Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 63

Abù Ọma Devid, mb͕e ọ nọ n’ọzara Juda.

1 Chineke, ọ bu Chinekem ka I bu; anamachọsi Gi ike:

Akpiri Gi akpọwo nkpuru-obim nku, anu-arum achọsiwo Gi ike,

N’ala ọkpọ-nku na nke ida-#mbà, ebe miri nādighi.

2 Otú a ka m’lekwasiworo Gi anya n’ebe nsọ gi,

Ihu ike-Gi na nsọpuru-Gi.

3 N’ihi na ebere-Gi di nma kari ndu;

Eb͕ub͕ere-ọnum abua gāja Gi.

4 Otú a ka m’gāgọzi Gi mb͕e m na-ādi ndu:

N’aha-Gi ka m’gāchili akam elu.

5 Afọ nēju nkpuru-obim dika agāsi na o rijuru umi-anu na abuba afọ;

Ọ bu kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēti nkpu ọṅù ka ọnum nēji to Gi;

6 Ọ buru na echetam I n’elu utem,

Nime nche-abali nile ka m’nātughari uchem na Gi.

7 N’ihi na I buworom iye-aka,

Ọ bu kwa n’okpuru ǹdò nke nkù-Gi abua ka m’nēti nkpu ọṅù.

8 Nkpuru-obim nārapara Gi n’aru n’iso Gi n’azu:

Mu ka aka-nri-gi jideworo.

9 Ma ndi ahu, ọ bu ime ka ọ la n’iyì ka ha nāchọ nkpuru-obim,

Ha gābà n’ebe nile di ala nke uwa.

10 Agarara ha nye n’aka mma-agha:

Òkè nke nkita-ọhia ka ha gābu.

11 Ma eze gāṅuri na Chineke:

Onye ọ bula nke nēwere Ya ṅu iyi gānya isi;

N’ihi na agēkpuchi ọnu nke ndi nēkwu okwu-ugha.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 64

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Chineke, nuru olum n’itughari-uchem:

Nēchezi ndum ka ọ pua n’oké egwu nke onye-iro.

2 I gēzopum n’ìzù nzuzo nke ndi nēme ihe ọjọ:

N’ìgwè ndi nālu ajọ ihe:

3 Ndi muworo ire-ha dika mma-agha,

Ha edowo àkú-ha, bú okwu di ilu:

4 Ib͕a onye zuru okè àkú n’ebe nzuzo di iche iche:

Na mberede ka ha nāb͕a ya, ha adighi-atu kwa egwu.

5 Ha nēme okwu ọjọ ka ọ diri ha ike;

Ha nākọ akukọ bayere isi ọnyà na nzuzo;

Ha siri, Ònye gāhu ha?

6 Ha nāchọputa ajọ omume nile, si, Ayi emezuwo nchọputa achọputara nke-ọma:

Ọzọ, èchìchè-ime nke madu ọ bula nime ha na obi-ya miri emi.

7 Ma Chineke nāb͕a ha àkú;

Na mberede ka ntib͕u nile ha bu.

8 Ewe me ka ha su ngọngọ, ebe ire nke aka ha nēmegide ha:

Ha nēfufe isi, bú onye ọ bula nke nēlekwasi ha anya.

9 Madu nile gātu kwa egwu;

We gosi ọlu Chineke,

Were uche chè èchìchè bayere omume-Ya.

10 Onye ezi omume gāṅuri na Jehova, b͕abà kwa nime Ya;

Ndi nile ndi ziri ezi n’obi gānya kwa isi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 65

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma. Abù Devid.

1 Gi ka otuto nēdere du, Chineke, nime Zaion:

Ọ bu kwa Gi ka anākwughachi nkwa ekwere.

2 Gi Onye nānu ekpere,

Gi ka anu-aru nile, bú madu, gābiakute.

3 Okwu nile nke ajọ omume nile dikaririm ike:

Njehie nile ayi, Gi onwe-gi gēkpuchi ha.

4 Ihe nāgara ya nke-ọma, bú onye I nārọputa,

Onye I nēme kwa ka ọ biarue nso,

Ka o we biri n’ogige-Gi nile:

Ka afọ ju ayi n’ezi ihe nke ulo-Gi,

Bú ebe nsọ nke ulo uku Gi.

5 Ihe di egwu ka I nēji za ayi n’ezi omume,

Chineke nke nzọputa-ayi;

Gi Onye bu ihe-ntukwasi-obi nke nsọtu nile nke uwa,

Na nke oké osimiri, bú ebe di iche iche di anya:

6 Onye nēji ike-Ya me ka ugwu nile guzosie ike;

Ebe ewerewo idi-ike ke Ya n’úkwù:

7 Onye nēme ka nkpọtu oké osimiri dajua, bú nkpọtu nmali-miri-ha,

Ya na ùzù nke mba nile.

8 Ndi bi na nsọtu nile nke uwa we nātu egwu ihe-iriba-ama nile gi:

I nēme ka ọpupu nile nke ututu na anyasi tie nkpu ọǹù.

9 I letawo ala, we me ka o juputa n’ihe,

I nēme ka ọ nwe àkù ri nne;

Miri-iyi Chineke juputara na miri

I nēdozi ọka-ha, mb͕e I si otú a dozie ala onwe-ya.

10 I nēdè ọ̀b͕à-ala-ubi-ya miri:

I nēme ka ebe elu ya nile di lari:

I nēji oké miri-ozuzo b͕aze ya;

I nāgọzi ihe-opupú-ya.

11 I kpubewo arọ nke ezi ihe-Gi okpu-eze;

Uzọ-Gi nile nātasasi kwa abuba.

12 Ha nātasa n’ebe-ita-nri niile nke ọzara:

Anēji kwa otite-egwú-ọṅù ke ugwu ntà nile n’úkwù.

13 Ewerewo igwè ewu na aturu yikwasi ebe-ita-nri nile dika uwe;

Anēwere ọka kpuchie ndagwurugwu nile;

Ha nēti nkpu ọǹù, e, ha nābù abù.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 66

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù, bú Abú Ọma.

1 Tikusienu Chineke nkpu ọǹù ike, uwa nile:

2 Bùanu nsọpuru aha-Ya n’abù ọma:

Menu ka otuto-Ya di nsọpuru.

3 Sinu Chineke, Le ka ọlu-Gi nile si di oké egwu!

N’uba nke ike-Gi ndi-iro-Gi gērube isi aghugho n’okpuru Gi.

4 Uwa nile gākpọ isi ala nye Gi,

Bùku kwa Gi abù ọma;

Ha gābùku aha-Gi abù ọma.Selah

5 Jenu, hu ọlu nile nke Chineke;

Onye di egwu ka Ọ bu n’omume-Ya n’ebe umu madu nọ.

6 Ọ b͕anwere oké osimiri ka ọ ghọ ala-akọrọ:

Ha nāgabiga osimirí n’ukwu-ha:

Ka ayi ṅuria nime Ya n’ebe ahu.

7 O ji idi-ike-Ya achi rue mb͕e ebighi-ebi;

Anya-Ya abua nēche mba nile nche:

Ka ndi nēwezuga onwe-ha ghara ibuli onwe-ha elu.Selah

8 Gọzienu Chineke-ayi, unu ndi nile di iche iche,

Me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya:

9 Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu,

Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n’ọnọdu-ha.

10 N’ihi na I nwawo ayi, Chineke:

I nuchawo ayi, dika esi anucha ọla-ọcha.

11 I mere ka ayi ma n’ọnyà;

I tukwasiwo n’úkwù-ayi ibu nānyib͕u ayi.

12 I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n’elu isi-ayi;

Ayi bàra n’ọku na nime miri;

I we me ka ayi puta ba n’inwebiga-ihe-ókè.

13 M’gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n’ulo-Gi,

M’gākwughachi Gi nkwam nile m’kwere Gi,

14 Nke eb͕ub͕ere-ọnum abua ji saghepu,

Nke ọnum kwu-kwa-ra, mb͕e nkpà dirim.

15 Ọtutu àjà-nsure-ọku, bú anu nwere abuba, ka m’gēsurere Gi,

Ha na ihe-nsure-ọku nke nēsì ísì utọ nke ebulu;

M’gāchu oke-ehi n’àjà, ha na nkpi.Selah

16 Bianu, nuru, unu nile ndi nātu egwu Chineke,

M’gākọ kwa akukọ bayere ihe O meworo nkpuru-obim.

17 Ya ka m’jiri ọnum kpọkue,

Nbuli-elu di kwa n’okpuru irem.

18 Ọ buru na ọ bu ajọ ihe ka m’leworo anya nime obim,

Onye-nwe-ayi agaghi-anu olum:

19 N’ezie Chineke anuwo olum;

Ọ ṅawo nti olu ekerem.

20 Onye agọziri agọzi ka Chineke bu,

Onye nēwezugaghi ekperem, O sighi kwa n’ebe m’no wezuga ebere-Ya.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 67

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’ubọ-akwara. Abù Ọma, Abù.

1 Ka Chineke mere ayi amara, gọzie ayi,

Me ka iru-Ya mua n’ebe ayi nọ;Selah

2 Ka ewe mara uzọ-Gi n’uwa,

Mara nzọputa-Gi n’etiti mba nile.

3 Ka ndi nile n’uwa kele Gi, Chineke;

Ka ndi nile n’uwa kele Gi, ha nile.

4 Ka mba nile ṅuria, ti kwa nkpu ọṅù:

N’ihi na I gēkpe ndi nile n’uwa ikpe ziri ezi,

Mba nile n’uwa ka I gēdu kwa.Selah

5 Ka ndi nile n’uwa kele Gi, Chineke;

Ka ndi nile n’uwa kele Gi, ha nile.

6 Ala emewo ihe-ọmume-ya:

Chineke, bú Chineke-ayi, gāgọzi ayi.

7 Chineke gāgọzi ayi;

Nsọtu nile nke uwa gātu kwa egwu Ya.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 68

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid, Abù.

1 Ka Chineke bilie, ka ndi-iro-Ya b͕asa;

Ka ndi nākpọ Ya asì si n’iru Ya b͕alaga.

2 Dika ifufe si efesa anwuru-ọku, otú a ka I gēfesa ha:

Dika wax si ab͕azepu n’iru ọku,

Otú a ka ndi nēmebi iwu gēsi n’iru Chineke la n’iyì.

3 Ma ka ndi ezi omume ṅuria; ka obi tọ ha utọ n’iru Chineke:

E, ka ha wulie elu n’ọṅù.

4 Bùkuenu Chineke abù, bùkuenu aha-Ya abù ọma:

Tulierenu Ya uzọ, bú Onye nānọkwasi inyinya gabiga n’ala ihe nādighi;

Aha-Ya bu JA; ṅuri-kwa-nu ọṅu-agha n’iru Ya.

5 Nna nke umu-nb͕ei, na onye-ikpe nke ndinyom di-ha nwuru,

Ka Chineke bu n’ebe-obibi-Ya di nsọ.

6 Chineke nēme ndi nání ha nọ ka ha biri n’ulo:

Ọ nēme ka ndi-nkpọrọ puta ba n’ebe ihe nāgara ha nke-ọma:

Ma ndi nēwezuga onwe-ha bi n’ala kpọrọ nku.

7 Chineke, mb͕e I putara ga n’iru ndi-Gi,

Mb͕e I zọbigara ije n’ala tọb͕ọrọ n’efu;Selah

8 Ala mara jijiji,

Ọzọ, elu-igwe buru miri n’iru Chineke:

Sainai ahu mara jijiji n’iru Chineke, bú Chineke nke Israel.

9 Miri-ozuzo, bú onyinye-afọ-ofufo, ka I nēfesa, Chineke,

Mb͕e ike gwuru ihe-nketa-Gi, Gi onwe-gi mere ka o guzosie ike.

10 Usu ndi nke Gi ebiriwo nime ya:

I nēdoziri ndi ewedara n’ala ihe n’idi-nma-Gi, Chineke.

11 Onye-nwe-ayi nēnye okwu:

Ndinyom ndi nēzisa ozi ahu bu usu bara uba.

12 Ndi-eze nke usu nile nke ndi-agha nāb͕alaga, ha nāb͕alaga:

Nwayi bi n’ulo nēkèsa kwa ihe akwatara n’agha.

13 Ọ buru na unu edina n’etiti ogige-aturu,

Ma ọ di ka nkù abua nke nduru nke ejiworo ọla-ọcha kpuchie,

Ejiwo kwa ọla-edo ọma nēnwu akwukwọ ndu akwukwọ ndu kpuchie nkù-ya abua.

14 Mb͕e Onye Nke puru ime ihe nile chusara ndi-eze nime ya,

Snow nēzò na Zalmon.

15 Ugwu Chineke ka ugwu Beshan bu;

Ugwu nwere ugwu di iche iche n’elu ya ka ugwu Beshan bu.

16 Unu ugwu nwere ugwu n’elu unu, n’ìhi gini ka unu ji ekworo

Le ugwu ahu anya nke Chineke chọsiworo ike ibu ebe-obibi-Ya?

E, Jehova gēbi nime ya rue mb͕e ebighi-ebi.

17 Ub͕ọ-ala Chineke di orú nnú uzọ abua na nnù iri, ha di nnù abua na ọgu iri uzọ nādighi iguta ọnu:

Onye-nwe-ayi nọ n’etiti ha, Sainai di nime ebe nsọ Ya.

18 I rigoruwo n’ebe di elu; dọta usu ndi adọtara n’agha n’agha;

I natawo onyinye di iche iche n’etiti madu,

E, ọbuná n’etiti ndi nēwezuga onwe-ha, ka Ja, bú Chineke, we biri n’etiti ha.

19 Onye agọziri agọzi ka Onye-nwe-ayi bu, kwa-ubọchi ka Ọ nēburu ayi ibu,

Bú Chineke Nke bu nzọputa-ayi.Selah

20 Chineke buru ayi Chineke nāzọputa azọputa;

Ọ bu kwa Johova, bú Onye-nwe-ayi, nwe uzọ nile isi n’ọnwu pua.

21 Ọ bu nání na Chineke gēb͕upú isi ndi-iro-Ya,

Bú opu-n’isi arapuru ndundu nke onye nējeghari n’ikpe-ọmuma-ya.

22 Onye-nwe-ayi siri, M’gēme ka ha si na Beshan lata,

M’gēme ka ha si n’ebe nile di omimi nke oké osimiri lata:

23 Ka I we b͕aye ukwu-gi n’ọbara,

Ka ire nkita-gi nile we si n’aru ndi-iro-gi kère òkè-ya.

24 Ha ahuwo ojije-Gi nile, Chineke,

Bú ojije nile nke Chinekem, bú Ezem, n’idi-nsọ-Ya.

25 Ndi-abù buru uzọ ga, ndi-ubọ-akwara soro n’azu,

N’etiti umu-ab͕ọghọ ndi nēti egwú-otiti.

26 Nime nkpọkọta nile nke madu gọzienu Chineke,

Bú Onye-nwe-ayi, unu ndi sitere n’isi-iyi Israel.

27 N’ebe ahu ka ọ nọ, bú Benjamin di ntà, nke nwere ike n’aru ha,

Ya na ndi-isi Juda na ìgwè ndi-ha,

Na ndi-isi Zebulum, na ndi-isi Naftali.

28 Chineke-gi enyewo ike-gi iwu:

Di ike, Chineke, Gi Onye luworo ayi ọlu.

29 N’ihi ulo uku Gi nime Jerusalem

Ọ bu Gi ka ndi-eze gēdukuru ùtú.

30 Basiere anu-ọhia nke amì nba ike,

Ìgwè oke-ehi, ha na umu-ehi nke ndi nile di iche iche,

Onye ọ bula nime ha nēkwe ka azọtọ ya n’ukwu nēweta iberibe ọla-ọcha;

Ọ chusawo ndi nile di iche iche ndi ilu-ọ̀gù nātọ utọ.

31 Ndi amara aha-ha gēsi n’Ijipt puta;

Etiopia gēsetiri Chineke aka-ya abua ngwa ngwa.

32 Unu ala-eze nke uwa, bùkuenu Chineke abù;

Bùkuenu Onye-nwe-ayi abù ọma;Selah

33 Bùkuenu Onye ahu Nke elu-igwe kachasi elu-igwe nile, nke di mb͕e ochie, nēbu dika inyinya;

Le, Ọ nēme ka olu-Ya da udà, ọ bu olu ike.

34 Nyenu Chineke ike:

N’elu Israel ka idi-elu-Ya di,

Ike-ya di kwa na mbara-ígwé nile.

35 Onye anātu egwu ka Chineke bu site n’ebe nsọ Gi nile:

Chineke nke Israel, Ya onwe-ya nēnye ndi-Ya ike na ume.

Onye agọziri agọzi ka Chineke bu.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 69

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’elu Shoshannim. Abù Ọma nke Devid.

1 Zọputam, Chineke;

N’ihi na miri abiaruwo nkpuru-obim.

2 Emikpuwom n’urọ nke ebe di omimi, ọ dighi kwa ebe-nguzo di:

Abatawom na miri nke miri emi, miri nke nērù ọku ọku na-enudakwa m.

3 Adọb͕uwom onwem n’ọlu n’ikpọ-òkùm; akpiri akpọsiwom nku:

Anyam abua adalawo n’isi, mb͕e m’nēchere Chinekem.

4 Ha di ọtutu kari agiri-isi nke isim, bú ndi nākpọm asì n’efu:

Ha nwere ume, bú ndi nēkpochapum, ebe ha bu ndi-irom n’uzọ okwu-ugha:

Mb͕e ahu ka m’nēnyeghachi ihe m’nānapugh n’ike.

5 Chineke, Gi onwe-gi amawo uchem b͕agọrọ ab͕agọ;

Ezonarighi kwa Gi ikpe-ọmumam nile.

6 Ekwela ka ihere me ha n’ihim, bú ndi nēle anya Gi, Chineke, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha:

Ekwela ka etiye ha n’ọnọdu-ihere n’ihim, bú ndi nāchọ Gi, Chineke nke Israel.

7 N’ihi na ọ bu n’ihi Gi ka m’būworo ita-uta;

Ihere ekpuchiwo irum.

8 Aghọworom umu-nnem onye ala ọzọ,

Ghọ-kwa-ra umu nnem muru onye mba ọzọ.

9 N’ihi na ekworo ulo-Gi eripiawom;

Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta adakwasiwokwam.

10 M’we kwa ákwá n’obubu-ọnu nke nkpuru-obim,

O we ghọrọm nání ihe-ita-uta.

11 Anameme kwa ka ákwà-nkpe buru uwem,

M’we ghọrọ ha ilu.

12 Ndi nānọdu n’ọnu-uzọ-ama nātughari uche bayerem;

Aghọwokwam abù nke ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu nābà n’anya nābù n’ikpọ ubọ-akwara.

13 Ma mu onwem, anamekpere Gi ekpere, Jehova, na mb͕e ọ nātọ Gi utọ:

Chineke, n’iba-uba nke ebere-Gi,

Zam n’ezi-okwu nke nzọputa-Gi.

14 Naputam n’apiti, ekwe-kwa-la ka m’mikpùe.

Kwe ka anaputam n’aka ndi nākpọm asì, ka anaputakwam na miri nke miri emi.

15 Ekwela ka miri nke nērù ọku ọku ṅachapum,

Ekwe-kwa-la ka ebe di omimi lodam;

Ekwe-kwa-la ka olùlù kpuchibidom ọnu-ya.

16 Zam, Jehova; n’ihi na ebere-Gi di nma:

Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di chem iru.

17 Ezonari-kwa-la orù-Gi iru-Gi;

N’ihi na nkpà nākpam; me ngwa zam.

18 Biarue nkpuru-obim nso, b͕aputa ya:

N’ihi ndi-irom b͕aputam.

19 Gi onwe-gi amawo ita-utam, na iherem, na ọnọdu-iherem:

N’iru Gi ka ndi-nkpab͕um nile nọ.

20 Ita-uta etiwawo nkpuru-obim; anamariasi kwa ọria ike:

M’we le anya onye gēgosim ebere o ji n’arum, ma ọ dighi onye ọ bula;

M’le-kwa-ra anya ndi-nkasi-obi, ma achọtaghm onye ọ bula.

21 Ha we nyem ńsí di ilu ka ọ buru ihe-oririm;

Ọzọ mb͕e akpiri kpọrọm nku ha nēme ka m’ṅua manya-vine b͕ara uka.

22 Me table-ha nke di n’iru ha ka ọ ghọ ib͕udu;

Mb͕e ha nọ n’udo, ya ghọ kwa ọnyà.

23 Me ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ;

Me kwa ka úkwù-ha nāma jijiji mb͕e nile.

24 Wukwasi ha iwe-Gi,

Me kwa ka idi-ọku nke iwe-Gi rue ha aru.

25 Me ka ebe-ulo-ikwū-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n’efu;

Ekwela onye ọ bula bi n’ulo-ikwū nile ha.

26 N’ihi na ọ bu onye Gi onwe-gi tib͕uworo ka ha sob͕uworo;

Ọ bu kwa akukọ bayere ihe-nb͕u nke ndi I dupuworo ka ha nākọ.

27 Tukwasi ajọ omume n’ajọ omume-ha:

Ekwe-kwa-la ka ha ba n’ezi omume-Gi.

28 Me ka ehichapu ha n’akwukwọ ndi di ndu,

Ekwe-kwa-la ka edekọ ha na ndi ezi omume n’akwukwọ.

29 Ma mu onwem bu onye ewedara n’ala na onye ihe nēb͕u nb͕u:

Chineke, nzọputa-Gi gētiyem n’ebe di elu.

30 M’gēji abù to aha Chineke,

M’gēji kwa ekele me ka Ọ di uku.

31 Ọ gadi kwa Jehova mma kari ehi,

Ma-ọbu oke-ehi nke nwere mpi, nke ukwu-ya wara njakpa.

32 Ndi di ume-ala n’obi ahuwo ya, ha nāṅuri:

Unu ndi nāchọ Chineke, ka obi-unu di ndu.

33 N’ihi na Jehova nēge nti ndi-ob͕eye,

Ọ ledaghi kwa ndi-nkpọrọ-Ya.

34 Ka elu-igwe na ala to Ya,

Ha na oké osimiri, na ihe ọ bula nke nākpughari nime ha.

35 N’ihi na Chineke gāzọputa Zaion, wu kwa obodo nile nke Juda;

Madu gēbi kwa n’ebe ahu, we nweta ya.

36 Nkpuru nke ndi-orù-Ya gēketa kwa ya;

Ndi nāhu aha-Ya n’anya gēbi kwa nime ya.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 70

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke Devid; ime ka echeta.

1 Chineke, bia ọsọsọ inaputam;

Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka.

2 Ka ihere me ha, ka ha nwe kwa iru-ihere,

Bú ndi nāchọ nkpuru-obim:

Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n’ọnọdu-ihere,

Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.

3 Ka ha laghachi azu n’ihi ihere-ha,

Bú ndi nāsi, Ehe, ehe!

4 Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi;

E, ka ndi nāhu nzọputa-Gi n’anya nāsi mb͕e nile,

Ka Chineke di uku.

5 Ma mu onwem bu onye ewedara n’ala na ob͕eye;

Chineke, biakutem ọsọsọ:

Onye-iye-akam na Onye nēme ka m’b͕apu ka I bu;

Jehova, anọla ọdù.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 71

1 Nime Gi, Jehova, ka m’b͕abàworo:

Ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi.

2 N’ezi omume-Gi naputam, me ka m’b͕apu:

Tọrọm nti-Gi n’ala, zọputam.

3 Ghọrọm oké nkume nke ebe-obibi, nke m’gābà nime ya mb͕e nile

I nyewo iwu izọputam;

N’ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu.

4 Chinekem, me ka m’b͕apu n’aka onye nēmebi iwu,

N’ọbu-aka nke onye nēme ajọ omume nke nēme kwa ihe-ike.

5 N’ihi na Gi onwe-gi bu olile-anyam, Onye-nwe-ayi Jehova:

Gi bu ntukwasi-obim site na nwata.

6 N’elu Gi ka m’dabeworo site n’afọ nnem:

Gi onwe-gi bu onye weputaworom n’afọ nnem:

Na Gi ka otutom gādi mb͕e nile.

7 Aghọworom ọtutu madu ihe-ebube;

Ma Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm di ike.

8 Ọnum gējuputa n’otuto-Gi,

Ogologo ubọchi nile ka ọ gējuputa kwa n’ima-nma-Gi.

9 Etufulam na mb͕e agadi;

Mb͕e ikem gwusiri arapulam.

10 N’ihi na ndi-irom ekwuwo okwu bayerem;

Ọzọ, ndi nēche nkpuru-obim nche ab͕aritawo ìzù,

11 Si, Chineke arapuwo ya:

Chuanu ya, jide ya; n’ihi na ọ dighi onye-nnaputa di.

12 Chineke, anọlam ebe di anya:

Chinekem, bia ọsọsọ iyerem aka.

13 Ka ihere me ha, ka eme kwa ka ha gwusia, bú ndi nēmegide nkpuru-obim;

Ka ewere ita-uta na ọnọdu-ihere kpuchie ndi nāchọ imem ihe ọjọ.

14 Ma mu onwem, mb͕e nile ka m’ganēche Gi,

We tukwasi otuto n’otuto-gi nile

15 Ọnum gākọ akukọ bayere ezi omume-Gi,

Ogologo ubọchi nile ka ọ gākọ akukọ bayere nzọputa-Gi;

N’ihi na amaghm ọnu-ọgugu nile ha.

16 M’gēji idi-ike nile nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, bia:

M’gēhota ezi omume-Gi, nání nke Gi.

17 Chineke, I zíwom ihe site na nwata;

Ọ bu kwa rue ub͕u a ka m’nēgosi oké ọlu-Gi nile.

18 Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke;

Rue mb͕e m’gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-Gi

Gosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi.

19 Ọzọ, ezi omume-Gi, Chineke, nādiru ebe di elu;

Gi Onye meworo ihe uku di iche iche, Chineke, ònye di ka Gi?

20 Gi, Onye meworo ka ayi hu ọtutu nkpab͕u nke jọ-kwa-ra njọ,

I gēme ka ayi di kwa ndu ọzọ,

Me kwa ka ayi si n’ob͕u-miri nile nke uwa rigoputa ọzọ.

21 Me ka idi-ukum bakari uba,

Gi chighari kwa kasiem obi.

22 Mu onwem gēji kwa une kele Gi,

Bú ezi-okwu-Gi, Chinekem:

M’gēji ubọ-akwara bùkue Gi abù ọma,

Gi Onye Nsọ nke Israel.

23 Eb͕ub͕ere-ọnum abua gēti nkpu ọṅù mb͕e m’nābùku Gi abù ọma;

Nkpuru-obim, nke I b͕aputaworo, gēti kwa nkpu ọṅù.

24 Ọzọ, irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi ogologo ubọchi nile:

N’ihi na ihere emewo ha, n’ihi na ha nwere iru-ihere, bú ndi nāchọ imem ihe ọjọ.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 72

Abù Ọma nke Solomon.

1 Chineke, nye eze ikpé-Gi nile,

Nye kwa nwa eze ezi omume-Gi.

2 O gēji ezi omume kpe ndi-Gi ikpe,

O gēji kwa ikpe ziri ezi kpe ndi-Gi ewedara n’ala.

3 Ugwu nile gēbutere ndi-Gi udo,

Ugwu ntà kwa, n’ezi omume.

4 Ọ gēkpe ndi ewedara n’ala n’etiti ndi-Gi ikpe,

Ọ gēnye umu nke ob͕eye nzọputa,

Zọpia kwa onye-nmeb͕u.

5 Ha ganātu egwu Gi ogologo mb͕e anyanwu gādigide,

Na n’iru ọnwa, rue ọb͕ọ nile.

6 Ọ gārida dika miri-ozuzo si ezokwasi n’ọzara asuru asu:

Dika oké miri-ozuzo nke nēdè ala.

7 Onye ezi omume gāma akwukwọ n’ubọchi nile ya dika osisi ndu;

Ọtutu udo gādi kwa rue mb͕e ọnwa agaghi-adi.

8 Ya nwe kwa ike n’aru madu site n’otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ,

Site kwa n’Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.

9 Ndi bi n’ala kpọrọ nku gēruru ala n’iru ya;

Ọzọ, ndi-iro-ya gāracha ájá.

10 Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma:

Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.

11 E, eze nile gākpọ isi ala nye ya:

Mba nile gēfè ya òfùfè.

12 N’ihi na ọ gānaputa ob͕eye mb͕e o nētiku ya;

Ọ gānaputa kwa onye ewedara n’ala mb͕e ọ dighi onye nēyere ya aka.

13 Ọ gēmere onye nēnweghi ike na ob͕eye ebere,

Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-ob͕eye ka ọ gāzọputa.

14 Ọ gēsi n’aka nzọb͕u na n’aka ime-ihe-ike b͕aputa nkpuru-obi-ha;

Ọbara-ha gādi kwa oké ọnu-ahia n’anya-ya.

15 Ya di kwa ndu! agēnye kwa ya ufọdu n’ọla-edo Sheba:

Agēkpe kwa ekpere bayere ya mb͕e nile;

Ogologo ubọchi nile ka agāgọzi ya.

16 Ka ọtutu ọka di n’ala n’elu ugwu nile;

Nkpuru-ya ganēme nkpatu dika Lebanon:

Madu gēsi kwa n’obodo wa okoko-osisi dika ihe akuru n’ala.

17 Ka aha-Ya dirue mb͕e ebighi-ebi;

N’iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù:

Madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya:

Mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma.

18 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke, bu, bú Chineke nke Israel,

Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche:

19 Ihe agọziri agọzi ka aha nsọpuru Ya bu kwa rue mb͕e ebighi-ebi;

Ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya.

Amen, na Amen.

20 Ekpere nke Devid nwa Jesi agwuwo.