Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 14

1 Abaija we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, ha we lìe ya n’obodo Devid: Esa nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya: ala di jū n’ubọchi-ya arọ iri.

2 Esa we me ezi ihe nke zi-kwa-ra ezi n’anya Jehova, bú Chineke-ya:

3 o we wezuga ebe-ichu-àjà nile nke ala ọzọ, na ebe nile di elu, tupia ogidi nile, b͕utue Asherim;

4 ọ si Juda ka ha chọ Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, na ime iwu na ihe enyere n’iwu.

5 O si-kwa-ra n’obodo nile nke Juda wezuga ebe nile di elu na arusi-anyanwu nile: ala-eze-ya we di jū n’iru ya.

6 O we wue obodo ewusiri ike nime Juda: n’ihi na ala di jū, ọ dighi kwa agha o nwere n’arọ ndia; n’ihi na Jehova mere ka o zuru ike.

7 O we si Juda, Ka ayi wue obodo ndia, were mb͕idi, na ulo-elu, na ibo-ọnu-uzọ-ama, na nkpọrọ b͕a ha buruburu; ala-ayi di n’iru ayi rue ub͕u a, n’ihi na ayi achọwo Jehova, bú Chineke-ayi; ayi achọwo Ya, O we me ka ayi zuru ike buruburu. Ha we wue, ihe we gara ha nke-ọma.

8 Esa nwe-kwa-ra usu-ndi-agha ndi nēbu ọta uku na ube, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnù iri ndi sitere na Juda; na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-ise ndi sitere na Benjamin, bú ndi nēbu ọta, nāzọgide kwa uta ikwe ha: ndia nile bu ndi-dike bu dìnkpà.

9 Zera, bú onye Etiopia, we chiri usu-ndi-agha, bú orú nnù ndikom ọgu uzọ isi na uzọ ise, na ọgu ub͕ọ-ala iri-na-ise, pukute ha; o we biarue Marisha.

10 Esa we pua izute ya, ha we do agha n’usoro nime ndagwuruguru Zefata nime Marisha.

11 Esa we kpọkue Jehova, bú Chineke-ya, si, Jehova, Ọ dighi onye tiyere Gi iye aka, n’etiti onye bara uba na onye ike nādigh: yere ayi aka, Jehova, bú Chineke-ayi; n’ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere, ọ bu kwa n’aha-Gi ka ayi biaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke-ayi ka I bu; ekwela ka ihe akpọrọ madu b͕ochigide Gi.

12 Jehova we tib͕ue ndi Etiopia n’iru Esa, na n’iru Juda; ndi Etiopia we b͕alaga.

13 Esa na ndi ya na ha nọ we chua ha rue Gera: ọtutu nime ndi Etiopia we da, idebe-ndu we ghara idiri ha; n’ihi na etipiara ha n’iru Jehova na n’iru ọmuma-ulo-ikwū-Ya; ha we būru ihe-nkwata nke bara uba nke-uku.

14 Ha we tib͕ue obodo nile di Gera buruburu; n’ihi na oké egwu nke Jehova dakwasiri ha: ha we luta ihe obodo nile n’agha; n’ihi na ọtutu ihe-nluta-n’agha di nime ha.

15 Ọzọ kwa, ha tib͕uru ndi ulo-ikwū nke anu-ulo, we chiri n’agha ìgwè ewu na aturu n’uba na camel, lata na Jerusalem.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 15

1 Mọ nke Chineke we dakwasi Azaraia nwa Oded:

2 o we pua izute Esa, si ya, Nurunum, Esa na Juda na Benjamin nile: Jehova nọyere unu, mb͕e unu nọyere Ya; ọ buru kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya; ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu.

3 Ma ọtutu ubọchi ka Israel nọ nēnweghi Chineke nke ezi-okwu, nēnweghi kwa onye-nchu-àjà nēzí ihe, nēnweghi kwa iwu:

4 ha we chigharikute Jehova, bú Chineke Israel, nime nkpab͕u diri ha, we chọ Ya, O we me ka ha chọta Ya.

5 Ma na mb͕e ahu ọ dighi udo diri onye nāpu apu, ma-ọbu diri onye nābata abata, kama ọtutu ib͕a-aghara dikwasiri ndi nile bi n’ala ahu nile.

6 Ewe tipia ha, mba megide mba, na obodo megide obodo: n’ihi na Chineke were nkpab͕u nile chusa ha.

7 Ma unu onwe-unu, dinu ike, ekwela ka aka-unu kuda: n’ihi na ugwọ-ọlu diri ọlu-unu.

8 Ma mb͕e Esa nuru okwu ndia, na obubu-amuma nke Oded, bú onye-amuma, o mere onwe-ya ka ọ di ike, we me ka ihe-árú nile si n’ala Juda na Benjamin nile, si kwa n’obodo nile nke ọ naputara n’ugwu Efraim, gabiga; o me kwa ka ebe-ichu-àjà Jehova di ọhu, bú nke di n’iru uzọ-nbata Jehova.

9 Ọ chikọta Juda na Benjamin nile, na ndi nānọ dika ọbìa n’etiti ha site n’Efraim na Manase, site kwa na Simeon: n’ihi na ha siri n’Israel dayere ya n’uba, mb͕e ha huru na Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya.

10 Ha we chikọta onwe-ha nime Jerusalem n’ọnwa nke-atọ, n’arọ nke-iri-na-ise nke Esa bu eze.

11 Ha we chuara Jehova àjà n’ubọchi ahu, site n’ihe-nkwata ha bubatara, bú nnù ehi na ọgu iri-na-ise, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri.

12 Ha we ba nime ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú iwere obi-ha nile na nkpuru-obi-ha nile chọ Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha;

13 na ime ka onye ọ bula nwua, ma ọ bu onye ntà ma-ọbu onye uku, ma-ọbu nwoke ma-ọbu nwayi, nke nāchọghi Jehova, bú Chineke Israel.

14 Ha we were oké olu, were kwa iti-nkpu, were kwa opì, were kwa opì-ike, ṅuara Jehova iyi.

15 Juda nile we ṅuria ọṅu n’ọṅuṅu-iyi ahu: n’ihi na ha were obi-ha nile ṅua iyi, were kwa otú ọ nātọzu ha utọ chọ Ya; O we me ka ha chọta Ya: Jehova we me ka ha zuru ike buruburu.

16 Ọzọ kwa, Meaka nne Esa, bú eze, o wezugara ya n’ibu eze-nwayi, n’ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, ọ supia ya, sure ya ọku na miri-iyi Kidron.

17 Ma esighi n’Israel wezuga ebe di elu: otú ọ di, obi Esa zuru okè n’ubọchi-ya nile.

18 Ọ chibata n’ulo Jehova ihe nile nna-ya doro nsọ, na ihe nile ya onwe-ya doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe di iche iche ọzọ.

19 Agha adighi kwa ọzọ rue arọ nke-orú-na-iri-na-ise nke Esa bu eze.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 16

1 N’arọ nke-orú-na-iri-na-isi nke Esa bu eze, Beasha, bú eze Israel, we rigo imegide Juda, wue Rema, ka ọ ghara ikwe Esa, bú eze Juda, ka o nwe onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata.

2 Esa we weputa ọla-ọcha na ọla-edo n’àkù ulo Jehova na nke ulo eze, zigara Ben-hedad, bú eze Siria, onye bi na Damaskọs, si,

3 Ọb͕ub͕a-ndu di n’etiti mu na gi, na n’etiti nnam na nna-gi: le, eziteworom i ọla-ọcha na ọla-edo; je, mebie ọb͕ub͕a-ndu gi na Beasha, bú eze Israel, b͕ara, ka o we si n’arum rigo.

4 Ben-hedad we ge eze, bú Esa, nti, zite ndi-isi usu nile nke ndi-agha o nwere imegide obodo nile nke Israel; ha we tib͕ue Ijon, na Dan, na Ebel-maim, na ulo-nchikọbata-ihe nile nke obodo Naftali nile.

5 O rue, mb͕e Beasha nuru ya, na ọ rapuru iwu Rema, me ka ozi-ya ahu kwusi.

6 Ma Esa, bú eze, chiri Juda nile; ha we bupu nkume nile nke Rema, na osisi-ya nile, nke Beasha ji wu ya; o we were ha wue Geba na Mizpa’

7 Ma na mb͕e ahu Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, biakutere Esa, bú eze Juda, si ya, N’ihi na i dabeworo n’eze Siria, ma i dabeghi na Jehova, bú Chineke-gi, n’ihi nka usu-ndi-agha eze Siria esiwo n’aka-gi wepuga onwe-ya.

8 Ndi Etiopia na ndi-Lubim, hà abughi usu-ndi-agha n’uba, nēnwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya bara uba nke-uku? ma mb͕e i dabere na Jehova, O nyere ha n’aka-gi.

9 N’ihi na Jehova, anya-Ya nējeghari n’uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n’akuku ndi obi-ha zuru okè n’ebe Ọ nọ. I bu onye-nzuzu na nka; n’ihi na site n’ub͕u a i gēnwe agha.

10 Esa we wesa onye-ọhu-uzọ ahu iwe, tiye ya n’ulo ọtọsi; n’ihi na o nēkosa ya ọnuma n’ihi ihe a. Esa we zọpia ufọdu nime ndi-ya na mb͕e ahu.

11 Ma, le, ihe nile Esa mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n’akwukwọ ndi-eze Juda na Israel.

12 Esa we ria ọria n’ukwu-ya abua n’arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete ọ bu eze; ọria-ya di uku ri nne: ọzọ kwa, n’ọria-ya ọ chọghi Jehova, kama ọ chọrọ n’etiti ndi-dibia.

13 Esa we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, ọ nwua n’arọ nke-ọgu-abua-na-otú ọ bu eze.

14 Ha we lìe ya n’ili ya, nke o gwuwara nye onwe-ya n’obodo Devid, ha we me ka o dina n’ihe-ndina nke emejuru n’uda di iche iche na ihe di iche iche asugwara asugwa n’ọlu onye nāsugwa manu nēsì ísì utọ: ha we surere ya oké nsure-ọku di uku.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 17

1 Jehoshafat nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya, we me onwe-ya ka ọ di ike imegide Israel.

2 O we tiye usu-ndi-agha n’obodo nile ewusiri ike nke Juda, o tiye-kwa-ra ebe-nguzo-ndi-agha n’ala Juda, na n’obodo Efraim nile nke Esa nna-ya were.

3 Jehova we nọyere Jehoshafat, n’ihi na o jere ije n’uzọ mbu Devid, bú nna-ya, ọ chọghi kwa Bealim;

4 kama ọ chọrọ Chineke nke nna-ya, jeghari kwa n’ihe nile O nyere n’iwu, ọ bughi kwa dika omume Israel si di.

5 Jehova we me ka ala-eze guzosie ike n’aka-ya; Juda nile we nye Jehoshafat onyinye-inata-iru-ọma; o we nwe àkù na nsọpuru n’uba.

6 Obi-ya di kwa elu n’uzọ nile nke Jehova: ọzọ kwa, o siri na Juda wezuga ebe nile di elu na Asherim.

7 Ma n’arọ nke-atọ nke ọ bu eze o zigara ndi-isi-ya, bú Ben-hail, na Obadaia, na Zekaraia, na Netanel, na Maikaia, izí ihe n’obodo Juda nile:

8 ha na ndi Livai, bú Shemaia, na Netanaia, na Zebadaia, na Asahel, na Shemiramot, na Jehonatan, na Adonaija, na Tobaija, na Tob-Adonaija, ndi Livai; ha na Elishama na Jehoram, bú ndi-nchu-àjà.

9 Ha we zí ihe na Juda, nēji akwukwọ iwu Jehova n’aka-ha; ha we nēje obodo nile nke Juda buruburu, we nēzí ihe n’etiti ndi Juda.

10 Oké egwu Jehova we dikwasi ala-eze nile nke ala nile nke di Juda buruburu, ha ebusoghi kwa Jehoshafat agha.

11 Ufọdu nime ndi Filistia weta-kwa-ra Jehoshafat onyinye-inata-iru-ọma, na ọla-ọcha òfùfè; ndi Arebia nēweta-kwa-ra ya ìgwè ewu na aturu, nnù ebulu iri-na-iteghete na ọgu ise, na nnù nkpi iri-na-iteghete na ọgu ise.

12 Jehoshafat we nāga n’iru we di ike ri nne; o we wue nime Juda ulo uku na obodo nchikọbata-ihe.

13 O nwe-kwa-ra ije-ozi bara uba n’obodo Juda nile, na ndikom agha nime Jerusalem, ha bu ndi-dike bu dìnkpà.

14 Ma ndia bu ngukọta-ha dika ulo nke ndi bu nna-ha si di: nke Juda, ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri; Adna, bú onye-isi, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnu iri, ndi-dike bu dìnkpà:

15 onye so ya bu Jehohanan, bú onye-isi, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-ise:

16 onye so ya bu Amasaia nwa Zikri, onye were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ya; ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi-dike bu dìnkpà:

17 ndi sitere na Benjamin; otù dike bu dìnkpà, bú Elaiada, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi nāchi uta na ọta:

18 onye so ya bu Jehozabad, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ abua na nnù iri, ndi ejikere nke usu-ndi-agha.

19 Ndia bu ndi nējere eze ozi, nāgughi ndi ahu eze tiyere n’obodo nile ewusiri ike nime Juda nile.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 18

1 Jehoshafat we nwe àkù na nsọpuru n’uba; o we ghọ ọgọ Ehab.

2 Mb͕e arọ ufọdu gwusiri ọ ridakuru Ehab, rue Sameria. Ehab we b͕uere ya aturu na ehi n’uba, b͕u-kwa-ra ndi ya na ha yikọrọ, o we kpalie ya irigoru Remot-gilead.

3 Ehab, bú eze Israel, we si Jehoshafat, bú eze Juda, Ì gēsom je Remot-gilead? Ọ we si ya, Dika m’di, otú a ka i di, ndim di kwa ka ndi-gi; ayi gānọye-kwa-ra gi n’agha ahu.

4 Jehoshafat we si eze Israel, Biko, buru uzọ ju ase okwu Jehova.

5 Eze Israel we chikọta ndi-amuma, bú nnù ndikom, si ha, Àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu #m’gārapu? Ha we si, Rigo; Chineke gēnye kwa ya n’aka eze.

6 Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ n’ebe a tiyere ndia, ka ayi we jua ase n’aka-ya?

7 Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n’aka-ya: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n’ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama nke ihe ọjọ ubọchi-ya nile: onye ahu bu Maikaia nwa Imla. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a.

8 Eze Israel we kpọ otù onye nēje ozi, si, Me ka Maikaia nwa Imla bia ọsọsọ.

9 Ma eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, nānọkwasi, nwoke ọ bula n’oche-eze-ya, yiri uwe-ha, ha we nọdu n’ebe-nzọcha-ọka n’oghere ọnu-uzọ-ama Sameria; ndi-amuma nile nēbu kwa amuma n’iru ha.

10 Zedakaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia.

11 Ndi-amuma nile nēbu kwa amuma otú a, si, Rigorue Remot-gilead, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma: Jehova enyewo kwa ya n’aka eze.

12 Ma onye-ozi ahu nke jere ikpọ Maikaia gwara ya okwu, si, Le, okwu nile nke ndi-amuma, dika otù ọnu, nēkwuru eze ezi ihe: biko, ka okwu-gi di kwa ka okwu otù onye nime ha, gi kwu kwa ezi ihe.

13 Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n’ezie ihe Chinekem gāsi, nke ahu ka m’gēkwu.

14 O we biakute eze, eze we si ya, Maikaia, àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu #m’gārapu? Ọ si, Rigonu, ka ihe ga-kwa-ra unu nke-ọma; agēnye kwa ha n’aka-unu.

15 Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n’aha Jehova?

16 Ọ si, Ahurum Israel nile ka ha b͕asaworo n’ugwu, dika ìgwè aturu nēnweghi onye-ọzùzù: Jehova we si, Ọ dighi onye nwe ndia; ka ha laghachi, nwoke ọ bula n’ulo-ya n’udo.

17 Eze Israel we si Jehoshafat, Àsighm i na ọ gaghi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama nke ihe ọjọ?

18 Ọ si, N’ihi nka nurunu okwu Jehova: ahurum Jehova ka Ọ nānọkwasi n’oche-eze-Ya, na usu-ndi-agha nke elu-igwe nile ka ha nēguzo n’aka-nri-Ya na n’aka-ekpe-Ya.

19 Jehova we si. Ònye gārafu Ehab, bú eze Israel, ka o we rigo, da na Remot-gilead? Otù onye nke nēkwu okwu we si otú a, onye ọzọ nke nēkwu okwu si kwa otú a.

20 Mọ ahu we puta, guzo n’iru Jehova, si, Mu onwem gārafu ya. Jehova we si ya, Gini ka i gēji?

21 Ọ si, M’gāpu, buru mọ okwu-ugha n’ọnu ndi-amuma-ya nile. Ọ si, I gārafu ya, i gēnwe kwa ike: pua, me otú a.

22 Ma ub͕u a, le, Jehova etiyewo mọ okwu-ugha n’ọnu ndi-amuma-gi ndia; Jehova ekwuwo kwa ihe ọjọ bayere gi.

23 Zedekaia nwa Keneana we biarue nso, tie Maikaia aka na ǹtì, si, Òle uzọ Mọ Jehova siri n’ebe m’nọ gabiga igwa gi okwu?

24 Maikaia we si, Le, i ganāhu n’ubọchi ahu, mb͕e i gābà n’ime-ulo nke di n’ime-ulo izo onwe-gi.

25 Eze Israel we si, Kurunu Maikaia, me ka ọ laghachikuru Emon, bú onye-isi obodo, laghachikuru kwa Joash, bú nwa eze,

26 unu gāsi kwa, Otú a ka eze siri, Tiyenu onye a n’ulo-nkpọrọ, me ka o rie nri nmeb͕u, ṅu kwa miri nmeb͕u, rue mb͕e m’gālaghachi n’udo.

27 Maikaia we si, Ọ buru na i laghachi ma-ọli n’udo, Jehova ekwughi okwu n’ọnum. Ọ si, Nurunu, ndi nile n’uwa, unu nile.

28 Eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, we rigorue Remot-gilead.

29 Eze Israel we si Jehoshafat, M’gēnwoghari onwem, ba n’agha; ma gi onwe-gi yikwasi uwe-gi. Eze Israel we nwogharia onwe-ya; ha we ba n’agha.

30 Ma eze Siria nyere ndi-isi ub͕ọ-ala o nwere iwu, si, Unu ebusola onye ntà ma-ọbu onye uku agha, kama ọ bu eze Israel, nání ya.

31 O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, Eze Israel ka ọ bu. Ha we chigharia ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu, Jehova we yere ya aka; Chineke we kpalie ha isi n’ebe ọ nọ pua.

32 O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru na ọ bughi eze Israel, ha we si n’iso ya laghachi.

33 Ma otù nwoke dọrọ uta-ya nāmaghi onye ọ bu, we b͕ata eze Israel n’etiti njikọ ihe-agha-ya na uwe-agha-ya: o we si onye-ub͕ọ-ala-ya, Chigharia aka-gi, me ka m’si n’ọmuma-ulo-ikwū pua; n’ihi na ọria nāriam.

34 Agha we la elu n’ubọchi ahu: eze Israel we guzogide onwe-ya n’ub͕ọ-ala-ya imegide Siria rue anyasi: ọ we nwua mb͕e anyanwu nāda.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 19

1 Jehoshafat, bú eze Juda, we laghachi n’ulo-ya n’udo, rue Jerusalem.

2 Jihu nwa Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, we pua izute ya, ọ si eze, bú Jehoshafat, Ò kwesiri gi iyere onye nēmebi iwu aka? ọ̀ bu kwa ndi nākpọ Jehova asì ka i nāhu n’anya? ma n’ihi ihe a iwe dikwasi gi site n’iru Jehova.

3 Otú ọ di, achọtawo ezi ihe n’aka-gi, n’ihi na i mewo ka Asherot si n’ala nka gabiga, i we dozie obi-gi ichọ Chineke.

4 Jehoshafat we biri na Jerusalem: o we jeghachi pua jegharia n’etiti ndi-ya site na Bia-sheba rue ugwu Efraim, me ka ha laghachikute Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.

5 O we guzo ndi-ikpe n’ala-ya n’obodo nile ewusiri ike nke Juda, n’obodo n’obodo,

6 ọ si ndi-ikpe, Lenu ihe unu onwe-unu nēme: n’ihi na ọ bughi madu ka unu nēkpere ikpe, kama ọ bu Jehova; Ọ nọye-kwa-ra unu n’okwu ikpe-unu.

7 Ma ub͕u a ka oké egwu Jehova dikwasi unu; lezienu anya, me ya: n’ihi na ọ dighi ajọ omume, ma-ọbu ihu-madu-iru-ọma, ma-ọbu inara-ihe-iri-ngo, di nime Jehova, bú Chineke-ayi.

8 Ọzọ kwa, nime Jerusalem ka Jehoshafat guzoro ufọdu nime ndi Livai na ndi-nchu-àjà, na ufọdu nime ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, ikpe ikpe Jehova, na idozi ise-okwu. Ha we laghachi na Jerusalem.

9 O nye ha iwu, si, Otú a ka unu gēme n’egwu Jehova, na n’ikwesi-ntukwasi-obi, na n’obi zuru okè.

10 Ma mb͕e ise-okwu ọ bula gēru unu nti site n’umu-nne-unu ndi bi n’obodo-ha, n’etiti ọbara na ọbara, n’etiti iwu na ihe enyere n’iwu, na ukpuru na ikpé, unu gēme kwa ka ha ghọta, ka ikpe we ghara ima ha n’ebe Jehova nọ, iwe ewe dikwasi unu, dikwasi kwa umu-nne-unu: otú a ka unu gēme, ikpe agaghi-ama kwa unu.

11 Ma, le, Amaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, bu onye-isi-unu n’okwu ọ bula nke Jehova; Zebadaia nwa Ishmael, bú onye-ndú ulo Juda, bu onye-isi-unu n’okwu ọ bula nke eze: ndi Livai gābu kwa ndi-odozi-okwu n’iru unu. Dinu ike, me; ka Jehova nọye-kwa-ra ezi madu.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 20

1 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na umu Moab, na umu Amon, ha na ufọdu site na ndi ọzọ, biara imegide Jehoshafat n’agha.

2 Madu ufọdu we bia gosi Jehoshafat, si, Ìgwè madu bara uba esiwo n’ofè oké osimiri, site na Siria, bia imegide gi; ma, le, ha nọ nime Hazazon-tema (nke bu En-gedi).

3 Jehoshafat we tua egwu, che iru-ya ichọ Jehova; o we kpọsa obubu-ọnu na Juda nile.

4 Juda we chikọta onwe-ha ichọ iye-aka site n’aka Jehova: ọbuná site n’obodo nile nke Juda ka ha biara ichọsi Jehova ike.

5 Jehoshafat we guzo nime nkpọkọta Juda na Jerusalem, n’ulo Jehova, n’iru ogige ọhu;

6 ọ si, Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, ọ̀ bughi Gi onwe-gi bu Chineke n’elu-igwe? ọ̀ bughi Gi onwe-gi nāchi kwa ala-eze nile nke mba nile? ọ bu kwa n’aka-Gi ka ume na idi-ike di, ọ dighi kwa onye gēguzo onwe-ya n’ebe I nọ.

7 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke-ayi, napuru ndi bi n’ala nka ala-ha n’iru ndi-Gi, bú Israel, were ya nye nkpuru Abraham, bú onye nāhu Gi n’anya, rue mb͕e ebighi-ebi?

8 Ha we biri nime ya, wuere Gi ebe nsọ nime ya nye aha-Gi, si,

9 Ọ buru na ihe ọjọ abiakwasi ayi, bú mma-agha ikpé, ma-ọbu ajọ ọria nēfe efe, ma-ọbu oké unwu, ayi gēguzo n’iru ulo a, na n’iru Gi, (n’ihi na aha-Gi di n’ulo a,) si na nkpab͕u-ayi tikue Gi, I gānu kwa, zọputa.

10 Ma ub͕u a, le, umu Amon na Moab na ugwu Sia, ndi I nēkweghi Israel ka ha bakuru ha, mb͕e ha nēsi n’ala Ijipt bia, kama ha si n’ebe ha nọ wezuga onwe-ha, ha ekpochapughi kwa ha;

11 ma, le, otú ndi ahu nēnyeghachi ayi, n’ibia ichupu ayi n’ihe-nnweta-Gi, nke I meworo ka ayi nweta.

12 Chineke-ayi, Ì gaghi-ekpe ha ikpe? n’ihi na ike adighi nime ayi n’iru ìgwè madu a bara uba nke nābia imegide ayi; ayi onwe-ayi amaghi kwa ihe ayi gēme: kama ọ bu Gi ka anya-ayi nādikwasi.

13 Juda nile nēguzo kwa n’iru Jehova, ha na umu-ntakiri-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha.

14 Ma Mọ Jehova dikwasiri Jahaziel nwa Zekaraia, nwa Benaia, nwa Jeiel, nwa Matanaia, bú onye Livai, onye sitere n’umu Esaf, n’etiti nkpọkọta ahu;

15 ọ si, Ṅanu nti, Juda nile, na ndi bi na Jerualem, na eze-ayi, bú Jehoshafat, otú a ka Jehova siri unu, Unu onwe-unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ n’iru ìgwè madu a bara uba; n’ihi na ọ bughi unu nwe agha nka, kama ọ bu Chineke nwe.

16 Echi ridanu imegide ha: le, ha nārigo n’uzọ-nrigo Ziz; unu gāchọta kwa ha na nsọtu ndagwurugwu, n’iru ọzara Jeruel.

17 Ọ bughi unu gēnwe ibu agha n’agha nka: guzonu onwe-unu, guzo, hu nzọputa Jehova n’etiti unu, Juda na Jerusalem: unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ: echi pukurunu ha; Jehova nọye-kwa-ra unu.

18 Jehoshafat we rube isi kpuchie iru-ya n’ala: Juda nile na ndi bi na Jerusalem da-kwa-ra n’ala n’iru Jehova, ikpọ isi ala nye Jehova.

19 Ndi Livai, bú ndi sitere n’umu ndi Kohat na ndi sitere n’umu ndi Kora, we bilie ito Jehova, bú Chineke Israel, n’olu di uku ri nne.

20 Ha we bilie n’isi-ututu, pua ba n’ọzara Tekoa: ma mb͕e ha nāpu, Jehoshafat guzoro, si, Nurunum, Juda, na ndi bi na Jerusalem; kwerenu na Jehova, bú Chineke-unu, unu gēkwesi kwa ntukwasi-obi; kwerenu na ndi-amuma-Ya, ihe gāga-kwa-ra unu nke-ọma.

21 O we me ka ndi-ya dua ya ọdu, o we guzo ndi nābùku Jehova abù, ndi nēto kwa ima-nma nke idi-nsọ, mb͕e ha nāpu n’obodo n’iru ndi ejikere agha, si, Kelenu Jehova; n’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

22 Ma na mb͕e ha malitere iti nkpu na ito otuto, Jehova tiyere ndi nēru nbì imegide umu Amon na Moab na ugwu Sia, bu ndi nābakuru Juda; ewe tib͕ue ha.

23 Umu Amon na Moab we guzo imegide ndi bi n’ugwu Sia, iwezuga ha ka ebibie ha na ikpochapu ha: mb͕e ha mere ka ndi bi na Sia gwusia, ha we yere onwe-ha aka, nwoke na ibe-ya, ibibi onwe-ha.

24 Juda we biarue ulo-nche, rue ọzara, ha we le ìgwè madu ahu anya; ma, le, ha bu ozu ozu daworo n’ala, ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu.

25 Jehoshafat na ndi-ya we bia iluta ihe-nkwata-ha n’agha, ha we hu n’etiti ha ma àkù ma ozu ma ihe di oké ọnu-ahia n’uba, ha we napusia onwe-ha ihe, kari nke ha nwere ike ibū: ha we nọ ubọchi atọ nāluta ihe-nkwata n’agha, n’ihi na ihe bara uba ka ọ bu.

26 Ma n’ubọchi nke-anọ ha kpọkọtara onwe-ha na ndagwurugwu Beraka; n’ihi na n’ebe ahu ka ha gọziri Jehova: n’ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu, Ndagwurugwu Bekara, rue ta.

27 Ha we lata, nwoke ọ bula nke Juda na Jerusalem, Jehoshafat nāga kwa n’iru ha, iwere ọṅù lata na Jerusalem; n’ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu n’iru ndi-iro-ha.

28 Ha we chiri une, na ubọ-akwara, na opì, biarue Jerusalem rue ulo Jehova.

29 Oké egwu Chineke we dikwasi ala-eze nile nke ala nile ọzọ, mb͕e ha nuru na Jehova busoro ndi-iro Israel agha.

30 Ala-eze Jehoshafat we di jū: n’ihi na Chineke-ya mere ka o zuru ike buruburu.

31 Jehoshafat we buru eze Juda: ọ b͕ara orú arọ na iri na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na ise nime Jerusalem: aha nne-ya bu Azuba nwa-nwayi Shilhi.

32 O jere ije n’uzọ Esa nna-ya, o sighi kwa nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n’anya Jehova.

33 Nání na ewezugaghi ebe di elu; ma rue ub͕u a ndi Juda edozighi obi-ha nye Chineke nke ndi bu nna-ha.

34 Ma ihe nile Jehoshafat mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n’akwukwọ ihe emere nke Jihu nwa Hanani, onye etiyere aha-ya n’akwukwọ ndi-eze Israel.

35 Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Jehoshafat, bú eze Juda, jikọrọ onwe-ya na Ehazaia, bú eze Israel; onye ahu nēmebi iwu n’omume-ya:

36 o we jikọ onwe-ya na ya ime ub͕ọ ijeru Tashish: ha we me ub͕ọ ahu n’Ezion-geba.

37 Elieza nwa Dodavahu nke Marisha we bu amuma megide Jehoshafat, si, N’ihi na i jikọrọ onwe-gi na Ehazaia, Jehova etipúwo ihe i mere. Ewe tiwa ub͕ọ ahu nile, ha enweghi kwa ike ijeru Tashish.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 21

1 Jehoshafat we so nna-ya-hà dina n’ọnwu, elìe ya n’ebe elìri nna-ya-hà n’obodo Devid: Jehoram nwa-ya we buru eze n’ọnọdu-ya.

2 O nwe-kwa-ra umu-nne-ndikom, bú umu Jehoshafat, aha-ha bu Azaraia, na Jehiel, na Zekaraia, na Azaraia, na Maikael, na Shefataia: ndia nile bu umu-ndikom Jehoshafat, bú eze Israel.

3 Nna-ha we nye ha ọtutu onyinye, nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ihe di oké ọnu-ahia, ha na obodo ewusiri ike nime Juda: ma ala-eze ka o nyere Jehoram, n’ihi na onye ahu bu ọkpara.

4 Jehoram we bilie ibu onye-isi ala-eze nna-ya, o we me onwe-ya ka ọ di ike, were mma-agha b͕ue umu-nne-ya ndikom nile, ọzọ kwa, o b͕uru ufọdu nime ndi-isi Israel.

5 Orú arọ na iri na abua ka Jehoram b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ asatọ na Jerusalem.

6 O je ije n’uzọ ndi-eze Israel, dika ulo Ehab mere: n’ihi na ọ bu nwa-nwayi Ehab ka ọ nwere na nwunye: o we me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.

7 Ma Jehova ekweghi ibibi ulo Devid, n’ihi ọb͕ub͕a-ndu ahu Ya na Devid mere, dika Ọ si-kwa-ra na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile.

8 N’ubọchi-ya ka Edom siri n’okpuru aka Juda jehie, mere onwe-ha eze.

9 Jehoram we gabiga, ya na ndi-isi-ya, ub͕ọ-ala-ya nile so-kwa-ra ya: o rue na o biliri n’abali, tib͕ue Edom ndi nāb͕a ya buruburu, ha na ndi-isi ub͕ọ-ala.

10 Edom we si n’okpuru aka Juda jehie, rue ta: mb͕e ahu ka Libna siri n’okpuru aka-ya jehie n’otù mb͕e ahu: n’ihi na ọ rapuru Jehova, bú Chineke nke nna-ya-hà.

11 Onye ahu me-kwa-ra ebe di elu n’ugwu nile nke Juda, we me ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, ọ rafu-kwa-ra Juda.

12 Odide-akwukwọ we si n’aka Elaija, bú onye-amuma, biakute ya, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Devid nna-gi, siri, N’ihi na i jeghi ije n’uzọ nile nke Jehoshafat nna-gi, ma-ọbu n’uzọ nile nke Esa, bú eze Juda;

13 kama i jewo ije n’uzọ ndi-eze Israel, me Juda na ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, dika ulo Ehab mere ka akwa iko; ọzọ kwa, umu-nne-gi ndikom, bú ulo nna-gi, ndi di nma kari gi onwe-gi, ka i b͕uworo:

14 le, Jehova nēti ihe-otiti uku n’etiti ndi-gi na n’etiti umu-gi, na n’etiti ndinyom-i, na n’etiti àkù-gi nile:

15 gi onwe-gi kwa, O gēji ọtutu ọria, n’ọria ngiri-afọ-gi, tie gi, rue mb͕e ngiri-afọ-gi gāputa site n’ọria ahu kwa-ubọchi.

16 Jehova we kpọte mọ nke ndi Filistia, na nke Arebia, ndi nọ n’akuku ndi Etiopia, imegide Jehoram:

17 ha we rigo imegide Juda, we tipúe ya, dọta àkù nile ahuru n’ulo eze, na umu-ya ndikom kwa, na ndinyom-ya, n’agha; ọ dighi kwa nwa-nwoke fọduru ya, ọ bu nání Jehoahaz, bú nke-ntà nime umu-ya ndikom.

18 Ma mb͕e ihe nile a gasiri Jehova were ọria nke nādighi ngwọta tie ya na ngiri-afọ-ya.

19 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, ọbuná na mb͕e ọgwugwu arọ abua gasiri, na ngiri-afọ-ya putara n’ọria-ya, o we nwua n’ajọ ọria. Ma ndi-ya esureghi nsure-ọku nye ya dika nsure-ọku nke nna-ya-hà.

20 Orú arọ na iri na abua ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze na Jerusalem arọ asatọ: o we la buru onye anāchọsighi ike ka ọ di ndu; ha we lìe ya n’obodo Devid, ma ọ bughi n’ílì ndi-eze.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 22

1 Ndi bi na Jerusalem we me Ehazaia nwa-ya nke-ntà eze n’ọnọdu ya: n’ihi na usu ndi nāpunara madu ihe, bú ndi soro ndi Arebia ba n’ọmuma-ulo-ikwū, b͕uru ndi nile bu ya okenye. Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, we buru eze.

2 Ọgu arọ abua na abua ka Ehazaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze otù arọ na Jerusalem: ma aha nne-ya bu Atalaia nwa Ọmri.

3 Ya onwe-ya je-kwa-ra ije n’uzọ nile nke ulo Ehab: n’ihi na nne-ya bu onye nādu ya ọdu imebi iwu.

4 O we me ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dika ulo Ehab mere: n’ihi na ndi ahu buru ya ndi nādu ọdu mb͕e ọnwu nna-ya gasiri, iwetara ya nbibi.

5 O jeghari-kwa-ra n’idu-ọdu-ha, we soro Jehoram nwa Ehab, bú eze Israel, ibuso Hazael, bú eze Siria, agha na Remot-gilead: ndi Siria we tib͕ue Joram.

6 O we lata ka agwọ ya nime Jezreel n’ihi ntib͕u nke ha tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Azaraia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Jehoram nwa Ehab nime Jezreel, n’ihi na ọ nāria ọria.

7 Ma o sitere na Chineke, bú nzọda Ehazaia, n’ibiakute Joram: n’ihi na mb͕e ọ biara, o we so Jehoram pukuru Jihu nwa Nimshi, onye Jehova tere manu ibipu ulo Ehab.

8 O rue, mb͕e Jihu nēme ulo Ehab ihe ekpere n’ikpe, na ọ huru ndi-isi Juda, na umu-ndikom nke umu-nne Ehazaia, ndi nējere Ehazaia ozi, o we b͕ue ha.

9 O we chọ Ehazaia, ha we jide ya, (ma onye ahu nēzo onwe-ya nime Sameria,) ha we me ka ọ biakute Jihu, me ka ọ nwua; ha we lìe ya, n’ihi na ha siri, Nwa Jehoshafat ka ọ bu, onye were obi-ya nile chọ Jehova. Ma ulo Ehazaia enweghi onye nwere ike ijide ala-eze.

10 Mb͕e Atalaia, bú nne Ehazaia, huru na nwa-ya nwoke anwuwo, o bilie, me ka nkpuru nile la n’iyì, bú ndi nwe ala-eze ulo Juda.

11 Ma Jehoshabeat, bú nwa-nwayi eze, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n’etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n’ime-ulo nke ihe-ndina. Jehoshabeat nwa-nwayi eze, bú Jehoram, nwunye Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, (n’ihi na nwayi ahu bu nwa-nne Ehazaia,) we zopu ya n’iru Atalaia, o we ghara ime ka ọ nwua.

12 O we nọ n’aka-ha n’ulo Chineke nēzo onwe-ya arọ isi: Atalaia we buru eze ala ahu.

Categories
II. IHE EMERE

II. IHE EMERE 23

1 Ma n’arọ nke-asa Jehoiaba mere onwe-ya ka ọ di ike, o we chita ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, bú Azaraia nwa Jehoram, na Ishmael nwa Jehohanan, na Azaraia nwa Obed, na Maaseia nwa Adaia, na Elishafat nwa Zikri, me ka ya na ha b͕a ndu.

2 Ha we nāga buruburu nime Juda, chikọputa ndi Livai n’obodo nile nke Juda, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, ha we biarue Jerusalem.

3 Nkpọkọta ahu nile na eze we b͕a ndu n’ulo Chineke. Ọ si ha, Le, nwa eze gābu eze, dika Jehova kwuworo bayere umu Devid.

4 Nka bu ihe unu gēme: otù uzọ n’uzọ atọ nime unu, bú ndi nābà nime n’ubọchi-izu-ike, bú nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai, gābu ndi-ọnu-uzọ-ama nke nbata-uzọ nile;

5 otù uzọ n’uzọ atọ gānọ kwa n’ulo eze, otù uzọ n’uzọ atọ kwa n’ọnu-uzọ-ama nke ntọ-ala: ndi Juda nile gānọ kwa n’ogige ulo Jehova nile.

6 Ma ka onye ọ bula ghara ibà n’ulo Jehova, ọ bu nání ndi-nchu-àjà, na ndi n’etiti ndi Livai ndi nēje ozi; ndi ahu gābà, n’ihi na ndi nsọ ka ha bu: ma ndi Juda nile gēdebe ihe-ndebe ulo Jehova.

7 Ndi Livai gānọ kwa eze buruburu, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n’aka-ya; ma onye nābata n’ulo, ka eme ka ọ nwua: unu nọye-kwa-ra eze mb͕e ọ nābà nime, na mb͕e ọ nāpu n’èzí.

8 Ndi Livai na Juda nile we me dika ihe nile si di nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, nyere n’iwu: ha we chiri, nwoke ọ bula ndikom-ya, bú ndi nābà nime n’ubọchi-izu-ike, ha na ndi nāpu apu n’ubọchi-izu-ike; n’ihi na Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, emeghi ka òkè di iche iche pua n’ije-ozi-ha.

9 Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we nye ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise ube, na ọta, na ọta ntà, nke eze, bú Devid, nwereri, nke di n’ulo Chineke.

10 O guzo ndi Juda nile, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n’aka-ya, site n’akuku aka-nri ulo ahu rue akuku aka-ekpe ulo ahu, n’akuku ebe-ichu-àjà na n’akuku ulo, n’akuku eze buruburu.

11 Ha we me ka nwa eze puta, ha we kpube ya okpu-eze, nye ya ihe-àmà, me ya eze: Jehoiada na umu-ya ndikom we te ya manu; ha we si, Ka eze di ndu.

12 Atalaia we nu olu ndi Juda ka ha nāb͕a ọsọ nēto kwa eze, o we biakute ndi ahu n’ulo Jehova:

13 ọ hu, ma, le, eze nēguzo n’akuku ogidi-ya na nbata, ndi-isi na opì-ha di kwa n’akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì; ndi-ọbù-abù ji kwa ihe abù kpọ, ndi nēme ka amara ito otuto nọ kwa. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze.

14 Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we me ka ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise puta, bú ndi-nlekọta usu-ndi-agha, si ha, Menu ka ọ pua ba n’etiti ariri; ma onye nābiaso ya n’azu, ka ewere mma-agha me ka ọ nwua:n’ihi na onye-nchu-àjà siri, Unu emela ka ọ nwua n’ulo Jehova.

15 Ha we doro ya onwe-ha n’akuku abua; o we ba na nbata nke ọnu-uzọ-ama inyinya n’ulo eze: ha we me ka ọ nwua n’ebe ahu.

16 Jehoiada we me ọb͕ub͕a-ndu nke di n’etiti ya na ndi Juda nile na eze, na ha gābu ndi Jehova nwere.

17 Ndi Juda nile we ba n’ulo Beal, kwatue ya, tupia ebe-ichu-àjà-ya nile na onyinyo-ya nile, ha b͕u-kwa-ra Matan, bú onye-nchu-àjà Beal, n’iru ebe-ichu-àjà ahu.

18 Jehoiada we tiye nlekọta nile nke ulo Jehova n’aka ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi Devid kère n’òkè ibu ndi-isi ulo Jehova, isure àjà-nsure-ọku nile nke Jehova, dika edeworo ya n’iwu Moses, n’ọṅù, na n’ibù-abù, site n’aka Devid.

19 O we guzo ndi-ọnu-uzọ-ama n’ọnu-uzọ-ama nile nke ulo Jehova, ka onye ruru árú n’uzọ ọ bula we ghara ibà nime.

20 O we chiri ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi di ike nke-uku, na ndi nāchi achi n’etiti ndi Juda, na ndi nile nke ala ahu, me ka eze si n’ulo Jehova rida: ha we si n’etiti ọnu-uzọ-ama nke di n’elu ba n’ulo eze, me ka eze nọkwasi n’oche-eze nke ala-eze.

21 Ndi nile nke ala ahu we ṅuria ọṅu, obodo ahu di-kwa-ra jū: ha we were mma-agha me ka Atalaia nwua.