Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 8

1 Ndi ahu nile we chikọta onwe-ha dika otù onye rue amá nke di n’iru ọnu-uzọ-ama miri; ha we si Ezra, bú ode-akwukwọ, ka o weta akwukwọ iwu Moses, nke Jehova nyere Israel n’iwu.

2 Ezra, bú onye-nchu-àjà, we weta iwu ahu n’iru nkpọkọta Israel, ma ndikom ma ndinyom, ma onye ọ bula nke nāghọta inu ihe, n’ubọchi mbu nke ọnwa nke-asa.

3 O we gua nime ya n’iru amá nke di n’iru ọnu-uzọ-ama miri site oge ututu rue etiti-ehihie, n’iru ndikom na ndinyom na ndi nāghọta ihe; ndi ahu nile we ṅa nti akwukwọ iwu ahu.

4 Ezra, bú ode-akwukwọ, we guzo n’elu ulo-elu osisi, nke ha mere bayere ihe a; Matitaia, na Shema, na Anaia, na Uraia, na Hilkaia, na Maaseia, we guzo n’akuku ya, n’aka-nri-ya; Pedaia kwa, na Mishael, na Malkija, na Hashum, na Hashbadana, na Zekaraia, na Meshulam, n’aka-ekpe-ya.

5 Ezra we saghe akwukwọ n’anya ndi ahu nile; (n’ihi na ọ nọ n’elu n’ebe ndi ahu nile nọ;) ma mb͕e ọ saghere ya, ndi ahu nile guzoro:

6 Ezra we gọzie Jehova, bú Chineke uku. Ndi ahu nile we za, si, Amen, Amen, n’ichili aka-ha elu: ha we rube isi-ha, kpọ isi ala nye Jehova, kpue iru-ha n’ala.

7 Ọzọ, Jeshua, na Bani, na Sherebia, na Jamin, na Akub, na Shabetai, na Hodia, na Maaseia, na Kelita, na Azaraia, na Jozabad, na Hanan, na Pelaia, na ndi Livai, mere ka ndi ahu ghọta iwu ahu: ndi ahu nēguzo kwa n’ebe-nguzo-ha.

8 Ha wee gua n’akwukwọ ahu, bú n’iwu Chineke, guputa ya nke-ọma, we me ka amata isi-ya, ha we ghọta ọgugu-ya.

9 Nehemaia, nke ya onwe-ya bu Tiashata, na Ezra onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ, na ndi Livai, bú ndi nēzí ndi ahu ihe, we si ndi ahu nile, Ta, ihe nsọ nke diri Jehova, bú Chineke-unu, ka ọ bu; unu erula újú, akwa-kwa-la ákwá. N’ihi na ndi ahu nile nākwa ákwá, mb͕e ha nuru okwu nile nke iwu ahu.

10 O we si ha, Jerenu onwe-unu, rie ihe mara abuba, ṅua ihe-ọṅuṅu di utọ, were òkè zigara ndi ọ nādighi ihe edoziworo ha: n’ihi na nsọ ka ubọchi ta diri Onye-nwe-ayi: ihe ewuta-kwa-la unu; n’ihi na ọṅù Jehova bu ike-unu.

11 Ndi Livai we nēme ka ndi ahu nile b͕a nkiti, si, Nọdunu du, n’ihi na ubọchi a di nsọ, ihe ewuta-kwa-la unu.

12 Ndi ahu nile we je iri ihe, na iṅu ihe ọṅuṅu, na iziga òkè, na ime ka oké ọṅù di, n’ihi na ha ghọtara okwu nile nke emere ka ha mara.

13 Ma n’ubọchi nke-abua achikọtara ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi ahu nile, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, n’ebe Ezra, bú ode-akwukwọ, nọ, ọbuná inwe uche bayere okwu nile nke iwu ahu.

14 Ha we chọputa ihe a edeworo n’iwu, bú na Jehova nyere iwu site n’aka Moses, ka umu Israel nọdu n’ulo-ntu n’ememe di n’ọnwa nke-asa:

15 na ka eme ka anu ka ekwusa kwa n’obodo-ha nile na nime Jerusalem, si, Puanu je n’ugwu, chita akwukwọ osisi olive, na akwukwọ osisi nēnye manu, na akwukwọ osisi myrtle, na igu nkwu, na akwukwọ nke osisi b͕ara n’ọhia, ime ulo-ntu, dika edeworo ya n’akwukwọ.

16 Ndi ahu we je, chita ha, mere onwe-ha ulo-ntu, nwoke ọ bula n’elu-ulo-ya, na n’ogige nile ha, na n’ogige nile nke ulo Chineke, na n’amá nke ọnu-uzọ-ama miri, na n’amá nke ọnu-uzọ-ama Efraim.

17 Nkpọkọta ahu nile nke ndi nālata site na ndọta-n’agha ahu mere ulo-ntu, we nọdu n’ulo-ntu-ha: n’ihi na umu Israel emeghi otú a site n’ubọchi Jeshua nwa Nun rue ubọchi ahu. Oké ọṅù di uku we di.

18 O we nāgu n’akwukwọ iwu Chineke kwa-ubọchi, site n’ubọchi mbu rue ubọchi ikpe-azu. Ha we me ememe ahu ubọchi asa; ma n’ubọchi nke-asatọ ubọchi-nb͕ochi di, dika ikpé-ya si di.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 9

1 Ma n’ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nka achikọtara umu Israel n’obubu-ọnu, na n’ákwà-nke, ájá dikwasi kwa ha.

2 Nkupuru Israel we kewaputa onwe-ha n’aru ndi ala ọzọ nile, guzo, kwuputa nmehie nile ha, na ajọ omume nile nke ndi bu nna-ha.

3 Ha we bilie n’ebe-nguzo-ha, gua n’akwukwọ iwu Jehova, bú Chineke-ha, otù uzọ n’uzọ anọ nke ubọchi; otù uzọ n’uzọ anọ kwa ka ha nēkwuputa, nākpọ kwa isi ala nye Jehova, bú Chineke-ha.

4 Jeshua, na Bani, na Kadmiel, na Shebania, na Buni, na Sherebia, na Bani, na Kenani, we bilie n’elu ihe-nrigo ndi Livai, were oké olu tikue Jehova, bú Chineke-ha.

5 Ndi Livai, bú Jeshua, na Kadmiel, na Bani, na Hashabneia, na Sherebia, na Hodia, na Shebania, na Petahia, we si, Bilienu, gọzie Jehova, bú Chineke-unu, site na mb͕e edighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi: ka ha gọzi kwa aha-Gi di nsọpuru, nke ebuliworo ya elu kari ngọzi na otuto nile.

6 Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi; Gi onwe-gi emewo elu-igwe, bú elu-igwe nke elu-igwe nile, na usu-ha nile, na uwa na ihe nile nke di n’elu ya, na oké osimiri nile na ihe nile nke di nime ha, Gi onwe-gi nēdebe kwa ha nile ndu; usu ihe elu-igwe nākpọ kwa isi ala nye Gi.

7 Gi onwe-gi, Jehova, bu Chineke ahu Nke rọputara Abram, me ka o si na Ua nke ndi Kaldea puta, I gu-kwa-ra aha-ya Abraham;

8 I hu-kwa-ra na obi-ya kwesiri ntukwasi-obi n’iru Gi, Gi na ya b͕a-kwa-ra ndu na I gēwere ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi Perizait na ndi Jebus na ndi-Giagashait nye, bú iwere ya nye nkpuru-ya, I we me ka okwu-Gi guzosie ike; n’ihi na onye ezi omume ka I bu.

9 I hu-kwa-ra mweda-n’ala nke nna-ayi-hà n’Ijipt, nu kwa iti-nkpu-ha n’akuku Oké Osimiri Uhie;

10 I we tiye ihe-iriba-ama na ihe-ebube n’aru Fero, na n’aru ndi-orù-ya nile, na n’aru ndi nile nke ala-ya; n’ihi na I mara na ha were nganga megide ha; I we mere Onwe-gi aha, dika o si di ta.

11 I kewa-kwa-ra oké osimiri n’iru ha, ha we gabiga n’etiti oké osimiri n’elu ala-akọrọ; ma I tubàra ndi nāchu ha na miri di omimi, dika nkume nime miri di ike.

12 Ọ bu kwa ogidi igwe-oji ka I nēwere du ha n’ehihie; I nēwere kwa ogidi ọku n’abali, inye ha ìhè n’uzọ ahu nke ha gēje ije nime ya.

13 Ọ bu kwa n’elu ugwu Sainai ka I ridara, si n’elu-igwe kpayere ha uka, I we nye ha ikpé ziri ezi na iwu ezi-okwu, na ezi ukpuru na ihe enyere n’iwu:

14 I me-kwa-ra ka ha mara ubọchi-izu-ike nsọ Gi, I were kwa ihe enyere n’iwu, na ukpuru, na iwu, nye ha n’iwu site n’aka Moses, bú orù-Gi:

15 ọ bu kwa nri nke sitere n’elu-igwe ka I nyere ha bayere agu-ha, me kwa ka miri si na nkume di elu putara ha bayere akpiri-ikpọ-nku-ha, I si-kwa-ra ha ba nime inweta ala ahu nke I weliri aka-Gi inye ha.

16 Ma ndi ahu na nna-ayi-hà mere ihe na nganga, kwesie olu-ha ike, ha egeghi kwa nti ihe nile I nyere n’iwu,

17 ha we ju inu ihe, ha echetaghi kwa oké ọlu-Gi nile nke I luru n’etiti ha; ha we kwesie olu-ha ike, do onye-isi nime nnupu-isi-ha ilaghachi n’ọbubu-orù-ha: ma Gi onwe-gi bu Chineke nke nb͕aghara nmehie, Onye nēme amara nwe kwa obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n’ebere, I rapughi kwa ha.

18 Ọbuná mb͕e ha mere nwa-ehi awuru awu nye onwe-ha, si, Nka bu chi-gi nke mere ka i si n’Ijipt rigoputa, ha we me oké ihe-nlelì-anya;

19 ma Gi onwe-gi n’ọtutu obi-ebere-Gi arapughi ha n’ọzara: ogidi igwe-oji esighi n’elu ha wezuga onwe-ya n’ehihie, idu ha n’uzọ-ha; ogidi ọku ewezugaghi kwa onwe-ya n’abali, inye ha na uzọ ahu nke ha nēje ije nime ya ìhè.

20 I nye-kwa-ra ezi Mọ nke Gi ime ka ha nwe uche, I b͕ochighi kwa manna-Gi n’ọnu-ha, I nye-kwa-ra ha miri bayere akpiri-ikpọ-nku-ha.

21 Ọ bu kwa ọgu arọ abua ka I zùru ha n’ọzara, ọ dighi kwa ihe kọrọ ha; uwe-ha akaghi nká, ukwu-ha azaghi kwa aza.

22 Ọzọ, I nyere ha ala-eze na ndi di iche iche, we kè ha n’òkè n’òkè n’akuku nile: ha we nweta ala Saihon, bú ala nke eze Heshbon, na ala Og, bú eze Beshan.

23 I me-kwa-ra ka umu-ha ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, I we me ka ha ba n’ala ahu nke I siri ndi bu nna-ha ka ha ba inweta ya.

24 Umu-ha we ba, nweta ala ahu, I we ruru ndi bi n’ala ahu, bú ndi Kenean, ala n’iru ha, were ha, na ndi-eze-ha, na ndi di iche iche nke ala ahu, nye n’aka-ha, ka ha were ha me dika ọ tọrọ ha utọ

25 Ha we were obodo di iche iche ewusiri ike, na ala nwere ume, ha nweta-kwa-ra ulo juputara n’ezi ihe nile, na olùlù-miri egwuwara egwuwa, na ubi-vine, na ubi-olive, na ọtutu osisi nāmi nkpuru anēri eri: ha we rie ihe, afọ ju-kwa-ra ha, ha we gba abuba, ezi ihe uku Gi we tọ ha utọ.

26 Ma ha juru Gi aju, nupu isi megide Gi, tufue iwu-Gi n’azu ha, b͕ue ndi-amuma-Gi ndi b͕ara àmà megide ha ime ka ha chigharikute Gi, ha we me oké ihe-nlelì.

27 I we nye ha n’aka ndi nākpab͕u ha, ha we kpab͕ue ha: ma na mb͕e nkpab͕u-ha, ha we tikue Gi, Gi onwe-gi we site n’elu-igwe nu, nye ha ndi-nzọputa dika ọtutu obi-ebere-Gi nile si di, ha we zọputa ha n’aka ndi nākpab͕u ha.

28 Ma mb͕e izu-ike diri ha, ha me-kwa-ra ihe ọjọ n’iru Gi ọzọ: I we rapu ha n’aka ndi-iro-ha, ha we nwe ike n’aru ha: ha we laghachi, tikue Gi, Gi onwe-gi we site n’elu-igwe nu, naputa ha ọtutu ub͕ò dika obi-ebere-Gi si di,

29 I we b͕a àmà megide ha, ime ka ha lata n’iwu-Gi: ma ndi ahu mere ihe na nganga, ha egeghi kwa nti ihe nile I nyere n’iwu, kama ha mehiere megide ikpé-Gi nile, (nke madu nēme nādi kwa ndu nime ha,) ha we wezuga ubu-ha, kwesie olu-ha ike, ha anughi kwa.

30 Ma I nēme ka ọtutu arọ di ogologo n’isi ha, I we were Mọ-Gi b͕a àmà megide ha site n’aka ndi-amuma-Gi: ma ha aṅaghi nti: I we nye ha n’aka ndi di iche iche nke ala ọzọ.

31 Ma n’ọtutu obi-ebere-Gi I meghi ka ha gwusia, I rapughi kwa ha; n’ihi na Chineke Nke nēme amara, Nke nwe kwa ra obi-ebere, ka I bu.

32 Ma ub͕u a, Chineke-ayi, Chineke uku, Nke bu dike, Nke di kwa egwu, Gi Onye nēdebe ọb͕ub͕a-ndu na ebere, ka ike-ọgwugwu nile ghara idi ntà n’iru Gi, bú nke gwuworo ayi, gwu kwa ndi-eze-ayi, gwu kwa ndi-isi-ayi, gwu kwa ndi-nchu-àjà-ayi, gwu kwa ndi-amuma-ayi, gwu kwa nna-ayi-hà, gwu kwa ndi-Gi nile, site n’ubọchi ndi-eze Asiria rue ta.

33 Ma Gi onwe-gi bu onye ezi omume bayere ihe nile nke biakwasiworo ayi; n’ihi na ihe bu ezi-okwu ka I meworo, ma ayi onwe-ayi emebiwo iwu:

34 ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, na nna-ayi-hà, ha emeghi kwa iwu-Gi, ha aṅaghi kwa nti n’ihe nile I nyere n’iwu na n’àmà-Gi nile, nke I b͕ara megide ha.

35 Ha onwe-ha efèghi kwa Gi n’ala-eze-ha, na n’ezi ihe-Gi bara uba nke I nyere ha, na n’ala ahu sara mbara nke nwe-kwa-ra ume, nke I tiyere n’iru ha, ha esighi kwa n’omume ọjọ nile ha chigharia.

36 Le, ayi onwe-ayi bu ndi-orù ta, ma ala ahu nke I nyere nna-ayi-hà iri nkpuru-ya na ezi ihe-ya, le, ayi onwe-ayi bu ndi-orù nime ya.

37 Ọ nēme-kwa-ra ndi-eze ọtutu ihe-ọmume, bú ndi I doro ndi-isi-ayi n’ihi nmehie nile ayi: ha nāchi kwa aru-ayi, na n’etiti anu-ulo-ayi, dika ọ nātọ ha utọ, ọ bu kwa na nkpab͕u uku ka ayi nọ.

38 Ma n’ihi ihe a nile ka ayi onwe-ayi nēme ọb͕ub͕a-ndu kwesiri ntukwasi-obi, ayi nēde kwa ya n’akwukwọ; ndi-isi-ayi na ndi Livai ayi na ndi-nchu-àjà-ayi bu kwa ndi-isi n’ikà ihe ahu akara akàrà.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 10

1 Ma ndi bu ndi-isi n’ikà ihe nile akara akàrà bu, Nehemaia, bú Tiashata, nwa Hakalaia, na Zedekaia;

2 na Seraia, na Azaraia, na Jeremaia;

3 na Pashua, na Amaraia, na Malkija;

4 na Hatush, na Shebania, na Maluk;

5 na Harim, na Meremot, na Obadaia;

6 na Daniel, na Gineton, na Beruk;

7 na Meshulam, na Abaija, na Mijamin;

8 na Maazia, na Bilgai, na Shemaia; ndia bu ndi-nchu-àjà.

9 Ndi Livai kwa: bú Jeshua nwa Azania, na Binui nke sitere n’umu Henadad, na Kadmiel;

10 na umu-nne-ha, bú Shebania, na Hodia, na Kelita, na Pelaia, na Hanan;

11 na Maika, na Rehob, na Hashabaia;

12 na Zakua, na Sherebia, na Shebania;

13 na Hodia, na Bani, na Beninu.

14 Ndi-isi ndi Israel: bú Parosh, na Pahat-moab, na Ilam, na Zatu, na Bani;

15 na Buni, na Azgad, na Bebai;

16 na Adonaija, na Bigvai, na Adin;

17 na Atea, na Hezekaia, na Azua;

18 na Hodia, na Hashum, na Bezai;

19 na Harif, na Anatot, na Nobai;

20 na Magpiash, na Meshulam, na Hezia;

21 na Meshezabel, na Zedok, na Jadua;

22 na Pelataia, na Hanan, na Anaia;

23 na Hoshea, na Hananaia, na Hashub;

24 na Halohesh, na Pilha, na Shobek;

25 na Rehum, na Hashabna, na Maaseia;

26 na Ahia, na Hanan, na Anan;

27 na Maluk, na Harim, na Beana.

28 Ndi-ayi fọduru, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù, na Netinim, na onye ọ bula nke siworo n’etiti ndi iche iche nke ala ọzọ kewapuru iwu Chineke onwe-ya, ha na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndiyom, onye ọ bula nke mara ihe, nke nāghọta kwa ihe;

29 ha nēkekọta onwe-ha n’aru umu-nne-ha, bú ndi-ha di ebube, ha nābà kwa n’ọb͕ub͕a-iyi na n’ọṅuṅu-iyi, ijeghari n’iwu Chineke, nke enyere site n’aka Moses, bú orù Chineke, na idebe na ime ihe nile Jehova, bú Onye-nwe-ayi, nyere n’iwu, na ikpé-Ya nile na ukpuru-Ya nile;

30 ọzọ kwa, na ayi agaghi-enye ndi di iche iche nke ala ahu umu-ayi ndinyom, na ayi agaghi-aluta-kwa-ra umu-ayi ndikom umu-ha ndinyom:

31 ọzọ, ndi di iche iche nke ala ahu ndi nēwebata ihe-ahia na ọka ọ bula n’ubọchi-izu-ike ire ere, na ayi agaghi-azuru n’aka-ha n’ubọchi-izu-ike, ma-ọbu n’ubọchi nsọ: ọzọ, na ayi gārapu arọ nke-asa na ihe-nbinye ọ bula.

32 Ayi me-kwa-ra ihe enyere n’iwu ka ha guzoro ayi, bú ibokwasi onwe-ayi otù uzọ n’uzọ atọ nke otù shekel n’arọ iji fè òfùfè ulo Chineke-ayi;

33 bayere achicha anēdebe n’usoro, na onyinye-inata-iru-ọma anēnye mb͕e nile, baye-kwa-ra àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e nile, nke ubọchi-izu-ike nile, na nke ọnwa ọhu nile, bayere mb͕e nile akara àkà, baye-kwa-ra ihe nsọ nile, baye-kwa-ra àjà-nmehie nile ikpuchiri Israel nmehie, bú ije-ozi nile nke ulo Chineke-ayi.

34 Ayi fe-kwa-ra nzà, bú ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi-ayi nile, bayere onyinye iji biaru nso, bú nkú, iwebata ya n’ulo Chineke-ayi, dika ulo nna-ayi-hà si di, na mb͕e ezubere, kwa-arọ, isure n’elu ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi, dika edeworo ya n’iwu:

35 na iwebata nkupuru mbu nke ala-ubi-ayi, na nkpuru mbu nke nkpuru nile nke osisi nile, kwa-arọ, n’ulo Jehova:

36 na umu eburu uzọ mu nke umu-ayi ndikom na nke anu-ulo-ayi, dika edeworo ya n’iwu, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-ayi na nke ìgwè ewu na aturu-ayi, iwebata ha n’ulo Chineke-ayi, nye ndi-nchu-àjà ndi nēje ozi n’ulo Chineke-ayi:

37 na ayi gēwebata-kwa-ra ndi-nchu-àjà utu ọka mbu ayi, na àjà-nbuli nile ayi, na nkpuru nke osisi nile ọ bula, na manya-vine ọhu, na manu, rue ime-ulo nke ulo Chineke-ayi; webata-kwa-ra ndi Livai otù uzọ n’uzọ iri nke ihe ala-ubi-ayi; n’ihi na ha onwe-ha, bú ndi Livai, nānara otù uzọ n’uzọ iri n’obodo nile nke ọlu-ubi-ayi.

38 Onye-nchu-àjà, bú nwa Eron, gānọye-kwa-ra ndi Livai, mb͕e ndi Livai nānara otù uzọ n’uzọ iri: ndi Livai gēwegota kwa otù uzọ n’uzọ iri nime otù uzọ n’uzọ iri nile rue ulo Chineke-ayi, rue ime-ulo, rue ulo àkù.

39 N’ihi na umu Israel na umu Livai gēwebata àjà-nbuli nke ọka na manya-vine ọhu na manu n’ime-ulo, ọ bu kwa n’ebe ahu ka ihe nile nke ebe nsọ di, ha na ndi-nchu-àjà ndi nēje ozi, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù: ayi agaghi-arapu kwa ulo Chineke-ayi.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 11

1 Ndi-isi ndi-Ju we biri na Jerusalem: ndi-Ju fọduru fe-kwa-ra nzà, ime ka otù onye nime madu iri bata ibi na Jerusalem, bú obodo nsọ, ka uzọ iteghete ndi fọduru biri kwa n’obodo ọzọ.

2 Ndi-Ju we gọzie ndikom ahu nile ndi were afọ-ofufo nye onwe-ha ibi na Jerusalem.

3 Ma ndia bu ndi-isi ala ahu anāchi achi ndi biri na Jerusalem: ma n’obodo nile nke Juda ka ndi ọzọ biri, nwoke ọ bula n’ihe-onwunwe-ya n’obodo nile ha, bú Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Netinim, na umu ndi-orù Solomon.

4 Ma na Jerusalem ka ufọdu nime umu Juda na nime umu Benjamin biri. Site n’umu Juda: Ataia nwa Uzaia, nwa Zekaraia, nwa Amaraia, nwa Shefataia, nwa Mahalalel, site n’umu Perez;

5 na Maaseia nwa Beruk, nwa Kọl-hose, nwa Hazaia, nwa Adaia, nwa Joiarib, nwa Zekaraia, nwa onye Shailo.

6 Umu Perez nile ndi bi na Jerusalem di nnù na ọgu atọ na asatọ, ndikom bu dìnkpà.

7 Ndia bu kwa umu Benjamin: Salu nwa Meshulam, nwa Joed, nwa Pedaia, nwa Kolaia, nwa Maaseia, nwa Itiel, nwa Jeshaia.

8 N’iso ya Gabaia, na Salai, na nnù abua na ọgu isi na asatọ.

9 Joel nwa Zikri bu kwa onye nēlekọta ha: Juda nwa Hasenua bu kwa onye nke-abua n’ichi obodo ahu.

10 Site na ndi-nchu-àjà: Jedaia nwa Joiarib, na Jakin,

11 na Seraia nwa Hilkaia, nwa Meshulam, nwa Zedok, nwa Meraiot, nwa Ahaitub, bú onye-ndú ulo Chineke,

12 na umu-nne-ha ndi nēje ozi ulo ahu, nnù abua na orú na abua: na Adaia nwa Jeroham, nwa Pelalia, nwa Amzi, nwa Zekaraia, nwa Pashua, nwa Malkija,

13 na umu-nne-ya, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, ọgu iri-na-abua na abua: na Amashsai nwa Azarel, nwa Ahzai, nwa Meshilemot, nwa Imea,

14 na umu-nne-ha, bú ndi-dike bu dìnkpà, ọgu isi na asatọ: onye nēlekọta ha bu Zabdiel nwa Hagedolim.

15 Site kwa na ndi Livai: Shemaia nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaia, nwa Buni;

16 na Shabetai, na Jozabad, ndi sitere na ndi-isi ndi Livai, ndi bu ndi-isi nke ije-ozi nke èzí diri ulo Chineke;

17 na Matanaia nwa Maika, nwa Zabdi, nwa Esaf, onye bu isi nāmalite ikele ekele n’ekpere, na Bakbukia, bú onye nke-abua n’umu-nne-ya; na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun.

18 Ndi Livai nile n’obodo nsọ ahu di ọgu iri-na-anọ na anọ.

19 Ọzọ, ndi-ọnu-uzọ-ama, bú Akub, na Talmon, na umu-nne-ha, ndi nēche nche n’ọnu-uzọ-ama nile, di ọgu asatọ na iri na abua.

20 Ma ndi fọduru nke Israel, na nke ndi-nchu-àjà, na nke ndi Livai, nọ n’obodo nile nke Juda, nwoke ọ bula n’ihe-nketa-ya.

21 Ma Netinim bi n’Ofel: Ziha na Gishpa bu kwa ndi-isi Netinim.

22 Ma onye-nlekọta ndi Livai nime Jerusalem bu Uzi nwa Bani, nwa Hashabaia, nwa Matanaia, nwa Maika, sitere n’umu Esaf, bú ndi-ọbù-abù, onye nēle ije-ozi nke ulo Chineke anya.

23 N’ihi na ihe eze nyere n’iwu di bayere ha, òkè kwesiri ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi-ọbù-abù, ihe nke ubọchi n’ubọchi-ya.

24 Petahia nwa Meshezabel, onye sitere n’umu Zera nwa Juda, nọ kwa n’aka eze, ikwuru ndi-Ju okwu ọ bula.

25 Ma n’obodo ntà nle n’ọhia-ha, ufọdu nime umu Juda biri na Kiriat-aba na umu-obodo-ya, na nime Dibon na umu-obodo-ya, na nime Jekabzeel na obodo ntà ya;

26 na nime Jeshua, na nime Molada, na nime Bet-pelet;

27 na nime Haza-shual, na nime Bia-sheba na umu-obodo-ya;

28 na nime Ziklag, na nime Mekona, na n’umu-obodo-ya;

29 na n’En-rimon, na nime Zora, na nime Jamut;

30 na Zanoa, na Adulam, na obodo ntà ha, na Lekish na ọhia-ya nile, na Azeka na umu-obodo-ya. Ha we ma ulo-ikwū-ha site na Bia-sheba rue ndagwurugwu Hinom.

31 Umu Benjamin bi-kwa-ra site na Geba ga n’iru, nime Mikmash, na Aija, na Bet-el na umu-obodo-ya;

32 na Anatot, na Nob, na Anania;

33 na Hezoa, na Rema, na Gitaim;

34 na Hadid, na Zeboim, na Nebalat;

35 na Lod, na Ono, bú ndagwurugwu ndi-ọ̀kà.

36 Site kwa na ndi Livai òkè ufọdu nke Juda diri Benjamin.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 12

1 Ma ndia bu ndi-nchu-aja na ndi Livai ndi soro Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua, rigota: Seraia, na Jeremaia, na Ezra;

2 na Amaria, na Maluk, na Hatush;

3 na Shekania, na Rehum, na Meremot;

4 na Ido, na Ginetoi, na Abaija;

5 na Mijamin, na Maadia, na Bilga;

6 na Shemaia, na Joiarib, na Jedaia;

7 na Salu, na Amok, na Hilkaia, na Jedaia. Ndia bu ndi-isi nke ndi-nchu-àjà na umu-nne-ha n’ubọchi Jeshua.

8 Ndi Livai kwa: Jeshua, na Binui, na Kadmiel, na Sherebia, na Juda, na Matanaia, bú onye-isi usu ndi nēkele ekele, ya onwe-ya na umu-nne-ya.

9 Bakbukia na Uno, bú umu-nne-ha, nọ kwa na ncherita-iru ha, dika ihe-ndebe nile ha si di.

10 Jeshua we mua Joiakim, Joiakim mua Elaiashib, Elaiashib mua Joiada,

11 Joiada, mua Jonatan, Jonatan mua Jadua.

12 Ma n’ubọchi Joiakim ndi-nchu-àjà di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna: nke Seraia, Meraia; nke Jeremaia, Hananaia;

13 nke Ezra, Meshulam; nke Amaraia, Jehohanan;

14 nke Meluki, Jonatan; nke Shebania, Josef;

15 nke Harim, Adna; nke Meraiot, Helkaia;

16 nke Ido, Zekaraia; nke Gineton, Meshulam;

17 nke Abaija, Zikri; nke Miniamin, nke Moadia, Piltai;

18 nke Bilga, Shamua; nke Shemaia, Jehonatan;

19 nke Joiarib kwa, Matenai; nke Jedaia, Uzi;

20 nke Salai, Kalai; nke Amok, Iba;

21 nke Hilkaia, Hashabaia; nke Jedaia, Netanel.

22 Edewo ndi-Livai n’akwukwọ n’ubọchi Elaiashib na Joiada na Johanan na Jadua ibu ndi-isi ulo nke ndi bu nna: ndi-nchu-àjà kwa, n’ọbubu-eze Daraiọs, bú onye Peasia.

23 Edewo umu Livai n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi ahu, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, we rue ubọchi Johanan nwa Elaiashib.

24 Ndi-isi ndi Livai kwa: Hashabaia, na Sherebia, na Jeshua nwa Kadimiel, na umu-nne-ha ndi nọ na ncherita-iru ha, ito Chineke na ikele ekele, dika ihe Devid, bú onye nke Chineke, nyere n’iwu si di, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.

25 Matanaia na Bakbukia na Obadia na Meshulam na Talmon na Akub bu ndi-ọnu-uzọ-ama nēdebe ihe-ndebe-ha n’ulo-nchikọbata-ihe nile nke ọnu-uzọ-ama nile.

26 Ndia nọ n’ubọchi Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, na n’ubọchi Nehemaia, bú onye nāchi ala, na nke Ezra, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ.

27 Ma n’ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke ha chọputara ndi Livai n’ebe-ha nile, ime ka ha biarue Jerusalem, ime ememe nke ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke, ọbuná n’iṅuri-ọṅu, na n’ikele-ekele, na n’ibù-abù, n’ájà na une na n’ubọ-akwara.

28 Umu nke ndi-ọbù-abù we chikọta onwe-ha, ọbuná site na buruburu-ala nke di Jerusalem buruburu, site kwa n’obodo ntà nile nke ndi Netofa;

29 site kwa na Bet-gilgal, site kwa n’ọhia nile nke Geba na Azmavet: n’ihi na ndi-ọbù-abù wuru obodo ntà nye onwe-ha buruburu Jerusalem.

30 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we me onwe-ha ka ha di ọcha: ha me-kwa-ra ka ndi Israel na ọnu-uzọ-ama nile na mb͕idi di ọcha.

31 M’we me ka ndi-isi Juda rigo n’elu mb͕idi, m’we guzo oké usu abua nke ndi nēkele ekele nēje kwa n’usoro; otù usu we je n’aka-nri n’elu mb͕idi rue ọnu-uzọ-ama nke ebe ikpofu ahihia:

32 Hoshaia we jeso ha, ya na nkera ndi-isi Juda,

33 na Azaraia, na Ezra, na Meshulam,

34 na Juda, na Benjamin, na Shemaia, na Jeremaia,

35 na ufọdu nime umu nke ndi-nchu-àjà, ndi chiri opì: na Zekarai nwa Jonatan, nwa Shemaia, nwa Matanaia, nwa Maikaia, nwa Zakua, nwa Esaf;

36 na umu-nne-ya, bú Shemaia, na Azarel, na Milalai, na Gilalai, na Maai, na Netanel, na Juda, na Hanani, ndi chiri ihe abù nke Devid, bú onye nke Chineke; Ezra, bú ode-akwukwọ, nọ kwa n’iru ha:

37 ha we rigo n’akuku ọnu-uzọ-ama isi-iyi, na ncherita-iru ha kwa, n’elu ihe-nrigo obodo Devid, nime nrigo mb͕idi, site n’akuku di n’elu n’ebe ulo Devid di, we rue ọnu-uzọ-ama miri n’akuku ọwuwa-anyanwu.

38 Usu nke-abua nke ndi nēkele ekele nke nēje izute ha je-kwa-ra, mu onwem so-kwa-ra ha je, mu na nkera ndi-ayi, n’elu mb͕idi, site n’akuku di n’elu n’ebe ulo-elu nke ite-ọku uku di, we rue mb͕idi sara mbara;

39 site kwa n’akuku di n’elu n’ebe ọnu-uzọ-ama Efraim di, na n’akuku ọnu-uzọ-ama ochie, na n’akuku ọnu-uzọ-ama azù, na ulo-elu Hananel, na ulo-elu Hamea, we rue ọnu-uzọ-ama aturu: ha we guzo n’ọnu-uzọ-ama ulo-nche.

40 Usu abua ahu nke ndi nēkele ekele we guzo n’ulo Chineke, ha na mu onwem, nkera ndi nọchiri anya eze nọye-kwa-ram:

41 ndi-nchu-àjà, bú Elaiakim, na Maaseia, na Miniamin, na Maikaia, na Elioenai, na Zekaraia, na Hananaia, guzo-kwa-ra chiri opì;

42 na Maaseia, na Shemaia, na Eleeza, na Uzi, na Jehohanan, na Malkija, na Ilam, na Eza. Ndi-ọbù-abù na Jezrahia, bú onye-nlekọta-ha, we me ka anu olu-ha.

43 Ha we chua àjà uku n’ubọchi ahu, we ṅuria; n’ihi na Chineke mere ka ha ṅuria ọṅu uku; ọzọ kwa, ndinyom-ha na umu-ntakiri-ha ṅuriri: ewe nu ọṅù Jerusalem rue ebe di anya.

44 Ewe me ndikom ufọdu n’ubọchi ahu ka ha buru ndi nēlekọta ime-ulo nile nke idebe àkù, na idebe àjà-nbuli nile, na ibede nkpuru mbu, na idebe otù uzọ n’uzọ iri nile, ichikọbata nime ha, dika ubi obodo nile si di, òkè nile nke iwu nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai: n’ihi na ọṅù Juda di n’ihi ndi-nchu-àjà na n’ihi ndi Livai, bú ndi nēguzo eguzo.

45 Ha we debe ihe-ndebe Chineke-ha, na ihe-ndebe ime-ka-adi-ọcha ahu, ha na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama, dika ihe Devid na Solomon nwa-ya nyere n’iwu si di.

46 N’ihi na n’ubọchi Devid na Esaf site na mb͕e ochie onye-isi nke ndi-ọbù-abù di, na abù otuto na ikele-ekele nke anābùku Chineke.

47 Israel nile n’ubọchi Zerubabel, na n’ubọchi Nehemaia, nēnye kwa òkè nke ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama, ihe nke ubọchi n’ubọchi-ya: ha nēdo-kwa-ra ndi Livai ihe nsọ; ndi Livai nēdo-kwa-ra umu Eron ihe nsọ.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 13

1 N’ubọchi ahu ka ha guru n’akwukwọ Moses na nti ndi Israel; ewe hu ihe edeworo nime ya, bú na onye Amon na onye Moab agaghi-abà na nkpọkọta ndi Chineke rue mb͕e ebighi-ebi;

2 n’ihi na ha ejighi achicha na miri bia n’iru umu Israel, kama ha gotara Belam imegide ha, ikọcha ha: ma Chineke-ayi b͕anwere nkọcha ahu ka ọ ghọ ngọzi.

3 O rue, mb͕e ha nuru iwu ahu, na ha kewapuru ndi nile gwara ọgwa n’Israel.

4 Ma tutu ihe a eme, Elaiashib, bú onye-nchu-àjà, onye edoro onye-isi ime-ulo nke ulo Chineke-ayi, ebe ọ bu ọgọ Tobaia,

5 ọ we doziere ya ime-ulo uku, ma n’ebe ahu ka ha nētiye na mb͕e gara aga onyinye-inata-iru-ọma, na frankincense, na ihe ulo Chineke nile, na otù uzọ n’uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu, bú ihe enyere n’iwu nke ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama; na àjà-nbuli nke ndi-nchu-aja.

6 Ma na mb͕e a nile anọghm na Jerusalem; n’ihi na n’arọ nke-orú-na-iri-na-abua nke Atakasakses, bú eze Babilon, ka m’biakutere eze, ma n’ọgwugwu ubọchi ufọdu ariọrọm eze ka ọ rapum:

7 m’we biarue Jerusalem, ghọta ihe ọjọ ahu nke Elaiashib mere bayere Tobaia, n’idoziri ya ime-ulo n’ogige ulo Chineke.

8 O we dim njọ nke-uku: m’we si n’ime-ulo ahu tupu ihe nile nke ulo Tobaia n’èzí.

9 M’we kwue, ha we me ka ime-ulo nile di ọcha: m’we chighachi n’ebe ahu ihe ulo Chineke, ha na onyinye-inata-iru-ọma na frankincense.

10 M’we mata na enyeghi òkè ndi Livai enye; ndi Livai na ndi-ọbù-abù, bú ndi nēje ozi ahu, we b͕alaga, nwoke ọ bula n’ubi-ya.

11 Mu na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m’we si, Gini mere arapuworo ulo Chineke? M’we chikọta ha, guzo ha n’ebe-nguzo-ha.

12 Juda nile we webata otù uzọ n’uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu n’ulo-àkù.

13 M’we me ndi-ulo-àkù ndi gāchi ulo-àkù nile, bú Shelemaia onye-nchu-àjà, na Zedok, bú ode-akwukwọ, na Pedaia, onye sitere na ndi Livai: Hanan nwa Zakua, nwa Matanaia, nọ kwa n’akuku ha: n’ihi na aguru ha na ndi kwesiri ntukwasi-obi, ọlu-ha bu kwa ikère umu-nne-ha òkè.

14 Chinekem, chetam n’ihi nka, ehichapu-kwa-la omume-eberem nile nke m’meworo n’ulo Chinekem, na n’ihe-ndebe-ya nile.

15 Na mb͕e ahu ka m’huru nime Juda ufọdu ndi nāzọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine n’ubọchi-izu-ike, ndi nēbubata kwa obo ọka, nēbo kwa inyinya-ibu; ọzọ kwa, manya-vine, na nkpuru-vine, na fig, na ibu nile ọ bula, ha nēbubata kwa ha nime Jerusalem n’ubọchi-izu-ike: m’we b͕a àmà megide ha n’ubọchi ha nēre ihe-oriri.

16 Ndi Taia bi-kwa-ra nime ya, ndi nēwebata azù, na ihe nile ọ bula anēre ere, ha nērenye kwa ha umu Juda n’ubọchi-izu-ike, na nime Jerusalem.

17 Mu na ndi amara aha-ha nime Juda we se okwu, m’we si ha, Gini bu ihe ọjọ a nke unu onwe-unu nēme, nēme kwa ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ?

18 Ọ̀ bughi otú a ka nna-unu-hà mere, Chineke-ayi we me ka ihe ọjọ a nile biakwasi ayi, biakwasi kwa obodo a? ma unu onwe-unu nātukwasi ihe n’ihe di ọku di n’aru Israel, n’ime ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ.

19 O rue, mb͕e ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem nāb͕a ọchichiri tutu ubọchi-izu-ike erue, na asirim ka emechie uzọ nile, m’si kwa ka aghara imeghe ha rue mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri: m’we guzo ufọdu nime ndi nējerem ozi n’ọnu-uzọ-ama, ka aghara ibubata ibu nime n’ubọchi-izu-ike.

20 Ndi nāzu ahia na ndi nēre ihe ọ bula nke anēre ere we nọ ọnọdu-abali n’azu Jerusalem otù ub͕ò ma-ọbu ub͕ò abua.

21 M’we b͕a àmà megide ha, si ha, Gini mere unu onwe-unu nānọ ọnọdu-abali na ncherita-iru mb͕idi? ọ buru na unu eme ya ọzọ, m’gēseti aka megide unu. Site na mb͕e ahu ha abiaghi n’ubọchi-izu-ike.

22 M’we si ndi Livai ka ha nēme onwe-ha ka ha di ọcha, ka ha nābia kwa nēche ọnu-uzọ-ama nile, ido ubọchi-izu-ike nsọ. Chinekem, cheta-kwa-ram ihe a, me-kwa-ram ebere, dika, iba-uba nke ebere-Gi si di.

23 Ọzọ, na mb͕e ahu ka m’huru ndi-Ju ndi lutara nwunye ndi bu ndinyom Ashdod na ndinyom Amon na ndinyom Moab:

24 umu-ha we nēkwu okwu nkera n’asusu Ashdod, ha amataghi kwa ikwu okwu n’asusu ndi-Ju, kama dika asusu uzọ ndi abua ahu si di.

25 Mu na ha we se okwu, m’we kọcha ha, tie ufọdu nime ha aka, kwopu agiri-isi-ha, me ka ha were Chineke ṅua iyi, si, Unu ewela umu-unu ndinyom nye umu-ha ndikom, unu aluta-kwa-lara umu-unu ndikom, ma-ọbu onwe-unu, umu-ha ndinyom.

26 Ọ̀ bughi n’ihe ndia ka Solomon, bú eze Israel, mehiere? ma n’etiti ọtutu mba ọ dighi eze di ka ya, onye Chineke huru n’anya ka ọ bu kwa, Chineke we me ya eze Israel nile: ọbuná onye ahu ka ndinyom ala ọzọ mere ka o mehie.

27 Ọ̀ bu kwa unu ka ayi gēge nti ime ihe ọjọ uku a nile, imekpu emekpu megide Chineke-ayi n’iluta ndinyom ala ọzọ?

28 Ma otù nime umu-ndikom Joiada nwa Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, bu di nwa-nwayi Sanbalat onye Horonaim: m’we me ka ọ b͕apu n’ebe m’nọ.

29 Chinekem, cheta ha, n’ihi na ha emewo ka agua ọlu-nchu-àjà, na ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà, na nke ndi Livai, n’ihe nādighi nsọ.

30 Eme-kwa-ram ka ha puta n’ebe onye ala ọzọ ọ bula nọ di ọcha, m’we guzoro ndi-nchu-àjà, guzo-kwa-ra ndi Livai, ihe-ndebe, nwoke ọ bula n’ije-ozi-ya;

31 na inara onyinye iji biaru nso, bú nkú, na mb͕e ezubere, na inara nkpuru mbu. Chinekem, chetam, imerem ezi ihe.

Categories
ESTA

ESTA 1

1 O rue, n’ubọchi Ahasuerọs, (nka bu Ahasuerọs nke bu eze ọgu ala anāchi achi na asa, site n’India we rue Etiopia:)

2 na mb͕e ahu, mb͕e eze, bú Ahasuerọs, nọkwasiri n’oche-eze ala-eze-ya, nke di na Shushan, bú ulo uku eze,

3 n’arọ nke-atọ nke ọbubu-eze-ya, na o mere ọṅuṅu-manya-vine nye ndi-isi-ya na ndi-orù-ya; ndi bu dìnkpà nke Peasia na Midia, bú ndi-eze na ndi-isi nke ala nile anāchi achi, nọ n’iru ya:

4 mb͕e o mere ka ahú àkù nke nsọpuru ala-eze-ya na ọkaka nke ima-nma nke idi-uku-ya ọtutu ubọchi, bú ọgu ubọchi iteghete.

5 Ma mb͕e emezuru ubọchi ndia, eze mere ọṅuṅu-manya-vine nye ndi nile ndi ahuru na Shushan, bú ulo uku eze, site n’onye uku we rue onye ntà, ubọchi asa, n’ogige nke ubi ab͕ara ogige nke ulo eze;

6 ihe-nkwuba di nke ezi ákwà ọcha na ogho ọcha na ogho anunu, nke eji udọ̀ nke ezi ákwà ọcha na ogho ododo kekọta ha na nb͕a-aka ọla-ọcha na ogidi marble: ihe-ndina bu ọla-edo na ọla-ọcha, n’elu pavement eji marble uhie, na nke ọcha, na nke edo, na nke oji, me.

7 Ha me-kwa-ra ka ha ṅua ihe-ọṅuṅu n’ihe ọla-edo, (ihe nile di kwa iche iche,) manya-vine nke ala-eze ba-kwa-ra uba, dika aka eze ruru.

8 Ọṅuṅu-ihe ahu di ka iwu si di; ọ dighi onye nērugide erugide: n’ihi na otú a ka eze nyere onye uku ọ bula nke ulo-ya iwu, ime dika ọ tọrọ nwoke ọ bula utọ.

9 Vashti, bú nwunye eze, me-kwa-ra ọṅuṅu-manya-vine nye ndinyom n’ulo ala-eze nke eze, bú Ahasuerọs, nwere.

10 N’ubọchi nke-asa, mb͕e obi eze di nma site na manya-vine, ọ siri Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas, bú ndi-onozi asa ndi nēje ozi n’iru eze, bú Ahasuerọs,

11 ka ha me ka Vashti, bú nwunye eze, bia n’iru eze nēkpu okpu-eze nke ala-eze, ime ka ndi di iche iche na ndi-isi hu nma-ya: n’ihi na nwayi nke di nma ile anya ka ọ bu.

12 Nwunye eze, bú Vashti, we ju ibia n’okwu eze nke sitere n’aka ndi-onozi: eze we we iwe nke-uku, ọnuma-ya nēre ọku nime ya.

13 Eze we si ndi mara ihe, bú ndi mara mb͕e di iche iche, (n’ihi na otú a ka okwu eze di n’iru ndi nile mara iwu na ikpé;

14 ma onye nọ nso ya bu Kashena, ya na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan, bú ndi-isi asa nke Peasia na Midia, ndi nāhu iru eze, ndi nānọ n’isi n’ala-eze:)

15 Dika iwu si di, gini ka agēme nwunye eze, bú Vashti, n’ihi na o meghi ihe eze, bú Ahasuerọs, siri ya site n’aka ndi-onozi?

16 Memukan we kwue n’iru eze na ndi-isi, si, Ọ bughi eze, nání ya, ka Vashti, bú nwunye eze, mere ajọ omume megide, kama megide ndi-isi nile, megide kwa ndi di iche iche nile ndi nọ n’ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs.

17 N’ihi na okwu a bayere nwunye eze gāpu rue nti ndinyom nile, ime ka di-ha buru ihe anēleda eleda n’anya-ha, mb͕e ha nāsi, Eze, bú Ahasuerọs, siri ka eme Vashti, bú nwunye eze, ka ọ bia n’iru ya, ma ọ biaghi.

18 Ubọchi ta ka ndinyom ndi-isi nke Peasia na Midia, bú ndi nuworo okwu a bayere nwunye eze, gāsi kwa ndi-isi nile nke eze otú a, nleda-anya na iwe nke zuru ezu gāputa kwa.

19 Ọ buru na ọ di eze nma, ka okwu ala-eze si n’iru ya pua, ka ede kwa ya n’akwukwọ n’etiti iwu Peasia na Media, o we ghara igabiga, ka Vashti ghara ibia ọzọ n’iru eze, bú Ahasuerọs; ka eze nye kwa nwayi-ibe-ya nke ka ya nma ọnọdu-nwunye-eze-ya.

20 Agēme kwa ka anu iwu eze, bú nke ọ nēme, n’ala-eze-ya nile, (n’ihi na ihe bara uba ka ọ bu,) ndinyom nile gēnye di-ha nsọpuru, site n’onye uku we rue onye ntà.

21 Okwu ahu we di nma n’anya eze na ndi-isi-ya; eze we me dika okwu Memukan si di:

22 o we ziga akwukwọ n’ala nile anāchi achi nke eze, n’ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, ziga-kwa-ra ndi ọ bula dika asusu-ya si di, na nwoke ọ bula gābu onye-isi n’ulo-ya, na ọ ganēkwu kwa ya dika asusu ndi-ya si di.

Categories
ESTA

ESTA 2

1 Mb͕e ihe ndia gasiri, mb͕e ọnuma eze, bú Ahasuerọs, bìri, ọ chetara Vashti, na ihe o mere, na ihe ekwubìri megide ya.

2 Ndi-ozi eze, bú ndi nējere ya ozi, we si ya, Ka ha chọrọ eze umu-ab͕ọghọ ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya:

3 ka eze me kwa ndi-nlekọta n’ala nile anāchi achi nke ala-eze-ya, ka ha we chikọta umu-ab͕ọghọ nile ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya, rue Shushan, bú ulo uku eze, rue ulo ndinyom, rue aka Hege, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom; ka enye kwa ha ihe-nsacha nile ha:

4 ka nwa-ab͕ọghọ nke di nma n’anya eze buru nwunye eze n’ọnọdu Vashti. Ihe ahu we di nma n’anya eze; o we me otú a.

5 Otù nwoke, bú onye-Ju, nọ na Shushan, bú ulo uku eze, aha-ya bu Mọdekai, nwa Jaia, nwa Shimai, nwa Kish, bú onye Benjamin;

6 onye emere ka o si na Jerusalem je biri n’ala ọzọ n’etiti ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, bú ndi emere ha na Jekonaia, bú eze Juda, ka ha je biri n’ala ọzọ, onye Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ọ je biri n’ala ọzọ.

7 O we nāzùlite Hadasa, nke ahu bu Esta, nwa-nwayi nwa-nne nna-ya: n’ihi na o nweghi nna ma-ọbu nne, ma nwa-ab͕ọghọ ahu mara nma n’aru, di kwa nma ile anya; mb͕e nna-ya na nne-ya nwuru, Mọdekai we kuru ya onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi.

8 O rue, mb͕e anuru okwu eze na iwu-ya, mb͕e achikọbata-kwa-ra ọtutu umu-ab͕ọghọ nime Shushan, bú ulo uku eze, rue aka Hegai, na ekubatara Esta n’ulo eze, rue aka Hegai, onye nēdebe ndinyom.

9 Nwa-ab͕ọghọ ahu we di nma n’anya-ya, ewe mere ya ebere n’iru ya; o we me ngwa inye ya ihe-nsacha-ya nile, na òkè-ya nile, na umu-ab͕ọghọ asa ahu ndi eleputaworo n’ulo eze ka enye ya ha: o we wegharia ya na umu-ab͕ọghọ-ya n’ulo kachasi nma nke ndinyom.

10 Esta egosighi ndi-ya ma-ọbu umu-nna-ya: n’ihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara igosi ha.

11 Mọdekai we nējeghari n’iru ogige ulo ndinyom n’ubọchi nile ọ bula, imara udo Esta, na ihe agēme ya.

12 Ma mb͕e orúrú nwa-ab͕ọghọ ọ bula biaruru nso ibakuru eze, bú Ahasuerọs, mb͕e ọnwa iri na abua gwusiri ya, dika iwu ndinyom si di, (n’ihi na otú a ka anēmezu ubọchi nsacha-ha, bú ọnwa isi iji manu myrrh, na ọnwa isi iji uda di iche iche na iji ihe-nsacha ndinyom,)

13 nwa-ab͕ọghọ ahu we biakute eze n’uzọ di otú a, anēnye ya ihe ọ bula ọ nāsi ha nye, iso ya si n’ulo ndinyom biarue ulo eze.

14 N’anyasi ka nwayi ahu batara, n’ututu ka nwayi ahu laghachi-kwa-ra n’ulo nke-abua nke ndinyom, rue aka Shaashgaz, bú onozi eze, onye nēdebe ndi-iko-nwayi: ọ dighi-abiakute eze ọzọ, ma-ọbughi na ihe-ya tọrọ eze utọ, ewe kpọ ya n’aha.

15 Ma mb͕e orúrú Esta, bú nwa-nwayi Abihail nwa-nne nna Mọdekai, onye kuru ya n’onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi, biaruru ibakuru eze, ọ chọghi ihe, ọ bu nání ihe Hegai, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom, nāsi ya. Esta we nānata amara n’anya ndi nile nāhu ya anya.

16 Ewe kuru Esta jekuru eze, bú Ahasuerọs, rue ulo ala-eze ya, n’ọnwa nke-iri, nke ahu bu ọnwa Tebet, n’arọ nke-asa nke ọbubu-eze-ya.

17 Eze we hu Esta n’anya kari ndinyom ahu nile, o we nata amara na ebere n’iru ya kari umu-ab͕ọghọ ahu nile ndi nāmaghi nwoke; o we tukwasi okpu-eze ala-eze n’isi-ya, me ya nwunye eze n’ọnọdu Vashti.

18 Eze we mere ndi-isi-ya na ndi-orù-ya nile oké ọṅuṅu-manya-vine, bú ọṅuṅu-manya-vine, Esta; o me-kwa-ra ka ala nile anāchi achi zuru ike n’itu utu, o we nye onyinye, dika aka eze ruru.

19 Ma mb͕e achikọtara ha nke ub͕ò abua, bú umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Mọdekai we nānọdu n’ọnu-uzọ-ama eze.

20 Esta adighi-egosi umu-nna-ya ma-ọbu ndi-ya; dika Mọdekai nyere ya iwu: n’ihi na ihe Mọdekai siri, nke ahu ka Esta nēme, dika mb͕e anāzùlite ya n’aka-ya.

21 Na mb͕e ahu, mb͕e Mọdekai nānọdu n’ọnu-uzọ-ama eze, Bigtan na Teresh, bú ndi-nchedo abua nke eze, nime ndi nēche nbata-uzọ, were iwe, chọ iseti aka megide eze, bú Ahasuerọs.

22 Mọdekai we mata ihe ahu, o we gosi Esta, bú nwunye eze; Esta we gwa eze n’aha Mọdekai.

23 Ewe jua ase okwu ahu, chọputa ya, ewe kwuba ha abua n’osisi: ewe de ya n’akwukwọ ihe emere n’ubọchi ahu n’iru eze.

Categories
ESTA

ESTA 3

1 Mb͕e ihe ndia gasiri, eze, bú Ahasuerọs, mere Heman nwa Hamedata, bú onye Egag, ka ọ buru onye oku, o we bulie ya elu, do oche-eze-ya n’ebe di elu kari ndi-isi nile ya na ha nọ.

2 Ndi-orù nile nke eze, ndi nọ n’ọnu-uzọ-ama eze, we nēruru ala, nākpọ kwa isi ala nye Heman: n’ihi na otú a ka eze nyere iwu bayere ya. Ma Mọdekai adighi-eruru ala, ọ dighi-akpọ kwa isi ala nye ya.

3 Ndi-orù eze, ndi nọ n’ọnu-uzọ-ama eze, we si Mọdekai, Gini mere gi onwe-gi nāgabiga ihe eze nyere n’iwu?

4 O rue, mb͕e ha nāgwa ya okwu kwa-ubọchi, ma ọ geghi nti ha, na ha gosiri Heman, ihu ma okwu Mọdekai gēguzo: n’ihi na o gosiri ha na ya onwe-ya bu onye-Ju.

5 Heman we hu na Mọdekai adighi-eruru ala, na ọ dighi-akpọ kwa isi ala nye ya, Heman we juputa n’ọnuma.

6 O we buru ihe-nleda-anya n’anya-ya iseti aka megide Mọdekai, nání ya; n’ihi na ha gosiri ya ndi Mọdekai: Heman we chọ ikpochapu ndi-Ju nile ndi nọ n’ala-eze nile nke Ahasuerọs, bú ndi Mọdekai.

7 N’ọnwa mbu, nke ahu bu ọnwa Nisan, n’arọ nke-iri-na-abua nke eze, bú Ahasuerọs, ka ha fere Pua, nke ahu bu nzà, n’iru Heman, site n’otù ubọchi rue ubọchi ọzọ, site kwa n’otù ọnwa ọzọ, rue ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada.

8 Heman we si eze, bú Ahasuerọs, Otù ndi di ndi emeworo ka ha b͕asa, ndi ekesawo-kwa-ra ha n’etiti ndi di iche iche n’ala nile anāchi achi nke ala-eze-gi; iwu nile ha di kwa iche n’iwu ndi ọ bula; ha adighi-edebe kwa iwu nile nke eze: o kwesighi kwa eze ka o kwe ka ha nọduru onwe-ha.

9 Ọ buru na ọ di eze nma, ka ede ya n’akwukwọ ime ka ha la n’iyì: m’gātù kwa orú nnù talent ọla-ọcha na nnù ise nye n’aka ndi nēje ozi a, iwebata ya n’ulo-àkù eze.

10 Eze we si n’aka-ya wezuga nb͕a-aka-akàrà-ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Egag, bú onye nākpab͕u ndi-Ju.

11 Eze we si Heman, Enyewo gi ọla-ọcha, ya na ndi ahu, ime ha dika ihe ahu si di nke di nma n’anya-gi.

12 Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze n’ọnwa mbu, n’ubọchi nke-iri-na-atọ di nime ya, ewe de ya n’akwukwọ dika ihe nile si di nke Heman nyere ndi nọchiri anya eze n’iwu, nke o nye-kwa-ra ndi nāchi ala ndi bu ndi-isi ala ọ bula anāchi achi, nke o nye-kwa-ra ndi-isi ndi ọ bula; ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di; n’aha eze, bú Ahasuerọs, ka edere ya, eji-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze ka ya akàrà.

13 Ewe site n’aka ndi-ọb͕a-ọsọ ziga akwukwọ n’ala nile anāchi achi nke eze, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ndi-Ju nile la n’iyì, site na nwata we rue okenye, ma umu-ntakiri ma ndinyom, n’otù ubọchi, n’ubọchi nke-iri-na-atọ nke ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, na iluta ihe-nkwata-ha n’agha.

14 Ndeputa odide-akwukwọ ahu, nke agēnye dika iwu n’ala nile ọ bula anāchi achi, ekpughere ya nye ndi nile di iche iche, ka ha nọ na njikere bayere ubọchi a.

15 Ndi-ọb͕a-ọsọ puru, ebe ewere okwu eze me ka ha me ngwa, enye-kwa-ra iwu ahu nime Shushan, bú ulo uku eze: ma eze na Heman nọduru iṅu ihe-ọṅuṅu; ma ọ b͕ara obodo ahu, bú Shushan, ghari.

Categories
ESTA

ESTA 4

1 Ma Mọdekai mara ihe nile emere, Mọdekai we dọwa uwe-ya nile, yikwasi ákwà-nkpe, kpokwasi ntu n’aru-ya, pua je n’etiti obodo, tie oké nkpu di ilu:

2 o we bia rue n’iru ọnu-uzọ-ama eze: n’ihi na ọ dighi onye gābà n’ọnu-uzọ-ama eze n’uwe nke ákwà-nkpe.

3 Ọzọ, n’ala nile ọ bula anāchi achi, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, oké iru-újú ndi-Ju, na obubu-ọnu, na ikwa-ákwá, na iti-aka-n’obi; atusa-kwa-ra ákwà-nkpe na ntu n’okpuru ọtutu madu.

4 Umu-ab͕ọghọ Esta na ndi-onozi-ya we bia gosi ya; o we nēb͕u nwunye eze ahu nb͕u n’obi nke-uku; o we zìe uwe iyikwasi Mọdekai, na iwezuga ákwà-nkpe-ya n’aru-ya: ma ọ naraghi ha.

5 Esta we kpọ Hatak, bú otù onye nime ndi-onozi eze, onye eze mere ka o guzo n’iru ya, o we nye ya iwu ijekuru Mọdekai, imara ihe nka bu, na ihe kpatara nka.

6 Hatak we pukuru Mọdekai rue amá obodo ahu, nke di n’iru ọnu-uzọ-ama eze.

7 Mọdekai we gosi ya ihe nile mere ya, kọ-kwa-ra ya isi ego ahu nke Heman siri na ọ gātù nye n’ulo-àkù eze n’ihi ndi-Ju, ime ka ha la n’iyì.

8 Ọzọ, ndeputa odide-akwukwọ iwu ahu nke enyere nime Shushan ikpochapu ha, o nyere ya ya, ime ka Esta hu ya, na igosi ya; na inye ya iwu ibakuru eze, iriọ ya aririọ-amara, na ichọrọ ndi-ya ihe n’iru ya.

9 Hatak we bia gosi Esta okwu Mọdekai nile.

10 Esta we gwa Hatak okwu, nye ya iwu inye Mọdekai, si:

11 Ndi-orù nile nke eze, na ndi ala anāchi achi nke eze, mara, na nwoke ọ bula, ma-ọbu nwayi ọ bula, nke gābakuru eze, rue ogige di ime-ime, bú onye anākpọghi, otù iwu-ya bu ka eme ka ha nwua, nāgughi onye eze nēsetiri nkpa-n’aka ọla-edo, ka ọ di ndu: ma akpọghi mu onwem ibakuru eze orú ubọchi na iri ndia.

12 Ha we gosi Mọdekai okwu Esta nile.

13 Mọdekai we si ha zaghachi Esta, si, Ekwula na nkpuru-obi-gi na i gēwepuga onwe-gi n’ulo eze, kari ndi-Ju nile.

14 N’ihi na ọ buru na i b͕a nkiti ghara ikwu okwu ọ bula na mb͕e a, oghere na nnaputa gēguzoro ndi-Ju site n’ebe ọzọ, ma agēme ka gi onwe-gi na ulo nna-gi la n’iyì: ma ònye mara ma ọ bu n’ihi mb͕e di otú a ka i biaruru ala-eze?

15 Esta we si ha zaghachi Mọdekai okwu, si,

16 Je, chikọta ndi-Ju nile ndi aganāchọta nime Shushan, nēbu-kwa-ranum ọnu, unu eri-kwa-la ihe, aṅu-kwa-la ihe-ọṅuṅu ubọchi atọ, abali na ehihie: mu onwem na umu-ab͕ọghọm gēbu kwa ọnu otú a; ma n’uzọ di otú a ka m’gābakuru eze, nke nādighi ka iwu si di: ma asi na alawom n’iyì, alawom n’iyì.

17 Mọdekai we gabiga, me dika ihe nile si di nke Esta nyere ya n’iwu.