Categories
NDI KỌLỌSI

NDI KỌLỌSI 4

1 Ndi-nwe madu, nēnye-kwa-nu ndi-orù-unu ihe ziri ezi na nke ra nrata; ebe unu matara na unu onwe-unu nwe-kwa-ra otù Onye Nke bu Onye-nwe-unu n’elu-igwe.

2 Nānọgidesinu ike n’ekpere-unu, nāmu-kwa-nu anya nime ya n’ikele-ekele;

3 nēkpe-kwa-nu ekpere n’ihi ayi n’otù oge ahu, ka Chineke we meghere ayi ọnu-uzọ ikwusa okwu-Ya, ka ayi kwue ihe-omimi nke Kraist, nke m’nọ kwa n’ab͕u n’ihi ya;

4 ka m’we me ka ọ puta ìhè, dika m’nāghaghi ikwu ya.

5 Nējegharinu n’amam-ihe n’ebe ndi nọ n’èzí nọ, nāzuchapuru onwe-unu oge a nile.

6 Ka okwu-unu di n’amara mb͕e nile, ihe eji nnú me ka ọ di utọ, ka unu we mata otú unu nāghaghi iza madu nile ọ bula.

7 Madu nke gēme ka unu mara ihe nile bayere mu onwem bu Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n’anya, buru kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n’ije-ozi, buru kwa orù-ibem nime Onye-nwe-ayi:

8 onye m’nēzitere unu ime ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu.

9 Anamezite kwa Ọnisimọs, bú nwa-nna-ayi ahu kwesiri ntukwasi-obi, onye ahu-kwa-ra n’anya, onye bu otù onye n’etiti unu. Ha gēme ka unu mara ihe nile nke anēme n’ebe a.

10 Aristakọs onye adọkọrọ mu na ya n’agha nēkele unu, ya na Mak nwa-nne Banabas (onye unu natara ihe ufọdu enyere n’iwu bayere ya; asi na ọ biakute unu, naranu ya nke-ọma),

11 Jisus kwa, onye anākpọ Justọs, madu atọ ndia sitere n’obibì-úgwù: nání ndia bu ndi sorom nālukọ ọlu n’ikwusa ala-eze Chineke, madu ndi emere ka ha burum ndi-ngugù-obi.

12 Epafras, onye bu otù onye n’etiti unu, orù nke Kraist Jisus, nēkele unu, nāb͕asi nb͕a ike n’ihi unu n’ekpere-ya nile mb͕e nile, ka unu we guzo dika ndi zuru okè ndi kwezuwo-kwa-ra ihe nile Chineke nāchọ.

13 N’ihi na anamab͕ara ya àmà, na ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu nke-uku nye unu na ndi nọ na Leọdisia na ndi nọ na Hierapọlis.

14 Luk, bú dibia nke ahuru n’anya, nēkele unu, ya na Dimas.

15 Kelenu umu-nna-ayi ndi nọ na Leọdisia, na Nimfas, na nzukọ Kraist nke di n’ulo-ha.

16 Ma mb͕e ọ bula agāgusi akwukwọ-ozi a n’etiti unu, menu ka agu kwa ya na nzukọ Kraist nke ndi Leọdisia; lezi-kwa-nu anya ka unu onwe-unu gu kwa akwukwọ ozi ahu si na Leọdisia bia.

17 Ọzọ, sinu Akipọs, Lezie ije-ozi nke i natara nime Onye-nwe-ayi anya, ka i jezu ya.

18 Ekele nke mu Pọl, nke m’ji aka nkem de. Chetanu ab͕um. Ka amara diyere unu.

Categories
I. NDI TESALỌNAIKA

I. NDI TESALỌNAIKA 1

1 Pọl na Silvanọs na Timọti nēdegara nzukọ nke ndi Tesalọnaika nime Chineke, bú Nna, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo.

2 Ayi nēkele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu nile, nēcheta unu mb͕e ayi nēkpe ekpere;

3 ebe ayi nēcheta nēwepughi aka ọlu nke okwukwe unu na ndọb͕u-n’ọlu nke ihunanya unu na ntachi-obi nke olile-anya unu ji ele anya Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, n’iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi;

4 ebe ayi matara, umu-nna-ayi ndi Chineke huru n’anya, i rọputa unu,

5 na ọ bughi nání n’okwu-ọnu ka ozi ọma ayi biaruru unu, kama ọ bia-kwa-ra n’ike, na nime Mọ Nsọ na ọtutu nkwezu; dika unu matara aha madu a huru na ayi bu n’ebe unu nọ n’ihi unu.

6 Unu onwe-unu ghọchikwara ndi nēṅomi ayi na Onye-nwe-ayi, ebe unu were ọṅù nke Mọ Nsọ nara okwu ahu nke-ọma nime ọtutu nkpab͕u;

7 ya mere unu ghọrọ ihe-atù n’ebe ha nile, nọ, bú ndi kwere ekwe nime Masedọnia na nime Akaia.

8 N’ihi na okwu nke Onye-nwe-ayi esiwo n’aru-unu daputa udà, ọ bughi nání na Masedọnia na Akaia, kama n’ebe nile ọ bula okwukwe-unu n’ebe Chineke nọ aputawo ìhè; ya mere ọ dighi ayi nkpà ikwu okwu ọ bula.

9 N’ihi na ha onwe-ha nākọ akukọ bayere ayi aha nbata ayi batara n’ebe unu nọ; ya na otú unu siri n’arusi chigharikute Chineke, ibu orù Chineke Nke di ndu Nke bu kwa onye-ezi-okwu,

10 na ichere Ọkpara-Ya Onye gēsi n’elu-igwe bia, Onye O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, bú Jisus, Onye nādọputa ayi n’iwe nke nābia.

Categories
I. NDI TESALỌNAIKA

I. NDI TESALỌNAIKA 2

1 N’ihi na unu onwe-unu matara, umu-nna-ayi, nbata ayi batara n’ebe unu nọ, na ahuwo na ọ bughi ihe-efu:

2 kama ọ bu ezie na ayi hururi ahuhu na mbu, eme kwa ayi ihe-ihere, dika unu matara, na Filipai, ma ayi kwuwara okwu nime Chineke-ayi igwa unu ozi ọma Chineke n’oké nb͕a.

3 N’ihi na aririọ ayi nāriọ unu esighi na njehie puta, o sighi kwa n’adighi-ọcha, ọ bughi kwa n’aghughọ:

4 kama dika Chineke nwaputaworo ayi ka enye ozi ọma Ya n’aka-ayi na ntukwasi-obi idebe, otú a ka ayi nēkwu; ọ bughi dika ndi nēme ihe gātọ madu utọ, kama dika ndi nēme ihe gātọ Chineke utọ, bú Onye nānwa obi-ayi.

5 N’ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ahuru ayi n’ikwu okwu nrafu, dika unu matara, ma-ọbu n’iwere aghughọ b͕achita anya-uku, Chineke bu onye-àmà;

6 ma-ọbu n’ichọ otuto site na madu, ma-ọbu n’aka-unu, ma-ọbu n’aka ndi ọzọ, mb͕e ayi puru idi ka ibu arọ́, dika ndi-ozi Kraist.

7 Kama ayi ghọrọ ndi di nwayọ n’etiti unu, dika mb͕e nwanyi nke nāzù nwa nēlezi umu nke aka ya anya nke-ọma:

8 otú a, ebe unu di ayi n’obi nke-uku, ọ diri ayi ezi nma ime ka unu keta, ọ bughi nání ozi ọma nke Chineke, kama ọ bu kwa nkpuru-obi nke aka ayi, n’ihi na emere ka unu buru ndi ayi huru n’anya.

9 N’ihi na unu nēcheta, umu-nna-ayi, ndọb͕u ayi nādọb͕u onwe-ayi n’ọlu na ihuju-anya-ayi: n’ihi na ayi nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu, ayi we kwusara unu ozi ọma nke Chineke.

10 Unu onwe-unu bu ndi-àmà, Chineke bu kwa onye-àmà, otú ahuru ayi na ayi bu ndi di ọcha n’obi na ndi ezi omume na ndi nādighi ita uta n’ebe unu nọ, bú ndi kwere ekwe:

11 ọbuná dika unu matara otú ayi mere madu nile ọ bula nime unu, dika nna si emere umu nke aka ya, nāriọ unu, nākasi kwa unu obi, nāgwasi kwa unu okwu ike,

12 ka unu we nējeghari dika ọ kwesiri Chineke, Onye nākpọbata unu n’ala-eze na ebube nke aka Ya.

13 Ọ bu kwa n’ihi nka ka ayi onwe-ayi nēkele kwa Chineke nēwepughi aka, na, mb͕e unu natara okwu nke unu nuru n’ọnu-ayi, bú okwu nke Chineke, ọ bughi okwu madu ka unu nara nke-ọma, kama, otú ọ di n’ezi-okwu, ọ bu okwu Chineke, nke nālusi kwa ọlu ike nime unu ndi kwere ekwe.

14 N’ihi na unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ghọrọ ndi nēṅomi nzukọ nile nke Chineke nke di na Judia nime Kraist Jisus: n’ihi na unu onwe-unu hu-kwa-ra otù ahuhu ahu n’aka ndi unu na ha bu otù ala, ọbuná dika ndi ahu huru ahuhu n’aka ndi-Ju;

15 ndi b͕uru Onye-nwe-ayi Jisus na ndi-amuma, chupu kwa ayi, ha bu kwa ndi ihe ha nēme nātọghi Chineke utọ, ha nēmegide kwa madu nile;

16 Na-eb͕ochi ayi igwa ndi mba ọzọ okwu ka ewe zọputa ha; imezu nmehie nile ha mb͕e nile: ma iwe Chineke abiakwasiwo ha rue ọgwugwu-ha.

17 Ma ayi onwe-ayi, umu-nna-ayi, ebe ekewapuru ayi n’aru-unu nwa oge ntà, n’iru, ọ bughi n’obi, ayi were oké agu nubiga ọku ókè n’obi kari ihu iru-unu:

18 n’ihi na ayi chọrọ ibiakute unu, mu onwem, bú Pọl, otù mb͕e na mb͕e ọzọ; Setan b͕ochikwara ayi.

19 N’ihi na gini bu olile-anya-ayi, ma-ọbu ọṅù-ayi, ma-ọbu okpu-eze nke inya-isi ayi? Ọ̀ bughi kwa unu onwe-unu, n’iru Onye-nwe-ayi Jisus n’ọbibia-Ya?

20 N’ihi na unu onwe-unu bu otuto-ayi na ọṅù-ayi.

Categories
I. NDI TESALỌNAIKA

I. NDI TESALỌNAIKA 3

1 N’ihi nka mb͕e ayi nāpughi inagide ọzọ, ọ di ayi ezi nma ka arapu nání ayi n’azu n’Atens;

2 ayi we ziga Timọti, nwa-nna-ayi na onye nējere Chineke ozi n’ozi ọma nke Kraist, ka o we me ka unu guzosie ike, ka o we kasi kwa unu obi n’ihi okwukwe-unu;

3 ka ewe ghara ikwaghari onye ọ bula nime nkpab͕u ndia; n’ihi na unu onwe-unu matara na ọ bu n’ihi nka ka edoro ayi.

4 N’ihi na n’ezie, mb͕e ayi nọ n’etiti unu, ayi buru uzọ nāgwa unu na agaje ikpab͕u ayi; ọbuná dika o mere, dika unu matakwara.

5 N’ihi nka mu onwem kwa, mb͕e m’nāpughi idi nānagide ya ọzọ, eziterem ka m’mara okwukwe-unu, ma o nwere uzọ ọ bula onye-ọnwunwa ahu nwarari unu, ndọb͕u ayi dọb͕uru onwe-ayi n’ọlu we ghọ ihe-efu.

6 Ma mb͕e Timọti siri n’ebe unu nọ biakute ayi ọbuná ub͕u a, we zìe ayi ozi ọma bayere okwukwe na ihunanya unu, si kwa na unu nēcheta ayi ezi ncheta mb͕e nile, na agu ihu ayi anya nāgusi kwa unu ike, ọbuná dika ọ nāgu kwa ayi onwe-ayi ihu unu;

7 n’ihi nka, umu-nna-ayi, akasiri ayi obi n’ihi unu nime nkpà-ayi nile na nkpab͕u-ayi nile site n’okwukwe-unu:

8 n’ihi na ayi di ndu ub͕u a, ọ buru na unu onwe-unu nēguzosi ike nime Onye-nwe-ayi.

9 N’ihi na ekele gini ka ayi puru inyeghachi Chineke bayere unu, n’ọṅù nile ayi ji ṅuria n’ihi unu n’iru Chineke-ayi;

10 abali na ehihie nāriọbiga aririọ ókè nke-uku ri nne ka ayi we hu iru-unu, dochi kwa ihe fọduru n’okwukwe-unu?

11 Ma ka Ya onwe-ya, bú Chineke-ayi na Nna-ayi, Onye-nwe-ayi Jisus, duzi uzọ-ayi rue ebe unu nọ:

12 ka Onye-nwe-ayi me kwa ka unu rie nne babiga kwa ókè n’ihunanya n’ebe ibe-unu nọ, na n’ebe madu nile nọ, ọbuná dika ayi onwe-ayi di n’ebe unu nọ;

13 ka O we me ka obi-unu guzosie ike nādighi ita uta n’idi-nsọ n’iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, n’ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus, Ya na ndi nsọ Ya nile.

Categories
I. NDI TESALỌNAIKA

I. NDI TESALỌNAIKA 4

1 Ya mere nke fọduru, umu-nna-ayi, ayi nēkpere unu, nāriọ kwa unu nime Onye-nwe-ayi Jisus, ka, dika unu natara n’aka-ayi otú unu nāghaghi ijeghari na ime ihe gātọ Chineke utọ, ọbuná dika unu nējeghari, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari.

2 N’ihi na unu matara iwu nile ayi nyere unu site n’aka Onye-nwe-ayi Jisus.

3 N’ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ, ka unu ghara ikwa iko;

4 ka onye ọ bula nime unu matara otú ọ gēnwe nwunye nke aka ya n’odido-nsọ na nsọpuru,

5 ọ bughi n’ọchichọ ọjọ nke agu ihe ọjọ, ọbuná dika ndi mba ọzọ ndi nāmataghi Chineke;

6 ka onye ọ bula ghara ighọb͕u na irib͕u nwa-nna-ya n’ihe a: n’ihi na Onye-nwe-ayi bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ bayere ihe ndia nile, dika ayi bu-kwa-ra uzọ gwa unu gwasi kwa unu ike.

7 N’ihi na Chineke akpọghi ayi ka ayi buru ndi nādighi ọcha, kama n’odido-nsọ.

8 Ya mere onye nāju, ọ bughi madu ka ọ nāju, kama ọ bu Chineke, Onye nēnye Mọ Nsọ Ya ka Ọ ba nime unu.

9 Ma ọ dighi unu nkpà ka madu degara unu akwukwọ bayere ihunanya n’ebe umu-nna-unu nọ: n’ihi na unu onwe-unu bu ndi Chineke zíworo ihurita ibe-unu n’anya;

10 n’ihi na unu nēme ya n’ezie n’ebe umu-nna-ayi nile ndi bi na Masedọnia dum nọ. Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari;

11 ka unu nējisi kwa ike inọdu nwayọ, na ime ihe nile nke aka unu, na iji aka-unu lu ọlu, dika ayi nyere unu iwu;

12 ka unu we nējeghari dika o kwesiri unu n’ebe ha nọ, bú ndi nọ n’èzí, ka ihe ọ bula ghara kwa ikpa unu.

13 Ma ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere ndi nāda n’ura ọnwu, umu-nna-ayi; ka o we ghara iwuta unu, ọbuná dika ọ nēwuta ndi fọduru, ndi nēnweghi olile-anya.

14 N’ihi na asi na ayi kwere na Jisus nwuru si kwa n’ọnwu bilie, otú a ndi emere ka ha da n’ura ọnwu site n’aka Jisus, ọ bu ndia ka Chineke gēkuru ka ha so Ya bia.

15 N’ihi na nka ka ayi nāgwa unu n’okwu Onye-nwe-ayi, na ayi onwe-ayi, bú ndi nọ na ndu, ndi anārapu rue ọbibia nke Onye-nwe-ayi, na ayi agaghi-eburu ndi dara n’ura onwu uzọ ma-ọli.

16 N’ihi na Onye-nwe-ayi onwe-ya gēwere oké ikpọ-òkù, were olu isi-mọ-ozi, were kwa opì nke Chineke, si n’elu-igwe ridata: ndi nwuru nime Kraist gēbu kwa uzọ si n’ọnwu bilie:

17 mb͕e ahu ayi onwe-ayi, bú ndi nọ na ndu, ndi anārapu, ayi na ha ka agēwelikọ n’igwe-oji, izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe: otú a ka ayi na Onye-nwe-ayi gānọ kwa mb͕e nile.

18 Ya mere werenu okwu ndia nākasirita ibe-unu obi.

Categories
I. NDI TESALỌNAIKA

I. NDI TESALỌNAIKA 5

1 Ma ọ dighi unu nkpà, umu-nna-ayi, ka edegara unu akwukwọ bayere oge ahu nile na ubọchi ahu nile.

2 N’ihi na unu onwe-unu matara nke-ọma na dika onye-ori nābia n’abali, otú a ka ubọchi nke Onye-nwe-ayi nābia.

3 Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.

4 Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, anọghi n’ọchichiri, ka ubọchi ahu we jide unu na mberede dika onye-ori:

5 n’ihi na unu onwe-unu nile bu umu nke ìhè, na umu nke ehihie: ayi abughi ndi nke abali, ma-ọbu nke ọchichiri;

6 ya mere otú a, ka ayi ghara iraru ura, dika ndi fọduru, kama ka ayi nēche nche nwe kwa anya-udo.

7 N’ihi na ndi nāraru ura nāraru ura n’abali; ndi nāṅubiga kwa manya ókè nāṅubiga n’abali.

8 Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi bu ndi nke ehihie, ka ayi nwe anya-udo, yikwasikwa ihe-agha ib͕ochi obi, bú okwukwe na ihunanya; ya na okpu-agha, bú ile-anya nzọputa.

9 N’ihi na Chineke edebeghi ayi inata iwe, kama inweta nzọputa site n’aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist,

10 Onye nwuru n’ihi ayi, ka ọ gābu, ma ayi nēche nche ma ayi nāraru ura, ka ayi we so Ya dikọ ndu.

11 N’ihi nka nākasiritanu ibe-unu obi, wulirita kwa ibe-unu elu dika ulo, dika unu nēme kwa.

12 Ma ayi nēkpere unu, umu-nna-ayi, ka unu mata ndi nādọb͕u onwe-ha n’ọlu n’etiti unu, ndi bu kwa ndi-isi-unu nime Onye-nwe-ayi, ndi nādu kwa unu ọdú;

13 ka unu were kwa ihunanya sọpuru ha gabiga ókè nke-uku ri nne n’ihi ọlu-ha. Birinu n’udo n’etiti onwe-unu.

14 Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, nādunu ndi nādighi-agazi ije ọdú, nakasinu ndi dara #mbà n’obi, nēyerenu ndi nādighi ike aka, nwenu ogologo-ntachi-obi n’ebe madu nile nọ.

15 Lenu ka onye ọ bula ghara inyeghachi onye ọ bula ihe ọjọ n’ọnọdu ihe ọjọ; kama nāb͕asonu ezi ihe mb͕e nile, n’ebe ibe-unu nọ, na n’ebe madu nile nọ.

16 Nāṅurinu ọṅu mb͕e nile;

17 nēkpenu ekpere nēwepughi aka;

18 nēkelenu ekele n’ihe nile ọ bula: n’ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ nime Kraist Jisus n’ebe unu nọ.

19 Unu emenyula Mọ Nsọ;

20 unu akpọla ibu-amuma ihe-efu;

21 nānwanu ihe nile; jidesienu ihe ọma ike;

22 unu etiyela aka n’aha ajọ ihe ọ bula.

23 Chineke nke udo, Ya Onwe-ya dozu kwa unu nsọ n’uzọ dum; ka edebezu kwa mọ-unu na nkpuru-obi-unu na aru-unu dum, nādighi ita uta n’ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

24 O kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye ahu nākpọ unu, Onye gēme kwa ya.

25 Umu-nna-ayi, nēkpenu ekpere bayere ayi.

26 Werenu isutu-ọnu di nsọ kele umu-nna-ayi nile.

27 Ewerem Onye-nwe-ayi b͕a unu iyi ka aguara umu-nna-ayi nile akwukwọ-ozi a.

28 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu.

Categories
II. NDI TESALỌNAIKA

II. NDI TESALỌNAIKA 1

1 Pọl na Silvanọs na Timọti nēdegara nzukọ nke ndi Tesalọnaika nime Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, akwukwọ:

2 Amara diri unu na udo nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.

3 Ayi ji ugwọ ikele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu, umu-nna-ayi, dika o kwesiri, n’ihi na okwukwe-unu nāba uba nke-uku, ihunanya ahu unu nile n’otù n’otù nāhurita ibe-unu nēri kwa nne;

4 ya mere ayi onwe-ayi nānya isi n’aru unu n’etiti nzukọ Chineke nile n’ihi ntachi-obi-unu na okwukwe-unu nime nsob͕u-unu nile na nime nkpab͕u nile unu nānagide;

5 nke bu ihe nēme ka ikpé ziri ezi nke Chineke puta ìhè; ka ewe gua unu na ndi kwesiri ala-eze Chineke, nke unu nāhu kwa ahuhu n’ihi ya:

6 asi na ọ bu ezie na o ziri ezi n’ebe Chineke nọ inyeghachi ndi nākpab͕u unu nkpab͕u,

7 na inyeghachi unu, bú ndi anākpab͕u, aru-efè, ayi na unu, nime nkpughe nke Onye-nwe-ayi Jisus site n’elu-igwe, Ya na ndi-mọ-ozi nke ike-Ya,

8 nime ọku nēre ere, nābọ̀ ọ́bọ̀ n’aru ndi nāmataghi Chineke, ha na ndi nāṅaghi nti ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus:

9 bú madu ndi gāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpe ziri ezi, bú nbibi ebighi-ebi nke sitere n’iru Onye-nwe-ayi, site kwa n’ebube nke ike-Ya,

10 mb͕e ọ bula Ọ gabia ka ewe nye Ya otuto nime ndi nsọ Ya, ka ibobo-Ya we nwu kwa ihe nile n’aru nime ndi kwereri ekwe (n’ihi na ekwere àmà ayi b͕ara unu) n’ubọchi ahu.

11 Ọ bu kwa nka ka ayi ji nēkpe kwa ekpere bayere unu mb͕e nile, ka Chineke-ayi we gua unu na ndi kwesiri ọkpukpọ akpọrọ unu, ka O were kwa ike mezu ihe nile ọ bula nke diri idi-nma ezi nma na ọlu nile ọ bula nke okwukwe;

12 ka ewe nye aha Onye-nwe-ayi Jisus otuto nime unu, nye kwa unu onwe-unu otuto nime Ya, dika amara nke Chineke-ayi na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist si di.

Categories
II. NDI TESALỌNAIKA

II. NDI TESALỌNAIKA 2

1 Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, n’ihi ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na nzukọ ayi gēzukọ n’ebe Ọ nọ;

2 ka ewe ghara isite n’aka mọ, ma-ọbu okwu, ma ọbu akwukwọ-ozi di ka o sitere n’aka-ayi, me ka unu me nkpatu pua n’uche-unu ọsọsọ, ma-ọbu ka unu tua ujọ, dika agāsi na ubọchi Onye-nwe-ayi di ub͕u a:

3 unu ekwela ka onye ọ bula ghọb͕ue unu n’uzọ ọ bula: n’ihi na ọ gaghi-adi, ma ọ buru na nwezuga ahu ebughi uzọ bia, ewe kpughe onye ahu nēmebi iwu, bú nwa nke ila-n’iyì,

4 onye nēmegide nēweli kwa onwe-ya elu imegide ihe nile anākpọ Chineke ma-ọbu nke bu ihe anāsọpuru dika Chineke; ya mere ọ nānọdu n’ulo nsọ nke Chineke, nēgosi onwe-ya si na ya bu Chineke.

5 Ùnu echetaghi, na, mb͕e m’nānọ n’etiti unu n’oge gara aga, ọ bu ihe ndia ka m’nāgwa unu?

6 Ub͕u a unu matakwara ihe nēb͕ochi, ka ewe kpughe ya n’oge nke aka ya.

7 N’ihi na ihe-omimi nke nmebi-iwu nālusi ọlu ike ub͕u a: nání rue mb͕e agēwepu onye ahu n’etiti, bú onye nēb͕ochi ub͕u a.

8 Mb͕e ahu ka agēkpughe kwa onye ahu nēmebi iwu, onye Onye-nwe-ayi Jisus gēwere iku-ume nke si n’ọnu-Ya puta b͕ue, were kwa ngosi nke ọbibia-Ya me ka ọ ghara idi irè;

9 bú onye ahu, nke ọbibia-ya di ka ilusi-ọlu-ike nke Setan n’ike nile ọ bula na ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube di iche iche nke ugha,

10 n’aghughọ nile kwa nke ajọ omume n’ebe ndi nāla n’iyì nọ; n’ihi na ha anaraghi ihu-n’anya nke ezi-okwu nke-ọma, ka ewe zọputa ha.

11 N’ihi nka Chineke nēzitekwara ha ilusi-ọlu-ike nke njehie, ka ha kwere ugha ahu:

12 ka ewe kpe ha nile ikpé, bú ndi nēkweghi ezi-okwu, kama ajọ omume diri ha ezi nma.

13 Ma ayi onwe-ayi ji ugwọ ikele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu, umu-nna-ayi ndi Onye-nwe-ayi huru n’anya, n’ihi na Chineke rọputara unu site na mbu ka unu we nwe nzọputa nime ido-nsọ nke Mọ Nsọ nēdo na ikwere ezi-okwu:

14 nke O sitere n’aka ozi ọma ayi kpọbata unu nime ya, ka unu we nweta ebube nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

15 Ya mere otú a, umu-nna-ayi, nēguzosinu ike, jidekwanu ozizí nile enyere n’aka idebe nke ezíri unu, ma-ọbu site n’okwu-ọnu-ayi, ma-ọbu site n’akwukwọ-ozi-ayi.

16 Ma ka Ya onwe-ya, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na Chineke, bú Nna-ayi, Onye huru ayi n’anya nye kwa ayi nkasi-obi ebighi-ebi na ezi olile-anya nime amara,

17 ka Ọ kasie obi-unu, me kwa ka ha guzosie ike n’ezi ọlu na ezi okwu nile ọ bula.

Categories
II. NDI TESALỌNAIKA

II. NDI TESALỌNAIKA 3

1 Nke fọduru, umu-nna-ayi, nēkpenu ekpere bayere ayi, ka okwu Onye-nwe-ayi we b͕a ọsọ, ka ewe nye kwa ya otuto, otú ọ di kwa n’etiti unu;

2 ka ewe dọputa kwa ayi n’aka ajọ madu ndi nēmehie kwa; n’ihi na ọ bughi madu nile nwere okwukwe.

3 Ma Onye-nwe-ayi bu onye kwesiri ntukwasi-obi, Onye gēme ka unu guzosie ike, che kwa unu ka unu ghara idabà n’aka ajọ onye ahu.

4 Ma ayi atukwasiwo obi n’aru unu nime Onye-nwe-ayi, na unu nēme, gēme kwa, ihe nile ayi nēme n’iwu.

5 Ma Onye-nwe-ayi duzie obi-unu bà n’ihunanya nke Chineke, bà kwa na ntachi-obi nke Kraist-ayi.

6 Ma ayi nēnye unu iwu, umu-nna-ayi, n’aha nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka unu nēze nwa-nna ọ bula nādighi-agazi ije, ọ dighi-eje kwa dika ozizí ahu enyere n’aka-ha idebe nke ha natara n’aka-ayi.

7 N’ihi na unu onwe-unu matara otú unu nāghaghi iṅomi ayi: n’ihi na ayi abughi ndi nādighi-agazi ije n’etiti unu;

8 ayi erighi kwa nri n’aka onye ọ bula n’efu, kama n’idọb͕u onye-ayi n’ọlu na ihuju-anya, nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu:

9 ọ bughi na ayi enweghi ike, ma ọ bu ka ayi we were onwe-ayi mere unu ihe-atù, ka unu we ṅomi ayi.

10 N’ihi na mb͕e ayi nọ n’etiti unu, ọ bu kwa nka ka ayi nēnye unu n’iwu, si, Ọ buru na onye ọ bula achọghi ilu ọlu, ya ghara kwa iri ihe.

11 N’ihi na ayi nuru okwu bayere ufọdu ndi nādighi-alu ọlu ọ bula, kama ha nētiye aka n’ọlu nke nābughi nke aka ha.

12 Ma ndi di otú a ka ayi nēnye iwu nāriọ kwa aririọ nime Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka ha were nwayọ nālu ọlu, ri kwa nri nke aka ha.

13 Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ike agwula unu n’obi n’ime ihe ọma.

14 Ma ọ buru na onye ọ bula aṅaghi nti okwu ayi ji akwukwọ-ozi a kwu, ribanu onye ahu ama, ka unu ghara iso ya mekọ ihe, ka ewe me ya ihe-ihere n’iru.

15 Unu agukwala ya n’onye-iro, kama nādunu ya ọdú dika nwa-nna.

16 Ma Ya onwe-ya, bú Onye-nwe udo, Ya nye unu udo mb͕e nile n’uzọ nile. Ka Onye-nwe-ayi nọyere unu.

17 Ekele nke mu Pọl nke m’ji aka nkem de, nke bu ihe-iriba-ama n’akwukwọ-ozi nile ọ bula: otú a ka m’nēde.

18 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu nile.

Categories
I. TIMỌTI

I. TIMỌTI 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus dika ihe ahu si di, nke Chineke, bú Onye-nzọputa-ayi, na Kraist Jisus, bú Onye ayi nēle anya Ya, nyere n’iwu;

2 anamedegara Timọti akwukwọ, bú ezi nwam n’okwukwe: Amara na ebere na udo diri gi nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.

3 Dika m’riọrọ gi ka i nọgide n’Efesọs, mb͕e m’gaje iga nime Masedọnia, ka i we nye madu ufọdu iwu ka ha ghara izí ihe di iche,

4 ka ha ghara kwa iṅa nti akukọ-ifò di iche iche na akukọ osuso-ọmumu di iche iche nādighi-agwu agwu, nke bu ihe nākpata ajuju, kari ikpata ọchichi-èzí-na-ulo nke Chineke nke di nime okwukwe: otú a ka m’nēme ub͕u a.

5 Ma ihe ezubere iweta n’iwu ahu bu ihu-n’anya sitere n’obi ọcha na ezi akọ-na-uche na okwukwe nke iru-abua nādighi ya:

6 nke madu ufọdu, ebe ha hiere ha, ha siri nime ha jehie we kwue okwu efu;

7 chọ kwa ibu ndi-ozizí nke iwu, ọ bu ezie na ha aghọtaghi ihe ha nēkwu, ha aghọtaghi kwa ihe ahu ha nēkwusi ike bayere ha.

8 Ma ayi matara na iwu ahu di nma, ma ọ buru na onye ọ bula ewere ya me ihe n’uzọ kwesiri iwu,

9 ebe ọ matara nka, na adighi-enye onye ezi omume iwu, kama anēnye ndi nēmebi iwu, ndi nēkweghi kwa idi n’okpuru iwu, nye ndi nāsọpurughi Chineke, ndi bu kwa ndi-nmehie, nye ndi nādighi ọcha n’obi, ndi emeru-kwa-ra emeru, nye ndi nēb͕u nna-ha na ndi nēb͕u nne-ha, nye ndi nēb͕u madu,

10 nye ndi nākwa iko, nye ndikom nēmeru onwe-ha n’aru ndikom, nye ndi nēzu madu n’ori, nye ndi-ugha, nye ndi nāṅu iyi ugha, ma ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di iche di nēmegide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu;

11 dika ozi ọma nke ebube nke Chineke di ngọzi si di, nke enyere mu onwem n’aka na ntukwasi-obi idebe.

12 Anamekele Onye ahu Nke merem ka m’di ike, bú Kraist Jisus Onye-nwe-ayi, n’ihi na Ọ gurum n’onye kwesiri ntukwasi-obi, ebe O deberem ijere Ya ozi;

13 ọ bu ezie na abum onye nēkwulu Chineke na mbu, buru kwa onye-nsob͕u, na onye nēme madu ihe-ihere: otú ọ di, O merem ebere, n’ihi na emerem ya nāmaghi ama nime ekweghi-ekwe;

14 ma amara nke Onye-nwe-ayi, ya na okwukwe na ihu-n’anya nke di nime Kraist Jisus, riri nne nke-uku.

15 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n’uzọ nile ọ bula, na Kraist Jisus biara n’uwa izọputa ndi-nmehie; ndi mu onwem bu onye-isi-ha:

16 otú ọ di, ọ bu n’ihi nka ka emerem ebere, ka o we buru nime mu onwem, bú onye-isi, ka Jisus Kraist gēgosi ogologo-ntachi-obi-Ya nile, ka m’buru ihe ilere anya n’etiti ndi gaje ikwere na Ya ka ha nata ndu ebighi-ebi.

17 Ma Eze nke mb͕e nile, Nke anāpughi imebi emebi, Nke anāpughi ihu anya, Onye nání Ya bu Chineke, nsọpuru na otuto diri Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

18 Iwu a ka m’nēnye n’aka-gi idebe, nwam Timọti, dika amuma nile si di nke eburu uzọ bu bayere gi, ka i we were ha bu agha ọma nka;

19 nēnwe okwukwe na ezi akọ-na-uche; nke ufọdu nupuru n’ebe ha nọ, ub͕ọ-ha we kpùe n’ebe okwukwe-ayi di:

20 ndi Haimeniọs na Aleksanda nọ n’etiti ha; ndi m’rara nye n’aka Setan, ka ewe site n’ahuhu zí ha ka ha ghara ikwulu Chineke.