Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 3

Abù Ọma Devid, mb͕e o siri n’iru Absalom nwa-ya b͕alaga.

1 Jehova, le otú ndi nākpab͕um bara uba!

Ọtutu madu nēbili imegidem.

2 Ọtutu madu nēkwu okwu bayere nkpuru-obim, si,

Ọ dighi nzọputa diri ya nime Chineke.

3 Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta buruburum,

Na nsọpurum, na onye nēbuli isim elu.

4 Ejim olum kpọkue Jehova,

O we zam site n’ugwu nsọ Ya.

5 Mu onwem dinara ala, raru ura;

Etetaram; n’ihi na Jehova nākwagidem.

6 M’gaghi-atu egwu ìgwè ndi nkem anāpughi iguta aguta,

Ndi doworo onwe-ha imegidem buruburu.

7 Bilie, Jehova; zọputam, Chinekem:

N’ihi na I tiwo ndi-irom nile ihe na ǹtì;

I tipiawo ezé ndi nēmebi iwu.

8 Jehova nwe nzọputa:

Ka ngọzi-Gi dikwasi ndi-Gi.Selah

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 4

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’ubọ-akwara. Abù Ọma Devid.

1 Mb͕e m’kpọrọ, Gi zam, Chineke nke ezi omumem;

I nyewom ebe sara mbara mb͕e m’nọ na nkpà:

Merem amara, nuru ekperem.

2 Umu madu, rùe ole mb͕e ka nsọpurum gāghọ itiye n’ọnọdu-ihere?

Unu nāhu ihe-efu n’anya, nāchọ okwu-ugha.

3 Ma maranu na Jehova ekewaputaworo Onwe-ya onye-ebere:

Jehova nānu mb͕e m’kpọkuru Ya.

4 Manu jijiji, emehie-kwa-la:

Sinu otú a n’obi-unu n’elu ihe-ndina-unu, we dere du.Selah

5 Chuanu àjà ezi omume,

Tukwasi-kwa-nu obi na Jehova.

6 Ọtutu madu nāsi, Ònye gēme ka ayi hu ọdi-nma?

Jehova, bulie ìhè iru-Gi ka ọ mukwasi ayi.

7 I tiyewo ọṅù n’obim,

Kari nke ha nwere na mb͕e ọka-ha na manya-vine ọhu ha ji aba uba.

8 N’udo ka m’gēji otù mb͕e ahu dina ala, raru ura:

N’ihi na Gi onwe-gi, Jehova, nání Gi, nēme ka m’biri na ntukwasi-obi.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 5

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; nke agābù n’ib͕u Ọjà. Abù Ọma Devid.

1 Ge nti n’okwu-ọnum, Jehova,

Ghọta ntughari-uchem.

2 Ṅa nti n’olu ntiku m’nētiku Gi, Ezem, na Chinekem:

N’ihi na ọ bu Gi ka m’nēkpere.

3 Jehova, n’ututu ka I gānu olum;

N’ututu ka m’gēdoro Gi ekperem n’usoro, che kwa nche.

4 N’ihi na ọ bughi Chineke nke nmebi-iwu nātọ utọ ka I bu:

Ihe ọjọ agaghi-anọ dika ọbia n’ebe I nọ.

5 Ndi nānya isi agaghi-eguzo onwe-ha n’anya-Gi:

I kpọrọ ndi nile nālu ajọ ihe asì.

6 I gēme ka ndi nile nēkwu okwu-ugha la n’iyì:

Madu nke bu onye-ọbara na onye- aghughọ, Jehova nākpọ ya onye-árú.

7 Ma mu onwem, n’uba nke ebere-Gi ka m’gābà n’ulo-Gi:

M’gākpọ isi ala n’ebe ulo uku nsọ Gi di n’egwu-Gi.

8 Jehova, dubem n’ezi omume-Gi n’ihi ndi nēchem anwu;

Me ka uzọ-Gi zie ezi n’irum.

9 N’ihi na ọ dighi ihe nke nēguzosi ike di n’ọnu-ya;

Ime-ha bu ila-n’iyì nile:

Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu;

Ha nēkwu okwu ire-utọ.

10 Ma ha ikpe, Chineke;

Ka ha da ada site na ndum-ọdu nile ha:

N’uba nke njehie nile ha nupu ha;

N’ihi na ha anupuwo isi imegide Gi.

11 Ma ka ndi nile ndi nābabà nime Gi ṅuria,

Ka ha tie nkpu ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi, n’ihi na I nēkpuchi ha ǹdò:

Ọzọ, ka obi nke ndi nāhu aha-Gi n’anya tọ ha utọ nime Gi.

12 N’ihi na Gi onwe-gi nāgọzi onye ezi omume;

Jehova, I ji otú ihe-ya si atọ Gi utọ b͕a ya buruburu dika ọta uku.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 6

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’ubọ-akwara, n’elu Octave. Abù Ọma Devid.

1 Jehova, Abalaram nba n’iwe-Gi,

Adọ-kwa-lam aka na nti n’ọnuma-Gi.

2 Merem amara, Jehova; n’ihi na onye taworo aru ka m’bu:

Mem ka m’diri ndu, Jehova; n’ihi na ọkpukpum nile nāma jijiji.

3 Nkpuru-obim nāma kwa jijiji nke-uku:

Ma Gi onwe-gi, Jehova, rùe ole mb͕e?

4 Lata, Jehova, dọputa nkpuru-obim:

Zọputam n’ihi ebere-Gi.

5 N’ihi na ọ dighi ncheta-Gi di n’ọnwu:

Nime ala-mọ ònye gēkele Gi?

6 Adọb͕uwom onwem n’ọlu n’ize-umem;

Kwa-abali ka m’nēme ka ihe-ndinam se n’elu anya-mirim;

Ejim anya-mirim de ihe m’ji edina.

7 Anyam emebiwo site na nkpasu-iwem dika uwe nla mebiri;

Ọ kawo nká n’hi ndi-nkpab͕um nile.

8 Si n’ebe m’nọ wezuga onwe-unu, unu nile ndi nālu ajọ ihe;

N’ihi na Jehova anuwo olu ákwám.

9 Jehova anuwo arirọ-amaram;

Jehova gānara ekperem.

10 Ihere gēme ndi-irom nile, ha gāma kwa jijiji nke-uku:

Ha gālaghachi azu, ihere gēme ha na mberede.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 7

Shiggaion nke Devid, nke ọ bùkuru Hehova, bayere okwu Kush, bú onye Benjamin.

1 Jehova, bú Chinekem, na Gi ka m’b͕abàworo:

Zọputam n’aka ndi nile nēsob͕um, naputakwam n’aka-ha:

2 Ka ọ ghara idọka nkpuru-obim dika ọdum,

Nētipia ya, mb͕e onye-nnaputa adighi.

3 Jehova, bú Chinekem, ọ buru na emewom nka;

Ọ buru na ajọ omume di n’ọbu-akam abua;

4 Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n’udo ihe ọjọ;

(Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n’efu:)

5 Ka onye-iro chua mkpuru-obim, rue ya aru;

Ka ọ zọda kwa ndum n’ala,

Me ka nsọpurum biri n’ájá.Selah

6 Bilie, Jehova, n’iwe-Gi,

Welie Onwe-gi elu imegide nrubiga-ókè-iwe nke ndi nākpab͕um:

Teta-kwa-ram; I nyewo ikpé iwu.

7 Ka nzukọ nke ndi nile di n’uwa di kwa Gi buruburu:

Gi laghachi kwa n’ebe di elu n’elu ya.

8 Jehova nēkpe ndi nile di iche iche ikpe:

Kpem ikpe, Jehova, dika ezi omumem si di, na dika izu-okèm si di nke di nimem.

9 Biko, kwe ka ihe ọjọ nke ndi nēmebi iwu gwusia, ma me ka onye ezi omume guzosie ike:

N’ihi na onye nānwa obi nile na akuru nile ka Chineke, bú Onye ezi omume, bu.

10 Ọtam dikwasi na Chineke,

Bú Onye nāzọputa ndi obi-ha ziri ezi.

11 Chineke bu onye-ikpe nēme ezi omume,

Ọ bu kwa Chineke nke nēwe iwe kwa-ubọchi.

12 Ọ buru na madu echigharighi, Ọ gāmu mma-agha-Ya ka ọ di nkọ;

Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, dozie ya ib͕a.

13 Ọ bu kwa imegide ya ka O doziworo ihe nile nke ọnwu;

Ọ nēme àkú-Ya ka ha buru ihe nēre ọku.

14 Le, ime ajọ ihe nēme ya;

Ọ turuwo kwa ime nmeb͕u, muputa okwu-ugha.

15 Olùlù ka o gwuworo, gwuputa ya,

O we da n’ebe-nbibi nke ọ nēme.

16 Nmeb͕u-ya gābiaghachi n’isi-ya,

Ọ bu kwa n’opu-n’isi-ya ka ihe-ike-ya gāridakwasi.

17 M’gēkele Jehova dika ezi omume-Ya si di:

M’gābùku kwa aha Jehova, bu Onye kachasi ihe nile elu, abù ọma.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 8

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’elu Gittith. Abù Ọma Devid.

1 Jehova, Onye-nwe-ayi,

Le otú aha-Gi di ebube n’uwa nile!

Gi Onye tiyeworo ebube-Gi n’elu ígwé.

2 I siwo n’ọnu umu-ntakiri na umu nāṅu ara tọ ntọ-ala ike,

N’ihi ndi-nkpab͕u-Gi,

Ime ka onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀ kwusi.

3 Mb͕e m’huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi,

Ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo;

4 Gini ka madu bu, na I nēcheta ya;

Na nwa nke madu, na I nēleta ya?

5 I we me ya ka ọ fọduru ya nke-ntà ibu Chineke,

I ji kwa nsọpuru na ima-nma kpube ya n’isi dika okpu-eze.

6 I nēme ya ka ọ nāchi ọlu nile nke aka-Gi abua;

Ihe nile ka I doro n’okpuru ukwu-ya abua:

7 Ewu na aturu na ehi, ha nile,

Ha na anu ọhia;

8 Nnunu elu-igwe, na azù nile nke oké osimiri,

Bú ihe nke nāgabiga n’uzọ nile nke oké osimiri nile.

9 Jehova, Onye-nwe-ayi,

Le otú aha-Gi di ebube n’uwa nile!

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 9

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’elu Muth-labben. Abù Ọma Devid.

1 M’gēji obim nile kele Jehova;

M’gākọ kwa akukọ oké ọlu-Gi nile.

2 M’gāṅuri ọṅu, obim gātọkwam utọ, nime Gi:

M’gābùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu;

3 Mb͕e ndi-irom laghachiri azu,

Su ngọngọ, si kwa n’iru Gi la n’iyì.

4 N’ihi na I kpewo ikpem ziri ezi na okwu-ikpem;

I nọduru n’oche-eze, buru onye-ikpe nēme ezi omume.

5 I basiwo mba nile ọzọ nba, I mewo ka ndi nēmebi iwu la n’iyì,

I hichapuwo aha-ha rue mb͕e nile ebighi-ebi.

6 Ndi-iro agwusiwo, ha bu nkpọnkpọ ebe rue mb͕e ebighi-ebi;

Ọzọ, obodo nile nke I ropuworo,

Ncheta-ha, ọbuná nke obodo ahu, alawo n’yì.

7 Ma Jehova nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi:

O doziwo oche-eze-Ya ikpe ikpe.

8 Ya onwe-ya gēkpe uwa dum madu bi ikpe n’ezi omume,

Ọ gēkpe ndi nile di n’uwa ikpe n’izi-ezi.

9 Jehova bu-kwa-ra onye anāzọpia ulo-elu,

Bú ulo-elu nke diri mb͕e nile nke nkpà;

10 Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi;

N’ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova.

11 Bùkuenu Jehova abù ọma, bú Onye bi na Zaion:

Gosinu omume-Ya nile n’etiti ndi nile di iche iche.

12 N’ihi na Onye nājuta ọbara ndi eb͕uru eb͕u echetawo ha:

O chezọghi iti-nkpu nke ndi ewedara n’ala.

13 Merem amara, Jehova;

Hu nweda-n’alam nke sitere n’aka ndi nākpọm asì,

Gi Onye nēbulim elu site n’ọnu-uzọ-ama ọnwu;

14 Ka m’we kọ akukọ otuto-Gi nile:

N’ọnu-uzọ-ama nile nke ada Zaion,

Ka m’ṅuria ọṅu na nzọputa-Gi.

15 Mba nile ọzọ emikpuwo n’olùlù ha mere:

N’ub͕u nke ha zobere ka anānwude ukwu-ha.

16 Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo:

N’ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n’ọnyà.Higgaion. Selah

17 Ndi nēmebi iwu gālaghachi n’ala mọ,

Bú mba nile ndi nēchezo Chineke.

18 N’ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka agēchezọ ob͕eye,

Olile-anya nke ndi di ume-ala n’obi agaghi-ala n’iyì rue mb͕e ebighi-ebi.

19 Bilie, Jehova; ekwela ka madu di ike:

Ka ekpe mba nile ikpe n’iru Gi.

20 Jehova, doro ha ihe-egwu:

Ka mba nile mara na nání madu ka ha bu.Selah

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 10

1 Jehova, n’ìhi gini ka I nēguzo nēbe di anya?

N’ìhi gini ka I nēzobe Onwe-gi na mb͕e nile nke nkpà?

2 Site na npako nke onye nēmebi iwu ka anāchu onye ewedara n’ala ọku ọku;

Anējide ha na nzube nile nke ha chère.

3 N’ihi na onye nēmebi iwu anyawo isi n’ihe nkpuru-obi-ya nāchọsi ike,

Onye nērita urù nēzighi ezi ka ọ gọziwo-kwa-ra, o lelìwo Jehova.

4 Onye nēmebi iwu, ka imi-ya si di elu, nāsi, Ọ dighi ajuju Ọ gāju.

Nzube-ya nile nāsi, ọ dighi Chineke ọ bula di.

5 Uzọ-ya nile di ike na mb͕e nile;

Ikpé-Gi nile di n’ebe di elu kari èbe anya-ya gēru:

Ndi nile nākpab͕u ya, ọ nāpù megide ha na nleli.

6 o siwo n’obi-ya, Agaghi-ewezugam n’ọnọdum:

Rue ọb͕ọ nile ọ dighi mb͕e m’gānọ n’ọdi-njọ.

7 Ọnu-ya juputara n’ọb͕ub͕a-iyi na aghughọ na mmegbu:

N’okpuru ire-ya ka nmeb͕u na ajọ ihe di.

8 Ọ nānọdu n’ebe iche-anwu nke obodo ntà nile:

N’ebe-nzuzo nile ka ọ nēb͕u onye nēmeghi ihe ọjọ:

Anya-ya abua nēwere nzuzo nyogide onye nāhuju anya.

9 Ọ neche anwu n’ebe-nzuzo dika ọdum n’okwu-ọhia-ya:

Ọ nēche anwu inwude onye ewedara n’ala:

Ọ na-anwude onye ewedara n’ala, mb͕e ọ dọbatara ya n’ub͕u-ya.

10 Anāzọpia ya, ọ nāmakpu amakpu,

Ndi nāhuju anya adawo kwa n’ala site n’aka ndi-ya nwere ume.

11 Ọ siwo n’obi-ya, Chineke echezọwo:

O zobewo iru-Ya; ọ dighi mb͕e Ọ huru ya.

12 Bilie, Jehova; Chineke, welie aka-Gi elu:

Echezọla ndi ewedara n’ala.

13 N’ìhi gini ka onye nēmebi iwu lelìworo Chineke?

Ọ siwo n’obi-ya, I gaghi-aju ajuju.

14 I huwo ya; n’ihi na Gi onwe-gi nēlegide nmeb͕u na nkpasu-iwe, itiye ya n’aka-Gi:

N’aka-Gi ka onye nāhuju anya nārapu onwe-ya;

Onye nēyere nwa-nb͕ei aka ka I buworo.

15 Tijie ogwe-aka nke onye nēmebi iwu;

Onye ọjọ kwa, I gājuta nmebi-iwu-ya rue mb͕e I gaghi-achọta ya.

16 Jehova bu Eze rue mb͕e nile ebighi-ebi:

Mba nile ọzọ esiwo n’ala-Ya lapu n’iyì.

17 I nuwo ihe ndi di ume-ala n’obi nāchọsi ike, Jehova:

I nēdozi obi-ha, I nēme ka nti-Gi ge:

18 Ikpe nwa-nb͕ei na onye anāzọpia azọpia ikpe,

Ka madu nke sitere n’uwa we ghara ime ka madu ma kwa jijiji ọzọ.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 11

Abù Oma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke Devid.

1 Na Jehova ka m’b͕abàworo:

Ùnu si aṅa si nkpuru-obim,

Felaganu n’ugwu-unu dika nnunu?

2 N’ihi na, le, ndi nēmebi iwu nāzọ uta-ha ukwu ikwe ya,

Ha edoziwo àkù-ha n’elu eriri-uta,

Ib͕a ndi obi-ha ziri ezi n’ochichiri.

3 N’ihi na anākwada ide nile;

Gini ka onye ezi omume meworo?

4 Jehova nọ n’ulo uku Ya di nsọ,

Jehova, n’elu-igwe ka oche-eze-Ya di;

Anya-Ya nāhu, mbubere-anya-Ya nānwa, umu madu.

5 Jehova n’anwa onye ezi omume:

Ma onye nēmebi iwu na onye nāhu ihe-ike n’anya ka nkpuru-obi-Ya nākpọ asì.

6 Ya me ka ib͕udu zokwasi ndi nēmebi iwu dika miri-ozuzo;

Ka ọku na brimstone na ifufe di ọku buru òkè ìko-ha.

7 N’ihi na onye ezi omume ka Jehova bu; ezi omume ka Ọ huru n’anya:

Ndi ziri ezi gāhu iru-ya.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 12

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’elu Octave. Abù Ọma Devid.

1 Jehova, zọputa; n’ihi na onye-ebere agwusiwo;

N’ihi na ndi kwesiri ntukwasi-obi agwupuwo n’etiti umu madu.

2 Ihe-efu ka ha nēkwurita, otù onye na ibe-ya:

Eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu ire-utọ na obi abua ka ha ji ekwu.

3 Ka Jehova bipu eb͕ub͕ere-ọnu nile nke nekwu okwu ire-utọ,

Na ire nke nēkwu oké ihe:

4 Ndi siworo, Ayi nēme ire-ayi ka ọ di ike;

Eb͕ub͕ere-ọnu-ayi di n’akuku ayi: ònye ka ayi nwere dika onye-nwe-ayi?

5 N’ihi ipunara ndi ewedara n’ala ihe, n’ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye,

Ub͕u a ka M’gēbili, ka Jehova kwuru;

M’gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe.

6 Okwu-ọnu Jehova nile bu okwu-ọnu di ọcha;

Ha bu ọla-ọcha anuchaworo n’ite-nnucha nke nērusa n’ala,

Nke esichaworo ub͕ò asa.

7 Gi onwe-gi, Jehova, gēdebe ha,

I gēchezi ha ka ha pua n’aka ọb͕ọ a rue mb͕e ebighi-ebi.

8 Ndi nēmebi iwu nējeghari buruburu,

Mb͕e anēbuli ihe jọb͕uru onwe-ya elu n’ebe umu madu nọ.