Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 13

1 Devid we me ka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise dua ya ọdu, bú onye-ndú ọ bula.

2 Devid we si nkpọkọta nile nke Israel, Ọ buru na ọ di unu nma, ọ buru kwa na o sitere na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi zisara umu-nne-ayi ozi n’ebe nile, bú ndi fọduru n’ala nile nke Israel, ha na ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi bi n’obodo ebe-ita-nri nile ha, ka ha we chikọta onwe-ha n’ebe ayi nọ:

3 ka ayi bughachi kwa ib͕e Chineke-ayi n’ebe ayi nọ: n’ihi na ayi achọghi ya n’ubọchi Sọl.

4 Nkpọkọta ahu nile we si na ha gēme otú a: n’ihi na okwu ahu ziri ezi n’anya ndi Israel nile.

5 Devid we kpọkọta Israel nile, site na Shaihoa nke Egypt we rue nbata Hemat, ime ka ib͕e Chineke si na Kiriat-jearim bia.

6 Devid we rigo, ya na Israel nile, rue Beala, rue Kiriat-jearim, nke Juda nwere, isi n’ebe ahu bugota ib͕e Chineke, bú Jehova, Onye nānọkwasi cherubim, nke akpọkwasiri Aha ahu.

7 Ha we me ka ub͕ọ-ala ọhu būru ib͕e Chineke, ha we buputa ya n’ulo Abinadab: Uza na Ahio we nēdu ub͕ọ-ala ahu.

8 Devid na Israel nile nēwere ike-ha nile gba egwú n’iru Chineke, were kwa abù, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na ájà, na opì.

9 Ha we biarue ebe-nzọcha-ọka Kidon, Uza we setia aka-ya ijide ib͕e ahu; n’ihi na ehi nāb͕a ukwu.

10 Iwe Jehova we di ọku megide Uza, O we tib͕ue ya, n’ihi na o setiri aka-ya metu ib͕e ahu: o we nwua n’ebe ahu n’iru Chineke.

11 Iwe Devid we di ọku, n’ihi na Jehova tiwaputara ntiwa megide Uza: o we kpọ ebe ahu Perez-uza, rue ta.

12 Devid we tua egwu Chineke n’ubọchi ahu, si, M’gēsi aṅa me ka ib͕e Chineke biakutem?

13 Devid ewezugaghi kwa ib͕e ahu nye onwe-ya rue obodo Devid, ma o buzugara ya rue ulo Obed-edom, bú onye Gat.

14 Ib͕e Chineke we nọdu n’ezi-na-ulo Obed-edom n’ulo-ya ọnwa atọ: Jehova we gọzie ulo Obed-edom na ihe nile o nwere.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 14

1 Hairam, bú eze Taia, we zigara Devid ndi-ozi, na osisi cedar, na ndi-ọ̀kà na nkume, na ndi-ọ̀kà n’osisi, iwuru Devid ulo.

2 Devid we mara na Jehova emewo ya ka o guzosie ike ibu eze Israel, n’ihi na ebuliwo ala-eze-ya n’elu n’ihi ndi-Ya, bú Israel.

3 Devid we kuru ndinyom ọzọ nime Jerusalem: Devid we mua umu-ndikom na umu-ndinyom ọzọ.

4 Ndia bu kwa aha umu o nwere na Jerusalem; Shamua, na Shobab, na Netan, na Solomon;

5 na Ibha, na Elishua, na Elpelet;

6 na Noga, na Nefeg, na Jafia;

7 na Elishama, na Beeliada, na Elifelet.

8 Ndi Filistia we nu na etere Devid manu ibu eze Israel nile, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid: Devid we nu ya, we pua n’iru ha.

9 Ma ndi Filistia biara, nọdu na ndagwurugwu Refaim.

10 Devid we jua Chineke ase, si, M’gārigo imegide ndi Filistia? Ì gēnye kwa ha n’akam? Jehova we si ya, Rigo; M’gēnye kwa ha n’aka-gi.

11 Ha we rigorue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n’ebe ahu; Devid we si, Jehova ekwopúwo megide ndi-irom site n’akam, dika nkwopú miri. N’ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim.

12 Ha we rapu chi nile ha n’ebe ahu; Devid we kwue, ewe sure ha n’ọku.

13 Ndi Filistia we nọdu ọzọ na ndagwurugwu ahu.

14 Devid we jua Chineke ase ọzọ; Chineke we si ya, Arigola iso ha: si n’ebe ha nọ ga buruburu, biakute ha na ncherita-iru osisi balsam.

15 Ọ gēru kwa, mb͕e i nuru olu ikiti-ukwu n’elu osisi balsam ahu, mb͕e ahu ka i gāpu ibu agha: n’ihi na Chineke apuwo n’iru gi itib͕u ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia.

16 Devid we me dika Chineke nyere ya iwu: ha we tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia site na Gibeon we rue Gezea.

17 Aha Devid we pua jezue n’ala nile; Jehova we tiye ujọ-ya n’aru mba nile.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 15

1 Devid we mere onwe-ya ulo ufọdu n’obodo Devid; o we doziere ib͕e Chineke ọnọdu, we mara ya ulo-ikwū.

2 Mb͕e ahu Devid siri, Ọ dighi onye gēbu ib͕e Chineke ma-ọbughi ndi Livai: n’ihi na ha ka Jehova rọputaworo ibū ib͕e Chineke, na ijere Ya ozi rue mb͕e ebighi-ebi.

3 Devid we kpọkọta Israel nile ibiaru Jerusalem, ibugota ib͕e Jehova rue ọnọdu-ya, nke o doziri nye ya.

4 Devid we chikọta umu Eron na ndi Livai:

5 nke umu Kohat; Uriel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom isi:

6 nke umu Merari; Asaia, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom iri-na-otù:

7 nke umu Giashom; Joel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom isi na iri:

8 nke umu Elizafan; Shemaia, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom iri:

9 nke umu Hebron; Eliel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom anọ:

10 nke umu Uziel; Aminadab, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom ise na iri na abua.

11 Devid we kpọ Zedok, kpọ kwa Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, kpọ kwa ndi Livai, bú Uriel, na Asaia, na Joel, na Shemaia, na Eliel, na Aminadab,

12 si ha, Unu onwe-unu bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai: donu onwe-unu nsọ, unu onwe-unu na umu-nne-unu, ka unu we bugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel, rue ebe m’doziri nye ya.

13 N’ihi na ọ bughi unu onwe-unu būru ya na mbu, n’ihi ya ka Jehova, bú Chineke-ayi, tiwaputara megide ayi, n’ihi na ayi achọghi Ya dika ikpé-Ya si di.

14 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we do onwe-ha nsọ ibugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel.

15 Umu ndi Livai we were nkpa-n’aka-ya abua būru ib͕e Chineke n’ubu-ha n’elu ha, dika Moses nyere iwu, dika okwu Jehova si di.

16 Devid we si ndi-isi ndi Livai ka ha me umu-nne-ha, bú ndi-ọbù-abù, ka ha guzo chiri ihe abù, bú une, na ubọ-akwara, na ájà, nēme ka anu udà-ha, iweli olu n’elu n’ihi ọṅù.

17 Ndi Livai we guzo Himan nwa Joel; na site n’umu-nne-ya, Esaf nwa Berekaia; na site n’umu Merari, bú umu-nne-ha, Itan nwa Kushaia;

18 tiye-kwa-ra ha umu-nne-ha, bú ndi nke usoro nke-abua, Zekaraia, na Ben, na Jaaziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Benaia, na Maaseia, na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, bú ndi-ọnu-uzọ-ama.

19 Na ndi-ọbù-abù, bú Himan, na Esaf, na Itan, chiri ájà ọla ime ka anu udà-ha;

20 na Zekaraia, na Aziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Maaseia, na Benaia, chiri une nke dabàra n’olu umu-ab͕ọghọ;

21 na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, na Azazaia, chiri ubọ-akwara nke dabàra n’octave, ibu ndi-isi nke ndi-abù.

22 Ma Kenania, bú onye-isi ndi Livai, bu isi n’ibū ibu ahu: ọ dọrọ aka na nti n’ibū ibu ahu, n’ihi na onye nwere nghọta ka ọ bu.

23 Berekaia na Elkena bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu.

24 Shebania, na Joshafat, na Netanel, na Amasai, na Zekaraia, na Benaia, na Elieza, bú ndi-nchu-àjà, nāfù opì n’iru ib͕e Chineke: Obed-edom na Jehia bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu.

25 Devid, na ndi-okenye Israel, na ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, we nēje iwere ọṅù si n’ulo Obed-edom bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova:

26 o rue, mb͕e Chineke yere ndi Livai ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova aka, na ha churu oke-ehi asa na ebulu asa n’àjà.

27 Ewere kwa uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha ke Devid ekike, ya na ndi Livai nile ndi nēbu ib͕e ahu, na ndi-ọbù-abù, na Kenania, bú onye-isi n’ibū ibu ahu tiyere ndi-ọbù-abù: ephod ákwà ọcha di kwa n’aru Devid.

28 Israel nile we were iti-nkpu, were kwa olu opì-ike, chiri kwa opì, na ájà, nēbugota ibe ọb͕ub͕a-ndu Jehova, nēwere une na ubọ-akwara me ka anu udà-ha.

29 O rue, mb͕e ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova biaruru obodo Devid, na Maikal nwa-nwayi Sọl lepuru anya na window, hu eze, bú Devid, ka ọ nāwuli, nēgwu kwa egwú; o we leda ya anya n’obi-ya.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 16

1 Ha we bubata ib͕e Chineke, guzo ya n’etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: ha we weta nso àjà-nsure-ọku na àjà-udo n’iru Chineke.

2 Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n’aha Jehova.

3 Ọ we kesara madu ọ bula n’Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otù ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami.

4 O we tiye ufọdu nime ndi Livai n’iru ib͕e Jehova, bú ndi nēje ozi, ọbuná ime ka echeta na ikele na ito Jehova, bú Chineke Israel:

5 ha bu: Esaf, bú onye-isi, na Zekaraia, bú onye nke-abua ya, na Jeiel, na Shemiramot, na Jehiel, na Matitaia, na Elaiab, na Benaia, na Obede-edom, na Jeiel, chiri une na ubọ-akwara; Esaf nēwere kwa ájà me ka anu udà-ha;

6 Benaia na Jehaziel, bú ndi-nchu-àjà, nāchiri kwa opì mb͕e nile, n’iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke.

7 Mb͕e ahu, n’ubọchi ahu, Devid buru uzọ nye iwu ikele Jehova, site n’aka Esaf na umu-nne-ya.

8 Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya;

Menu ka amara omume-Ya nile n’etiti ndi nile n’uwa.

9 Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma;

Tugharinu uche n’oké ọlu-Ya nile.

10 Nētonu onwe-unu n’aha nsọ Ya:

Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria.

11 Nāchọnu Jehova na ike-Ya;

Chọnu iru-Ya mb͕e nile.

12 Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo;

Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;

13 Unu nkpuru Israel, bú orù-Ya,

Umu Jekob, ndi-Ya arọputara.

14 Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi:

N’uwa nile ka ikpé-Ya nile di.

15 Chetanu ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi ebi,

Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n’iwu;

16 Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara,

Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak;

17 O we me ka o guzoro Jekob ibu ukpuru,

Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi:

18 Si, Gi ka M’gēnye ala Kenean,

Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa:

19 Mb͕e unu bu ndikom ole-na-ole;

E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;

20 Ha we nējeghari si n’otù mba jerue mba ọzọ,

Si n’otù ala-eze jerue ndi ọzọ.

21 O kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha;

O we bara ndi-eze nba n’ihi ha;

22 Si, Unu emetula ndim etere manu aka,

Unu emejo-kwa-la ndi-amumam.

23 Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile;

Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n’otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.

24 Kọsanu akukọ nsọpuru-Ya n’etiti mba nile,

Akukọ oké ọlu-Ya nile n’etiti ndi nile di iche iche.

25 N’ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:

Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu kwa n’elu chi nile.

26 N’ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu:

Ma Jehova mere elu-igwe.

27 Ebube na ima-nma di n’iru Ya:

Ike na ọṅù di n’ebe-Ya.

28 Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche,

Nyenu Jehova nsọpuru na ike.

29 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:

Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bia n’iru Ya:

Kpọnu isi ala nye Jehova n’ima-nma nke idi-nsọ.

30 Ka o nēb͕u unu nb͕u site n’iru Ya, unu elu-uwa nile:

Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n’ọnọdu-ya.

31 Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù;

Ka ha si kwa n’etiti mba nile, Jehova bu eze.

32 Ka oké osimiri bib͕ọ, ya na ùjú-ya;

Ka obi tọ ọhia utọ, ya na ihe nile nke di nime ya;

33 Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù n’iru Jehova,

N’ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe.

34 Kelenu Jehova; n’ihi na Ọ di nma:

N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

35 Si-kwa-nu, Zọputa ayi, Chineke nzọputa-ayi,

Chikọta kwa ayi, naputa ayi n’aka mba nile,

Ikele aha nsọ Gi,

Na inya isi n’otuto-Gi.

36 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu,

Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi.

Ndi Israel nile we si, Amen, ha we to Jehova.

37 O we rapu n’ebe ahu, n’iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, Esaf na umu-nne-ya, ije ozi n’iru ib͕e ahu mb͕e nile, dika ihe ubọchi n’ubọchi-ya si di:

38 na Obed-edom na umu-nne-ha, ọgu ndikom atọ na asatọ; na Obed-edom nwa Jedutun, na Hosa, ibu ndi-ọnu-uzọ-ama:

39 na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, n’iru ebe-obibi Jehova n’ebe di elu nke di na Gibeon,

40 isurere Jehova àjà-nsure-ọku n’elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku mb͕e nile n’ututu na n’anyasi, ọbuná dika ihe nile si di nke edeworo n’iwu Jehova, nke O nyere Israel n’iwu;

41 ha na Himan na Jedutun, na ndi fọduru nime ndi arọputara arọputa, ndi akpọrọ n’aha n’aha, ikele Jehova, n’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di;

42 ha na Himan na Jedutun, ndi chiri opì na ájà inye ndi nēme ka anu udà-ha, chiri kwa ihe abù Chineke: na umu Jedutun, inọ n’ọnu-uzọ-ama.

43 Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n’ulo-ya: Devid we lata igọzi ulo-ya.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 17

1 O rue, mb͕e Devid biri n’ulo-ya, na Devid siri Netan, bú onye-amuma, Le, mu onwem nēbi n’ulo cedar, ma ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova nēbi n’okpuru ákwà-nkwuba.

2 Netan we si Devid, Ihe nile nke di n’obi-gi, me ya; n’ihi na Chineke nọyere gi.

3 O rue, n’abali ahu, na okwu Chineke ruru Netan nti, si,

4 Je, si Devid, bú orùm, Otú a ka Jehova siri, Gi onwe-gi agaghi-ewurum ulo ibu ebe M’gēbi:

5 n’ihi na ebighm n’ulo site n’ubọchi M’mere ka Israel rigota, rue ta; kama esim n’otù ulo-ikwū ba n’ulo-ikwū ọzọ, si kwa n’otù ebe-obibi ba n’ebe-obibi ọzọ.

6 N’ebe nile nke M’nējeghari n’etiti Israel nile, ọ̀ di okwu M’gwara otù nime ndi-ikpe Israel, nke M’nyere iwu izù ndim, si, N’ìhi gini ka unu nēwurughm ulo cedar?

7 Ma ub͕u a otú a ka i gāsi orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Mu onwem siri n’ebe-ita-nri anu-ulo, si kwa n’ebe i nēso ìgwè ewu na aturu, kuru gi, ka i buru onye-ndú ndim, bú Israel:

8 M’we nọyere gi n’ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n’iru gi; M’gēme-kwa-ra gi aha, dika aha ndi uku ndi nọ n’uwa.

9 M’gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otù ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n’ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eme kwa ha ọzọ ka ha nāka nká ngwa ngwa, dika na mbu,

10 na dika site n’ubọchi mb͕e M’nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel: emewokwam ka ndi-iro-gi nile ruru ala. Anamegosi kwa gi na Jehova gēwuru gi ulo.

11 Ọ gēru kwa, mb͕e ubọchi-gi zuru ijeso nna-gi-hà, na M’gēme ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, onye gēsite n’umu-gi ndikom; M’gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.

12 Onye ahu gēwurum ulo, M’gēme kwa ka oche-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.

13 Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa: M’gaghi-ewezuga kwa eberem n’ebe ọ nọ, dika M’wezugara ya n’ebe ọ nọ, bú onye buru gi uzọ:

14 ma M’gēme ka o nēguzo n’ulom na n’ala-ezem rue mb͕e ebighi-ebi: agēme kwa ka oche-eze-ya buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi.

15 Dika okwu ndia nile si di, na dika ọhù a nile si di, otú a ka Netan gwara Devid okwu.

16 Devid, bú eze, we ba, nọdu ala n’iru Jehova; ọ si, Ònye ka m’bu, Jehova, bú Chineke, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m’biarue na mb͕e a?

17 Ma nka bu ihe ntà n’anya-gi, Chineke; I we kwue okwu bayere ulo orù-Gi rue mb͕e di anya, I huwokwam dika ọnọdu nke madu nọ n’elu si di, Jehova, bú Chineke.

18 Gini ka Devid gāgwa kwa Gi ọzọ bayere nsọpuru orù-Gi? n’ihi na Gi onwe-gi mara orù-Gi.

19 Jehova, n’ihi orù-Gi, na dika obi-Gi si di, ka I meworo ihe-idi-uku a nile, ime ka amara ihe uku ndia nile.

20 Jehova, ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi.

21 Ma òle mba di ka ndi-Gi, bú Israel, nke bu otù mba nke nēguzo iche n’uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ibu otù ndi, imere Onwe-gi aha site n’ihe-idi-uku na ihe di egwu, ichupu mba di iche iche n’iru ndi-Gi, ndi I siri n’Ijipt b͕aputa?

22 I we doro Onwe-gi ndi-Gi, bú Israel, ibu otù ndi rue mb͕e ebighi-ebi; Gi onwe-gi, Jehova, we ghọrọ ha Chineke.

23 Ma ub͕u a, Jehova, okwu ahu nke I kwuworo bayere orù-Gi, baye-kwa-ra ulo-ya, ka eme ya ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, Gi me kwa dika I kwuworo.

24 Ka eme kwa ka ọ buru ihe kwesiri ntukwasi-obi, ka aha-Gi di kwa uku rue mb͕e ebighi-ebi, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, bu Chineke Israel nwere: agēme kwa ka ulo Devid, bú orù-Gi, guzosie ike n’iru Gi.

25 N’ihi na Gi onwe-gi, Chinekem, ekpughewo nti orù-Gi, si na I gēwuru ya ulo: n’ihi nka orù-Gi nwetara obi-ike ikpe ekpere n’iru Gi.

26 Ma ub͕u a, Jehova, Gi onwe-gi bu Chineke onwe-ya, I gwawo kwa orù-Gi ezi ihe a:

27 ma ub͕u a I kwerewo igọzi ulo orù-Gi, ka o we dirue mb͕e ebighi-ebi n’iru Gi: n’ihi na Gi onwe-gi, Jehova, agọziwo, o we buru ihe agọziri agọzi rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 18

1 O rue, mb͕e nka gasiri, na Devid tib͕uru ndi Filistia, me kwa ka ha ruru ala, o we nara n’aka ndi Filistia Gat na umu-obodo-ya.

2 O tib͕u-kwa-ra Moab; Moab we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma.

3 Devid tib͕u-kwa-ra Hedareza, bú eze Zoba, rue Hemat, mb͕e o nēje ime ka ike-ya guzo n’akuku osimiri Yufretis.

4 Devid we napu n’aka-ya nnù ub͕ọ-ala abua na ọgu iri, na nnù ndi-inyinya iri-na-asa na ọgu iri, na orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje: Devid bipu-kwa-ra nkwonkwo-ukwu inyinya ub͕ọ-ala nile, ma o kwere ka ọgu inyinya ub͕ọ-ala ise fọdu n’etiti ha.

5 Siria Damaskọs we bia iyere Hedareza, bú eze Zoba, aka, Devid we tib͕ue n’etiti ndi Siria orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise.

6 Devid we tiye ebe-nguzo-ndi-agha nime Siria Damaskọs; Siria we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.

7 Devid we chiri ọta ọla-edo nke dikwasiri ndi-orù Hedareza, chita ha na Jerusalem.

8 Devid we si na Tibhat, si kwa na Kun, bú obodo Hedareza, chiri ọtutu ọla nke-uku, nke Solomon ji me oké osimiri ọla ahu, na ogidi nile, na ihe ọla nile.

9 Tou, bú eze Hemat, we nu na Devid etib͕uwo usu-ndi-agha nile nke Hedareza, bú eze Zoba;

10 o we zìe Hadoram nwa-ya jekuru eze, bú Devid, iju ya ajuju bayere udo-ya, na igọzi ya, n’ihi na o busoworo Hedareza agha, we tib͕ue ya; n’ihi na nwoke nke nēbuso Tou agha nke-uku ka Hedareza bu; ihe nile nke ọla-edo na nke ọla-ọcha na nke ọla di kwa n’aka Hadoram.

11 Ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo ahu nke o butere site na mba nile; site n’Edom, site kwa na Moab, site kwa n’umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n’Amalek.

12 Abishai nwa Zeruaia tib͕u-kwa-ra Edom nime Ndagwurugwu Nnù. orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise.

13 O we tiye ebe-nguzo-ndi-agha n’Edom; Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.

14 Devid we buru eze Israel nile; o we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere m’ikpe na ezi omume.

15 Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta.

16 Zedok nwa Ahaitub, na Abimelek nwa Abaiata, bu ndi-nchu-àjà; Shavsha bu ode-akwukwọ;

17 Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n’aka eze.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 19

1 O rue, mb͕e ihe a gasiri, na Nehash, bú eze umu Amon, nwuru, nwa-ya we buru eze n’ọnọdu ya.

2 Devid we si, M’gēmere Hanun nwa Nehash ebere, n’ihi na nna-ya merem ebere. Devid we ziga ndi-ozi ikasi ya obi bayere nna-ya. Ndi-orù Devid we ba n’ala umu Amon jekuru Hanun, ikasi ya obi.

3 Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, Devid, ọ̀ nāsọpuru nna-gi n’anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa ala-ayi, na ikwatu ya, na iledo ya, ka ndi-orù-ya biakutere gi?

4 Hanun we were ndi-orù Devid, kọpu ha afu-ọnu, bipu kwa uwe-nwuda-ha n’etiti, rue otule-ha, we zilaga ha.

5 Ewe je gosi Devid ihe bayere ndikom ahu. O we ziga izute ha; n’ihi na ihere nēme ndikom ahu nke-uku. Eze we si, Nọdunu na Jeriko rue mb͕e afu-ọnu-unu tolitere, mb͕e ahu ka unu gālata.

6 Umu Amon we hu na ha emewo onwe-ha ka ha nēsi Devid ísì ọjọ, Hanun na umu Amon we ziga nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri igotara onwe-ha ub͕ọ-ala na ndi-inyinya site na Mesọpọtemia, site kwa na Siria Meaka, site kwa na Zoba.

7 Ha we gotara onwe-ha orú nnù ub͕ọ-ala uzọ anọ, na eze Meaka na ndi-ya; ha we bia ma ulo-ikwū-ha n’iru Medeba. Umu Amon si-kwa-ra n’obodo nile ha chikọta onwe-ha, bia ibu agha.

8 Devid we nu ya, ziga Joab, na usu-ndi-agha nile, bú ndi-dike.

9 Umu Amon we puta, do agha n’usoro n’ọnu-uzọ obodo: ma ndi-eze ndi biara nọrọ onwe-ha n’ọhia.

10 Joab we hu na iru agha ahu di megide ya iru na azu, o we rọputa ufọdu n’etiti ndi Israel nile arọputara arọputa, do ha n’usoro izute Siria.

11 O tiye ndi Israel fọduru n’aka Abishai, bú nwa-nne-ya, ha we do onwe-ha n’usoro izute umu Amon.

12 Ọ si, Ọ buru na Siria akariam ike, i gābu-kwa-ram onye-nzọputa: ma ọ buru na umu Amon akaria gi ike, m’gāzọputa kwa gi.

13 Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n’ihi ndi-ayi, na n’ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n’anya-Ya.

14 Joab na ndi soro ya we biarue nso n’iru ndi Siria ibu agha; ha we b͕alaga n’iru ya.

15 Umu Amon we hu na Siria ab͕alagawo, ha onwe-ha we b͕alaga kwa n’iru Abishai nwa-nne-ya, ba n’obodo. Joab we biarue Jerusalem.

16 Siria we hu na etib͕uru ha n’iru Israel, ha we ziga ndi-ozi, me ka Siria ndi nọ n’ofè Osimiri puta, Shofak onye-isi usu-ndi-agha Hedareza je-kwa-ra n’iru ha.

17 Ewe gosi Devid; o we chikọta Israel nile, gabiga Jọdan, biakute ha, do agha n’usoro megide ha. Devid we do ndi-ya n’usoro izute Siria, ha we buso ya agha.

18 Siria we b͕alaga n’iru Israel; Devid we b͕ue n’etiti ndi Siria ndikom nke nnù ub͕ọ-ala iri-na-asa na ọgu iri, na orú nnù ndikom uzọ ise, bú ndi ji ukwu eje, o me-kwa-ra ka Shofak, bú onye-isi usu-ndi-agha-ha, nwua.

19 Ndi-orù Hedareza we hu na etib͕uru ha n’iru Israel, ha we me ka ha onwe-ha na Devid di n’udo, we fè ya òfùfè: Siria ekweghi kwa izọputa umu Amon ọzọ.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 20

1 O rue, na mb͕e ọb͕ub͕a arọ, na mb͕e ndi-eze nāpu ibu agha, na Joab dupuru ndi-dìnkpà nke usu-ndi-agha, bibie ala umu Amon, bia, nọchigide Raba n’agha. Ma Devid nānọdu na Jerusalem. Joab we tib͕ue Raba, kwada kwa ya.

2 Devid we kpupu okpu-eze nke eze-ha n’isi-ya, we hu na o ruru otù talent ọla-edo n’ọtùtù, nkume di okè ọnu-ahia di kwa nime ya; o we di n’isi Devid: o weputa-kwa-ra ihe-nkwata obodo ahu, nke riri nne nke-uku.

3 O me-kwa-ra ka ndi nọ nime ya puta, o do ha n’okpuru mma-nkwọ, na n’okpuru ígwè nēbì ihe, na n’okpuru anyu-ike. Otù a ka Devid nēme kwa obodo nile nke umu Amon. Devid na ndi Israel nile we lata na Jerusalem.

4 O rue, mb͕e ihe a gasiri, na agha biliri na Gezea nke ebusoro ndi Filistia: mb͕e ahu Sibekai onye Husha tib͕uru Sipai, nke sitere n’umu Rafa: ewe me ka ha ruru ala.

5 Agha we di ọzọ ebusoro ndi Filistia; Elhanam nwa Jaia we tib͕ue Lahmi, bú nwa-nne Gọlaiat onye Gat, onye osisi ube-ya di ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà.

6 Agha we di ọzọ na Gat, ma otù nwoke toro ogologo nọ n’ebe ahu, nkpisi aka-ya abua di isi isi, nkpisi ukwu-ya abua di kwa isi isi, ha nile di orú na anọ; ma amu-kwa-ra onye ahu nye Rafa.

7 Ọ ta Israel uta, Jonatan nwa Shimea, bú nwa-nne Devid, we tib͕ue ya.

8 Ndia ka amuru nye Rafa nime Gat; ha we da site n’aka Devid, na site n’aka ndi-orù-ya.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 21

1 Setan we guzo imegide Israel, o we kpalie Devid iguta Israel.

2 Devid we si Joab, si kwa ndi-isi ndi Israel, Jenu, gua Israel ọnu site na Bia-sheba we rue Dan; wetaranum ọnu-ọgugu-ha ka m’we mara ya.

3 Joab we si, Ka Jehova tukwasiri ndi-Ya, ka iba-uba ha bara ra, otù onye ọgu ise otù onye ọgu ise: onye-nwem, bú eze, hà abughi ndi-orù onye-nwem nwere, ha nile? n’ìhi gini ka onye-nwem nāchọ ihe a? n’ìhi gini ka ọ gāghọrọ Israel ihe-ikpe-ọmuma?

4 Ma okwu eze di ike n’ebe Joab nọ. Joab we pua, jegharia n’Israel nile, biarue Jerusalem.

5 Joab we nye Devid ọnu-ọgugu nke ngukọta ọ gukọtara ndi Israel. Israel nile we di orú nnù ndikom ọgu uzọ isi na uzọ iri-na-asa na nnù iri, ndi nāmiputa mma-agha: Juda di kwa orú nnù ndikom ọgu uzọ abua na uzọ iri-na-asatọ na nnù iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha.

6 Ma ọ gukọtaghi Livai na Benjamin n’etiti ha: n’ihi na okwu eze bu ihe-árú n’anya Joab.

7 Ọ we jọ njọ n’anya Chineke bayere okwu a, O we tib͕ue Israel.

8 Devid we si Chineke, Emehiewom nke-uku n’ihe a m’meworo: ma ub͕u a, biko, me ka ajọ omume orù-Gi gabiga; n’ihi na emewom ihe-nzuzu nke-uku.

9 Jehova we gwa Gad, bú onye-ọhu-uzọ nke Devid, okwu, si,

10 Je gwa Devid okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ihe atọ ka Mu onwem nēche n’iru gi; rọputara onwe-gi otù nime ha, ka M’we me gi ya.

11 Gad we biakute Devid, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nara n’onwe-gi otù n’ihe ndia;

12 ma ọ bu oké unwu arọ atọ; ma-ọbu ka ekpochapu gi ọnwa atọ n’iru ndi nākpab͕u gi, ọbuná mma-agha ndi-iro-gi nēru gi aru; ma-ọbu mma-agha Jehova ubọchi atọ, bú ajọ ọria nēfe efe n’ala, mọ-ozi nke Jehova nēbibi kwa n’ókè-ala nile nke Israel. Ma ub͕u a le okwu m’gēweghachiri Onye nēzitem.

13 Devid we si Gad, Anọm na nkpà nke-uku: biko ka m’dabà n’aka Jehova; n’ihi na obi-ebere-Ya bara uba nke-uku: ma ka m’ghara idabà n’aka madu.

14 Jehova we tiye ajọ ọria nēfe efe n’aru Israel: orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise we dapu n’Israel.

15 Chineke we ziga mọ-ozi na Jerusalem ibibi ya: ma mb͕e ọ gaje ibibi, Jehova huru, we chègharia n’ihe ọjọ ahu, we si mọ-ozi ahu nke nēbibi, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nēguzo n’akuku ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.

16 Devid we welie anya-ya, hu mọ-ozi nke Jehova, ka o nēguzo n’etiti ala na elu-igwe, ya na mma-agha-ya amiputara amiputa n’aka-ya, nke esetiri n’elu Jerusalem. Devid na ndi-okenye we kpuru ákwà-nkpe da kpuchie iru-ha n’ala.

17 Devid we si Chineke, Ọ̀ bughi mu onwem siri ka aguta ndi Israel? ọbuná mu onwem ka ọ bu, bú onye mehieworo, me kwa ihe ọjọ nke-uku; ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, Jehova, bú Chinekem, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam; ma ka ọ ghara idigide ndi-Gi, ka etie ha ihe-otiti.

18 Mọ-ozi nke Jehova we si Gad ka ọ si Devid ka Devid rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n’ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.

19 Devid we rigo n’okwu Gad nke o kwuru n’aha Jehova.

20 Ọnan we chigharia, hu mọ-ozi ahu; umu-ya ndikom anọ ndi ya na ha nọ we nēzo onwe-ha. Ma Ọnan nāzọcha ọka wheat.

21 Devid we biakute Ọnan, Ọnan we legide anya, hu Devid, si n’ebe-nzọcha-ọka-ya puta, kpọ isi ala nye Devid, kpuchie iru-ya n’ala.

22 Devid we si Ọnan, Nyem ebe a, bú ebe-nzọcha-ọka nka, ka m’we wuere Jehova ebe-ichu-àjà nime ya: n’ego zuru ezu o ruru ka i gēnyem ya: ka ewe b͕ochie ihe-otiti a n’ebe ndi Israel nọ.

23 Ọnan we si Devid, Were ya n’onwe-gi, ka onye-nwem, bú eze, me kwa ihe di nma n’anya-ya: le, enyewom gi ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka ka ha buru nkú, na ọka wheat ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma; ihe nile ka m’nyeworo.

24 Eze, bú Devid, we si Ọnan, É-è; kama aghaghm izuru ya n’ego zuru ezu o ruru: n’ihi na m’gaghi-ewere ihe i nwere ichuru Jehova àjà, m’gaghi-esure kwa àjà-nsure-ọku nke m’nētiyeghi ego ọ bula.

25 Devid we nye Ọnan nnù shekel ọla-edo na ọgu iri n’ọtùtù iji zuru ebe ahu.

26 Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n’ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo, kpọkue Jehova; Ọ we were ọku si n’elu-igwe za ya n’elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.

27 Jehova we gwa mọ-ozi ahu; o we mighachi mma-agha-ya n’ọbọ-ya.

28 Na mb͕e ahu, mb͕e Devid huru na Jehova zara ya n’ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus, o we chua àjà n’ebe ahu.

29 Ma ebe-obibi Jehova, nke Moses mere n’ọzara, na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, di n’ebe di elu nime Gibeon na mb͕e ahu.

30 Ma Devid apughi ije n’iru ya iju Chineke ase: n’ihi na ọ turu egwu nke-uku n’ihi mma-agha mọ-ozi nke Jehova.

Categories
I. IHE EMERE

I. IHE EMERE 22

1 Devid we si, Nka bu ulo Jehova, bú Chineke, nka bu-kwa-ra Israel ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.

2 Devid we si ka achikọta ndi-ọbìa ndi nọ n’ala Israel; o we guzo ndi nāwa nkume iwa nkume awaputara awaputa iwu ulo Chineke.

3 Devid dozi-kwa-ra ígwè riri nne ikpuru ibo ọnu-uzọ-ama nile ǹtú, na ikpu ihe-njikọta nile; na ọla riri nne nke anātùghi atù;

4 na osisi cedar nādighi ọnu-ọgugu: n’ihi na ndi Zaidon na ndi Taia butere osisi cedar riri nne nye Devid.

5 Devid we si, Solomon nwam bu nwata di kwa nrò, ma ulo ahu agēwuru Jehova, aghaghi ime ya ka ọ di uku kachasi ulo nile, ibu aha na ibu ihe mara nma diri ala nile: biko, ka m’doziere ya. Devid we dozie ri nne tutu ọ nwua.

6 O we kpọ Solomon, bú nwa-ya, nye ya iwu iwuru Jehova, bú Chineke Israel, ulo.

7 Devid we si Solomon nwa-ya, Mu onwem, ọ di n’obim iwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo.

8 Okwu Jehova we ruem nti, si, I wusiwo ọbara ri nne, i buwo kwa agha uku di iche iche: i gaghi-ewuru aham ulo, n’ihi na i wusiwo ọtutu ọbara n’uwa n’irum:

9 le, agāmuru gi nwa-nwoke, onye ahu gābu nwoke izu-ike; M’gēme kwa ka o zuru ike pua n’aka ndi-iro-ya nile buruburu: n’ihi na Solomon ka aha-ya gābu, M’gēnye kwa Israel udo na idi-jū n’ubọchi-ya:

10 onye ahu gēwuru aham ulo; ya onwe-ya gāburum nwa, Mu onwem gābu-kwa-ra ya nna; M’gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike n’elu Israel rue mb͕e ebighi-ebi.

11 Ub͕u a, nwam, ka Jehova nọyere gi; gi nwe kwa uche, wue ulo Jehova, bú Chineke-gi, dika O kwuworo bayere gi.

12 Nání Jehova nye gi ezi uche na nghọta, nye gi iwu bayere Israel; ọbuná idebe iwu Jehova, bú Chineke-gi.

13 Mb͕e ahu ka i gēnwe uche, ọ buru na i lezie anya ime ukpuru nile na ikpé nile nke Jehova nyere Moses n’iwu bayere Israel: di ike, nwe kwa ume; atula egwu, atu-kwa-la ujọ.

14 Ma, le, na nwedam edoziworom ulo Jehova ọla-edo orú nnù talent uzọ iri-na-abua na nnù iri, na ọla-ọcha orú nnù talent ọgu uzọ isi na uzọ ise; ma ọla na ígwè enweghi ọtùtù; n’ihi na o riri nne: edoziwokwam osisi na nkume; i gātukwasi kwa ha ihe.

15 Ndi nēje ozi ri-kwa-ra nne n’aka-gi, ndi nāwa nkume na osisi na ndi-ọ̀kà nkume na osisi, na ndi nile mara ihe n’ije-ozi ọ bula;

16 ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla, na ígwè, enweghi ọnu-ogugu; bilie, lua ọlu, ka Jehova nọyere kwa gi.

17 Devid we nye ndi-isi nile nke Israel iwu iyere Solomon nwa-ya aka, si,

18 Jehova, bú Chineke-unu, Ọ̀ nọyeghi unu? Ọ̀ meghi kwa ka unu zuru ike buruburu? n’ihi na Ọ nyewo n’akam ndi bi n’ala; ebudawo kwa ala n’iru Jehova, na n’iru ndi-Ya.

19 Ub͕u a werenu obi-unu na nkpuru-obi-unu nye ichọ Jehova, bú Chineke-unu; bili-kwa-nu, wue ebe nsọ Jehova, bú Chineke, ibubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na ihe nsọ nile nke Chineke, n’ulo nke anēwuru aha Jehova.