Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 93

1 Jehova bu eze; idi-elu ka O yiriworo dika uwe;

Jehova eyiriwo uwe, O werewo ike ke Onwe-ya n’úkwù:

Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n’ọnọdu-ya.

2 Oche-eze-Gi eguzosiwo ike site na mb͕e ochie:

Site na mb͕e ebighi-ebi ka I nọ.

3 Osimiri eweliwo olu-ha, Jehova,

Osimiri eweliwo olu-ha;

Osimiri nēweli ebili-miri nile ha elu.

4 Kari olu nile nke ọtutu miri,

Kari ebili-miri nile di ebube nke oké osimiri,

Jehova Nke nọ n’ebe di elu di ebube.

5 Ihe-àmà-Gi nile kwesiri ntukwasi-obi nke-uku:

N’ebe ulo-Gi di idi-nsọ mara nma,

Jehova, rue ubọchi nile nke ndu di ogologo.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 94

1 Chineke nke ọ́bọ̀ nile, Jehova,

Chineke nke ọ́bọ̀ nile, nwuputa ìhè.

2 Bulie Onwe-gi, Onye-ikpe nke uwa:

Nyeghachi ndi-npako nmeso-ha.

3 Jehova, rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu,

Rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu gāṅuri ọṅu-agha?

4 Ha nēkwuwa okwu-ọnu, ha nēkwu oké okwu:

Ndi nile nke nālu ajọ ihe nānya isi.

5 Ndi-Gi ka ha nāzọpia, Jehova,

Ọ bu kwa ihe-nketa-Gi ka ha nēweda n’ala.

6 Ha nēb͕u nwanyi di-ya nwuru, na ọbìa,

Ha nēb͕u kwa umu-nb͕ei n’ọchu.

7 Ha we si, Ja agaghi-ahu,

Chineke nke Jekob agaghi-amata kwa.

8 Ghọtanu, unu ndi bu anu-ọhia n’etiti ndi Israel:

Unu ndi-nzuzu kwa, òle mb͕e unu gēnwe uche?

9 Onye nāku nti dika ihe-ọkukú, Ọ̀ gaghi-anu íhe?

Ma-ọbu Onye nākpu anya, Ọ̀ gaghi-ahuwa uzọ?

10 Onye nādọ mba nile aka na nti, Ọ̀ gaghi-aba nba,

Bú Onye nēzí madu ihe-ọmuma?

11 Jehova mara èchìchè madu,

Na èchìchè ahu bu nání otù nku-ume.

12 Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja,

Onye I nēsi kwa n’iwu-Gi zí ihe;

13 Ime ka ọ nọ jū pua n’ubọchi nile nke ihe ọjọ,

Rue mb͕e agēgwuru onye nēmebi iwu olùlù.

14 N’ihi na Jehova agaghi-ara ndi-Ya aka,

Ọ gaghi-arapu kwa ihe-nketa-Ya.

15 N’ihi na ikpé gālaghachikute ezi omume:

Ndi nile ndi ziri ezi n’obi gēso kwa ya.

16 Ònye gēbilirim imegide ndi nēme ihe ọjọ?

Ònye gēme onwe-ya ka o guzosierem ike imegide ndi nālu ajọ ihe?

17 Ọ buru na Jehova abughi onye nēyerem aka,

Ọ fọduru nwa mb͕e nkpuru-obim gēbiwori n’ebe inọ-dū.

18 Ọ buru na asiwom, Ewezugawo ukwum n’ọnọdu-ya;

Ebere-Gi nākwagidem, Jehova.

19 Mb͕e ncheb͕um nāba uba n’imem,

Nkasi-obi-Gi nile nāgugu nkpuru-obim.

20 Àgējikọta Gi na oche-eze nke ihe-ila-n’iyì nile,

Nke nēji ukpuru kpuzí nmeb͕u?

21 Ha nēdo onwe-ha n’usu ndi nāpunara madu ihe imegide nkpuru-obi onye ezi omume,

Ọ bu kwa ọbara nēmeghi ihe ọjọ ka ha nāma ikpe.

22 Ma Jehova aburuworom ulo-elu;

Chinekem bu kwa oké nkume nke ebe-nb͕abàm.

23 O mewo kwa ka ajọ ihe-ha laghachikute ha,

Ọ bu kwa ihe ọjọ ha ka Ọ gēji kpochapu ha;

Jehova, bú Chineke-ayi, gēkpochapu ha.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 95

1 Bianu, ka ayi tikue Jehova nkpu ọṅù:

Ka ayi tikusie oké nkume nke nzọputa-ayi nkpu ọṅù ike.

2 Ka ayi were ekele bia n’iru Ya,

Ka ayi were abù ọma tikusie Ya nkpu ọṅù ike.

3 N’ihi na Chineke uku ka Jehova bu,

Ọ bu kwa Eze uku nāchi chi nile.

4 Onye ebe nile nke michasiri emi nke uwa di n’aka-Ya:

Ebe dichasi elu nke ugwu nile bu kwa nke Ya.

5 Onye nwere oké osimiri, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya;

Ọ bu kwa aka-Ya kpuru ala-akọro.

6 Batanu, ka ayi kpọ isi ala ruru kwa ala;

Ka ayi b͕ue ikperè n’ala n’iru Jehova Onye meworo ayi:

7 N’ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi:

Ayi onwe-ayi bu kwa ndi Ọ nāzù dika aturu, buru kwa ìgwè aturu nke aka-Ya.

Ta, ọ buru na unu ege nti olu-ya,

8 Unu emela ka obi-unu sie ike, dika na Meriba,

Dika n’ubọchi Masa n’ọzara:

9 Mb͕e nna-unu-hà nwaram,

Nwaputam ìhè, hu kwa ọlum.

10 Ọgu arọ abua ka M’nāsọ ọb͕ọ ahu oyi,

M’we si, Ndi nke nākpafu n’obi-ha ka ha bu,

Ha onwe-ha amaghi kwa uzọm nile:

11 N’ihi ya aṅurum iyi n’iwem, si,

Ha agaghi-abà n’izu-ikem ma-ọli

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 96

1 Bùkuenu Jehova abù ọhu:

Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile.

2 Bùkuenu Jehova abù, gọzienu aha-Ya;

Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n’otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.

3 Kọsanu akukọ ebube-Ya n’etiti mba nile,

Akukọ oké ọlu-Ya nile n’etiti ndi nile di iche iche.

4 N’ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:

Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu n’elu chi nile.

5 N’ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu:

Ma Jehova mere elu-igwe.

6 Ebube na ima-nma di n’iru Ya:

Ike na nma di n’ebe nsọ Ya.

7 Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche,

Nyenu Jehova nsọpuru na ike.

8 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:

Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bata n’ogige-Ya nile.

9 Kpọnu isi ala nye Jehova n’ima-nma nke idi-nsọ:

Ka o nēb͕u unu nb͕u site n’iru Ya, unu elu-uwa nile.

10 Sinu n’etiti mba nile, Jehova bu eze:

Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n’ọnọdu-ya:

Ọ gēkpe ndi nile di iche iche ikpe n’izi-ezi.

11 Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù;

Ka oké osimiri bib͕o, ya na ùjú-ya;

12 Ka ọhia ṅuria ọṅu-agha, ya na ihe nile nke di nime ya;

Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù;

13 N’iru Jehova, n’ihi na Ọ biawo;

N’ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe:

Ọ gēji ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe,

Ọ gēji kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Ya kpe ndi nile di iche iche ikpe.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 97

1 Jehova bu eze; ka uwa tegharia egwu ọṅù;

Ka ala bara uba nke di oké osimiri buruburu ṅuria.

2 Igwe-oji na oké ọchichiri di Ya buruburu:

Ezi omume na ikpé ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Ya.

3 Ọku nāga n’iru Ya,

Nēsure kwa ndi-nkpab͕u-Ya buruburu.

4 Àmùmà-Ya nile nyere elu-uwa dum madu bi ìhè:

Uwa huru ya, o we gbue ya nb͕u.

5 Ugwu nile b͕azepuru dika wax n’iru Jehova,

N’iru Onye-nwe uwa nile.

6 Elu-igwe gosiri ezi omume-Ya,

Ndi nile di iche iche hu-kwa-ra ebube-Ya.

7 Ka ihere me ndi nile ndi nēfè arusi apiri api òfùfè,

Ndi nānya isi n’ihe-efu di iche iche:

Kpọnu isi ala nya Ya, unu chi nile.

8 Zaion nuru, we ṅuria,

Umu-ndinyom Juda we tegharia egwu ọǹù;

N’ihi ikpé-Gi nile, Jehova.

9 N’ihi na Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye kachasi ihe nile elu n’elu uwa nile:

Emewo ka I di elu nke-uku n’elu chi nile.

10 Unu ndi nāhu Jehova n’anya, kpọnu ihe ọjọ asì:

Ọ nēdebe nkpuru-obi ndi-ebere-Ya;

Ọ nānaputa ha n’aka ndi nēmebi iwu.

11 Aghaworo onye ezi omume ìhè dika nkpuru,

Aghawo-kwa-ra ndi ziri ezi n’obi ọṅù.

12 Ṅurianu na Jehova, unu ndi ezi omume;

Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 98

Abù Ọma.

1 Bùkuenu Jehova abù ọhu;

N’ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche;

Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa.

2 Jehova emewo ka amara nzọputa-Ya:

N’anya mba nile ka O kpugheworo ezi omume-Ya.

3 O chetawo ebere-Ya na ikwesi-ntukwasi-obi-Ya n’ebe ulo Israel di:

Nsọtu nile nke uwa ahuwo nzọputa Chineke-ayi.

4 Tikusienu Jehova nkpu ọṅù ike, uwa nile:

Tiwanu nkpu, tienu nkpu ọṅù, bùanu abù ọma.

5 Werenu ubọ-akwara bùkue Jehova abù ọma;

Werenu ubọ-akwara na olu abù ọma.

6 Chirinu opì na olu opì-ike

Tisie nkpu ọṅù ike n’iru Eze, bù Jehova.

7 Ka oké osimiri bib͕ọ, na ùjú-ya;

Elu-uwa dum madu bi, na ndi bi nime ya;

8 Ka osimiri nile kua aka-ha;

Ka ugwu tie nkpu ọṅù n’otù;

9 N’iru Jehova, n’ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe:

Ọ gēwere ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe,

Ọ gēwere kwa izi-ezi kpe ndi nile di iche iche.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 99

1 Jehova bu eze; ka ndi nile di iche iche ma jijiji:

Ọ nēbi n’etiti cherubim; ka uwa me nkpatu.

2 Jehova di uku nime Zaion;

Onye di elu ka Ọ bu kwa n’elu ndi nile di iche iche.

3 Ka ha kele aha-Gi nke di uku, nke anātu kwa egwu ya:

Onye nsọ ka Ọ bu.

4 Ike nke eze nāhu kwa ezi ikpé n’anya;

Gi onwe-gi emewo ka izi-ezi guzosie ike,

Ezi ikpé na ezi omume ka Gi onwe-gi meworo nime Jekob.

5 Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, elu,

Kpọ-kwa-nu isi ala n’ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di:

Onye nsọ ka Ọ bu.

6 Moses na Eron n’etiti ndi-nchu-àjà-Ya,

Samuel kwa n’etiti ndi nākpọku aha-Ya;

Ha nākpọku Jehova, Ya onwe-ya we za ha.

7 N’ogidi igwe-oji ka Ọ nāgwa ha okwu:

Ha debere ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru O nyere ha.

8 Jehova, bú Chineke-ayi, Gi onwe-gi zara ha:

Chineke Nke nēbupu nmehie ka I buru ha,

Ma I bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ omume nile ha,

9 Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi,

Kpọ-kwa-nu isi ala n’ebe ugwu nsọ Ya di;

N’ihi na onye nsọ ka Jehova, bú Chineke-ayi, bu.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 100

Abù Ọma ikele ekele.

1 Tikusienu Johova nkpu ọṅù ike, uwa nile.

2 Werenu ọṅù fè Jehova òfùfè:

Werenu iti-nkpu ọṅù bia n’iru Ya.

3 Maranu na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke:

Ya onwe-ya emewo ayi, ọ bu kwa Ya nwe ayi;

Ayi bu ndi-Ya, na ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-Ya.

4 Werenu ekele ba n’ọnu-uzọ-ama-Ya nile,

Werenu otuto ba n’ogige-Ya nile:

Kelenu Ya, gọzi-kwa-nu aha-Ya.

5 N’ihi na Jehova di nma; rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di;

Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Ya di kwa.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 101

Abù Ọma Devid.

1 Ebere na ezi ikpé ka M’gābù n’abù:

Gi, Jehova, ka m’gabùku abù ọma.

2 M’gēnwe uche n’uzọ zuru okè:

Òle mb͕e I gābiakutem?

M’gējeghari n’etiti ulom n’izu-okè nke obim.

3 M’gaghi-edo ihe jọb͕uru onwe-ya n’irum:

Akpọwom ọlu nke ndi nējehie asì;

Ọ gaghi-arapra n’arum.

4 Obi b͕agọro ab͕agọ gēsi n’ebe m’nọ wezuga onwe-ya:

Ọ dighi onye ọjọ m’gāmara.

5 Onye nēkpè madu-ibe-ya ikpè na nzuzo, onye ahu ka m’gēkpochapu:

Onye nwere anya npako na obi di nganga, onye ahu ka m’nāpughi inagide.

6 Anyam abua di n’aru ndi kwesiri ntukwasi-obi n’ala, ka mu na ha we biri:

Onye nēje ije n’uzọ zuru okè, onye ahu gējerem ozi.

7 Onye nālu ọlu aghughọ agaghi-ebi n’etiti ulom:

Onye nēkwu okwu-ugha agaghi-eguzosi ike n’iru anyam.

8 Kwa-ututu ka m’gēkpochapu ndi nile nēmebi iwu n’ala;

Isi n’obodo Jehova kpochapu ndi nile nālu ajọ ihe.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 102

Ekpere nke onye ewedara n’ala mb͕e ike adighi ya, o we nēkwuwa okwu ntamu-ya n’iru Jehova.

1 Jehova, nuru ekperem,

Ka ntikum ru kwa Gi nti.

2 Ezonarilam iru-Gi n’ubọchi ahuhu m’nāhu:

Tọ nti-Gi n’ala n’ebe m’nọ;

N’ubọchi m’nākpọku Gi zam ngwa ngwa.

3 N’ihi na ubọchim nile agwusiwo n’anwuru-ọku,

Erechapuwo kwa ọkpukpum nile dika ọlọkọ-ọku.

4 Etib͕uwo obim dika ihe akuru n’ala, o we kpọnwua;

N’ihi na echezọwom iri nrim.

5 Site n’olu ize-umem

Ọkpukpum araparawo n’anu-arum.

6 Eyirim okwolo nke ọzara;

Aghọwom ihe dika okwukwu nke nkpọnkpọ ebe.

7 Amuruwom anya, we ghọ

Ihe dika nnunu ntà nke nání ya nọ n’elu-ulo.

8 Ogologo ubọchi nile ka ndi-irom nātam uta;

Ndi nāwi ara imegidem ejiwom ṅua iyi.

9 N’ihi na eriwom ntu dika nri,

Were kwa ikwa-ákwá gwakọta ihe-ọṅuṅum.

10 Site n’iwe-Gi na ọnuma-Gi:

N’ihi na I buliwom elu, we tufuem.

11 Ubọchim nile di ka onyinyo nke nēsetipu onwe-ya site n’ọdida anyanwu;

Mu onwem nākpọnwu kwa dika ihe akuru n’ala.

12 Ma Gi onwe-gi, Jehova, nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi;

Ncheta-Gi nādiru kwa ọb͕ọ nile.

13 Gi onwe-gi gēbili, nwe obi-ebere n’aru Zaion:

N’ihi na mb͕e eruwo imere ya amara, n’ihi na mb͕e akara àkà abiawo.

14 N’ihi na nkume-ya nile nātọ ndi-orù-Gi utọ,

Ha nēme-kwa-ra ájá-ya amara.

15 Mba nile gātu kwa egwu aha Jehova,

Eze nile nke uwa gātu kwa egwu ebube-Gi:

16 N’ihi na Jehova ewuwo Zaion,

O mewo Onwe-ya ka ahú Ya nime ebube-ya.

17 O chewo ekpere nke onye nēnweghi ihe iru,

O ledaghi kwa ekpere-ha anya.

18 Agēde nka n’akwukwọ nye ọb͕ọ nēso n’azu:

Ọzọ, otù ndi nke agēkè gēto Ja.

19 N’ihi na O siwo n’ebe di elu nke ebe nsọ Ya lepu anya;

Jehova esitewo n’elu-igwe legide uwa anya;

20 Inu ize-ume nke onye-nkpọrọ;

Itọpu ndi nāghaghi inwu anwu;

21 Ka ha we kọ akukọ aha Jehova nime Zaion,

Kọ kwa akukọ otuto-Ya nime Jerusalem;

22 Mb͕e ndi nile di iche iche gāchikọta onwe-ha n’otù,

Ha na ala-eze nile, ifè Jehova òfùfè.

23 O wedawo ikem n’uzọ;

O bilatawo ubọchim nile.

24 Asirim, Chinekem, emela ka m’la n’elu n’etiti ubọchim nile:

N’ọb͕ọ nile ka arọ-gi nādigide.

25 Na mb͕e ochie ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa;

Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa.

26 Ha onwe-ha gāla n’iyì, ma Gi onwe-gi nēguzogide:

Ha nile gāka kwa nká dika uwe;

Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāb͕anwe ha, agāb͕anwe kwa ha:

27 Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile,

Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu

28 Umu nke ndi-orù-Gi gēbigide,

Nkpuru-ha gēguzosi ike n’iru Gi.