Categories
EZRA

EZRA 8

1 Ma ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, nka bu kwa akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi nēsom si na Babilon rigo, n’ọbubu-eze Ataksakses, bú eze.

2 Site n’umu Finehas, Giashom: site n’umu Itama, Daniel: site n’umu Devid, Hatush.

3 Site n’umu Shekania; site n’umu Parosh, Zekaraia: ndi soro ya, bú ndi edere n’akwukwọ-osuso-ọmumu diri ndikom, di ọgu asa na iri.

4 Site n’umu Pahat-moab, Eliehoenai nwa Zerahai; ndi soro ya di ọgu ndikom iri.

5 Site n’umu Shekania, nwa Jahaziel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri-na-ise.

6 Site kwa n’umu Adin, Ebed nwa Jonatan; ndi soro ya di ọgu ndikom abua na iri.

7 Site kwa n’umu Ilam, Jeshaia nwa Atalaia; ndi soro ya di ọgu ndikom atọ na iri.

8 Site kwa n’umu Shefataia, Zebadaia nwa Maikael; ndi soro ya di ọgu ndikom anọ.

9 Site n’umu Joab, Obadaia nwa Jehiel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri na iri na asatọ.

10 Site kwa n’umu Shelomit, nwa Josifia; ndi soro ya di ọgu ndikom asatọ.

11 Site kwa n’umu Bebai, Zekaraia nwa Bebai; ndi soro ya di orú ndikom na asatọ.

12 Site kwa n’umu Azgad, Johanan nwa Hakatan; ndi soro ya di ọgu ndikom ise na iri.

13 Site kwa n’umu Adonikam, bú ndi-ikpe-azu; ndia bu kwa aha-ha, Elifelet, na Jeuel, na Shemaia; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ.

14 Site kwa n’umu Bigvai, Utai na Zabud; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ na iri.

15 M’we chikọta ha rue osimiri nke nērùbata n’Ahava; ayi we nọ n’ọmuma-ulo-ikwū n’ebe ahu ubọchi atọ: m’we mata ndi ahu, mata kwa ndi-nchu-àjà, ma ọ dighi onye nime umu Livai m’chọtara n’ebe ahu.

16 M’we zìe kpọ Elieza, kpọ kwa Ariel, kpọ kwa Shemaia, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Jarib, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Netan, kpọ kwa Zekaraia, kpọ kwa Meshulam, bú ndi-isi; m’kpọ kwa Joiarib, kpọ kwa Elnetan, bú ndi-nghọta.

17 M’we nye ha iwu inye Ido, bú onye-isi na Kasifia, bú ebe ahu; m’we tiye n’ọnu-ha okwu igwa Ido, bú nwa-nne-ya, na Netinim, nime Kasifia, bú ebe ahu, ka ha me ka ndi nējere ulo Chineke-ayi ozi biakute ayi.

18 Ha we me ka otù nwoke nke nwere uche biakute ayi, dika ezi aka nke Chineke-ayi si di n’aru ayi, o sitere n’umu Mahli, nwa Livai, nwa Israel; na Sherebia na umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri-na-asatọ;

19 na Hashabaia, ya na Jeshaia nke sitere n’umu Merari, na umu-nne-ya na umu-ha ndikom, orú madu;

20 site kwa na Netinim, ndi Devid na ndi-isi nyere ka ha fè òfùfè nke ndi Livai, ọgu Netinim iri-na-otù: ha nile ka akpọrọ n’aha n’aha.

21 M’we kpọsa obubu-ọnu n’ebe ahu, n’akuku osimiri Ahava, iweda onwe-ayi n’ala n’iru Chineke-ayi ichọta n’aka-Ya uzọ ziri ezi nye onwe-ayi, nye kwa umu-ntakiri-ayi, nye kwa àkù-ayi nile.

22 N’ihi na emerem ihere iriọ n’aka eze usu-ndi-agha na ndi-inyinya iyere ayi aka n’ihi onye-iro nke di n’uzọ: n’ihi na ayi gwara eze okwu, si, Aka Chineke-ayi di n’aru ndi nile nāchọ Ya, ime ha nma; ma ike-Ya na iwe-Ya nēmegide ndi nile nārapu Ya.

23 Ayi we bue ọnu, riọ Chineke-ayi aririọ bayere nka: O we kwe ka ayi riọta ihe ayi riọrọ.

24 M’we kewaputa na ndi-isi nke ndi-nchu-àjà madu iri na abua, bú Sherebia na Hashabaia, ha na madu iri ndi sitere n’umu-nne-ha,

25 m’we tùara ha ọla-ọcha ahu, na ọla-edo ahu, na ihe ahu nile, bú àjà-nbuli nke ulo Chineke-ayi, nke eze, na ndi nādu ya ọdu, na ndi-isi-ya, na Israel nile ahuru n’ebe ahu, buliri:

26 m’we tùa nye ha n’aka nnù talent ọla-ọcha na ọgu iri-na-abua na iri, na ọgu talent ihe ọla-ọcha ise; na ọgu talent ọla-edo ise;

27 na orú ọkwa ntà ọla-edo, ọtùtù-ha bu nnù daric abua na ọgu iri; na ihe abua nke ezi ọla nācha edo edo, bú ihe anāchọsi ike dika ọla-edo.

28 M’we si ha, Unu onwe-unu bu ihe nsọ Jehova nwere, ihe ndia bu kwa ihe nsọ; ọla-ọcha na ọla-edo bu kwa onyinye-afọ-ofufo enyere Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà.

29 Nechenu ha nche, debe kwa ha, rue mb͕e unu tùru ha n’iru ndi-isi nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, nime Jerusalem, n’ime-ulo nke ulo Jehova.

30 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we nara ọtùtù nke ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile, ibūru ha biarue Jerusalem rue ulo Chineke-ayi.

31 Ayi we si n’osimiri Ahava n’ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa mbu bulie ije, ijeru Jerusalem: aka Chineke-ayi we di n’aru ayi, O we naputa ayi n’aka onye-iro ọ bula na onye nēche anwu n’uzọ.

32 Ayi we biarue Jerusalem, nọdu n’ebe ahu ubọchi atọ.

33 Ma n’ubọchi nke-anọ ka atùru ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile n’ulo Chineke-ayi nye n’aka Meremot, nwa Uraia, bú onye-nchu-àjà; Eleeza nwa Finehas nọye-kwa-ra ya; Jozabad nwa Jeshua na Noadaia nwa Binui, bú ndi Livai, nọye-kwa-ra ha;

34 n’ọnu-ọgugu na n’ọtùtù ka enyere ha ihe ọ bula: ewe de ọtùtù nile n’akwukwọ na mb͕e ahu.

35 Ndi nēsi na ndọta-n’agha bia, bú umu ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, wetara àjà-nsure-ọku nso Chineke Israel, oke-ehi iri na abua n’ihi Israel nile ọgu ebulu anọ na iri na isi, ọgu umu-aturu atọ na iri na asa, nkpi iri na abua ibu àjà-nmehie: ihe a nile bu àjà-nsure-ọku isurere Jehova.

36 Ha we nye ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala n’ofè osimiri iwu nile nke eze: ha we yere ndi-Ju na ulo Chineke aka.

Categories
EZRA

EZRA 9

1 Ma mb͕e emere ka ihe ndia gwusia, ndi-isi biarurum nso, si, Ndi Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, ha ekewapughi onwe-ha n’etiti ndi di iche iche nke ala ọzọ, nēme dika ihe-árú-ha si di, bú ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus, na ndi Amon, na ndi Moab, na ndi Ijipt, na ndi-Amorait.

2 N’ihi na ha esiwo n’umu-ha ndinyom lutara onwe-ha nwunye, luta-kwa-ra umu-ha ndikom; nkpuru nsọ ahu we gwakọta onwe-ha na ndi di iche iche nke ala ọzọ: ma aka ndi-isi na ndi nāchi ala bu uzọ na nmekpu a.

3 Ma mb͕e m’nuru okwu a, adọwaram uwem na uwe-nwudam, ropu kwa ufọdu n’agiri-isi nke isim na aji afu-ọnum, m’we nọdu, ibobo we nwuam n’aru.

4 Ewe chikọta n’ebe m’nọ onye ọ bula nke nāma jijiji n’okwu Chineke Israel, n’ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ; ma mu onwem nānọdu, ibobo we nwuam n’aru, rue mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi.

5 Ma na mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, esirim n’iweda onwem n’ala bilie, ọbuná na ndọwa na uwe-nwudam; m’we ruru ala n’ikperèm b͕asara Jehova, bú Chinekem, ọbu-akam abua;

6 M’we si, Chinekem, ihere nēmem, irum nwughari-kwa-ra n’ihi ihere, iweliri Gi irum elu, Chinekem: n’ihi na ajọ omume-ayi bara uba kari isi-ayi elu, ikpe-ọmuma-ayi aghọwo kwa ihe uku rue elu-igwe.

7 Site n’ubọchi nna-ayi-hà ayi onwe-ayi anọwo n’ikpe-ọmuma uku rue ta; ma n’ihi ajọ omume nile ayi ka enyere ayi onwe-ayi, na ndi-eze-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, n’aka ndi-eze ala ọzọ, na mma-agha, na na ndọta-n’agha, na nime nluta-n’agha, na n’ihere iru, dika o si di ta.

8 Ma ub͕u a na mb͕e dika nwa ntabi-anya amara esitewo n’aka Jehova, bú Chineke-ayi, ime ka ndi b͕apuru ab͕apu fọduru ayi, na inye ayi otù ǹtú n’ebe nsọ Ya, ka Chineke-ayi we nye anya-ayi ìhè, na idebere ayi nwantī ndu n’ọbubu-orù-ayi.

9 N’ihi na ndi-orù ka ayi bu; ma Chineke-ayi arapughi ayi n’ọbubu-orù-ayi, kama O setiwo ebere rue ayi aru n’iru ndi-eze Peasia, idebere ayi ndu, iwuli ulo Chineke-ayi elu, na ime ka nkpọnkpọ-ebe-ya nile guzo, na inye ayi mb͕idi nime Juda na nime Jerusalem.

10 Ma ub͕u a, Chineke-ayi, àyi gāsi gini mb͕e ihe a gasiri? n’ihi na ayi arapuwo ihe nile I nyere n’iwu,

11 nke I nyere n’iwu site n’aka ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, si, Ala ahu nke unu onwe-unu nābata inweta ya, ala isọ-nsọ ka ọ bu n’isọ-nsọ nke ndi di iche iche nke ala ọzọ, site n’ihe-árú nile ha, nke juputaworo ya site n’otu ọnu-uzọ rue ọnu-uzọ ọzọ, n’ọrurú-ha.

12 Ma ub͕u a unu enyela umu-ha ndikom umu-unu ndinyom, unu ekuru-kwa-la umu-ha ndinyom nye umu-unu ndikom, unu achọ-kwa-la udo-ha ma-ọbu ọdi-nma-ha rue mb͕e ebighi-ebi: ka unu we di ike, rie ezi ihe nke ala ahu, me kwa ka umu-unu nweta ya rue mb͕e ebighi-ebi.

13 Ma mb͕e ihe nile a gasiri, nke nābiakwasi ayi n’ihi omume ọjọ nile ayi, na n’ihi ikpe-ọmuma uku ayi, n’ihi na Gi onwe-gi, bú Chineke-ayi, eb͕ochiwo ahuhu-nmehie-ayi, ka ọ ghara idi elu ka ajọ omume-ayi, I we nye ndi-nb͕apu di otú a,

14 àyi gālaghachi kwa mebie ihe nile I nyere n’iwu, we ghọ ọgọ ndi ahu ndi nēme ihe-árú ndia? Ì gaghi-ewesa ayi iwe, rue mb͕e emere ka ayi gwusi, ndi fọduru ma-ọbu ndi-nb͕apu we ghara idi?

15 Jehova, bú Chineke Israel, onye ezi omume ka I bu; n’ihi na ayi fọduru ibu ndi-nb͕apu, dika o si di ta: le, ayi nọ n’iru Gi n’ikpe-ọmuma-ayi; n’ihi na ọ dighi onye iguzo n’iru Gi n’ihi nka.

Categories
EZRA

EZRA 10

1 Ma mb͕e Ezra nēkpe ekpere, nēkwuputa kwa ekwuputa, nākwa ákwá nātuda kwa onwe-ya n’ala n’iru ulo Chineke, esiri n’Israel chikọta n’ebe ọ nọ nkpọkọta madu di ọtutu nke-uku, bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri: n’ihi na ndi Israel kwara ákwá ri nne.

2 Shekania nwa Jehiel, nke sitere n’umu Ilam, we za, si Ezra, Ayi onwe-ayi emekpuwo emekpu megide Chineke-ayi, luta ndinyom ala ọzọ sitere na ndi di iche iche nke ala nka: ma ub͕u a Israel nwere olile-anya bayere ihe a.

3 Ma ub͕u a ka ayi na Chineke-ayi b͕a ndu na ayi gēme ka ndinyom ahu nile na umu amuru site na ha pua, dika ndumọdu si di nke Onye-nwe-ayi, na nke ndi nāma jijiji n’ihe nile nke Chineke-ayi nyere n’iwu; dika iwu-Ya si di ka agēme kwa ya.

4 Bilie; n’ihi na okwu a diri gi, ayi onwe-ayi nọye-kwa-ra gi: di ike, me kwa ya.

5 Ezra we bilie, me ndi-isi nke ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Israel nile, ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di. Ha we ṅua iyi.

6 Ezra we si n’iru ulo Chineke bilie, jerue ime-ulo Jehohanan nwa Elaiashib: o we je n’ebe ahu, ma o righi nri, ọ ṅughi kwa miri: n’ihi na o nēru újú n’ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ.

7 Ha we kwusa nime Juda na Jerusalem gwa umu nile nke ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ka ha chikọta onwe-ha na Jerusalem;

8 ka ewezuga kwa àkù-ya nile ibibi ya, kewapu kwa onye ahu na nkpọkọta ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, bú onye ọ bula nke nābiaghi n’ubọchi atọ, dika ndum-ọdu ndi-isi na ndi-okenye si di.

9 Ndikom nile nke Juda na Benjamin we chikọta onwe-ha na Jerusalem n’ubọchi atọ; nke ahu bu ọnwa nke-iteghete, n’ubọchi nke-orú n’ọnwa ahu: ndi ahu nile we nọdu n’amá ulo Chineke, nāma jijiji n’ihi okwu a, na site n’oké miri-ozuzo nile.

10 Ezra, bú onye-nchu-àjà, we bilie, si ha, Unu onwe-unu emekpuwo emekpu, luta ndinyom ala ọzọ, itukwasi ihe n’ikpe-ọmuma Israel.

11 Ma ub͕u a nyenu Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, ekele, me kwa ihe nātọ Ya utọ: kewaputa-kwa-nu onwe-unu n’aru ndi di iche iche nke ala nka, na n’aru ndinyom ala ọzọ.

12 Nkpọkọta ahu nile we were oké olu za, si, O ziri ezi, dika okwu-gi nile n’ebe ayi nọ si di, ayi aghaghi ime otú a.

13 Ma ndi Israel di ọtutu, ọ bu kwa mb͕e oké miri-ozuzo, ike adighi kwa ayi iguzo n’èzí, ma ozi a abughi nke otù ubọchi, ọ bughi kwa nke ubọchi abua: n’ihi na ayi ejehiewo ri nne n’okwu a.

14 Biko, ka ndi-isi-ayi guzoro nkpọkọta nka nile, ka ndi nile ndi nọ n’obodo nile ayi bia kwa na mb͕e ezubere, bú ndi lutara ndinyom ala ọzọ, ha na ndi-okenye obodo nile ọ bula, na ndi-ikpe-ya, rue mb͕e iwe ọku nke Chineke-ayi bayere okwu a si n’aru ayi laghachi.

15 Otú ọ di, Jonatan nwa Asahel na Jahzeia nwa Tikva guzoro imegide ihe a: Meshulam na Shabetai, bú onye Livai, yekwara ha aka.

16 Umu nke ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ we me otú a. Ewe kewapu Ezra, bú onye-nchu-àjà, na ndikom ọzọ, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ha nile n’aha-ha kwa; ha we nọdu n’ubọchi mbu nke ọnwa nke-iri ka ha we jua ajuju okwu a.

17 Ha we jubìe ajuju n’okwu ndikom nile ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ n’ubọchi mbu nke ọnwa mbu.

18 Ewe chọta ufọdu n’etiti umu ndi-nchu-àjà ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ: bú, n’etiti umu Jeshua, nwa Jozadak, na umu-nne-ya: Maaseia, na Elieza, na Jarib, na Gedalaia.

19 Ha we nye aka-ha ime ka ndinyom-ha pua; ebe ikpe mara ha, ha we nye ebulu nke ìgwè aturu n’ihi ikpe-ọmuma-ha.

20 Na n’etiti umu Imea; Hanani na Zebadaia.

21 Na n’etiti umu Harim; Maaseia, na Elaija, na Shemaia, na Jehiel, na Uzaia.

22 Na n’etiti umu Pashua; Elioenai, na Maaseia, na Ishmael, na Netanel, na Jozabad, na Elasa.

23 Na n’etiti ndi Livai; Jozabad, na Shimai, na Kelaia, (onye ahu bu Kelita), na Petahia, na Juda, na Elieza.

24 Na n’etiti ndi-ọbù-abù; Elaiashib: na n’etiti ndi-ọnu-uzọ-ama; Shalum, na Telem, na Uri.

25 Na n’etiti Israel: n’etiti umu Parosh; Ramia, na Izia, na Malkija, na Mijamin, na Eleeza, na Malkija, na Benaia.

26 Na n’etiti umu Ilam; Matanaia, na Zekaraia, na Jehiel, na Abdi, na Jeremot, na Elaija.

27 Na n’etiti umu Zatu; Elioenai, na Elaiashib, na Matanaia, na Jeremot, na Zabad, na Aziza.

28 Na n’etiti umu Bebai; Jehohanan, na Hananaia, na Zabai, na Atlai.

29 Na n’etiti umu Bani; Meshulam, na Maluk, na Adaia, na Jashub, na Sheal, na Jeremot.

30 Na n’etiti umu Pahat-moab; Adna, na Kelal, na Benaia, na Maaseia, na Matanaia, na Bezalel, na Binui, na Manase.

31 Na n’etiti umu Harim; Elieza, na Ishija, na Malkija, na Shemaia, na Shimeon;

32 Benjamin, na Maluk, na Shemaria;

33 Na n’etiti umu Hashum; Matenai, na Matata, na Zabad, na Elifelet, na Jeremai, na Manase, na Shimai.

34 Na n’etiti umu Bani; Maadai, na Amram, na Uel;

35 na Benaia, na Bedeia, na Keluhi;

36 na Vania, na Meremot, na Elaiashib;

37 na Matanaia, na Matenai, na Jaasu;

38 na Bani, na Binui, na Shimai;

39 na Shelemaia, na Netan, na Adaia;

40 na Maknadebai, na Shashai, na Sharai;

41 na Azarel, na Shelemaia, na Shemaria;

42 na Shalum, na Amaraia, na Josef.

43 N’etiti umu Nebo; Jeiel, na Matitaia, na Zabad, na Zebina, na Ido, na Joel, na Benaia.

44 Ndia nile alutawo ndinyom ala ọzọ na nwunye: ufọdu nime ha nwe-kwa-ra ndinyom ndi ha siri n’aka ha mu umu-ndikom.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 1

1 Okwu Nehemaia nwa Hakalaia. O rue, n’ọnwa Kislev, n’arọ nke-orú, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze.

2 Hanani, bú otù nime umu-nnem, we bia, ya onwe-ya na ndikom ufọdu ndi sitere na Juda; m’we jua ha ajuju bayere ndi-Ju, bú ndi-nb͕apu, nke fọduru site na ndọta-n’agha, na ajuju bayere Jerusalem.

3 Ha we sim, Ndi fọduru, bú ndi fọduru site na ndọta-n’agha n’ebe ahu n’ala ahu anāchi achi nọ n’ọnọdu ọjọ na n’ita-uta: etipúsi-kwa-ra mb͕idi Jerusalem, sure kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile ọku.

4 O rue, mb͕e m’nuru okwu ndia, na anọdurum ala, kwa ákwá, rue újú ubọchi ufọdu; m’we bue ọnu, kpe kwa ekpere n’iru Chineke nke elu-igwe,

5 si, Biko, Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Chineke uku, Nke di kwa egwu, Onye nēdebere ndi nāhu Ya n’anya nēdebe kwa ihe nile O nyere n’iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere:

6 biko, ka nti-Gi nāṅa nti, ka anya-Gi abua saghe kwa, ka I we ge nti ekpere orù-Gi, nke mu onwem nēkpe n’iru Gi ta, ehihie na abali, bayere umu Israel, bú ndi-orù-Gi, m’nēkwuputa kwa nmehie nile nke umu Israel, nke ayi mehieworo megide Gi: e, mu onwem na ulo nnam emehiewo.

7 Ayi emejọwo Gi nke-uku, ayi edebeghi kwa ihe nile enyere n’iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke I nyere Moses, bú orù-gi, n’iwu.

8 Biko, cheta okwu ahu nke I nyere Moses, bú orù-Gi, n’iwu, si, Asi na unu onwe-unu emekpu emekpu, Mu onwem gēme ka unu b͕asa n’etiti ndi nile:

9 ma asi na unu alaghachikutem, we debe ihe nile M’nyere n’iwu me kwa ha, ọ buru na ndi-unu anāchufu adi na nsọtu elu-igwe, site n’ebe ahu ka M’gāchikọta ha, me ka ha biarue ebe ahu nke M’rọputaworo ime ka aham biri n’ebe ahu.

10 Ma ndia bu orù-Gi na ndi-Gi, ndi I were ike uku Gi, were kwa aka-Gi di ike, b͕aputa.

11 Biko, Onye-nwe-ayi, biko, ka nti-Gi nāṅa nti n’ekpere orù-Gi, na n’ekpere ndi-orù-Gi, ndi ọ nātọ utọ itu egwu aha-Gi: biko, me kwa ka ihe nāgara orù-Gi nke-ọma ta, me ka enwe obi-ebere n’aru ya n’iru nwoke a. (Ma mu onwem buru eze obu-ihe-ọṅuṅu.)

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 2

1 O rue n’ọnwa Nisan, n’arọ nke-orú nke Ataksakses, bú eze, na manya-vine di n’iru ya, m’we buru manya-vine ahu, nye eze. Ma akaghm-ajọ njọ n’obi n’iru ya.

2 Eze we sim, Gini mere iru-gi jọrọ njọ, ma gi onwe-gi adighi-aria ọria? nka abughi ihe ọzọ, ọ bu nání obi jọrọ njọ. M’we tua egwu ri nne nke-uku.

3 M’we si eze, Ka eze di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: gini mere irum agaghi-eji jọ njọ, mb͕e obodo ahu, bú ulo nke ílì nnam-hà, bu nkpọnkpọ ebe, eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile n’ọku?

4 Eze we sim, Ọ̀ bu gini kwa ka gi onwe-gi nāchọ? M’we kpere Chineke nke elu-igwe.

5 M’we si eze, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na orù-gi di nma n’anya-gi, ọ bu ka i zigam na Juda, rue obodo ílì nnam-hà, ka m’we wue ya.

6 Eze we sim, (nwunye eze nānọdu kwa n’akuku ya,) Rùe ole mb͕e ka ije-gi gādi? òle mb͕e ka i gālaghachi kwa? O we di nma n’anya eze, o we zigam; m’we nye ya oge.

7 M’we si eze, Ọ buru na ọ di eze nma, ka enyem akwukwọ-ozi inye ndi nāchi ala n’ofè osimiri, ka ha kwe ka m’gabiga rue mb͕e m’batara Juda;

8 na akwukwọ-ozi inye Esaf, bú onye nēche ogige ọma nke eze nwere, ka ọ nyem osisi ijikọta ọnu-uzọ-ama nile nke ulo uku ahu n’otù nke diri ulo ahu, na ijikọta mb͕idi obodo n’otù, na ijikọta ulo n’otù, bú nke m’gābà nime ya. Eze we nyem, dika ezi aka Chinekem si di n’arum.

9 M’we biakute ndi nāchi ala n’ofè osimiri, m’we nye ha akwukwọ-ozi eze. Ma eze zìri ndi-isi usu-ndi-agha na ndi-inyinya isom je.

10 Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, we nu ya, o we di ha njọ nke-uku na madu abiawo ichọrọ umu Israel ọdi-nma.

11 M’we bata Jerusalem, nọ n’ebe ahu ubọchi atọ.

12 M’we bilie n’abali, mu onwem na ndikom ole-na-ole sorom; ma egosighm madu ọ bula ihe Chinekem nētiye n’obim imere Jerusalem: ọ dighi kwa anu-ulo di n’ebe m’nọ, ọ bu nání anu-ulo ahu nke m’nānọkwasi ya.

13 M’we si n’ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu pua n’abali, we rue n’iru isi-iyi dragon, ru kwa ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia, we le mb͕idi Jerusalem nile anya, bú nke etipúsiri etipú, ọku eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile.

14 M’we gabiga rue ọnu-uzọ-ama isi-iyi, ru kwa ọdọ-miri eze: ọ dighi kwa ebe anu-ulo nke di n’okpurum gāgabiga.

15 M’we nārigo na miri-iyi n’abali, m’we nēle mb͕idi ahu anya; m’we chigharia, ba n’ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu, we laghachi.

16 Ma ndi nọchiri anya eze amaghi ebe m’jere, ma-ọbu ihe mu onwem nēme; egosighkwam ndi-Ju rue ub͕u a, egosighkwam ndi-nchu-àjà, egosighkwam ndi amara aha-ha, egosighkwam ndi nọchiri anya eze, egosighkwam ndi fọduru ndi nēje ozi ahu.

17 M’we si ha, Unu onwe-unu nāhu ọnọdu ọjọ nke ayi onwe-ayi nọ nime ya, na Jerusalem bu nkpọnkpọ ebe, na esure-kwa-ra ọnu-uzọ-ama-ya nile n’ọku: bianu ka ayi wue mb͕idi Jerusalem, ka ayi we ghara ibu kwa ihe-ita-uta ọzọ.

18 M’we gosi ha aka Chineke nke di nma n’arum; na okwu nile nke eze kwa nke ọ gwaram. Ha we si, Ka ayi bilie lua mb͕idi. Ha we me ka aka-ha di ike ime ezi ihe a.

19 Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, na Geshem, bú onye Arebia, we nu ya, ha we chìa ayi ọchì, leda ayi anya, si, Gini bu ihe a nke unu onwe-unu nēme? ọ̀ bu eze ka unu nānupu isi imegide?

20 M’we zaghachi ha okwu, si ha, Chineke nke elu-igwe, Ya onwe-ya gēme ka ihe gara ayi nke-ọma; ayi onwe-ayi, bú ndi-orù-Ya, gēbili kwa lua mb͕idi: ma unu enweghi òkè, ma-ọbu ọnọdu ziri ezi, ma-ọbu ihe-ncheta, nime Jerusalem.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 3

1 Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, we bilie, ya na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, ha we lua ọnu-uzọ-ama aturu; ha onwe-ha doro ya nsọ, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya; ọbuná rue ulo-elu Hamea ka ha doro ya nsọ, rue ulo-elu Hananel.

2 N’akuku ya ka ndikom Jeriko luru. N’akuku ha ka Zakua nwa Imri luru.

3 Ọnu-uzọ-ama azù ka umu Hasenaa luru; ndi ahu jikọtara ya n’otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.

4 N’akuku ha ka Meremot nwa Uraia, nwa Hakoz, mere ka mb͕idi di ike. N’akuku ha ka Meshulam nwa Berekaia, nwa Meshezabel, mere ka mb͕idi di ike. N’akuku ha ka Zedok nwa Beana mere ka mb͕idi di ike.

5 N’akuku ha ka ndi Tekoa mere ka mb͕idi di ike; ma ndi-ha ndi di ebube etiyeghi olu-ha n’òfùfè Onye-nwe-ha.

6 Ọnu-uzọ-ama ochie ka Joiada nwa Pasea na Meshulam nwa Besodeia mere ka ọ di ike; ndi ahu jikọtara ya n’otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.

7 N’akuku ha ka Melataia, bú onye Gibeon, na Jadon, bú onye Meronot, ndikom Gibeon na Mizpa, mere ka mb͕idi di ike rue oche-eze nke onye nāchi ala n’ofè osimiri.

8 N’akuku ya ka Uziel nwa Hahaia, bú ndi-nnucha-ọla, mere ka mb͕idi di ike. N’akuku ya ka Hananaia, bú otù onye nime ndi nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ, mere ka mb͕idi di ike, ha we rapu Jerusalem rue mb͕idi di obosara.

9 N’akuku ha ka Refaia nwa Hua, bú onye-isi nkera ala di Jerusalem buruburu, mere ka mb͕idi di ike.

10 N’akuku ha ka Jedaia nwa Harumaf mere ka mb͕idi di ike, bú na ncherita-iru ulo-ya. N’akuku ya ka Hatush nwa Hashabneia mere ka mb͕idi di ike.

11 Malkija nwa Harim na Hashub nwa Pahat-moab mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, bú ulo-elu nke ite-ọku uku.

12 N’akuku ya ka Shalum nwa Halohesh, bú onye-isi nkera ala di Jerusalem buruburu, mere ka mb͕idi di ike, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom.

13 Ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu ka Hanun na ndi bi na Zanoa mere ka ọ di ike; ndi ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na nnù cubit mb͕idi abua na ọgu iri rue ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia.

14 Ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia ka Malkija nwa Rikab, bú onye-isi ala di Bet-hakerem buruburu, mere ka ọ di ike; onye ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.

15 Ọnu-uzọ-ama isi-iyi ka Shalun nwa Kọl-hoze, bú onye-isi ala di Mizpa buruburu, mere ka ọ di ike; onye ahu luru ya, kpue ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na mb͕idi ọdọ-miri Shela, rue ubi eze ab͕ara ogige, ru kwa ihe-nrigo nke nēsi n’obodo Devid rida.

16 N’iso ya ka Nehemaia nwa Azbuk, bú onye-isi nkera ala di Bet-zua buruburu, mere ka mb͕idi di ike, rue na ncherita-iru ílì Devid, ru kwa ọdọ-miri nke emere, ru kwa ulo ndi-dike.

17 N’iso ya ka ndi Livai, Rehum nwa Bani, mere ka mb͕idi di ike. N’akuku ya ka Hashabaia, bú onye-isi nkera ala di Keila buruburu, mere ka mb͕idi diri buruburu-ala-ya ike.

18 N’iso ya ka umu-nne-ha, na Bavai nwa Henadad, bú onye-isi nkera ala di Keila buruburu, mere ka mb͕idi di ike.

19 N’akuku ya ka Eza nwa Jeshua, bú onye-isi Mizpa, mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na ncherita-iru nrigo ulo-ihe-ekike-agha na nkuku mb͕idi.

20 N’iso ya ka Beruk nwa Zabai nuru ọku n’obi ime iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na nkuku mb͕idi rue ọnu-uzọ ulo Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà.

21 N’iso ya ka Meremot nwa Uraia nwa Hakoz mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site n’ọnu-uzọ ulo Elaiashib we rue nsọtu ulo Elaiashib.

22 N’iso ya ka ndi-nchu-àjà, bú ndikom nke Buruburu-ala, mere ka mb͕idi di ike.

23 N’iso ha ka Benjamin na Hashub mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ulo-ha. N’iso ha ka Azaraia nwa Maaseia nwa Ananaia mere ka mb͕idi di ike n’akuku ulo-ya.

24 N’iso ya ka Binui nwa Henadad mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site n’ulo Azaraia rue nkuku mb͕idi, ọbuná rue ulo-elu nkuku.

25 Palal nwa Uzai mere ka mb͕idi di ike site na ncherita-iru nkuku mb͕idi, na ulo-elu nke nāputa n’ulo di n’elu nke eze, bú nke di nso ogige ulo-nche. N’iso ya ka Pedaia nwa Parosh mere ka mb͕idi di ike.

26 (Ma Netinim nēbi n’Ofel, rue na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama miri n’akuku ọwuwa-anyanwu, na ulo-elu nke nāputa aputa.)

27 N’iso ya ka ndi Tekoa mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na ncherita ulo-elu di uku nke nāputa aputa, we rue mb͕idi Ofel.

28 Site n’elu ọnu-uzọ-ama inyinya ka ndi-nchu-àjà mere ka mb͕idi di ike, nwoke ọ bula na ncherita-iru ulo-ya.

29 N’iso ha ka Zedok nwa Imea mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ulo-ya. N’iso ya ka Shemaia nwa Shekania, bú onye nēche ọnu-uzọ-ama ọwuwa-anyanwu, mere ka mb͕idi di ike.

30 N’iso ya ka Hananaia nwa Shelemaia, na Hanum, bú nwa nke-isi nke Zalaf, mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike. N’iso ya ka Meshulam nwa Berekaia mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ime-ulo-ya.

31 N’iso ya ka Malkija, bú otù onye nime ndi-nnucha-ọla, mere ka mb͕idi di ike rue ulo Netinim, na nke ndi nāzu ahia, na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama Hamifkad, ru kwa nrigo ulo-elu nkuku.

32 N’etiti nrigo ulo-elu nkuku na ọnu-uzọ-ama aturu ka ndi-nnucha-ọla na ndi nāzu ahia mere ka ọ di ike.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 4

1 O rue, mb͕e Sanbalat nuru na ayi onwe-ayi nālu mb͕idi, na iwe-ya di ọku, ewe kpasue ya iwe, o we chìa ndi-Ju ọchì.

2 O kwue okwu n’iru umu-nne-ya na usu-ndi-agha Sameria, si, Gini ka ndi-Ju ndia ndi nāta aru nēme? hà gārapuru onwe-ha ihe? hà gāchu àjà? hà gēme ka ọlu-ha gwusia n’otù ubọchi? hà gēsi n’obo ájá me ka nkume di adi ọzọ, ebe nkume ahu nile bu ihe akpọworo ọku?

3 Tobaia, bú onye Amon, nọ kwa n’akuku ya, ọ si, Ọzọ, mb͕idi nke ndi ahu nālu, ọ buru na nkita-ọhia arigo n’elu ya, o gētipú kwa mb͕idi-nkume-ha.

4 Nuru, Chineke-ayi; n’ihi na ayi bu ndi eledaworo anya: Gi me kwa ka ita-uta-ha laghachi n’isi-ha, Gi rara kwa ha nye ibu ihe-nluta-n’agha n’ala ndọta-n’agha:

5 ekpuchi-kwa-la ajọ omume-ha, ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie-ha n’iru Gi: n’ihi na ha akpasuwo Gi iwe n’iru ndi nālu mb͕idi.

6 Ayi we lua mb͕idi ahu; ewe lukọta mb͕idi nile rue nkera idi-elu-ya: n’ihi na ndi-Ju nwere obi ilu ọlu.

7 O rue na, mb͕e Sanbalat na Tobaia na ndi Arebia na ndi Amon na ndi Ashdod nuru na anāluzu mb͕idi Jerusalem nile, na amalitere ituchi ntipú-ya nile, iwe-ha we di ọku nke-uku;

8 ha we kekọta onwe-ha, ha nile n’otù, ibia ibuso Jerusalem agha, na ikpatara ya ihe-njehie.

9 Ayi we kpere Chineke-ayi, guzo ndi-nche megide ha ehihie na abali, n’ihi ha.

10 Juda we si, Ike nke ndi-ibu ebilatawo, ma nkpọnkpọ-ihe riri nne; ayi onwe-ayi apughi kwa ilu mb͕idi.

11 Ndi nākpab͕u ayi we si, Ha agaghi-ama, ha agaghi-ahu kwa, rue mb͕e ayi batara n’etiti ha, b͕ue ha, me ka ije-ozi ahu kwusi.

12 O rue, mb͕e ndi-Ju ndi bi n’akuku ha biara, na ha siri ayi ub͕ò iri site n’ebe ahu nile, Unu gēchigharikute ayi.

13 M’we guzo ndi-ayi n’ebe nile dikarisiri ala nke ebe di nime mb͕idi, n’ebe nile sara mbara, m’we guzo ndi-ayi dika ab͕uru nile ha si di, ha na mma-agha-ha, na ube-ha, na uta-ha.

14 M’we hu, bilie, si ndi amara aha-ha, si kwa ndi nọchiri anya eze, si kwa ndi-ayi fọduru, Unu atula egwu ha: chetanu Onye-nwe-ayi, Nke di uku di kwa egwu, bu-kwa-ranu umu-nne-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na ndinyom-unu, na ulo-unu, agha.

15 O rue na, mb͕e ndi-iro-ayi nuru na ayi mara ya, na Chineke mebi-kwa-ra ndum-ọdu ha duritara onwe-ha, ayi nile we laghachi na mb͕idi, nwoke ọ bula ije ozi-ya.

16 O rue, site n’ubọchi ahu, na nkera ndi nējerem ozi nālu ọlu n’ije-ozi ahu, ma nkera nime ha nēji ube na ọta na uta na uwe-agha; ndi-isi nọ kwa n’azu ulo Juda nile.

17 Ndi nālu mb͕idi n’elu mb͕idi ahu na ndi nēbu ibu nēbo onwe-ha ibu, nwoke ọ bula nēwere otù aka-ya lu ọlu n’ije-ozi ahu, ma otù aka-ya nēji ihe-agha-ya;

18 ndi nālu mb͕idi kwa, nwoke ọ bula na mma-agha-ya ekeworo n’úkwù-ya nọ, ha we nālu mb͕idi otú a. Onye nāfù opì-ike nọ kwa n’akukum.

19 M’we si ndi amara aha-ha, si kwa ndi nọchiri anya eze, si kwa ndi-ayi fọduru, Ije-ozi a riri nne, sa kwa mbara, ayi onwe-ayi ekewawo n’elu mb͕idi, ayi we nọ n’ebe di anya, otù nwoke n’aru nwa-nne-ya.

20 N’ebe ọ bula unu nuru olu opì-ike, n’ebe ahu ka unu gāchikọta onwe-unu n’ebe ayi nọ; Chineke-ayi gēburu ayi agha.

21 Ayi onwe-ayi we nālu ọlu n’ije-ozi ahu: ma nkera-ha nēji ube site na chi-ọbubọ rue mb͕e kpakpando putara.

22 Ọzọ, na mb͕e ahu m’siri ndi-ayi, Ka nwoke ọ bula na onye nējere ya ozi nọ ọnọdu-abali n’etiti Jerusalem, ka ha we buru ayi ndi-nche n’abali, je kwa ozi n’ehihie.

23 Ma ọ dighi onye ọ bula, ma ọ bu mu onwem, ma-ọbu umu-nnem, ma-ọbu ndi nējerem ozi, ma-ọbu ndikom nche ndi nēsom, ọ dighi onye n’etiti ayi nēyipu uwe-ya, nwoke ọ bula were ihe-agha-ya je miri.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 5

1 Oké iti-nkpu nke ndi-ayi na ndinyom-ha we di megide umu-nne-ha, bú ndi-Ju.

2 N’ihi na ufọdu di ndi nāsi, Ayi onwe-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom, di ọtutu: kwe ka ayi nara ọka, ka ayi we rie ihe, we di ndu.

3 Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile na ulo-ayi nile ka ayi nēdo n’ibé: kwe ka ayi nara ọka, n’ihi oké unwu a.

4 Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ayi ewerewo ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile biri ego itu utu-ala eze.

5 Ma ub͕u a dika anu-aru umu-nne-ayi ka anu-aru-ayi di, dika umu-ha ka umu-ayi di: ma, le, ayi onwe-ayi nāzọda umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom ime ka ha buru ndi-orù, ufọdu di kwa n’etiti umu-ayi ndinyom ndi azọdaworo azọda: ma ayi enweghi ike nke aka-ayi; ma ndi ọzọ nwe ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile.

6 Iwem we di ọku nke-uku mb͕e m’nuru iti-nkpu-ha na okwu ndia.

7 Obim we duam ọdu, mu na ndi amara aha-ha na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m’we si ha, Ọmuru-nwa ka unu onwe-unu nānara, nwoke ọ bula n’aka nwa-nne-ya. M’we nwe nkpọkọta uku megide ha.

8 M’we si ha, Ayi onwe-ayi ab͕aputawo umu-nne-ayi, bú ndi-Ju, ndi erenyere ndi mba ọzọ, dika aka-ayi ruru; ùnu onwe-unu gēre kwa umu-nne-unu, àgērenye kwa ayi ha? Ha we b͕a nkiti, ha ahughi kwa okwu ha gāza.

9 M’we si, Ọ dighi nma, bú ihe a nke unu onwe-unu nēme: ọ̀ bughi n’egwu Chineke ka unu gējeghari, n’ihi ita-uta nke ndi mba ọzọ, bú ndi-iro-ayi?

10 Ọzọ kwa, mu onwem na umu-nnem na ndi nējerem ozi nēbinye ha ego na ọka n’ọmuru-nwa. Biko, ka ayi rapu ọmuru-nwa nka.

11 Biko, burunu uzọ nyeghachi ha ubi nile ha, na ubi-vine nile ha, na ubi-olive nile ha, na ulo nile ha, na otù uzọ n’ọgu uzọ ise nke ego, na nke ọka, na nke manya-vine ọhu, na nke manu, nke unu nānara ha n’ọmuru-nwa.

12 Ha we si, Ayi gēnyeghachi ha, ayi agaghi-achọ kwa ihe n’aka ha; otú a ka ayi gēme, dika gi onwe-gi nēkwu. M’we kpọ ndi-nchu-àjà, me ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di.

13 Arurupu-kwa-ram obi-uwem, si, Ka Chineke rurupu nwoke ọ bula otú a site n’ulo-ya, site kwa na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n’ọlu, bú onye nādighi-eme ka okwu a guzosie ike; ọbuná otú a ya bu ihe arurupuworo, nke tọb͕ọ-kwa-ra n’efu. Nkpọkọta ahu nile we si, Amen, ha we to Jehova. Ndi-ayi we me dika okwu a si di.

14 Ọzọ, site n’ubọchi o nyerem iwu ibu onye nāchi ha n’ala Juda, site n’arọ nke-orú we rue arọ nke-orú-na-iri-na-abua nke Ataksakses, bú eze, nke ahu bu arọ iri na abua, mu onwem na umu-nnem erighi nri nke onye nāchi ala.

15 Ma ndi mbu nāchi ala ndi burum uzọ, ha bob͕uru ndi-Ju ibu arọ́, we nara ha utu n’achicha na manya-vine, tiyere ọgu shekel ọla-ọcha abua; ọbuná ndi nējere ha ozi bu ndi-isi n’ebe ndi-ayi nọ: ma mu onwem emeghi otú a, n’ihi egwu Chineke.

16 Ọzọ kwa, m’jisiri ike n’ije-ozi mb͕idi a, ọ dighi kwa ubi ayi zutara: ma achikọtawo ndi nile nējerem ozi n’ebe ahu ije ozi ahu.

17 Ọzọ, ndi-Ju na ndi nọchiri anya eze, bú ọgụ ndikom asa na iri, nọ na table nkem, ha na ndi nābiakute ayi site na mba ndi di ayi buruburu.

18 Ma ihe nke edoziworo bayere otù ubòchi bu otù ehi na aturu isi arọputara arọputa; edozi-kwa-ra umu-nnunu nyem, dozi kwa manya-vine nile ọ bula n’uba otù ub͕ò n’ubọchi iri: ma n’ihe a nile ọ dighi nri nke diri onye nāchi ala m’chọrọ, n’ihi na òfùfè ahu di arọ́ n’aru ndi nka.

19 Chinekem, chetaram ihe nile nke m’meworo n’ihi ndi nka, imerem ezi ihe.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 6

1 O rue, mb͕e Sanbalat, na Tobaia, na Geshem, bú onye Arebia, na ndi-iro-ayi fọduru, nuru na m’lusiri mb͕idi ahu, na ọ dighi kwa ntipú fọduru nime ya; (ọ bu ezie na akaghm-eguzo ibo-ọnu-uzọ n’ọnu-uzọ-ama nile rue mb͕e ahu;)

2 o rue, na Sanbalat na Geshem ziterem ozi, si, Bia, ka ayi zukọta n’otù n’obodo ntà nime ndagwurugwu nke Ono. Ma ndi ahu nēchè èchìchè imejọm emejọ.

3 M’we zigara ha ndi-ozi, si, Ozi uku ka m’nēje, apughkwam irida: n’ìhi gini ka ozi a gākwusi, mb͕e m’nārapu ya, we ridakuru unu?

4 Ha we ziterem ozi ub͕ò anọ dika okwu a si di; m’we zaghachi ha okwu dika okwu a si di.

5 Sanbalat we ziterem onye nējere ya ozi nke ub͕ò ise dika okwu a si di, ya na akwukwọ-ozi nke emegheworo n’aka-ya;

6 edewo nime ya, si, Anuwo ya n’etiti mba nile ọzọ, Gashmu nāsi kwa, na gi onwe-gi na ndi-Ju nēchè èchìchè inupu isi; n’ihi nka ka gi onwe-gi nālu mb͕idi ahu: gi onwe-gi aghọwo-kwa-ra ha eze, dika okwu ndia si di.

7 Ọzọ kwa, i guzowo ndi-amuma ikpọsa òkù bayere gi nime Jerusalem, si, Eze di nime Juda: ma ub͕u a eze gānu ya dika okwu ndia si di. Ma ub͕u a bia, ka ayi durita onwe-ayi ọdu.

8 M’we zigara ya ozi, si, Ọ dighi ka okwu ndia si di nke gi onwe-gi nēkwu, kama gi onwe-gi nēchèputa ha n’obi-gi.

9 N’ihi na ha nile nēme ka ayi tua egwu, si, Aka-ha gākudapu n’ije-ozi a, agaghi-eje kwa ya. Ma ub͕u a Gi me ka akam abua di ike.

10 Ma mu onwem batara n’ulo Shemaia nwa Delaia nwa Mehetabel, ma emechidoworo onye ahu uzọ; o we si, Ka ayi zukọta n’ulo Chineke, n’etiti ulo uku Chineke, ka ayi mechi kwa uzọ nile nke ulo uku Chineke: n’ihi na ha nābia ib͕u gi; e, n’abali ka ha nābia ib͕u gi.

11 M’we si, Nwoke dika mu onwem, ọ̀ gāb͕alaga? ònye di kwa, nke di ka mu onwem, nke gābà n’ulo uku Chineke, we di ndu? m’gaghi-abà nime.

12 M’we mata, ma, le, ọ bughi Chineke zitere ya: kama okwu amuma nka ka o kwuru imegidem: ma Sanbalat na Tobaia goro ya.

13 N’ihi nka ka egoro onye ahu, ka m’we tua egwu, me otú a, we mehie, ka ha we nwe kwa ya inyem aha ọjọ, ka ha we tam uta.

14 Chinekem, cheta Tobaia, cheta kwa Sanbalat, dika omume-ha ndia si di, ọzọ kwa, cheta Noadia, bú onye-amuma-nwayi, cheta kwa ndi-amuma fọduru, ndi nēme ka m’tua egwu.

15 Ewe luzue mb͕idi ahu n’ubọchi nke-orú-na-ise nke ọnwa Elul, n’ọgu ubọchi abua na iri na abua.

16 O rue, mb͕e ndi-iro-ayi nile nuru ya, na mba nile nke di ayi buruburu turu egwu, we da ada nke-uku n’anya nke aka ha: ha we mara na esitere n’aka Chineke-ayi je ozi a.

17 Ọzọ, na mb͕e ahu ndi Juda amara aha-ha nēzigara Tobaia ọtutu akwukwọ-ozi, akwukwọ-ozi nke Tobaia nābiaru kwa ha aka.

18 N’ihi na ọtutu madu di nime Juda ndi nwere iyi ha ṅuru ya, n’ihi na di nwa-nwayi Shekania nwa Ara ka ọ bu; Jehohanan nwa-ya lu-kwa-ra nwa-nwayi Meshulam nwa Berekaia na nwunye.

19 Ha nēkwu kwa okwu bayere ezi omume-ya nile n’irum, ha nēburu kwa okwum nile pukuru ya. Akwukwọ-ozi ka Tobaia ziri ime ka m’tua egwu.

Categories
NEHEMAIA

NEHEMAIA 7

1 O rue, mb͕e alusiri mb͕idi ahu, mb͕e m’guzosi-kwa-ra ibo-ọnu-uzọ-ya nile, mb͕e emesi-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama na ndi-ọbù-abù na ndi-Livai ka ha lekọta ozi-ha,

2 na m’nyere Hanani, bú nwa-nnem, na Hananaia, bú onye-isi ulo uku eze, iwu bayere Jerusalem: n’ihi na onye ahu bu onye ezi-okwu, ọ nātu kwa egwu Chineke kari ọtutu madu.

3 M’we si ha, Ka aghara imeghepu ọnu-uzọ-ama Jerusalem rue mb͕e anyanwu di ọku; na mb͕e ndi-nche nēguzo kwa na nche-ha, ka ha mechie uzọ, kpọchi-kwa-nu ha: guzo kwa ndi bi na Jerusalem na nche, nwoke ọ bula nime nche-ya, nwoke ọ bula kwa na ncherita-iru ulo-ya.

4 Ma obodo ahu sara mbara n’aka abua, di kwa uku: ma ndi-ayi di ole-na-ole n’etiti ya, ulo adighi kwa nke ewuru ewu.

5 Chinekem we tiye ya n’obim, m’we chikọta ndi amara aha-ha, na ndi nọchiri anya eze, na ndi-ayi nile, ka ewe de ha n’akwukwọ-osuso-ọmumu. M’we chọta akwukwọ osuso-ọmumu nke ndi rigotaworo na mbu, m’we hu ihe a edeworo nime ya:

6 Ndia bu umu ala ahu anāchi achi, ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n’agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n’ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri n’ala ọzọ, ha we lata na Jerusalem, lata kwa na Juda, nwoke ọ bula n’obodo-ya;

7 ndi nābia, ha na Zerubabel, na Jeshua, na Nehemaia, na Azaraia, na Raamia, na Nahamani, na Mọdekai, na Bilshan, na Misperet, na Bigvai, na Nehum, na Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel:

8 Umu Parosh, nnù ise na ọgu asatọ na iri na abua.

9 Umu Shefataia ọgu iri-na-asatọ na iri na abua.

10 Umu Ara, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na abua.

11 Umu Pahat-moab, nke umu Jeshua na Joab, nnù asa na iri na asatọ.

12 Umu Ilam, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.

13 Umu Zatu, nnù abua na ọgu abua na ise.

14 Umu Zakai, nnù na ọgu iri-na-asatọ.

15 Umu Binui, nnù na ọgu iri-na-abua na asatọ.

16 Umu Bebai, nnù na ọgu iri-na-otù na asatọ.

17 Umu Azgad, nnù ise na ọgu iri-na-isi na abua.

18 Umu Adonikam, nnù na ọgu iri-na-atọ na asa.

19 Umu Bigvai, nnù ise na ọgu atọ na asa.

20 Umu Adin, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na ise.

21 Umu Atea, nke Hezekaia, ọgu anọ na iri na asatọ.

22 Umu Hashum, ọgu iri-na-isi na asatọ.

23 Umu Bezai, ọgu iri-na-isi na anọ.

24 Umu Harif, ọgu ise na iri na abua.

25 Umu Gibeon, ọgu anọ na iri na ise.

26 Ndikom Bet-lehem na Netofa, ọgu iteghete na asatọ.

27 Ndikom Anatot, ọgu isi na asatọ.

28 Ndikom Bet-azmavet, ọgu abua na abua.

29 Ndikom Kiriat-jearim na Kefira na Beirot, nnù na ọgu iri-na-asa na atọ.

30 Ndikom Rema na Geba, nnù na ọgu iri-na-otù na otù.

31 Ndikom Mikmas, ọgu isi na abua.

32 Ndikom Bet-el na Ai, ọgu isi na atọ.

33 Ndikom Nebo nke-ọzọ, ọgu abua na iri na abua.

34 Umu Ilam nke-ọzọ, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.

35 Umu Harim, ọgu iri-na-isi.

36 Umu jeriko, ọgu iri-na-asa na ise.

37 Umu Lod na Hadid na Ono, nnù n’ ọgu na iri-na-isi na otù.

38 Umu Senaa, nnù iteghete na ọgu iri-na-isi na iri.

39 Ndi-nchu-àjà: umu Jedaia, nke ulo Jeshua, nnù abua na ọgu asatọ na iri na atọ.

40 Umu Imea, nnù abua na ọgu iri-na-abua na iri na abua.

41 Umu Pashua, nnù atọ na ọgu abua na asa.

42 Umu Harim, nnù abua na ọgu iri na iri na asa.

43 Ndi Livai: umu Jeshua, nke Kadmiel, nke umu Hodeva, ọgu atọ na iri na anọ.

44 Ndi ọbù-abù: umu Esaf, ọgu asa na asatọ.

45 Ndi-ọnu-uzọ-ama: umu Shalum, na umu Atea, na umu Talmon, na umu Akub, na umu Hatita, na umu Shobai, ọgu isi na iri na asatọ.

46 Netinim: umu Ziha, na umu Hasufa, na umu Tabaot;

47 na umu Keros, na umu Sia, na umu Padon;

48 na umu Lebana, na umu Hagaba, na umu Salmai;

49 na umu Hanan, na umu Gidel, na umu Gaha;

50 na umu Reaia, na umu Rezin, na umu Nekoda;

51 na umu Gazam, na umu Uza, na umu Pasea;

52 na umu Besai, na umu Meunim, na umu Nefushesim;

53 na umu Bakbuk, na umu Hakufa, na umu Hahua;

54 na umu Bazlit, na umu Mehida, na umu Hasha;

55 na umu Bakos, na umu Sisera, na umu Tema;

56 na umu Nezia, na umu Hatifa.

57 Umu ndi-orù Solomon: umu Sotai, na umu Soferet, na umu Perida;

58 na umu Jaala, na umu Dakon, na umu Gidel;

59 na umu Shefataia, na umu Hatil, na umu Pokeret-hazebaim, na umu Emon.

60 Netinim nile, na umu ndi-orù Solomon, di ọgu iri-na-iteghete na iri na abua.

61 Ndia bu kwa ndi nārigo site na Tel-mela na Tel-hasha na Kerub na Adon na Imea: ma ha apughi igosi ulo nke ndi bu nna-ha, ma-ọbu nkpuru-ha, ma ọ bu Israel ka ha siri puta:

62 umu Delaia, na umu Tobaia, na umu Nekoda, nnù na ọgu iri-na-abua na abua.

63 Site kwa na ndi-nchu-àjà: umu Họbaia, na umu Hakoz, na umu Bazilai, onye luru nwunye sitere n’umu-ndinyom Bazilai, bú onye Gilead, ewe kpọ ya aha n’aha-ha.

64 Ndia chọrọ odide-akwukwọ-ha n’etiti ndi edere n’akwukwọ-osuso-ọmumu, ma achọtaghi ya: ewe gua ha na ndi nādighi nsọ, ewe wepu ha n’ọlu-nchu-àjà.

65 Tiashata we si ha, ka ha ghara iri ihe n’ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, rue mb͕e onye-nchu-àjà gēwere Ìhè na Izu-okè guzo.

66 Nkpọkọta ahu nile n’otù di orú nnù uzọ ise na nnù ise na ọgu iri-na-asatọ,

67 nāgughi orù-ha ndikom na orù-ha ndinyom, ndi di nnù iri-na-asatọ na ọgu isi na iri na asa: ha nwe-kwa-ra ọgu madu iri-na-abua na ise bu ndikom nābù abù na ndinyom nābù abù.

68 Inyinya-ha di nnù na ọgu iri-na-isi na iri na isi; inyinya mule ha di ọgu iri-na-abua na ise;

69 camel-ha di nnù na orú na iri na ise; inyinya-ibu-ha di nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-isi.

70 Ma ufọdu n’etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna nyere onyinye nke diri ije-ozi ahu. Tiashata tiyere n’ulo-àkù nnù daric ọla-edo abua na ọgu iri, na ọgu ọkwa-nwusa abua na iri, na nnù uwe ndi-nchu-àjà na ọgu isi na iri.

71 Ma ufọdu n’etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna tiyere n’ulo-àkù nke ije-ozi ahu orú nnù daric ọla-edo uzọ abua na nnù iri, na nnù pound ọla-ọcha ise na ọgu iri.

72 Ma nke ndi-ayi fọduru nyere di orú nnù daric ọla-edo uzọ abua na nnù iri, na nnù pound ọla ọcha ise, na ọgu uwe ndi-nchu-àjà atọ na asa.

73 Ndi-nchu-aja, na ndi Livai, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù, na ufọdu nime ndi Juda, na Netinim, na Israel nile, we biri n’obodo nile ha. Ọnwa nke-asa we rue, umu Israel nọ kwa n’obodo nile ha.