Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 9

1 Ènweghi m onwem? àbughi m onye-ozi? àhughm Jisus Onye-nwe-ayi? ùnu onwe-unu abughi ọlum nime Onye-nwe-ayi?

2 Ọ buru na abughm onye-ozi n’ebe ndi ọzọ nọ, ma otú ọ di, abum onye-ozi n’ebe unu nọ: n’ihi na akàrà nke ọlu onye-ozi nkem ka unu onwe-unu bu nime Onye-nwe-ayi.

3 Ngọpum n’iru ndi nēkpem ikpé bu nka.

4 Ọ̀ gābu na ayi enweghi ike iri ihe na iṅu ihe?

5 Ọ̀ gābu na ayi enweghi ike ikuru nwunye, bú nwa-nna-nwanyi nime Kraist, jeghari, dika ndi-ozi fọduru nēme kwa, ha na umu-nne Onye-nwe-ayi, na Kifas?

6 Ma-ọbu nání mu onwem na Banabas, àyi enweghi ike ighara ilu ọlu?

7 Òle onye-agha nēwere ego-ọlu nke aka ya lua ọlu onye-agha mb͕e ọ bula? ònye nāku ubi-vine, nādighi-eri kwa nkpuru-ya? ma-ọbu ònye nāzù ìgwè aturu, nādighi-eri kwa ihe putara na miri-ara ìgwè aturu ahu?

8 Ọ̀ gabu na anamekwu ihe ndia dika madu si ekwu? ma-ọbu ìwu Chineke adighi-ekwu kwa ihe ndia?

9 N’ihi na edewo ya n’iwu Moses, si, Ekechila ọnu ehi mb͕e ọ nāzọcha ọka. Ọ̀ gābu na ehi bu ihe nēmetu Chineke n’obi?

10 ma-ọbu Ò nēkwu ya n’ihi ayi onwe-ayi? E, n’ihi ayi ka edere ya n’akwukwọ nsọ: n’ihi na onye nālu ọlu ubi kwesiri ilu ọlu ubi n’olile-anya, onye nāzọcha ọka kwesiri kwa izọcha n’olile-anya na ọ gēketa.

11 Ọ buru na ayi onwe-ayi ghara ihe nke Mọ Nsọ dika nkpuru nye unu, ọ̀ bu ihe uku ma ọ buru na ayi onwe-ayi gēwere ihe nke anu-aru unu dika ihe-ubi?

12 Ọ buru na ndi ọzọ eketa ike a n’ebe unu nọ, àyi onwe-ayi adighi-eketa kari? Otú ọ di, ayi ejighi ike a nara ihe; kama ayi nānagide ihe nile, ka ayi we ghara ib͕ochi ozi ọma Kraist n’uzọ ọ bula.

13 Ùnu amataghi na ndi nālu ọlu n’ulo uku Chineke nēri ihe si n’ulo uku Chineke puta, na ndi nānọ kwa n’iru ebe-ichu-àjà nēso ebe ichu-àjà ahu nēkekọ ihe?

14 Ọbuná otú a ka Onye-nwe-ayi kara àkà ka ndi nēkwusa ozi ọma Ya si n’ozi ọma ahu di ndu.

15 Ma mu onwem, ejighm ihe ọ bula n’ihe ndia nara ihe: edeghi m kwa ihe ndia n’akwukwọ ka ewe me otú a n’ebe m’nọ: n’ihi na ọ kam nma ka m’nwua, kari ka onye ọ bula me ka ihe-inya-isim buru ihe-efu.

16 N’ihi na asi na anam-ezisa ozi ọma, enweghi m ihe inya isi; n’ihi na nkpà nākpam; n’ihi na ahuhu dirim, asi na ezisaghi m ozi ọma.

17 N’ihi na asi na emem ihe a ebe m’nāchọ ime ya, enwerem ugwọ-ọlu: ma ọ buru na emem ya mb͕e m’nāchọghi ime ya, ewerewo ntukwasi-obi nye ọchichi-èzí-na-ulo n’akam.

18 Gini kwa bu ugwọ-ọlum? Mb͕e m’nēzisa ozi ọma, ka m’we me ka ozi ọma ahu buru ihe ego nādighi nime ya, ka m’ghara ijizu ike nkem inara ihe n’ozi ọma ahu.

19 N’ihi na ọ bu ezie na enwerem onwem n’ebe madu nile nọ, ma emerem onwem ka m’buru orù madu nile, ka m’we rita ọtutu madu n’urù kari.

20 N’ebe ndi-Ju nọ m’we di ka onye-Ju, ka m’we rita ndi-Ju n’urù; n’ebe ndi nọ n’okpuru iwu di m’we di ka onye nọ n’okpuru iwu, ọ bughi na mu onwem nọ n’okpuru iwu, ka m’we rita ndi nọ n’okpuru iwu n’urù;

21 n’ebe ndi nēnweghi iwu nọ m’we di ka onye nēnweghi iwu, ọ bughi na enweghm iwu n’ebe Chineke nọ, kama anọm n’okpuru iwu n’ebe Kraist nọ, ka m’we rita ndi nēnweghi iwu n’urù.

22 N’ebe ndi nādighi ike nọ m’ghọrọ onye nādighi ike, ka m’we rita ndi nādighi ike n’urù: aghọwom ihe nile n’ebe madu nile nọ, ka m’we si n’uzọ ọ bula zọputa ufọdu.

23 Ma anameme ihe nile n’ihi ozi ọma, ka m’we ghọ onye nēnwekọ ya.

24 Ùnu amataghi na ndi nāb͕a ọsọ n’ebe ọsọ, ha nile nāb͕a ọsọ, ma ọ bu otù onye nāb͕ata ihe ọsọ? Nāb͕anu otú a, ka unu we b͕ata.

25 Madu ọ bula nke nāb͕asi nb͕a ike ika ibe-ya n’egwú-unu nējide kwa onwe-ya n’ihe nile. Ya mere, ndi ahu nēme ya inata okpu-nmeri nke puru ire uré; ma ayi onwe-ayi nēme ya inata okpu-nmeri nke nāpughi ire uré.

26 Ya mere mu onwem nāb͕a ọsọ otú a, dika onye nādighi-ab͕a nēleghi anya ihe; otú a ka m’nēsu ọkpọ, dika onye nādighi-apia ifufe:

27 ma anametiputa arum ọnyá, me kwa ya ka ọ buru orùm: ka mu onwem ghara ighọ onye ajuru aju n’uzọ ọ bula, mb͕e m’kwusasiri okwu Chineke nye ndi ọzọ.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 10

1 N’ihi na achọghm, umu-nnam, ka unu ghara imara, na nna-ayi-hà nile nọri n’okpuru igwe-oji ahu, ha nile gabiga-kwa-ra oké osimiri ahu;

2 eme-kwa-ra ha nile baptism ibà nime Moses nime igwe-oji ahu na nime oké osimiri ahu;

3 ha nile ri-kwa-ra otù ihe-oriri ahu nke mọ;

4 ha nile ṅu-kwa-ra otù ihe-ọṅuṅu ahu nke mọ: n’ihi na ha nāṅu miri nke si na nkume nke mọ nke soro ha: nkume ahu bu kwa Kraist.

5 Ma ihe ndi kari n’etiti ha adighi Chineke ezi nma: n’ihi ya akwaturu ha n’ọhia.

6 Ma ihe ndia ghọrọ ihe-atù nye ayi, ka ayi we ghara ibu ndi agu ihe ọjọ nāgu, dika agu ihe ọjọ gu-kwa-ra ndi ahu.

7 Unu aghọ-kwa-la ndi nēkpere arusi, dika ufọdu n’etiti ha ghọrọ; dika edeworo ya n’akwukwọ nsọ, si, Ndi Israel nọduru ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú.

8 Ka ayi ghara kwa ikwa iko, dika ufọdu n’etiti ha kwara, we da nwua n’otù ubọchi, ọgu nnù madu abua na nnù iri na asa na ọgu iri.

9 Ka ayi ghara kwa inwa Onye-nwe-ayi, dika ufọdu n’etiti ha nwara, agwọ we la ha n’iyì.

10 Unu atamu-kwa-la, dika ufọdu n’etiti ha tamuru, onye-nbibi ahu we la ha n’iyì.

11 Ma ihe ndia nēmeri ndi ahu n’uzọ ihe-atù; ewe de ha n’akwukwọ nsọ ka ha we buru ihe idu ayi ọdú, ndi ọgwugwu oge ndia ruteworo.

12 Ya mere, onye nēchè na o nēguzo, ya lezi anya ka ọ ghara ida.

13 Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n’oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya.

14 N’ihi nka, ndi m’huru n’anya, b͕anarinu ikpere-arusi.

15 Anamekwu dika anamagwa ndi nwere uche; unu onwe-unu tule ihe m’nēkwu.

16 Iko nke ngọzi ahu nke ayi nāgọzi, ọ̀ bughi nnwekọ ọbara Kraist? Achicha ahu nke ayi nānyawa, ọ̀ bughi nnwekọ aru Kraist?

17 n’ihi na otù achicha di, ayi, ọ bu ezie na ayi di ọtutu, ma ayi bu otù aru: n’ihi na ayi nile nēketa òkè n’otù achicha ahu.

18 Lenu Israel dika anu-aru si di: ndi nēri àjà, hà na ebe-ichu-aja adighi-enwekọ?

19 Gini kwa ka m’nēkwu? nà ihe achuru n’aja nye arusi bu ihe ọ bula, ma-ọbu na arusi bu ihe ọ bula?

20 Kama okwu m’nēkwu bu, na ihe ndi mba ọzọ nāchu n’àjà, ha nāchuru ndi-mọ ọjọ, ọ bughi kwa Chineke ka ha nāchuru: ma achọghi m ka unu ghọ ndi unu na ndi-mọ ọjọ nēnwekọ.

21 Unu apughi iṅu iko Onye-nwe-ayi na iko ndi-mọ ọjọ: unu apughi iketa table Onye-nwe-ayi na table ndi-mọ ọjọ.

22 Ma-ọbu àyi nākpasu Onye-nwe-ayi ekworo? àyi ka Ya ike?

23 Ihe nile ziri ezi n’iwu; ma ọ bughi ihe nile bara urù. Ihe nile ziri ezi n’iwu; ma ọ bughi ihe nile nēwuli madu elu dika ulo.

24 Ka onye ọ bula ghara ichọ ọdi-nma nke aka ya, kama ọdi-nma nke madu-ibe-ya.

25 Ihe nile ọ bula anēre n’ahia anu, rienu ya, ghara iju ajuju n’ihi akọ-na-uche;

26 n’ihi na uwa bu nke Onye-nwe-ayi, na ùjú-ya.

27 Ọ buru na onye ọ bula n’etiti ndi nēkweghi akpọ unu n’oriri, ọ buru kwa na unu achọ ije; ihe ọ bula anēdebe n’iru unu, rienu ya, ghara iju ajuju n’ihi akọ-na-uche.

28 Ma ọ buru na onye ọ bula asi unu, Achuru ihe a n’àjà, unu erila, n’ihi onye ahu nke gosiri ya, na n’ihi akọ-na-uche:

29 akọ-na-uche, ka m’kwuru, ọ bughi nke aka gi, kama akọ-na-uche nke madu-ibe-gi; n’ihi na gini mere akọ-na-uche ọzọ nēkpe inwe-onwem ikpé?

30 Ọ buru na mu onwem ji ekele keta, gini mere anēkwulum n’ihi ihe ahu nke mu onwem nēkelere ekele?

31 Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto.

32 Unu aghọla ndi nēme ndi-Ju, ma-ọbu ndi-Grik, ma-ọbu nzukọ Chineke, ka ha su ngọngọ:

33 dika mu onwem nēme kwa ihe nātọ madu nile n’ihe nile, nāchọghi urù nke akam, kama urù nke madu nile, ka ewe zọputa ha.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 11

1 Ghọnu ndi nēṅomim, dika mu onwem bu kwa onye nēṅomi Kraist.

2 Ma anamaja unu na unu nēchetam n’ihe nile, jisi kwa ozizí ahu enyere n’aka-unu idebe ike, dika m’nyere ha n’aka-unu idebe.

3 Ma anamachọ ka unu mata na Kraist bu isi nke nwoke ọ bula; nwoke bu kwa isi nke nwanyi; Chineke bu kwa isi nke Kraist.

4 Nwoke ọ bula, mb͕e ọ nēkpe ekpere ma-ọbu mb͕e ọ nēbu amuma, ọ buru na o kpu ihe-nkpudo n’isi-ya, ọ nēme ka ihere me isi-ya.

5 Ma nwanyi ọ bula, mb͕e ọ dighi-ekpudo ihe n’isi-ya n’ikpe ekpere ma-ọbu n’ibu amuma, ọ nēme ka ihere me isi-ya: n’ihi na ya na nwanyi nke akọpuworo isi-ya bu otù ihe ahu.

6 N’ihi na asi na nwanyi ekpudoghi onwe-ya ihe n’isi, ka akpacha kwa agiri-isi-ya: ma asi na ọ buru nwanyi ihe-ihere ka akpacha agiri-isi-ya ma-ọbu ka akọpu isi-ya, ka ekpudo ya ihe n’isi.

7 N’ihi na nwoke ekwesighi n’ezie ka ekpudo ya ihe n’isi, ebe ọ bu onyinyo na otuto nke Chineke: ma nwanyi bu otuto nke nwoke.

8 N’ihi na nwoke esighi na nwanyi puta; kama nwanyi siri na nwoke puta:

9 n’ihi na ekèghi kwa nwoke n’ihi nwanyi; kama ekère nwanyi n’ihi nwoke:

10 n’ihi nka ka nwanyi kwesiri ikpu ihe-iriba-ama nke ike n’isi-ya, n’ihi ndi-mọ-ozi.

11 Otú ọ di, nwanyi adighi ma nwoke anọghi ya, nwoke adighi kwa ma nwanyi anọghi ya, nime Onye-nwe-ayi.

12 N’ihi na dika nwanyi siri na nwoke puta, otú a ka nwoke site-kwa-ra n’aka nwanyi; ma ihe nile si na Chineke puta.

13 Tulenu nime onwe-unu: ọ̀ kwesiri ka nwanyi kpere Chineke ma ekpudoghi ya ihe n’isi?

14 Ọbuná uzọ ekère madu, yà onwe-ya adighi-ezí unu, na, asi na nwoke nwere ogologo agiri-isi, na ọ buru ya ihe-ihere?

15 Ma ọ buru na nwanyi nwere ogologo agiri-isi, ọ buru ya ihe otuto: n’ihi na enyewo ya agiri-isi-ya n’ọnọdu ihe ib͕okwasi n’aru.

16 Ma ọ buru na unu nēchè na onye ọ bula bu onye nēse okwu, ayi onwe-ayi, ma-ọbu nzukọ Chineke, enweghi ọme-n’ala di otú a.

17 Ma n’inye unu iwu a, etoghm unu, na unu adighi-abiakọ n’otù ebe ka unu we dikari nma, kama ka unu we jọkari njọ.

18 N’ihi na ihe mbu, mb͕e unu biakọrọ na nzukọ, anurum na nkewa di iche iche nādi n’etiti unu; ekwe-kwa-ram ya ufọdu.

19 N’ihi na irọ-òtù di iche iche aghaghi idi kwa n’etiti unu, ka ndi anwaputaworo we ghọ ndi putara ìhè n’etiti unu.

20 Ya mere mb͕e unu biakọrọ n’otù ebe, ọ bughi iri nri-anyasi nke Onye-nwe-ayi:

21 n’ihi na madu nile n’otù n’otù, mb͕e unu nēri, nēburu ndi ọzọ uzọ rie nri-anyasi nke aka ha; agu we nāgu otù onye, onye ọzọ nāṅubiga kwa manya ókè.

22 Ọ̀ gābu na unu enweghi nọ̄ ulo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu nime ha? ma-ọbu ùnu nēlelì nzukọ Chineke, me kwa ndi nēnweghi ihe ka ihere me ha? Ọ̀ bu gini ka m’gāsi unu? #m’gēto unu? Etoghi m unu na nka.

23 N’ihi na mu onwem natara n’aka Onye-nwe-ayi ihe m’nye-kwa-ra unu n’aka idebe, na Onye-nwe-ayi Jisus n’abali ahu nke arara Ya nye n’aka madu, Ọ nara ob͕e achicha,

24 kele kwa, we nyawa ha, si, Nka bu arum, nke anēnye n’ihi unu: nēmenu nka ka unu we nēchetam.

25 Mb͕e ha risiri nri-anyasi, Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram: nēmenu nka, mb͕e ọ bula unu gāṅu ya, ka unu we nēchetam.

26 N’ihi na mb͕e ọ bula unu nēri achicha nka, nāṅu kwa iko ahu, unu nēkwusa ọnwu Onye-nwe-ayi rue mb͕e Ọ gābia.

27 Ya mere onye ọ bula nke gēri achicha ahu ma-ọbu ṅu iko ahu nke Onye-nwe-ayi mb͕e ọ nēkwesighi, ikpé aru na ọbara nke Onye-nwe-ayi gāma ya.

28 Ma ka madu nwaputa onwe-ya, otú a ka o ri kwa nime achicha ahu, ṅu kwa nime iko ahu.

29 N’ihi na onye nēri nāṅu kwa, ọ nēri nāṅu kwa ikpé nye onwe-ya, ma ọ buru na ọ tuleghi aru ahu.

30 N’ihi nka ọtutu madu n’etiti unu adighi ike nāria kwa nriaria, ndi dawo-kwa-ra n’ura nke ọnwu abughi madu ole-na-ole.

31 Ma ọ buru na ayi atule onwe-ayi, agaghi-ekpe ayi ikpé.

32 Ma mb͕e anēkpe ayi ikpé, Onye-nwe-ayi nēzí ayi ihe, site n’inye ayi ahuhu, ka ewe ghara imakọ ayi na uwa ikpé.

33 Ya mere, umu-nnam, mb͕e unu biakọrọ n’otù ebe iri ihe, cherenu ibe-unu.

34 Ọ buru na agu nāgu onye ọ bula, ya rie ihe n’ulo-ya; ka unu ghara ibiakọ n’uzọ gēweta ikpé. Ihe nile fọduru ka m’gēdozi mb͕e ọ bula m’gābia.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 12

1 Ma okwu bayere onyinye nke Mọ Nsọ, umu-nnam, achọghi m ka unu ghara imara.

2 Unu matara na mb͕e unu buri ndi mba ọzọ, anēdufu unu iso arusi ahu dara ob͕i, n’uzọ ọ bula anēdu unu.

3 N’ihi nka emem ka unu mara na ọ dighi onye ọ bula nke nēkwu okwu nime Mọ nke Chineke nāsi, Jisus bu anathema; ọ dighi kwa onye ọ bula puru isi, Jisus bu Onye-nwe-ayi, ma-ọbughi nime Mọ Nsọ.

4 Ma òkìkè nke onyinye-amara di, ma ọ bu otù Mọ Nsọ ahu.

5 Òkìkè nke ije-ozi di kwa, otù Onye-nwe-ayi ahu di kwa.

6 Òkìkè ihe alutaworo n’ọlu di kwa, ma ọ bu otù Chineke ahu, Onye nālusi ihe nile ike nime ayi nile.

7 Ma anēnye madu nile n’otù n’otù n’etiti ayi ngosi nke Mọ Nsọ ka o we ba urù.

8 N’ihi na anēsite n’aka Mọ Nsọ nye otù onye okwu amam-ihe; anēnye kwa onye ọzọ okwu ọmuma, di ka Mọ ahu nāchọ:

9 nye kwa ibe-ya okwukwe, nime otù Mọ ahu; nye kwa onye ọzọ onyinye-amara nile ime ka aru madu di ike, nime otù Mọ nka;

10 nye kwa onye ọzọ nluputa nke ọlu di ike; nye kwa onye ọzọ obubu-amuma; nye kwa onye ọzọ itule mọ di iche iche; nye kwa ibe-ya aha asusu di iche iche; nye kwa onye ọzọ isughari asusu:

11 ma ihe ndia nile ka otù Mọ ahu nālusi ike, nání Ya, nēkère madu nile n’otù n’otù, ebe onye ọ bula nọ O kère ya dika Ọ nāchọ.

12 N’ihí na dika aru-ayi bu otù, nwe kwa ọtutu ihe di ya nime, ma ihe nile nke di n’aru, ọ bu ezie na ha di ọtutu, ma ha bu otù aru; otú a ka Kraist di kwa.

13 N’ihi na nime otù Mọ Nsọ ka emere ayi onwe-ayi nile baptism ibà n’otù aru, ma ayi bu ndi-Ju ma-ọbu ndi-Grik, ma ayi bu ndi-orù ma-ọbu ndi nwere onwe-ha; eme-kwa-ra ka ayi nile ṅua nime otù Mọ Nsọ.

14 N’ihi na aru-ayi abughi nání otù ihe nke di ya nime, kama ọ bu ọtutu ihe.

15 Ọ buru na ukwu gāsi, N’ihi na abughi m aka, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n’ihi nka.

16 Ọ buru kwa na nti gāsi, N’ihi na abughi m anya, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n’ihi nka.

17 Ọ buru na aru dum bu anya, òle ebe ka ihe-ọnunu di? Ọ buru na aru dum bu ihe-ọnunu, òle ebe ka ihe inu isìsì di?

18 Ma otú ọ di, Chineke debere ihe di n’aru, ha nile n’otù n’otù, nime aru, dika Ọ chọrọ.

19 Ma asi na ha nile bu otù ihe di n’aru, òle ebe ka aru di?

20 Ma otú ọ di, ha di ọtutu ihe di n’aru, ma ha bu otù aru.

21 Ọzọ, anya apughi isi aka, Nkpà gi akpaghi m: ọzọ kwa, isi apughi isi ukwu, Nkpà unu akpaghm.

22 Kama ọ bu ihe ahu di n’aru nke anēchè na ha adighi ike kari bu ihe di nkpà kari nke-uku:

23 akuku ahu nke aru, nke ayi nēchè na adighi-asọpuru ha dika akuku ọzọ, akuku ndia ka ayi nēnyebiga kwa nsọpuru ókè kari; akuku aru nke ayi nke nādighi kwa nma n’anya bu nke mabigara ókè kari;

24 ma nkpà akpaghi akuku aru nke ayi nke mara nma: kama Chineke tigwara aru n’otù, akuku aru ahu nke nsọpuru fọduru ya inwe ka Ọ nēnyebiga nsọpuru ókè kari;

25 ka nkewa we ghara idi n’aru; kama ka ihe di n’aru we nēcheb͕u onwe-ha nye ibe-ha n’otù uzọ ahu.

26 Ọ buru kwa na otù ihe nke di n’aru nāhu ahuhu, ihe nile di n’aru ahu soro ya nāhukọ ahuhu; ọ buru kwa na anēnye otù ihe di n’aru otuto, ihe nile di n’aru ahu soro ya ṅurikọ ọṅu.

27 Ma unu onwe-unu bu aru nke Kraist, buru kwa ihe di n’aru, onye ọ bula n’akuku nke ya.

28 Chineke debe-kwa-ra ufọdu nime nzukọ-Ya, nke-mbu ndi-ozi, nke-abua ndi-amuma, nke-atọ ndi-ozizí, nke so ha ọlu di ike, nke so ha onyinye-amara di iche iche ime ka aru madu di ike, iye-aka, ichi-isi, aha asusu di iche iche.

29 Ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-ozi? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-amuma? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-ozizí? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi nālu ọlu di ike?

30 ọ̀ gābu na ha nile nwere onyinye-amara ime ka madu di ike? ọ̀ gābu na ha nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu? ọ̀ gābu na ha nile nāsughari asusu?

31 Ma werenu obi nānu ọku chọ onyinye-amara ndia nke kari uku. Tukwasi ihe ndia anamegosi kwa unu uzọ nke kachasi nma.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 13

1 Asi na ejim asusu di iche iche nke madu na nke ndi-mọ-ozi nēkwu okwu, ma enweghi m ihu-n’anya, aghọwom ọla nāra ara, ma-ọbu ájà ọla nāda udà.

2 Asi kwa na enwerem onyinye ibu-amuma, mata kwa ihe-omimi nile na ihe-ọmuma nile; asi kwa na enwerem okwukwe nile, nke mere m’gēnwe ike ibubiga ugwu, ma enweghi m ihu-n’anya, abughm ihe ọ bula.

3 Asi kwa na ewerem ihe nile m’nwere zùa ndi-ob͕eye, asi kwa na araram arum nye ka ewe rem ọku, ma enweghm ihu-n’anya, ọ baghm urù ọ bula.

4 Ihu-n’anya nwere ogologo-ntachi-obi, o nwe-kwa-ra obi-ọma; ihu-n’anya adighi-ekwo ekworo; ihu-n’anya adighi-anya isi, ọ dighi-afuli onwe-ya elu,

5 ọ dighi-eme ihe nādighi nma n’anya, ọ dighi-achọ ihe nke aka ya, oké iwe adighi-ewe ya, ọ dighi-agu ihe ọjọ emere ya;

6 ọ dighi-aṅuri ọṅu nime ajọ omume, ma ọ nēso ezi-okwu ṅurikọ ọṅu;

7 ọ nānagide ihe nile, nēkwere ihe nile, nēle anya ihe nile, nēnwe ntachi-obi n’ihe nile.

8 Ihu-n’anya adighi-ada mb͕e ọ bula: ma ọ buru na ibu-amuma di, agēme ka ha ghara idi irè; ọ buru kwa na asusu di iche iche di, ha gāgwu; ọ buru kwa na ihe-ọmuma di, agēme ka ọ ghara idi irè.

9 N’ihi na ayi mara na nkpirikpi, ayi nēbu kwa amuma na nkpirikpi:

10 ma mb͕e ọ bula ihe nke zuru okè gābia, agēme ihe, nke di na nkpirikpi ka ọ ghara idi irè.

11 Mb͕e m’buri nwa ọhu, anamekwu dika nwa ọhu, anamatukwasi uche n’ihe dika nwa ọhu, anamagu ihe dika nwa ọhu: ub͕u a mb͕e m’ghọworo okenye, emewom ka omume nwa ọhu ghara idi irè.

12 N’ihi na ub͕u a ayi ji enyo hu ihe, nime ilu; ma mb͕e ahu ayi gāhu iru na iru: ub͕u a m’mara na nkpirikpi; ma mb͕e ahu m’gāmazu dika amazu-kwa-ram.

13 Ma ub͕u a ka okwukwe, olile-anya, ihu-n’anya, ihe atọ ndia, nānọgide; ma nke kachasi n’ihe ndia bu ihu-n’anya.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 14

1 Nāb͕asonu ihu-n’anya; otú ọ di, werenu obi nānu ọku chọ onyinye-amara nile nke Mọ Nsọ, ma nāchọkarinu ka unu bū amuma.

2 N’ihi na onye ji asusu di iche nēkwu okwu, ọ dighi-agwa madu okwu, kama ọ nāgwa Chineke; n’ihi na ọ dighi onye ọ bula nānu ihe ọ nēkwu; ma o ji mọ-ya nēkwu ihe-omimi.

3 Ma onye nēbu amuma nāgwa madu okwu nke iwuli-elu dika ulo, na nke nkasi-obi, na nke ngugu-obi.

4 Onye ji asusu di iche nēkwu okwu nēwuli onwe-ya elu dika ulo; ma onye nēbu amuma nēwuli nzukọ Kraist elu dika ulo.

5 Otú ọ di, anamachọ ka unu nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma achọkaririm ka unu nēbu amuma: onye nēbu amuma ka kwa onye ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma-ọbughi na ọ nāsughari ya, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo.

6 Ma otú ọ di, umu-nnam, asi na agamabiakute unu were asusu di iche iche nēkwu okwu, ùrù gini ka m’gābara unu, asi na agwaghi m unu okwu n’uzọ nkpughe, ma-ọbu n’uzọ ihe-ọmuma, ma-ọbu n’uzọ ibu-amuma, ma-ọbu n’uzọ ozizí?

7 Ọbuná ihe nējighi ndu, mb͕e olu-ha nāda udà, ma ọ bu ọ̀jà ma-ọbu ubọ-akwara, ọ buru na ọ dighi ihe di iche n’olu-ha, àgēsi aṅa mara ihe anāfù ma-ọbu nke anākpọ?

8 N’ihi na asi kwa na opì nāda nke anāmaghi isi-ya, ònye gākwadebe onwe-ya ije agha?

9 Otú a unu onwe-unu kwa, ma ọ buru na unu ejighi ire kwu okwu di nfe ighota, àgēsi aṅa mara ihe anēkwu? n’ihi na unu ganēkwu okwu nye ifufe.

10 Agāsi na ọtutu aha olu di iche iche di n’uwa, ọ dighi kwa ihe ọ bula nke nēnweghi olu.

11 Ya mere asi na amataghm isi olu ahu, m’gābu onye nāsu asusu ọzọ n’anya onye ahu nēkwu okwu, onye ahu nēkwu okwu gābu kwa onye nāsu asusu ọzọ n’anyam.

12 Otú a unu onwe-unu kwa, ebe unu bu ndi nēwere obi nānu ọku chọ onyinye nile nke Mọ Nsọ, nāchọnu ka unu we babiga ókè nime ha, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo.

13 N’ihi nka onye ji asusu di iche nēkwu okwu, ya kpere Chineke ka o we sugharia.

14 N’ihi na asi na ejim asusu di iche nēkpe ekpere, mọm nēkpe ekpere, ma uchem amighi nkpuru.

15 Ọ̀ bu gini kwa? m’gēji mọm kpe ekpere, ma m’gēji kwa uchem kpe ekpere: m’gēji mọm bù abù ọma, ma m’gēji kwa uchem bù abù ọma.

16 Ma emeghi otú a, onye nọ n’ọnọdu onye nāmutaghi akwukwọ gēsi aṅa si Amen ahu mb͕e i nēkele ekele, ma ọ buru na i ji mọ-gi nāgọzi, ebe ọ nāmataghi ihe ọ bula i nēkwu?

17 N’ihi na ọ bu ezie na gi onwe-gi nēkele nke-ọma, ma ewulighi ibe-gi elu dika ulo.

18 Ekelem Chineke, na ejim asusu di iche iche nēkwu okwu kari unu nile:

19 otú ọ di, nime nzukọ Kraist anamachọ ka m’ji uchem kwu nkpuru okwu ise, ka m’were okwu-ọnum zí kwa ndi ọzọ ihe, kari ikwu orú nnù okwu na nnù ise n’asusu di iche.

20 Umu-nnam, unu abula umu-ntakiri n’uche-unu: kama burunu umu ọhu n’obi ọjọ, ma n’uche-unu burunu ndi tozuru okè.

21 Nime iwu Chineke ka edeworo ya, si, M’gēji madu ndi nāsu asusu di iche, ji kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi di iche, gwa ndi nka okwu; ma ọbuná otú a ha agaghi-anu olum, ka Onye-nwe-ayi kwuru.

22 Ya mere asusu di iche iche ndia, emere ka ha buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi kwere ekwe, kama nye ndi nēkweghi ekwe: ma emere ibu-amuma ka ọ buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi nēkweghi ekwe, kama nye ndi kwere ekwe.

23 Ya mere asi na nzukọ Kraist dum biakọrọ n’otù ebe, asi kwa na ha nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma ọ buru na ndi nāmutaghi akwukwọ ma-ọbu ndi nēkweghi ekwe gābata, hà agaghi-asi na anya adighi unu nma?

24 Ma asi na ha nile ebu amuma, ma ọ buru na onye nēkweghi ekwe ma-ọbu onye nāmutaghi akwukwọ gābata, ha nile nātu ya nmehie-ya n’anya, ha nile nēkpe kwa ya ikpé;

25 ihe-nzuzo nile nke obi-ya aputa ìhè; ọ gēsi otú a da kpuchie iru-ya n’ala kpọ kwa isi ala nye Chineke, nēkwuputa na ọ bu ezie na Chineke nọ n’etiti unu.

26 Ọ̀ bu gini kwa, umu-nnam? mb͕e ọ bula unu biakọrọ n’otù ebe, unu nile n’otù n’otù ji abù ọma, ji ihe-ozizí, ji ihe-nkpughe, ji asusu di iche, ji isughari-asusu. Ka eme ihe nile ka ewe wuli madu nile elu dika ulo.

27 Ọ buru na onye ọ bula eji asusu di iche nēkwu okwu, ka ọ buru ihe ra ka madu abua gēkwu, ma ka ha ghara ika madu atọ, ka ha kwu kwa n’usoro; ka otù onye sughari kwa:

28 ma asi na ọ dighi onye nāsughari asusu nọ n’etiti unu, ya kpuchie ọnu-ya nime nzukọ Kraist; ya gwa onwe-ya na Chineke okwu.

29 Ka ndi-amuma kwu kwa okwu, madu abua ma-ọbu madu atọ, ka ndi ọzọ tule kwa.

30 Ma asi na ekpughere onye ọzọ nke nọdu n’akuku ya ihe, ka onye mbu kpuchie ọnu-ya.

31 N’ihi na unu nile puru ibu amuma n’otù n’otù, ka madu nile we muta ihe, ka ewe kasi kwa madu nile obi;

32 anēdo kwa mọ nile nke ndi-amuma n’okpuru ndi-amuma;

33 n’ihi na Chineke abughi Chineke nke aghara, kama Ọ bu Chineke nke udo; otú ọ di nime nzukọ nile nke ndi nsọ.

34 Ka ndinyom-unu kpuchie ọnu-ha nime nzukọ-unu: n’ihi na ekweghi ha ka ha kwue okwu; kama ka ha do onwe-ha n’okpuru ike, dika iwu Chineke nēkwu kwa.

35 Ọ buru kwa na ha nāchọ imuta ihe ọ bula, ka ha jua di nke aka ha n’ulo: n’ihi na ọ bu ihe-ihere ka nwanyi kwue okwu nime nzukọ Kraist.

36 Ọ̀ gābu na okwu Chineke si n’ebe unu nọ puta? ma-ọbu ò ruru nání unu?

37 Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye-amuma, ma-ọbu onye nwere onyinye Mọ Nsọ, ya mazu ihe m’nēdegara unu n’akwukwọ, na ha bu ihe Onye-nwe-ayi nyere n’iwu.

38 Ma ọ buru na onye ọ bula amaghi ihe ndia, ọ bu onye anāmaghi ama.

39 Ya mere, umu-nnam, werenu obi nānu ọku chọ ka unu bu amuma, unu eb͕ochi-kwa-la iji asusu di iche iche nēkwu okwu.

40 Ma ka eme ihe nile n’uzọ di nma n’anya, na n’usoro.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 15

1 Ma emem ka unu mara, umu-nnam, ozi ọma ahu nke m’zìri unu, nke unu nata-kwa-ra, nke unu nēguzo kwa nime ya,

2 nke esite-kwa-ra zọputa unu, ma ọ buru na unu jidesie ya ike, bú aha okwu m’ji zì unu ozi ọma ahu, ma asi na ọ bughi na unu kwere n’efu.

3 N’ihi na enyerem n’aka-unu na mbu ihe m’nata-kwa-ra idebe, na Kraist nwuru n’ihi nmehie-ayi nile, dika ihe edeworo n’akwukwọ nsọ si di;

4 na elì-kwa-ra Ya; na emewo-kwa-ra ka O si n’ọnwu bilie n’ubọchi nke-atọ, dika ihe edeworo n’akwukwọ nsọ si di;

5 na O me-kwa-ra ka Kifas hu Ya anya; emesia O mere ka ndi-ozi iri na abua ahu hu Ya anya;

6 emesia O mere ka ndi kari nnù madu na ọgu ise n’etiti umu-nna-ayi hu Ya anya n’otù mb͕e, ndi ka n’ọnu-ọgugu n’etiti ndi ahu nānọgide rue ub͕u a, ma ufọdu adawo n’ura ọnwu;

7 emesia O mere ka Jemes hu Ya anya; emesia O mere ka ndi-ozi nile hu Ya anya;

8 ma n’ikpe-azu ha nile, dika nwa amukworo amukwo, O mere ka mu onwem hu kwa Ya anya.

9 N’ihi na mu onwem dikarisiri ntà n’etiti ndi-ozi, ebe m’nērughi ka akpọm onye-ozi, n’ihi na esob͕urum nzukọ Chineke.

10 Ma site n’amara Chineke abum ihe m’bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n’ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.

11 Ya mere ma ọ buru mu onwem, ma-ọbu ndi ahu, otú a ka ayi nēkwusa, otú a ka unu kwe-kwa-ra.

12 Ma ọ buru na anēkwusa na emewo ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ùfọdu n’etiti unu si aṅa nēkwu na nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu adighi?

13 Ma ọ buru na nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu adighi, emeghi kwa ka Kraist si n’ọnwu bilie:

14 ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n’ọnwu bilie, ya mere ihe ayi nēkwusa bu ihe-efu, okwukwe-unu bu kwa ihe-efu.

15 Ọzọ kwa, anāhu na ayi bu ndi-àmà ugha nke Chineke; n’ihi na ayi b͕ara àmà megide Chineke na O mere ka Kraist ahu si n’ọnwu bilie; bú Onye Ọ nēmeghi ka O si n’ọnwu bilie, ma ọ buru na ọ bu ezie na emeghi ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie.

16 N’ihi na asi na emeghi ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie, emeghi kwa ka Kraist si n’ọnwu bilie:

17 ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n’ọnwu bilie, okwukwe-unu bu ihe-efu; unu nānọ na nmehie nile unu ub͕u a.

18 Ya mere ndi da-kwa-ra n’ura ọnwu nime Kraist lara n’iyì.

19 Asi na ọ bu nání na ndu a ka ayi nweworo olile-anya-ayi nime Kraist, ayi bu ndi kwesiri ebere kari madu nile.

20 Ma otú ọ di, emewo ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, nkpuru mbu nke ndi daworo n’ura ọnwu.

21 N’ihi na ebe ọnwu sitere n’aka madu, nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu site-kwa-ra n’aka madu.

22 N’ihi na dika ọnwu diri madu nile nime Adam, ọ bu kwa otú a ka agēme ka madu nile di ndu nime Kraist ahu.

23 Ma madu nile n’otù n’otù n’usoro nke aka ha: Kraist, dika nkpuru mbu; emesia ndi nke Kraist, n’ọbibia-Ya.

24 Emesia ọgwugwu ihe nile gābia, mb͕e ọ bula Ọ gārara ala-eze-Ya nye n’aka Chineke, Onye bu kwa Nna; mb͕e ọ bula Ọ gēmewori ka ọbubu-isi nile na ichi-isi nile na ike nile ghara idi irè.

25 N’ihi na Ọ ghaghi ibu eze, rue mb͕e Ọ gēdebewori ndi-iro-Ya nile n’okpuru ukwu-Ya.

26 Dika onye-iro ikpe-azu, agaje ime ka ọnwu ghara idi irè.

27 N’ihi na, Ihe nile ka O doro n’okpuru ukwu-Ya abua. Ma mb͕e ọ bula O gēkwuwori, si, Edowo ihe nile n’okpuru Ya, ọ putara ìhè na Ọ nọghi ya, bú Onye doro ihe nile n’okpuru Ya.

28 Ma mb͕e ọ bula agēdowori ihe nile n’okpuru Ya, mb͕e ahu ka agēdo Ọkpara ahu Onwe-ya n’okpuru Onye ahu Nke doro ihe nile n’okpuru Ya, ka Chineke we buru ihe nile nime ihe nile.

29 N’ihi na asi na ọ dighi otú a, gini ka ha gēme, bú ndi anēme baptism n’ọnọdu ndi nwuru anwu? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie ma-ọli, ọ̀ bu kwa gini mere anēme ha baptism n’ọnọdu ha?

30 Gini me-kwa-ra ayi onwe-ayi nānọ n’ize-ndu oge hour nile ọ bula?

31 Ejim inya-isi ahu n’aru-unu, umu-nnam, nke m’nānya nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi, we kwusie ike na anamanwu kwa-ubọchi.

32 Ọ buru na abumri onye nālu ọ̀gù megide anu-ọhia n’Efesọs dika madu si eme, ùrù gini baram? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie, ka ayi rie ṅu kwa, n’ihi na echi ka ayi gānwu.

33 Unu ekwela ka eduhie unu: Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma.

34 Sinu n’ura manya teta n’uzọ ezi omume, unu emehie-kwa-la; n’ihi na ufọdu nēnwe amaghi-ihe bayere Chineke: anamekwu nka ka m’me unu ihere n’iru.

35 Ma otù onye gāsi, Èsi aṅa eme ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie? ọ̀ bu kwa ahà aru gini ka ha ji bia?

36 Onye nēnweghi uche, adighi-eme ka nkpuru gi onwe-gi nāgha di ndu, ma ọ buru na ọ nwughi anwu:

37 ihe i nāgha kwa, ọ bughi aru gāputa ka i nāgha, kama ọ bu nkpuru efu, ma eleghi anya ọ gābu ọka, ma-ọbu nkpuru ọ bula nime nkpuru fọduru;

38 ma Chineke nēnye ya aru dika Ọ chọrọ, nēnye kwa nkpuru ọ bula nime nkpuru nile aru nke aka ya.

39 Anu-aru nile abughi otù anu-aru: kama otù anu-aru nke madu di, anu-aru ọzọ nke anumanu di kwa, anu-aru ọzọ nke nnunu di kwa, anu-aru ọzọ nke azù di kwa.

40 Aru nke elu-igwe na aru nke uwa di kwa: ma ebube nke aru nke elu-igwe bu otù, ebube nke aru nke uwa di kwa iche.

41 Otù ebube nke anyanwu di, ebube ọzọ nke ọnwa di kwa, ebube ọzọ nke kpakpando di kwa; n’ihi na otù kpakpando di iche n’aru kpakpando ọzọ n’ebube.

42 Otú a ka nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu di kwa. Anāgha ya n’ire-uré; anēme ka o si n’ọnwu bilie n’ereghi-uré:

43 anāgha ya n’ihe-ihere; anēme ka o si n’ọnwu bilie n’ebube: anāgha ya n’adighi-ike; anēme ka o si n’ọnwu bilie n’ike:

44 anāgha ya aru nke nkpuru-obi nāchi; anēme ka o si n’ọnwu bilie aru nke Mọ di nime ya nāchi. Ọ buru na aru nke nkpuru-obi nāchi di, aru nke Mọ nāchi di kwa.

45 Otú a ka edewo-kwa-ra ya n’akwukwọ, si, Madu mbu, bú Adam, ghọrọ nkpuru-obi di ndu. Adam ikpe-azu ghọrọ mọ nke nēnye ndu.

46 Otú ọ di, nke Mọ nāchi ebughi uzọ, kama ọ bu nke nkpuru-obi nāchi; emesia nke Mọ nāchi soro.

47 Madu mbu sitere n’ala, eji-kwa-ra ájá kpu ya: Madu nke-abua sitere n’elu-igwe.

48 Aha madu onye ahu ejiri ájá kpu di, madu di otú a ka ndi eji ájá kpu di kwa: ọzọ, aha madu Onye elu-igwe ahu di, madu di otú a ka ndi elu-igwe di kwa.

49 Dika ayi yiri kwa onyinyo nke onye ahu eji ájá kpu, ayi gēyiri kwa onyinyo nke Onye elu-igwe ahu.

50 Ma nka ka m’nēkwu, umu-nnam, na anu-aru na ọbara apughi iketa ala-eze Chineke; ihe nēre uré eketaghi kwa ereghi-uré.

51 Le, agwam unu ihe-omimi: Ọ bughi ayi nile gāda n’ura ọnwu, ma agēnwo ayi nile,

52 n’oge dikarisiri ntà, n’otù ntabi-anya, mb͕e agāfù opì ikpe-azu: n’ihi na agāfù opì, agēme kwa ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie nāpughi ire uré, agēnwo kwa ayi onwe-ayi.

53 N’ihi na aru a nke puru ire uré aghaghi iyikwasi ereghi-uré, aru a nke puru inwu anwu aghaghi iyikwasi anwughi-anwu.

54 Ma mb͕e ọ bula aru a nke puru ire uré gēyikwasiwori ereghi-uré, mb͕e aru a nke puru inwu anwu gēyikwasiwori anwughi-anwu kwa, mb͕e ahu okwu ahu edeworo n’akwukwọ nsọ gēme, bú, Eloro ọnwu rue nmeri.

55 Ọnwu, òle ebe nmeri-gi di? Ọnwu, òle ebe ihe-ọb͕ub͕a-gi di?

56 Ihe-ọb͕ub͕a nke ọnwu bu nmehie; ike nke nmehie bu kwa iwu:

57 ma ekele diri Chineke, Onye nēnye ayi nmeri site n’aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

58 Ya mere, umu-nnam m’huru n’anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n’ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.

Categories
I. NDI KỌRINT

I. NDI KỌRINT 16

1 Ma okwu bayere ùtú anāturu ndi nsọ, dika m’nyere nzukọ Kraist di na Galetia iwu, unu onwe-unu me kwa otú a.

2 Kwa ubọchi mbu n’ízù ubọchi asa ka unu nile n’otù n’otù debe ihe n’ulo nākpado ya, otú ihe nāgara onye ọ bula nke-ọma, ka aghara inara ùtú mb͕e ọ bula m’gābia.

3 Ma mb͕e ọ bula m’biaruru, ndi ọ bula unu gānwaputa, m’gēwere akwukwọ-ozi ziga ndi ahu ibūru ihe-amara-unu je Jerusalem:

4 ma asi na ọ kwesiri ka mu onwem je kwa, ha gēsom je.

5 Ma m’gābiakute unu, mb͕e ọ bula m’gāgabigasi nime Masedọnia; n’ihi na agajem igabiga nime Masedọnia;

6 ma eleghi anya na nke unu ka m’gānọgide, ma-ọbu nọbiga kwa na mb͕e oyi, ka unu we dupum n’ijem ebe ọ bula m’nāga.

7 N’ihi na achọghi m ihu unu ub͕u a n’uzọ ijem; n’ihi na anamele anya na m’gānọgide na nke unu oge ufọdu, ma asi na Onye-nwe-ayi gēkwe.

8 Ma m’gānọgide n’Efesọs rue oge Pentikọst;

9 n’ihi na emegheworom ọnu-uzọ di uku nke agēji kwa lusi ọlu ike, ọzọ, ọtutu ndi nēmegidem.

10 Ma asi na Timọti abia, lezienu anya ka ọ nọgide na nke unu nātughi egwu; n’ihi na ọ nālu ọlu Onye-nwe-ayi, dika mu onwem nālu kwa:

11 ya mere, ka onye ọ bula ghara ikpọ ya ihe-efu. Kama dupunu ya n’ije-ya n’udo, ka o we biakutem: n’ihi na anamele anya na ọ gēso umu-nna-ayi bia.

12 Ma okwu bayere Apọlos nwa-nna-ayi, ariọrọm ya ọtutu aririọ ka o so umu-nna-ayi biakute unu: ma ihe ọ chọrọ abughi ka ọ bia ub͕u a ma-ọli; ma ọ gābia mb͕e ọ bula o nwere oghere.

13 Nēchenu nche, nēguzosinu ike n’okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.

14 Ka eme ihe-unu nile n’ihu-n’anya.

15 Ma ariọm unu, umu-nnam, (unu matara èzí-na-ulo Stefanas, na ọ bu nkpuru mbu nke Akaia, na ha do-kwa-ra onwe-ha ijere ndi nsọ ozi),

16 ka unu onwe-unu do kwa onwe-unu n’okpuru madu di otú a, na n’okpuru onye ọ bula nke soro ayi nālukọ ọlu, onye nādọb͕u kwa onwe-ya n’ọlu.

17 Anamaṅuri kwa ọṅu n’ọbibia nke Stefanas na Fọtunetọs na Akaikọs: n’ihi na ndi ahu mezuru ihe fọduru unu imerem.

18 N’ihi na ha mere ka mọ nkem na nke unu zuru ike: ya mere mazunu madu di otú a.

19 Nzukọ Kraist nile nke di n’Esia nēkele unu. Akwila na Priska nēkele unu ọtutu ekele nime Onye-nwe-ayi, ha na nzukọ Kraist nke di n’ulo-ha.

20 Umu-nna-ayi nile nēkele unu. Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita ibe-unu.

21 Ekele nke mu Pọl, nke m’ji aka nkem de.

22 Ọ buru na onye ọ bula adighi-ahu Onye-nwe-ayi n’anya, ka ọ buru anathema. Onye-nwe-ayi nābia.

23 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.

24 Ihu-n’anya nkem diyere unu nile nime Kraist Jisus. Amen.

Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n’ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi, nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, ha na ndi nsọ nile ndi nọ n’Akaia dum:

2 Amara diri unu na udo nke si n’aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.

3 Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke obi-ebere nile na Chineke nke nkasi-obi nile;

4 Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula.

5 N’ihi na dika ahuhu nile Kraist huru nābabiga ókè n’ebe ayi nọ, otú a ka nkasi-obi-ayi nābabiga kwa ókè site n’aka Kraist.

6 Ma ọ buru na anākpab͕u ayi, ọ bu n’ihi nkasi-obi-unu na nzọputa-unu; ọ buru kwa na anākasi ayi obi, ọ bu n’ihi nkasi-obi-unu, nke nālusi ọlu ike n’itachi obi n’otù ahuhu ahu nke ayi onwe-ayi nāhu kwa:

7 olile-anya-ayi bayere unu nēguzosi kwa ike; ebe ayi matara na, dika unu bu ndi nēnwekọ ahuhu nile, otú a ka unu nēnwekọ kwa nkasi-obi ahu.

8 N’ihi na, umu-nnam, ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere nkpab͕u-ayi nke akpab͕uru ayi n’Esia, na esob͕uru ayi nke-uku ri nne, kari ike-ayi, ya mere ayi nwebigara obi abua ókè ma ayi gādi kwa ndu:

9 e, ayi onwe-ayi enwewo ọziza azara nime onwe-ayi na ọ bu ọnwu, ka ayi we ghara itukwasi obi n’onwe-ayi, kama ọ bu na Chineke Onye nēme ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie:

10 Onye dọputara ayi n’oké ọnwu di otú a, Ọ gādọputa kwa ayi: Onye ayi leworo anya Ya na Ọ ganādọputa kwa ayi ọzọ;

11 ebe unu nēyekọ kwa aka n’ihi ayi n’aririọ-unu; ka ọtutu madu we kele ekele n’ihi ayi bayere onyinye-amara enyeworo ayi site n’aka ọtutu madu.

12 N’ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n’idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n’amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n’amara Chineke, ka ayi biri obi n’uwa, ma ọ bu n’ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.

13 N’ihi na ayi edegaraghi unu ihe ọzọ n’akwukwọ, ma-ọbughi ihe unu nāghọta ma-ọbu nke unu nāmazu kwa, anamele kwa anya na unu gāmazu ha rue ọgwugwu ihe nile:

14 dika unu mazu-kwa-ra ayi n’otù akuku, na ayi bu ihe-inya-isi-unu, ọbuná dika unu onwe-unu bu kwa ihe-inya-isi nke ayi, n’ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus.

15 Nime ntukwasi-obi a ka m’zube-kwa-ra na mbu ibiakute unu, ka unu we nwe amara nke-abua;

16 ka m’we site kwa n’iye-aka-unu je rue Masedọnia, si kwa na Masedọnia biakute unu ọzọ, ka unu we dupukwam n’ijem iga Judia.

17 Ya mere mb͕e m’zubere nka, ọ̀ gābu na ejim uche nāgha agha zube? ma-ọbu ihe m’nēzuputa, ànamezuputa ha dika anu-aru nāgwam, ka e e na é-è é-è we di n’ọnum n’otù oge?

18 Ma dika Chineke kwesiri ntukwasi-obi, okwu-ayi nke ayi gwara unu abughi e na é-è.

19 N’ihi na Ọkpara Chineke, Jisus Kraist, Onye ekwusara n’etiti unu site n’ọnu-ayi, bú site n’ọnu nkem na nke Silvanọs na nke Timọti, emeghi Ya ka Ọ buru e na é-è, kama emewo ka e di nime Ya.

20 N’ihi na ka ha ra, bú nkwa nke Chineke, ọ bu nime Ya ka e di: n’ihi nka ka Amen site-kwa-ra n’aka-Ya, ka ewe site n’aka-ayi nye Chineke otuto.

21 Ma Onye ahu Nke nēme ka ayi na unu guzosie ike nime Kraist, Onye te-kwa-ra-ayi manu n’isi, bu Chineke;

22 Onye ka-kwa-ra ayi akàrà, nye kwa ayi Mọ Nsọ n’obi-ayi, bú ihe ayi ji mara na ayi gēnwezu nkwa ahu nile.

23 Ma mu onwem nākpọku Chineke ka Ọ buru onye-àmà megide nkpuru-obim, na ọ bu n’imere unu ebere ka m’nējighi bia Kọrint rue ub͕u a.

24 Ọ bughi na ayi bu ndi-nwe okwukwe-unu, kama ayi bu ndi soro unu nālu ọṅù-unu: n’ihi na unu ji okwukwe-unu guzo.

Categories
II. NDI KỌRINT

II. NDI KỌRINT 2

1 Ma ezuputaram onwem nka, na m’gaghi-abiakute unu ọzọ n’ihe-nwuta.

2 N’ihi na asi na mu onwem eme ka o wuta unu, ònye bu kwa onye gēme ka obi tọm utọ, ma-ọbughi onye ahu nke anēme ka o wuta ya site na mu onwem?

3 Ede-kwa-ram otù ihe nka n’akwukwọ, ka m’we ghara inwe ihe-nwuta mb͕e m’biara n’aka ndi o kwesiri ka m’ṅuria ọṅu n’aru ha; ebe m’tukwasiworo obi n’ebe unu nile nọ, na ọṅùm bu ọṅù nke unu nile.

4 N’ihi na m’sitere na nkpab͕u na ihe-nb͕u nke obi riri nne were ọtutu anya-miri degara unu akwukwọ; ọ bughi ka eme ka o wuta unu, kama ka unu we mara ihu-n’anya nke m’hubigara unu ókè kari.

5 Ma ọ buru na onye ọ bula emewo ka o wuta ayi, ọ bughi mu onwem, kama, n’otù akuku (ka m’ghara idọb͕u unu nke-uku) ọ bu unu nile ka o meworo ka o wuta.

6 O zuworo madu di otú a, bú nba nka nke ndi ka n’ọnu-ọgugu nime unu bara ya;

7 ya mere, kama ibara ya nba ọzọ anamachọ ka unu were amara b͕aghara ya kasi kwa ya obi, ka aghara iji ihe-nwuta nke nēwutabiga ya ókè loda madu di otú a n’uzọ ọ bula.

8 N’ihi nka ariọm unu ka unu me ka ihu-n’anya unu huru ya buru ihe di itukwasi obi.

9 N’ihi na ihe mere m’degara unu akwukwọ bu kwa nka, ka m’we mara nnwaputa unu, ma unu bu ndi nāṅa nti rue ihe nile.

10 Ma onye ọ bula unu were amara b͕aghara ya ihe ọ bula, mu onwem were kwa amara b͕aghara ya: n’ihi na ihe mu onwem werewo-kwa-ra amara b͕aghara, ma ọ buru na ewerewom amara b͕aghara ihe ọ bula, ọ bu n’ihi unu ka m’meworo ya n’iru Kraist;

11 ka Setan we ghara irib͕u ayi: n’ihi na ayi abughi ndi nāmaghi ihe nile ọ nēchèputa.

12 Ma mb͕e m’biaruru Troas izisa ozi ọma Kraist, mb͕e emeghereri kwa ọnu-uzọ nime Onye-nwe-ayi nyem,

13 mọm adighi nfé ma-ọli, n’ihi na ahughi m Taitọs nwa-nnam: kama ekelerem ha ekele ikpe-azu, we pua je Masedọnia.

14 Ma ekele diri Chineke, Onye nēdughari ayi n’ọṅù-agha nime Kraist mb͕e nile, nēsite kwa n’aka-ayi egosi isìsì nke ọmuma-Ya n’ebe nile.

15 N’ihi na ayi bu isìsì utọ nke Kraist n’ebe Chineke nọ, n’etiti ndi anāzọputa, na n’etiti ndi nāla n’iyì;

16 n’ebe ndia nọ ọ bu isìsì nke sitere n’ọnwu we dubà n’ọnwu; n’ebe ndi ahu anāzọputa nọ ọ bu isìsì nke sitere na ndu we dubà na ndu. Ma ònye ruru ime ihe ndia?

17 N’ihi na ayi adighi ka ọra madu, ndi were ihe nādighi nma nētigwa n’okwu Chineke: kama dika ndi sitere n’idi-ọcha, kama dika ndi sitere na Chineke, ọ bu n’iru Chineke, nime Kraist ka ayi nēkwu.