Saihon na Og, ndi unu wezugara ka ebibie ha.

11 Ma mb͕e ayi nuru ya, obi-ayi we lọ ayi miri, ọ dighi kwa mọ guzoro ọzọ nime nwoke ọ bula, n’ihi unu: n’ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu Chineke n’elu-igwe di n’elu, na n’elu uwa di n’okpuru.

12 Ma ub͕u a, biko, werenu Jehova ṅuaram iyi, n’ihi na emerem unu ebere, na unu, ọbuná unu onwe-unu, gēmere ulo nnam ebere, nyekwam ihe-iriba-ama ezi-okwu:

13 na unu gēme kwa ka nnam, na nnem, na umu-nnem ndinyom, na ihe nile ha nwere, di ndu, na unu gānaputa kwa ndu-ayi n’ọnwu.

14 Ndikom ahu we si ya, Ndu-ayi lara ndu-unu ka ayi we nwua, ma ọ buru na unu egosighi okwu-ayi nka; ọ gēru kwa, mb͕e Jehova gēnye ayi ala nka, na ayi gēmere gi ebere na ezi-okwu.

15 Ọ we were udọ̀ weda ha site na window: n’ihi na ulo-ya di na nb͕idi obodo, ọ bu kwa n’elu mb͕idi ka o biri.

16 O we si ha, Jenu n’ugwu, ka ndi nāchu unu we ghara izute unu; zo-kwa-nu onwe-unu n’ebe ahu ubọchi atọ, rue mb͕e ndi nāchu unu gālaghachi: emesi kwa unu gēje ije-unu.

17 Ndikom ahu we si ya, Ayi onwe-ayi gābu ndi ikpe nāmaghi n’iyi-gi a nke i meworo ka ayi ṅua.

18 Le, mb͕e ayi onwe-ayi gaje ibata n’ala nka, i gēkegide eriri ogho uhie a nime window nke i ji weda ayi: nna-gi, na nne-gi, na umu-nne-gi, na ulo nna-gi nile, ka i gāchikọta-kwa-ra onwe-gi n’ulo a.

19 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke gēsi n’ọnu-uzọ ulo-gi pua n’èzi, ọbara-ya gādikwasi n’isi-ya, ayi onwe-ayi gābu kwa ndi ikpe nāmagh: ma onye ọ bula gi na ya gānọ n’ulo, ọbara-ya gādikwasi n’isi-ayi, ma ọ buru na aka ọ bula adikwasi ya.

20 Ma ọ buru na i gosi okwu-ayi nka, ayi gābu kwa ndi ikpe nāmaghi n’iyi-gi nke i meworo ka ayi ṅua.

21 O we si, Dika okwu nile unu si di, otú a ka ọ gādi. O we zilaga ha, ha we je: o we kegide eriri uhie ahu nime window.

22 Ha we je, biarue ugwu ahu, nọdu n’ebe ahu ubọchi atọ, rue mb͕e ndi nāchu ha laghachiri: ndi nāchu ha we chọ ha n’uzọ ahu nile, ma ha achọtaghi ha.

23 Ndikom abua ahu we laghachi, si n’ugwu ahu rida, we gabiga, biakute Joshua nwa Nun; ha we kọrọ ya ihe nile nke dakwasiri ha.

24 Ha we si Joshua, N’ezie Jehova enyewo ala ahu nile n’aka-ayi; ọzọ kwa, ndi nile ndi bi n’ala ahu nāb͕azepu n’iru ayi.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 3

1 Joshua we bilie n’isi-ututu, ha we si na Shitim bilie ije, we biarue Jọdan, ya onwe-ya na umu Israel nile; ha we nọ ọnọdu-abali n’ebe ahu tutu ha agabiga.

2 O rue, n’ọgwugwu ubọchi atọ, na ndi-ọchi-agha gabigara n’etiti ọmuma-ulo-ikwū;

3 ha we nye ndi Israel iwu, si, Mb͕e unu nāhu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ka ha nēbu ya, unu onwe-unu gēsi kwa n’ebe unu nọ bulie ije, we nējeso ya.

4 Nání, ókè gādi n’etiti unu na ya, dika nnù cubit ise n’ọtùtù: unu abiarula nso ya, ka unu we mara uzọ nke unu gēsi je; n’ihi na unu agabigaghi n’uzọ a na mb͕e gara aga.

5 Joshua we si ndi Israel, Donu onwe-unu nsọ: n’ihi na echi ka Jehova gēme ihe-ebube di iche iche n’etiti unu.

6 Joshua we gwa ndi-nchu-àjà okwu, si, Bulienu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu-ahu, gabiga n’iru ndi Israel. Ha we bulie ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu, we nēje n’iru ndi Israel.

7 Jehova we si Joshua, Ta ka M’gāmalite ime ka i di uku n’anya Israel nile, ka ha we mara na otú M’nọyere Moses, otú a ka M’gānọyere gi.

8 Gi onwe-gi gēnye kwa ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu iwu, si, Mb͕e unu gābiaru nsọtu miri Jọdan, unu gēguzo na Jọdan.

9 Joshua we si umu Israel, Bianu nso ebe a, nuru okwu nile nke Jehova, bú Chineke-unu.

10 Joshua we si, Nka ka unu gēji mata na Chineke Nke di ndu nọ n’etiti unu, Ọ ghaghi kwa inapu ha ala-ha n’iru unu, bú ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Haivait, na ndi-Perizait, na ndi-Giagashait, na ndi-Amorait, na ndi Jebus.

11 Le, ib͕e ọb͕ub͕a-ndu nke Onye-nwe uwa nile nāgabiga n’iru unu nime Jọdan.

12 Ma ub͕u a, werenu m’onwe-unu ndikom iri na abua sitere n’ebo nile nke Israel, otù nwoke otù nwoke diri ebo ọ bula.

13 Ọ gēru kwa, mb͕e ọbu-ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e Jehova, bú Onye-nwe uwa nile, gēzu ike nime miri Jọdan, na agēbipu miri Jọdan, bú miri nke nēsi n’elu rida; ha gēguzo kwa n’otù obo.

14 O rue, mb͕e ndi Israel siri n’ulo-ikwū nile ha bulie ije, igabiga Jọdan, ndi-nchu-àjà nēbu kwa ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu n’iru ndi Israel;

15 mb͕e ndi nēbu ib͕e ahu biaru-kwa-ra Jọdan, mb͕e ndi-nchu-àjà ndi, nēbu ib͕e ahu zọyere ukwu-ha nime nsọtu miri, (n’ihi na Jọdan nēruchi usọ-ya nile ubọchi nile nke owuwe-ihe-ubi,)

16 na miri ahu nke nēsi n’elu rida guzoro, we bilie n’otù obo, n’ebe di anya nke-uku, n’Adam, bú obodo nke di n’akuku Zaretan: ebìpusi-kwa-ra miri nke nērudata rue osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú: ndi Israel we gabiga na ncherita-iru Jeriko.

17 Ndi-nchu-aja ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova we guzo n’ala-akọrọ n’etiti Jọdan, Israel nile we nagabiga n’ala-akọrọ, rue mb͕e mba ahu nile gabigasiri Jọdan.