Categories
JEMES

JEMES 5

1 Genu nti, unu ndi-ọgaranya, kwa ákwá, ti-kwa-nu nkpu n’ihi ihuju-anya nile unu nke nābiakwasi unu.

2 Àkù-unu erewo uré, uwe nile unu aghọwo kwa ihe nla ripiaworo.

3 Ọla-edo-unu na ọla-ọcha-unu ab͕awo nchara; nchara-ha gāburu kwa unu ihe-àmà, ọ gēripia kwa anu-aru-unu dika ọku. Unu kpadoro àkù-unu na mb͕e ikpe-azu.

4 Le, ugwọ-ọlu nke ndi-ọlu ndi bìri ọka n’ubi-unu, nke unu jidere na nmeb͕u, nēti nkpu: iti-nkpu nke ndi ahu ndi were ihe-ubi-unu abàwo na nti Onye-nwe usu nile nke ndi-agha.

5 Unu biri n’oké oriri na ọṅuṅu n’elu uwa, di kwa ndu ọjọ dika ọ nātọ aru-unu utọ; unu zùru obi-unu n’ubọchi ob͕ub͕u.

6 Unu mara ikpé, unu b͕uru onye ezi omume ahu; ọ dighi-edo onwe-ya imegide unu.

7 Ya mere, umu-nnam, nātachinu ogologo-ntachi-obi rue ọbibia nke Onye-nwe-ayi. Le, onye-ọlu-ubi nēche nkpuru di oké ọnu-ahia nke ala, nātachi ogologo-ntachi-obi n’ebe ọ di, rue mb͕e ọ gānata miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu.

8 Unu onwe-unu, nātachi-kwa-nu ogologo-ntachi-obi; menu ka obi-unu guzosie ike: n’ihi na ọbibia nke Onye-nwe-ayi di nso.

9 Umu-nnam, unu atamuritala megide onwe-unu, ka ewe ghara ikpe unu: le, Onye-ikpé-ayi nēguzo n’iru ọnu-uzọ.

10 Umu-nnam, natanu ndi-amuma ahu, bú ndi kwuru okwu n’aha Onye-nwe-ayi, dika ihe-ilere-anya nke ihuju-anya na nke ogologo-ntachi-obi.

11 Le, ayi nākpọ ha ndi ngọzi diri, bú ndi tachiri obi: unu nuru ihe bayere ntachi-obi nke Job, hu kwa ihe Onye-nwe-ayi zubere, na Onye-nwe-ayi bu onye nwere ọmiko ri nne, nwe kwa obi ebere.

12 Ma nke kachasi ihe nile, umu-nnam, unu aṅula iyí, unu ejila elu-igwe, ma-ọbu ala, ma-ọbu ihe iṅu-iyi ọ bula ọzọ, ṅu iyi: kama ka e-unu buru e, ka é-è-unu buru kwa é-è; ka unu we ghara idabà n’okpuru ikpé.

13 Ọ̀ di onye ọ bula n’etiti unu nāhuju anya? ya kpe ekpere. Ọ̀ di onye ọ bula nwere obi-utọ? ya bùa abù ọma.

14 Ọ̀ di onye ọ bula n’etiti unu nke aru-ya nādighi ike? ya kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n’isi-ya, nēte ya manu olive n’aha Onye-nwe-ayi:

15 ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādighi ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie; ọ buru kwa na o mehieworo, agāb͕aghara ya nmehie ahu.

16 Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n’ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n’ilusi-ọlu-ike-ya.

17 Elaija bu madu yiri ayi n’aru-ya, o we kpesie ekpere ike ka miri ghara izo; miri ezoghi kwa n’ala arọ atọ na ọnwa isi.

18 O we kpe ekpere ọzọ; elu-igwe we nye miri-ozuzo, ala we mia nkpuru-ya.

19 Umu-nnam, asi na onye ọ bula n’etiti unu si n’ezi-okwu jehie, ma otù onye we me ka o chigharia;

20 ka ọ mara na onye meworo ka onye-nmehie si na njehie nke uzọ-ya chigharia gazọputa nkpuru-obi n’ọnwu, o gēkpuchi kwa ọtutu nmehie.

Categories
I. PITA

I. PITA 1

1 Pita, onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi arọputaworo ndi bi dika ọbìa n’etiti Nb͕asa ahu nime Pọntọs, Galetia, Kapadọsia, Esia, na Bitinia,

2 ndi arọputaworo dika ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara si di, nime ido-nsọ nke Mọ Nsọ, ka unu we ṅa Jisus Kraist nti, ka ewe fesa kwa unu ọbara-Ya: Ka eme ka amara bara unu uba, ya na udo.

3 Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye muru ayi ọzọ, dika oké ebere-Ya si di, ka ayi we nwe olile-anya di ndu, site na nbilite ahu nke Jisus Kraist si na ndi mwuru anwu bilite,

4 ka ayi we keta nketa nke anāpughi imebi, nke anādighi-emeru kwa emeru, nke nādighi-atalata kwa, nke edebeworo n’elu-igwe nye unu,

5 ndi ewere ike nke Chineke nēche nche site n’okwukwe rue nzọputa nke edoziworo ikpughe n’oge ikpe-azu.

6 Nke obi nātọ unu utọ nke-uku nime ya, ọ bu ezie na emere ka o wuta unu n’ọnwunwa di iche iche nwa oge ub͕u a, ma asi na ọ di nkpà,

7 ka nnwaputa nke okwukwe-unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n’iyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru nime nkpughe nke Jisus Kraist:

8 Onye unu huru n’anya, ọ bu ezie na unu ahughi Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bu ezie na unu adighi-ahu Ya anya ub͕u a, obi we nātọ unu utọ nke-uku n’ọṅù nke anāpughi ikwu okwu nke enyewo-kwa-ra ya otuto:

9 ebe unu nānata ihe okwukwe-unu gēweta, bú nzọputa nke nkpuru-obi-unu.

10 Ọ bu kwa nzọputa nka ka ndi-amuma chọrọ, nyocha kwa ihe bayere ya, bú ndi buru amuma bayere amara ahu nke gēru unu:

11 nēnyocha oge ọ bu ma-ọbu aha oge ọ bu, bú nke Mọ nke Kraist Nke si nime ha nēgosi, mb͕e O buru uzọ nāb͕a àmà bayere ahuhu nke Kraist, na ebube nile nke gēso ha.

12 Ndi ekpughere nye, na ọ bughi onwe-ha, kama ọ bu unu, ka ha ji ihe ndia jere ozi, bú ihe nke akọrọ unu ub͕u a site n’ọnu ndi ahu ndi zìri unu ozi ọma nka nime Mọ Nsọ eziputara n’elu-igwe; ihe ọ nāgu ndi-mọ-ozi inyocha ha.

13 N’ihi nka kenu ihe-ọkiké a n’úkwù nke uche-unu, nwe-kwa-nu anya-udo, lezu-kwa-nu anya okè n’amara nke anēwetara unu nime nkpughe nke Jisus Kraist;

14 dika umu nke iṅa-nti, unu eme-kwa-la onwe-unu ka unu di ka agu ihe ọjọ ahu si di, bú nke guru unu na mbu n’amaghi-ihe-unu:

15 kama dika Onye kpọrọ unu di nsọ, unu onwe-unu, ghọ-kwa-nu ndi di nsọ n’ibi-obi nile di iche iche;

16 n’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Unu gādi nsọ; n’ihi na nsọ ka Mu onwem di.

17 Ọ buru kwa na unu akpọku Ya dika Nna, bú Onye nēkpe ikpé dika ọlu madu nile n’otù n’otù si di nēleghi madu anya n’iru, nēbinu obi n’egwu n’oge unu bi dika ọbìa:

18 ebe unu matara na ejighi ihe apuru imebi, bú ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo, b͕aputa unu n’ibi-obi efu unu nke nna-unu-hà nyere unu n’aka ibi;

19 kama eji ọbara di oké ọnu-ahia, dika nke nwa-aturu nke ọlu ma-ọbu ntupọ nādighi ya n’aru, bú ọbara nke Kraist:

20 Onye eburu uzọ mara n’ezie mb͕e akātọghi ntọ-ala nke uwa, ma emere ka Ọ puta ìhè n’ọgwugwu oge ndia n’ihi unu,

21 ndi sitere n’aka-Ya buru ndi kwere na Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, we nye Ya ebube; ka okwukwe-unu na olile-anya-unu we di n’ebe Chineke nọ.

22 Ebe unu meworo nkpuru-obi-unu ka ha di ọcha n’iṅa-nti nke unu ṅara ezi-okwu, iwere ihu-n’anya nke iru-abua nādighi ya hu umu-nna-unu n’anya, sitenu n’obi-unu hurita onwe-unu n’anya si-ike:

23 ebe amuworo unu ọzọ, esiteghi na nkpuru apuru imebi, kama esitere na nke anāpughi imebi, site n’okwu Chineke, nke di ndu, nke nādigide kwa, mu unu ọzọ.

24 N’ihi na,

Anu-aru nile di ka ahihia,

Ebube-ya nile di kwa ka uzari ahihia.

Ahihia akpọnwuwo, uzari-ya adapuwo kwa:

25 Ma okwu Onye-nwe-ayi nādigide rue mb͕e ebighi-ebi.

Nka bu kwa okwu nke ozi ọma ahu ezisara unu.

Categories
I. PITA

I. PITA 2

1 Ya mere, tupunu ihe ọjọ nile, na aghughọ nile, na iru-abua, na ekworo, na nkwutọ nile di iche iche,

2 dika umu amuru ọhu, ka agu miri-ara nke okwu Chineke, nke aghughọ nādighi ya, nāgusi unu ike, ka unu we were ya nētó etó rue nzọputa;

3 ọ buru na unu deturu n’ire na Onye-nwe-ayi bu onye nwere obi-ọma;

4 Onye unu nābiakute, bú nkume di ndu, Nke madu juru n’ezie, ma n’ebe Chineke nọ Ọ bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru,

5 ewe were kwa unu onwe-unu, dika nkume di ndu, wu, ka unu buru ulo nke Mọ Nsọ, ka unu we buru òtù ndi-nchu-àjà di nsọ, ichu àjà nke di ka Mọ Nsọ si cho, nke di Chineke ezi nma site na Jisus Kraist.

6 N’ihi na ekwuru n’ihe edeworo n’akwukwọ nsọ, si,

Le, anamatọb͕ọ na Zaion otù isi nkume nime nkuku ntọ-ala, nke bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru:

Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya ma-ọli.

7 Ya mere ọ bu unu, bú ndi kwere ekwe, ka nsọpuru ahu diri: ma n’ebe ndi nādighi-ekwe nọ,

Nkume nke ndi nēwu ulo juru,

Nke ahu ka emere isi nkuku ulo;

8 na,

Nkume isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n’ọnyà;

n’ihi na ha nāsu ngọngọ n’okwu ahu, ebe ha nēkweyeghi ekweye: edo-kwa-ra ha ka ha me ihe a.

9 Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n’ọchichiri ahu ba n’ìhè-Ya di ebube:

10 ndi nābughi ndi n’oge gara aga, ma ub͕u a unu bu ndi nke Chineke: ndi anēmereghri ebere, ma ub͕u a unu bu ndi emeworo ebere.

11 Ndi m’huru n’anya, ariọm unu dika ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa, ka unu ghara ime ihe ọjọ di iche iche nāgu anu-aru, nke bu ihe nēbu agha imegide nkpuru-obi;

12 nēbinu obi-unu nke-ọma n’etiti ndi mba ọzọ; ka ha we site n’ọlu ọma nile unu, nke ha nēle anya, nye Chineke otuto n’ubọchi nleta ahu nime ihe ahu ha nēkwutọ unu nime ya dika ndi nēme ihe ọjọ.

13 Donu onwe-unu n’okpuru ibu-isi ọ bula madu debere n’ihi Onye-nwe-ayi; ma ọ bu eze, dika onye nọ n’ike n’elu unu;

14 ma-ọbu ndi-isi, dika ndi anēzite site n’aka-ya ka ha bọ̀ ọ́bọ̀ n’aru ndi nēme ihe ọjọ, ka ha to kwa ndi nēme ezi ihe.

15 N’ihi na otú a ka ọchichọ nke Chineke si di, ka unu site n’ime ezi ihe me ka amaghi-ihe nke ndi nēnweghi uche kpuchie ọnu:

16 dika ndi nwere onwe-ha, ma unu enweghi inwe-onwe-unu ahu dika ihe-nkpuchi nke ihe ọjọ, kama dika ndi-orù nke Chineke.

17 Sọpurunu madu nile. Hunu òtù ndi bu umu-nna n’anya. Nātunu egwu Chineke. Nāsọpurunu eze-unu.

18 Ndi nēje ozi, nēdonu onwe-unu n’okpuru ndi-nwe-unu n’egwu nile; ọ bughi nání n’okpuru ndi bu ezi madu ndi nwe-kwa-ra obi-ọma, kama ọ bu kwa n’okpuru ndi b͕agọrọ ab͕agọ.

19 N’ihi na nka bu ihe-ekele, ma ọ buru na onye ọ bula nātachi obi n’ihe-nwuta di iche iche n’ihi akọ-na-uche n’ebe Chineke nọ, nāhu ahuhu nke nēzighi ezi.

20 N’ihi na àha otuto gini di ya, ma ọ buru na, mb͕e unu nēmehie, mb͕e eti kwa unu aka, unu atachi obi na ya?

21 N’ihi na akpọrọ unu ime nka: n’ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu n’ihi unu, nārapuru unu ihe ilere anya, ka unu we so ije-ukwu-Ya nile:

22 Onye ọ dighi nmehie ọ bula O mere, ahughi kwa aghughọ n’ọnu-Ya:

23 Onye, mb͕e anēkwuto Ya, Ọ dighi-ekwutọghachi ọzọ; mb͕e Ọ nāhu ahuhu, Ọ dighi-aba nba; kama Ọ rara Onwe-ya nye n’aka Onye ahu Nke nēkpe ikpé ziri ezi:

24 Onye Ya onwe-ya, dika àjà achuru, būru nmehie nile ayi n’aru-Ya n’elu osisi ahu, ka ayi, ebe ayi nwuworo n’ebe nmehie nile di, ka ayi we di ndu n’ebe ezi omume di; Onye eji ọnyá-utari-Ya me ka unu nwe ezi ndu.

25 N’ihi na unu nēhieri dika aturu; ma ub͕u a unu chigharikutere Onye ahu Onye nāzù nkpuru-obi-unu dika anāzù aturu, Onye nēlekọta kwa ha anya.

Categories
I. PITA

I. PITA 3

1 Otú ahu, ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n’okpuru di nke aka unu; ka, ọbuná asi na ufọdu ekweyeghi okwu Chineke, ka ewe site n’ibi-obi nwunye-ha rita ha n’urù n’ebe anēkwughi okwu;

2 mb͕e ha nēle ibi-obi-unu di ọcha, ya na egwu.

3 Ndi ichọ-nma-ha ka ọ ghara ibu ichọ-nma ahu nke aru nke bu ikpa isi, na iyikwasi ihe ọla-edo, ma-ọbu iyikwasi ọtutu uwe;

4 kama ka ọ buru madu zoro ezo nke nkpuru-obi, n’uwe anāpughi imebi nke bu mọ di nwayọ di kwa udo, nke di oké ọnu-ahia n’anya Chineke.

5 N’ihi na otú a ka ndinyom ahu ndi di nsọ, ndi nēle anya Chineke, nāchọ kwa onwe-ha nma n’oge gara aga, nēdo onwe-ha n’okpuru di nke aka ha:

6 dika Sera ṅara Abraham nti, nākpọ ya onye-nwe-ya: onye emere unu ka unu buru umu-ya, ma ọ buru na unu eme ezi ihe, ghara kwa itu egwu site n’ujọ ọ bula.

7 Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye-unu bikọ n’uzọ ihe-omuma, nēkeye ihe bu nwanyi nsọpuru, dika onye nādighi ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara ib͕ochi ekpere-unu.

8 Ma n’ikpe-azu, nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna-unu n’anya, ndi nwere obi ọmiko, ndi nwere uche di ume-ala:

9 ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n’ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n’ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n’ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.

10 N’ihi na,

Onye ahu nke nāchọ ihu ndu n’anya,

Na ihu ezi ubọchi,

Ya me ka ire-ya ghara ikwu ihe ọjọ,

Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu-ya ghara ikwu okwu aghughọ:

11 Ya si kwa n’ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe;

Ya chọ udo, b͕aso kwa ya.

12 N’ihi na anya abua nke Onye-nwe-ayi di n’aru ndi ezi omume,

Nti-Ya abua di kwa n’ebe aririọ-ha di:

Ma iru nke Onye-nwe-ayi digidere ndi nēme ihe ọjọ.

13 Ọ̀nye bu kwa onye ahu nke gēmejọ unu, ma o buru na unu ghọro ndi nānu ọku n’obi n’iso ezi ihe?

14 Ma ọ buru kwa na unu ahu ahuhu n’ihi ezi omume, ngọzi nādiri unu: ma unu atula egwu ahu ha nākpata, obi alọ-kwa-la unu miri;

15 kama donu Kraist-ayi nsọ nime obi-unu dika Onye-nwe-unu: buru-kwa-nu ndi edoziworo mb͕e dum igọpuru onye ọ bula nke nāju unu ajuju bayere olile-anya ahu nke di nime unu, ma ka unu were nwayọ na egwu gọpu:

16 ebe unu nwere ezi akọ-na-uche; ka ewe me ka ihere me ha, bú ndi nākpali ibi-obi ọma unu nime Kraist, nime ihe ahu nke anēkwutọ unu nime ya.

17 N’ihi na ọ ka nma, ma ọ buru na ọchichọ Chineke chọrọ ya, ka unu hu ahuhu n’ihi na unu nēme ezi ihe kama n’ihi na unu nēme ihe ọjọ.

18 N’ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu bayere nmehie, nání otù mb͕e, Onye ezi omume n’ihi ndi ajọ omume, ka O we kuru ayi biakute Chineke; n’ihi na emere ka Ọ nwua anwu n’anu-aru-Ya, ma emere ka Ọ di ndu na mọ-Ya;

19 nke ọ bu kwa nime ya ka Ọ gara we kwusara ndi-mọ nọ n’ulọ-nkpọrọ okwu,

20 ndi nēkweyeghi n’oge gara aga, mb͕e ogologo-ntachi-obi Chineke nēchesi ike n’ubọchi Noa, mb͕e anēdozi ub͕o, nke ewere miri zọputa madu ole-na-ole, ya bu madu asatọ, nime ya:

21 bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n’uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n’ebe Chineke nọ, site na nbilite-n’ọnwu nke Jisus Kraist;

22 Onye nọ n’aka-nri nke Chineke, ebe Ọ gara ba n’elu-igwe; edowo kwa ndi-mọ-ozi na ndi nāchi isi na ndi di ike n’okpuru Ya.

Categories
I. PITA

I. PITA 4

1 Ya mere, ebe Kraist huru ahuhu n’anu-aru, unu onwe-unu were kwa otù izù ahu ke dika ekike-agha; n’ihi na onye huworo ahuhu n’anu-aru agharawo nmehie;

2 ka unu we ghara ibi ọzọ n’oge fọduru unu n’anu-aru-unu ime ihe ọjọ di iche iche nāgu madu, kama ime ihe Chineke nāchọ.

3 N’ihi na oge nke gasiworo ezuwo iluputa ihe ndi mba ọzọ nēzube, na ijeghari nime agu ikwa-iko, agu ihe ọjọ nile, manya-ob͕ub͕u nile, ite-egwú nile, iṅubiga-manya-ókè nile, na ikpere-arusi nile jọb͕uru onwe-ha:

4 nke ha nēchè na ọ bu ihe madu nāhughi mb͕e ọ bula na unu adighi-eso ha n’omume ahu b͕abà n’otù njubiga-ókè ahu nke ndu ila-n’iyì, ha nēkwulu unu:

5 ndi gāza ajuju bayere onwe-ha nye Onye ahu Nke doziworo Onwe-ya ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpé.

6 N’ihi na ihe eji zìsara ọbuná ndi nwuru anwu ozi ọma bu nka, ka ewe kpe ha ikpé dika esi ekpe madu n’anu-aru, ma ka ha we di ndu dika Chineke si di na mọ.

7 Ma ọgwugwu ihe nile di nsọ: ya mere nwenu uche zuru okè, nwe-kwa-nu anya-udo ka unu we kpe ekpere:

8 nke bu isi ihe nile menu ka ihu-n’anya ahu unu nāhurita onwe-unu di ike; n’ihi na ihu-n’anya nēkpuchi ọtutu nmehie:

9 nelērita onwe-unu ọbìa nke-ọma nātamughi ntamu:

10 dika unu nile n’otù n’otù natara onyinye-amara, werenu ihe ahu nējerita onwe-unu ozi, dika ndi nāchi èzi-na-ulo nke-ọma n’amara Chineke nke di n’uzọ di iche iche;

11 ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n’ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n’ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n’ihe nile site n’aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

12 Ndi m’huru n’anya, unu echèla èchichè bayere ọnwunwa ọku ahu nke di n’etiti unu, nke nābiakwasi unu inwa unu, na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula, dika agāsi na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula nādakwasi unu:

13 kama ebe unu nwekọrọ ahuhu nke Kraist, nāṅurinu ọṅu; ka unu we were kwa obi nātọ utọ nke-uku ṅuria nime nkpughe nke ebube-Ya.

14 Ọ buru na anāta unu uta n’aha Kraist, ngọzi nādiri unu; n’ihi na Mọ nke ebube na Mọ nke Chineke nānọgide n’aru unu.

15 N’ihi na, ka onye ọ bula n’etiti unu ghara ihu ahuhu dika ob͕u-madu, ma-ọbu onye-ori, ma-ọbu onye nēme ihe ọjọ, ma-ọbu dika onye nēle ihe nābughi nke aka ya anya:

16 ma ọ buru na onye ọ bula nāhu ahuhu dika Kristian, ka ihere ghara ime ya; ma ka o nye Chineke otuto n’aha nka.

17 N’ihi na oge ahu eruwo ka esite n’ulo Chineke malite ikpe ikpé: ma ọ buru na o buru uzọ site n’aru ayi malite, gini gābu ọgwugwu nke ndi nēkweyeghi ozi ọma nke Chineke?

18 Ọ buru kwa na ọ di ike izọputa onye ezi omume, òle ebe agēgosi onye nādighi-asọpuru Chineke na onye-nmhie?

19 Ya mere ka ndi nāhu ahuhu dika ọchichọ Chineke si di were kwa nkpuru-obi-ha n’ime ezi ihe nye n’aka Onye-òkìkè kwesiri ntukwasi-obi idebe.

Categories
I. PITA

I. PITA 5

1 Ya mere, ariọm ndi-okenye nọ n’etiti unu, onye mu onwem bu okenye-ibe-unu, ya na onye-àmà nke ahuhu nile nke Kraist, abukwam onye-nnwekọ nke ebube ahu nke agaje ikpughe:

2 Nāzùnu ìgwè aturu ntà Chineke nke di n’etiti unu, nēlekọta ha anya, ọ bughi n’ihi na nkpà nākpa unu, kama site n’ọchichọ obi, dika Chineke chọrọ; ọ bughi kwa n’ihi urù nēweta ihere, kama n’ihi na unu di ọku n’obi;

3 ọ bughi kwa dika agāsi na unu nēme ndi bu ihe-nketa dika unu bu ndi-nwe-ha, kama nēme onwe-unu ihe-atù ìgwè aturu ntà ahu gēṅomi.

4 Mb͕e agēme kwa ka Onye-isi-ọzùzù-aturu puta ìhè, unu gānata okpu-eze nke ebube ahu, nke nādighi-atalata.

5 Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n’okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n’ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n’obi amara.

6 Ya mere wedanu onwe-unu n’okpuru aka di ike nke Chineke, ka O we welie unu elu n’oge nke Ya;

7 nātukwasinu Ya ncheb͕u nile unu nēcheb͕u onwe-unu, n’ihi na ihe nile bayere unu nēmetu Ya n’obi.

8 Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi:

9 ma nēguzogidenu ya, n’ihi na unu di ike n’okwukwe-unu, ebe unu matara na anēmezu otù ahuhu ahu n’aru ndi bu òtù umu-nna-unu ndi nọ n’uwa.

10 Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n’ebube ebighi-ebi Ya nime Kraist, mb͕e unu huworo ahuhu nwa oge, Ya onwe-ya gēme ka unu zue okè, me kwa ka unu guzosie ike, me kwa ka unu di ike, tọ kwa unu ntọ-ala.

11 Ọ bu Ya nwe ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

12 Site n’aka Silvanọs, nwa-nna-ayi kwesiri ntukwasi-obi, dika m’nāgu ya, ka m’nēdegara unu akwukwọ n’okwu ole-na-ole, nāriọ unu, nāb͕a kwa àmà na nka bu amara Chineke n’ezie: nēguzosinu ike nime ya.

13 Nwanyi ahu nke nọ na Babilon, nke soro unu buru onye arọputaworo, nēkele unu; nwam, bú Mak, nēkele kwa unu.

14 Werenu isutu-ọnu nke ihu-n’anya nēkelerita onwe-unu.

Udo diri unu nile ndi nọ nime Kraist.

Categories
II. PITA

II. PITA 1

1 Saimon Pita, orù na onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi ketaworo okwukwe di oké ọnu-ahia ra ka nke ayi ketaworo n’ezi omume Onye ahu, bú Chineke-ayi na Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist;

2 Ka eme ka amara bara unu uba, ya na udo, nime nmazu nke Chineke na nke Jisus Onye-nwe-ayi;

3 dika ike O ji buru Chineke nyeworo n’aka-ayi ihe nile di ndu na nsọpuru-Chineke n’efu, site na nmazu nke Onye ahu Onye ji ebube na idi-nma nke aka Ya kpọ ayi;

4 bú nke O siteworo nye n’aka-ayi nkwa nile ahu di oké ọnu-ahia di kwa uku ri nne; ka unu we site n’ihe ndia ghọ ndi nēnwekọ ihe O ji buru Chineke, ebe unu b͕anariworo nmebi nke di n’uwa site n’agu ihe ọjọ.

5 Ma n’ihi otù ihe a n’akuku-unu tukwasinu inu-ọku-n’obi nile, nyezu-kwa-nu idi-nma n’okwukwe-unu; nyezu kwa ihe-ọmuma n’idi-nma-unu;

6 nyezu kwa ijisi-onwe-unu-ike n’ihe-ọmuma-unu; nyezu kwa ntachi-obi n’ijisi-onwe-unu-ike; nyezu kwa nsọpuru-Chineke nime ntachi-obi-unu;

7 nyezu kwa ihuunanya umu-nna nime nsọpuru-Chineke-unu; nyezu kwa ihu-n’anya nime ihu-n’anya-umu-nna-unu.

8 N’ihi na asi na unu nwere ihe ndia, asi kwa na unu nwere ha ri nne, ha nēdo unu ndi nābughi ndi nādighi-alu ọlu ma-ọbu ndi nādighi-ami nkpuru rue imazu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

9 N’ihi na onye ahu ihe ndia nādighi ya nso bu onye kpuru ìsì, onye nāhu inyoghi-inyoghi, ebe ọ chezọrọ nsachapu nke nmehie ochie ya nile.

10 N’ihi nka, umu-nnam, nānunu ọku n’obi kari ime ka ọkpukpọ-unu na nrọputa-unu buru ihe nēguzosi ike: n’ihi na asi na unu e#me ihe ndia, unu agaghi-asu ngọngọ mb͕e ọ bula ma-oli:

11 n’ihi na otú a ka agēnyezu unu n’àkù nbata ahu unu gābata nime ala-eze ebighi-ebi nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist.

12 N’ihi nka mb͕e dum agajem ichetara unu ihe ndia, ọ bu ezie na unu matara ha, emewo kwa ka unu guzosie ike n’ezi-okwu ahu nke dinyere unu.

13 Ma anamagu ya n’ihe ziri ezi, ka oge ra m’nọ n’ulo-ikwū a, ikpali unu n’ichetara unu;

14 ebe m’matara na ntupu nke ulo-ikwūm nka nābia ọsọsọ, ọbuná dika Onye-nwe-ayi Jisus Kraist gosirim.

15 E, m’gānu ọku n’obi ka unu we nwe ike icheta ihe ndia n’oge nile ọ bula mb͕e m’lasiri.

16 N’ihi na ayi esoghi akukọ-irò nke eji amam-ihe kọ, mb͕e ayi mere ka unu mara ike na ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ma emere ayi ka ayi buru ndi huru idi-uku nke Onye ahu.

17 N’ihi na Ọ natara nsọpuru na ebube n’aka Chineke, bú Nna, mb͕e Ebube ahu nke kwesiri idi-uku mere ka olu di otú a dara Ya, si, Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya di Mu onwem ezi nma:

18 olu a ka ayi onwe-ayi nukwara ka o nēsi n’elu-igwe da, mb͕e ayi na Ya nọ n’ugwu ahu di nsọ.

19 Eme-kwa-ra ka okwu amuma ahu guzosiere ayi ike kari; nke unu nēme nke-ọma n’iṅa nti ya, dika oriọna mb͕e ọ nēnwu n’ebe b͕ara ọchichiri, rue mb͕e chi gābọ, kpakpando chi-ọbubọ we tibe n’obi-unu:

20 ebe unu buru uzọ mara nka, na ọ dighi amuma ọ bula n’ihe edeworo n’akwukwọ nsọ nke madu puru ikọ isi-ya site na nání uche nke aka ya.

21 N’ihi na ọ dighi amuma ọ bula nke eji ọchichọ madu bu mb͕e ọ bula: kama madu sitere na Chineke kwue okwu, mb͕e Mọ Nsọ nēme ka ha kwue.

Categories
II. PITA

II. PITA 2

1 Ma ndi-amuma ugha putakwara ìhè n’etiti ndi Israel, dika ndi-ozizí ugha gādi kwa n’etiti unu, bú madu ndi gēwere nzuzo webata irọ-òtù di iche iche nke ila-n’iyì, nāgọnari ọbuná Onye-nwe-ha Onye b͕ara ha, ndi nēweta ila-n’iyì di ngwa tukwasi onwe-ha n’isi.

2 Ọtutu madu gēso kwa uzọ agu-ikwa-iko-ha; ndi agēkwulu uzọ nke ezi-okwu n’ihi ha.

3 Nime anya-uku ka ha gēji kwa okwu nrafu di iche iche were unu zua ahia: ndi ọmuma-ikpe-ha nābughi ihe nādighi-alu ọlu site n’oge ochie, ila-n’iyì-ha adighi-atu kwa ura.

4 N’ihi na asi na Chineke emereghi ndi-mọ-ozi ebere mb͕e ha mehiere, kama Ọ tubàra ha n’ime-ime ọku ala-mọ, we rara ha nye n’olùlù nke ọchichiri, ka ewe debe ha ikpe ikpé;

5 asi kwa na O mereghi uwa ochie ebere, kama ọ bu Noa, onye mere ha asatọ, bú onye nēkwusa ezi omume, ka O chere, mb͕e O mere ka iju-miri biakwasi uwa nke ndi nādighi-asọpuru Chineke;

6 O we me ka obodo Sọdọm na Gọmọrra ghọ ntu, were kwa ikpù-iru ma ha ikpé, ebe O mere ha-ri ka ha buru ihe-ilere-anya nye ndi gaje ibu ndi nādighi-asọpuru Chineke;

7 O we dọputa Lot, bú onye ezi omume, mb͕e ibi-obi n’agu ikwa-iko nke ndi ahu ndi nēmebi iwu nēwuta ya nke-uku

8 (n’ihi na onye ezi omume ahu, ebe o nēbi n’etiti ha, o were ọlu-ha nke nēmebi iwu mekpa nkpuru-obi ezi omume ya aru kwa-ubọchi, n’ile ihe na inu ihe):

9 Onye-nwe-ayi matara idọputa ha n’ọnwunwa, bú ndi nāsọpuru Chineke, na idebe ndi ajọ omume n’ahuhu-nmehie rue ubọchi ikpé;

10 ma nke kachasi ndi nējeso anu-aru n’agu ihe emeruru emeru, ndi nēlelì kwa ibu-onye-nwe-madu anya. Ndi nwere anya-ike, ndi nwere isi-ike, ha amaghi aru jijiji ikwulu ndi nọ n’ebube:

11 ebe ndi-mọ-ozi, ọ bu ezie na ha ka ha n’ume na ike, ma ha ekpegideghi ha ikpé nkwulu n’iru Onye-nwe-ayi.

12 Ma ndia, dika anu nēnweghi uche, ndi bu anu nzuzu site n’ọmumu-ha inwude na imebi, nēkwulu Chineke n’ihe ha nāmaghi, agēmebi kwa ndia na nmehie ha,

13 ndi anēmejọ ha dika ugwọ-ọlu nke ajọ omume; madu ndi nāgu ya n’ihe-utọ, bú ibi n’oké oriri na oké ọṅuṅu n’ehihie, ndi bu ntupọ na ihe-ita-uta, nānọ n’oké oriri na oké ọṅuṅu n’oriri ihu-n’anya ha mb͕e ha nēso unu rikọ ihe;

14 ha bu ndi nwere anya nke juputara n’aru nwanyi nākwa iko, anya nke nāpughi kwa ighara imehie; ha bu kwa ndi nārafu nkpuru-obi ndi nādighi-eguzosi ike; ha nwekwara obi anwaputaworo n’anya-uku; buru kwa umu nke ọbubu-ọnu;

15 ha rapuru uzọ guzosiri ike eguzo, we jehie, ebe ha soro uzọ Belam nwa nke Beoa, onye huru ugwọ-ọlu nke ajọ omume n’anya;

16 ma aturu ya nmebi iwu nke aka ya n’anya: inyinya-ibu nke dara ob͕i were olu madu kwu okwu we b͕ochie anya-adighi-nma nke onye-amuma ahu.

17 Ndia bu isi-iyi nke miri nādighi, buru kwa alulu nke oké ifufe nēfepu; ndi edebeworo ha itiri nke ọchichiri.

18 N’ihi na, ebe ha nēkwu oké okwu na mbuli elu nke ihe-efu, ha were agu ikwa-iko di iche iche nārafu ndi ahu nime agu ihe ọjọ nke anu-aru, bú ndi nāb͕anari n’oge ub͕u a ndi nēbi obi na njehie;

19 ha nēkwe kwa ha nkwa na ha gēnwe onwe-ha, ọ bu ezie na ha onwe-ha bu orù nke nmehie; n’ihi na ihe meriworo madu, ihe a ka emewo-kwa-ra ka onye ahu buru orù-ya.

20 N’ihi na asi na, mb͕e ha b͕anariworo ihe nile emeruru emeru nke uwa site na nmazu nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist, ewe nime ihe ndia, meri kwa ha, ọnọdu ikpe-azu ha abiawo jọkari ọnọdu mbu njọ.

21 N’ihi na ọ gākawori nma ma ọ buru na ha akāmazughi uzọ ezi omume, kari imazu ya, we si n’ihe di nsọ ahu enyere n’iwu, nke enyere ha n’aka idebe, laghachi.

22 Okwu nke ezi ilu ahu adakwasiwo ha, Ọ bu nkita nke chighariri ọzọ n’ihe ọ b͕ọrọ, buru kwa nne-ezì nke chighariri ọzọ n’ituru n’apiti mb͕e ọ sachasiri onwe-ya.

Categories
II. PITA

II. PITA 3

1 Ndi m’huru n’anya, nka bu akwukwọ-ozi nke-abua nke m’nēdegara unu ub͕u a; ma nime ha abua ka m’nakpali uche-unu di ọcha n’ichetara unu;

2 ka unu we cheta okwu nke ndi-amuma di nsọ buru uzọ kwu, cheta kwa ihe ahu Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, nyere n’iwu site n’ọnu ndi-ozi-unu:

3 ebe unu buru uzọ mara nka, na ndi-ọchìe gēji ichì-ọchì bia na mb͕e ikpe-azu, nāga dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di,

4 nāsi kwa, Òle ebe nkwa nke ọbibia-Ya di? n’ihi na site n’ubọchi nna-ayi-hà dara n’ura ọnwu, ihe nile nādigide dika ha diworo site na nmalite nke òkìkè.

5 N’ihi na nka mere ha nchefu n’ihi na ha nāchọ ya, na elu-igwe di site na mb͕e ochie, ha na ala nke esitere na miri were kwa miri me ka o guzokọ n’otù, site n’okwu Chineke;

6 nke esitere n’aka-ha me ka uwa nke di n’oge ahu la n’iyì, n’ihi na iju-miri rikpuru ya:

7 ma elu-igwe nke di ub͕u a, ha na uwa, ka akpadoworo nye ọku site n’otù okwu ahu, ebe anēdebe ha nye ubọchi nke ikpé na ila-n’iyì nke ndi nādighi-asọpuru Chineke.

8 Ma unu ekwela ka otù ihe a me unu nchefu, ndi m’huru n’anya, na otù ubọchi di ka nnù arọ abua na ọgu iri n’anya Onye-nwe-ayi, nnù arọ abua na ọgu iri di kwa ka otù ubọchi.

9 Onye-nwe-ayi anọghi ọdù n’ime nkwa-Ya, dika ufọdu nāgu ya na ọ bu inọ-ọdù; kama Ọ nātachiri unu ogologo-ntachi-obi, n’ihi na O zubeghi ka ndi ọ bula la n’iyì, kama ka madu nile bia rue nchèghari.

10 Ma ubọchi Onye-nwe-ayi gābia dika onye-ori; nke ọ bu nime ya ka elu-igwe gēji oké ùzù gabiga, ihe nile di n’elu-igwe gāb͕a kwa ọku we la n’iyì, uwa na ọlu nile aluru nime ya gērechapu kwa.

11 Ebe anēme ka ihe ndia nile la n’iyì otú a, ọ̀ bu aha madu gini ka unu nāghaghi ibu n’ibi-obi nsọ nile na nsọpuru-Chineke nile,

12 nēle anya ọbibia nke ubọchi ahu nke Chineke, nēme kwa ka ọ bia ngwa ngwa, nke elu-igwe gēre ọku we la n’iyì n’ihi ya, ihe nile di n’elu-igwe gāb͕a kwa ọku we b͕aze?

13 Ma dika nkwa-Ya si di, ayi nēle anya elu-igwe ọhu na uwa ọhu, nke ezi omume bi nime ha.

14 N’ihi nka, ndi m’huru n’anya, ebe unu nēle anya ihe ndia, nānunu ọku n’obi ka ewe hu unu n’udo, ndi nēnweghi ntupọ, ndi anāpughi kwa ita uta n’iru Ya.

15 Nāgu-kwa-nu ogologo-ntachi-obi Onye-nwe-ayi na ọ bu nzọputa; dika nwa-nna-ayi ayi huru n’anya, bú Pọl, dega-kwa-ra unu n’akwukwọ, dika amam-ihe enyere ya si di;

16 dika ọ de-kwa-ra n’akwukwọ-ozi-ya nile; nēkwu okwu bayere ihe ndia nime ha; nke ihe ufọdu nke di ike ighọta di nime ha, nke ndi anēzíghi ihe na ndi nādighi-eguzosi ike nāchighari, dika ha nēme kwa ihe fọduru nke edeworo n’akwukwọ nsọ, ila onwe-ha n’iyì.

17 Ya mere, unu onwe-unu, ndi m’huru n’anya, ebe unu buru uzọ mara ihe ndia, nēchenu onwe-unu nche, ka aghara iwere njehie nke ndi nēmebi iwu bupu unu, unu we si na nguzosi-ike nke aka unu dapu.

18 Ma nābanu uba n’amara na ọmuma nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist. Ọ bu Ya ka otuto diri ma ub͕u a ma rue ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi. Amen.

Categories
I. JỌN

I. JỌN 1

1 Ihe nke diri site na mbu, ihe ayi nuworo, ihe ayi jiworo anya-ayi hu, ihe ayi kiriri, nke aka-ayi datukwara, bayere Okwu nke ndu ahu,

2 (emekwara ka ndu ahu puta ìhè, ayi ahuwo kwa ya, nāb͕a kwa àmà, kọ-kwa-ra unu ndu ahu, ndu nke diri n’ebe Nna ayi nọ, ewe me ka ọ putara ayi ìhè);

3 ọ bu ihe ayi huworo, nu kwa, ka ayi nākọkwara unu, ka unu onwe-unu we so kwa ayi nwekọ ya: ma nnwekọ-ayi bu kwa nke ayi soro Nna-ayi, so kwa Ọkpara-Ya Jisus Kraist, nēnwekọ:

4 ihe ndia ka ayi onwe-ayi nēde kwa n’akwukwọ, ka ewe mezue ọṅù-ayi.

5 Nka bu kwa ozi ahu nke ayi nuworo n’ọnu-Ya, nākọ-kwa-ra unu, na Chineke bu ìhè, ọ dighi kwa ọchichiri ọ bula di nime Ya.

6 Ọ buru na ayi asi na ayi nēso Ya nwekọ ihe, ma ayi nējeghari n’ọchichiri, ayi nēkwu okwu-ugha, ayi adighi-eme kwa ezi-okwu:

7 ma ọ buru na ayi ejegharia n’ìhè ahu, dika Ya onwe-ya nọ n’ìhè ahu, ayi nēnwekọrita ihe n’etiti onwe-ayi, ọbara Jisus, bú Ọkpara-Ya, nāsachapu kwa ayi nmehie nile.

8 Ọ buru na ayi asi na ayi enweghi nmehie, ayi nēduhie onwe-ayi, ezi-okwu ahu adighi kwa nime ayi.

9 Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa Onye ezi omume, ka O we b͕aghara ayi nmehie-ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile.

10 Ọ buru na ayi asi na ọ dighi mb͕e ọ bula ayi mehiere, ayi nēme Ya onye-ugha, okwu-Ya adighi kwa nime ayi.