Categories
ESTA

ESTA 5

1 O rue, n’ubọchi nke-atọ, na Esta yiri uwe ala-eze ya, we guzo n’ogige di ime-ime nke ulo eze, na ncherita-iru ulo eze: ma eze nānọkwasi n’oche-eze ala-eze ya n’ulo ala-eze ya, na ncherita-iru ọnu-uzọ ulo ahu.

2 O rue, mb͕e eze huru Esta, bú nwunye eze, ka o nēguzo n’ogige, na ọ natara amara n’anya-ya: eze we setipuru Esta nkpa-n’aka ọla-edo nke di n’aka-ya. Esta we biarue nso, metu isi nkpa-n’aka ahu.

3 Eze we si ya, Gini ka i nāchọ, Esta, nwunye eze? gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēnye kwa gi.

4 Esta we si, Ọ buru na ọ di eze nma, ka eze na Heman bia ta n’ọṅuṅu-manya-vine ahu nke m’meworo ya.

5 Eze we si, Menu ka Heman me ngwa ime ihe Esta kwuru. Eze na Heman we bia n’ọṅuṅu-manya-vine nke Esta mere.

6 Eze we si Esta n’ọṅuṅu manya-vine ahu, Gini bu aririọ-gi? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēme ya.

7 Esta we za, si, Aririọm na ọchichọm bu;

8 ọ buru na ahutawom amara n’iru eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma inye ihe m’nāriọ, na ime ihe m’nāchọ, ka eze na Heman bia n’ọṅuṅu-manya-vine nke m’gēmere ha, echi ka m’gēme kwa dika okwu eze si di.

9 Heman we pua ubọchi ahu nāṅuri ọṅu, ọ di kwa ya nma n’obi: ma mb͕e Heman huru Mọdekai n’ọnu-uzọ-ama eze, na o bilighi, na ọ maghi kwa jijiji n’iru ya, Heman juputara n’ọnuma megide Mọdekai.

10 Ma Heman jisiri onwe-ya ike, ba n’ulo-ya; o we ziga, me ka ndi nāhu ya n’anya bia, ha na Zeresh, bú nwunye-ya.

11 Heman we kọrọ ha akukọ bayere nsọpuru nke àkù-ya, na iba-uba nke umu-ya ndikom, na ihe nile nke eze ji me ka ọ di uku, nke o ji buli kwa ya ibu onye-isi nke ndi-isi na ndi-orù eze.

12 Heman we si, Ọzọ, Esta, bú nwunye eze, emeghi onye ọ bula ka o so eze bata n’ọṅuṅu-manya-vine nke o mere, ọ bu nání mu onwem; ọzọ kwa, echi ka akpọworo mu onwem jekuru ya, mu na eze.

13 Ma ihe a nile adighi-ezurum, na mb͕e nile mu onwem nāhu Mọdekai, bú onye-Ju, ka ọ nānọdu n’ọnu-uzọ-ama eze.

14 Zeresh, bú nwunye-ya, na ndi nile nāhu ya n’anya, we si ya, Ka ha me osisi nke idi-elu-ya di ọgu cubit abua na iri, ma n’ututu gi si eze ka akwuba Mọdekai n’elu-ya: gi so kwa eze ba n’ọṅuṅu-manya-vine ahu nāṅuri ọṅu. Okwu ahu we di nma n’anya Heman; o we me osisi ahu.

Categories
ESTA

ESTA 6

1 N’abali ahu urá eze fepuru n’anya-ya; o we si ka ewebata akwukwọ ihe-ncheta nke ihe emere n’ubọchi ahu, ewe nāgu ha n’iru eze.

2 Ewe hu ihe a nke edere n’akwukwọ, bú na Mọdekai gosiri ihe bayere Bignata na Teresh, bú ndi-onozi abua nke eze, nime ndi nēche ngata-uzọ, ndi chọrọ iseti aka megide eze, bú Ahasuerọs.

3 Eze we si, Nsọpuru na idi-uku gini ka emere Mọdekai n’ihi ihe a? Ndi-ozi eze, bú ndi nējere ya ozi, we si, Ọ dighi ihe emere ya.

4 Eze we si, Ònye nọ n’ogige? Ma Heman abatawo n’ogige ulo eze nke di n’èzí, isi eze ka ọ kwuba Mọdekai n’osisi nke o doziri nye ya.

5 Ndi nējere eze ozi we si ya, Le, Heman nēguzo n’ogige. Eze we si, Ya bata.

6 Heman we bata. Eze we si ya, Gini ka agēme nwoke ahu, bú onye nsọpuru-ya tọworo eze utọ? Heman we si n’obi-ya, Ònye ka ọ nātọ eze utọ inye nsọpuru karim?

7 Heman we si eze, Nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ,

8 ka achita uwe ala-eze nke eze yiriworo, na inyinya nke eze nọkwasiworo, na okpu-eze nke ala-eze nke ekpukwasiworo ya n’isi:

9 ka enye kwa uwe ahu na inyinya ahu n’aka otù nwoke nime ndi-isi eze, ndi bu eze, ka ha yikwasi kwa nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ, ka ha me kwa ka inyinya būru ya ga n’amá obodo, ka ha kpọ kwa n’iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ.

10 Eze we si Heman, Me ngwa, chiri uwe ahu na inyinya ahu, dika i si kwu, me-kwa-ra Mọdekai otú a, bú onye-Ju, nke nānọdu n’ọnu-uzọ-ama eze: ka okwu ọ bula ghara idapu n’ihe nile nke i kwuworo.

11 Heman we chiri uwe ahu na inyinya ahu, yikwasi Mọdekai, me ka inyinya būru ya ga n’amá obodo, ọ kpọ-kwa-ra n’iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ.

12 Mọdekai we laghachi n’ọnu-uzọ-ama eze. Ma Heman were ngwa la n’ulo-ya, nēru újú, ekpuchi-kwa-ra isi-ya.

13 Heman we kọrọ Zeresh, bú nwunye-ya, kọ-kwa-ra ndi nile nāhu ya n’anya, ihe nile nke mere ya. Ndi-ya mara ihe na Zeresh, bú nwunye-ya, we si ya, Ọ buru na Mọdekai sitere na nkpuru ndi-Ju, bú onye i maliteworo ida n’iru ya, i gaghi-enwe ike imegide ya, kama i ghaghi ida n’iru ya.

14 Mb͕e ha na ya nọ nēkwurita okwu, ndi-onozí eze biaruru nso, we me ngwa ime ka Heman bata n’ọṅuṅu-manya-vine nke Esta mere.

Categories
ESTA

ESTA 7

1 Eze na Heman we bata iso Esta, bú nwunye eze, ṅu manya-vine.

2 Eze we si kwa Esta n’ubọchi nke-abua, n’ọṅuṅu manya-vine ahu, Gini bu aririọ-gi, Esta, nwunye eze? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēme kwa ya.

3 Esta, bú nwunye eze we za, si, Ọ buru na ahutawom amara n’iru gi, eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma, ka enyem ndum n’aririọm, na ndim n’ọchichọm:

4 n’ihi na erewo ayi, bú mu onwem na ndim, ikpochapu ayi, na ib͕u ayi, na ime ka ayi la n’iyì. Ma asi na erewo ayi ibu ndi-orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, m’gāb͕a nkiti, ọ bu ezie na onye-nkpab͕u agaghi-emezu n’ihe gēfunari eze.

5 Eze, bú Ahasuerọs, we za, si Esta, bú nwunye eze, Ònye ka ọ bu, bú onye a? òle ebe onye a nọ kwa, bú onye ahu nke obi-ya mere ka o zue ime otú a?

6 Esta we si, Otù onye-nkpab͕u na onye-iro, bú Heman ọjọ a. Heman we tua egwu nke-uku n’iru eze na nwunye eze.

7 Eze we si n’ọṅuṅu manya-vine bilie n’ọnuma-ya je n’ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya: ma Heman guzoro ichọ ndu-ya n’aka Esta, bú nwunye eze; n’ihi na ọ huru na eze zubesiri ihe ọjọ ike megide ya.

8 Eze we si n’ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya biaghachi n’ulo ọṅuṅu manya-vine ahu; ma Heman adawo n’elu ihe-ndina nke Esta nọ n’elu ya. Eze we si, Ọ̀ gēweda kwa nwunye eze n’ala n’irum n’ulom? Mb͕e okwu ahu putara n’ọnu eze, ha kpuchiri iru Heman.

9 Habona, bú otù onye nime ndi-onozi ndi nọ n’iru eze, we si, Le kwa, osisi ahu nke idi-elu-ya di ọgu cubit abua na iri, nke Heman mere nye Mọdekai, bú onye kwuru ezi ihe bayere eze, o nēguzo n’ulo Heman. Eze we si, Kwubanu ya n’elu ya.

10 Ha we kwuba Heman n’elu osisi nke o doziri nye Mọdekai. Ewe me ka ọnuma eze bìe.

Categories
ESTA

ESTA 8

1 N’ubọchi ahu eze, bú Ahasuerọs, nyere Esta, bú nwunye eze, ulo Heman, bú onye nākpab͕u ndi-Ju. Ma Mọdekai biara n’iru eze; n’ihi na Esta gosiri ka ya na ya si di.

2 Eze we wezuga nb͕a-aka-ya, nke o mere ka ọ ghara idi n’aka Heman, o we nye ya Mọdekai. Esta we do Mọdekai onye-isi ulo Heman.

3 Esta we kwu kwa ọzọ n’iru eze, da n’ala n’iru ukwu-ya abua, kwa ákwá, riọ ya aririọ-amara, bú ka o me ka ihe ọjọ Heman, bú onye Egag, na èchìchè-ya nke o chère megide ndi-Ju gabiga.

4 Eze we setipuru Esta nkpa-n’aka ọla-edo ya. Esta we bilie, guzo n’iru eze,

5 si, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na ahutawom amara n’iru ya, ọ buru kwa na okwu a ziri ezi n’iru eze, ọ buru kwa na mu onwem adi nma n’anya-ya, ka ede ya n’akwukwọ iweghachi akwukwọ, bú èchìchè Heman nwa Hamedata onye Egag, nke o dere ime ka ndi-Ju la n’iyì, bú ndi nọ n’ala nile anāchi achi nke eze.

6 N’ihi na #m’gēsi aṅa pu inagide ya mb͕e m’huru ihe ọjọ nke nābiakwasi ndim? #m’gēsi kwa aṅa pu inagide ya mb͕e m’huru ila-n’iyì umu-nnam?

7 Eze, bú Ahasuerọs, we si Esta, bú nwunye eze, si kwa Mọdekai, bú onye-Ju, Le, ulo Heman ka m’nyere Esta, nwoke ahu ka ha kwuba-kwa-ra n’elu osisi, n’ihi na o setiri aka-ya megide ndi-Ju.

8 Unu onwe-unu kwa, denu akwukwọ bayere ndi-Ju, dika o si di nma n’anya-unu, n’aha eze, were-kwa-nu nb͕a-aka-akàrà eze kà ya: n’ihi na odide-akwukwọ nke edeworo n’aha eze, nke ewerewo-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze kà ya, ọ dighi onye puru ichighari ya.

9 Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze na mb͕e ahu, n’ọnwa nke-atọ, nke ahu bu ọnwa Sivan, n’ubọchi nke-orú-na-atọ nime ya; ewe de ya dika iwu nile si di nke Mọdekai nyere ndi-Ju, nye kwa ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala na ndi-isi ala nile anāchi achi nke di site n’India we rue Etiopia, bú ọgu ala isi na asa nke anāchi achi, ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di, nye kwa ndi-Ju dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika asusu-ha si di.

10 O we de akwukwọ n’aha eze, bú Ahasuerọs, were nb͕a-aka-akàrà eze kà ya, zìga akwukwọ n’aka ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya nēbu, bú ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule na umu-inyinya nēbu:

11 bú akwukwọ nke eze kwere nime ha ka ndi-Ju ndi nọ n’obodo nile ọ bula kpọkọta onwe-ha, guzo kwa n’ihi ndu-ha, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ha la n’iyì, bú usu-ndi-agha nile nke ndi ahu na ala ahu anāchi achi ndi nākpab͕u ha, ma umu-ntakiri-ha, ma ndinyom-ha, na iluta ihe-nkwata-ha n’agha,

12 n’ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, n’otù ubọchi, bú n’ubọchi nke-iri-na-atọ nke ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada.

13 Ndeputa odide-akwukwọ, nke agēnye dika iwu n’ala nile ọ bula anāchi achi, ekpughere ya nye ndi nile di iche iche, ka ndi-Ju nọ na njikere bayere ubọchi a, ibọrọ onwe-ha ọ́bọ̀ n’iru ndi-iro-ha.

14 Ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule nēbu puru, ebe ewere okwu eze kwalie ha, me ka ha me ngwa; enye-kwa-ra iwu ahu nime Shushan, bú ulo uku eze.

15 Mọdekai we si n’iru eze pua n’uwe ala-eze nke ákwà anunu na ezi ákwà ọcha, ya na okpu-eze ọla-edo di uku, na uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha na ákwà ododo: obodo Shushan we tie nkpu ṅuri kwa ọṅu.

16 Ndi-Ju nwere ìhè, na ọṅù, na obi-utọ na nsọpuru.

17 N’ala nile ọ bula anāchi achi, na n’obodo nile o bula, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, ndi-Ju nwe-kwa-ra ọṅù na obi-utọ na ọṅuṅu-manya-vine na ezi ubọchi. Ọtutu madu nime ndi di iche iche nke ala ahu we nāghọ ndi-Ju; n’ihi na oké egwu ndi-Ju dakwasiri ha.

Categories
ESTA

ESTA 9

1 Ma n’ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, n’ubọchi nke-iri-na-atọ nime ya, mb͕e okwu eze na iwu-ya biaruru nso ka eme ya, n’ubọchi mb͕e ndi-iro ndi-Ju lere anya ibu ndi-isi-ha; ma ab͕anwere ya, ndi-Ju onwe-ha we ghọ ndi-isi nke ndi nākpọ ha asì;

2 ndi-Ju kpọkọtara onwe-ha n’obodo nile ha n’ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, iseti aka megide ndi nāchọ ọdi-njọ-ha: ọ dighi kwa nwoke ọ bula guzoro n’iru ha; n’ihi na oké egwu-ha dakwasiri ndi nile di iche iche.

3 Ndi-isi nile nke ala nile anāchi achi, na ndi nọchiri anya eze, na ndi nāchi ala, na ndi nēje ozi eze nwere, ha nēye-kwa-ra ndi-Ju aka; n’ihi na oké egwu Mọdekai dakwasiri ha.

4 N’ihi na Mọdekai di uku n’ulo eze, akukọ-ya we nējezu n’ala nile anāchi achi: n’ihi na nwoke ahu, bú Mọdekai, nāga n’iru n’idi uku.

5 Ndi-Ju we were ntib͕u mma-agha na ob͕ub͕u na ila-n’iyì tib͕ue n’etiti ndi-iro-ha nile, me ndi nākpọ ha asì dika ọ tọrọ ha.

6 Ma nime Shushan, bú ulo uku eze, ndi-Ju b͕uru nnù ndikom na ọgu ise, me ka ha la n’iyì.

7 Ha b͕u-kwa-ra Pashandata, na Dalfon, na Aspata,

8 na Porata, na Adalia, na Aridata,

9 na Pamashta, na Arisai, na Aridai, na Vaizata,

10 bú umu-ndikom iri nke Heman nwa Hamedata, bú onye nākpab͕u ndi-Ju; ma ha esetighi aka-ha n’ihe-nluta-n’agha-ha.

11 N’ubọchi ahu ọnu-ọgugu ndi eb͕uru eb͕u na Shushan, bú ulo uku eze, biaruru n’iru eze.

12 Eze we si Esta, bú nwunye eze, Nime Shushan, bú ulo uku eze, ka ndi-Ju b͕uworo nnù ndikom na ọgu ise, na umu-ndikom iri Heman, me ka ha la n’iyì; gini kwa ka ha meworo n’ala anāchi achi nke fọduru nke eze? Ma gini bu aririọ-gi? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi ọzọ? agēme kwa ya.

13 Esta we si, Ọ buru na ọ di eze nma, ka enye kwa ndi-Ju ike echi, bú ndi nọ na Shushan, ime dika iwu ta si di, ka akwuba kwa umu-ndikom iri Heman n’elu osisi.

14 Eze we si ka eme ya otú a: ewe nye iwu nime Shushan; ha we kwuba umu-ndikom iri nke Heman.

15 Ndi-Ju ndi nọ na Shushan we kpọkọta kwa onwe-ha n’ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada, b͕ue ọgu ndikom iri-na-ise nime Shushan; ma ha esetighi aka-ha n’ihe-nluta-n’agha-ha.

16 Ndi-Ju fọduru ndi nọ n’ala nile anāchi achi nke eze kpọkọta-kwa-ra onwe-ha, we guzo n’ihi ndu-ha, zuru ike pua n’aka ndi-iro-ha, b͕ue orú nnù ndikom uzọ iteghete na nnù asa na ọgu iri n’etiti ndi nākpọ ha asì; ma ha esetighi aka-ha n’ihe-nluta-n’agha-ha.

17 N’ubọchi nke-iri-na-atọ n’ọnwa Ada ka ha mere nka; ha we zuru ike n’ubọchi nke-iri-na-anọ nime ya, me ya ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na ọṅù.

18 Ma ndi-Ju ndi nọ na Shushan kpọkọtara onwe-ha n’ubọchi nke-iri-na-atọ nime ya, na n’ubọchi nke-iri-na-anọ nime ya; ha we zuru ike n’ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, me ya ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na ọṅù.

19 N’ihi nka ndi-Ju nke obodo nile nēnweghi mb͕idi, bú ndi bi n’obodo nēnweghi mb͕idi, nēme ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada ka ọ buru ubọchi ọṅù na ọṅuṅu-manya-vine, na ezi ubọchi, na ubọchi izigaritara onwe-ha òkè.

20 Mọdekai we de ihe ndia n’akwukwọ, zigara ndi-Ju nile akwukwọ, bú ndi nọ n’ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, ma ndi nọ nso ma ndi nọ n’ebe di anya,

21 ime ka o guzosiri ha ike na ha ganēme ememe n’ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada, na n’ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, n’arọ nile ọ bula,

22 dika ubọchi nke ndi-Ju zuru ike nime ha pua n’aka ndi-iro-ha, na ọnwa ahu nke b͕anwere n’ebe ha nọ, isi n’ihe-nwuta ghọ ọṅù, isi kwa n’iru-újú ghọ ezi ubọchi: na ha ganēme ha ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na nke ọṅù, na nke izigaritara onwe-ha òkè, na nke inye ndi-ob͕eye onyinye.

23 Ndi-Ju we nara ihe ahu nke ha malitere ime, na nke Mọdekai degara ha n’akwukwọ;

24 n’ihi na Heman nwa Hamedata, onye Egag, bú onye nākpab͕u ndi-Ju nile, chère èchìchè megide ndi-Ju ime ka ha la n’iyì, o we fe Pua, nke ahu bu nzà, ichusa ha, na ime ka ha la n’iyì;

25 ma mb͕e Esta batara n’iru eze, eze ji akwukwọ si ka èchìchè ọjọ ya, nke o chère megide ndi-Ju, ka o chigharikwasi n’isi-ya; ọ si kwa ka akwuba ya na umu-ya ndikom n’elu osisi.

26 N’ihi nka ka ha kpọrọ ubọchi ndia Purim, n’aha Pua ahu. N’ihi nka, bú n’ihi okwu nile nke akwukwọ a, na ihe ha huru bayere nka, na ihe biaruru ha aru,

27 n’ihi nka ka ndi-Ju mere ka o guzosie ike, ha we nara ihe a bayere onwe-ha, baye-kwa-ra nkpuru-ha, baye-kwa-ra ndi nile ndi nārapara n’aru-ha, ka o we ghara igabiga, bú na ha ganēme ememe n’ubọchi abua ndia dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika mb͕e-ha ezubere ezube si di, n’arọ nile ọ bula;

28 na aganēcheta kwa ubọchi ndia me kwa ememe nime ha n’ọb͕ọ nile ọ bula, na ab͕uru ọ bula, na ala ọ bula anāchi achi, na obodo ọ bula; na ubọchi ndia nke Purim agaghi-esi kwa n’etiti ndi-Ju gabiga, na ncheta-ha agaghi-agwu kwa site na nkpuru-ha.

29 Esta, bú nwunye eze, nwa-nwayi Abihail, na Mọdekai, bú onye-Ju, we were ike nile de akwukwọ ime ka akwukwọ-ozi a nke-abua nke Purim guzosie ike.

30 O we zigara ndi-Ju nile akwukwọ, nke okwu udo na nke ezi-okwu di nime ha, rue ọgu ala anāchi achi isi na asa, bú nke ala-eze Ahasuerọs,

31 ime ka ubọchi ndia nke Purim guzosie ike nime mb͕e-ha ezubere ezube, dika Mọdekai, bú onye-Ju, na Esta, bú nwunye eze, mere ka ha guzosiere ha ike, na dika ha mere ka ha guzosiere onwe-ha, guzosi-kwa-ra nkpuru-ha, ike, bú okwu obubu-ọnu na ikwa-ákwá-ha.

32 Okwu-ọnu Esta we me ka okwu ndia nke Purim guzosie ike; ewe de ya n’akwukwọ.

Categories
ESTA

ESTA 10

1 Eze, bú Ahasuerọs, we me ka ala ahu na ala nile nke di oké osimiri buruburu tua utu.

2 Ma ọlu nile nke ike-ya na nke idi-ike-ya, na ọkukọ-isi nke idi-uku nke Mọdekai, bú nke eze mere ya ka ọ di uku, èdeghi ihe ndia n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi nke ndi-eze Midia na Peasia?

3 N’ihi na Mọdekai, bú onye-Ju, nọsoro eze, bú Ahasuerọs, ọ di kwa uku n’etiti ndi-Ju, na onye ihe-ya tọrọ ọtutu umu-nne-ya utọ; ọ nāchọrọ ndi-ya ọdi-nma, nāgwa kwa nkpuru-ya nile okwu udo.

Categories
JOB

JOB 1

1 Otù nwoke di n’ala Uz, Job bu aha-ya; nwoke ahu zuru okè, zi kwa ezi, ọ nātu kwa egwu Chineke, nēsi kwa n’ihe ọjọ wezuga onwe-ya.

2 Ewe muara ya umu-ndikom asa na umu-ndinyom atọ.

3 Ihe-nnweta-ya di nnù ewu na aturu iri-na-asa na ọgu iri, na nnù camel asa na ọgu iri, na nnù ehi abua na ọgu iri ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu na ọgu ise, na ndi-orù bara uba nke-uku; nwoke ahu we di uku kari umu Iru-anyanwu nile.

4 Ma umu-ya ndikom jere me ọṅuṅu-manya-vine n’ulo nwoke ọ bula nime ha n’ubọchi-ya; ha zì-kwa-ra kpọ umu-nne-ha ndinyom atọ iso ha rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.

5 O rue, mb͕e ubọchi nile nke ọṅuṅu-manya-vine-ha gasiri buruburu, na Job zìri do ha nsọ, o we bilie n’isi-ututu, sure àjà-nsure-ọku, dika ọnu-ọgugu ha nile si di: n’ihi na Job siri, Eleghi anya umum ndikom emehiweo, b͕akuta kwa Chineke azu n’obi-ha. Otú a ka Job nēme ubọchi nile.

6 Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n’iru Jehova, Setan we bia kwa n’etiti ha.

7 Jehova we si Setan Òle ebe i si bia? Setan we za Jehova, si, Site n’igaghari n’uwa, na site n’ijeghari nime ya.

8 Jehova we si Setan Ì tukwasiwo obi-gi n’aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n’uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n’ihe ọjọ wezuga onwe-ya.

9 Setan we za Jehova, si, Ọ̀ bu n’efu ka Job nātu egwu Chineke?

10 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi b͕aworo ya, b͕a-kwa-ra ulo-ya, b͕a-kwa-ra ihe nile o nwere, ogige buruburu? I gọziwo ọlu aka-ya abua, ihe-nnweta-ya ab͕asawo kwa n’ala.

11 Ma otú ọ di, biko setipu aka-Gi, metu ihe nile o nwere, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n’iru Gi.

12 Jehova we si Setan Le, ihe nile o nwere di n’aka-gi; nání esetila aka-gi metu aru-ya. Setan we si n’iru Jehova pua.

13 O rue, n’otù ubọchi, mb͕e umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom nēri ihe nāṅu kwa manya-vine n’ulọ nwa-nne-ha, bú ọkpara,

14 na onye-ozi biakutere Job, si, Ìgwè ehi nādọ ihe eji gwu ala-ubi, ìgwè nne-inyinya-ibu nāta nri n’akuku ha:

15 ndi Sheba we dakwasi ha, chiri ha; ọzọ kwa, ha ewerewo ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.

16 Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ọku nke Chineke esiwo n’elu-igwe da, rechapu ìgwe ewu na aturu, na ndi nējere gi ozi, ripia ha; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.

17 Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ndi Kaldea doro usu atọ, made imegide camel, chiri ha, ọzọ kwa, ha were ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.

18 Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri ihe nāṅu kwa manya-vine n’ulo nwa-nne-ha, bú ọkpara:

19 ma, le, oké ifufe siri n’ofè ọzara bia, tie nkuku anọ nke ulo ahu, o we dakwasi umu-okorọbia ahu, ha we nwua; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.

20 Job we bilie, dọwa uwe-nwuda-ya; kọpu isi-ya, da n’ala, kpọ isi ala;

21 o si, Ọtọ ka m’b͕ara si n’afọ nnem puta, ọtọ ka m’gāb͕a kwa laghachi n’ebe ahu: Jehova nyere, Jehova anarawo kwa; ka aha Jehova buru ihe agọziri agọzi.

22 N’ihe a nile Job emehieghi, ọ sighi kwa na Chineke mere ihe-nzuzu.

Categories
JOB

JOB 2

1 Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n’iru Jehova, Setan we bia kwa n’etiti ha iguzo onwe-ya n’iru Jehova.

2 Jehova we si Setan, Òle ebe i si bia? Setan we za Jehova, si, Site n’igaghari n’uwa, na site n’ijeghari nime ya.

3 Jehova we si Setan, Ì tukwasiwo obi-gi n’aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n’uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n’ihe ọjọ wezuga onwe-ya: ọ nọ nējide kwa izu-okè-ya, ma i nākpalim imegide ya, iloda ya n’efu.

4 Setan we za Jehova, si, Akpukpọ-aru lara akpukpọ-aru, ọbuná ihe nile nke madu nwere ka ọ gēnye n’ọnọdu ndu-ya.

5 Otú ọ di, biko, setipu aka-Gi, metu okpukpu-ya metu kwa anu-aru-ya, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n’iru Gi.

6 Jehova we si Setan, Le, ọ nọ n’aka-gi; nání debe ndu-ya.

7 Setan we si n’iru Jehova pua, were ihe-ofifi ọjọ tie Job, site n’ọbu-ukwu-ya rue opu-n’isi-ya.

8 O we were n’onwe-ya ejùjù iji kọ onwe-ya ọkọ; ya onwe-ya nānọdu kwa n’etiti ntu.

9 Nwunye-ya we si ya, Ì nọ nējide izu-okè-gi? b͕akuta Chineke azu, nwua.

10 Ọ si ya, Dika otù nime ndinyom nzuzu si ekwu, otú a ka i nēkwu. Àyi gānara kwa ezi ihe n’aka Chineke, ghara inara ihe ọjọ? Nihe a nile Job ejighi eb͕ub͕ere-onu-ya mehie.

11 Ndi-eyì atọ nke Job we nu ihe ọjọ a nile nke biakwasiri ya, ha we bia, nwoke ọ bula site n’ebe-ya; Elifaz, bú onye Timan; na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama: ha we zukọta n’otù ibia igosi ya ebere ha ji n’aru ya na ikasi ya obi.

12 Ha we welie anya-ha site n’ebe di anya, le ya, ma ha amataghi ya, ha we welie olu-ha, kwa ákwá. ha we dọwa, nwoke ọ bula uwe-nwuda-ya, ha we kpokwasi ájá n’isi-ha n’ikpoli ya n’ebe elu-igwe di.

13 Ha na ya we nānọko n’ala ubọchi asa ehihie na abali, ma ọ dighi onye nāgwa ya okwu; n’ihi na ha huru na o nēb͕u ya nb͕u nke-uku.

Categories
JOB

JOB 3

1 Mb͕e ihe a gasiri, Job saghere ọnu-ya, kọcha ubọchi-ya.

2 Job we za, si:

3 Ka ubọchi nke amurum nime ya la n’iyì,

Ya na abali ahu nke siri, Aturu ime nwa-nwoke.

4 Ka ubọchi ahu ghọ ọchichiri;

Ka Chineke ghara isi n’elu ju ase ya,

Ka ìhè ghara kwa imukwasi ya.

5 Ka ọchichiri na onyinyo ọnwu b͕aputa ya;

Ka igwe-oji biri n’elu ya;

Ka ihe nile nke nēme ka ubọchi b͕a ọchichiri me ka ọ tua egwu nke-uku.

6 Abali ahu, ka oké ọchichiri jide ya:

Ka ọ ghara iṅuri ọṅu n’etiti ubọchi nile nke arọ;

Ka ọ ghara ibata n’ọnu-ọgugu ọnwa.

7 Le, ka abali ahu ghọ nwayi-àgà;

Ka iti-nkpu-ọṅù ghara ibà nime ya.

8 Ka ha bua ya ọnu, bú ndi nābu ubọchi ọnu,

Ndi nọ na njikere ikpọte leviathan.

9 Ka kpakpando nile nke emumechi-ya b͕a ọchichiri:

Ka ọ le anya ìhè, ìhè adighi kwa;

Ka ọ ghara ile mbuboro-anya nke chi-ọbubọ anya:

10 N’ihi na o mechighi ọnu-uzọ afọ nke m’si nime ya puta,

O zopughi kwa ọnọdu ọjọ n’anyam.

11 N’ìhi gini ka m’nēsighi n’àkpà-nwa nwua?

N’ìhi gini ka m’nāputaghi n’afọ kubìe ume?

12 Gini mere ikperè abua di n’irum inaram?

Ma-ọbu ara, ka m’we ṅua?

13 N’ihi na ub͕u a ka m’gēdinawori di jū

M’gāraruwori ura; mb͕e ahu ka izu-ike gādirim:

14 Mu na ndi-eze na ndi-ndum-ọdu nke uwa,

Ndi nēwuru onwe-ha nkpọnkpọ ebe;

15 Ma-ọbu mu na ndi-isi ndi nwere ọla-edo,

Ndi nēmeju ulo-ha n’ọla-ọcha:

16 Ma-ọbu gini mere m’nādighi ka nwa amukworo amukwo nke ezoworo ezo;

Dika umu ọhu nke nāhughi ìhè?

17 N’ebe ahu ka ndi nēmebi iwu rapuworo ime nkpatu;

Ọ bu kwa n’ebe ahu ka ndi ike gwuru nēzu ike.

18 N’ebe ahu ka ndi-nkpọrọ nānọkọ jū;

Ha anughi olu ndi nāchi ha n’ihe-ike.

19 Onye ntà na onye uku nọ n’ebe ahu, ha abua;

Orù apuwo kwa n’aka onye-nwe-ya nwere onwe-ya.

20 N’ìhi gini ka O nēnye onye nọ n’ọnọdu ọjọ ìhè?

N’ìhi gini kwa ka O nēnye ndi nkpuru-obi-ha di ilu ndu?

21 Ndi nēchere ọnwu, ma ọ dighi-abia;

Ha nēgwu kwa ala-ya kari àkù zoro ezo;

22 Ndi nāṅuri rue otite-egwú-ọṅù,

Obi nātọ kwa ha utọ mb͕e ha chọtara ílì.

23 N’ìhi gini ka O nēnye nwoke nke ezoworo uzọ-ya ìhè,

Bú onye Chineke b͕ochiwo-kwa-ra ya?

24 N’ihi na ọ bu tutu eriem nrim ka ize-umem nābia,

Anāwusi kwa ọb͕ub͕ọ-ujam nile dika miri.

25 N’ihi na oké egwu ka m’turu, o we biakwasim,

Ihe nke m’turu ujọ biakute-kwa-ram.

26 Anọghm n’udo, anọghkwam jū, ezughkwam ike;

Ma ime-nkpatu biara.

Categories
JOB

JOB 4

1 Elifaz, bú onye Timan, we za, si,

2 Asi na otù onye anwa igwa gi okwu, ìke gāgwu gi?

Ma ònye puru ib͕ọchi onwe-ya n’ikwa okwu?

3 Le, i dọwo ọtutu madu, aka na nti,

I nēme kwa ka aka nke nādighi ike di ike.

4 Okwu-gi nēme ka onye nāsu ngọngọ guzosie ike,

I nāb͕a kwa ikperè nēruru ala ume.

5 Ma ub͕u a ọ nābiakute gi, ike we gwu gi;

Ọ nēmetu gi aru, i we ma jijiji.

6 Ọ̀ bughi egwu-Chineke-gi bu ntukwasi-obi-gi?

Ọ̀ bughi kwa izu-okè uzọ-gi nile bu olile-anya-gi?

7 Biko, cheta, ònye laworo n’iyì, mb͕e ya onwe-ya bu onye nēmeghi ihe ọjọ?

Ma-ọbu òle ebe ezipuwo ndi ziri ezi?

8 Dika m’huworo anya, ndi nēgwu ajọ ihe dika ala-ubi,

Ndi nāgha kwa nmeb͕u dika nkpuru-ọghigha, ha nēwe ya dika ihe-ubi.

9 Site n’iku-ume Chineke ka ha nāla n’iyì,

Site kwa n’ifufe nke iwe-Ya ka anēme ka ha gwusia.

10 Ọb͕ub͕ọ-uja ọdum, na olu ọdum nāb͕ọ uja,

Na ezé umu-ọdum, ka emebiworo.

11 Oke-ọdum nāla n’iyì site n’enweghi ihe ọ dọb͕utara,

Umu nke nne-ọdum ekesawo kwa onwe-ha.

12 Ma mu ka ezutara okwu n’ori nye,

Ntim we nara ntakwu nke sitere na ya.

13 N’èchìchè sitere n’ọhù nile nke abali,

Mb͕e oké ura nādakwasi madu,

14 Oké egwu zuterem, ya na ima-jijiji,

O we me ka ọtutu ọkpukpum tua oké egwu.

15 Otù mọ we gabiga n’irum;

Aji anu-arum we guzo ọtọ.

16 Ọ nēguzo eguzo, ma amataghm otú ọ di n’ile ya anya;

Otù udi di n’iru anyam:

Idebe-ọnu-du di, ma olu ka m’nānu, si,

17 Madu, ọ̀ gābu onye ezi omume kari Chineke?

Nwòke gādi ọcha kari Onye kèworo ya?

18 Le, ọbuná ndi-orù-Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi;

Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ nēbo ebubo na ha bu ndi-nmehie:

19 Ò gesi kwa aṅa ghara ibo kari ndi bi n’ulo urọ?

Nke ntọ-ala-ha di n’ájá,

Ndi anāzọpia azọpia dika nla.

20 Site n’ututu rue anyasi anētib͕u ha:

Ha nāla n’iyì rue mb͕e ebighi-ebi, ma ọ dighi onye nātukwasi ya obi.

21 Àdopughi udọ̀ ulo-ikwū-ha nime ha?

Ha nānwu, ọ bughi kwa n’amam-ihe.