Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 14

1 Joab nwa Zeruaia we mara na obi eze di n’ebe Absolom nọ.

2 Joab we ziga ozi na Tekoa, si n’ebe ahu kuta otù nwayi mara ihe, si ya, Biko, me onwe-gi onye nēru újú biko, yiri kwa uwe iru-újú, ete-kwa-la onwe-gi manu, kama di ka nwayi nke nēru újú ọtutu ubọchi ndia n’ihi onye nwuru anwu:

3 i gābakuru kwa eze, gwa ya okwu dika okwu a si di. Joab we tiye okwu n’ọnu-ya.

4 Nwayi Tekoa we gwa eze okwu, da kpue iru-ya n’ala, kpọ isi ala, si, Zọputam eze.

5 Eze we si ya, Gini nēme gi? Ọ si, n’ezie nwayi di-ya nwuru ka m’bu, dim anwuwo kwa.

6 Nwayi nējere gi ozi nwe-kwa-ra umu-ndikom abua, ha abua we lua ọ̀gù n’ọhia, ọ dighi kwa onye-nnaputa n’etiti ha, ma otù onye tib͕uru ibe-ya, me ka ọ nwua.

7 Ma, le, ab͕uru-ha nile ebiliwo megide nwayi nējere gi ozi, ha we si, Nye ayi onye tib͕uru nwa-nne-ya, ka ayi we me ka ọ nwua n’ọnodu ndu nwa-nne-ya onye o b͕uru, ayi gēkpochapu kwa onye-nnweta ahu: ma ha gēmenyu icheku nkem nke fọduru, we ghara idoro dim aha ma-ọbu ndi fọduru n’elu uwa.

8 Eze we si nwayi ahu, La n’ulo-gi, mu onwem gēnye kwa iwu bayere gi.

9 Nwayi Tekoa ahu we si eze, N’isim, onye-nwem, eze, ka ajọ omume a di, na n’isi ulo nnam: ma ka eze na oche-eze-ya buru ndi ikpe nāmaghi.

10 Eze we si, Onye nāgwa gi okwu, me ka ọ biakutem, ọ gaghi-emetu kwa gi aka ọzọ.

11 Nwayi ahu we si, Biko, ka eze cheta Jehova, bú Chineke-gi, ka onye-ọ́bọ̀ ọbara ghara ibibi nke-uku, ka ha we ghara ikpochapu nwam nwoke. Devid we si, Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nwa-gi gāda n’ala.

12 Nwayi ahu we si, Biko, ka nwayi nējere gi ozi gwa onye-nwem, bú eze, okwu. Ọ si, kwue.

13 Nwayi ahu we si, Ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka i chère ihe di otú a megide ndi Chineke? n’ihi na eze nēkwu okwu a dika onye ikpe mara, ebe eze nādighi-eme ka onye nke ya achupuru achupu lata.

14 N’ihi na ayi aghaghi inwu, ayi di kwa ka miri nke anāwusi n’ala, nke anāgaghi-achikọta; ma Chineke ewepughi ndu, kama Ọ nēchè èchìchè, ka onye achupuru achupu we ghara ibu onye achupuru n’ebe Ọ nọ.

15 Ma ub͕u a, ebe m’biaworo igwa eze, bú onye nwem, okwu a, ọ bu n’ihi na ndim emewo ka m’tua egwu; nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka m’gwa eze okwu; eleghi anya eze gēme okwu nke orù-ya nwayi.

16 N’ihi na eze gānu, inaputa orù-ya nwayi n’ọbu-aka nwoke nāchọ ikpochapu mu na nwam nwoke n’otù n’ihe-nketa Chineke.

17 Nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka okwu onye-nwem, bú eze, diri izu-ike: n’ihi na dika mọ-ozi nke Chineke, otú a ka onye-nwem, bú eze, di inu ezi ihe na ihe ọjọ: Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi.

18 Eze we za, si nwayi ahu, Biko, ezonarilam okwu nke mu onwem nāju gi. Nwayi ahu we si, Biko, ka onye-nwem, bú eze, kwue.

19 Eze we si, Àka Joab diyere gi n’ihe a nile? Nwayi ahu we za, si, Ndu nke nkpuru-obi-gi, onye-nwem, bú eze, ọ dighi onye ọ bula nēsi n’ihe ọ bula onye nwem, bú eze, kwuru, che iru n’aka-nri ma-ọbu n’aka-ekpe: n’ihi na orù-gi, bú Joab, ya onwe-ya nyerem iwu, ya onwe-ya tiye-kwa-ra okwu ndia nile n’ọnu nwayi nējere gi ozi:

20 ọ bu ichighari iru okwu a ka Joab, bú orù-gi meworo ihe a: ma onye-nwem bu onye mara ihe, dika amam-ihe nke mọ-ozi nke Chineke, ima ihe nile di n’uwa.

21 Eze we si Joab, Biko, le emewom ihe a: gi je kwa, me ka nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, lata.

22 Joab we da kpue iru-ya n’ala, kpọ isi ala, gọzie eze: Joab we si, Ta ka orù-gi mara na ahutawom amara n’iru-gi, onye-nwem, bú eze, ebe eze meworo okwu orù-ya.

23 Joab we bilie je Geshua, me ka Absalom bia ba na Jerusalem.

24 Eze we si, Ka o chigharia la n’ulo-ya, ma ọ gaghi-ahu irum anya. Absalom we chigharia la n’ulo-ya, ma ọ hughi iru eze.

25 Ma n’Israel nile ọ dighi nwoke mara nma dika Absalom anētò nke-uku: site n’ọbu-ukwu-ya we rue opu-n’isi-ya ọlu adighi n’aru-ya.

26 Ma mb͕e ọ kọpuru isi-ya, (n’ihi na ọ bu n’ogwugwu arọ n’ọgwugwu arọ ka ọ nākọpu ya: n’ihi na agiri-isi di arọ́ n’isi-ya, o we kọpu ya:) o we tua agiri-isi di n’isi-ya ọgu shekel iri, n’ihe-ọtùtù eze.

27 Ewe muara Absalom umu-ndikom atọ, na otù nwa-nwayi, aha-ya bu Tema: onye ahu bu nwayi mara nma ile anya.

28 Absalom we biri na Jerusalem arọ abua zuru ezu; ma ọ hughi iru eze.

29 Absalom we zigara Joab ozi, iziga ya jekuru eze; ma o kweghi ibiakute ya: O we ziga ọzọ nke ub͕ò abua, ma ọ kweghi ibia.

30 O we si ndi-orù-ya, Lenu, òkè ala-ubi Joab di n’akuku alam, o nwe-kwa-ra ọka barley n’ebe ahu: jenu, sue ya ọku. Ndi-orù Absalom we sue òkè ala-ubi ahu ọku.

31 Joab we bilie, biakute Absalom rue ulo-ya, si ya, N’ìhi gini ka ndi-orù-gi suworo òkè ala-ubim ọku?

32 Absalom we si Joab, Le, eziterem i ozi, si, Bia n’ebe a, ka m’ziga kwa gi jekuru eze, si N’ìhi gini ka m’siworo na Geshua bia? ọ gādim nma ma asi na mu onwem anọdu n’ebe ahu rue ub͕u a: ma ub͕u a ka m’hu iru eze; ọ buru kwa na ajọ omume adi nimem, ya me ka m’nwua.

33 Joab we biakute eze, gosi ya: o we kpọ Absalom, o we biakute eze, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ya n’ala n’iru eze: eze we sutu Absalom ọnu.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 15

1 O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom doziri onwe-ya ub͕ọ-ala na inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n’iru ya.

2 Absalom we bilie n’isi-ututu, guzo n’akuku uzọ ọnu-uzọ-ama: o rue, mb͕e nwoke ọ bula nwere okwu nke gēru eze nti ka o we kpe ya, na Absalon kpọro ya, si, Òle obodo gi onwe-gi si bia? Ọ si, Otú nime ebo Israel ka orù-gi si bia.

3 Absalom we si ya, Le, okwu-gi nile di nma, zi kwa ezi; ma ọ dighi onye nēge gi nti site n’ebe eze nọ.

4 Absalom we si, Ònye gēdom onye-ikpe n’ala nka, ka nwoke ọ bula nke nwere okwu ma-ọbu ikpé we biakutem, m’we kpọ ya onye ezi omume!

5 O rue, mb͕e nwoke ọ bula biaruru ya nso ikpọ isi ala nye ya, na o setiri aka-ya, jide ya, sututu ya ọnu.

6 Absalom we mere Israel nile dika okwu a si di, bú ndi biakutere eze ka ekpe ha ikpe: Absalom we zuru obi ndikom Israel n’ori.

7 O rue, n’ọgwugwu ọgu arọ abua, na Absalom siri eze, Biko, ka m’je kwughachi nkwam, nke, m’kwere Jehova, nime Hebron.

8 N’ihi na orù-gi kwere nkwa mb͕e m’biri na Geshua nime Siria, si, Ọ buru na Jehova eme ka m’laghachi na Jerusalem n’ezie, m’gēfè kwa Jehova òfùfè.

9 Eze we si ya, Je n’udo. O we bilie, jerue Hebron.

10 Absalom we ziga ndi-nledo n’ebo nile nke Israel, si, Mb͕e unu nuru olu opì-ike, unu gāsi kwa, Absalom bu eze na Hebron.

11 Ọgu ndikom iri we si na Jerusalem soro Absalom je, bú ndi akpọrọ, ha we nēje n’izu-okè obi-ha; ma ha amaghi ihe ọ bula.

12 Absalom we zipu Ahitofel onye Gailo, bú onye nādu Devid ọdu, n’obodo-ya, bú Gailo mb͕e ọ nāchu àjà. Nkekọta ahu we di ike; ndi Israel nāba kwa uba nēje n’iru n’iru n’aka Absalom.

13 Onye nēgosi ihe we biakute Devid, si, Obi ndikom Israel di iso Absalom n’azu.

14 Devid we si ndi-orù-ya nile, ndi ya na ha nọ na Jerusalem, Bilienu, ka ayi b͕apu; n’ihi na ayi enweghi nb͕apu n’iru Absalom: menu ngwa ije, ka o we ghara ime ngwa rue ayi aru, me ka ihe ọjọ kwagide ayi, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo a.

15 Ndi-orù eze we si eze, Dika ihe nile si di nke onye-nwem, bú eze, garọputa, le, ndi-orù-gi.

16 Eze we pua, ya na ulo-ya nile ndi soro ya n’ukwu n’ukwu. Eze we rapu ndinyom iri, bú ndi-iko-ya nwayi, iche ulo.

17 Eze we pua, ya na ndi-ya nile ndi soro ya n’ukwu n’ukwu; ha we nọdu na Bet-meahak.

18 Ndi-orù-ya nile we nāgabiga n’akuku ya; ndi Keret nile, na ndi Pelet nile, na ndi Gat nile, bú nnù ndikom na ọgu iri ndi siri na Gat bia, soro ya n’ukwu n’ukwu, nāgabiga kwa n’iru eze.

19 Eze we si Itai, bú onye Gat, N’ìhi gini ka gi onwe-gi nēso kwa ayi je? laghachi, soro eze nọdu: n’ihi na onye ala ọzọ ka i bu, onye rapuru ala-ya ka i bu kwa; laghachi n’ebe-gi.

20 nyahuru bu ọbibia-gi, ọ̀ bu ta ka m’gēme gi ka i ṅagharia n’iso ayi je, n’ihi na mu onwem nēje ebe mu onwem nēje? gi laghachi, me kwa ka umu-nne-gi laghachi; ka ebere na ezi-okwu diyere gi.

21 Itai we za eze, si, Jehova nādi ndu, onye-nwem, bú eze, nādi kwa ndu, n’ezie n’ọnọdu ebe onye-nwem, bú eze, gānọ, ma-ọbu inwu ọnwu ma-ọbu idi ndu, n’ezie n’ebe ahu ka orù-gi gānọ kwa.

22 Devid we si Itai, Je gabiga. Itai onye Gat we gabiga, ya na ndikom-ya nile, na umu-ntakiri nile nke di n’aka-ya.

23 Ala ahu nile nākwa ákwá n’oké olu, ndi ahu nile nāgabiga kwa: eze nāgabiga kwa miri-iyi Kidron, ndi-ya nile nāgabiga kwa, n’iru uzọ ọzara.

24 Ma, le, Zedok bia-kwa-ra, ya na ndi Livai nile, nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke; ha we dọba ib͕e Chineke, Abaiata we rigo, rue mb͕e ndi ahu nile siri n’obodo gabigasia.

25 Eze we si Zedok Bughachi ib͕e Chineke n’obodo; o buru na ahutam amara n’iru Jehova, Ọ gēweghachim, me ka m’hu ya na ebe-obibi-Ya:

26 ma ọ buru na Ọ si otú a, Ihe-gi atọghm utọ; lem, Ya mem otú ọ di nma n’anya-Ya.

27 Eze we si Zedok, bú onye-nchu-àjà, Ọ̀ bughi onye-ọhu-uzọ ka i bu? laghachi n’obodo n’udo, unu na Ahimaaz nwa-gi, na Jonatan nwa Abaiata, bú umu-unu abua.

28 Lenu, mu onwem ganānọgide na ngabiga-miri nke ọzara, rue mb͕e okwu gēsi n’ebe unu nọ bia igosim ka ihe si di.

29 Zedok na Abaiata we bughachi ib͕e Chineke na Jerusalem: ha we nọdu n’ebe ahu.

30 Ma Devid nārigo na nrigo ugwu Olive, nārigo nākwa ákwá; ekpuchi-kwa-ra isi-ya, ya onwe-ya nēje kwa b͕ara ukwu efu: ndi nile ndi soro ya je kpuchi-kwa-ra, nwoke ọ bula isi-ya, ha we rigo, nārigo nākwa ákwá.

31 Otú onye we gosi Devid, si, Ahitofel di n’etiti ndi-nkekọta ahu ndi nēso Absalom. Devid we si, Biko, Jehova, me ka idu-ọdu Ahitofel ghọ ihe-nzuzu.

32 O rue, na mb͕e Devid biaruru elu nrigo ahu, ebe ọ nākpọ isi ala nye Jehova, le, Hushai, bú onye-Akait, biara izute ya, ya na uwe-ya adọwara adọwa, na ájá n’elu isi-ya.

33 Devid we si ya, Ọ buru na i sorom gabiga, i gābu-kwa-ram ibu:

34 ma ọ buru na i laghachi n’obodo, we si Absalom, Orù-gi ka m’bu, eze; dika mu onwem bu orù nna-gi na mb͕e gara aga, ub͕u a mu onwem gābu kwa orù-gi: i gēmebi-kwa-ram idu-ọdu Ahitofel.

35 Gi na ha anọghi kwa n’ebe ahu, bú Zedok na Abaiata ndi-nchu-àjà? o gēru kwa, na okwu ọ bula i gānu site n’ulo eze, i gēgosi ya Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà.

36 Le, ha na umu-ha ndikom abua nọ n’ebe ahu, bú Ahimaaz nwa Zedok, na Jonatan nwa Abaiata; site n’aka-ha ka unu gēzite-kwa-ram okwu ọ bula unu gānu.

37 Hushai, bú eyi Devid, we ba n’obodo; Absalom ba-kwa-ra nime Jerusalem.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 16

1 Devid we gabiga elu nrigo nke-ntà, ma, le, Ziba, onye nējere Mefiboshet ozi, zutere ya, chiri inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa, ọgu ob͕e achicha iri di kwa n’elu ha, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu nkpuru mb͕e okpom-ọku ise, na otù karama-akpukpọ manya-vine.

2 Eze we si Ziba, Gina ka i gēji ihe ndia me? Ziba we si, Inyinya-ibu ndia bu ka ndi ulo eze we nọkwasi ha; achicha na nkpuru mb͕e okpom-ọku bu ka umu-okorọbia we rie ha; manya-vine bu ka ndi nāda mbà nọzara we ṅua.

3 Eze we si, Ma òle ebe nwa onye-nwe-gi nọ? Ziba we si eze, Le, ọ nānọ na Jerusalem: n’ihi na ọ siri, Ta ka ulo Israel gēnyeghachim ala-eze nnam.

4 Eze we si Ziba, Le, gi gēnwe ihe nile Mefiboshet nwere. Ziba we si, Anamakpọ isi ala; ka m’huta amara n’iru gi, onye-nwem, bú eze.

5 Eze, bú Devid, we biarute Bahurim, ma, le, otú nwoke nke sitere n’ab͕uru ulo Sọl nēsi n’ebe ahu puta, aha-ya bu Shimai, nwa Gira: ọ nāputa, nākọcha ka ọ nāputa.

6 Ọ tua Devid nkume, tu kwa ndi-orù nile nke eze, bú Devid: ndi Israel nile na ndi-dike nile di kwa n’aka-nri-ya na n’aka-ekpe-ya.

7 Ma otú a ka Shimai siri mb͕e ọ nākọcha, Pua, pua, gi nwoke ọbara na nwoke jọb͕uru onwe-ya:

8 Jehova eweghachiwo n’isi-gi ọbara nile nke ulo Sọl, onye i buworo eze n’ọnọdu ya; Jehova enyewo kwa ala-eze n’aka Absalom, bú nwa-gi: ma, le, n’ihe ọjọ gi ka ejideworo gi, n’ihi na nwoke ọbara ka i bu.

9 Abishai nwa Zeruaia we si eze, N’ìhi gini ka nkita nka nke nwuru anwu nākọcha onye-nwem, bú eze? biko, ka m’gabiga, wezuga isi-ya.

10 Eze we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ umu Zeruaia? mb͕e ọ nākọcha, mb͕e Jehova siwo-kwa-ra ya, Kọcha Devid; ònye gāsi kwa, Gini mere i meworo otú a?

11 Devid we si Abishai, si kwa ndi-orù-ya nile, Le nwam, nke siri n’afọm puta, nāchọ ndum: onye Benjamin nka, ò gēsi kwa aṅa ghara ichọkari ya ub͕u a? ka ọ nọduru onwe-ya, ka ọ kọcha kwa; n’ihi na Jehova siworo ya, Kọcha.

12 Eleghi anya Jehova gēlekwasi nwedam anya, Jehova gēnyeghachikwam ezi ihe n’ọnọnọdu nkọcha-ya ta.

13 Devid na ndikom-ya we je n’uzọ ahu: Shimai nēje kwa n’akuku ugwu na ncherita-iru ya, ọ nēje ije we kọcha, tu kwa nkume na ncherita-iru ya, kpoli kwa ájá.

14 Eze na ndi nile ndi ya na ha yikọrọ je, we biarue Ayefim; o we turu ndu n’ebe ahu.

15 Absalom na ndi nile, bú ndikom Israel, we ba na Jerusalem, Ahitofel so-kwa-ra ya ba.

16 O rue, mb͕e Hushai, bú onye-Akait, bú eyì Devid, biakutere Absalom, na Hushai siri Absalom, Ka eze di ndu, ka eze di ndu.

17 Absalom we si Hushai, Ọ̀ bu nka bu ebere i nēmere eyi-gi? n’ìhi gini ka i nēsoghi eyì-gi je?

18 Hushai we si Absalom, É-è, kama onye Jehova na ndi nka na ndikom nile nke Israel rọputaworo, ya ka m’gādiri, ọ bu kwa n’aka-ya ka m’gēbiri.

19 Ọzọ kwa, ònye ka mu onwem gēfè òfùfè? Ọ̀ bughi n’iru nwa-ya? dika m’fèworo òfùfè n’iru nna-gi, otú a ka m’gābu n’iru gi.

20 Absalom we si Ahitofel, Duanu ọdu n’onwe-unu ihe ayi gēme.

21 Ahitofel we si Absalom, Bakuru ndi-iko nna-gi ndinyom, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo; Israel nile gānu kwa na i nēsi nna-gi ísì ọjọ: aka ndi nile gi na ha nọ gādi kwa ike.

22 Ha we b͕asara Absalom ulo-ikwū n’elu ulo; Absalom we bakuru ndi-iko nna-ya ndinyom n’anya Israel nile.

23 Ọdu Ahitofel, nke ọ duru na mb͕e ahu, di ka agāsi na ajuru ase n’okwu Chineke: otú a ka idu-ọdu nile nke Ahitofel di, ma n’ebe Devid nọ ma n’ebe Absalom nọ.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 17

1 Ahitofel we si Absalom, Biko, ka m’rọputa orú nnù ndikom na nnù iri, bilie, chua Devid n’azu n’abali a:

2 m’gābiakwasi kwa ya mb͕e ike gwuru ya onwe-ya, na mb͕e aka-ya nādighi ike, m’gēme kwa ka ọ ma jijiji: ndi nile ndi ya na ha nọ gāb͕alaga kwa; m’gētib͕u kwa eze, nání ya:

3 m’gēme kwa ka ndi-ya nile laghachikute gi: dika nlaghachi madu nile ka nwoke ahu bu, onye gi onwe-gi nāchọ: ndi Israel nile gānọ n’udi.

4 Okwu ahu ziri ezi n’anya Absalom na n’anya ndi-okenye nile nke Israel.

5 Absalom we si, Biko, kpọ kwa Hushai, bú onye-Akait, ka ayi nuru kwa ihe di kwa n’ọnu ya onwe-ya.

6 Hushai we biakute Absalom, Absalom we gwa ya okwu, si, Dika okwu a si di ka Ahitofel kwuru: àyi gēme ihe o kwuru? ọ buru na ayi agaghi-eme ya, gi onwe-gi kwue.

7 Hushai we si Absalom, Ọdu nke Ahitofel duworo ub͕u a adighi nma.

8 Hushai we si, Gi onwe-gi amawo nna-gi na ndikom-ya, na ndi-dike ka ha bu, ndi nkpuru-obi-ha di ilu ka ha bu kwa, dika bear ab͕abara aka nwa n’ọhia: nna-gi bu kwa nwoke agha, ọ gaghi-esoro kwa ndi-ya nọ ọnọdu abali.

9 Le, ub͕u ya onwe-ya ezowo onwe-ya n’otù olùlù ma-ọbu n’otù nime ọnọdu-ya: o gēru kwa, mb͕e ufọdu nime ha dara na nmalite, na onye ọ bula nānu ya gāsi, Ntib͕u di n’etiti ndi ahu nke nēso Absalom.

10 Onye ahu kwa, ọbuná onye bu dìnkpà, onye obi-ya di ka obi ọdum, ọ gāb͕aze ab͕aze: n’ihi na Israel nile amawo na dike ka nna-gi bu, ndi bu dìnkpà ka ha bu kwa, bú ndi ya na ha nọ.

11 Ma anamadu ọdu ka achikọtasia Israel nile n’ebe i nọ site na Dan we rue Bia-sheba, dika ájá nke di n’akuku oké osimiri n’iba-uba: ka iru-gi nēje kwa n’agha ahu.

12 Ayi gābiakute kwa ya n’otù nime ọnọdu ebe agāchọta ya, ayi onwe-ayi gādakwasi kwa ya dika igirigi nādakwasi n’ala: ayi agaghi-eme kwa ka ọbuná otù onye fọdu n’etiti ya na n’etiti ndikom nile ndi ya na ha nọ.

13 Ma ọ buru na achikọta ya n’otù obodo, agēme kwa ka Israel nile chita udọ̀ n’obodo ahu, ayi gādọ kwa ya rue miri-iyi, rue mb͕e agaghi-ahuta ọbuná otù ajirija nkume n’ebe ahu.

14 Absalom na ndikom nile nke Israel we si, Idu-ọdu Hushai, bú onye-Akait, di nma kari idu-ọdu Ahitofel, Ma Jehova nyere iwu imebi ezi idu-ọdu nke Ahitofel, ka Jehova we me ka ihe ọjọ biakwasi Absalom.

15 Hushai we si Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, Otú a na otú a ka Ahitofel duru Absalom na ndi-okenye Israel ọdu; otú a na otú a ka mu onwem du-kwa-ra.

16 Ma ub͕u a ziganu ngwa ngwa, gosi Devid, si, Anọla ọnọdu abali a n’ala ihe nādighi nke ọzara, kama i ghaghi igabiga; ka aghara iloda eze na ndi nile ndi ya na ha nọ.

17 Ma Jonatan na Ahimaaz nēguzo n’En-rogel; nwayi nēje ozi we je gosi ha; ndi ahu we je gosi eze, bú Devid: n’ihi na ọ gaghi-ekwe me, bú ka ahú ka ha ba n’obodo.

18 Otù nwa-okoro we hu ha, gosi, Absalom: ha abua we je ngwa ngwa, ba n’ulo otù nwoke nime Bahurim, onye nwere olùlù-miri n’ogige-ya; ha we rida n’ebe ahu.

19 Nwayi nwe-ulo we were ihe-nkpuchi-ya b͕asa ya n’ọnu olùlù-miri ahu, tusa ọka asuru asu n’elu ya; ma ọ dighi ihe amara.

20 Ndi-orù Absalom we biakute nwayi ahu n’ulo, si, Òle ebe Ahimaaz na Jonatan nọ? Nwayi ahu we si ha, Ha agabigawo iyi miri. Ha we chọ, ma ha achọtaghi ha, ha we lata na Jerusalem.

21 O rue, mb͕e ha lasiri, na ha siri n’olùlù-miri ahu rigota, je, gosi eze, bú Devid; ha we si Devid, Bilienu, gabiga miri ngwa ngwa; n’ihi na otú a ka Ahitofel duworo ọdu megide unu.

22 Devid we bilie, ya na ndi nile ndi ya na ha nọ, ha we gabiga Jọdan; mb͕e ìhè ututu putara ọ dighi onye fọduru nke nāgabigaghi Jọdan.

23 Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n’ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n’ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n’ílì nna-ya.

24 Ma Devid biaruru Mahanaim. Absalom we gabiga Jọdan, ya onwe-ya na ndikom nile nke Israel tiyere ya.

25 Ma Amasa ka Absalom doro onye-isi usu-ndi-agha n’ọnọdu Joab. Ma Amasa bu nwa otù nwoke, aha-ya bu Itra onye Israel, onye bakuru Abigal nwa-nwayi Nehash, nwa-nne-nwayi nke Zeruaia nne Joab.

26 Israel na Absalom we ma ulo-ikwū-ha n’ala Gilead.

27 O rue, mb͕e Devid biaruru Mahanaim, na Shobi nwa Nehash nke Raba umu Amon, na Makia nwa Amiel nke Lo-deba, na Bazilai onye Gilead nke Rogelim,

28 wetara nso Devid, weta kwa nso ndi ya na ha nọ, ihe-ndina, na ọkwa, na ite nke ọkpu-ite kpuru, na ọka wheat, na ọka barley, na utu ọka, na ọka aṅara aṅa, na akidi, na lentil, na ọka aṅara n’oko,

29 na manu-aṅu, na miri-ara-ehi nke raru araru, na ìgwè ewu na aturu, na cheese nke ìgwè ehi, ka ha rie: n’ihi na ha siri, Agu nāgu ndi nka, ha nāda kwa mbà, akpiri nākpọ kwa ha nku, n’ọzara.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 18

1 Devid we gukọta ndi ya na ha nọ, do ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise ichi ha.

2 Devid we zipu ndi ahu, otù uzọ n’uzọ atọ n’aka Joab, na otù uzọ n’uzọ atọ n’aka Abishai nwa Zeruaia, nwa-nne Joab, na otù uzọ n’uzọ atọ n’aka Itai, bú onye Gat Eze we si ndi-ya, Aghaghm iso unu pua, ọbuná mu onwem.

3 Ndi-ya we si, I gaghāpu: n’ihi na ọ buru na ayi ab͕alaga ab͕alaga, ha agaghi-atukwasi ayi obi: ọ buru kwa na nkera nime ayi anwua, ha agaghi-atukwasi ayi obi: n’ihi na ub͕u a orú nnù ndikom na nnù ise dika ayi di; ma ub͕u a ọ di nma ka i buru ayi onye-iye-aka site n’obodo.

4 Eze we si ha, Ihe di nma n’anya-unu ka m’gēme. Eze we guzo n’akuku ọnu-uzọ-ama, ndi-ya nile we nāpu n’ọgu ise ọgu ise, na nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri.

5 Eze we nye Joab na Abishai na Itai iwu, si, Menu nwayọ n’aru nwa-okorọbia, bú Absalom, n’ihim. Ndi-ya nile nu-kwa-ra mb͕e eze nyere ndi-isi nile iwu bayere Absalom.

6 Ndi-ya we pua je n’ọhia izute Israel: agha ahu we di n’oké ohia Efraim.

7 Ewe tib͕ue ndi Israel n’ebe ahu n’iru ndi-orù Devid, ntib͕u uku we di n’ebe ahu n’ubọchi ahu, bú orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri.

8 Ewe nāb͕asa agha ahu n’ebe ahu n’elu ala ahu nile; oké ọhia ahu we ripia ọtutu madu n’etiti ndi Israel n’ubọchi ahu kari ndi mma-agha ripiara.

9 Absalom we zute ndi-orù Devid. Ma Absalom nānọkwasi n’inyinya mule-ya, inyinya mule ahu we ba n’okpuru alaka tuhiri atuhi nke oké osisi terebinth, isi-ya we kogide n’osisi terebinth ahu, ewe do ya n’etiti elu-igwe na ala; ma inyinya mule ahu nke di n’okpuru ya gabigara.

10 Otù nwoke we hu ya, gosi Joab, si, Le, ahurum Absalom ka ọ kwuru n’osisi terebinth.

11 Joab we si nwoke ahu nke nēgosi ya, Ma, le, i huru ya, ma gini mere i tib͕ughi ya n’ebe ahu rue ala? ọ gābu kwa ọlum inye gi ọla-ọcha iri, na otù ihe-ọkiké.

12 Nwoke ahu we si Joab, Ọ buru kwa na mu onwem ejide n’ọbu-akam nnù ọla-ọcha abua na ọgu iri, ma m’gaghi-eseti akam imegide nwa eze: n’ihi na ọ bu na nti-ayi ka eze nyere gi na Abishai na Itai iwu, si, Lezienu anya bayere nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, onye ọ bula.

13 Ma asi na emem otú a, m’gēme ihe-ugha megide ndum, (ma ọ dighi okwu ọ bula agēzonari eze,) gi onwe-gi gēguzo kwa onwe-gi n’akuku ọzọ.

14 Joab we si, Ọ bughi otú a ka m’ganēche n’iru gi. O we chiri nkpa-n’aka atọ n’aka-ya, dubà ha n’obi Absalom, mb͕e ọ nānọ na ndu n’etiti osisi terebinth.

15 Umu-okorọbiua iri ndi nēbu ihe-agha Joab we b͕a gburugburu, tib͕ue Absalom, me ka o nwua.

16 Joab we fùa opì-ike, ndi Devid we si n’ichu Israel n’azu lata: n’ihi na Joab b͕ochiri ndi ahu.

17 Ha we were Absalom, tubà ya n’olùlù uku n’oké ọhia ahu, me ka oké obo uku nke nkume guzo n’elu ya: Israel nile we b͕alaga, onye ọ bula n’ulo-ikwū-ya

18 Ma Absalom, mb͕e ọ nọ na ndu, o were ogidi nke di na ndagwurugwu eze guzoro onwe-ya: n’ihi na ọ siri, Enweghm nwa-nwoke ime ka echeta aham: o we kpọ ogidi ahu n’aha-ya: ewe kpọ ya ihe-ncheta Absalom, rue ta.

19 Ahimaaz nwa Zedok we si, Biko, ka m’b͕a ọsọ zìe eze ozi ọma, na Jehova ekpeputawo ya n’aka ndi-iro-ya.

20 Joab we si ya, Ọ bughi onye ozi ọma ka i gābu ta, kama i gēzi ozi ọma ubọchi ọzọ: ma ta i gaghi-ezí ozi ọma, n’ihi na nwa eze anwuwo.

21 Joab we si onye Kush, Je gosi eze ihe i huworo. Onye Kush ahu we kpọ isi ala nye Joab, b͕a ọsọ.

22 Ahimaaz nwa Zedok we si kwa Joab ọzọ, Ma otú ọ di, biko, ka m’b͕a ọsọ, mu onwem kwa, n’azu onye Kush. Joab we si, N’ìhi gini kwa ka gi onwe-gi ganāb͕a ọsọ, nwam, ma ọ dighi ozi ọma ahutara gi.

23 Ma otú ọ di, m’gāb͕a ọsọ, ka o kwuru. Ọ si ya, B͕a ọsọ. Ahimaaz we b͕a ọsọ Buruburu-ala, b͕abiga onye Kush ahu.

24 Ma Devid nānọdu n’etiti ọnu-uzọ-ama abua ahu: onye-nche we jerue elu-ulo ọnu-uzọ-ama rue mbidi obodo, we welie anya-ya, hu, ma, le, otù nwoke nāb͕a ọsọ nání ya.

25 Onye-nche we kpọ òkù, gosi eze. Eze we si, Ọ buru na ọ bu nání ya, ozi ọma di n’ọnu-ya. O we bia si-ike, biarue nso.

26 Onye-nche we hu nwoke ọzọ ka ọ nāb͕a ọsọ: onye-nche we kpọ onye nēche ọnu-uzọ òkù, si, le, nwoke ọzọ nāb͕a ọsọ, nání ya. Eze we si, Onye ahu nēzi kwa ozi ọma.

27 Onye-nche we si, Mu onwem nāhu ọb͕ub͕a-ọsọ nke onye mbu, ọ di ka ọb͕ub͕a-ọsọ Ahimaaz nwa Zedok. Eze we si, Ezi nwoke ka onye ahu bu, ọ bu kwa ezi ozi ọma ka ọ nābia izì.

28 Ahimaaz we kpọ òkù, si eze, Udo. Ọ kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n’ala, si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke-gi, bu, Onye mechibidoworo ndikom ahu ndi weliri aka-ha imegide onye-nwem, bú eze.

29 Eze we si, Ùdo diri nwa-okorọbia ahu, bú Absalom: Ahimaaz we si, Ahurum oké ìgwè madu mb͕e Joab zitere orú eze na orù-gi, ma amaghm ihe ọ bu.

30 Eze we si, Chigharia, guzo onwe-gi n’ebe a. O we chigharia, guzo.

31 Ma, le, onye Kush biara; onye Kush we si, Ka ezìe onye-nwem, bú eze, ozi ọma: n’ihi na Jehova ekpeputawo gi ta n’aka ndi nile nēbili imegide gi.

32 Eze we si onye Kush ahu, Ùdo diri nwa-okorọbia ahu, bú Absalom? Onye Kush we si, Ndi-iro onye-nwem, bú eze, na ndi nile ndi biliworo megide gi imejọ gi, ka ha di ka nwa-okorọbia ahu.

33 Eze we ma jijiji nke-uku, rigo rue ulo-elu nke ọnu-uzọ-ama, kwa ákwá: ma otú a ka o siri mb͕e ọ nēje, Nwam Absalom, nwam, nwam Absalom! ọ gādim nọ̄ nma ma asi na mu onwem anwuwo n’ọnọdu gi, Absalom, nwam, nwam!

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 19

1 Ewe gosi Joab, si, Le, eze nākwa ákwá, nēru-kwa-ra Absalom újú.

2 Nzọputa we ghọrọ ndi Devid nile iru-újú n’ubọchi ahu: n’ihi na ndi Devid nuru n’ubọchi ahu, si, Ọ nēwuta eze n’ihi nwa-ya.

3 Ndi Devid we ghèré bà n’obodo n’ubọchi ahu, dika ndi ihere nēme nēghepu mb͕e ha nāb͕alaga n’agha.

4 Ma eze kpuchiri iru-ya, eze we tie nkpu n’oké olu, si, Nwam Absalom, Absalom, nwam, nwam!

5 Joab we bakuru eze n’ulo, si, I mewo ka ihere me iru ndi-orú-gi nile ta, bú ndi nēwepuga ndu-gi, na ndu umu-gi ndikom na nke umu-gi ndinyom, na ndu ndinyom-i, na ndu ndi-iko-gi nwayi, ta;

6 n’ihu ndi nākpọ gi asi n’anya, na n’ikpọ ndi nāhu gi n’anya asi. N’ihi na i gosiwo ta, na ndi-isi na ndi-orù abughi ihe n’anya-gi: n’ihi na amawom, ta, na asi na Absalom adiwo ndu, asi kwa na ayi nile anwuwo ta, mb͕e ahu o gēzi ezi n’anya-gi.

7 Ma ub͕u a bilie, pua, gwa ndi-orù-gi okwu gāba ha n’obi: n’ihi na aṅuwom iyi na Jehova, na ọ dighi otù nwoke gēsoro gi nọ ọnọdu abali a, ma asi na i gaghi-apu: ma nke ahu gājọrọ gi njọ kari ihe ọjọ nile nke biakwasiworo gi site ka i di na nwata rue ub͕u a.

8 Eze we bilie, nọdu n’ọnu-uzọ-ama. Ha we gosi ndi ya nile, si, Le, eze nānọdu n’ọnu-uzọ-ama: ndi ahu nile we bia n’iru eze.

Ma Israel b͕alagara, nwoke o bula n’ulo-ikwū-ya.

9 Ndi Israel nile we nēse okwu n’ebo nile nke Israel, si, Eze naputara ayi n’ọbu-aka ndi-iro-ayi, ya onwe-ya me kwa-ra ka ayi wepuga onwe-ayi n’ọbu-aka ndi Filistia; ma ub͕u a o siwo n’ala b͕alaga n’ihi Absalom.

10 Ma Absalom, onye ayi tere manu ibu isi-ayi, anwuwo n’agha. Ma ub͕u a n’ihi gini ka unu onwe-unu nādighi-ekwu ime ka eze lata?

11 Eze, bú Devid, we zigara Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, ozi, si, Gwanu ndi-okenye Juda okwu, si, N’ìhi gini ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata n’ulo-ya? ma okwu Israel nile abiaruwo eze nti, ime ka ọ lata n’ulo-ya?

12 Umu-nnem ka unu bu, ọkpukpum na anu-arum ka unu bu: n’ìhi gini kwa ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata?

13 Amasa ka unu gāsi kwa, Ọ̀ bughi ọkpukpum na anu-arum ka i bu? Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na i ghọghi onye-isi usu-ndi-agha n’irum ubọchi nile n’ọnọdu Joab.

14 O we me ka obi ndikom nile nke Juda rulata, dika otù nwoke; ha we zigara eze ozi, si, Lata, gi onwe-gi na ndi-orù-gi nile.

15 Eze we lata, bia rue Jọdan. Juda we biarue Gilgal, ije izute eze, ime ka eze gabiga Jọdan.

16 Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke sitere na Bahurim, we me ngwa soro ndikom Juda ridata izute eze, bú Devid.

17 Nnù ndikom abua na ọgu iri so-kwa-ra ya site na Benjamin; Ziba kwa, onye nējere ulo Sọl ozi, ya na umu-ya ndikom iri na ise na orú ndi-orú-ya; ha we jisie ike gabiga Jọdan n’iru eze.

18 Ma ub͕o-nwebiga gabigara iwebiga ndi ulo eze, na ime ihe di nma n’anya-ya. Shimai nwa Gira we da n’iru eze, mb͕e ọ gabigara Jọdan.

19 Ọ si eze, Ka onye-nwem ghara igu ajọ omume nyem, echeta-kwa-la ihe orù-gi mere n’ajọ omume n’ubọchi onye-nwem, bú eze, siri na Jerusalem pua, ka eze we tiye ya n’obi-ya.

20 N’ihi na orù-gi amawo na mu onwem emehiewo: ma, le, abiawom ta, buru ulo nile nke Josef uzọ irida izute onye-nwem, bú eze.

21 Abishai nwa Zeruaia we za, si, Àgaghi-eme ka Shimai nwua n’ihi nka, n’ihi na ọ kọchara onye Jehova etere manu?

22 Devid we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ, umu-ndikom Zeruaia, na unu gāburum onye-nmegide ta? àgēme ka nwoke ọ bula nwua n’Israel ta? n’ihi na ọ̀ bu na amaghm na ta ka mu onwem bu eze Israel?

23 Eze we si Shimai, I gaghi-anwu. Eze we ṅuara ya iyi.

24 Mefiboshet nwa Sọl rida-kwa-ra izute eze; ma o dozighi ukwu-ya, o dozighi kwa afu-ọnu-ya, ọ sughi kwa uwe-ya miri, site n’ubọchi eze jere rue ubọchi mb͕e ọ bia-kwa-ra n’udo.

25 O rue, mb͕e ọ biaruru Jerusalem izute eze, na eze siri ya, N’ìhi gini ka i nēsoghm je, Mefiboshet?

26 Ọ si, Onye-nwem, eze, orùm ghọb͕urum: n’ihi na orù-gi siri, Ka m’jikwara onwem inyinya-ibu, ka m’we nọkwasi ya, soro eze je; n’ihi na orù-gi dara ngwurọ.

27 O we kwulu orù-gi n’ebe onye-nwem, bú eze, nọ; ma onye-nwem, bú eze, di ka onye-ozi Chineke: gi me kwa ihe di nma n’anya-gi.

28 N’ihi na ulo nnam nile abughi ihe ọ bula ma-ọbughi ndi ọnwu n’iru onye-nwem, bú eze: ma i doro orù-gi n’etiti ndi nēri ihe na table nke gi. Ma èzi omume gini ka m’nwere ọzọ itiku eze nkpu ọzọ?

29 Eze we si ya, N’ìhi gini ka i nēkwu okwu bayere okwu-gi nile ọzọ? Asiwom, Gi onwe-gi na Ziba gēkè ubi ahu.

30 Mefiboshet we si eze, E, ya were ihe nile, ebe onye-nwem, bú eze, biaworo n’ulo-ya n’udo.

31 Bazilai, bú onye Gilead, we si na Rogelim rida; o we soro eze gabiga Jọdan, izilaga ya n’ofè Jọdan.

32 Ma Bazilai mere agadi nke-uku, ọ b͕ara ọgu arọ anọ: ya onwe-ya zù-kwa-ra eze mb͕e ọ nānọdu na Mahanaim; n’ihi na oké madu ka ọ bu nke-uku.

33 Eze we si Bazilai, Gi onwe-gi sorom gabiga, m’gāzù kwa gi n’ebe m’nọ na Jerusalem.

34 Bazilai we si eze, Ùbọchi arọ nke ndum di ole, m’gēji soro eze rigorue Jerusalem?

35 Ọgu arọ anọ ka m’b͕ara ta: m’gāmara ihe di iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọ? òrù-gi gāmata utọ ihe m’nēri ma-ọbu nke m’nāṅu? m’gēge nti ọzọ n’olu ndikom nābu abù na ndinyom nābu abù? n’ihi gini kwa ka orù-gi gāburu onye-nwem, bú eze, ibu ọzọ?

36 Dika ihe ntà orù-gi nēso eze gabiga Jọdan: n’ìhi gini kwa ka eze gēnyeghachim ihe-nnyeghachi a?

37 Biko, ka orù-gi laghachi, ka m’we nwua n’obodom, n’akuku ílì nnam na nnem. Ma, le, orù-gi, bú Kimham; ya soro onye-nwem, bú eze, gabiga; gi me-kwa-ra ya ihe di nma n’anya-gi.

38 Eze we si, Kimham gēsom gabiga, mu onwem gēme-kwa-ra ya ihe di nma n’anya-gi: ma ihe ọ bula i gārọputa ka m’mere gi, m’gēmere gi ya.

39 Ndi Devid nile we gabiga Jọdan, eze gabiga-kwa-ra: eze we sutu Bazilai ọnu, gọzie ya: o we laghachi n’ebe-ya.

40 Eze we gabiga rue Gilgal, Kimham so-kwa-ra ya gabiga: ndi nile nke Juda we me ka eze gabiga, ha na nkera ndi Israel.

41 Ma, le, ndikom nile nke Israel nābiakute eze, we si eze, Gini mere umu-nne-ayi, bú ndikom Juda, zupuru gi n’ori, me ka eze na ulo-ya gabiga Jọdan, na ndikom Devid nile tiyere ya?

42 Ndikom nile nke Juda we za ndikom Israel, si, N’ihi eze di ayi nso n’aru: n’ìhi gini kwa ka iwe-unu di ọku bayere ihe a? àyi eriwo ihe si n’aka eze puta ma-ọli? ọ̀ di onyinye-nri ọ bula o wetara ayi?

43 Ndikom Israel we za ndikom Juda, si, Òkè iri ka ayi nwere n’eze, ọzọ kwa, ayi nwere òkè nime Devid kari unu: gini me-kwa-ra unu lelìri ayi anya, ka okwu-ayi ghara ibu uzọ n’ime ka eze-ayi lata? Ma okwu ndikom Juda siri ike kari okwu ndikom Israel.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 20

1 Ma ọ dabatara otù nwoke jọb͕uru onwe-ya inọ n’ebe ahu, aha-ya bu Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin: o we fùa opì-ike, si, Ayi enweghi òkè nime Devid, ayi enweghi kwa ihe-nketa nime nwa Jesi: nwoke ọ bula, ya la n’ulo-ikwū-ya, Israel.

2 Ndikom nile nke Israel we si n’iso Devid rigo, so Sheba nwa Bikri: ma ndikom Juda rapara n’aru eze-ha, site na Jọdan we rue Jerusalem.

3 Devid we biarue ulo-ya na Jerusalem; eze we chiri ndinyom iri ahu, bú ndi-iko-ya, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo, o we tiye ha n’ulo-ndebe, nāzu ha, ma ọ bakurughi ha. Ha we buru ndi emechibidoworo uzọ rue ubọchi ọnwu-ha, nādi ndu dika ndinyom di-ha nwuru.

4 Eze we si Amasa, Kpọkọtaram ndikom Juda n’ubọchi atọ, gi onwe-gi guzo kwa n’ebe a.

5 Amasa we je ikpọkọta Juda: ma ọ nọrọ ọdù kari mb͕e akara àkà nke ọ kaworo ya.

6 Devid we si Abishai, Ub͕u a Sheba nwa Bikri gēmejọ ayi kari Absalom: gi onwe-gi chiri ndi-orù onye-mwe-gi, chua ya n’azu, ka o we ghara ichọtara onwe-ya obodo ufọdu ewusiri ike, we naputa onwe-ya n’anya-ayi.

7 Ndikom Joab we soro ya pua, ha na ndi Keret na ndi Pelet, na ndi-dike nile: ha we si na Jerusalem pua, ichu Sheba nwa Bikri n’azu.

8 Mb͕e ndi ahu nọ n’akuku nkume uku nke di na Gibeon, Amasa biara n’iru ha. Ma ekeworo Joab ihe-ọkiké, uwe-nwuda-ya ka o yikwasiri, ihe-ọkiké di kwa n’elu ya, ya na mma-agha ekekọtara n’úkwù-ya n’ọbọ-ya; ma mb͕e Joab putara mma-agha we dapu.

9 Joab we si Amasa, Ọ̀ bu n’udo ka i nọ, nwa-nnem? Joab we were aka-nri-ya jide Amasa n’afu-ọnu isutu ya ọnu.

10 Ma Amasa elezighi anya na mma-agha nke di n’aka Joab: o we were ya tie ya n’okpuru ọgiriga nke-ise, wusi ngiri-afọ-ya n’ala, ma o tighi kwa ya ọzọ; o we nwua. Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, we chua Sheba nwa Bikri n’azu.

11 Ma otù nwoke n’etiti umu-okorọbia Joab guzoro n’akuku ya, si, Onye ọ bula ihe Joab nātọ utọ, na onye ọ bula diri Devid, ya so Joab n’azu.

12 Ma Amasa nāturu n’ọbara n’etiti uzọ atuliri atuli. Nwoke ahu we hu na ndi Israel nile guzoro, o we bupu Amasa n’uzọ atuliri atuli chigharia n’ọhia, tukwasi uwe n’elu ya, mb͕e ọ huru na onye ọ bula nke biara n’ebe ọ di guzoro.

13 Mb͕e ebupusiri ya n’uzọ atuliri atuli, ndikom nile gabigara iso n’azu Joab, ichu Sheba nwa Bikri n’azu.

14 O we gabiga n’ebo nile nke Israel rue Ebel, na Bet-meaka, na ndi Bia nile: ewe kpọkọta ha, ha we bia so kwa ya n’azu.

15 Ha we bia nọchigide ya n’agha n’Ebel Bet-meaka, wukọta ihe-ntukọba imegide obodo ahu, o we guzo nime ékpè: ndi nile soro Joab nēbibimb͕idi, ime ka ọ da.

16 Otù nwayi nke mara ihe we si n’obodo ahu kpọ òkù, si, Nurunu, nurunu; biko, sinu Joab, Biarue nso n’ebe a, ka m’gwa gi okwu.

17 O we biarue ya nso; nwayi ahu we si, Gì onwe-gi bu Joab? Ọ si, Mu onwem bu ya. Nwayi ahu we si ya, Nuru okwu nile nke orù-gi nwayi. Ọ si Anamanu nọ̄.

18 Nwayi ahu we kwue, si, Ha nēkwu ekwu na mbu, si, Ha aghaghi iju ase n’Ebel: otú a ka ha kwuzu-kwa-ra okwu.

19 Mu onwem bu otù onye nime ndi-udo ndi kwesiri ntukwasi-obi n’Israel: gi onwe-gi nāchọ ime ka otù obodo na otù nne n’Israel nwua: n’ìhi gini ka i gēloda ihe-nketa Jehova?

20 Joab we za, si, Ya burum ihe-árú, ya burum ihe-árú; m’gaghi-eloda ma-ọli, m’gaghi-ebibi kwa ma-ọli.

21 Ọ bughi otú a ka okwu a di: kama otù nwoke nke sitere n’ugwu Efraim, Sheba nwa Bikri bu aha-ya, o weliri aka-ya imegide eze, bú imegide Devid: nyenum ya, nání ya, ka m’si n’obodo a la. Nwayi ahu we si Joab, Le, agātuputara gi isi-ya nime mb͕idi.

22 Nwayi ahu we biakute ndi obodo ahu nile n’amam-ihe-ya. Ha we bipu isi Sheba nwa Bikri, tupuru ya Joab. O we fùa opì-ike, ha we si n’obodo ahu b͕asa, nwoke ọ bula ọ la n’ulo-ikwū-ya. Joab we lata na Jerusalem jekuru eze.

23 Ma Joab bu onye-isi usu-ndi-agha nile nke Israel: Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret, bu kwa onye-isi ndi Pelet:

24 Adoram bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè: Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta:

25 Sheva bu ode-akwukwọ: Zedok na Abaiata bu ndi-nchu-àjà.

26 ọzọ kwa, Ira onye Jaia buru Devid onye-isi n’ije ozi.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 21

1 Oké unwu we di n’ubọchi Devid arọ atọ n’usoro, arọ na arọ; Devid we chọ iru Jehova. Jehova we si, Ọ bu n’ihi Sọl na n’ihi ulo ọbara ya, n’ihi na o mere ka ndi Gibeon nwua.

2 Eze we kpọ ndi Gibeon, si ha; (ma ndi Gibeon, ọ bughi n’umu Israel ka ha sitere, kama ha sitere na ndi-Amorait fọduru; ma umu Israel ṅuru ha iyi: ma Sọl chọrọ itib͕u ha n’ekworo n’ihi umu Israel na Juda:)

3 Devid we si ndi Gibeon, Gini ka m’gēmere unu? gini kwa ka m’gēji kpuchie nmehie, ka unu we gọzie ihe-nketa Jehova?

4 Ndi Gibeon we si ya, Ọ dighi ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo diri ayi n’ebe Sọl nọ, ma-ọbu n’ebe ulo-ya nọ: ọ dighi kwa nwoke ọ bula agēme ka ọ nwuara ayi n’Israel. O we si, Ihe unu onwe-unu nāsi, ihe ahu ka m’gēmere unu.

5 Ha we si eze, Nwoke ahu nke mere ka ayi gwusia, nke zube-kwa-ra imegide ayi, ewe kpochapu ayi ka ayi ghara iguzo onwe-ayi n’ókè-ala ọ bula nke Israel,

6 ka enye ayi ndikom asa sitere n’umu-ya, ayi gākwuba kwa ha nye Jehova nime Gibea Sọl, onye Jehova rọputara. Eze we si, Mu onwem gēnye unu ha.

7 Ma eze nwere ọmiko n’aru Mefiboshet, nwa Jonatan nwa Sọl, n’ihi ọṅuṅu-iyi Jehova nke di n’etiti ha, bú n’etiti Devid na Jonatan nwa Sọl.

8 Eze we chiri umu-ndikom abua nke Rizpa nwa-nwayi Aia, ndi ọ muru Sọl, bú Amoni na Mefiboshet; na umu-ndikom ise nke Maikal nwa-nwayi Sọl, ndi ọ muru Adriel nwa Bazilai onye Mehola:

9 o we nye ha n’aka ndi Gibeon, ha we kwuba ha n’ugwu n’iru Jehova: ha asa we da n’otù: ma emere ka ndi ahu nwua n’ubọchi owuwe-ihe-ubi, n’ubọchi mbu, na nmalite obìbì ọka barley.

10 Rizpa nwa-nwayi Aia we chiri ákwà-nkpe, b͕asara onwe-ya n’elu oké nkume, site na nmalite owuwe-ihe-ubi rue mb͕e esi n’elu-igwe wukwasi ha miri-ozuzo; o kweghi kwa ka anu-ufe nke elu-igwe nọkwasi ha n’ehihie, ma-ọbu anu-ọhia n’abali.

11 Ewe gosi Devid ihe Rizpa nwa Aia, nwayi bu iko Sọl, mere.

12 Devid we je chiri ọkpukpu Sọl na ọkpukpu Jonatan nwa-ya n’aka ndi-nwe Jebesh-gilead, ndi zupuru ha n’amá Bet-shan, ebe ndi Filistia kwubara ha, n’ubọchi ndi Filistia tib͕uru Sọl nime Gilboa:

13 o we si n’ebe ahu chigota ọkpukpu Sọl na ọkpukpu Jonatan nwa-ya; ha chikọta-kwa-ra ọkpukpu ndi akwubara.

14 Ha we lìe ọkpukpu Sọl na Jonatan nwa-ya n’ala Benjamin nime Zela, n’ílì Kish, bú nna-ya: ha we me ihe nile eze nyere n’iwu. Ewe riọta Chineke aririọ bayere ala ahu mb͕e ihe a gasiri.

15 Ma ndi Filistia nwere agha ọzọ ha nēbuso Israel; Devid we rida, ya na ndi-orù-ya, buso ndi Filistia agha; Devid we da #mbà.

16 Ishbi-benob, nke di n’etiti umu Rafa, onye ọtùtù ube-ya di ọgu shekel ọla iri-na-ise n’ọtùtù, ekewo-kwa-ra onye ahu ihe-agha ọhu, o we si na ya gētib͕u Devid.

17 Ma Abishai nwa Zeruaia yere ya aka, tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua. Mb͕e ahu ndikom Devid ṅuru ya iyi, si, I gaghi eso ayi pua ibu agha ọzọ, ka i ghara imenyu oriọna Israel.

18 O rue, mb͕e ihe a gasiri, na agha di kwa ọzọ na Gob nke ebusoro ndi Filistia: mb͕e ahu Sibekai onye Husha tib͕uru Saf, nke di n’etiti umu Rafa.

19 Agha we di ọzọ na Gob ebusoro ndi Filistia; Elhanan nwa Jaare-oregim onye Bet-lehem we tib͕ue nwa-nne Gọlaiat onye Gat, onye osisi ube-ya di ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà.

20 Agha we di ọzọ na Gat, ma otú nwoke toro ogologo nọ n’ebe ahu, nkpisi aka-ya abua di isi isi, nkpisi ukwu-ya abua di kwa isi isi, ọnu-ọgugu-ha di orú na anọ; ma amu-kwa-ra onye ahu nye Rafa.

21 Ọ ta Israel uta, Jonatan nwa Shimai, bú nwa-nne Devid, we tib͕ue ya.

22 Madu anọ ndia ka amuru nye Rafa nime Gat; ha we da site n’aka Devid, na site n’aka ndi-orù-ya.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 22

1 Devid we gwa Jehova okwu nile nke abù a n’ubọchi Jehova naputara ya n’ọbu-aka ndi-iro-ya nile na n’ọbu-aka Sọl:

2 ọ we si,

Jehova bu oké nkumem, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka m’b͕apu, Onye m’nwere;

3 Ọ bu Chineke nke oké nkumem, anamab͕abà nime Ya;

Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum, na ebe-nb͕alagam;

Onye-nzọputam, I nāzọputam n’ihe-ike.

4 Onye-anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova,

Ewe zọputam n’aka ndi-irom.

5 N’ihi na ebili-miri nke ọnwu b͕aram buruburu,

Miri-iyi nile nke jọb͕uru onwe-ya nēme ka m’tua egwu.

6 Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu;

Ọnyà nile nke ọnwu biara n’irum.

7 Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam,

Ọ bu Chinekem ka m’nākpọku:

O we si n’ulo uku Ya nu olum,

Nkpu m’tikuru Ya ba-kwa-ra na nti-Ya abua.

8 Ala we me nkpatu ma kwa jijiji,

Nto-ala nile nke elu-igwe nāma jijiji,

Ewe me ka ha me nkpatu, n’ihi na iwe-Ya di ọku.

9 Anwuru-ọku rigoro n’imi-Ya,

Ọku nēsi kwa n’ọnu-Ya ripia:

Afunwuru icheku site na ya.

10 O rulata-kwa-ra elu-igwe, rida;

Oké ọchichiri di kwa n’okpuru ukwu-Ya abua.

11 O we nọkwasi n’elu cherub dika inyinya, we fere:

Ewe hu Ya n’elu nkù ìfùfè.

12 O we do ọchichiri buruburu Ya ka ọ buru ulo-ntu,

Bú nchikọta miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.

13 Site n’onwunwu nke nēnwu n’iru Ya

Afunwuru icheku ọku.

14 Jehova si n’elu-igwe nāma éb͕è-elu-igwe,

Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa-ka olu-Ya da.

15 O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa;

Àmùmà kwa, O we chusa ha.

16 Ewe hu ebe osimiri si erù,

Anēkpughe ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi,

N’ibasi-nba-ike nke Jehova,

Site n’ume nke iku-ume nke imi-Ya.

17 O si n’elu zìe, kurum,

Dọputam n’ọtutu miri;

18 Ọ nānaputam n’aka onye-irom di ike,

N’aka ndi nākpọm asì; n’ihi na ha nwere ume karim

19 Ha nābia n’irum n’ubọchi nhuju-anyam:

Ma Jehova burum ihe-ndabere.

20 O we me ka m’puta rue ebe sara mbara:

Ọ nādọputam, n’ihi na ihem tọrọ Ya utọ.

21 Jehova nēnyeghachim dika ezi ọmumem si di:

Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka Ọ nēmeghachim ọzọ.

22 N’ihi na edebewo uzọ nile nke Jehova,

Emebighkwam iwu n’ipu n’aka Chinekem.

23 N’ihi na ikpé-Ya nile di n’irum:

Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga onwem n’ebe ha di.

24 M’we zue okè n’ebe Ọ nọ,

Edebe-kwa-ram onwem pua n’ajọ omumem.

25 Jehova we meghachim dika ezi omumem si di;

Dika idi-ọcham n’anya-Ya si di.

26 N’ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere,

N’ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;

27 N’ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha;

Ma n’ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi Onye-nb͕á.

28 I gāzọputa kwa ndi ewedara n’ala:

Ma anya-Gi abua dikwasi ndi di elu, ka I we me ka ha di ala.

29 N’ihi na Gi onwe-gi bu oriọnam, Jehova:

Jehova nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.

30 N’ihi na m’nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe:

Anamesite na Chinekem wubiga mb͕idi.

31 Chineke, uzọ-Ya zuru okè:

Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;

Ọta ka ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.

32 N’ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?

Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?

33 Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku:

Ọ nākwazu kwa uzọm.

34 O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:

N’elu ebem di elu ka Ọ nēguzokwam.

35 O nēzí akam abua ibu agha;

Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.

36 I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:

Ume-ala-n’obi nke Gi nēmekwam ka m’ba uba.

37 I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n’okpurum,

Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.

38 Ka m’chua ndi-irom, we kpochapu ha;

Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.

39 M’we me ka ha gwusia, anamamapú kwa ha, ha agaghi-ebili kwa:

Ha we da n’okpuru ukwum abua.

40 I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:

I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n’okpurum.

41 Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha,

Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.

42 Ha nāgha anya, ma ọ dighi onye nāzọputa ha;

N’ebe Jehova nọ ka ha nāgha anya, ma Ọ zaghi ha.

43 Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala,

Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha.

44 I we me ka m’b͕apu n’ilu-ọ̀gù nile nke ndim;

I nēdebem ka m’buru isi mba nile ọzọ: Ndi m’nāmaghi gēfèm òfùfè.

45 Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n’okpurum:

Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti.

46 Ndi ala ọzọ nāta aru,

Ke onwe-ha ihe-ọkiké, si n’ebe-nmechibido-ha puta.

47 Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa;

Chineke nke oké nkume nzọputam di kwa elu:

48 Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀,

Onye nēme kwa ka ndi di iche iche rida n’okpurum,

49 Onye nēme kwa ka m’si n’aka ndi-irom pua:

I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem:

I nānaputam n’aka madu nēme ihe ike.

50 N’ihi nka ka m’gēkele Gi, Jehova, n’etiti mba ọzọ,

Aha-Gi ka m’gābùku kwa abù ọma.

51 Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku:

Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere,

Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere rue mb͕e ebighi-ebi.

Categories
II. SAMUEL

II. SAMUEL 23

1 Ma ndi a bu okwu ikpe-azu nke Devid.

Ihe nke si n’ọnu Devid nwa Jesi puta,

Na ihe nke si n’ọnu nwoke ahu puta, bú onye emere ka o bilie,

Bayere onye nke Chineke Jekob etere manu,

Na onye nwere olu di utọ n’ibù abù ọma Israel:

2 Mọ nke Jehova kwuru site n’ọnum,

Okwu-Ya di kwa n’irem.

3 Chineke Israel siri,

Mu ka Oké Nkume Israel gwara okwu:

Onye nāchi madu bu onye ezi omume,

Ọ nāchi n’egwu Chineke

4 Ọ di kwa ka ìhè ututu, mb͕e anyanwu nāwa,

Bú ututu igwe-oji nādighi;

Mb͕e ahihia ndu nēpuputa n’ala,

Site n’ọmumu-anyanwu, site na miri-ozuzo.

5 N’ihi na ọ bughi otú a ka ulom di n’ebe Chineke nọ;

N’ihi na ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Ọ b͕aworo nyem,

Bú ọb͕ub͕a-ndu edoworo n’usoro n’ihe nile, nke edebewo-kwa-ra:

N’ihi na nzọputam nile, na ihe-utọ nile,

N’ezie Ọ gaghi-eme ka o pute.

6 Ma ndi jọb͕uru onwe-ha di ka ogwu anēkopu ekopu, ha nile,

N’ihi na ọ bughi aka ka eji ewere ha:

7 Ma nwoke nke nēmetu ha aka

Gēnweju ígwè na osisi ube aka:

Agēwere kwa ọku suresia ha n’ọnọdu-ha.

8 Ndia bu aha ndi-dike, ndi Devid nwere; Josheb-bashebet onye-Tahkemonait, onye-isi nke ndi-ọchi-agha; onye ahu bu Adino onye-Eznait: onye nēmegide nnù ndikom abua eb͕uru n’otù ub͕ò.

9 Nke so ya bu Eleeza nwa Dodai nwa onye Ahoa, bú otù onye n’etiti ndi-dike atọ ahu ndi ha na Devid nọ mb͕e ha rara onwe-ha nye rue ọnwu n’etiti ndi Filistia ndi chikọtara onwe-ha n’ebe ahu ibu agha, ma ndikom Israel rigoro:

10 onye ahu biliri, tib͕u ndi Filistia rue mb͕e ike gwuru aka-ya, aka-ya we rapara na mma-agha: Jehova we zọputa nzọputa uku n’ubọchi ahu; ndi Israel we laghachi soro ya n’azu nání iyipu ihe di n’aru ndi eb͕uru eb͕u.

11 Nke so ya bu Shama nwa Agi onye-Hararait. Ndi Filistia we chikọta onwe-ha n’usu, ma òkè ubi di n’ebe ahu juputara na lentil; ma ndi Israel b͕apuru n’iru ndi Filistia.

12 O we guzo onwe-ya n’etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia: Jehova we zọputa nzọputa uku.

13 Ndikom atọ n’etiti orú ndi-isi na iri ahu we rida, biakute Devid n’owuwe-ihe-ubi rue ọb͕à Adulam; ma usu ndi Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim.

14 Ma Devid nọ n’ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu.

15 Devid we chọsie ike, si, Ònye gēme ka m’ṅua miri sitere n’olùlù-miri Bet-lehem, nke di n’ọnu-uzọ-ama:

16 Ndi-dike atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n’olùlù-miri Bet-lehem, nke di n’ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma o kweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova.

17 Ọ si, Ya burum ihe-árú, Jehova, ime ihe a: #m’gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n’aka-ha nēje? o kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere.

18 Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, nwa Zeruaia, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu. Onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n’etiti ndikom atọ ahu.

19 Àdighi-asọpuru ya kari ndikom atọ ahu? o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu.

20 Benaia kwa, nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n’ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n’etiti olùlù n’ubọchi snow nēzò.

21 Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, bú nwoke mara nma ile anya: ube di kwa n’aka onye Ijipt ahu; ma o ji nkpa-n’aka ridakuru ya, napu ube ahu n’aka onye Ijipt n’ike, were ube-ya b͕ue ya.

22 Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n’etiti ndi-dike atọ ahu.

23 Anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. Devid we do ya ibà n’etiti ndi nānu okwu-ya.

24 Asahel nwa-nne Joab bu otù onye n’etiti orú ndikom na iri ahu; Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem;

25 Shama onye Harod, Elika onye Harod;

26 Hilez onye-Paltait, Ira nwa Ikesh onye Tekoa;

27 Abieza onye Anatot, Mebunai onye Husha;

28 Zalmon onye Ahoa, Maharai onye Netofa;

29 Hileb nwa Beana onye Netofa, Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin;

30 Benaia onye Piraton, Hidai nke miri-iyi Gaash;

31 Abi-albon onye Araba, Azmavet onye Bahurim;

32 Eliahba onye Shaalabin, nke umu Jashen, Jonatan;

33 Shama onye-Hararait, Ahiam nwa Shara onye-Ararait;

34 Elifelet nwa Ahasbai, nwa onye Meakat, Eliam nwa Ahitofel onye Gailo;

35 Hezro onye Kamel, Paarai onye Arab;

36 Igal nwa Netan nke Zoba, Bani onye Gad;

37 Zelek onye Amon, Naharai onye Beirot, onye nēbu ihe-agha Joab nwa Zeruaia;

38 Ira onye Jeta, Gareb onye Jeta;

39 Uraia onye Het: ha nile di orú ndikom na iri na asa.