Categories
JOB

JOB 5

1 Biko, kpọ òkù; ọ̀ di onye nāza gi?

Ònyè n’etiti ndi nsọ ka i gēche kwa iru?

2 N’ihi na nkpasu-iwe nēb͕u onye b͕agọro ab͕ago n’uche-ya,

Ekworo nēme kwa ka onye nenweghi uche nwua.

3 Mu onwem ahuwo onye b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ya ka ọ nāb͕a ngbọrọgwu:

M’we bua ebe-obibi-ya ọnu na mberede.

4 Umu-ya nānọpu anya n’ebe nzọputa di,

Ewe zọpia ha n’ọnu-uzọ-ama,

Ọ dighi kwa onye nānaputa ha.

5 Onye onye-agu nēripia owuwe-ihe-ubi-ya,

Nēsi kwa ọbuná n’ogwu were ya,

Ọnyà nēkusi ume ike inwe àkù-ha.

6 N’ihi na ajọ ihe adighi-esi n’ájá puta,

Ọ bughi kwa n’ala ka ọnọdu ọjọ si epuputa;

7 Kama anāmuputa madu nye ọnọdu ọjọ,

Dika icheke-ọku nile nēfeli elu.

8 Ma mu onwem, m’gāchọ Chineke,

Chineke ka m’gēbo kwa okwum:

9 Onye nēme ihe uku, nke ngwuputa ala-ha nādighi;

Oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu adigh:

10 Onye nēnye miri-ozuzo n’elu ala,

Nēziga kwa miri n’elu ebe di n’èzi:

11 Ido ndi di ala n’ebe di elu;

Ndi nēyi uwe-nkpe nọ kwa n’elu nime nzọputa.

12 Ọ nēmebi èchìchè nile nke ndi-aghughọ,

Aka-ha adighi-eme kwa ihe ha zubere.

13 Ọ nējide ndi mara ihe n’aghughọ-ha:

Ndum-ọdu nke ndi nāb͕a nb͕a me-kwa-ra ngwa.

14 N’ehihie ka ha nēzute ọchichiri,

Ha nāsọghari kwa ìsì n’etiti-ehihie, dika n’abali.

15 O we zọputa madu na mma-agha nke sitere n’ọnu-ha,

Bú ndi-ob͕eye n’aka ndi di ike.

16 Onye nēnweghi ike we nwe olile-anya,

Ma ajọ omume ekpuchiwo ọnu-ya.

17 Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba:

Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.

18 N’ihi na Onye ahu nēme ka ihe b͕ue nb͕u,

Ọ nēké kwa eke; O nētib͕u, aka-Ya nēme kwa ka adiri ndu.

19 Nime nkpab͕u isi ka Ọ gānaputa gi;

Ọzọ, n’asa ihe ọjọ agaghi-emetu gi aru.

20 N’oké unwu Ọ b͕aputawo gi n’ọnwu;

B͕aputa kwa gi n’aka mma-agha n’agha.

21 Mb͕e ire nāpia utari agēzo gi;

I gaghi-atu kwa egwu ihe-ike mb͕e ọ nābia.

22 I gāchì ihe-ike, chì kwa agu, ọchì;

I gaghi-atu kwa egwu anu-ọhia nke uwa.

23 N’ihi na gi na nkume ọhia nile gādi n’ọb͕ub͕a-ndu;

Gi na anu ọhia gādi kwa n’udo.

24 I gāma kwa na ulo-ikwū-gi di n’udo;

I gēlekọta kwa ebe-obibi-gi, i gaghi-emehie kwa.

25 I gāma kwa na nkpuru-gi di ọtutu,

Umu nke putara n’aru-gi gādi kwa ka ihe-ọkukú nke ala.

26 I gābia n’ílì n’ezib͕o agadi,

Dika obo ọka si ala elu na mb͕e-ya.

27 Le nka, ayi egwuputawo ala-ya, otú a ka ọ di;

Nuru ya, gi onwe-gi mata kwa ya n’onwe-gi.

Categories
JOB

JOB 6

1 Job we za, si,

2 Biko, ka atùa nkpasu-iwem nke-ọma,

Ka ha buli kwa nmebim n’ihe-ọtùtù n’otù!

3 N’ihi na ub͕u a ọ di arọ́ kari ájá oké osimiri nile:

N’ihi ya ka okwum nile sihieworo uzọ.

4 N’ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem,

Nke ńsí-ha ka mọm nāṅu

Ihe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n’usoro imegidem.

5 Inyinya-ibu-ọhia, ò nēti nkpu n’elu ahihia ndu?

Ma-ọbu ehi, ò nēti nkpu n’elu nri agwara agwara nye ya?

6 Ànēri ihe nke nādighi utọ n’ire, ma nnú adighi ya?

Ma-ọbu ùtọ di na nke di ọcha nime àkwá?

7 Ihe nkpuru-obim nāju imetu,

Ihe ndia di ka nrim nke mebiri emebi.

8 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na aririọm abia;

Asi kwa na Chineke enyem olile-anyam!

9 Ọbuná ka Chineke kwe izọpiam;

Ka Ọ tọpu aka-Ya, bipum.

10 Nkasi-obim we nādiru ub͕u a;

M’we wulie elu n’ihe-nb͕u nke nādighi-enwe ọmiko:

N’ihi na ezoghm okwu-ọnu nile nke Onye Nsọ.

11 Gini bu ikem na m’gēche?

Gini bu kwa ọgwugwum, na m’gēme ka ndum di ogologo?

12 Ọ̀ bu ike nkume ka ikem bu?

Ma-ọbu anu-arum, ọ̀ bu ọla?

13 Ọ̀ bughi na iye-akam adighi nimem?

Na enupuwo kwa nzube-ihe n’ebe m’nọ?

14 Onye obi nālọ ya miri kwesiri inwe ebere site n’aka eyì-ya;

Bú onye nārapu kwa egwu Onye Nke puru ime ihe nile.

15 Umu-nnem aghọb͕uwom dika miri-iyi,

Dika ebe miri-iyi nke nērùbiga nērù;

16 Nke nēji nji n’ihi ice,

Nke snow nēzó onwe-ya nime ha:

17 Na mb͕e anēme ka ha di ọku ha tọb͕ọro n’efu:

Mb͕e ọ di ọku, ha tapuworo n’ọnọdu-ha.

18 Ndi-ije nke uzọ-ha nēchighari onwe-ha;

Ha nārigo n’ebe tọb͕ọrọ n’efu, we la n’iyì.

19 Ndi-ije nke Tima legidere anya,

Usu-ndi-ije nke Sheba lere anya ha.

20 Ihere mere ha n’ihi na ha tukwasiri ha obi;

Ha biaruru ebe ahu, iru-ha we nwughari n’ihi ihere.

21 N’ihi na ub͕u a unu abughi ihe;

Unu nāhu ihe-ujọ, we tua egwu.

22 Ọ̀ bu na m’siri, Nyenum ihe?

Ma-ọbu, Nyenu ihe-iri-ngo n’ihim site n’àkù-unu?

23 Ma-ọbu, Wepuganum n’aka onye-nkpab͕u?

Ma-ọbu, B͕aputanum n’aka ndi nēme ka madu ma jijiji?

24 Zínum ihe, mu onwem gāb͕a kwa nkiti:

Me-kwa-num ka m’ghọta ihe m’mehieworo n’amaghi-ama.

25 Le ka okwu-ọnu nke ziri ezi si di irè!

Ma gini ka iba-nba nke si n’ọnu-unu puta nābara?

26 Ùnu nēchè na unu gābara okwu nba?

Ebe okwu-ọnu nile nke onye nādighi-atukwasi obi-ya n’ihe di ka ifufe.

27 Ọzọ kwa, n’aru nwa-nb͕ei ka unu nēfekwasi nzà,

Unu nēwere kwa eyì-unu zua ahia.

28 Ma ub͕u a kwenu ichem iru;

Ọ̀ bu kwa n’iru unu ka m’gēkwu okwu-ugha?

29 Biko, chigharianu, ka ajọ omume ghara idi;

E, chigharianu ọzọ, ezi omumem di nime ya.

30 Ọ̀ di ajọ omume di n’irem?

Òkpo-ọnum agaghi-amata ihe anāchọsi ike?

Categories
JOB

JOB 7

1 Ọ̀ dighi obubu-agha diri madu n’elu uwa?

Ùbọchi-ya adighi ka ubọchi onye egoro ọlu?

2 Dika orù si ekusie ume ike ibà n’okpuru ǹdò,

Na dika onye egoro ọlu si ele anya ugwọ-olu-ya:

3 Otú a ka emeworom ha m’keta ọtutu ọnwa nke ihe-efu,

Ọtutu abali nke m’nādọb͕u onwem n’ọlu ka ha gutawo-kwa-ra nyem.

4 Ọ buru na edinam, m’si,

Òle mb͕e m’gēbili? ma anyasi esetiwo onwe-ya;

Afọ ejuwokwam na ntugharim rue chi-ọbubọ.

5 Anu-arum nēyi ikpuru na ob͕e ájá;

Akpukpọ-arum atawo ata, we b͕aze.

6 Ubọchim di garagara kari ọ́kpà eji kpa ákwà,

Ha we gwusia nenweghi olile-anya.

7 Cheta na ndum bu ifufe:

Anyam agaghi-alaghachi ihu ezi ihe.

8 Anya onye nāhum agaghi-ekirim:

Anya-Gi gādi n’arum, ma m’gaghi-adi.

9 Dika igwe-oji si agwusi, we la,

Otú a onye nārida n’ala agaghi-arigota.

10 Ọ gaghi-alata n’ulo-ya ọzọ,

Ebe-ya agaghi-amata kwa ya ọzọ.

11 Mu onwem kwa, m’gaghi-eb͕ochi ọnum;

Ka m’kwue nime nkpab͕u nke mọm;

Ka m’tamue ntamu n’idi-ilu nke nkpuru-obim.

12 Ọ̀ bu oké osimiri ka m’bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n’oké osimiri,

Na I nēdo ndi-nche ichem?

13 Mb͕e m’siri, Ihe m’ji dina gākasim obi,

Ihe-ndinam gēbupu ntamum;

14 I we were nrọ me ka m’tua ujọ,

I site-kwa-ra n’ọhù me ka m’tua egwu nke-uku:

15 Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u,

Na ọnwu kari ọkpukpum ndia.

16 Ajuwom ndu; m’gaghi-adi ndu rue mb͕e ebighi-ebi:

Rapum; n’ihi na otù nku-ume ka ubọchim nile bu.

17 Gini ka madu bu, na I nēme ya ka ọ di uku,

Na I nātukwasi kwa ya obi-Gi,

18 Na I nēleta kwa ya ututu nile,

Na I nānwaputa ya na mb͕e dikarisiri ntà nile?

19 Rùe ole mb͕e ka I nāgaghi-elepum anya,

Ka I nāgaghi-arapum rue mb͕e m’lodara ọnu-mirim?

20 Asi na emehiewom, gini ka m’nēme Gi, Gi Onye nēche madu?

N’ìhi gini ka I doworom ibu ihe-ndakwasi n’ebe I nọ,

M’we ghọrọ onwem ibu?

21 Ma gini mere I nādighi-ebupu njehiem, me ka ajọ omume gabiga?

N’ihi na ub͕u a m’gēdina n’ájá:

I gāchọsikwam ike, ma m’gaghi-anọ.

Categories
JOB

JOB 8

1 Bildad, bú onye Shua, we za, si,

2 Rùe ole mb͕e ka i ganēkwu ihe ndia?

Rù kwa ole mb͕e ka okwu nile nke ọnu-gi gābu ifufe di ike?

3 Chineke, Ọ̀ neme ka ikpé b͕agọ ab͕agọ?

Ma-ọbu Onye Nke puru ime ihe nile,

Ọ̀ nēme ka ezi omume b͕agọ ab͕agọ?

4 Ọ buru na umu-gi emehiewo megide Ya,

Ọ we zilaga ha n’aka nmehie-ha:

5 Ọ buru na gi onwe-gi achọsie Chineke ike,

We riọ Onye Nke puru ime ihe nile aririọ-amara;

6 Ọ buru na onye di ọcha n’obi na onye ziri ezi ka i bu;

N’ezie ub͕u a Ọ gētetara gi,

Me ka ebe-obibi nke ezi omume-gi di n’udo.

7 Ọ bu ezie na nmalite-gi di ntà,

Ma ikpe-azu-gi gēbù ibù nke-uku.

8 N’ihi na, biko, jua ọb͕o mbu,

Dozie onwe-gi imata ihe ndi bu nna-ha gwuputara:

9 (N’ihi na nke nnyahuru ka ayi bu, ayi amaghi kwa ihe,

N’ihi na onyinyo ka ubọchi-ayi nile bu n’elu uwa:)

10 Ndi ahu, hà agaghi-ezí gi ihe, gwa gi okwu,

Si n’obi-ha weputa okwu?

11 Papyrus, Ò gētolite elu ma apiti adighi?

Amì, ò gēbù ibù ma miri adighi?

12 Mb͕e ọ nọ n’ima akwukwọ ndu, mb͕e akēbighi ya,

Ọ nēbu ahihia ọ bula uzọ akpọnwu.

13 Otú a ka okporo-uzọ ndi nile nēchezọ Chineke si di;

Olile-anya nke onye emeruru emeru gāla n’iyì:

14 Onye agākpaji okwukwe efu ya,

Ntukwasi-obi-ya bu kwa ulo ududo.

15 Ọ gādabere n’aru ulo-ya, ma ọ gaghi-eguzo:

Ọ gējide ya, ma ọ gaghi-eguzosi ike.

16 Dika osisi ndu ka ọ di n’iru anyanwu,

Ome-ya nēpusa n’ubi-ya ab͕ara ogige.

17 Nkpọrọgwu-ya nēkekọta onwe-ha n’aru obo nkume,

Ọ nāhu ebe nkume anya.

18 Ọ buru na esi n’ebe-ya loda ya,

Ọ gāgọnari kwa ya, si, Ahughm i.

19 Le, nka bu obi-utọ, nke uzọ-ya,

Ma ndi ọzọ gēsi n’ájá pue.

20 Le, Chineke agaghi-aju onye zuru okè,

Ọ gaghi-ejide kwa aka ndi nēme ihe ọjọ.

21 Rue mb͕e Ọ gēwere ichì-ọchì mejue ọnu-gi,

Were kwa iti-nkpu mejue eb͕ub͕ere-ọnu-gi.

22 Ndi nākpọ gi asì gēyi ihere dika uwe;

Ulo-ikwū nke ndi nēmebi iwu agaghi-adi kwa.

Categories
JOB

JOB 9

1 Job we za, si,

2 N’ezie amawom na ọ di otú a:

Ma madu, ò gēsi aṅa buru onye ezi omume n’iru Chineke?

3 Ọ buru na ọ tọ ya utọ iso Ya je n’ikpé,

Ọ gaghi-aza Ya otù okwu nime nnù okwu abua na ọgu iri.

4 O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n’ike:

Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n’udo?

5 Onye nākwapu ugwu, ma ha amaghi ya,

Mb͕e Ọ kwatuworo ha n’iwe-Ya.

6 Onye nēme ka uwa me nkpatu pua n’ọnọdu-ya,

Ogidi-ya nile we ma jijiji.

7 Onye nāgwa anyanwu okwu, o we ghara iwa;

Ọ nākachi kwa kpakpando akàrà.

8 Onye nání Ya nēseti elu-igwe,

Nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke oké osimiri ukwu.

9 Onye nēme Bear, na Orion, na Pleiades,

Na ime-ulo nke Ndida.

10 Onye nēme ihe uku, rue mb͕e ngwuputa ala-ha nādighi;

Na oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu nādighi.

11 Le, Ọ nāgabiga n’akukum, ma adighm-ahu Ya:

Ọ nāga kwa n’iru, ma adighm-amata Ya.

12 Le, Ọ nānwude ihe, ònye gēme ka Ọ laghachi azu?

Ònye gāsi Ya, Gini ka I nēme?

13 Chineke agaghi-eme ka iwe-Ya laghachi;

Ndi nēyere Rehab aka ruru ala n’okpuru Ya.

14 Mù onwem gēsi kwa aṅa za Ya,

Rọputa kwa okwum nile m’gāgwa Ya?

15 Onye, ọ buru na abum onye ezi omume, m’gaghi-aza Ya;

Kama m’gāriọ onye nēkpem ikpe aririọ-amara.

16 Ọ buru na m’kpọwo òkù, O we zam;

M’gaghi-ekwe kwa na Ọ ṅara nti n’olum;

17 Bú Onye nēji oké ifufe chifiam aru,

Onye nēme kwa ka ob͕ub͕u-mmam, bú nke eb͕urum, ba uba n’efù.

18 Ọ gaghi-ekwem ka m’turu ndu,

Kama Ọ nēme ka afọ jum n’ihe-ilu nile.

19 Ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ike nke onye nwe ume, le, Ọ nọ ya!

Ma ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ikpé, ònye gākaram mb͕e?

20 Ọ buru na abum onye ezi omume, ọnum gāmam ikpe:

Onye zuru okè ka m’bu, o we si na abum onye b͕agọrọ ab͕agọ.

21 Onye zuru okè ka m’bu; adighm-amara nkpuru-obim;

Ajum ndum.

22 Otù ihe aju ka ọ bu; n’ihi ya ka m’siri,

Onye zuru okè na onye nēmebi iwu ka Ya onwe-ya nēme ka ha gwusia.

23 Ọ buru na utari eme ka madu nwua n’otù ntabi-anya,

Ọ gāchì onwunwa onye nēmeghi ihe ọjọ ọchì.

24 Enyewo uwa n’aka onye-nmehie:

Ọ nēkpuchi iru ndi-ikpe-ya;

Ọ buru na ọ bughi Ya, ònye kwa ka ọ bu?

25 Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ:

Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe.

26 Ha agabigawo n’iru dika ub͕o amì:

Dika ugo si efedakwasi ngwa ngwa n’anu ọ gēri.

27 Ọ buru na asim, Ka m’chezọ ntamum,

Ka m’rapu iru ujọm, b͕asa irum:

28 Anamatu ujọ ihe-nb͕um nile,

Amawom na I gaghi-agum n’onye nēmeghi ihe ọjọ.

29 Agama mu onwem ikpe;

N’ìhi gini kwa ka m’dọb͕uru onwem n’ọlu n’efu?

30 Ọ buru na ewerem miri snow sa arum,

Were kwa nchà me ka ọbu-akam abua di ọcha;

31 Mb͕e ahu I gābiayem n’olùlù,

Uwem gākpọkwam ihe-árú.

32 N’ihi na Ọ bughi madu, otú m’bu, na m’gāza Ya,

Na ayi gābiakota n’ikpé.

33 Ọ dighi odozi-okwu di n’etiti ayi,

Nke gātukwasi ayi abua aka-ya.

34 Ya wezuga nkpa-n’aka-Ya n’arum,

Ka oké ujọ-Ya ghara ime ka m’tua egwu nke-uku:

35 Ka m’kwue okwu, ghara itu egwu Ya;

N’ihi na ọ bughi otú a ka m’di n’ebe mu onwem nọ.

Categories
JOB

JOB 10

1 Ike ndum agwuwo nkpuru-obim;

Ka m’rapuru onwem ntamum;

Ka m’kwue okwu n’idi-ilu nke nkpuru-obim.

2 M’gāsi Chineke, Amalam ikpe;

Me ka m’mara ihe kpatara I ji som se okwu.

3 Ọ̀ di Gi nma ka I meb͕ue nmeb͕u,

Ka I ju ndọb͕u-n’ọlu nke ọbu-aka-Gi abua,

We mukwasi ìhè na ndum-ọdu ndi nēmebi iwu?

4 Ọ̀ bu anya anu-aru ka I nwere,

Ma-ọbu na I nāhu dika madu si ahu?

5 Ọ̀ bu dika ubọchi madu si di ka ubọchi-Gi di?

Ma-ọbu arọ-Gi, hà di ka ubọchi madu,

6 Na I nāchọ ajọ omumem,

Nāju kwa ase nmehiem?

7 Ọ bu ezie na I mara na adighm-emebi iwu;

Ọ dighi kwa onye ọ bula nānaputa n’aka-Gi.

8 Aka-Gi dozirim, we kpuam

Ka m’buru otù buruburu; ma I nēlodam.

9 Biko, cheta na dika urọ ka I kpuworom;

Ì gēme kwa ka m’laghachi n’ájá?

10 Ọ̀ bughi dika miri-ara ka I nāwusim,

Me ka m’raru araru dika cheese?

11 Akpukpọ-aru na anu-aru ka I yikwasirim,

Were kwa ọkpukpu na akwara kpam dika ákwà.

12 Ndu na ebere ka I meworo ka m’nwe,

Nlekọta-gi edebewo kwa mọm.

13 Ma I zoro ihe ndia n’obi-Gi;

Amawom na nka di n’aka-Gi:

14 Ọ buru na emehiewom, I nēlezikwam anya,

I gaghi-agupukwam n’ajọ omumem.

15 Ọ buru na emebiwom iwu, ahuhu dirim;

Ọ buru kwa na abum onye ezi omume, m’gaghi-eweli isim elu;

Ebe nlelìm juworom afọ,

Ya na ilekwasi nwedam anya.

16 Ọ buru kwa na isim ewelie onwe-ya n’elu, dika ọdum nke nāb͕ọ uja ka I nāchu ntám:

I we laghachi gosi Onwe-gi onye di ebube megidem.

17 I nēme ka ndi-àmà-Gi di ọhu n’irum,

Nēme kwa ka nkpasu-iwe-Gi ba uba n’ebe m’nọ;

Nb͕anwe na usu-ndi-agha di n’ebe m’nọ.

18 N’ìhi gini kwa ka I ji me ka m’si n’àkpà-nwa puta?

M’gēkubìwori ume, ọ dighi kwa anya gāhum.

19 Dika agāsi na ọ dighi mb͕e m’nọ, otú a ka m’gādi;

Site n’afọ nnem rue ílì ka agēbum.

20 Ùbọchim adighi ole-na-ole? rapu kwa,

Dopu Onwe-gi n’ebe m’nọ, ka m’we b͕asa irum nwantī,

21 Tutu alam, ghara kwa ilaghachi,

Rue ala ọchichiri, na onyinyo ọnwu;

22 Ala oké ọchichiri, dika oké ọchichiri onwe-ya;

Ala onyinyo ọnwu, nke usoro nādighi ya,

Ebe ọmumu-ìhè di kwa ka oké ọchichiri.

Categories
JOB

JOB 11

1 Zofa, bú onye Neama, we za, si,

2 Àgaghi-aza ọtutu okwu?

Àgāgu kwa onye eb͕ub͕ere-ọnu n’onye ezi omume?

3 Ekwukwu-Gi nile nēme ka madu b͕a nkiti;

I we chìa ọchì, ma ọ dighi onye nēme ka ihere me gi.

4 I we si, Nmutam di ọcha,

M’di kwa ọcha n’anya-Gi.

5 Ma otú ọ di, ọ gādim nọ̄ nma ma asi na Chineke ekwue okwu,

Saghe eb͕ub͕ere-ọnu-Ya megide gi;

6 Gosi gi ihe-nzuzo nile nke amam-ihe,

Na ọ di okpukpu n’izube ihe.

Gi mara kwa na Chineke nēme ka echezọrọ gi ufọdu nime ajọ omume-gi.

7 Ì gēsi n’ogwugwu chọputa Chineke?

Ì gāchọputa Onye Nke puru ime ihe nile rue ebe Ọ sọturu?

8 Ọ ra ka ebe di elu nile nke elu-igwe; gini ka i gēme?

Ọ di omimi kari ala-mọ; gini ka i gāmara?

9 Ọtùtù-ya di ogologo kari uwa,

Di kwa obosara kari oké osimiri.

10 Ọ buru na Ọ ga n’iru, mechibido madu uzọ,

Kpọkọta nkpọkọta, ònye gēme kwa ka Ọ laghachi?

11 N’ihi na Ya onwe-ya mara madu efu:

Ọ nāhu kwa ajọ ihe, mb͕e Ọ nādighi-elegide ya anya.

12 Ma nkpọkọrọ madu gēnwe obi,

Mb͕e amuru nwa-inyinya-ibu-ọhia ka ọ buru madu.

13 Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi,

We b͕asa ọbu-aka-gi abua n’ebe Ọ nọ;

14 Ọ buru na ajọ ihe adi n’aka-gi, me ka ọ di n’ebe di anya,

Ekwe-kwa-la ka ajọ omume biri nulo-ikwū-gi nile;

15 N’ihi na mb͕e ahu i gēweli iru-gi nēnweghi ọlu n’aru-gi;

I gābu kwa ihe siri ike dika ọla awuru awu, i gaghi-atu kwa egwu:

16 N’ihi na gi onwe-gi gēchezọ ọnọdu ọjọ gi,

Dika miri nke gabigara agabiga ka i gēcheta ya:

17 Kari etiti-ehihie ka ubọchi ndu-gi gēbili kwa;

Ọ buru na oké ọchichiri adi, ọ gādi ka ututu.

18 I gātukwasi kwa obi, n’ihi na olile-anya di;

I gēnyocha kwa, were ntukwasi-obi dina.

19 Ọzọ kwa, i gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka i ma jijiji;

Ọtutu madu gēme kwa ka iru-gi dajua.

20 Ma anya ndi nēmebi iwu gādala n’isi,

Ebe-nb͕alaga alanariowo kwa ha n’iyì,

Nkubì-ume bu kwa olile-anya-ha.

Categories
JOB

JOB 12

1 Job we za, si,

2 N’ezie unu onwe-unu bu ndi bu ihe,

Unu na amam-ihe gānwukọ n’otù.

3 Enwe-kwa-ram obi dika unu;

Mu onwem abughi onye dara ada kari unu:

Ma ònye ka ọ bu nke ihe dika ndia nādighi n’aka?

4 Onye bu ihe-ọchì nke madu-ibe-ya ka m’bu,

Bú onye nākpọku Chineke, O we za ya:

Ihe-ọchì ka onye ezi omume nke zuru okè bu.

5 Nleda diri ọdida n’èchìchè onye nọ jū;

Edoziwo ya nye ndi ukwu-ha nāb͕uchapu ab͕uchapu.

6 Ulo-ikwū nile nke ndi nāpunara madu ihe di n’udo,

Ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi nākpasu Chineke iwe;

Bú onye ọ bula nke wetaworo chi-ya n’aka-ya.

7 Ma otú ọ di, biko, jua anumanu, ha gēzí kwa gi ihe,

Na anu-ufe nke elu-igwe, ha gēgosi kwa gi:

8 Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe;

Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi.

9 Ọ̀ bu onye nāmaghi n’ihe ndia nile,

Na aka Jehova emewo nka?

10 Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n’aka-Ya,

Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.

11 Nti, ọ̀ dighi-anwa okwu?

Okpo-ọnu kwa, ọ̀ dighi-edeturu onwe-ya ihe-oriri-ya?

12 Nime ndi kara nká ka amam-ihe di,

N’ubọchi ndu di ogologo ka nghọta di kwa.

13 N’aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di;

Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.

14 Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ;

Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.

15 Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ;

Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru.

16 N’aka-Ya ka ike na nzube-ihe di;

O nwere onye nēmehie n’amaghi-ama na onye nēme ka madu mehie n’amaghi-ama.

17 Ọ nēme ka ndi nādu ọdu la dika onye akwatara ihe-ya n’agha,

Ọ nēme kwa ndi-ikpe ka ha ghọ ndi-nzuzu.

18 Ab͕u ndi-eze kere ka Ọ tọpuworo,

We ke ihe-ọkiké n’úkwù-ha.

19 Ọ nēme ka ndi-nchu-àjà la dika onye akwatara ihe-ya nagha,

Ndi nādigide ka Ọ nēme kwa ka ha kpùe iru.

20 Ọ nēwezuga okwu eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi,

Ezi uche nke ndi-okenye ka Ọ nēwepu kwa.

21 Ọ nāwusa nleda n’aru ndi amara aha-ha,

Akpukpọ-úkwù nke ndi di ike ka Ọ kpọpu-kwa-ra.

22 Ọ nēsi n’ọchichiri kpughepu ihe di omimi,

We me ka onyinyo ọnwu puta ìhè.

23 Ọ nēme ka mba di uku, Ọ nēme kwa ka ha la n’iyì:

Ọ nāb͕asa mba, nēdu kwa ha.

24 Ọ nēwezuga obi ndi-isi nke ndi uwa,

We me ka ha waghari n’ebe tọb͕ọrọ n’efu ebe uzọ nādighi.

25 Ha nāsọghari ìsì n’ọchichiri nēnweghi ìhè,

O we me ka ha kpafue dika onye ṅubigaworo manya ókè.

Categories
JOB

JOB 13

1 Le, ihe a nile ka anyam huworo,

Ntim anuwo, ghọta kwa ya.

2 Dika ọmuma-ihe-unu si di, otú a ka m’maworo, ọbuná mu onwem:

Mu onwem abughi onye dara ada kari unu.

3 Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m’gāgwa okwu,

Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka.

4 Ma otú ọ di, unu onwe-unu bu ndi nētekpu madu okwu-ugha dika ihe-ntekpu,

Ndi-dibia efu ka unu nile bu.

5 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti!

Ọ we ghọro unu amam-ihe.

6 Biko, nurunu iru-ukam,

Ṅa-kwa-nu nti n’ikpe-ọnu nile nke eb͕ub͕ere-ọnum.

7 Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume?

Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ?

8 Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma?

Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù?

9 Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu?

Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò?

10 Ọ ghaghi ibara unu nba,

Ọ buru na unu ahu madu iru-ọma na nzuzo.

11 Nbùli-elu-Ya adighi-eme ka unu tua egwu nke-uku?

Oké egwu-Ya adighi-adakwasi kwa unu?

12 Okwu-ncheta nile unu bu ilu nke ntu,

Ihe-nb͕ochi urọ ka ihe-nb͕ochi nile unu bu.

13 B͕anu nkiti, pua n’ebe m’nọ, ka m’kwu kwa, mu onwem,

Gini gāgabiga kwa n’arum?

14 N’ìhi gini ka m’gēburu anu-arum n’ezém,

Tiye kwa ndum n’ọbu-akam?

15 Le, Ọ gēb͕um; m’gaghi-echere:

Otú ọ di, uzọm nile ka m’gāru uka n’iru Ya.

16 Ọzọ, Ya onwe-ya gāburum nzọputa;

N’ihi na onye emeruru emeru agaghi-abia n’iru Ya.

17 Nurunu okwum nile nke-ọma,

Ka nkwuputam di kwa na nti-unu.

18 Biko, le, edowom ikpém n’usoro;

Amawom na mu onwem bu onye ezi omume.

19 Ònye bu onye ahu nke mu na ya gēkpe ikpe?

N’ihi na ub͕u a ka m’gāb͕a nkiti, kubìe ume.

20 Nání emelam ihe abua,

Mb͕e ahu m’gaghi-ezopu onwem n’iru Gi:

21 Me ka ọbu-aka-Gi dipu n’arum n’ebe di anya;

Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m’tua egwu nke-uku.

22 Gi kpọ kwa òkù, mu onwem gāza kwa;

Ma-ọbu ka m’kwue, I we zam.

23 Àjọ omume na nmehie m’nwere di ole?

Me ka m’mara njehiem na nmehiem.

24 N’ìhi gini ka I nēzo iru-Gi,

Nēchè kwa na mu bu onye-iro n’ebe I nọ?

25 Ì gēme ka akwukwọ osisi nke ifufe nēfepu ma jijiji?

Ma-ọbu Ì gāchu ahihia ọ̄ka kpọrọ akpọ?

26 N’ihi na I nēde ihe di ilu n’akwukwọ megidem,

I nēme kwa ka m’nweta ajọ omume nile m’mere n’okorọbiam:

27 I nētiye kwa ukwum abua n’ọtọsi, nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya;

I nākpa Onwe-gi ókè buruburu ọbu-ukwum:

28 Bú madu nke di ka ihe rere ure nke nāka nká,

Dika uwe nke nla riworo.

Categories
JOB

JOB 14

1 Madu nke nwayi muru,

Ubọchi-ndu-ya di nkpunkpu, afọ ejuwo kwa ya n’ahuhu.

2 Dika okoko-osisi ka ọ putaworo, ewe nēbipu ya:

O we nāb͕alaga dika onyinyo, ọ dighi-eguzo kwa.

3 Ọ̀ bu kwa n’aru onye a ka I megheworo anya-Gi,

Me ka m’so Gi ba n’ikpé?

4 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ihe ọcha gāputa n’ihe ruru árú! ọ dighi otù ihe ọcha gāputa na ya.

5 Ebe ihe akara àkà ka ubọchi-ya nile bu, ọnu-ọgugu nke ọnwa-ya nile di n’aka-Gi,

I mewo ókè-ya, ọ gaghi-agabiga kwa ya;

6 Lepu ya anya, ka o we kwusi,

Rue mb͕e ubochi-ya gātọ ya utọ, dika onye egoro ọlu.

7 N’ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya,

Na ome-ya agaghi-akwusi kwa.

8 Ọ buru na nkpọrọgwu-ya eme ochie n’ala,

Ogwe-ya anwu kwa n’ájá;

9 Site n’ísì miri ọ gāma akwukwọ,

Wa kwa alaka dika ihe akuru aku.

10 Ma onye di ike gānwu, ike gāgwu kwa ya:

Madu we kubìe ume, òle ebe ọ nọ kwa?

11 Miri esiwo n’oké osimiri la,

Osimiri we tasia, takọrọ;

12 Otú a madu edinawo, ọ dighi-ebili kwa:

Rue mb͕e elu-igwe nādighi, ha agaghi-eteta,

Agaghi-akpọte kwa ha n’ura-ha.

13 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I zobem n’ala-mọ,

Ma asi na I debem na nzuzo, rue mb͕e iwe-Gi laghachiri,

Ma asi na I kparam ókè, we chetam!

14 Ọ buru na madu anwua, ọ̀ gadi ndu ọzọ?

Ubọchi nile nke obubu-agham ka m’gēche,

Rue mb͕e nb͕anwem gābia.

15 I gākpọ òkù, mu onwem gāza kwa Gi:

Agu ọlu aka-Gi gāgu Gi.

16 N’ihi na ubu a I nāgu nzọ-ukwum ọnu:

Ì dighi-elezi nmehiem anya?

17 Akachiwo njehiem akàrà n’àkpà,

I we tekpue ajọ omumem ihe.

18 Ma otú ọ di, ugwu nke nāda ada nāla n’iyì,

Anākwapu kwa oké nkume n’ọnọdu ya.

19 Miri nēme ka nkume ta;

Orúrú-ya nāṅachapu ájá ala:

Olile-anya madu ka I mewo-kwa-ra ka ọ la n’iyì.

20 I nwere ike n’aru ya rue mb͕e ebighi-ebi, ọ we la;

I nēme ka iru-ya b͕anwe, I we zilaga ya.

21 Anāsọpuru umu-ya ndikom, ma ọ dighi-ama ya;

Ha nāghọ kwa ndi ntà, ma ọ dighi-amata ihe bayere ha.

22 Nání na o nēb͕u anu-aru-ya nke dikwasi ya nb͕u,

Nkpuru-obi-ya nke di nime aru-ya nēru kwa újú.