Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 23

Abù Ọma Devid.

1 Jehova bu onye nāzùm dika aturu; ó dighi ihe kọrọm.

2 N’ebe-ita-nri nke ahihia ndu ka O nēme ka m’makpu:

N’akuku miri nke izu-ike ka Ọ nedum nwayo.

3 Ọ nēweghachi nkpuru-obim:

Ọ nēdum n’uzọ nile nke ezi omume n’ihi aha-Ya.

4 Ọzọ, asi na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwu,

M’gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọ bula; n’ihi na Gi onwe-gi nọyerem:

Ndele-Gi na nkpa-n’aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi.

5 I nēdo table n’usoro n’irum n’anya ndi nākpab͕um:

I tewo isim manu; ikom bu inwebiga-ihe-ókè.

6 Nání idi-nma na ebere gāb͕asom ubọchi nile nke ndum:

M’gēbi kwa n’ulo Jehova rue ogologo ubọchi nile.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 24

Abù Ọma Devid.

1 Jehova nwe uwa na ùjú-ya;

Elu-uwa dum madu bi na ndi bi nime ya.

2 N’ihi na Ya onwe-ya atọwo ntọ-ala-ya n’elu oké osimiri nile,

Me kwa ka o guzosie ike n’elu osimiri nile.

3 Ònye gārigo n’ugwu Jehova?

Ònye gēguzosi kwa ike n’ebe nsọ Ya?

4 Onye nwere ọbu-aka abua nēmeghi ihe ọjọ, na obi di ọcha;

Onye nēbulighi nkpuru-obi-ya nye ihe-efu,

Ọ ṅughi kwa iyi aghughọ.

5 Ọ gānata ngọzi n’aka Jehova,

Na ezi omume naka Chineke nke nzọputa-ya.

6 Nka bu ọb͕ọ nke ndi nācho Ya,

Bú ndi nāchọsi iru-Gi ike, Chineke nke Jekob.Selah

7 Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu;

Ka ebuli kwa unu elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi:

Eze ebube gābata kwa.

8 Ònye kwa bu Eze ebube a?

Ọ bu Jehova, Nke bu dìnkpà na dike,

Ọ bu Jehova, Nke bu dike n’agha.

9 Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu;

Buli-kwa-nu ha elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi:

Eze ebube gābata kwa.

10 Ònye ka Ọ bu, bú Eze ebube a?

Ọ bu Jehova nke usu nile nke ndi-agha,

Ya onwe-ya bu Eze ebube a.Selah

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 25

Abù Ọma nke Devid.

1 Gi, Jehova, ka m’nēbuliri nkpuru-obim.

2 Chinekem, na Gi ka m’tukwasiworo obi,

Ekwela ka ihere mem;

Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n’arum.

3 Ọzọ, ndi nile ndi nēle anya Gi, ihere agaghi-eme ha:

Ihere gēme ndi nāghọ aghughọ n’efu.

4 Jehova, me ka m’mara uzọ-gi nile;

Zím okporo-uzọ-Gi nile.

5 Mem ka m’zọ ije n’ezi-okwu-Gi, Gi zíkwam ihe;

N’ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam;

Gi ka m’nēle anya Gi ogologo ubọchi nile.

6 Cheta obi-ebere-Gi nile, Jehova, ha na ebere-Gi nile;

N’ihi na site na mb͕e ebighi-ebi ka ha diworo.

7 Echetala nmehie nile m’mehiere n’okorọbiam, ha na njehiem nile:

Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam,

N’ihi idi-nma-Gi, Jehova.

8 Onye di nma na onye ziri ezi ka Jehova bu:

Nihi nka ka Ọ nēzi ndi-nmehie ihe n’uzọ.

9 Ọ nēme ka ndi di ume-ala n’obi zọ ije n’ikpé:

Ọ nēzi kwa ndi di ume-ala n’obi uzọ-Ya.

10 Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwu

N’ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ.

11 N’ihi aha-Gi, Jehova,

B͕aghara ajọ omumem, n’ihi na o riri nne.

12 Ònye ka ọ bu, bú nwoke nātu egwu Jehova?

O gēzi ya ihe n’uzọ ọ nārọputa.

13 Nkpuru-obi-ya gānọ ọnọdu-abali n’ọdi-nma,

Nkpuru-ya gēnweta kwa ala.

14 Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya;

Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe.

15 Anyam abua di n’ebe Jehova nọ mb͕e nile;

N’ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n’ub͕u puta.

16 Chem iru, me-kwa-ram amara;

N’ihi na onye nání ya nọ na onye ewedara n’ala ka m’bu.

17 Ahuhu nile nke obim sara mbara:

Me ka m’si na nkpàm nile puta.

18 Hu nweda-n’alam na ọnọdu ọjọm;

Bupu kwa nmehiem nile.

19 Hu ndi-irom, n’ihi na ha di ọtutu;

Ha ji ikpọ-asi nke na-eme ihe-ike kpọm asi.

20 Debe nkpuru-obim, naputakwam:

Ekwela ka ihere mem, n’ihi na ab͕abàwom nime Gi.

21 Ka izu-okè na izi-ezi chezim,

N’ihi na elewom anya Gi.

22 Chineke, b͕aputa Israel

Na nkpà-ya nile.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 26

Abù Ọma nke Devid.

1 Kpem ikpe, Jehova, n’ihi na mu onwem ejewo ije n’izu-okèm:

Ọ bu kwa na Jehova ka m’tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu.

2 Nwà m, Jehova, nwaputakwam;

Nucha akurum abua na obim.

3 N’ihi na ebere-Gi di n’iru anyam;

Ejeghariwokwam n’ezi-okwu-Gi.

4 Mu na madu efu anọkọghi;

Mu na ndi-iru-abua adighi-abàkọ kwa.

5 Akpọwom nkpọkọta ndi nēme ihe ọjọ asì,

Mu na ndi nēmebi iwu adighi-anọkọ kwa.

6 Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ;

We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova:

7 Ime ka ege nti olu ekele,

Na ikọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.

8 Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n’anya,

Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi.

9 Achikọtala nkpuru-obim na ndi-nmehie n’otù,

Achikọta-kwa-la ndum na ndi-ọbara n’otù:

10 Ndi nzube ọjọ di n’ka-ha,

Aka-nri-ha juputa-kwa-ra n’iri-ngo.

11 Ma mu onwem, n’izu-okèm ka m’gēje ije:

B͕aputam, me-kwa-ram amara.

12 Ukwum eguzowo n’ala di lari:

Nime nkpọkọta madu nile ka m’gāgọzi Jehova.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 27

Abù Ọma nke Devid.

1 Jehova bu ìhèm na nzọputam; ònye ka m’gātu egwu?

Jehova bu ebe siri ike nke ndum; ònye ka m’gātu oké egwu?

2 Mb͕e ndi nēme ihe ọjọ biarurum nso iri anu-arum,

Bú ndi nākpab͕um na ndi-irom, ha onwe-ha suru ngọngọ, da n’ala.

3 Ọ buru na ọmuma-ulo-ikwū ndi-agha ama ulo-ikwū-ha imegidem,

Obim agaghi-atu egwu:

Ọ buru na agha ebilie imegidem,

Na nka ka mu onwem nātukwasi obi.

4 Otù ihe ka m’riọworo n’aka Jehova, nke ahu ka m’nāchọ;

Ọ bu ka m’biri n’ulo Jehova ubọchi nile nke ndum,

Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n’ulo uku Ya.

5 N’ihi na Ọ gēdebem na nzuzo n’ulo-ntu-Ya n’ubọchi ihe ọjọ:

Ọ gēzobem n’ebe-nzuzo nke ulo-ikwū-Ya;

N’oké nkume ka Ọ gēbulim elu.

6 Ma ub͕u a agēbuli isim elu n’elu ndi-irom dim buruburu;

M’ga-achukwa àjà nke iti-nkpu n’ulo-ikwū-Ya;

M’gābù abù, m’gābùku kwa Jehova abù ọma.

7 Jehova, nuru mb͕e m’were olum kpọ òkù:

Me-kwa-ram amara, zakwam.

8 Gi ka obim siworo, Gi kwuru okwu, si, Chọnu irum;

Iru-Gi, Jehova, ka m ga-achọ.

9 Ezonarilam iru-Gi;

Ejila iwe wezuga orù-Gi:

Iye-akam ka I buworo;

Ab͕anarilam, arapu-kwa-lam, Chineke nke nzọputam.

10 N’ihi na nnam na nnem arapuwom,

Ma Jehova gēkubatam.

11 Jehova, zím uzọ-Gi;

Durukwam n’okporo-uzọ di lari,

N’ihi ndi nēchem anwu.

12 Enyelam n’aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi nākpab͕um:

N’ihi na ndi-àmà okwu-ugha ebiliwo imegidem, ha na ndi nēkupu ihe-ike dika ume.

13 M’gēme aṅa ma asi na ekweghm na m’gēle idi-nma Jehova

N’ala ndi di ndu?

14 Nēle anya Jehova:

Di ike, ka obi-gi nwe kwa ume;

E, nēle anya Jehova.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 28

Abú Ọma nke Devid.

1 Gi, Jehova, ka m’nākpọku;

Oké nkumem, echila nti n’ebe m’nọ:

Ka I we ghara ib͕am nkiti,

M’we yie ndi nārida n’olùlù.

2 Nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m’tikuru Gi,

Mb͕e m’chiliri akam abua n’ebe ime-ime-ulo nke ebe nsọ Gi di.

3 Adọkpurulam tiyere ndi nēmebi iwu,

Tiye-kwa-ra ndi nālu ajọ ihe;

Ndi nāgwa madu-ibe-ha okwu udo,

Ma ihe ọjọ di n’obi-ha.

4 Nye ha dika ọlu-ha si di, na dika ijọ-njọ nke nmeso nile ha si di:

Nye ha dika aka-ha si eme;

Nyeghachi ha ihe ha mere.

5 N’ihi na ha adighi-aghọta ọlu nile nke Jehova,

Na n’ihi na ha adighi-aghọta ihe aka-Ya abua meworo,

Ọ gākwada ha, Ọ gaghi-ewulita ha elu dika ulo.

6 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu,

N’ihi na Ọ nuwo olu aririọ-amaram nile.

7 Jehova bu ikem na ọtam;

Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka:

Obim we nāwuli elu n’ọṅù;

M’gēsite kwa n’abùm kele Ya.

8 Jehova buru ya ike,

Ebe siri ike nke nzọputa nke onye nke Ya etere manu ka Ọ bu.

9 Zọputa ndi-Gi, gozi kwa ihe-nketa-Gi:

Nāzù kwa ha dika aturu, nēku kwa ha n’aka-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 29

Abù Ọma Devid.

1 Nyenu Jehova, unu umu Chineke,

Nyenu Jehova nsọpuru na ike.

2 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya;

Kpọnu isi ala nye Jehova n’ima-nma nke idi-nsọ.

3 Olu Jehova di n’elu miri:

Chineke nke ebube nāma éb͕è-elu-igwe,

Jehova nọ n’elu ọtutu miri.

4 Olu Jehova nāda n’ike;

Olu Jehova nāda n’ima-nma.

5 Olu Jehova nētiwa osisi cedar;

Jehova we tiwasia osisi cedar nke Lebanon.

6 Ọ nēme ka ha nāwuli elu dika nwa-ehi;

Bú Lebanon na Siron, dika nwa-atu.

7 Olu Jehova nāwaputa ire ọku.

8 Olu Jehova nēme ka ọzara me nkpatu;

Jehova nēme ka ọzara Kedesh me nkpatu.

9 Olu Jehova nēme ka ime nēme nne-ele,

Ọ nāb͕uchapu kwa akwukwọ osisi oké ọhia:

Ọzọ n’ulo uku Ya ihe hile nāsi, Ebube.

10 Jehova nọduru n’oche-eze n’Iju-miri ahu;

Jehova we nọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi.

11 Jehova gēnye ndi-Ya ike;

Jehova gēji udo gọzie ndi-Ya.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 30

Abù Ọma; Abù nke ira Ulo ahu nye Chineke; Abù Ọma nke Devid.

1 M’gēbuli Gi elu, Jehova; n’ihi na I dọgowom n’elu,

I meghi kwa ka ndi-irom ṅuriam.

2 Jehova, bú Chinekem,

Etikurum, I, I we me ka m’diri ndu.

3 Jehova, I mewo ka nkpuru-obim si n’ala-mọ rigoputa:

I mewo ka m’si n’etiti ndi nārida n’olùlù di ndu.

4 Bùkuenu Jehova abù ọma, unu ndi-ebere-Ya,

Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ.

5 N’ihi na nání otù ntabi-anya nāgabiga n’iwe-Ya;

Ogologo ndu nile nāgabiga na mb͕e ihe-ayi nātọ Yautọ:

N’anyasi ikwa-ákwá gābia inọ ọnọdu-abali,

Ma n’ututu iti-nkpu-ọṅù gādi.

6 Ma mu onwem, asirim n’udom,

Agaghi-ewezugam n’ọnọdum rue mb͕e egighi-ebi.

7 Jehova, I ji ka ihem si atọ Gi utọ me ka ike guzoro ukwu m:

I zobere iru-Gi; aghọrọm onye nāma jijiji.

8 Gi, Jehova, ka m’nākpọku;

Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi ka m’nāriọ aririọ-amara:

9 Ùrù gini di n’ọbaram, mb͕e m’na-arida n’olùlù?

Ájá, ọ̀ gēkele Gi? ò gēgosi ezi-okwu-Gi?

10 Nuru, Jehova, me-kwa-ram amara:

Jehova, buru onye nēyerem aka.

11 I b͕anweworom iti-aka-n’obim ka ọ ghọ ite-egwú;

I tọpuwo ákwà-nkpem, were ọṅù kem dika ihe-ọkiké:

12 Ka nsọpurum we bùkue Gi abù ọma, ghara idere du.

Jehova, bú Chinekem rue mb͕e ebighi-ebi ka m’gēkele Gi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 31

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Nime Gi, Jehova, ka m’b͕abàworo; ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi:

N’ezi omume-gi me ka m’b͕apu.

2 Tọrọm nti-Gi n’ala; naputam ngwa ngwa:

Ghọrọm oké nkume nke ebe siri ike, bú ulo nke ebe ewusiri ike nke-uku izọputam.

3 N’ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu;

Ọzọ, n’ihi aha-Gi I gēdum, dukwam nwayo.

4 I gēme ka m’si n’ub͕u nke ha zoberem puta;

N’ihi na Gi onwe-gi bu ebem siri ike.

5 N’aka-Gi ka m’nēnye mọm idebe:

I b͕aputawom, Jehova, Chineke nke ezi-okwu.

6 Akpọwom ha asì, bú ndi nāriba ihe-efu nile nke nābughi ihe ama:

Ma mu onwem atukwasiwo obi na Jehova.

7 Ka m’tegharia egwú ọṅu, ṅuri kwa ọṅu, n’ebere-Gi:

N’ihi na I huwo nweda-n’alam;

I mawo nkpuru-obim n’ahuhu di iche iche:

8 I mechibidoghkwam nye n’aka onye-iro;

I mewo ka ukwum abua guzo n’ebe sara mbara.

9 Merem amara, Jehova, n’ihi na anọm na nkpab͕u:

Anyam emebiwo nime nkpasu-iwem, ya na nkpuru-obim, na afọm, dika uwe nla mebiri.

10 N’ihi na ndum agwusiwo n’iru-újú, na arọm nile n’ize-ume:

Ikem asuwo ngọngọ site n’ajọ omumem, ọkpukpum nile emebiwo kwa, dika uwe nla mebiri.

11 N’ihi ndi-nkpab͕um nile aghọwom ihe-ita-uta nke-uku,

Ọbuná n’ebe ndi-ab͕ata-obim nọ aghọwo-kwa-ram ndi m’mara oké egwu:

Ndi nāhum n’èzí ab͕anariwom.

12 Echezọwo mu onwem dika onye nwuru anwu puru n’obi madu:

Aghọwom ihe nāla n’iyì.

13 N’ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu,

Ujọ dim buruburu:

Mb͕e ha nāb͕a ìzù n’otù imegidem,

Ha zubere iwepu ndum.

14 Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m’tukwasiworo obi, Jehova:

Asiwom, Chinekem ka I bu.

15 N’aka-Gi ka mb͕em nile di:

Naputam n’aka ndi-irom, na n’aka ndi nēsob͕um.

16 Me ka iru-Gi nye orù-gi ìhè:

Zọputam n’ihi ebere-Gi.

17 Jehova, ekwela ka ihere mem; n’ihi na akpọkuwom I:

Ka ihere me ndi nēmebi iwu, ka ha debe ọnu-ha du n’ala-mọ.

18 Ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha da ob͕i;

Nke nēkwu oké okwu megide onye ezi omume,

Nime npako na nleda-anya.

19 Le ka ezi ihe-Gi si ba uba, nke I tukọbaworo nye ndi nātu egwu Gi,

Nke I luworo nye ndi nāb͕abà nime Gi n’iru umu madu!

20 I nēzobe ha n’ebe-nzuzo nke iru-Gi ka ha pua n’aka nkekọta nile nke madu:

I nēdebe ha na nzuzo n’ulo-ntu ka ha pua n’ise-okwu nke ire di iche iche.

21 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu:

N’ihi na O mewo ka ebere-Ya di ebube n’ebe m’nọ n’obodo ewusiri ike.

22 Ma mu onwem, asirim na nkujam, Ebipuwom n’anya-Gi:

Otú ọ di, I nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m’tikuru Gi.

23 Hunu Jehova n’anya, ndi-ebere-Ya nile:

Ọ bu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka Jehova nēchezi,

Ọ nākwughachibiga kwa onye nēme omume npako ókè.

24 Dinu ike, ka obi-unu nwe kwa ume, Unu nile ndi nēchere Jehova.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 32

Abù Ọma nke Devid. Maschil.

1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye ebupuworo njehie-ya, onye ekpuchiworo nmehie-ya.

2 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú madu nke Jehova nādighi-aguru ya ajọ omume,

Bú onye ọ dighi aghughọ ọ bula di na mọ-ya.

3 Mb͕e m’b͕ara nkiti, ọkpukpum nile kara nká

Site n’ọb͕ub͕ọ-ujam ogologo ubọchi nile.

4 N’ihi na ehihie na abali aka-Gi di arọ̀ n’arum:

Umem b͕anwere n’ihe-ikpọ-nku nke uguru.Selah

5 Anamemeri ka I mara nmehiem, ekpuchighkwam ajọ omumem:

M’siri, M’gēkwuputara Jehova njehiem nile;

Gi onwe-Gi bupu-kwa-ra ajọ omume nke nmehiem.Selah

6 N’ihi nka ka onye-ebere ọ bula kpere Gi na mb͕e agēji chọta Gi:

N’ezie n’iju-miri nke ọtutu miri ha agaghi-eru ya aru.

7 Gi onwe-gi burum ebe-nzuzo; I gēchezim ka m’pua n’ahuhu;

Iti-nkpu nke mb͕e anēme ka ab͕apu, ndia ka I gēme ka ha dim buruburu.Selah

8 M’gēme ka i nwe uche, M’gēzi kwa gi ihe n’uzọ nke i gēje ije nime ya:

M’gādu gi ọdu, anyam gādikwasi kwa gi n’aru.

9 Unu adila ka inyinya, ma-ọbu dika inyinya mule, nke ọ dighi nghọta ha nwere:

Agēji kwa bit na bridle, dika ihe-ekike, ijide ha,

Ma emeghi otú a ha agaghi-abiaru nso gi.

10 Ọtutu ihe-nb͕u gādiri onye nēmebi iwu:

Ma onye nātukwasi obi na Jehova, ebere gādi ya buruburu.

11 Ṅurianu ọṅu na Jehova, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, unu ndi ezi omume:

Ti-kwa-nu nkpu ọṅù, unu nile ndi ziri ezi n’obi.