Categories
I. JỌN

I. JỌN 2

1 Umu-ntakirim, ihe ndia ka m’nēdegara unu n’akwukwọ, ka unu we ghara imehie. Ọ buru kwa na onye ọ bula emehie, ayi nwere otù Onye nēkwu ọnu ayi n’ebe Nna-ayi nọ, Ya bu Jisus Kraist, bú Onye ezi omume:

2 Ya onwe-ya bu kwa ihe ijuru Chineke obi bayere nmehie nile ayi; ma Ọ bughi ihe ijuru Ya obi bayere nání nmehie nke ayi onwe-ayi, kama Ọ bu kwa ihe ijuru Ya obi bayere nmehie nke uwa dum;

3 nime nka ka ayi ma-kwa-ra na ayi amawo Ya, ma ọ buru na ayi edebe ihe nile O nyere n’iwu.

4 Onye, nāsi, Amawom Ya, ma ọ dighi-edebe ihe nile O nyere n’iwu, ọ bu onye-ugha, ezi-okwu adighi kwa nime onye ahu:

5 ma onye ọ bula nke nēdebe okwu-Ya, ọ bu nime onye ahu ka emeworo ka ihunanya Chineke zue okè n’ezie. Nime nka ka ayi mara na ayi nọ nime Ya:

6 onye nāsi na ọ nānọgide nime Ya, o ji ugwọ ka ya onwe-ya nējeghari kwa dika Ya onwe-ya jeghariri.

7 Ndi m’huru n’anya, ọ dighi ihe ọhuu enyere n’iwu nkem m’nēdegara unu, kama ihe ochie enyere n’iwu nke unu nwere site na mbu: ihe ochie ahu enyere n’iwu bu okwu ahu nke unu nuru.

8 Ọzọ, ihe ọhu enyere n’iwu ka m’nēdegara unu, ya bu ihe nke bu ezi-okwu nime Ya na nime unu; n’ihi na ọchichiri ahu nāgabiga, ezi ìhè ahu nāmu kwa ub͕u a.

9 Onye nāsi na ya nọ n’ìhè ahu, ma ọ nākpọ nwa-nna-ya asì, ọ nānọ n’ọchichiri ahu rue ub͕u a.

10 Onye nāhu nwa-nna-ya n’anya nānọgide n’ìhè ahu, ọ dighi ihe nēme ka madu ma n’onyà di nime ya.

11 Ma onye nākpọ nwa-nna-ya asì nọ n’ọchichiri ahu, nējeghari kwa nime ọchichiri ahu, ọ mataghi kwa ebe ọ nāga, n’ihi na ọchichiri ahu mere ka anya-ya kpue ìsì.

12 Umu-ntakirim, anamedegara unu akwukwọ, n’ihi na agbagharawo unu nmehie-unu n’ihi aha-Ya.

13 Ndi bu nna, anamedegara unu akwukwọ, n’ihi na unu amawo Onye ahu Nke di site na mbu. Umu-okorọbia, anamedegara unu akwukwọ, n’ihi na unu emeriwo ajọ onye ahu. Umu-ntakirim, edegaram unu akwukwọ, n’ihi na unu amawo Nna-ayi.

14 Ndi bu nna, edegaram unu akwukwọ, n’ihi na unu amawo Onye ahu nke di site na mbu. Umu-okorọbia, edegaram unu akwukwọ, n’ihi na unu di ike, okwu Chineke nānọgide kwa nime unu, unu emeriwo kwa ajọ onye ahu.

15 Unu ahula uwa, ma-ọbu ihe nke di n’uwa, n’anya. Ọ buru na onye ọ bula ahú uwa n’anya, ihu-n’anya nke Nna-ayi adighi nime ya.

16 N’ihi na ihe nile nke di n’uwa, bú agu ihe ọjọ nke anu-aru, na agu ihe ọjọ nke anya, na oké-okwu nke ibi-obi, esiteghi na Nna-ayi, kama o sitere n’uwa.

17 Uwa nāgabiga kwa, ya na agu ihe ọjọ ya: ma onye nēme ihe Chineke nāchọ nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi.

18 Umu-ntakirim, ọ bu oge hour ikpe-azu: dika unu nukwara na otù onye nke nēmegide Kraist nābia, ọbuná ub͕u a ọtutu ndi nēmegide Kraist aputawo; nke ayi sitere na ya mara na ọ bu oge hour ikpe-azu.

19 Ha siri n’etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n’ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n’etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi.

20 Unu onwe-unu nwe-kwa-ra otite-manu site n’Onye Nsọ ahu, unu mata-kwa-ra ihe nile.

21 Ọ bughi n’ihi na unu amataghi ezi okwu ahu ka m’degara unu akwukwọ, kama ọ bu n’ihi na unu matara ya, ọ bu kwa n’ihi na ọ dighi ugha ọ bula si n’ezi-okwu ahu puta.

22 Onye bu onye-ugha ahu ma-ọbughi onye nāgọ si na Jisus abughi Kraist ahu? Onye nāgọnari Nna-ayi na Ọkpara-Ya, onye a bu onye ahu nēmegide Kraist.

23 Onye ọ bula nke nāgọnari Ọkpara ahu, o nweghi kwa Nna ahu: onye nēkwuputa Ọkpara ahu, o nwe-kwa-ra Nna ahu.

24 Ma unu onwe-unu, ka ihe ahu unu nuru site na mbu digide nime unu. Ọ buru na ihe ahu unu nuru site na mbu adigide nime unu, unu onwe-unu gānọgide kwa nime Ọkpara ahu, nọgide kwa nime Nna-Ya.

25 Nka bu kwa nkwa ahu nke Ya onwe-ya kwere ayi, bú ndu ahu, nke bu ndu ebighi-ebi.

26 Ihe ndia ka m’degara unu n’akwukwọ bayere ndi nēduhie unu.

27 Unu onwe-unu kwa, otite-manu ahu nke unu natara n’aka-Ya nādigide nime unu, ọ dighi kwa unu nkpà ka onye ọ bula zí unu ihe; kama dika otite-manu-Ya nēzí unu ihe bayere ihe nile, dika ọ bu kwa ezie, nābughi kwa okwu-ugha, dika O zíkwara unu, nānọgidenu nime Ya.

28 Umu-ntakirim, nānọgide-kwa-nu nime Ya ub͕u a; ka ọ gābu, ma ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu, ghara kwa iwere ihere pua n’iru Ya n’ọbibia-Ya.

29 Ọ buru na unu matara na Ọ bu onye ezi omume, unu mara na onye ọ bula nke nēme ezi omume bu kwa onye amuworo site na Ya.

Categories
I. JỌN

I. JỌN 3

1 Lenu aha ihunanya nka bu nke Nna-ayi nyeworo ayi, ka ewe kpọ ayi umu Chineke: ayi bu kwa umu-Ya. N’ihi nka uwa amaghi ayi, n’ihi na ọ maghi Ya.

2 Ndi m’huru n’anya, ub͕u a ka ayi bu umu Chineke, akēmeghi kwa ka ọ puta ìhè ihe ayi gābu. Ayi matara na, ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ayi gābu ndi yiri Ya; n’ihi na ayi gāhu Ya otú Ọ di.

3 Onye ọ bula nke nwere olile-anya nka n’ebe Ọ nọ, ọ nēme kwa onwe-ya ka ọ di ọcha, dika Ya onwe-ya di ọcha.

4 Onye ọ bula nke nēme nmehie, ọ nēme kwa ihe nmebi iwu: nmehie bu kwa nmehie-iwu.

5 Unu mata-kwa-ra na emere ka Ya onwe-ya puta ìhè ka O we hichapu nmehie; nmehie adighi kwa nime Ya.

6 Onye ọ bula nke nānọgide nime Ya adighi-emehie: onye ọ bula nke nēmehie ahughi Ya anya mb͕e ọ bula, ọ maghi kwa Ya.

7 Umu-ntakirim, unu ekwela ka onye ọ bula duhie unu: onye nēme ezi omume bu onye ezi omume, dika Ya onwe-ya bu onye ezi omume:

8 onye nēme nmehie si n’ekwensu puta; n’ihi na ekwensu nēmehie site na mbu. Ihe eji me ka Ọkpara Chineke puta ìhè bu nka, ka O we la ọlu nile nke ekwensu n’iyì.

9 Onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adighi-eme nmehie, n’ihi na nkpuru-Ya nādigide nime ya: ọ pughi kwa imehie, n’ihi na amuwo ya site na Chineke.

10 Nime nka ka umu Chineke bu ndi emeworo ka ha puta ìhè, ha na umu ekwensu: onye ọ bula nke nādighi-eme ezi omume esighi na Chineke puta, onye nke nādighi-ahu nwa-nna-ya n’anya esighi kwa na Ya puta.

11 N’ihi na nka bu ozi ahu unu nuru site na mbu, ka ayi hurita onwe-ayi n’anya:

12 ọ bughi dika Ken si buru onye si n’ajọ onye ahu puta, we b͕ue nwa-nne-ya. Ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka o b͕uru ya? N’ihi na ọlu-ya jọrọ njọ, ma ọlu nke nwa-nne-ya ziri ezi.

13 Umu-nnam, ka ọ ghara iju unu anya ma ọ buru na uwa akpọ unu asì.

14 Ayi onwe-ayi matara na ayi esitewo n’ọnwu ba na ndu, n’ihi na ayi nāhu umu-nna-ayi n’anya. Onye nādighi-ahu n’anya nānọgide n’ọnwu.

15 Onye ọ bula nke nākpọ nwa-nna-ya asì bu ob͕u-madu: unu mata-kwa-ra na ọ dighi ob͕u-madu ọ bula nwere ndu ebighi-ebi nādigide nime ya.

16 Nime nka ka ayi maworo ihu-n’anya, n’ihi na Ya onwe-ya tọb͕ọrọ ndu-Ya n’ihi ayi: ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ itọb͕ọ ndu-ayi n’ihi umu-nna-ayi.

17 Ma onye ọ bula nke nwere ihe uwa nka o ji biri, nke hu-kwa-ra nwa-nna-ya ka ọ nọ na nkpà, o we mechigide ya obi ebere ya, ìhunanya Chineke si aǹa digide nime ya?

18 Umu-ntakirim, ka ayi ghara ihu n’anya n’okwu, ma-ọbu n’ire; kama ka ayi nāhu n’anya n’ọlu na ezi-okwu.

19 Nime nka ka ayi gāmara na ayi bu ndi nke ezi-okwu ahu, me kwa ka obi-ayi kwenye ekwenye n’iru Ya,

20 n’ihe ọ bula nke obi-ayi nāma ayi ikpé nime ya; n’ihi na Chineke ka obi-ayi uku, Ọ ma-kwa-ra ihe nile.

21 Ndi m’huru n’anya, ọ buru na obi-ayi amaghi ayi ikpé, ayi nwere nkwuwa-okwu n’ebe Chineke nọ;

22 ihe ọ bula ayi nāriọ kwa, ayi nānata ya n’aka-Ya, n’ihi na ayi nēdebe ihe nile Ọ nyere n’iwu, ayi nēme kwa ihe nile nātọ utọ n’iru Ya.

23 Nka bu kwa ihe O nyere n’iwu, ka ayi kwere n’aha nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist, hurita kwa onwe-ayi n’anya, dika O nyere ayi iwu.

24 Onye nēdebe kwa ihe nile O nyere n’iwu nānọgide nime Ya, Ya onwe-ya nānọgide kwa nime ya. Nime nka ka ayi makwara na Ọ nānọgide nime ayi, site na Mọ Nsọ ahu Nke O nyere ayi.

Categories
I. JỌN

I. JỌN 4

1 Ndi m’huru n’anya, unu ekwela okwu mọ nile, kama nwaputanu udi-mọ ahu, ma ha bu ndi siri na Chineke puta: n’ihi na ọtutu ndi-amuma ugha apuwo ba n’uwa.

2 Nime nka ka unu mara Mọ nke Chineke: mọ ọ bula nke nēkwuputa na Jisus Kraist abiawo n’anu-aru bu mọ nke siri na Chineke puta:

3 ma mọ ọ bula nke nādighi-ekwuputa Jisus, o sighi na Chineke puta: nka bu kwa mọ nke onye ahu nēmegide Kraist, nke unu nuworo na ọ nābia; ọ bu kwa n’oge di ub͕u a ka ọ nọ n’uwa.

4 Umu-ntakirim, unu onwe-unu bu ndi siri na Chineke puta, unu emeriwo kwa ha: n’ihi na Onye ahu Nke nọ nime unu ka onye ahu nke nọ n’uwa uku.

5 Ndi ahu bu ndi nke uwa: n’ihi nka ha nēkwu okwu nke si n’uwa puta, uwa nānu kwa olu-ha.

6 Ayi onwe-ayi bu ndi siri na Chineke puta: onye mara Chineke nānu olu-ayi; onye nēsighi na Chineke puta adighi-anu olu-ayi. Ayi sitere na nka mara mọ ezi-okwu ahu, na mọ nduhie ahu.

7 Ndi m’huru n’anya, ka ayi hurita onwe-ayi n’anya: n’ihi na ihu-n’anya bu ihe si na Chineke puta; onye ọ bula nke nāhu n’anya bu kwa onye amuworo site na Chineke, ọ ma-kwa-ra Chineke.

8 Onye nādighi-ahu n’anya amaghi Chineke; n’ihi na Chineke bu ihu-n’anya.

9 Nime nka ka emere ka ihu-n’anya Chineke puta ìhè nime ayi, na Chineke ewerewo Ọkpara Ọ muru nání Ya zite n’uwa, ka ayi we di ndu site n’aka-Ya.

10 Nime nka ka ihu-n’anya di, ọ bughi na ayi onwe-ayi huru Chineke n’anya, kama ọ bu na Ya onwe-ya huru ayi n’anya, we zite Ọkpara-Ya ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi bayere nmehie-ayi.

11 Ndi m’huru n’anya, ọ buru na Chineke huru ayi n’anya otú a, ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ ihurita onwe-ayi n’anya.

12 Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula: ọ buru na ayi ahurita onwe-ayi n’anya, Chineke nānọgide nime ayi, emewo kwa ka ihu-n’anya-Ya zue okè nime ayi:

13 nime nka ka ayi mara na ayi nānọgide nime Ya, na Ya onwe-ya nānọgide kwa nime ayi, n’ihi na O nyewo ayi ufọdu nime Mọ nke Ya.

14 Ayi onwe-ayi ahuwo kwa, ayi nāb͕a kwa àmà, na Nna-ayi ezitewo Ọkpara-Ya ka Ọ buru Onye-nzọputa nke uwa.

15 Onye ọ bula nke gēkwuputa na Jisus bu Ọkpara Chineke, Chineke nānọgide nime ya, ya onwe-ya nānọgide kwa nime Chineke.

16 Ayi onwe-ayi amawo kwa ihu-n’anya ahu, ayi ekwerewo kwa na ya, bú nke Chineke nwere n’ebe ayi nọ. Chineke bu ihu-n’anya; onye nānọgide kwa n’ihu-n’anya; nime Chineke ka ọ nanọgide Chineke nānọgide kwa nime ya.

17 Nime nka ka emeworo ka ihu-n’anya zue okè n’akuku ayi, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu n’ubọchi ikpé ahu; n’ihi na dika Ya onwe-ya di, ayi onwe-ayi di kwa otú a n’uwa nka.

18 Egwu adighi n’ihu-n’anya: kama ihu-n’anya nke zuru okè nāchupu egwu n’èzí, n’ihi na egwu, akēmeghi ya ka o zue òkè nime ihunanya

19 Ayi onwe-ayi nāhu n’anya, n’ihi na Ya onwe-ya buru uzọ hu ayi n’anya.

20 Ọ buru na onye ọ bula gāsi, Anamahu Chineke n’anya, ma ọ nākpọ nwa-nne-ya asì, ọ bu onye-ugha: n’ihi na onye nādighi-ahu nwa-nna-ya n’anya, bú onye ọ huworo, ọ pughi ihu Chineke n’anya, bú Onye ọ nāhughi mb͕e ọ bula.

21 Ihe a enyere n’iwu ka ayi nwe-kwa-ra site n’ebe Ọ nọ, ka onye nāhu Chineke n’anya, ka ọ hu kwa nwa-nna-ya n’anya.

Categories
I. JỌN

I. JỌN 5

1 Onye ọ bula nke kwere na Jisus bu Kraist ahu, amuwo ya site na Chineke: ọzọ onye ọ bula nke nāhu Onye ahu Nke muru n’anya, ọ nāhu kwa onye ahu nke amuworo site na Ya n’anya.

2 Nime nka ka ayi mara na ayi nāhu umu Chineke n’anya, mb͕e ọ bula ayi nāhu Chineke n’anya, me kwa ihe nile O nyere n’iwu.

3 N’ihi na nka bu ihu-n’anya Chineke, ka ayi debe ihe nile O nyere n’iwu: ihe O nyere n’iwu adighi kwa arọ́.

4 N’ihi na ihe ọ bula nke amuworo site na Chineke nēmeri uwa: nka bu kwa nmeri nke meriworo uwa, bú okwukwe-ayi.

5 Ma ònye bu onye nēmeri uwa, ma-ọbughi onye ahu nke kwere na Jisus bu Ọkpara Chineke?

6 Nka bu Onye ahu Nke were miri na ọbara bia, bú Jisus Kraist; ọ bughi nání nime miri ahu, kama ọ bu nime miri ahu na nime ọbara ahu.

7 Ọ bu kwa Mọ Nsọ bu Onye nāb͕a àmà, n’ihi na Mọ ahu bu ezi-okwu.

8 N’ihi na ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ, bú Mọ ahu, na miri ahu, na ọbara ahu: ha atọ diri ime otù ihe ahu.

9 Ọ buru na ayi anata àmà nke madu, àmà nke Chineke ka ya uku: n’ihi na àmà nke Chineke bu nka, na Ọ b͕awo àmà bayere Ọkpara-Ya.

10 Onye kwere n’Ọkpara Chineke nwere àmà ahu nime ya: onye nēkweghi okwu Chineke emewo Ya onye-ugha; n’ihi na o kweghi n’àmà ahu nke Chineke b͕aworo bayere Ọkpara-Ya.

11 Àmà ahu bu nka, na Chineke nyere ayi ndu ebighi-ebi, ndu ahu di nime Ọkpara-Ya.

12 Onye nwere Ọkpara ahu nwere ndu ahu; onye nēnweghi Ọkpara Chineke enweghi ndu ahu.

13 Ihe ndia ka m’degara unu n’akwukwọ, bú ndi kwere n’aha Ọkpara Chineke, ka unu we mata na unu nwere ndu ebighi-ebi.

14 Nkwuwa-okwu ahu nke ayi nwere n’ebe Ọ nọ bu nka, na ọ buru na ayi ariọ ihe ọ bula dika ọchichọ-Ya si di, Ọ nānu olu-ayi:

15 ọ buru kwa na ayi matara na Ọ nānu olu-ayi n’ihe ọ bula ayi nāriọ, ayi matara na ayi nwere ihe-aririọ ahu ayi riọ̀woro n’aka-Ya.

16 Ọ buru na onye ọ bula ahú nwa-nna-ya ka ọ nēmehie nmehie nke nādighi-eweta ọnwu, ọ gāriọ aririọ, Chineke gēnye kwa ya ndu inye ndi nēmehie nmehie ahu nke nādighi-eweta ọnwu. Nmehie di nke nēweta ọnwu: ọ bughi ekpere bayere nka ka m’nāgwa ya ka o kpe.

17 Ajọ omume nile bu nmehie: nmehie di kwa nke nādighi-eweta ọnwu.

18 Ayi matara na onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adighi-emehie; kama Onye ahu Nke amuru Ya site na Chineke nēdebe ya, ajọ onye ahu adighi-emetu kwa ya aka.

19 Ayi matara na ayi bu ndi si na Chineke puta, uwa dum nātọb͕ọ kwa n’aka ajọ onye ahu.

20 Ma ayi matara na Ọkpara Chineke abiawo, nye kwa ayi uche, ka ayi we mara Onye-ezi-okwu ahu, ayi nọ kwa nime Onye-ezi-okwu ahu, nime Ọkpara-Ya, bú Jisus Kraist. Nka bu ezi Chineke, na ndu ebighi-ebi.

21 Umu-ntakirim, chenu onwe-unu nche ka unu ghara ikpere arusi.

Categories
II. JỌN

II. JỌN 1

1 Okenye nēdegara nwanyi-nwe-madu, bú onye arọputaworo, akwukwọ, ya na umu-ya, ndi mu onwem nāhu n’anya n’ezi-okwu; ọ bughi kwa nání mu onwem, kama ọ bu kwa ndi nile ndi maworo ezi-okwu ahu;

2 n’ihi ezi-okwu ahu nke nānọgide nime ayi, ọ gādiye-kwa-ra ayi rue mb͕e ebighi-ebi:

3 Amara, ebere, udo gādiyere ayi site n’ebe Chineke, bú Nna-ayi, nọ, site kwa n’ebe Jisus Kraist nọ, bú Ọkpara nke Nna-ayi, nime ezi-okwu na ihu-n’anya.

4 Anamaṅuri ọṅu nke-uku na ahuwom ufọdu n’etiti umu-gi ka ha nējeghari nime ezi-okwu, dika ayi natara ihe enyere n’iwu n’aka Nna-ayi.

5 Anamariọ kwa gi ub͕u a, nwanyi-nwe-madu, ọ bughi dika agāsi na anamedegara gi ihe ọhu enyere n’iwu n’akwukwọ, kama ọ bu nke ayi nwere site na mbu, ka ayi hurita onwe-ayi n’anya.

6 Ihu-n’anya ahu bu kwa nka, ka ayi nējeghari dika ihe nile O nyere n’iwu si di. Ihe ahu enyere n’iwu bu nka, dika unu nuru site na mbu, ka unu nējeghari nime ya.

7 N’ihi na ọtutu ndi-nduhie apuwo ba nime uwa, bú ndi nādighi-ekwuputa na Jisus Kraist nābia n’anu-aru. Nka bu onye-nduhie ahu na onye ahu nēmegide Kraist.

8 Lezienu onwe-unu anya, ka unu we ghara ila ọlu ayi luru n’iyì, kama ka unu we nata ugwọ-ọlu zuru ezù.

9 Onye ọ bula nke nāga n’iru, nke nādighi-anọgide kwa nime ozizí nke Kraist-ayi, o nweghi Chineke: onye nānọgide nime ozizí ahu, onye ahu nwere Nna ahu, Ya na Ọkpara-Ya.

10 Ọ buru na onye ọ bula abiakute unu, ma ọ wetaghi ozizí a, unu akpọbatala ya n’ulo, unu asi-kwa-la ya biri nke-ọma:

11 n’ihi na onye nāsi ya biri nke-ọma nēso ya n’inwekọ ọlu-ya nile, nke bu ajọ ọlu.

12 Ebe m’nwere ọtutu ihe idegara unu n’akwukwọ, ezubeghm iwere akwukwọ na ink de ha: kama anamele anya na m’gābiaru unu aru, were kwa ọnu gwa unu okwu, ka ewe mezu ọṅù-unu.

13 Umu nwa-nna-gi nwanyi, bú onye arọputaworo, nēkele gi.

Categories
III. JỌN

III. JỌN 1

1 Okenye nēdegara Gaiọs akwukwọ, bú onye ahuru n’anya, onye mu onwem nāhu n’anya n’ezi-okwu.

2 Onye m’huru n’anya, anamekpere Chineke ka ihe nile nāgara gi nke-ọma, ka i nwe kwa ezi ndu, dika ọ nāgara nkpuru-obi-gi nke-ọma.

3 N’ihi na aṅuririm ọṅu nke-uku, mb͕e umu-nna-ayi ufọdu biara we b͕a àmà ezi-okwu-gi, dika gi onwe-gi nējeghari n’ezi-okwu.

4 Enweghm ọṅù nke ka ihe ndia uku, bú inu ka umu nke akam nējeghari n’ezi-okwu ahu.

5 Onye m’huru n’anya, i nēme ihe kwesiri ntukwasi-obi n’ọlu ọ bula i luru n’ebe ndi bu umu-nna-ayi, ndi bu kwa ndi-ọbìa, nọ;

6 ndi b͕ara àmà ihu-n’anya-gi n’iru nzukọ Kraist: ndi i gēme nke-ọma idupu ha n’ije-ha dika o kwesiri imere Chineke:

7 n’ihi na ọ bu n’ihi Aha ahu ka ha puru, nānaraghi ihe ọ bula n’aka ndi mba ọzọ.

8 Ya mere ayi onwe-ayi ji ugwọ ikpọbata madu di otú a, ka ayi we buru kwa ndi soro ezi-okwu ahu nālukọ ọlu.

9 Edegaram nzukọ-unu ihe n’akwukwọ: ma Diọtrefis, onye ọ nātọ utọ ibu onye-isi n’etiti ha, anaraghi ayi nke-ọma.

10 N’ihi nka, ọ buru na abiam, m’gēme ka echeta ọlu-ya nile nke ọ nālu, n’iwere ajọ okwu nēkwugide ayi ihe-nzuzu: afọ ejughi kwa ya n’ihe ahu, ma ya onwe-ya adighi-anara umu-nna-ayi nke-ọma, ọ nēb͕ochi kwa ndi nēzube inara ha, ọ nāchupu kwa ha na nzukọ Kraist.

11 Onye m’huru n’anya, eṅomila ihe ọjọ, kama nēṅomi ezi ihe. Onye nēme ezi ihe bu onye siri na Chineke puta: onye nēme ihe ọjọ ahughi Chineke mb͕e ọ bula.

12 Madu nile, ha na ezi-okwu onwe-ya, ab͕aworo Dimitriọs àmà: e, ayi onwe-ya nāb͕a kwa àmà; i mata-kwa-ra na àmà-ayi bu ezie.

13 Enwerem ọtutu ihe idegara gi n’akwukwọ, ma achọghm iwere ink na pen degara gi:

14 ma anamele anya ihu gi ngwa ngwa, ayi gēwere kwa ọnu kwurita okwu.

15 Ka udo diri gi. Ndi-eyì-ayi nēkele gi. Nēkele ndi-eyì-ayi n’aha n’aha.

Categories
JUD

JUD 1

1 Judas, orù nke Jisus Kraist, na nwa-nne Jemes, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi akpọworo, ndi ahuru n’anya nime Chineke, bú Nna-ayi, ndi edebewo kwara Jisus Kraist:

2 Ka eme ka ebere na udo na ihu-n’anya bara unu uba.

3 Ndi m’huru n’anya, ebe m’nānu ọku nile n’obi idegara unu akwukwọ bayere nzọputa ahu azọputakọrọ ayi, ọ dim nkpà idegara unu akwukwọ nāriọ unu ka unu nāb͕asi nb͕a ike n’ihi okwukwe ahu nke enyere ndi nsọ n’aka nání otù mb͕e idebe.

4 N’ihi na madu ufọdu b͕ebàra, bú ndi ewereworo ha gosi ọra madu mb͕e ochie ka ewe ma ha ikpé a, ndi nādighi-asọpuru Chineke, ndi nāgha amara Chineke-ayi ka ọ buru agu ikwa-iko, ndi nāgọnari kwa Onye nání Ya bu Nna-nwe-ọra, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

5 Ma anamezube ichetara unu, ọ bu ezie na unu matara ihe nile nání otù mb͕e, na Onye-nwe-ayi, mb͕e Ọ zọputarari otù ndi n’ala Ijipt, emesia O we la ndi nēkweghi ekwe n’iyì.

6 Ndi-mọ-ozi ndi nēdebeghi ibu-isi nke aka ha, kama ha rapuru ebe-obibi nke aka ha, O debewo kwa ha n’ab͕u ebighi-ebi n’okpuru ọchichiri nye ikpé nke oké ubọchi ahu.

7 Dika Sọdọm na Gọmọra, na obodo di ha gburugburu, ebe ha rara onwe-ha nye n’ikwa-iko n’uzọ di otú ndia mere, we pua so anu-aru di iche, edebewo ha n’iru ọra madu dika ihe-ngosi, nāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpé ziri ezi, nke bu ọku ebighi-ebi.

8 Ma otú ahu madu ndia nēmeru kwa anu-aru-ha n’irọ-nrọ-ha, ju kwa ibu-onye-nwe-madu, kwulu kwa ndi nọ n’ebube.

9 Ma Maikael onye-isi-mọ-ozi, mb͕e ya na ekwensu nārurita uka banyere aru Moses, ka ọ nēkwugide ya, o nweghi anya-ike ikpe ya ikpé nkwulu, kama ọ siri, Ka Onye-nwe-ayi bara gi nba.

10 Ma ndia nēkwulu ihe nile, ka ha ra, bú ihe ha nāmatagh: ma ka ha ra, bú ihe ha nāghọta site n’ọmumu, dika anu nēnweghi uche, nime ihe ndia ka anēmebi ha.

11 Ahuhu gādiri ha, n’ihi na ha gara n’uzọ Ken, wusì kwa onwe-ha dika miri na njehie nke Belam n’ihi ugwọ-ọlu, we la n’iyì na nkwugide nke Kora.

12 Ndia bu ndi nke bu nkume zoro ezo n’oriri ihu n’anya unu mb͕e ha nēso unu rikọ ihe nātughi egwu, ndi nāzù onwe-ha dika aturu; ha bu igwe-oji nke miri nādighi, nke ifufe nēfeghari; buru kwa osisi nāmighi nkpuru n’oge nkpuru, nke nwuru anwu ub͕ò abua, nke eropuru eropu;

13 buru kwa ebili-miri di egwu nke oké osimiri, nāsuputa ihere nke aka ha dika ufufu; umu-kpakpando nējehie ejehie, ndi edebeworo itiri nke ọchichiri rue mb͕e ebighi-ebi.

14 Ọ bu kwa ndia ka Inok, bú onye-asa site n’Adam, buru amuma, si, Le, Onye-nwe-ayi biara Ya na ndi nsọ Ya, anāpughi iguta ọnu,

15 ikpe madu nile ikpé, na itu ndi nile ndi nāsọpurughi Chineke ihe n’anya, bú ọlu nile nke asọpughi-Chineke ha nke ha luru n’asọpughi-Chineke, ha na okwu di ike nile nke ndi-nmehie ndi nāsọpurughi Chineke kwugidere Ya.

16 Ndia bu ndi-ntamu, ndi nāta Chineke uta, nējeso agu ihe ọjọ nile ha (ọnu-ha nēkwu kwa oké okwu nāfuli afuli), ndi nāja iru madu n’ihi urù.

17 Ma unu onwe-unu, ndi m’huru n’anya, chetanu okwu nile nke ndi-ozi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist buru uzọ kwu;

18 na ha siri unu, N’oge ikpe-azu ndi-ọchì gādi, nāga dika agu ihe ọjọ nile nke aka ha nke asọpughi-Chineke si di.

19 Ndia bu ndi nākpata nkewa, ndi nkpuru-obi madu nāchi, ndi nēnweghi Mọ Nsọ.

20 Ma unu onwe-unu, ndi m’huru n’anya, n’iwuli onwe-unu elu dika ulo n’elu okwukwe-unu dikarisiri nsọ, n’ikpe kwa ekpere nime Mọ Nsọ,

21 debe onwe-unu n’ihu-n’anya Chineke, nēche ebere Onye-nwe-ayi Jisus Kraist rue ndu ebighi-ebi.

22 Nēme-kwa-ranu ufọdu ebere, bú ndi nwere obi abua;

23 nāzọputa-kwa-nu ufọdu, nāguputa ha n’ọku; ma werenu egwu mere ufọdu ebere; nākpọ ọbuná uwe anu-aru nyeworo ntupọ asì.

24 Ma Onye ahu nke puru iche unu nche ka unu ghara isu ngọngọ, na iguzo unu n’iru ebube-Ya nādighi ita uta n’oké obi-utọ,

25 Onye nání Ya bu Chineke, buru kwa Onye-nzọputa-ayi, ka ha site n’aka Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, diri Ya, bú otuto na idi-uku na ike na ichi-isi, mb͕e oge a nile akērughi, ub͕u a kwa, we ru kwa mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 1

1 Nkpughe nke Jisus Kraist, nke Chineke nyere Ya igosi ndi-orù-Ya, bú ihe nāghaghi iputa n’isi nso: O we site n’aka mọ-ozi-Ya ziga we gosi Jọn orù-Ya;

2 onye b͕ara àmà nke okwu Chineke, na nke àmà Jisus Kraist, ka ha ra, bú ihe ọ huru.

3 Ngọzi nādiri onye nāgu, na ndi nānu okwu nile nke amuma nka, ndi nēdebe kwa ihe nile edeworo nime ya: n’ihi na oge ahu di nso.

4 Jọn nēdegara nzukọ Kraist asa nke di n’Esia akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo, nke si n’aka Onye ahu puta, bú Onye nādi adi, Onye dikwari, Onye nābia kwa; nke si kwa n’aka Mọ asa ahu puta, bú ndi nọ n’iru oche-eze-Ya;

5 nke si kwa n’aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n’etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n’anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya;

6 O we me ka ayi buru ala-eze, ndi-nchu-àjà nye Chineke na Nna nke Ya; ọ bu Ya ka otuto nile na ike nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

7 Le, Ọ nābia, Ya na igwe-oji; anya nile ọ bula gāhuzu kwa Ya, ndi ahu gāhu kwa Ya, bú ndi mara Ya ube; ebo nile nke uwa gēti-kwa-ra ya aka n’obi. E, Amen.

8 Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, ka Onye-nwe-ayi Chineke kwuru, bú Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri, Onye nābia kwa, Onye puru ime ihe nile.

9 Mu onwem, bú Jọn, nwa-nna-unu na onye nēso unu nwekọ nkpab͕u na ala-eze na ntachi-obi nke di nime Jisus, emere ka m’nọ n’agwe-etiti ahu nke anākpọ Patmọs, n’ihi okwu Chineke na àmà Jisus.

10 Emere ka m’nọ nime Mọ Nsọ n’ubọchi Onye-nwe-ayi, m’we nu otù oké olu n’azum, dika nke opì,

11 ka ọ nāsi, Ihe i nele anya, de ya n’akwukwọ, ziga-kwa-ra nzukọ Kraist asa ndia; zigara Efesọs, ziga-kwa-ra Smuana, ziga-kwa-ra Pagamọm, ziga-kwa-ra Taiataira, ziga-kwa-ra Sadis, ziga-kwa-ra Filadelfia, ziga-kwa-ra Leọdisia.

12 M’we chigharia ile olu ahu nke nākpayerem uka. Mb͕e m’chigharisiri m’we hu ihe-idọba-oriọna asa nke eji ọla-edo me;

13 n’etiti ihe-idọba-oriọna asa ahu ahu-kwa-ram otù Onye yiri nwa nke madu, Onye nēyi uwe nke ruru n’ukwu ala, ewerewo kwa ihe-ọkiké nke ọla-edo ke n’obi-Ya gburugburu.

14 Isi-Ya na agiri-isi-Ya di kwa ọcha dika aji-anu ọcha, dika snow; anya-Ya abua di kwa ka ire ọku;

15 ukwu-Ya abua di kwa ka ọla akwọchapuru ka o b͕upu, dika agāsi na erere ya-ri n’oké ọku; olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri.

16 O nwe-kwa-ra kpakpando asa n’aka-nri-Ya: mma-agha di nkọ nke nwere iru abua nēsi kwa n’ọnu-Ya puta: iru-Ya di kwa ka anyanwu nāmu n’ike-ya.

17 Mb͕e m’huru Ya, m’we da n’ala n’ukwu-Ya dika onye nwuru anwu. O we bikwasim aka-nri-Ya, si, Atula egwu; Mu onwem bu onye mbu na onye ikpe-azu,

18 buru kwa Onye ahu nādi ndu; aghọ-kwa-ram onye nwuru anwu, ma le, anamadi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, enwe-kwa-ram nkpisi-ugodi nile nke ọnwu na nke Hedis

19 Ya mere, de ihe nile i huru n’akwukwọ, ha na ihe nke nādi adi, na ihe nile nke gaje iputa mb͕e ihe ndia gasiri;

20 ihe-omimi nke kpakpando asa ahu nke i huru n’aka-nrim, na ihe-idọba-oriọna asa ahu nke eji ọla-edo me. Kpakpando asa ahu bu ndi-mọ-ozi nke nzukọ Kraist asa ahu: ihe-idọba-oriọna asa ahu bu kwa nzukọ Kraist asa.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 2

1 Degara mọ-ozi nke nzukọ Kraist di n’Efesọs akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nēji kpakpando asa ahu n’aka-nri-Ya, Onye nējeghari n’etiti ihe-idọba-oriọna asa ahu nke eji ọla-edo me:

2 Amataram ọlu-gi nile, na ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n’ọlu, na ntachi-obi-gi, mata kwa na i pughi inagide ndi ọjọ, i nwa-kwa-ra ndi nākpọ onwe-ha ndi-ozi, ma ha abughi, i we hu na ha bu ndi-ugha;

3 i nwe-kwa-ra ntachi-obi, i bū-kwa-ra ibu n’ihi aham, ike akāgwughi kwa gi.

4 Ma enwerem nka imegide gi, na i rapuru ihu-n’anya ahu i nwere na mbu.

5 Ya mere cheta ebe i siworo dapu, gi chèghari kwa, lu kwa ọlu mbu; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi, M’gēwepu kwa ihe-idọba-oriọna-gi n’ọnọdu-ya, ma asi na i chègharighi.

6 Otú ọ di, nka ka i nwere, na i nākpọ ọlu nile nke ndi-Nikọlaitan asì, bú nke Mu onwem nākpọ kwa asì.

7 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M’gēkweye ka o rie nkpuru si n’osisi nke ndu ahu puta, bú nke di na Paradais nke Chineke.

8 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Smuana akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye ahu nke bu onye mbu na onye ikpe-azu, Onye ghọrọ onye nwuru anwu, we dikwa ndu:

9 Amataram nkpab͕u-gi, na ob͕eye i bu (ma i bu ọgaranya), na nkwulu Chineke nke ndi nāsi na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha bu ulo-nzukọ Setan.

10 Atula ahuhu nile i gaje ihu egwu: le, ekwensu gaje itubà ufọdu n’etiti unu nime ulo-nkpọrọ, ka ewe nwa unu; unu gēnwe kwa nkpab͕u ubọchi iri. Gosi onwe-gi onye kwesiri ntukwasi-obi rue ọnwu, M’gēnye kwa gi okpu-eze ahu, bú ndu.

11 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, agaghi-emejọ ya site n’ọnwu nke-abua ahu.

12 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Pagamọm akwukwọ, si,

Ihe ndi ka O nēkwu, bú Onye ahu Nke nwere mma-agha di nkọ ahu nke nwere iru abua:

13 Amataram ebe i bi, bú ebe oche-eze Setan di: i nējidesi kwa aham ike, i gọnarighi kwa okwukwem, ọbuná n’ubọchi Antipas onye-àmàm, onye nkem kwesiri ntukwasi-obi, onye eb͕uru n’etiti unu, ebe Setan bi.

14 Ma enwerem ihe ole-na-ole imegide gi, n’ihi na i nwere n’ebe ahu ufọdu ndi nējidesi ozizí Belam ike, bú onye nēzí Belak itọb͕ọ n’iru umu Israel ihe-ima-n’ọnyà, ka ha rie ihe achuru n’àjà nye arusi, ka ha kwa kwa iko.

15 Otú a, gi onwe-gi nwe-kwa-ra ufọdu ndi nējidesi ozizí ndi-Nikọlaitan ike otú ahu.

16 Ya mere, chègharia; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi ọsọsọ, M’gēwere kwa mma-agha nke ọnum bu agha megide ha.

17 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M’gēnye ufọdu nime manna ahu nke ezobeworo, M’gēnye kwa ya nkume ọcha, n’elu nkume ahu ka edewo-kwa-ra aha ọhu, nke ọ nādighi onye ọ bula matara ma-ọbughi onye nānata ya.

18 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Taiataira akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Ọkpara Chineke nēkwu, Onye anya-Ya abua di ka ire ọku, ukwu-Ya abua di kwa ka ọla akwọchapuru ka o b͕upu:

19 Amataram ọlu-gi nile, na ihu-n’anya-gi na okwukwe-gi na ije-ozi-gi na ntachi-obi-gi, mata kwa na ọlu ikpe-azu gi kariri nke-mbu.

20 Ma enwerem nka imegide gi, na i kwere nwanyi ahu, bú Jezebel, onye nākpọ onwe-ya onye-amuma-nwanyi; o nēzí kwa ndi-orùm ihe, nēduhie kwa ha, ka ha kwa iko, ri kwa ihe achuru n’àjà nye arusi.

21 Enye-kwa-ram ya oge, ka o we chègharia; ma ọ chọghi ichèghari n’ikwa-iko-ya.

22 Le, anamatubà ya n’ihe-nkpab͕u, tubà kwa ndi soro ya kwa iko nime oké nkpab͕u, ma asi na ha echègharighi n’ọlu-ya.

23 M’gēwere kwa ọnwu b͕ue umu-ya; nzukọ Kraist nile gāmara kwa na Mu onwem bu onye nēnyocha akuru na obi nile: M’gēnye kwa unu n’otù n’otù dika ọlu nile unu si di.

24 Ma unu ka m’nāgwa, bú ndi fọduru na Taiataira, ka unu ra, bú ndi nēnweghi ozizí a, madu ndi nāmaghi ihe nile di omimi nke Setan, dika ha nēkwu; ebokwasighi m unu ibu arọ́ ọzọ.

25 Otú ọ di, ihe unu nwere, jidesienu ya ike rue mb͕e M’gābia.

26 Onye nēmeri emeri, na onye nēdebe ọlum nile rue ọgwugwu ihe nile, ya ka M’gēnye kwa ike ichi mba nile:

27 ọ gewere kwa nkpa-n’aka ígwè zùa ha dika aturu, dika anākujisi ite nke ọkpu-ite; dika Mu onwem natawokwara n’aka Nnam:

28 M’gēnye kwa ya kpakpando ututu.

29 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

Categories
NKPUGHE

NKPUGHE 3

1 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Sadis akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nwere Mọ asa ahu nke Chineke, na kpakpando asa ahu: Amataram, ọlu-gi nile, na i nwere aha na i di ndu, ma i bu onye nwuru anwu.

2 Ghọ onye nēche nche, me kwa ka ihe fọduru guzosie ike, bú nke gaje inwu anwu: n’ihi na ọ dighi ọlu-gi M’huworo nke zuworo ezù n’iru Chinekem.

3 Ya mere, nēcheta otú i nataworo, ya na otú i nuru; nēdebe kwa ya, chèghari kwa. Ya mere, asi na i cheghi nche, M’gābia dika onye-ori, i gaghi-amara kwa oge hour M’gābiakwasi gi ma-ọli.

4 Ma i nwere aha ole-na-ole na Sadis ndi nēmerughi uwe-ha: ha gēsokam nējeghari nime uwe ọcha; n’ihi na ha bu ndi kwesiri.

5 Onye nēmeri emeri ka agēb͕okwasi uwe ọcha otú a; M’gaghi-ehichapu kwa aha-ya nime akwukwọ nke ndu nkem ma-ọli, M’gēkwuputa kwa aha-ya n’iru Nnam, na n’iru ndi-mọ-ozi-Ya.

6 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

7 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Filadelfia akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye di Nsọ, Onye-ezi-okwu, Onye nwere nkpisi-ugodi nke Devid, Onye nēmeghe, ọ dighi kwa onye ọ bula gēmechi, Onye nēmechi kwa, ọ dighi kwa onye ọ bula nēmeghe:

8 Amataram ọlu-gi nile (le, enyewom gi ọnu-uzọ nke emegheworo n’iru gi, nke onye ọ bula nāpughi imechi), na i nwere ike ntà, i debe-kwa-ra okwum, i gọnarighi kwa aham.

9 Le, anamenye ufọdu nime ulo-nzukọ, ahu nke Setan, nime ndi si na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha nēkwu okwu-ugha; le, M’gēme ka ha bia kpọ isi ala n’iru ukwu-gi, ka ha mara kwa na Mu onwem huru gi n’anya.

10 N’ihi na i debere okwu nke ntachi-obim, Mu onwem gēdebe kwa gi ka i ghara ibà n’oge hour nke ọnwunwa ahu, bú oge hour nke gaje ibiakwasi elu-uwa dum madu bi, inwa ndi bi n’elu uwa.

11 Anamabia ọsọsọ: jidesie ihe i nwere ike, ka onye ọ bula ghara inara ọkpu-eze-gi.

12 Onye nēmeri emeri, ya ka M’gēme ka ọ buru ide n’ulo nsọ nke Chinekem, ọ gaghi-esi kwa n’ebe ahu pua ọzọ ma-ọli: M’gēde-kwasi kwa ya aha Chinekem, na aha obodo Chinekem, bú Jerusalem ọhu, nke si n’elu-igwe ridata site n’ebe Chinekem nọ, M’gēdekwasi kwa ya aha ọhu nkem.

13 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

14 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Leọdisia akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Amen ahu nēkwu, bú Onye-àmà ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke bu kwa Onye-ezi-okwu, Isi nke ihe nile Chineke kère:

15 Amataram ọlu-gi nile, na i jughi oyi i kpoghi kwa ọku: ọ gādi m nọ̄ nma ma i nāju oyi ma-ọbu na i nēkpo ọku.

16 Otú a, n’ihi na i di ṅaraṅara, i kpoghi kwa ọku i jughi kwa oyi, M’gāb͕ọpu gi n’ọnum.

17 N’ihi na i nāsi, Abum ọgaranya. emewo ka m’buru ọgaranya, ọ dighi kwa ihe ọ bula nākpam; i mataghi kwa na gi onwe-gi bu onye ahu nāhuju anya na onye kwesiri ebere na onye dara ob͕eye na onye kpuru ìsì na onye nāb͕a ọtọ:

18 aduam gi ọdú ka i zuru n’akam ọla-edo nke erechaworo n’ọku, ka i we ghọ ọgaranya; ka i zuru kwa uwe ọcha, ka i we bokwasi onwe-gi, ka ewe ghara ime ka ihere nke ib͕a-ọtọ-gi puta ìhè; ka i zuru kwa ọgwu-anya ite n’anya-gi, ka i we nāhu uzọ.

19 Ka ha ra, bú ndi Mu onwem huru n’anya, anamatu ha nmehie ha n’anya, zí kwa ha ihe site n’inye ha ahuhu: ya mere, nānu ọku n’obi, chèghari kwa.

20 Le, anameguzo n’ọnu-uzọ, nāku kwa aka: ọ buru na onye ọ bula anu olum, meghe kwa uzọ, M’gābakute ya, so kwa ya ri nri-anyasi, ya onwe-ya gēsokwam rie.

21 Onye nēmeri emeri, ya ka M’gēkweye ka o som nọdu ala n’oche-ezem, dika Mu onwem meri-kwa-ra, we so Nnam nọdu ala n’oche-eze-Ya.

22 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.