Categories
JOB

JOB 35

1 Elaihu we nāza, si,

2 Ọ̀ bu nka ka i nēchè na ọ bu ikpé-gi?

Ma-ọbu Ì siwo, Ezi omumem kariri nke Chineke?

3 Na i nāsi, Gini ka ọ bara Gi?

Ùrù gini ka ọ baram kari nmehiem?

4 Mu onwem gāzaghachi gi,

Gi na ndi-eyì-gi.

5 Legide elu-igwe anya, hu;

Kiri kwa mbara-ígwé nile nke di elu kari gi.

6 Ọ buru na i mehiewo, gini ka i nēmegide Ya?

Ọ buru kwa na njehie-gi abawo uba, gini ka i neme Ya?

7 Ọ buru na i bu onye ezi omume, gini ka i nēnye Ya?

Ma-ọbu gini ka Ọ nānara n’aka-gi?

8 Nmebi-iwu-gi gēmetu nwoke dika gi;

Ezi omume-gi gēmetu kwa nwa nke madu.

9 N’ihi iba-uba nke nmeb͕u ka ha nēti nkpu;

Ha nētiku onye gēyere ha aka n’ihi ogwe-aka ndi di ike.

10 Ma ọ dighi onye siri, Òle ebe Chineke nọ, bú Onye merem,

Onye nēnye abù ọma n’abali;

11 Onye nēzí ayi ihe kari anu nke uwa,

Ọ nēme kwa ka ayi mara ihe kari anu-ufe nke elu-igwe?

12 N’ebe ahu ka ha nēti nkpu, ma Ọ dighi-aza,

N’ihi npako di ọjọ.

13 N’ezie Chineke agaghi-anu ihe-efu,

Onye puru ime ihe nile agaghi-ekiri kwa ya.

14 Otú ọ di, mb͕e i nāsi na i dighi-ekiri Ya,

Okwu-ikpe-gi di n’iru Ya, i gēchere kwa Ya.

15 Ma ub͕u a, n’ihi na iwe-Ya eletaghi,

Na n’ihi na Ọ ribaghi njehie ama nke-uku;

16 N’ihi ya ka Job nāsaghepu ọnu-ya n’efu;

Ọ bughi n’ọmuma-ihe ka O nēme ka okwu-ya nile ba uba.

Categories
JOB

JOB 36

1 Elaihu we nēkwu kwa, si,

2 Cherem nwa mb͕e ntà, m’gēkwuputa-kwa-ra gi;

N’ihi na okwu ọzọ di ikwuru Chineke.

3 M’gēsi n’ebe di anya bute ọmuma-ihem,

Ọ bu kwa Onye kpurum ka m’gēnye ezi omume.

4 N’ihi na n’ezie ọ bughi okwu-ugha ka okwum nile bu:

Onye zuru okè n’ọmuma-ihe nọyere gi.

5 Le, Chineke di ike, Ọ dighi-aju kwa onye ọ bula:

Ọ di ike n’ike nke obi.

6 Ọ dighi-edebe ndu nke onye nēmebi iwu:

Ma Ọ nēnye ndi ewedara n’ala ezi ikpé.

7 Ọ dighi-esepu anya-Ya n’aru onye ezi omume:

Ma ọbuná n’ebe ndi-eze nọ n’oche-eze

Ka Ọ nēme ka ha nọkwasi rue mb͕e ebighi-ebi, ha we di elu.

8 Ma ọ buru na ejide ha n’udọ̀ nke nweda-n’ala,

Dika ndi ekeworo ab͕u nime nkpọrọ-ukwu;

9 O we nēgosi ha ọlu-ha,

Na njehie nile ha, na ha nēme onwe-ha ndi di ike megide Ya.

10 O nēkpughe kwa nti-ha idọ ha aka na nti,

Ọ si ha si n’ajọ ihe laghachi.

11 Ọ buru na ha anu, we fè Ya òfùfè,

Ha gēme ka ubọchi nile ha gwusia n’ọdi-nma,

Me kwa ka arọ nile ha gwusia n’ihe-utọ.

12 Ma ọ buru na ha adighi-anu ha gāla n’iyì site n’ihe-agha,

Kubìe ume nēnweghi ọmuma-ihe.

13 Ma ndi emeruru obi-ha emeru nēdo iwe n’obi:

Ha adighi-etiku Chineke mb͕e O keworo ha ab͕u.

14 Nkpuru-obi-ha nānwu na nwata,

Ndu-ha nāla kwa n’iyì n’etiti ndi edoro nsọ ikwa iko.

15 Ọ nādọputa onye ewedara n’ala na nweda-n’ala-ya.

Ọ nēkpughe kwa nti-ha nime nmeb͕u.

16 Ọbuná otú a ka Ọ ràraworo gi isi n’ọnu nkpab͕u

Ba n’ebe sara mbara, nke ebe di nkpa nādighi n’okpuru ya;

Ndọba ihe-oriri nke table-gi gējuputa kwa n’abuba.

17 Ma i juputawo n’okwu-ikpé nke onye nēmebi iwu:

Okwu-ikpé na ezi ikpé nējide gi.

18 N’ihi na lezie anya ka ọnuma ghara irafu gi site n’otiti-ihe;

Ekwe-kwa-la ka iba-uba nke ihe-nb͕aputa wezuga gi.

19 Ọ̀ gēdo àkù-gi n’usoro ka i ghara inọ na nkpà?

Ma-ọbu ume nile nke ike-gi?

20 Ekusila ume ike ibiaru abali,

Bú mb͕e ndi di iche iche nārigo n’ọnọdu-ha.

21 Lezie anya, echela ajọ ihe iru:

N’ihi na nka ka i rọputaworo kari nweda-n’ala.

22 Le, Chineke nēme Onwe-ya ka Ọ nọ n’elu n’ike-Ya:

Ònye bu onye-ozizí dika Ya?

23 Ònye wereworo uzọ-Ya leta Ya?

Ma-ọbu ònye siworo, I mewo ajọ omume?

24 Cheta ka i me ọlu-Ya ka ọ di uku,

Bú nke madu bùworo abù bayere ya.

25 Madu nile elewo ya anya;

Madu nēlegide ya site n’ebe di anya.

26 Le, Chineke di uku, ayi amaghi kwa Ya;

Ọnu-ọgugu arọ-Ya enweghi kwa ngwuputa.

27 N’ihi na Ọ nēsepu nkpuru miri,

Nke nāghọ miri-ozuzo diri alulu-Ya:

28 Nke mbara-ígwé nāwuda, nātasa madu n’uba.

29 Ọzọ, ọ̀ di onye nāghọta nb͕asa igwe-oji

Nbib͕ọ nke ulo-ntu-Ya?

30 Le, Ọ b͕asawo ìhè-Ya n’elu ya;

Ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri ka O kpuchiwo-kwa-ra.

31 N’ihi na ndia ka O ji nēkpe ndi nile di iche iche ikpe;

Ọ nēnye ihe-oriri n’uba.

32 Ọ jiwo ìhè kpuchi ọbu-aka-Ya abua;

We nye ya iwu imegide onye nēmegide Ya.

33 Nkpọtu-ya nēgosi ihe bayere Ya,

Gosi kwa anu-ulo ihe bayere Onye nārigo.

Categories
JOB

JOB 37

1 Ọzọ, obim nāma jijiji bayere nka,

Ọ nēme kwa nkpatu pua n’ọnọdu-ya.

2 Genu nti nke-ọma n’ime-nkpatu nke olu-Ya,

Na ntamu nke nēsi n’ọnu-Ya puta.

3 N’okputu elu-igwe nile ka Ọ nēzisa ya,

Ìhè-ya dikwasi kwa akuku nile nke uwa.

4 Mb͕e ọ gasiri olu nāb͕ọ uja;

Ọ nēwere olu nbili-elu-Ya ma éb͕è-elu-igwe:

Ọ dighi-eb͕ochi ha mb͕e anānu olu-Ya.

5 Chineke nēji olu-Ya ma éb͕è-elu-igwe n’uzọ di ebube;

Ọ nēme ihe uku, ma ayi amaghi ha.

6 N’ihi na Ọ nāsi snow,

Na oké miri-ozuzo,

Na oké miri-ozuzo nke miri-ozuzo-Ya di ike, Di n’ala.

7 Ọ nākachi aka madu ọ bula akàra;

Ka madu nile O mere we mara ya.

8 Anu-ọhia we nābà n’ọ̀té-ya,

Ọ nānọdu kwa n’ebe-obibi-ya.

9 N’ime-ulo Ndida ka oké ifufe nēsi bia:

Ọ bu kwa n’Ugwu ka oyi nēsi bia.

10 Anēsi n’iku-ume Chineke nye ice:

Anēme kwa obosara miri ka ọ di warara.

11 Ọzọ, O nēji miri-ozuzo bob͕u oké igwe-oji;

Ọ nāb͕asa igwe-oji nke ìhè-Ya:

12 Anēchighari kwa nke ahu buruburu site n’okpukpe-Ya,

Ka ha we me ihe ọ bula nke Ọ nēnye ha n’iwu

N’elu-uwa dum madu bi:

13 Ma ọ bu n’ihi nkpa-n’aka, ma-ọbu n’ihi uwa-Ya,

Ma-ọbu n’ihi ebere, ka Ọ nēme ka ọ biarue.

14 Ṅa nti na nka, Job:

Guzo, ghọta oké ọlu nile nke Chineke.

15 Ì mara otú Chineke nēnye ha iwu,

Nēme kwa ka ìhè igwe-oji-Ya mua?

16 Ì mara otú oké igwe-oji ji kwuru efekefe,

Oké ọlu nke Onye zuru okè n’ọmuma-ihe?

17 Gi onye uwe-gi nēkpo ọku,

Mb͕e Ọ nēme ka uwa di jū site n’ifufe Ndida.

18 Ì gēso Ya me ka mbara-ígwé nile sa mbara,

Nke di ike dika enyo awuru awu?

19 Me ka ayi mara ihe ayi gāsi Ya;

Ayi adighi-edo okwu-ayi n’usoro n’ihi ọchichiri.

20 Àgākọrọ Ya na m’gēkwu okwu?

Ma-ọbu ọ̀ di madu ọ bula siri ka eloda ya?

21 Ma ub͕u a madu ahughi ìhè nke nēb͕upu na mbara-ígwé:

Ifufe we gabiga, me ka ha di ọcha.

22 N’Ugwu ka ọla-edo, bú ọmùmù-ìhè, nēsi bia:

Chineke ka ebube di egwu nādikwasi.

23 Onye puru ime ihe nile, ayi achọputaghi Ya; Ọ di uku n’ike:

N’ikpe na iba-uba nke ezi omume Ọ dighi-eweda n’ala.

24 N’ihi ya madu nātu egwu Ya:

Ọ dighi-ahu ndi nile obi-ha mara ihe.

Categories
JOB

JOB 38

1 Jehova we si n’oké ifufe za Job, si,

2 Ònye bu onye a nke nēme ka ndum-ọdu b͕a ọchichiri

Site n’okwu ọmuma-ihe nādighi?

3 Biko, ke ihe-ọkiké n’úkwù-gi dika onye di ike:

M’gāju kwa gi, gi me kwa ka M’mara.

4 Òle ebe i nọ mb͕e M’tọro ntọ-ala uwa?

Gosim, ma ọ buru na i mara nghọta.

5 Ònye doro ọtùtù-ya nile, ma asi na i mara?

Ma-ọbu ònye setiri eriri-ọtùtù n’elu ya?

6 N’èlu gini ka emere ka ukwu-ya nile bamie?

Ma-ọbu ònye tọb͕ọrọ nkume nkuku-ya,

7 Mb͕e kpakpando ututu nētikọ nkpu ọṅù,

Umu Chineke nile we tisie nkpu ọṅù ike?

8 Ma-ọbu ònye ji ibo-ọnu-uzọ mechibido oké osimiri,

Mb͕e ọ waputara dika agāsi na ọ nēsi n’àkpà-nwa puta;

9 Mb͕e M’doro igwe-oji ka ọ buru uwe-ya,

Na oké ọchichiri ka ọ buru ákwà-ọkiké-ya,

10 M’we kpawara ya ókèm,

Tiye ihe-ntuchi na ibo-ọnu-uzọ,

11 Si, Rue ebe a ka i gābia, ma i gaghi-agabiga ya;

N’ebe a ka agākwusi kwa npako nke ebili-miri-gi nile?

12 Site na nmalite ubọchi-gi ọ̀ di mb͕e i nyere ututu iwu,

Me chi-ọbubọ ka ọ mara ọnọdu-ya;

13 Ka o we jide akuku nile nke uwa aka,

Ewe si nime ya rurupu ndi nēmebe iwu?

14 Ọ nāb͕anwe onwe-ya dka urọ akàrà;

Ha nēguzo kwa onwe-ha dika uwe:

15 Anēb͕ochi kwa ìhè-ha n’ebe ndi nēmebi iwu nọ,

Anānyaji kwa ogwe-aka di elu.

16 Ì bàwo n’ebe-nsuputa nile nke oké osimiri?

Ma-ọbu ì jeghariwo n’ebe michasiri emi nke ob͕u-miri?

17 Èkpugheworo gi ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu?

Ma-ọbu ì nāhu ọnu-uzọ-ama nke onyinyo ọnwu?

18 Ì ghọtawo rue obosara uwa?

Gosim, ma ọ buru na i nazuwo ya.

19 Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe-obibi ìhè?

Ọchichiri kwa, òle ebe ọ di, bú ọnọdu-ya;

20 Nke i gēwere ya je n’ókè-ala-ya,

Nke i gāghọta kwa uzọ nile nke ulo-ya?

21 I mawo, n’ihi na mb͕e ahu ka anāmu gi,

Ọnu-ọgugu ubọchi-gi ri-kwa-ra nne!

22 Ì bàwo n’ulo-nkwakọba nile nke snow,

Ma-ọbu ì nāhu ulo-nkwakọba nile nke ákú-miri-igwe,

23 Nke M’b͕ochiworo nye mb͕e nkpà,

Nye ubọchi ọ̀gù na agha?

24 Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe anēkesa ìhè,

Ebe anāb͕asa ifufe ọwuwa-anyanwu n’elu uwa?

25 Ònye waworo uzọ-miri nye iju-miri,

Ma-ọbu uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe;

26 Ime ka miri zokwasi ala ebe ọ dighi onye ọ bula bi;

Bú ọzara madu nēbighi nime ya;

27 Ime ka afọ ju nkpọnkpọ-ebe nke tọb͕ọrọ n’efu;

Na ime ka o pue, bú npuputa ọhu nke ahihia ndu?

28 Miri-ozuzo, ọ̀ nwere nna?

Ma-ọbu ònye muworo nkpuru igirigi?

29 N’àfọ onye ka ice nēsi puta?

Hoar-frost nke elu-igwe kwa, ònye muworo ya?

30 N’ihe dika nkume ka miri nēzobe onwe-ha,

Iru ob͕u-miri nāraru kwa araru.

31 Ì nēkekọta iru-utọ Pleiades,

Ma-ọbu tọsa ihe-ọdudọ nile nke Orion?

32 Ì nēme ka Mazzaroth puta na mb͕e-ya?

Ma-ọbu ì nēdu Bear na umu-ya?

33 Ì mawo ukpuru nile nke elu-igwe?

Ma-ọbu ì nēdo ndozi-okwu-ya n’uwa?

34 Ì nēweli olu-gi elu rue igwe-oji,

Ka njubiga miri we kpuchie gi?

35 Ì nēzipu àmùmà, ka ha we je,

Si kwa gi, Le ayi?

36 Ònye tiyeworo amam-ihe n’akuku di nime?

Ma-ọbu ònye nyeworo akọ-na-uche nghọta?

37 Ònye nāgu mbara-ígwé ọnu site n’amam-ihe?

Ma-ọbu ònye nātọb͕ọ karama-akpukpọ nile nke elu-igwe ib͕apu miri-ha,

38 Mb͕e ájá nāghọ urọ,

Mb͕e ọkpurukpu-ájá nile nārapara n’aru onwe-ha?

39 Ì nāchuru nne-ọdum anu-ndọb͕u?

Ma-ọbu ì nēme ka afọ-iri-nri umu-ọdum ju,

40 Mb͕e ha nāmakpu n’ebe-obibi-ha,

Nọdu kwa n’okwu-ọhia iche anu?

41 Ònye nēdoziri ugolo-ọma ihe-oriri-ya,

Mb͕e umu-ya nētiku Chineke, Nāwaghari nēnweghi ihe-oriri?

Categories
JOB

JOB 39

1 Ì mawo mb͕e ewu-ọhia nke nkume di elu ji amu nwa?

Ì nāriba ama mb͕e nne-ele nāmuputa nwa?

2 Ì nāgu ọnwa ha nọzuru n’imu nwa ọnu?

Ma-ọbu ì mawo mb͕e ha ji amu nwa?

3 Ha nēruru ala, muputa umu-ha,

Tuzuga ihe-nb͕u-ha.

4 Aru nāma umu-ha nma, ha nētolite n’ọhia;

Ha nāpu, ha adighi-alaghachikute kwa ha.

5 Ònye zipuworo inyinya-ibu-ọhia ka o nwere onwe-ya?

Ma-ọbu ònye tọpuworo ab͕u inyinya-ibu-ọhia?

6 Nke M’meworo ala ihe nādighi ka ọ buru ulo-ya,

Me kwa ala bu nnú nnú ka ọ buru ebe-obibi-ya.

7 Ọ nāchì ùzù obodo ọchì,

Ọ dighi-anu nbib͕o nke onye nāchi madu n’ihe-ike.

8 Ebe-nleputa nke ugwu bu ebe ọ nāzù onwe-ya,

Akwukwọ ndu ọ bula ka ọ nāchọ.

9 Àtu gēkwe ibu orù-gi?

Ma-ọbu ọ̀ gānọ ọnọdu-abali n’akuku ebe i nāzù anu-ulo-gi?

10 Ì gēji udọ̀-ya libe atu n’ihe-ọlu n’ọ̀b͕à ala-ubi?

Ma-ọbu ò gēso gi me ndagwurugwu ka ha di lari?

11 Ì gātukwasi ya obi n’ihi na ike-ya riri nne?

Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n’ọlu?

12 Ì gēkwere na ya, na ọ gēbulata nkpuru-ọghigha-gi,

Chikọta ọka nke ebe-nzọcha-ọka-gi?

13 Nkù nke enyi-nnunu nāṅuri ọṅu;

Ma nkù-ya na ábúbà-ya, hà di ebere?

14 N’ihi na ọ nārapu àkwá-ya n’ala,

Nēme ka ha kpo ọku n’elu ájá,

15 O we chezọ na ukwu gāzọpia ha,

Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu.

16 O mewo umu-ya ihe-ike, dika agāsi na ha abughi ihe o nwere:

Ọ bu n’efu ka ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu bu, ma ọ tughi egwu;

17 N’ihi na Chineke emewo ya ka o chezọ amam-ihe,

O kèghi kwa ya òkè nime nghọta.

18 Na mb͕e o ji seti onwe-ya n’elu ib͕a ọsọ,

Ọ nāchì inyinya, nāchì kwa onye ọ nēbu, ọchì.

19 Ì nēnye inyinya idi-ike-ya?

Ì nēyikwasi olu-ya ọzà nēme nkpatu?

20 Ì nēme ya ka ọ kwua ǹtù dika igurube?

Ebube nke imapu-imi-ya di oké ujọ.

21 Ọ nābọ ukwu na ndagwurugwu, obi nātọ kwa ya utọ n’ike-ya:

Ọ nāpu izute ihe-agha.

22 Ọ nāchì oké egwu ọchì, ma ọ dighi-atu ujọ;

Ọ dighi-esi kwa n’iru mma-agha chighari azu.

23 Àkpà-àkú nēkwu wọghiri wọghiri n’elu ya,

Ya na ob͕ub͕u-àmùmà nke ube, na arua.

24 Nime nmali-elu-ya na ime-nkpatu-ya o nēloda ala;

Ọ dighi-ekwe kwa na ọ bu olu opi-ike.

25 Mb͕e ọ bula opi-ike ji adà udà ọ si, Ehe!

Ọ bu kwa site n’ebe di anya ka ọ nānu ísì agha,

Na éb͕è-elu-igwe, bú nbib͕ọ ndi-ọchi-gha, na iti-nkpu.

26 Ọ̀ bu site na nghọta-gi ka eb͕é nēfego n’elu,

B͕asa kwa nkù-ya n’ebe Ndida di?

27 Ọ̀ bu n’okwu-ọnu-gi ka ugo nēfeli elu,

Ma-ọbu me akwu-ya ka ọ di elu?

28 N’elu nkume di elu ka o nēbi, nọ kwa ọnọdu-abali,

N’elu ọnu nkume di elu na ebe ewusiri ike.

29 Site n’ebe ahu ka o nyoputaworo ihe-oriri;

Anya-ya abua nēsi n’ebe di anya legide ya.

30 Umu-ya nāmicha kwa ọbara:

Ọzọ, ebe ndi eb͕uru eb͕u di, n’ebe ahu ka ọ nọ.

Categories
JOB

JOB 40

1 Jehova we za Job, si,

2 Onye nādọ aka na nti, ọ̀ nāluso

Onye puru ime ihe nile ọ̀gù?

Onye nābara Chineke nba, ya za ya.

3 Job we za Jehova, si,

4 Le, abum onye elelìworo; gini ka m’gāzaghachi Gi?

Atukwasiwom, akam, n’ọnum.

5 Otù ub͕ò ka m’kwuworo okwu, m’gaghi-aza kwa;

E, ub͕ò abua, ma m’gaghi-aza kwa ọzọ.

6 Jehova we si n’oké ifufe za Job, si,

7 Biko, ke ihe-ọkiké n’úkwù-gi dika onye di ike:

M’gāju gi, gi me kwa ka M’mara.

8 Ì nēmebi kwa ikpém?

I nāmam ikpe, ka i we buru onye ezi omume?

9 Ma-ọbu ọ̀ bu ogwe-aka dika Chineke ka i nwere?

Ọ̀ bu kwa olu dika Ya ka i gēji ma dika éb͕è-elu-igwe?

10 Biko, were nbili-elu na idi-elu chọ onwe-gi nma;

Were kwa ebube na ima-nma yikwasi onwe-gi.

11 Wusa nrubiga-ókè nke iwe-gi:

Hu kwa onye-npako ọ bula, me ka ọ di ala.

12 Hu onye-npako ọ bula, me ka o ruru ala;

Zọpia kwa ndi nēmebi iwu n’ọnọdu-ha.

13 Zobekọ ha n’ájá;

Kechie iru-ha n’ebe zoro ezo.

14 Emesia Mu onwem gēkele kwa gi,

Si na aka-nri-gi nāzọputa gi.

15 Biko, le otobo, nke M’kèworo gi na ya;

Ọ nāta ahihia dika ehi.

16 Biko, le, ike-ya di n’úkwù-ya,

Ume-ya di kwa n’akwara nile nke afọ-ya.

17 Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar:

Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya.

18 Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi;

Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè.

19 Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke:

Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso.

20 N’ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya;

Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú.

21 N’okpuru osisi lotus ka ọ nēdina,

N’ebe nzuzo nke amì, na apiti.

22 Osisi lotus nēji ǹdò-ha b͕ochie ya;

Osisi willow nke miri-iyi di ya buruburu.

23 Le, osimiri nērùsi ike, ọ dighi-ama jijiji:

Ọ nātukwasi obi, mb͕e Jọdan nāwaputa rue ọnu-ya.

24 Ànējide ya mb͕e ọ nēle anya?

Ma-ọbu ànēwere ọnyà mapue imi-ya?

Categories
JOB

JOB 41

1 Ì gēji nkò-azù dọrọ oké agu-iyi?

Ma-ọbu ì gēji ndọ̀ biada ire-ya?

2 Ì gētiye udọ̀-ami n’imi-ya?

Ma-ọbu i gēji ngu ígwè dupue àb͕à-ya?

3 Ọ̀ gāriọ gi ọtutu aririọ-amara?

Ma-ọbu ọ̀ gāgwa gi okwu di nrò?

4 Ò gēso gi b͕a ndu?

Ì gēwere ya ka ọ buru orù rue mb͕e ebighi-ebi?

5 Ì gēji ya gwu egwú dika nnunu?

Ma-ọbu ì gēke ya ab͕u nye umu-ab͕ọghọ-gi?

6 Òtù ndi-azù, hà gēji ya zu ahia?

Hà gēkè ya n’etiti ndi-ahia?

7 Ì gēji ígwè ebiri nkò maju akpukpọ-aru-ya?

Ma-ọbu ì gēji ube-azù maju isi-ya?

8 Tukwasi ya ọbu-aka-gi;

Cheta agha, eme-kwa-la ya ọzọ.

9 Le, nchere-ya bu ihe-ugha:

Àdighi-atuda madu ọbuná n’ile ya anya?

10 Ọ dighi onye di irè nke ikpọte ya:

Ònye kwa bu onye ahu nke gēguzo onwe-ya n’irum?

11 Ònye buru uzọ nyem, nke M’gākwughachi?

Ihe ọ bula nke di n’okpuru elu-igwe nile, nkem ka ọ bu.

12 M’gaghi-ab͕a nkiti bayere ihe nile di ya n’aru,

Ma-ọbu okwu nke idi-ike-ya, ma-ọbu ima-nma nke odudo-n’usoro-ya.

13 Ònye kpugheworo iru uwe-ya?

Ònye gābà n’ab͕a-ya apiajiri okpùkpù abua?

14 Ònye gēmeghe uzọ nke iru-ya?

Ezé-ya di oké ujọ buruburu.

15 Usoro nke ọta azu-ya bu npako-ya,

Ha bu ihe emechiri emechi dika agāsi na eji ihe-akàrà siri ike mechi ya.

16 Dika otù si nọ ibe-ya nso,

Ifufe adighi-abà n’etiti ha.

17 Anēme ka otù rapara n’aru nwa-nne-ya;

Ha nējisi onwe-ha ike, agaghi-ekesa kwa ha.

18 Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu,

Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ.

19 N’ọnu-ya ka ọku-ọwa nāputa,

Icheku-ọku nēwepuga kwa onwe-ha.

20 N’oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa,

Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere.

21 Iku-ume-ya nāmunye icheku,

Ire-ọku nēsi kwa n’ọnu-ya puta.

22 N’olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya,

Ọ bu kwa n’iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú.

23 Ibewa urù anu-aru-ya rapara n’aru onwe-ha:

O siri ike n’aru ya; agaghi-emeghari ya.

24 Obi-ya siri ike dika nkume;

O si-kwa-ra ike dika nne-nkume-igwe-nri.

25 Mb͕e o nēbuli onwe-ya ndi di ike nātu ujọ:

Site n’imebi-obi ha nēsihie uzọ.

26 Ọ buru na madu ewere mma-agha biakwasi ya, mma-agha ahu adighi-eguzosi ike;

Ya na ube, na àkú, na uwe-agha.

27 Ọ nāgu ígwè n’okporo-ọka,

Nāgu kwa ọla n’osisi rere ure.

28 Àkú adighi-eme ka ọ b͕alaga:

Nkume èbè ab͕anweworo ya ahihia-ọka.

29 Anāgu ndele n’ahihia-ọka:

Ọ nāchì kwa nkpọtu arua ọchì.

30 Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ:

Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n’elu apiti.

31 Ọ nēme miri di omimi ka ọ b͕ọ dika ite:

Ọ nēme oké osimiri ka ọ di ka manu-otite nēsì ísì utọ.

32 Ọ nēme uzọ ka ọ nēnwuso ya;

Madu gēchè na ob͕u-miri nwere isi-awọ.

33 Ọ dighi nke di ka ya n’elu ájá uwa,

Nke emeworo nēnweghi ujọ.

34 Ihe nile nke di elu ka ọ nāhu:

Ya onwe-ya bu eze anu-ọhia nile di nganga.

Categories
JOB

JOB 42

1 Job we za Jehova, si,

2 Amawom na I puru ime ihe nile,

Amawokwam na adighi-eb͕ochi nzube ọ bula nke sitere na Gi.

3 Ònye bu onye a nke nēzobe ndum-ọdu n’enweghi ọmuma-ihe?

N’ihi ya ka m’gosiworo ihe nke m’nādighi-aghọta,

Ihe dikaririm ebube, nke m’nādighi-amata.

4 Biko, nuru, mu onwem gēkwu kwa;

M’gāju Gi, Gi me kwa ka m’mara.

5 Site n’ọnunu nti ka m’nuru Gi;

Ma ub͕u a anyam ahuwo Gi.

6 N’ihi nka ka m’nāju onwem aju, we chègharia

N’elu ájá na ntu.

7 O rue, mb͕e Jehova gwasiri Job okwu ndia, na Jehova siri Elifaz, bú onye Timan, Iwem di ọku megide gi, megide kwa ndi-eyì-gi abua: n’ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuworo.

8 Ma ub͕u a, chirinu n’onwe-unu oke-ehi asa na ebulu asa, jekuru orùm, bú Job, surere onwe-unu àjà-nsure-ọku; Job, bú orùm, gēkpe kwa ekpere bayere unu; n’ihi na n’ezie ọ bu ya ka M’gāhu iru-ọma, ka M’ghara imeso unu dika nzuzu-unu si di; n’ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuru.

9 Elifaz, bú onye Timan, na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama, we je, me dika Jehova gwara ha: Jehova we hu Job iru-ọma.

10 Jehova me-kwa-ra ka ndọta-n’agha Job lata, mb͕e o kpere ekpere bayere ndi-eyì-ya: Jehova we tukwasi n’ihe nile Job nwere okpùkpù abua.

11 Umu-nne-ya ndikom nile, na umu-nne-ya ndinyom nile, na ndi nile mara ya na mb͕e gara aga, we biakute ya, so ya rie nri n’ulo-ya: ha we gosi ya ebere ha ji n’aru ya, kasi kwa ya obi bayere ihe ọjọ ahu nile nke Jehova mere ka ọ biakwasi ya: ha we nye ya, nwoke ọ bula otù iberibe ego, na nwoke ọ bula otù nb͕a-aka ọla-edo.

12 Ọzọ, Jehova gọziri ikpe-zu Job kari nmalite-ya, o we nwe orú nnù ewu na aturu na nnù iri-na-ise, na nnù camel iri-na-ise, na nnù ehi ise ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu abua na ọgu iri.

13 O nwe-kwa-ra umu-ndikom asa na umu-ndinyom atọ.

14 O we kpọ aha nwayi mbu, Jemaima; na aha nwayi nke-abua, Kezaia; na aha nwayi nke-atọ, Keren-hapuk.

15 Ma ahughi ndinyom, mara nma dika umu-ndinyom Job n’ala ahu nile: nna-ha we nye ha ihe-nketa n’etiti umu-nne-ha ndikom.

16 Job we di ndu mb͕e ihe a gasiri ọgu arọ asa, o we hu umu-ya, na umu umu-ya, bú ọb͕ọ anọ.

17 Job we nwua, buru agadi, ubọchi ndu-ya ju-kwa-ra ya afọ.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 1

1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nējeghi ije na ndumọdu ndi nēmebi iwu,

Nke nēguzoghi kwa n’uzọ ndi nmehie,

Nke nānọghi kwa n’ọnọdu ndi nākwa emò.

2 Kama n’iwu Jehova ka ihe-utọ-ya di;

Ọ bu kwa n’iwu-Ya ka ọ nātughari uche ehihie na abali.

3 Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n’akuku iyi juputara na miri,

Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya,

Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu;

Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma.

4 Ọ bughi otú a ka ndi nēmebi iwu di;

Kama ha di ka ib͕ob͕o-ọka nke ifufe nēfesa.

5 N’ihi nka ndi nēmebi iwu agaghi-eguzosi ike n’ikpé,

Ndi-nmehie agaghi-eguzosi kwa ike na nzukọ ndi ezi omume.

6 N’ihi na Jehova mara uzọ ndi ezi omume:

Ma uzọ ndi nēmebi iwu gāla n’iyì.

Categories
ABÙ ỌMA

ABÙ ỌMA 2

1 N’ìhi gini ka mba nile meworo oké nkpọtu?

N’ìhi gini ka ndi nile di n’uwa nātughari ihe-efu n’uche?

2 Ndi-eze nke uwa nēguzo onwe-ha,

Ndi-isi nāb͕akọta kwa ìzù,

Imegide Jehova, na imegide onye-Ya etere manu, si,

3 Ka ayi tijie ab͕u nile ha,

Tufue udọ̀ nile ha n’aru ayi.

4 Onye nānọdu n’elu-igwe nāchi ọchì:

Onye-nwe-ayi nākwa ha emò.

5 Mb͕e ahu Ọ gāgwa ha okwu n’iwe-Ya,

Ọ bu kwa n’iwe-Ya di ọku ka Ọ gēme ka ha ma jijiji:

6 Ma Mu onwem emewo ka ezem guzosie ike

N’elu Zaion, bú ugwu nsọm.

7 M’gākọ akukọ bayere ukpuru:

Jeohva sirim, Ọkparam ka gi onwe-gi bu;

Mu onwem amuwo gi ta.

8 Riọm, na agamenye gi mba nile ka ha buru ihe-nketa-gi,

Na nsọtu uwa ka ha buru ihe-onwunwe-gi.

9 I gēji nkpa-n’aka ígwè tijisi ha;

Dika ihe ọkpu-ite kpuru ka agātupia ha.

10 Ma ub͕u a, ndi-eze, nwenu uche:

Ka adọ unu aka na nti, ndi-ikpe nke uwa.

11 Werenu egwu fè Jehova òfùfè,

Were-kwa-nu ọma-jijiji tegharia egwú ọṅù.

12 Sutunu onye arọputaworo ọnu, ka ọ ghara iwe iwe, unu we la n’iyì n’uzo,

N’ihi na iwe-ya gēre ọku na mb͕e ntà.

Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ha bu, bú ndi nile nāb͕abà nime ya.