Categories
JOSHUA

JOSHUA 4

1 O rue, mb͕e mba ahu nile gabigasiri Jọdan, na Jehova gwara Joshua okwu, si,

2 Werenu n’onwe-unu ndikom iri na abua sitere na ndim, otù nwoke otù nwoke n’ebo ọ bula,

3 nye-kwa-nu ha iwu, si, Bupuru onwe-unu n’ebe a, n’etiti Jọdan, n’ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà, nkume iri na abua, bubiga ha n’etiti unu, dọba ha n’ọnọdu-abali ahu, ebe unu gānọ abali ta.

4 Joshua we kpọ ndikom iri na abua ahu, ndi o doziworo site n’umu Israel, otù nwoke otù nwoke site n’ebo ọ bula:

5 Joshua we si ha, Gabiganu n’iru ib͕e Jehova, bú Chineke-unu, rue etiti Jọdan, buliere onwe-unu, nwoke ọ bula otù nkume, tukwasi n’elu ubu-ya, dika ọnu-ọgugu ebo umu Israel si di:

6 ka nka we buru ihe-iriba-ama n’etiti unu, mb͕e umu-unu gāju ajuju n’ọdi-n’iru, si, Gini bu isi nkume ndia n’ebe unu nọ?

7 unu gāsi kwa ha, N’ihi na ebipuru miri Jọdan n’iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova; mb͕e ọ gabigara Jọdan, ebipuru miri Jọdan: nkume ndia gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ncheta rue mb͕e ebighi-ebi.

8 Umu Israel we me otú a, dika Joshua nyere ha iwu, ha we bupu nkume iri na abua n’etiti Jọdan, dika Jehova gwara Joshua okwu, dika ọnu-ọgugu ebo umu Israel si di; ha we bubiga ha n’etiti ha rue ọnọdu-abali-ha, we dọba ha n’ebe ahu.

9 Joshua we guzo nkume iri na abua n’etiti Jọdan, bú ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu: ha we di n’ebe ahu, rue ta.

10 Ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ahu nēguzo kwa n’etiti Jọdan, rue mb͕e emezuru okwu ahu nile nke Jehova nyere Joshua n’iwu igwa ndi Israel, dika ihe ahu nile si di nke Moses nyere Joshua n’iwu: ndi Israel we me ngwa gabiga.

11 O rue, mb͕e ndi Israel nile gabigasiri, na ib͕e Jehova gabigara, ya na ndi-nchu-àjà, n’iru ndi Israel.

12 Umu Reuben, na umu Gad, na nkera ebo Manase, we gabiga n’iru umu Israel, chiri ihe-ekike-agha, dika Moses gwara ha okwu:

13 dika orú nnù uzọ ise, ndi ejikere nke usu-ndi-agha, gabigara n’iru Jehova ibu agha, rue ala ihe nādighi nke Jeriko.

14 N’ubọchi ahu ka Jehova mere Joshua ka ọ di uku n’anya Israel nile; ha we tua egwu ya, dika ha turu egwu Moses, ubọchi nile nke ndu-ya.

15 Jehova we gwa Joshua okwu, si,

16 Nye ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ihe-àmà iwu, ka ha si na Jọdan rigota.

17 Joshua we nye ndi-nchu-àjà iwu, si, Sinu na Jọdan rigota.

18 O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova siri n’etiti Jọdan rigota, mb͕e ndi-nchu-àjà sepuru ọbu-ukwu-ha rue ala-akọrọ, na miri Jọdan laghachiri n’ọnọdu-ya, we ruchie akuku-ya nile, dika na mb͕e gara aga.

19 Ndi Israel we si na Jọdan rigota n’ubọchi nke-iri nke ọnwa mbu, má ulo-ikwū-ha na Gilgal, na nsọtu ọwuwa-anyanwu Jeriko.

20 Nkume iri na abua ahu, nke ha si na Jọdan were, Joshua we guzo ha na Gilgal.

21 Ọ we gwa umu Israel okwu, si, Mb͕e umu-unu gāju ndi bu nna-ha ajuju n’ọdi-n’iru, si, Gini bi isi nkume ndia?

22 Unu gēme kwa ka umu-unu mara, si, N’ala-akọrọ ka Israel gabigara Jọdan nka.

23 N’ihi na Jehova, bú Chineke-unu, mere ka miri Jọdan takọrọ n’iru unu, rue mb͕e unu gabigara, dika Jehova, bú Chineke-unu, mere Oké Osimiri Uhie, nke O mere ka ọ takọrọ n’iru ayi, rue mb͕e ayi gabigara:

24 ka ndi nile nke uwa we mara aka Jehova, na ike ka ọ di; ka ha we tua egwu Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi nile.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 5

1 O rue, mb͕e eze nile nke ndi-Amorait, ndi bi n’ofè Jọdan n’akuku ọdida-anyanwu, na eze nile nke ndi Kenean, ndi bi n’akuku oké osimiri, nuru na Jehova mereri ka miri Jọdan takọrọ n’iru umu Israel, rue mb͕e ayi gabigasiri, na obi lọrọ ha miri, mọ adighi kwa nime ha ọzọ, n’ihi umu Israel.

2 Na mb͕e ahu Jehova siri Joshua, Mere onwe-gi mma ọ́mú, bìe umu Israel úgwù ọzọ nke ub͕ò abua.

3 Joshua we mere onwe-ya mma ọ́mu, bìe umu Israel úgwù na Gibeat-ha-aralot.

4 Nka bu kwa ihe kpatara Joshua ji bìe úgwù: ndi Israel nile ndi nēsi n’Ijipt puta, ndi bu ndikom, bú ndikom agha nile, nwuru n’ọzara n’uzọ, mb͕e ha siri n’Ijipt puta.

5 N’ihi na ndi ebìri úgwù ka ha bu, bú ndi nile putara n’Ijipt: ma ndi nile amuru n’ọzara n’uzo mb͕e ha siri n’Ijipt puta, ha ebìghi ha úgwù.

6 N’ihi na ọgu arọ abua ka umu Israel jere ije n’ọzara, rue mb͕e mba ahu nile gwusiri, bú ndikom agha ahu ndi nēsi n’Ijipt puta, n’ihi na ha egeghi nti olu Jehova: ndi Jehova ṅuru iyi na Ọ gaghi-ekwe ka ha hu ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi na Ọ gēnye ayi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.

7 Ma umu-ha, ndi O mere ka ha bilie n’ọnọdu ha, ndi ahu ka Joshua biri úgwù: n’ihi na ndi anēbighi úgwù ka ha bu, n’ihi na ha ebìghi ha úgwù n’uzọ.

8 O rue, mb͕e ha bìzuru mba ahu nile úgwù, na ha nọduru n’ọnọdu-ha n’ọmuma-ulo-ikwū, rue mb͕e aru-ha di ike.

9 Jehova we si Joshua, Ta ka M’kpochapuworo ihe-ita-uta nke Ijipt n’aru unu. Ewe kpọ aha ebe ahu Gilgal, rue ta.

10 Umu Israel we ma ulo-ikwū-ha na Gilgal; ha we me ememe ngabiga n’ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n’anyasi, n’ala ihe nādighi nke Jeriko.

11 Ha we rie ufọdu nime ihe mìrì n’ala ahu n’echi nke ngabiga ahu, bú achicha ekoghi-eko na ọka aṅara n’ọku, n’otù ubọchi ahu.

12 Manna we kwusi n’echi-ya, mb͕e ha riri ufọdu nime ihe mìrì n’ala ahu; umu Israel enweghi kwa manna ọzọ; ha we rie ihe-ọmume ala Kenean n’arọ ahu.

13 O rue, mb͕e Joshua nọ n’akuku Jeriko, na o weliri anya-ya abua, we hu, ma, le, otù nwoke nēguzo na ncherita-iru ya, mma-agha-ya amiputara amiputa di n’aka-ya: Joshua we jekuru ya, si ya, Ọ̀ bu ayi ka i diri ma-ọbu ndi nēmegide ayi?

14 Ọ si, É-è; kama mu onwem bu onye-isi usu-ndi-agha Jehova; ub͕u a ka m’biaworo. Joshua we da kpue iru-ya n’ala, kpọ isi ala, si ya, Gini ka onye-nwem nāgwa orù-ya?

15 Onye-isi usu-ndi-agha Jehova we si Joshua, Yipu akpukpọ-ukwu-gi n’ukwu-gi; n’ihi na ebe nke gi onwe-gi nēguzo n’elu ya, nsọ ka ọ di. Joshua we me otú a.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 6

1 (Ma Jeriko mechiri ọnu-uzọ-ama-ya, ewe mechibido ya uzọ n’ihi umu Israel: ọ dighi onye nāpu n’èzí, ọ dighi kwa onye nābà nime.)

2 Jehova we si Joshua, Le, enyewom Jeriko, na eze-ya, na ndi-dike nile, bú dinkpà, n’aka-gi.

3 Unu gāb͕a obodo ahu buruburu, ndikom agha nile, nēje obodo ahu buruburu otù ub͕ò. Otú a ka i gēme ubọchi isi.

4 Ndi-nchu-aja asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n’iru ib͕e ahu: ma n’ubọchi nke-asa unu gāb͕a obodo ahu buruburu ub͕ù asa, ndi-nchu-aja gāfù kwa opì-ike asa ahu.

5 Ọ gēru kwa, mb͕e ha gēwere mpi oké uda fù ọfufu-opì di anya, mb͕e unu gānu kwa olu opì-ike ahu, na ndi nkem nile gēti oké nkpu; mb͕idi obodo ahu gāda kwa n’okpuru ya, ndim gārigo kwa, nwoke ọ bula na ncherita-iru ya.

6 Joshua nwa Nun we kpọ ndi-nchu-àjà, si ha, Būrunu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu, ndi-nchu-àjà asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n’iru ib͕e Jehova.

7 Ha we si ndi Israel, Gabiganu, b͕a obodo ahu buruburu, ndi ejikere gāgabiga kwa n’iru ib͕e Jehova.

8 O rue, mb͕e Joshua gwara ndi Israel okwu, ndi-nchu-àjà asa ndi nēbu opì-ike oké uda asa ahu n’iru Jehova we gabiga, we nāfù opì-ike asa ahu: ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova we nējeso ha n’azu.

9 Ndi ejikere we nēje n’iru ndi-nchu-àjà ndi nāfù opì-ike asa ahu, ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e ahu n’azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje.

10 Joshua we nye ndi Israel iwu, si, Unu etila nkpu, unu ekwe-kwa-la ka anu olu-unu, okwu ọ bula agaghi-esi kwa n’ọnu-unu puta, rue ubọchi m’gāsi unu, Tienu nkpu; unu ewe tie nkpu.

11 Ọ we me ka ib͕e Jehova b͕a obodo ahu buruburu, nēje ya buruburu otù ub͕ò: ha we bata n’ọmuma-ulo-ikwū, nọ ọnọdu-abali n’ọmuma-ulo-ikwū.

12 Joshua we bilie n’isi-ututu, ndi-nchu-àjà we būru ib͕e Jehova.

13 Ndi-nchu-àjà asa ahu ndi nēbu opì-ike oké uda asa ahu n’iru ib͕e Jehova nējegide, nāfù kwa opì-ike asa ahu: ndi ejikere nēje kwa n’iru ha; ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e Jehova n’azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje.

14 N’ubọchi nke-abua ha we b͕a obodo ahu buruburu otù ub͕ò, we laghachi n’ọmuma-ulo-ikwū: otú a ka ha mere ubọchi isi.

15 O rue n’ubọchi nke-asa, na ha biliri n’isi-ututu mb͕e chi nābọ, we b͕a obodo ahu buruburu n’otù uzọ ahu ub͕ò asa: nání, n’ubọchi ahu ha b͕ara obodo ahu buruburu ub͕ò asa.

16 O rue, n’ub͕ò nke-asa, mb͕e ndi-nchu-àjà fùru opì-ike asa ahu, na Joshua siri ndi Israel, Tienu nkpu; n’ihi na Jehova enyewo unu obodo ahu.

17 Obodo ahu gābu ihe ewezugara nye Jehova, ya onwe-ya, na ihe nile di nime ya: nání Rehab, bú nwayi nākwa iko, gādi ndu, ya onwe-ya na ndi nile ya na ha nọ n’ulo, n’ihi na o zobere ndi-ozi ndi ayi zigara.

18 Ma otú ọ di, unu onwe-unu debenu onwe-unu ka unu ghara imetu ihe ewezugara nye Jehova aka, ka unu we ghara iwere ihe ahu ewezugara, mb͕e unu wezugasiri ya; unu ewe me ka ọmuma-ulo-ikwū Israel buru ihe ewezugara ka ebibie ya, unu ewe mekpa ya aru.

19 Ma ọla-ọcha nile, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, nsọ ka ha diri Jehova: ha gābà n’ulo-àkù Jehova.

20 Ndi Israel we tie nkpu, ndi-nchu-àjà we fùa opì-ike asa ahu: o rue, mb͕e ndi Israel nuru olu opì-ike, na ndi Israel tiri oké nkpu, mb͕idi ahu we da n’okpuru ya, ndi Israel we rigo n’obodo ahu, nwoke ọ bula na ncherita-iru ya, ha we were obodo ahu.

21 Ha we were ọnu mma-agha wezuga ihe nile di n’obodo ahu ka ebibie ya, ma nwoke ma nwayi, ma nwata ma okenye, na ehi, na aturu, na inyinya-ibu.

22 Joshua we si ndikom abua ahu ndi nēledori ala ahu, Banu n’ulo nwayi ahu nākwa iko, menu ka nwanyi ahu na ihe nile o nwere puta, dika unu ṅuru ya iyi.

23 Umu-okorọbia ahu, bú ndi-nledo, we ba nime, me ka Rehab, na nna-ya, na nne-ya, na umu-nne-ya, na ihe nile ọ nwere, puta, ab͕uru-ya nile ka ha me-kwa-ra ka ha puta; ha we me ka ha nọdu n’azu ọmuma-ulo-ikwū Israel.

24 Ha we sure obodo ahu n’ọku, na ihe nile nke di nime ya: nání ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, ka ha tiyere n’ulo-àkù Jehova.

25 Ma Joshua mere ka Rehab, bú nwayi nākwa iko, na ulo nna-ya, na ihe nile ọ nwere, di ndu; ọ we biri n’etiti Israel, rue ta; n’ihi na o zobere ndi-ozi ahu, ndi Joshua zigara iledo Jeriko.

26 Joshua we b͕a ha iyi na mb͕e ahu, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu n’iru Jehova, nke gēbili wue obodo Jeriko a: ọkpara-ya ka ọ gēwere tọ ntọ-ala-ya, nwa-nwoke-ya nke-ntà ka ọ gēwere kwa guzo ọnu-uzọ-ama-ya ọtọ.

27 Jehova we nọyere Joshua: akukọ-ya we di n’ala ahu nile.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 7

1 Ma umu Israel mekpuru ihe-nmekpu n’ihe ahu ewezugara nye Jehova; n’ihi na Ekan nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda, were ufọdu nime ihe ahu ewezugara nye Jehova; iwe Jehova we di ọku megide umu Israel.

2 Joshua we si na Jeriko ziga ndikom ije Ai, nke di nso Bet-even, n’akuku Iru-anyanwu nke Bet-el, o we gwa ha okwu, si, Rigonu, ledo ala ahu. Ndikom ahu we rigo, ledo Ai.

3 Ha we laghachikuru Joshua, si ya, Ka ndi Israel nile ghara irigo; ka ihe ra ka nnù ndikom ise, ma-ọbu ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri, rigo, tib͕ue Ai; emela ka ndi Israel nile dọb͕ue onwe-ha n’ọlu iru ebe ahu; n’ihi na madu ole-na-ole ka ha di.

4 Ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri we rigo n’ebe ahu site na ndi Israel: ha we b͕alaga n’iru ndikom Ai.

5 Ndikom Ai we tib͕ue ihe ra ka orú madu na iri na isi sitere na ha: ha we si n’iru ọnu-uzọ-ama chugide ha rue Shebarim, we tib͕ue ha na nrida ahu: obi we lọ ndi Israel miri, we ghọ miri miri.

6 Joshua we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, da kpue iru-ya n’ala n’iru ib͕e Jehova rue anyasi, ya onwe-ya na ndi-okenye Israel; ha we kpokwasi ájá n’isi-ha.

7 Joshua we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova, n’ìhi gini ka I meworo ka ndi nka gabiga Jọdan ma-ọli, inye ayi n’aka ndi-Amorait, ime ka ayi la n’iyì? ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi kwere we biri n’ofè Jọdan!

8 Biko, Onye-nwe-ayi, gini ka m’gēkwu, mb͕e Israel b͕akutasiri azu-ha n’iru ndi-iro-ha?

9 Ndi Kenean na ndi nile bi n’ala nka gānu kwa ya, we b͕a ayi buruburu, bipu aha-ayi n’uwa: ọ̀ bu kwa gini ka I gēmere aha uku Gi?

10 Jehova we si Joshua, Gi bilie; n’ìhi gini bu nka na i nāda kpu iru-gi n’ala?

11 Israel emehiewo; ọzọ kwa, ha agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M’nyere ha n’iwu: ọzọ kwa, ha ewerewo ufọdu nime ihe ewezugara nyem; ọzọ kwa, ha ezuwo ori, ọzọ kwa, ha aghọwo aghughọ, ọzọ kwa, ha etiyewo ya n’ihe-ha.

12 Umu Israel apughi kwa iguzosi ike n’iru ndi-iro-ha, ha nāb͕akuta azu n’iru ndi-iro-ha, n’ihi na ha aghọwo ihe ewezugara ka ebibie ha: M’gaghi-anọyere unu ọzọ, ma ọ buru na unu ekpochapughi ihe ahu ewezugara nyem n’etiti unu.

13 Bilie, do ndim nsọ, si, Donu onwe-unu nsọ bayere echi: n’ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ihe ewezugara nyem di n’etiti gi, Israel: i pughi iguzosi ike n’iru ndi-iro-gi, rue mb͕e unu gēwezuga n’etiti onwe-unu ihe ahu ewezugara nyem.

14 Agēme kwa ka unu biarue nso n’ututu n’ebo nile unu: o gēru kwa, na ebo ahu nke Jehova gānwude gābiaru nso n’ab͕uru nile ya; ab͕uru ahu nke Jehova gānwude gābiaru kwa nso n’ulo-ya nile; ulo ahu nke Jehova gānwude gābiaru kwa nso na ndikom-ya.

15 Ọ gēru kwa, na onye anwudere ya na ihe ahu ewezugara nye Jehova, agēsure ya n’ọku, ya onwe-ya na ihe nile o nwere: n’ihi na ọ gabigawo ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na n’ihi na o mewo ihe-nzuzu n’Israel.

16 Joshua we bilie n’isi-ututu, me ka Israel biarue nso n’ebo nile ha; ewe nwude ebo Juda:

17 o we me ka ab͕uru Juda biarue nso; ọ we nwude ab͕uru ndi Zera: o we me ka ab͕uru ndi Zera biarue nso na ndikom-ya; ewe nwude Zabdi:

18 o we me ka ulo-ya biarue nso na ndikom-ya; ewe nwude Ekan, nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda.

19 Joshua we si Ekan, Nwam, biko, nye Jehova, bú Chineke Israel, nsọpuru, nye kwa Ya ekele; biko, gosikwam ihe i meworo; ezopula ya n’ebe m’nọ.

20 Ekan we za Joshua, si, N’ezi-okwu mu onwem emehiewo megide Jehova, bú Chineke Israel, otú a na otú a ka m’mewo-kwa-ra:

21 m’we hu n’etiti ihe-nkwata otù ezi uwe-nwuda nke Shaina, na ọgu shekel ọla-ọcha iri, na otù nkpirikpi ọla-edo nke ọtùtù-ya di ọgu shekel abua na iri, m’we nwe anya-uku n’ebe ha di, m’we chiri ha; ma, le, ezoworo ha n’ala n’etiti ulo-ikwūm, ọla-ọcha ahu di kwa n’okpuru ya.

22 Joshua we ziga ndi-ozi, ha we b͕arue ulo-ikwū-ya; ma, le, ezoro ya n’ulo-ikwū-ya, ọla-ọcha ahu di kwa n’okpuru ya.

23 Ha we si n’ulo-ikwū ahu chiri ha, chitara ha Joshua, chita-kwa-ra ha umu Israel nile; ha we wusa ha n’iru Jehova.

24 Joshua, ya na Israel nile, we were Ekan nwa Zera, na ọla-ọcha ahu, na uwe-nwuda ahu, na nkpirikpi ọla-edo ahu, na umu-ya ndikom, na umu-ya ndinyom, na ehi-ya, na inyinya-ibu-ya, na ìgwè ewu na aturu-ya, na ulo-ikwū-ya, na ihe nile o nwere: ha we me ka ha rigorue Ndagwurugwu Ekoa.

25 Joshua we si, Gini mere i mekpaworo ayi aru? Jehova gēmekpa gi aru ta. Israel nile we were nkume ub͕ue ya; ha we sure ha n’ọku, were kwa nkume tub͕ue ha.

26 Ha we guzo n’elu ya oké obo nkume, rue ta; Jehova we si n’idi-ọku nke iwe-Ya chigharia. N’ihi ya akpọrọ aha ebe ahu, Ndagwurugwu Ekoa, rue ta.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 8

1 Jehova we si Joshua, Atula egwu, atu-kwa-la ujọ: chiri ndi-agha nile tiyere onwe-gi, bilie, rigorue Ai: le, enyewom eze Ai, na ndi-ya, na obodo-ya, na ala-ya, n’aka-gi:

2 i gēme kwa Ai, me kwa eze-ya, dika i mere Jeriko, me kwa eze-ya: nání, na unu gālutara onwe-unu n’agha ihe-nkwata-ya, na anu-ulo-ya: doro onwe-gi ndi nēru nbì megide obodo ahu n’azu ya.

3 Joshua we bilie, ya na ndi-agha nile, irigoru Ai: Joshua we rọputa orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù ndikom iri-na-ise, ndi-dike, bú ndi-dìnkpà, o we zipu ha n’abali.

4 O we nye ha iwu, si, Lenu, unu onwe-unu nēru nbì megide obodo ahu, n’azu obodo: unu esila n’obodo ahu je n’ebe di anya nke-uku, buru-kwa-nu ndi nọ na njikere, unu nile:

5 mu onwem, na ndi nile mu na ha nọ, gābiaru obodo ahu nso: ọ gēru kwa, mb͕e ha gāputa izute ayi, dika na mb͕e mbu, na ayi gāb͕alaga n’iru ha;

6 ha gāputa n’azu ayi, rue mb͕e ayi gādọpu ha n’obodo; n’ihi na ha gāsi, Ha nāb͕alaga n’iru ayi, dika na mb͕e mbu; ayi gāb͕alaga kwa n’iru ha:

7 unu onwe-unu gēsi kwa n’oruru-nbì ahu bilie, nweta obodo ahu: n’ihi na Jehova, bú Chineke-unu, gēnye ya n’aka-unu.

8 Ọ gēru kwa, mb͕e unu wereworo obodo ahu, na unu gēsu obodo ahu ọku; dika okwu Jehova si di, otú a ka unu gēme: lenu, enyewom unu iwu.

9 Joshua we zipu ha: we je n’oruru-nbì ahu, we nọdu n’etiti Bet-el na Ai, n’akuku Ọdida-anyanwu Ai: Joshua we nọ ọnọdu-abali ahu n’etiti ndi Israel.

10 Joshua we bilie n’isi-ututu, lekọta ndi Israel, rigo, ya onwe-ya na ndi-okenye Israel, n’iru ndi Israel, rue Ai.

11 Ndi nile, bú ndi-agha ndi ya na ha nọ, we rigo, biarue nso, bia na ncherita-iru obodo ahu, ma ulo-ikwū-ha n’akuku Ugwu nke Ai: ma ndagwurugwu di n’etiti ya na Ai.

12 O we chiri ihe ra ka nnù ndikom iri-na-abua na ọgu iri, do ha n’oruru-nbì n’etiti Bet-el na Ai, n’akuku Ọdida-anyanwu obodo ahu.

13 Ndi Israel we do ọmuma-ulo-ikwū ahu nile nke di n’akuku Ugwu obodo ahu, na ndi-ha ndi nēche anwu n’akuku Ọdida-anyanwu obodo ahu; Joshua we je n’etiti ndagwurugwu ahu n’abali ahu.

14 O rue, mb͕e eze Ai huru nke ahu, na ndikom obodo-ya mere ngwa, bilie n’isi-ututu, pua izute Israel ibu agha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, na mb͕e akara àkà, n’iru Araba ahu; ma ya onwe-ya amaghi na ndi nēru nbì di megide ya n’azu obodo-ya.

15 O we di ka anētib͕u Joshua na Israel nile n’iru ha, ha we b͕alaga n’uzọ ọzara.

16 Ewe tikue ndi nile nọ n’obodo ahu nkpu ichu ha n’azu: ha we chua Joshua n’azu, ewe dọpu ha n’obodo.

17 Ọ dighi kwa nwoke fọduru na Ai ma-ọbu na Bet-el, nke nāpughi ichu Israel: ha we rapu obodo ahu ka o ghere oghe, we chua Israel n’azu.

18 Jehova we si Joshua, Zo nkpunkpu ube nke di n’aka-gi n’ebe Ai di; n’ihi na n’aka-gi ka M’gēnye ya. Joshua we zo nkpunkpu ube ahu nke di n’aka-ya n’ebe obodo ahu di.

19 Ndi nēru nbì we si n’ọnọdu-ha bilie ngwa ngwa, we b͕a ọsọ mb͕e o setiri aka-ya, ha we ba n’obodo, were ya; ha we me ngwa sue obodo ahu ọku.

20 Ndikom Ai we le anya n’azu ha, hu, ma, le, anwuru-ọku obodo-ha rigoro rue elu-igwe, ike adighi kwa nime ha ib͕alaga otù uzọ ọzọ: ndi Israel ndi nāb͕alaga n’ọzara we chigharia imegide ndi nāchu ha.

21 Joshua na Israel nile-hukwara na ndi nēru nbì ewerewo obodo ahu, hu kwa na anwuru-ọku obodo arigowo n’elu, ha we laghachi, tib͕ue ndikom Ai.

22 Ndi nēru nbì si kwa n’obodo puta izute ha; ha we nọ n’etiti Israel, ndi si n’ọzara nọ n’otù akuku, ndi si n’obodo nọ kwa n’akuku ọzọ: ha we tib͕ue ha rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ma-ọbu onye b͕apuru ab͕apu arapuru ha.

23 Ha we were eze Ai na ndu, me ka ọ biarue Joshua nso.

24 O rue, mb͕e Israel b͕usiri ndi nile bi na Ai n’ọhia, bú n’ọzara ebe ha churu ha, mb͕e ha nile dasiri n’ọnu mma-agha, rue mb͕e ha gwusiri, na Israel nile laghachiri na Ai, ọnu mma-agha tib͕ue ya.

25 Ndi nile ndi dara n’ubọchi ahu, ma nwoke ma nwayi, we di orú nnù madu na nnù iri, bú ndikom nile nke Ai.

26 Ma Joshua eseghachighi aka-ya, nke o ji zo nkpunkpu ube ahu, rue mb͕e o wezugasiri ndi nile bi na Ai ka ebibie ha.

27 Nání na Israel lutara n’onwe-ha anu-ulo na ihe-nkwata nke obodo ahu n’agha, dika okwu Jehova si di nke O nyere Joshua n’iwu.

28 Joshua we sure Ai ọku, do ya ka ọ buru obo ebighi-ebi, bú ebe tọb͕ọrọ n’efu, rue ta.

29 Ọ we kwuba eze Ai n’osisi rue mb͕e anyasi: ma mb͕e anyanwu nāda Joshua nyere iwu, ha we si n’osisi weda ozu-ya, tuda ya n’oghere ọnu-uzọ-ama obodo, guzo n’elu ya oké obo nkume, rue ta.

30 Mb͕e ahu Joshua wuru ebe-ichu-àjà nye Jehova, bú Chineke Israel, n’ugwu Ibal,

31 dika Moses, bú orù Jehova, nyere umu Israel iwu, dika edeworo ya n’akwukwọ iwu Moses, bú ebe-ichu-àjà nkume zuru okè, nke ọ nēmeghi ka ígwè ga n’elu ha: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n’elu ya, chu kwa àjà-udo.

32 O we dekwasi na nkume ahu n’ebe ahu ndeputa iwu Moses, nke o dere n’akwukwọ n’iru umu Israel.

33 Israel nile, na ndi-okenye-ha, na ndi-ọchi-agha-ha, na ndi-ikpé-ha, nēguzo kwa n’otù akuku na n’akuku nke-ọzọ nke ib͕e ahu na ncherita-iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ma ọbìa ma onye amuru n’ala; nkera-ha na ncherita-iru ugwu Geraizim, nkera-ha ọzọ na ncherita-iru ugwu Ibal; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu na mbu, igọzi ndi Israel.

34 Emesia o we gua okwu nile nke iwu ahu, ma ngọzi ma nkọcha, dika ihe nile si di nke edeworo n’akwukwọ iwu ahu.

35 Ọ dighi okwu ọ bula n’ihe nile nke Moses nyere n’iwu nke Joshua nāgughi n’iru nkpọkọta nile nke Israel, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-ọbìa ndi nēje ije n’etiti ha.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 9

1 O rue, mb͕e eze nile ndi bi n’ofè Jọdan, n’ugwu, na n’ebe di ala ala, na n’ọnu-miri nile nke oké osimiri uku ahu na ncherita-iru Lebanon, ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, nuru ya;

2 na ha chikọtara onwe-ha, ibuso Joshua na ibuso Israel agha, n’otù ọnu.

3 Ma ndi bi na Gibeon nuru ihe nke Joshua mereri Jeriko me kwa Ai,

4 ha we were aghughọ me ihe, ọbuná ndi ahu, ha we je, me dika ndi ezìri ozi, ha we chiri akpa kara nká n’elu inyinya-ibu-ha, na karama-akpukpọ manya-vine, nke kara nká, dọwa kwa adọwa, ekezi-kwa-ra ekezi;

5 akpukpọ-ukwu kara nká, nke ab͕ara ab͕a, di kwa n’ukwu-ha, uwe kara nká di kwa n’aru ha; achicha nile nke ihe ha nēri n’uzọ kpọ-kwa-ra nku, ma kwa ebu.

6 Ha we jekuru Joshua rue ọmuma-ulo-ikwū na Gilgal, si ya, si kwa ndikom Israel, Ala di anya ka ayi si bia: ma ub͕u a ka ayi na unu b͕a ndu.

7 Ndikom Israel we si ndi-Haivait, Eleghi anya n’etiti ayi ka unu onwe-unu nēbi; àyi na unu gēsi kwa aṅa b͕a ndu?

8 Ha we si Joshua, Ndi-orù-gi ka ayi bu. Joshua we si ha, Òle ndi ka unu bu? òle ebe unu si bia kwa?

9 Ha we si ya, Ala di anya nke-uku ka ndi-orù-gi si bia n’ihi aha Jehova, bú Chineke-gi: n’ihi na ayi anuwo akukọ- Ya, na ihe nile O mere n’Ijipt,

10 na ihe nile O mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi biri n’ofè Jọdan, bú nke O mere Saihon, bú eze Heshbon, me kwa Og, bú eze Beshan, nke nọ n’Ashtarot.

11 Ndi-okenye-ayi na ndi nile bi n’ala-ayi we gwa ayi okwu, si, Werenu ihe unu gēri n’uzọ n’aka-unu, je izute ha, si ha, Ndi-orù-unu ka ayi bu: ma ub͕u a, ka ayi na unu b͕a ndu.

12 Achicha-ayi a, mb͕e ọ di ọku ka ayi weputara ya n’ulo-ayi ibu ihe ayi gēri n’uzọ n’ubọchi ayi putara ijekuru unu; ma ub͕u a, le, ọ kpọwo nku, ma kwa ebu:

13 karama-akpukpọ manya-vine ndia, nke ayi b͕ajuru, di kwa ọhu; ma, le, ha dọwara adọwa: uwe-ayi na akpukpọ-ukwu-ayi ndi a akawo kwa nká site n’ije di ogologo nke-uku.

14 Ndikom ahu we nara ufọdu nime ihe-oriri-uzọ-ha, ha ajughi kwa ase n’ọnu Jehova.

15 Joshua we me ka udo di n’etiti ha na Israel, ya na ha we b͕a ndu, ka ọ kwe ka ha di ndu: ndi-isi nzukọ Israel we ṅuara ha iyi.

16 O rue, n’ọgwugwu ubọchi atọ mb͕e ha na ha b͕asiri ndu, na ha nuru na ndi-ab͕ata-obi-ha ka ha bu, na ọ bu kwa n’etiti ha ka ndi ahu nēbi.

17 Umu Israel we bilie ije, biarue obodo nile ha n’ubọchi nke-atọ. Ma obodo-ha bu Gibeon, na Kefira, na Beirot, na Kiriat-jearim.

18 Ma umu Israel etib͕ughi ha, n’ihí na ndi-isi nzukọ Israel ewerewo Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara ha iyi. Nzukọ ahu nile we tamu ntamu megide ndi-isi.

19 Ndi-isi nile we si nzukọ ahu nile, Ayi onwe-ayi ewerewo Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara ha iyi: ma ub͕u a ayi apughi imetu ha aka.

20 Nka ka ayi gēme ha, kwe kwa ka ha di ndu; ka iwe we ghara idikwasi ayi, n’ihi iyi ahu nke ayi ṅuru ha.

21 Ndi-isi we si ha, Ka ha di ndu: ha we ghọrọ nzukọ Israel nile ndi-ọwa-nkú na ndi-ose-miri; dika ndi-isi gwara ha okwu.

22 Joshua we kpọ ha, gwa ha okwu, si, N’ìhi gini ka unu ghọb͕uru-ayi, si, Ndi bi n’ebe dipuru unu anya nke-uku ka ayi bu; ma unu onwe-unu nēbi n’etiti ayi?

23 Ma ub͕u a, ndi anābu ọnu ka unu bu, agaghi-ebipu kwa n’etiti unu ndi gābu orù, ma ndi-ọwa-nkú ma ndi-ose-miri bayere ulo Chinekem.

24 Ha we za Joshua, si, N’ihi na egosiri ndi-orù-gi n’ezie na Jehova, bú Chineke-gi, nyere Moses, bú orù-Ya, iwu inye unu ala nka nile, na ikpochapu ndi nile bi n’ala nka n’iru unu; ayi we tua egwu nke-uku bayere ndu-ayi n’ihi unu, ayi we me ihe a.

25 Ma ub͕u a, le, ayi nọ n’aka-gi: dika o si di nma, dika o si zi kwa ezi n’anya-gi ime ayi, me.

26 O we me ha otú a, naputa ha n’aka umu Israel, ha eb͕ughi kwa ha.

27 Joshua we me ha n’ubọchi ahu ndi-ọwa-nkú na ndi-ose-miri bayere nzukọ Israel, baye-kwa-ra ebe-ichu-àjà Jehova, rue ta, n’ebe ahu nke Ọ gārọputa.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 10

1 O rue, mb͕e Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, nuru na Joshua ewerewo Ai, wezuga kwa ya ka ebibie ya; dika ọ mereri Jeriko na eze-ya, otú a ka o mere Ai na eze-ya; mb͕e ọ nu-kwa-ra na ndi bi na Gibeon emewo ka ha na Israel di n’udo, ha we nọ n’etiti ha;

2 o rue, mb͕e ha nuru ya, na ha turu egwu nke-uku, n’ihi na Gibeon bu obodo uku, dika otù nime obodo ala-eze ahu, na n’ihi na ọ di uku kari Ai, ndikom-ya nile bu kwa ndi-dike.

3 Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, we zigara Hoham, bú eze Hebron, ziga-kwa-ra Piram, bú eze Jamut, ziga-kwa-ra Jafia, bú eze Lekish, ziga-kwa-ra Debia, bú eze Eglon, ozi, si,

4 Rigokutenum, yerem aka, ka ayi tib͕u kwa Gibeon: n’ihi na ọ mere ka ya onwe-ya na Joshua na umu Israel di n’udo.

5 Eze ise ndi-Amorait, bú eze Jerusalem, na eze Hebron, na eze Jamut, na eze Lekish, na eze Eglon, we chikọta onwe-ha, rigo, ha onwe-ha na ọmuma-ulo-ikwū-ha nile, we ma ulo-ikwū-ha imegide Gibeon, we buso ya agha.

6 Ndikom Gibeon we zigara Joshua ozi rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal, si, Arala ndi-orù-gi aka; rigokute ayi ngwa ngwa, zọputa ayi, ye-kwa-ra ayi aka: n’ihi na eze nile nke ndi-Amorait ndi bi n’ugwu achikọtawo onwe-ha imegide ayi.

7 Joshua we si na Gilgal rigo, ya onwe-ya, na ndi-agha nile tiyere ya, na ndi-dike nile, bú ndi-dìnkpà.

8 Jehova we si Joshua, Atula egwu ha: n’ihi na n’aka-gi ka M’nyeworo ha; ọ dighi nwoke nime ha nke gēguzo n’iru gi.

9 Joshua we biakwasi ha na mberede; n’ihi na ogologo abali nile ka o si na Gilagal rigo.

10 Jehova we chusa ha n’iru Israel, o tib͕ue ha oké ntib͕u na Gibeon, we chusa ha n’uzọ nrigo Bet-horon, tib͕ue ha rue Azeka, ru kwa Makeda.

11 O rue, mb͕e ha si n’iru Israel b͕alaga, mb͕e ha nọ na nrida Bet-horon, na Jehova si n’elu-igwe tudakwasi ha nkume uku rue Azeka, ha we nwua: ndi nwuru na nkume ákú-miri-ígwé ahu kariri ndi umu Israel were mma-agha b͕ue.

12 Mb͕e ahu Joshua gwara Jehova okwu n’ubọchi Jehova rara ndi-Amorait nye n’iru umu Israel; o we si n’anya Israel,

Anyanwu, guzo du n’elu Gibeon;

Gi Ọnwa kwa, na ndagwurugwu Ajalon.

13 Anyanwu we guzo du, ọnwa guzo-kwa-ra,

Rue mb͕e mba ahu bọsiri ọ́bọ̀ n’aru ndi-iro-ha.

Èdeghi nka n’akwukwọ Jasha? Anyanwu we guzo n’etiti elu-igwe, o meghi kwa ngwa ida ihe ra ka otù ubọchi zuru ezu.

14 Ọ dighi kwa ubọchi di ka ubọchi ahu n’iru ya ma-ọbu n’azu ya, na Jehova gere nti olu madu: n’ihi na Jehova nēburu Israel agha.

15 Joshua we lata, ya na Israel nile, rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal.

16 Eze ise ndia we b͕alaga, zo onwe-ha n’ọb͕à na Makeda.

17 Ewe gosi Joshua, si, Achọtawo eze ise ahu, ha ezowo onwe-ha n’ọb͕à na Makeda.

18 Joshua we si, Kpọrenu nkume uku rue ọnu ọb͕à ahu, do kwa ndikom n’elu ya dika ndi-nlekọta idebe ha:

19 ma unu onwe-unu eguzola; nāchunu ndi-iro-unu n’azu, tib͕u kwa ndi-ikpe-azu n’etiti ha; unu ekwela ka ha ba n’obodo di iche iche ha: n’ihi na Jehova, bú Chineke-unu, enyewo ha n’aka-unu.

20 O rue, mb͕e Joshua na umu Israel tib͕usiri ha oké ntib͕u nke-uku, rue mb͕e emere ka ha gwusia, mb͕e ndi fọduru, bú ndi fọduru n’etiti ha, basi-kwa-ra n’obodo ewusiri ike,

21 na ndi Israel nile latara n’ọmuma-ulo-ikwū jekuru Joshua na Makeda n’udo: ọ dighi nwoke raghariri ire-ya megide umu Israel.

22 Joshua we si, Meghenu ọnu ọb͕à ahu, me kwa ka eze ise ndia si n’ọb͕à ahu pukutem.

23 Ha we me otú a, me ka eze ise ahu si n’ọb͕à ahu pukute ya, bú eze Jerusalem, na eze Hebron, na eze Jamut, na eze Lekish, na eze Eglon.

24 O rue, mb͕e ha mere ka eze ise ahu pukute Joshua, na Joshua kpọrọ ndikom nile nke Israel, si ndi-ọchi-agha nke ndikom agha ndi soro ya je, Bianu nso, zọkwasinu ukwu-unu n’olu eze ndia. Ha we bia nso, zọkwasi ukwu-ha n’olu-ha.

25 Joshua we si ha, Unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ; dinu ike, nwe-kwa-nu ume: n’ihi na otú a ka Jehova gēme ndi-iro-unu nile ndi unu onwe-unu nēbuso agha.

26 Emesia Joshua we tib͕ue ha, me ka ha nwua, kwuba ha n’osisi ise: ha we kwugide n’elu osisi ise ahu rue anyasi.

27 O rue, na mb͕e anyanwu nāda, na Joshua nyere iwu, ha we si n’osisi ise ahu weda ha, tubà ha n’ọb͕à ahu ebe ha zoro onwe-ha, we tukwasi nkume uku n’ọnu ọb͕à ahu, rue ubọchi nke ta.

28 Joshua we were Makeda n’ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya na eze-ya; o wezugara ha na madu nile nke di nime ya ka ebibie ha, ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o me eze Makeda dika o mere eze Jeriko.

29 Joshua we si Makeda gabiga, ya na Israel nile, rue Libna, buso Libna agha:

30 Jehova we nye kwa ya na eze-ya n’aka Israel; o were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru nime ya; o me eze-ya dika ọ mere eze Jeriko.

31 Joshua we si na Libna gabiga, ya na Israel nile, rue Lekish, ma ulo-ikwū-ya megide ya, buso ya agha:

32 Jehova we nye Lekish n’aka Israel, o were ya n’ubọchi nke-abua, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya, dika ihe nile si di nke o mere Libna.

33 Mb͕e ahu Horam, bú eze Gezea, rigoro iyere Lekish aka; Joshua we tib͕ue ya na ndi-ya, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ọ rapuru ya.

34 Joshua we si na Lekish gabiga, ya na Israel nile, rue Eglon; ha ma ulo-ikwū-ha megide ya, buso ya agha;

35 ha were ya n’ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, madu nile nke di nime ya ka ọ wezugara ka ebibie ha n’ubọchi ahu, dika ihe nile si di nke o mere Lekish.

36 Joshua we si n’Eglon rigo, ya na Israel nile, rue Hebron; ha buso ya agha:

37 ha were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na eze-ya, na obodo-ya nile, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru, dika ihe nile si di nke o mere Eglon; o wezuga ya ka ebibie ya, na madu nile nke di nime ya.

38 Joshua we laghachi, ya na Israel nile, rue Debia, buso ya agha:

39 o were ya, na eze-ya, na obodo-ya nile; ha were ọnu mma-agha tib͕ue ha, wezuga madu nile nke di nime ya ka ebibie ha; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: dika o mere Hebron, otú a ka o mere Debia, me kwa eze-ya; dika ọ me-kwa-ra Libna, me kwa eze-ya.

40 Joshua we tib͕ue ala ahu nile, bú ugwu, na Negeb, na ebe di ala ala, na nkpọrube nile, na eze-ha nile; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o wezuga ihe nile nēku ume ka ebibie ya, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere iwu.

41 Joshua we si na Kedesh-banea tib͕ue ha we rue Geza, na ala Goshen nile, we rue Gibeon.

42 Eze ndia nile na ala-ha ka Joshua were n’otù mb͕e, n’ihi na Jehova, bú Chineke Israel, nēburu Israel agha.

43 Joshua we lata, ya na Israel nile, rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 11

1 O rue, mb͕e Jebin, bú eze Hezoa, nuru ya, na o zigara Jobab, bú eze Madon, ziga-kwa-ra eze Shimron, ziga-kwa-ra eze Akshaf,

2 ziga-kwa-ra ndi-eze ndi nọ n’Ugwu, bú n’ugwu, na n’Araba nke di na Ndida Kinerot, na n’ebe di ala ala, na n’ebe nile di elu nke Doa n’Ọdida-anyanwu, ozi;

3 o zigara ndi Kenean n’Ọwuwa-anyanwu na n’Ọdida-anyanwu, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus n’ugwu, na ndi-Haivait n’okpuru Heamon n’ala Mizpa.

4 Ha we puta, ha onwe-ha na ọmuma-ulo-ikwū-ha nile tiyere ha, bú ndi bara uba, dika ájá nke di n’usọ oké osimiri n’uba, ha na inyinya na ub͕ọ-ala bara uba nke-uku.

5 Eze ndia nile we zukọ; ha we bia, makọ ulo-ikwū-ha na miri Mirom, ibuso Israel agha.

6 Jehova we si Joshua, Atula egwu n’ihi ha: n’ihi na echi dika na mb͕e a Mu onwem gāra ha nile nye ka ha buru ndi eb͕uru eb͕u n’iru Israel: nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha ka i gēbipu, ọ bu kwa ub͕ọ-ala nile ha ka i gēsure n’ọku.

7 Joshua we bia, ya na ndi-agha nile, imegide ha n’akuku miri Mirom na mberede, we dakwasi ha.

8 Jehova we nye ha n’aka Israel, ha we tib͕ue ha, chu kwa ha rue Zaidon bara uba, ru kwa Misrefot-maim, ru kwa ndagwurugwu Mizpe n’akuku Ọwuwa-anyanwu; ha tib͕ue ha, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ha rapuru ha.

9 Joshua we me ha dika Jehova siri ya: o bipuru nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha, sure kwa ub͕ọ-ala nile ha n’ọku.

10 Joshua we laghachi na mb͕e ahu, were Hezoa, were mma-agha tib͕ue eze-ya: n’ihi na Hezoa na mb͕e gara aga bu isi ala-eze ahu nile.

11 Ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu nile nke di nime ya, ha wezugara ha ka ebibie ha: ọ dighi onye nēku ume fọduru: o sure Hezoa n’ọku.

12 Obodo nile nke ndi-eze ahu, na eze-ha nile, ka Joshua were, o were ọnu mma-agha tib͕ue ha, wezuga ha ka ebibie ha; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu.

13 Nání, obodo nile nke Jehova nke nēguzo n’obo-ha, Israel esureghi ha ọku, nāgughi Hezoa nání ya; nke ahu ka Joshua surere ọku.

14 Ihe-nkwata nile nke obodo ndia, na anu-ulo-ha, umu Israel lutara ha n’agha nye onwe-ha; nání na ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu ọ bula, rue mb͕e ha kpochapusiri ha, ha ekweghi ka onye ọ bula nēku ume fọdu.

15 Dika Jehova nyere Moses, bú orù-Ya, iwu, otú a ka Moses nyere Joshua iwu: otú a ka Joshua me-kwa-ra; o wezugaghi okwu ọ bula n’ihe nile nke Jehova nyere Moses n’iwu.

16 Joshua we were ala ahu nile, bú ugwu, na Negeb nile, na ala Goshen nile, na ebe di ala ala, na Araba, na ugwu Israel, na ebe di ala ala ya;

17 site n’ugwu Halak, nke nārigo rue Sia, we rue Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon n’okpuru ugwu Heamon: eze-ha nile ka o were, tib͕ue ha, me ka ha nwua.

18 Ọtutu ubọchi ka Joshua busoro eze ahu nile agha.

19 Ọ dighi obodo nke mere ka ha onwe-ha na umu Israel di n’udo, ma-ọbughi ndi-Haivait ndi bi na Gibeon: ha nile ka ha were n’agha.

20 N’ihi na o sitere n’aka Jehova ime ka obi-ha di ike, izute Israel n’agha, ka O we wezuga ha ka ebibie ha, ka ha we ghara inwe amara, kama ka O we kpochapu ha, dika Jehova nyere Moses iwu.

21 Joshua we bia na mb͕e ahu, bipu ndi Anak ahu n’ugwu, bú nime Hebron, na nime Debia, na n’Anab, na n’ugwu Juda nile, na n’ugwu Israel nile: ha na obodo nile ha ka Joshua wezugara ka ebibie ha.

22 Ọ dighi ndi Anak fọduru n’ala umu Israel; nání nime Geza, na nime Gat, na n’Ashdod, ka ha fọduru.

23 Joshua we were ala ahu nile, dika okwu nile si di nke Jehova gwara Moses; Joshua we nye ya Israel ka ọ buru ihe-nketa, dika esi kè ha n’òkè n’òkè dika ebo nile ha si di. Ala ahu we rapu ibu-agha, di jū.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 12

1 Ma ndia bu eze ala ahu, ndi umu Israel tib͕uru, nweta ala-ha n’ofè Jọdan n’akuku ọwuwa-anyanwu, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon, na Araba nile n’akuku ọwuwa-anyanwu:

2 Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, nāchi kwa site n’Aroea, nke di n’usọ ndagwurugwu Anon, na etiti ndagwurugwu ahu, na nkera Gilead, we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon;

3 na Araba ahu rue oké osimiri Kinerot, n’akuku ọwuwa-anyanwu, ru kwa oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n’akuku ọwuwa-anyanwu, n’uzọ ije Bet-jeshimot; na na Ndida, n’okpuru nkpọrube Pisga:

4 na ókè-ala Og, bú eze Beshan, onye sitere na ndi fọduru nke Refaim, onye bi n’Ashtarot na n’Edrei,

5 nāchi kwa n’ugwu Heamon, na nime Saleka, na nime Beshan nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na nkera Gilead, bú ókè-ala Saihon, bú eze Heshbon.

6 Moses, bú orù Jehova, na umu Israel tib͕uru ha: Moses, bú orù Jehova, we nye ya ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, ka ọ buru ihe-nnweta.

7 Ndia bu kwa eze ala ahu ndi Joshua na umu Israel tib͕uru n’ofè Jọdan n’akuku Ọdida-anyanwu, site na Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon we rue ugwu Halak, nke nārigo rue Sia; Joshua we nye ya ebo Israel nile ka ọ buru ihe-nnweta dika esi kè ha n’òkè n’òkè;

8 n’ugwu, na n’ebe di ala ala, na n’Araba ahu, na nime nkpọrube nile, na n’ọzara, na nime Negeb; ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:

9 eze Jeriko, otù; eze Ai, nke di n’akuku Bet-el, otù;

10 eze Jerusalem, otù; eze Hebron, otù:

11 eze Jamut, otù; eze Lekish, otù;

12 eze Eglon, otù; eze Gezea, otù;

13 eze Debia, otù; eze Geda, otù;

14 eze Họma, otù; eze Arad, otù;

15 eze Libna, otù; eze Adulam, otù;

16 eze Makeda, otù; eze Bet-el, otù;

17 eze Tapua, otù; eze Hefa, otù;

18 eze Efek, otù; eze Lasharon, otù;

19 eze Madon, otù; eze Hezoa, otù;

20 eze Shimron-meron, otù; eze Akshaf, otù;

21 eze Teanak, otù; eze Megido, otù;

22 eze Kedesh, otù; eze Jọkneam nime Kamel, otù;

23 eze Doa n’ebe di elu nke Doa, otù; eze Goim nime Gilgal, otù;

24 eze Tiaza, otù: eze ahu nile di orú na iri na otù.

Categories
JOSHUA

JOSHUA 13

1 Ma Joshua ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya nāgwu; Jehova we si ya, I ghọwo agadi, ubọchi ndu-gi nāgwu, ma ala nke riri nne nke-uku fọduru inweta.

2 Nka bu ala nke fọduru: buruburu-ala nile nke ndi Filistia, na ndi Geshua nile;

3 site na Shaihoa ahu, nke di n’iru Ijipt, we rue ókè-ala Ekron n’akuku Ugwu, ndi Kenean ka aguru ya nye: ndi-isi ise nke ndi Filistia; ndi Geza, na ndi Ashdod, na ndi Ashkelon, na ndi Gat, na ndi Ekron; ndi Avim kwa,

4 site na Ndida: ala nile nke ndi Kenean, na Meara nke ndi Zaidon nwe, rue Efek, rue ókè-ala ndi-Amorait:

5 na ala ndi Gebal, na Lebanon nile, n’ọwuwa-anyanwu, site na Beal-gad n’okpuru ugwu Heamon rue nbata Hemat:

6 ndi nile bi n’ugwu site na Lebanon rue Mizrefot-maim, bú ndi Zaidon nile; Mu onwem nānapu ha ala-ha n’iru umu Israel: nání me ka ọ dayere Israel n’ihe-nketa, dika M’nyeworo gi iwu.

7 Ma ub͕u a kère ebo iteghete na nkera ebo Manase ala nka n’ihe-nketa.

8 Ndi Reuben na ndi Gad soro ya nara ihe-nketa-ha, nke Moses nyere ha, n’ofè Jọdan n’akuku ọwuwa-anyanwu, dika Moses, bú orù Jehova, nyere ha;

9 site n’Aroea, nke di n’usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n’etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke Medeba rue Dibon;

10 na obodo nile nke Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye buri eze nime Heshbon, rue ókè-ala umu Amon;

11 na Gilead, na ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na ugwu Heamon nile, na Beshan nile rue Saleka;

12 ala-eze nile nke Og nime Beshan, onye buri eze n’Ashtarot na n’Edrei (onye ahu fọduru site na ndi fọduru nke Refaim); Moses we tib͕ue ha, napu ha ala-ha.

13 Ma umu Israel anapughi ndi Geshua na ndi Meakat ala-ha: Geshua na Meakat we biri n’etiti umu Israel, rue ta.

14 Nání ebo Livai ka ọ nēnyeghi ihe-nketa; àjà-ọku nile nke Jehova, bú Chineke Israel, nke ahu bu ihe-nketa-ya, dika Ọ gwara ya okwu.

15 Moses we nye ebo umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di.

16 Ókè-ala ha nwere we di site n’Aroea, nke di n’usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n’etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke di n’akuku Medeba;

17 Heshbon, na obodo-ya nile nke di n’ala di lari; Dibon, na Bamot-beal, na Bet-beal-meon;

18 na Jehaz, na Kedimot, na Mefaat;

19 na Kiriataim, na Sibma, na Zeret-shaha n’ugwu ndagwurugwu ahu;

20 na Bet-peoa, na nkpọrube nile nke Pisga, na Bet-jeshimot;

21 na obodo nile nke ala di lari, na ala-eze nile nke Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye buri eze nime Heshbon, onye Moses tib͕uru, ya na ndi-isi Midian, bú Evi, na Rekem, na Zua, na Hua, na Reba, ndi bu ndi-isi nke Saihon, ndi bi n’ala ahu.

22 Umu Israel were kwa mma-agha b͕ue Belam nwa Beoa, bu onye nāju ase, n’etiti ndi ha b͕uru.

23 Òkè-ala umu Reuben we buru Jọdan, na ókè-ala-ya. Nka bu ihe-nketa umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà nile ha.

24 Moses we nye ebo Gad, bú umu Gad, dika ab͕uru nile ha si di.

25 Ókè-ala-ha we buru Jeza, na obodo nile nke Gilead, na nkera ala umu Amon, rue Aroea nke di n’iru Raba;

26 site kwa na Heshbon rue Remat-mizpe, na Betonim; site kwa na Mahanaim rue ókè-ala Debia;

27 na nime ndagwurugwu ahu, Bet-heram, na Bet-nimra, na Sukot, na Zafon, bú nke fọduru nke ala-eze Saihon, bú eze Heshbon, Jọdan na ókè-ala-ya, rue nsọtu oké osimiri Kineret n’ofè Jọdan n’akuku ọwuwa-anyanwu.

28 Nka bu ihe-nketa umu Gad dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà nile ha.

29 Moses we nye nkera ebo Manase ihe-nketa: ọ we diri nkera ebo umu Manase dika ab͕uru nile ha si di.

30 Ókè-ala-ya we di site na Mahanaim, Beshan nile, ala-eze nile nke Og, bú eze Beshan, na ebe-obibi nile nke Jaia, nke di na Beshan, ọgu obodo atọ:

31 nkera Gilead, na Ashtarot, na Edrei, bú obodo ala-eze Og nime Beshan, we diri umu Makia nwa Manase, diri nkera umu Makia dika ab͕uru nile ha si di.

32 Ndia bu ndi Moses mere ka ha keta ihe n’ala ihe nādighi nke Moab, n’ofè Jọdan n’akuku Jeriko, n’akuku ọwuwa-anyanwu.

33 Ma Moses enyeghi ebo Livai ihe-nketa: Jehova, bú Chineke Israel, bu ihe-nketa-ha, dika Ọ gwara ha okwu.