Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 13

1 Ma ndi-amuma na ndi-ozizí di n’Antiọk, nime nzukọ Kraist di n’ebe ahu, bú Banabas, na Simeon onye anākpọ Naiga, na Lusiọs onye Sairini, na Manaen onye azùkọrọ ya na Herod, bú tetrarch, na Sọl.

2 Ma mb͕e ha nēfè Onye-nwe-ayi òfùfè, nēbu kwa ọnu, Mọ Nsọ siri, Kewaputaram Banabas na Sọl ilu ọlu nke M’kpọworo ha ka ha lua.

3 Mb͕e ahu, mb͕e ha busiri ọnu kpe kwa ekpere bikwasi kwa ha aka n’isi, ha we zipu ha.

4 Ya mere ndi ahu, ebe Mọ Nsọ zipuru ha, ha ridata na Seleusia; ha we site n’ebe ahu ba n’ub͕o je Saiprọs.

5 Mb͕e ha ruru Salamis, ha we kwusa okwu Chineke n’ulo-nzukọ nile nke ndi-Ju: ha nwe-kwa-ra Jọn dika onye nējere ha ozi.

6 Mb͕e ha gabigasiri n’agwe-etiti ahu dum rue Pafọs, ha hu otù nwoke nke bu onye-mb͕asi, onye-amuma ugha, onye-Ju, aha-ya bu Ba-Jisus;

7 onye ya na onye-isi nọ, bú Sajiọs Pọlọs, nwoke nwere nghọta. Onye ahu kpọtāra onwe-ya Banabas na Sọl, we chọ inu okwu Chineke.

8 Ma Elimas, bú onye-mb͕asi ahu, (n’ihi na otú a ka aha-ya di ma asugharia ya), nēguzogide ha, nāchọ uzọ iduhie onye-isi ahu n’okwukwe-ayi.

9 Ma Sọl, onye anākpọ kwa Pọl, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ legidere ya anya,

10 si, Gi onye juputara n’aghughọ nile na ihe nile jọb͕uru onwe-ya, gi nwa ekwensu, gi onye-iro ezi omume nile, ì gaghi-arapu ikwahie uzọ nile eguzoziri nke Onye-nwe-ayi?

11 Ub͕u a, le, aka Onye-nwe-ayi di kwa n’aru gi, i gēkpu kwa ìsì, nāhughi anyanwu nwa oge. Ngwa ngwa alulu na ọchichiri dakwasiri ya; o we nējeghari nāchọ ndi gējide ya n’aka idu ya.

12 Mb͕e ahu onye-isi ahu, mb͕e ọ huru ihe meworo, o kwere, ebe ibobo ozizí nke Onye-nwe-ayi nwuru ya n’aru.

13 Pọl-hà we si na Pafọs nupu ub͕ọ, bia rue Paga di na Pamfilia: jọn we rapu ha, laghachi na Jerusalem.

14 Ma ha onwe-ha sitere na Paga gabiga, bia rue Antiọk di na Pisidia; ha we ba nime ulo-nzukọ-ha n’ubọchi-izu-ike, we nọdu ala.

15 Ma mb͕e agusiri akwukwọ iwu na ndi-amuma, ndi-isi ulo-nzukọ ahu zigara ha ozi, si, Umu-nne-ayi, ọ buru na unu nwere okwu nkasi-obi igwa ndi-ayi, kwuenu.

16 Pọl we bilie, kpukpu kwa aka, si,

Ndikom nke Israel, na ndi nātu egwu Chineke, nurunu.

17 Chineke nke ndi nka, bú Israel, rọputara nna-ayi-hà, we welie ndi Israel elu mb͕e ha nọ dika ọbìa n’ala Ijipt, O were kwa ogwe-aka di elu duputa ha nime ya.

18 Oge ra ka ọgu arọ abua O we nānagide omume-ha n’ọhia.

19 Mb͕e O wedasiri mba asa n’ala Kenean, O me ka ha keta ala-ha, ihe ra ka nnù arọ na ọgu arọ abua na iri:

20 mb͕e ihe ndia gasiri O nye ha ndi-ikpé rue oge Samuel, bú onye-amuma.

21 Emesia ha riọ ka enye ha eze: Chineke we nye ha Sọl nwa Kish, nwoke nke sitere n’ebo Benjamin, onye chiri eze ọgu arọ abua.

22 Mb͕e O wepusiri ya, O welie Devid ibu eze-ha; onye Ọ b͕a-kwa-ra àmà, si, Achọtawom Devid nwa Jesi, nwoke nke di ka obim si achọ, onye gēme ihe nile M’nāchọ.

23 Site na nkpuru nwoke a ka Chineke wetara Israel Onye-nzọputa, bú Jisus, dika nkwa-Ya si di;

24 mb͕e Jọn buru uzọ kwusa baptism nke nechègari nye ndi Israel nile, mb͕e Ọ kābataghi.

25 Ma mb͕e Jọn nāb͕azu ọsọ-ya, ọ si, Gini ka unu nēchè na abum? Mu onwem abughi Ya. Kama, le, otù Onye nābia n’azum, Onye m’nēkwesighi itọpu akpukpọ-ukwu nke ukwu-Ya.

26 Umu-nnem, umu eriri Abraham, na ndi di n’etiti unu nātu egwu Chineke, ọ bu ayi onwe-ayi ka eziputara okwu nke nzọputa nka.

27 N’ihi na ndi bi na Jerusalem, na ndi-isi-ha, ebe ha nāmataghi Ya, na olu ndi-amuma nke anāgu n’ubọchi-izu-ike nile, ha mezuru ha n’ima Ya ikpé.

28 Ọ bu ezie na ha ahughi ihe ọ bula kwesiri ọnwu n’aru Ya, ma ha riọrọ Pailet ka eb͕ue Ya.

29 Mb͕e ha mezuru ihe nile edeworo n’akwukwọ nsọ bayere Ya, ha si n’osisi ahu wedata Ya, tọb͕ọ Ya n’ílì.

30 Ma Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie:

31 ewe me ka ha hu Ya ọtutu ubọchi, bú ndi soro Ya si na Galili rigoro Jerusalem, ndi buru ndi-Ju ndi-àmà-Ya ub͕u a.

32 Ayi onwe-ayi nēzì kwa unu ozi ọma nke nkwa ahu ekwere nna-ayi-hà,

33 na Chineke emezuwo nka n’ebe umu-ayi nọ, ebe O mere ka Jisus bilie; dika edewo-kwa-ra ya n’abù ọma nke-abua, si, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta.

34 Ma na O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ dighi na Ọ gaje ilaghachi n’ire-uré ọzọ, O kwuwo otú a, si, M’gēnye unu ihe nile di ọcha nke kwesiri ntukwasi-obi nke ekwere Devid na nkwa.

35 N’ihi na Ọ nāsi kwa n’abù ọma di iche, I gaghi-enye Onye nke Gi di ọcha n’obi ka Ọ hu ire-uré.

36 N’ihi na Devid, mb͕e o jesiri ọb͕ọ-ya ozi, o sitere n’ìzù Chineke da n’ura ọnwu, ewe tọb͕ọ ya n’ebe nna-ya-hà nọ, o we hu ire-uré:

37 ma Onye ahu Chineke mere ka O bilie ahughi ire-uré.

38 Ya mere maranu nka, umu-nnem, na anēsite n’ọnu Onye a kwusa nb͕aghara nmehie nile nye unu:

39 ọ bu kwa nime Onye a ka anāgu onye ọ bula nke kwere na Ya n’onye ezi omume n’ihe nile, nke anāpughi igu unu na ndi ezi omume na ha nime iwu Moses.

40 Ya mere lezienu anya, ka ihe ahu ghara ibiakwasi unu, nke ekwuworo n’akwukwọ ndi-amuma, si,

41 Lenu, ndi-nlelì-anya, ka o ju kwa unu anya, ka ekpochapu kwa unu;

N’ihi na ọlu ka Mu Onwem nālu n’ubọchi-unu,

Ọlu unu nāgaghi-ekwe ma-ọli ọ buru na onye ọ bula kọrọ unu akukọ-ya.

42 Mb͕e ha nāpu, ha we riọ ka agwa ha okwu ndia n’ubọchi-izu-ike soni.

43 Ma mb͕e nzukọ ahu lasasiri, ọtutu madu n’etiti ndi-Ju, na n’etiti ndi nēso uzọ ndi-Ju ndi nātu egwu Chineke, soro Pọl na Banabas: ndi nāgwa ha okwu, nēme kwa ha ka ha kweye inọgide n’amara nke Chineke.

44 Ma n’ubọchi-izu-ike soni ọ fọduru ihe ntà ka obodo ahu nile zukọ inu okwu Chineke.

45 Ma mb͕e ndi-Ju huru ìgwè madu ahu, ha juputara n’ekworo, we nēkwugide ihe nile Pọl nēkwu, ha nēkwulu kwa ha.

46 Pọl na Banabas we kwuwa okwu, si, Ọ di nkpà ka eburu uzọ gwa unu okwu Chineke. Ebe unu nēnupu ya n’aru-unu, nekpe kwa onwe-unu ndi nēkwesighi ndu ebighi-ebi, le, ayi gaje ichighari gwa ndi mba ọzọ okwu.

47 n’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi nyeworo ayi iwu, si,

Edebewom I ka I buru ìhè nke mba nile,

Ka I we di inye nzọputa rue nsọtu uwa.

48 Ma mb͕e ndi mba ọzọ nuru nka, ha ṅuria, nye kwa okwu Chineke otuto: ha we kwere na Jisus, ka ha ra, bú ndi edoro inata ndu ebighi-ebi.

49 Ewe nēbu okwu Onye-nwe-ayi jezu ala ahu dum.

50 Ma ndi-Ju kwaliri ndinyom nātu egwu Chineke, bú ndi anāsọpuru, na ndi-isi obodo ahu, ha we kpalie nsob͕u megide Pọl na Banabas, we chupu ha n’ókè-ala-ha.

51 Ma ha rupuru ájá nke ukwu-ha megide ha, we bia rue Aikọniọm.

52 Ndi nēso uzọ Jisus we juputa n’ọṅù na Mọ Nsọ.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 14

1 O we rue n’Aikọniọm, na ha abua bàkọrọ n’ulo-nzukọ nke ndi-Ju, we kwue okwu n’uzọ nke mere ka oké ìgwe madu, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, kwere na Jisus.

2 Ma ndi-Ju ndi nēkweyeghi kpaliri nkpuru-obi ndi mba ọzọ, me ka ha jọ njọ n’ebe umu-nna nime Kraist nọ.

3 Ya mere ha nọgidere n’ebe ahu oge di anya, nēkwuwa okwu nime Onye-nwe-ayi, Onye nāb͕ara okwu amara-Ya àmà, ebe Ọ nēnye ka eme ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche site n’aka-ha.

4 Ma ọra obodo ahu kewara: ufọdu we nọ n’akuku ndi-Ju, ufọdu nọ kwa n’akuku ndi-ozi Jisus.

5 Mb͕e ndi mba ọzọ na ndi-Ju kwa, ha na ndi-isi-ha, nukọtara ime ha ihe-ihere, na itu ha nkume,

6 ha we mata, b͕alaga n’obodo nke Laikaọnia, bú Listra na Dabe, na ala di ha buruburu:

7 n’ebe ahu ka ha nēzisa kwa ozi ọma.

8 Ma na Listra otù nwoke nānọdu ala, nke ukwu-ya abua nēnweghi ike, bú onye-ngwurọ site n’afọ nne-ya, onye ọ dighi mb͕e ọ bula o jereri ije.

9 Onye a nuru Pọl ka o nēkwu: onye, ebe o legidere ya anya, ebe ọ hu-kwa-ra na o nwere okwukwe agēji zọputa ya,

10 o were oké olu si, Bilie, guzo ọtọ n’ukwu-gi abua. O we wulie je kwa ije.

11 Mb͕e ìgwè madu nile huru ihe Pọl mere, ha welie olu-ha, nāsi n’asusu Laikaọnia, Chi-ayi ridatakuru ayi n’oyiyi madu.

12 Ha we kpọ Banabas, Jupita; kpọ kwa Pọl, Makuri, ebe ya onwe-ya bu onye-isi nēkwu okwu.

13 Onye-nchu-àjà nke Jupita, nke ulo nsọ ya di n’iru obodo ahu, we sekputa ehi weta kwa okoko-osisi n’ọnu-uzọ-ama obodo, ya na ìgwè madu ahu we chọ ichu àjà.

14 Ma mb͕e ndi-ozi ahu, bú Banabas na Pọl, nuru ya, ha dọwa uwe-ha, we pua b͕abà n’etiti ìgwè madu ahu, nēti nkpu,

15 nāsi, Ndikom, gini mere unu nēme ihe ndia? Ayi onwe-ayi bu kwa madu yiri unu n’aru-ayi, ayi nēzì kwa unu ozi ọma, ka unu si n’ihe-efu ndia chigharikute Chineke Nke di ndu, Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime:

16 Onye n’ọb͕ọ nile gara aga kwere ka mba nile nāga n’uzọ nile nke aka ha.

17 Otú ọ di, Ọ rapughi Onwe-ya nēnweghi ihe-àmà, ebe Ọ nēme ezi ihe, nēnye kwa unu miri-ozuzo na oge nkpuru site n’elu-igwe, nēmeju obi-unu n’ihe-ọzùzù na ọṅù.

18 Ma n’ikwu okwu ndia ọ di ha ike ib͕ochi ìgwè madu nile ka ha ghara ichu àjà nye ha.

19 Ma ndi-Ju siri n’Antiọk na Aikọniọm bia rue ebe ahu: mb͕e ha rafusiri ìgwè madu nile, ha tua Pọl nkume, dọkpupu ya n’azu abodo, nēchè na ọ nwuru anwu.

20 Ma mb͕e ndi nēso uzọ Jisus guzoro ya buruburu, o bilie, ba nime obodo: n’echi-ya ya na Banabas we pua ga Dabe.

21 Mb͕e ha zisasiri ozi ọma gwa ndi obodo ahu, me kwa ọtutu madu ka ha buru ndi nēso uzọ Jisus, ha laghachi na Listra, na Aikọniọm, na Antiọk,

22 nēme ka nkpuru-obi ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike, nāriọ ha ka ha nọgide n’okwukwe-ayi, nēgosi kwa na ayi aghaghi isite n’ọtutu nkpab͕u ba n’ala-eze Chineke.

23 Mb͕e ha rọputasiri ndi-okenye nime nzukọ Kraist nile n’otù n’otù nye ha, were kwa ọbubu-ọnu kpe ekpere, ha we rara ha nye n’aka Onye-nwe-ayi, bú Onye ha kwereri na Ya.

24 Ha we gabiga n’etiti Pisidia, bia rue Pamfilia.

25 Mb͕e ha kwusiri okwu Chineke na Paga, ha ridata n’Atalaia;

26 ha we si n’ebe ahu ba n’ub͕ọ je Antiọk, nke esitereri na ya rara ha nye n’amara nke Chineke ilu ọlu nke ha luzuru.

27 Mb͕e ha ruru, me kwa ka nzukọ Kraist zukọta, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me, kọ-kwa-ra ha na O meghereri ọnu-uzọ okwukwe nye ndi mba ọzọ.

28 Ha na ndi nēso uzọ Jisus we nọgide ọ bughi nwa oge.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 15

1 Madu ufọdu we si na Judia ridata we zí umu-nna nime Kraist ihe, si, Ọ buru na ebìghi unu úgwù dika ọme-n’ala nke Moses nyere si di, apughi izọputa unu.

2 Ma mb͕e nkewa na ajuju nādighi ntà diri Pọl na Banabas imegide ha, ndi Kraist we dozie ka Pọl na Banabas, na ufọdu ndi ọzọ n’etiti ha, rigoro Jerusalem jekuru ndi-ozi na ndi-okenye bayere ajuju a.

3 Ya mere, mb͕e nzukọ Kraist dupusiri ha n’ije-ha, ha gabigara n’etiti Finisia, gabiga kwa n’etiti Sameria, nākọ nchighari nke ndi mba ọzọ: ha nēme kwa ka oké ọṅù diri umu-nna nime Kraist nile.

4 Mb͕e ha ruru Jerusalem, nzukọ Kraist na ndi-ozi na ndi-okenye we nara ha nke-ọma, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me.

5 Ma ufọdu nime irọ-òtù ndi-Farisi ndi kwere na Jisus biliri, si, Aghaghi ibì ha úgwù, na inye ha iwu ka ha debe iwu Moses.

6 Ndi-ozi na ndi-okenye we zukọ ile okwu a.

7 Mb͕e ha juritarari onwe-ha ọtutu ajuju, Pita we bilie, si ha,

Umu-nnam, unu onwe-unu mara na site n’ubọchi mbu Chineke rọputara n’etiti unu, ka ndi mba ọzọ we site n’ọnum nu okwu nke ozi ọma ahu, kwere kwa.

8 Chineke, Onye mara obi madu, we b͕ara ha àmà, ebe O nyere ha Mọ Nsọ, dika Ọ nye-kwa-ra ayi onwe-ayi;

9 ọ dighi kwa ókè Ọ kpara n’ab͕ata ayi na ha, ebe O mere ka obi-ha di ọcha site n’okwukwe.

10 Ya mere, ub͕u a, gini mere unu nānwa Chineke, n’ikoye yoke n’olu ndi nēso uzọ Jisus, nke ma nna-ayi-hà ma ayi onwe-ayi nēnweghi ike ibūru?

11 Kama ayi kewere na agāzọputa ayi site n’amara Onye-nwe-ayi Jisus, n’otù aka ahu dika ha onwe-ha.

12 Ọra ha nile we kpuchie ọnu-ha; ha we nuru okwu Banabas na Pọl ka ha nakọ akukọ ihe-iriba-ama na ọlu-ebube nile, ka ha ra, bú nke Chineke mere n’etiti ndi mba ọzọ site n’aka-ha.

13 Mb͕e ha kpuchiri ọnu-ha, Jemes we za, si,

Umu-nnam, nurunu olum:

14 Simeon kọrọ otú Chineke buru uzọ leta ndi mba ọzọ, isi n’etiti ha weputara aha-Ya otù ndi.

15 Nka na okwu ndi-amuma nwe-kwa-ra otù olu; dika edeworo n’akwukwọ nsọ, si,

16 Mb͕e ihe ndia gasiri M’gālaghchi,

M’gāma kwa ulo-ikwū nke Devid ọzọ, nke daworo ada;

Ọ bu kwa ebe-ya nile akwaturu akwatu ka M’gēwu ọzọ,

M’gēme kwa ka o guzozie ọzọ:

17 Ka ndi fọduru n’etiti madu we chọ Onye-nwe-ayi,

Ha na mba nile, ndi aguru aham,

18 Ka Onye-nwe-ayi kwuru, Onye nēme ka amara ihe ndia site na nmalite oge a.

19 N’ihi nka uche nke mu onwem bu, ka ayi ghara isob͕u ndi si n’etiti ndi mba ọzọ chigharikute Chineke:

20 kama ka ayi zigara ha akwukwọ-ozi, ka ha rapu ihe ruru árú nke arusi nile, na ikwa-iko, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ọbara.

21 N’ihi na Moses site n’ọb͕ọ mbu nile nwere n’obodo dum ndi nēkwusa ya, ebe anāgu ya n’ulo-nzukọ nile ubọchi-izu-ike dum.

22 Mb͕e ahu ọ di ndi-ozi na ndi-okenye nma, ha na nzukọ Kraist dum, irọputa ndikom ufọdu nime ha, na iziga ha n’Antiọk, ha na Pọl na Banabas; bú Judas anākpọ Basabas, na Sailas, ndikom bu ndi-isi n’etiti umu-nna nime Kraist:

23 ha site-kwa-ra n’aka-ha de akwukwọ, si, Ndi-ozi na umu-nna-unu, bú ndi-okenye, nēdegara umu-nna-ayi akwukwọ, bú ndi sitere na ndi mba ọzọ, ndi bi n’Antiọk na Siria na Silisia, ayi nēkele unu:

24 Ebe ayi nuru na ufọdu ndi siri n’etiti ayi pua were okwu me ka obi lọ unu miri, nēmebi nkpuru-obi-unu; bú ndi ayi nēnyeghi ihe ọ bula n’iwu;

25 ọ di ayi nma, ebe ayi biaworo nwe otù obi, irọputa ndikom na iwere ha zigara unu, ha na Banabas na Pọl, ndi ayi huru n’anya,

26 ndi raraworo ndu-ha nye n’ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

27 Ya mere ayi ezitewo Judas na Sailas, ndi ha onwe-ha gākọ-kwa-ra unu otù ihe ndia n’okwu ọnu.

28 N’ihi na ọ di Mọ Nsọ nma, di kwa ayi onwe-ayi nma, ka ayi ghara ibo unu ibu arọ́ kari ihe ndia di nkpà:

29 ka unu rapu ihe nile achuru n’aja nye arusi, na ọbara, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ikwa-iko; ọ buru na unu edebe onwe-unu ghara imetu ihe ndia aka, ọ gādiri unu nma. Jisienu ike.

30 Ya mere, mb͕e ezipusiri ha, ha ridatara n’Antiọk; mb͕e ha mesiri ka ọra madu zukọ, ha nye ha akwukwọ-ozi ahu.

31 Mb͕e ha gusiri ya, ha ṅuria n’ihi nkasi-obi di ya.

32 Judas na Sailas, ebe ha onwe-ha bu kwa ndi-amuma, ha we were ọtutu okwu kasie umu-nna ahu obi, me kwa ka obi-ha guzosie ike.

33 Mb͕e ha nọdusiri n’ebe ahu oge ufọdu, ewe si n’ebe umu-nna ahu nọ zilaga ha n’udo lakuru ndi ziputara ha-ri.

34 Ma otú ọ di, ọ di Sailas nma ka ọ nọgide n’ebe ahu.

35 Ma Pọl na Banabas nọgidere n’Antiọk, nēzí nēzisa kwa ozi ọma, bú okwu nke Onye-nwe-ayi, ha na ọtutu ndi ọzọ kwa.

36 Mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Pọl we si Banabas, Ka ayi jeghachi ub͕u a leta umu-nna-ayi n’obodo nile n’otù n’otù ebe ayi kwusara okwu Onye-nwe-ayi, ka ayi we le otú ha nēme.

37 Banabas we zube ikuru kwa Jọn, onye anākpọ Mark, ka ya na ha yikọ je.

38 Ma ọ dighi Pọl nma ka ha kuru onye ahu ka ya na ha yikọ je, bú onye si na Pamfilia rapu ha laghachi, ghara iso kwa ha je ọlu-ha.

39 Oké iwe we puta n’etiti ha, nke mere ka ha kewa otù onye n’ebe ibe-ya nọ, Banabas we kuru Mark nye onwe-ya, we ba n’ub͕ọ je Saiprọs;

40 ma Pọl rọputara Sailas, we pua, mb͕e umu-nna nime Kraist rarasiri ya nye n’amara Onye-nwe-ayi.

41 O we gabiga nime Siria na Silisia, nēme ka nzukọ Kraist guzosie ike.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 16

1 O we biaru kwa Dabe na Listra: ma le, otù onye nke nēso uzọ Jisus nọ n’ebe ahu, aha-ya bu Timọti, nwa nke otù nwanyi Ju onye kwere na Jisus; ma nna-ya bu onye-Grik.

2 Umu-nna nime Kraist ndi bi na Listra na Aikọniọm b͕ara onye ahu ezi àmà.

3 Nwoke a ka Pọl chọrọ ka o so ya pua; o we were ya bì ya úgwù n’ihi ndi-Ju ndi nọ n’ebe ahu: n’ihi na ha nile matara na nna-ya bu onye-Grik.

4 Mb͕e ha nāgabiga n’obodo nile, ha we nēnye n’aka-ha iwu ahu idebe, bú nke ndi-ozi na ndi-okenye nọ na Jerusalem nyereri.

5 Ya mere anēnye nzukọ Kraist ike n’okwukwe-ayi, ọnu-ọgugu-ha nābabiga kwa uba ókè kwa-ubọchi.

6 Ha we nāgabiga n’ala Frijia na Galetia, ebe Mọ Nsọ b͕ochiri ha ikwu okwu Chineke n’Esia;

7 mb͕e ha biara na ncherita-iru Misia, ha we nwa iga na Bitinia; ma Mọ nke Jisus ekweghi ha;

8 ha we gabiga akuku Misia, we ridata na Troas.

9 Ewe me ka Pọl hu ọhù n’abali: Otù nwoke, bú onye Masedọnia, nēguzo, nāriọ ya, si, Gabita na Masedọnia, yere ayi aka.

10 Mb͕e ọ husiri ọhù ahu, ngwa ngwa ayi we chọ uzọ ipu ka ayi ba na Masedọnia, ebe ayi sikwutara n’obi-ayi na Chineke kpọrọ ayi-ri izì ha ozi ọma.

11 Ya mere ayi siri na Troas nupu ub͕ọ, we ga otù iru rue Samọtresi, n’echi-ya ayi we rue Neapọlis;

12 ayi we site n’ebe ahu ga rue Filipai, nke bu otù obodo nke Masedọnia, obodo mbu nke akuku ahu, buru kwa colony nke Rom: ayi we nānọgide n’obodo ahu ubọchi ufọdu.

13 N’ubọchi-izu-ike ayi we pua n’ọnu-uzọ-ama obodo ga n’usọ otù osimiri, ebe ayi chère na ebe ekpere di; ayi we nọdu ala, we gwa ndinyom ndi b͕akọrọ okwu.

14 Otù nwanyi we nu okwu-ayi, aha-ya bu Lidia, onye nēre ihe eji esiji ákwà ododo, onye obodo Tayataira, onye nātu egwu Chineke: Onye-nwe-ayi we meghe obi-ya, iṅa nti n’ihe nile Pọl nēkwu.

15 Mb͕e emere ya na èzí-na-ulo-ya baptism, ọ riọ ayi, si, Ọ buru na unu atulewo na abum onye kwere n’Onye-nwe-ayi, batanu n’ulom, nọgide n’ebe ahu. O we rugide ayi.

16 O we rue, mb͕e ayi nāga ebe ekpere, na otù nwa-ab͕ọghọ onye nwere mọ nke anākpọ Paiton zutere ayi, onye nēwetara ndi-nwe-ya ọtutu urù site n’ibu amuma ugha.

17 Nwanyi a nēso ayi na Pọl, nēti nkpu, si, Madu ndia bu ndi-orù Chineke Onye kachasi ihe nile elu, ndi nēkwusara unu uzọ nzọputa.

18 Ma nka ka ọ nēme ọtutu ubọchi. Ma Pọl, ebe ike gwuru ya nọ̄, o chighariri, si mọ ahu, Anamenye gi iwu n’aha Jisus Kraist ka i si nime ya puta. O we puta n’otù oge hour ahu.

19 Ma mb͕e ndi-nwe-ya huru na olile-anya nke urù-ha alawo, ha jidere Pọl na Sailas, we dọkpuru ha ba n’ọma-ahia n’iru ndi-isi,

20 mb͕e ha kutasiri ha n’iru ndi-ikpé, ha si, Ndikom ndia, ebe ha bu ndi-Ju, ha nēme ka obi lọ ndi obodo-ayi miri nke-uku,

21 ha nēkwusa kwa ọme-n’ala nke nēzighi ezi n’iwu ka ayi nara, ma-ọbu ime, ebe ayi bu ndi Rom.

22 Ìgwè ndi ahu we guzo ọtọ n’otù imegide ha: ndi-ikpé we dọwapu uwe-ha, nye kwa iwu ka apia ha utari.

23 Mb͕e ha tisiri ha ọtutu ihe-otiti, ha tubà ha n’ulo-nkpọrọ, nēnye onye-nche ulo-nkpọrọ iwu ka ọ debe ha nke-ọma:

24 onye, ebe enyere ya-ri iwu di otú a, ọ tubàra ha nime ulo-nkpọrọ di nime, kpọsie ha ọtọsi ike n’ukwu.

25 Ma dika n’etiti abali Pọl na Sailas nēkpe ekpere nābùku kwa Chineke abù, ndi-nkpọrọ we nēge nti n’olu-ha;

26 na mberede oké ala-ọma-jijiji di, nke mere ka ntọ-ala ulo-nkpọrọ ma jijiji: ngwa ngwa ọnu-uzọ nile we meghe; ab͕u ndi-nkpọrọ nile tọpu-kwa-ra.

27 Onye-nche ulo-nkpọrọ, ebe emere ka ọ teta n’ura, ebe ọ hu-kwa-ra ọnu-uzọ ulo-nkpọrọ ka ha megheworo, o we miputa mma-agha-ya, gaje ib͕u onwe-ya, ebe ọ nēchè na ndi-nkpọrọ ab͕apuwori.

28 Ma Pọl were oké olu ti nkpu, si, Emerula onwe-gi aru: n’ihi na ayi nile nọ n’ebe a.

29 O we riọ ka eweta ọku, o we mabà nime, da n’iru Pọl na Sailas, ka aru nāma ya jijiji,

30 o we kuputa ha, si, Ndi-nwe-ayi, gini di nkpà ka m’me ka ewe zọputam?

31 Ha we si, Kwere n’Onye-nwe-ayi Jisus, agāzọputa kwa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulo-gi.

32 Ha we gwa ya okwu Onye-nwe-ayi, ya na ndi nile nọ n’ulo-ya.

33 O we kuru ha n’otù oge hour nke abali ahu, sa ọnyá ihe-otiti-ha; ngwa ngwa ewe me ya baptism, ya onwe-ya na ndi-ya nile.

34 O we kugo ha n’ulo-ya, dọba ihe-oriri n’iru ha, obi nātọ kwa ya utọ nke-uku, ya na èzí-na-ulo-ya nile, ebe o kwere Chineke.

35 Ma mb͕e chi bọrọ, ndi-ikpé zitere ndi-ọchi-utari-ha, si, Rapu ndikom ahu ka ha la.

36 Onye-nche ulo-nkpọrọ ahu we kọrọ Pọl okwu ndia, si, Ndi-ikpé ezitewo ka arapu unu la: ya mere putanu ub͕u a, la kwa n’udo.

37 Ma Pọl siri ha, Ha piara ayi ihe n’iru ọra madu, nāmaghi ayi ikpé, ọ bu ezie na ayi bu ndi Rom, ha we tubà ayi n’ulo-nkpọrọ; hà nāchupu kwa ayi ub͕u a na nzuzo? ha agaghi-eme ya ma-ọli; kama ka ha onwe-ha bia duputa ayi.

38 Ndi-ọchi-utari ahu we kọrọ ndi-ikpé okwu ndia: ha we tua egwu, mb͕e ha nuru na ha bu ndi Rom;

39 ha we bia riọ ha; mb͕e ha duputasiri ha, ha we kpere ha ka ha si n’obodo-ha pua.

40 Ha we si n’ulo-nkpọrọ-ahu puta, ba n’ulo Lidia: mb͕e ha husiri umu-nna nime Kraist, ha kasie ha obi, we pua.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 17

1 Ma mb͕e ha gabigasiri n’Amfipọlis na Apọlonia, ha biaruru Tesalọnaika, ebe ulo-nzukọ ndi-Ju di:

2 Pọl dika ọ nēme mb͕e dum, we bakuru ha, ogologo ubọchi-izu-ike atọ ọ nāgwa kwa ha okwu site n’ihe edeworo n’akwukwọ nsọ,

3 nēmeghe ha, nēche kwa n’iru ndi ahu, na Kraist-ha aghaghi ihu ahuhu, na isi na ndi nwuru anwu bilie; nēgosi kwa na Jisus nka, Onye mu onwem nēkwusara unu, ka o kwuru, bu Kraist ahu.

4 Ewe me ka ufọdu nime ha kweye, ha we dayere Pọl na Sailas; ha na oké ìgwè madu n’etiti ndi-Grik ndi nātu egwu Chineke, ọ dighi kwa ndinyom ole-na-ole nime ndinyom ndi bu ndi-isi dayere ha.

5 Ma ndi-Ju, ebe ha nēkwo ekworo, ha kuru ajọ ndikom ufọdu nime ndi nēguzo n’efu n’ọma-ahia ka ha so ha, ha we kpọkọta ìgwè madu, me ka obodo ahu tua ùzù; ha we biakwasi ulo Jeson, chọ uzọ ikuputa ha n’iru ọra madu.

6 Ma mb͕e ha nāchọtaghi ha, ha dọkpuru Jeson na umu-nna nime Kraist ufọdu ga n’iru ndi-isi obodo, nēti nkpu, si, Ndia, bú ndi kpùru elu-uwa dum madu bi iru, ha eruwo kwa n’ebe a;

7 ndi Jeson kpọbataworo: ndia nile nēmegide kwa iwu nile nke Sisa, ebe ha nāsi na Eze di iche di, bú Jisus.

8 Ha we me ka obi lọ ìgwè madu ahu na ndi-isi obodo miri, mb͕e ha nuru ihe ndia.

9 Mb͕e ha mesiri ka Jeson na ndi fọduru nọ n’aka-mbe, ha we rapu ha ka ha la.

10 Ngwa ngwa umu-nna nime Kraist we zipu Pọl na Sailas n’abali igaru Beria: mb͕e ha ruru ebe ahu, ha ba nime ulo-nzukọ nke ndi-Ju.

11 Ma ndia ka ndi bi na Tesalọnaika nma n’obi, ebe ha were obi di ọku nile nara okwu ahu nke-ọma, nēnyocha ihe nile edeworo n’akwukwọ nsọ kwa-ubọchi, ma ihe ndia di otú a.

12 Ya mere ọtutu madu nime ha kwere na Jisus; ọ dighi kwa ole-na-ole kwere n’etiti ndinyom Grik ndi anāsọpuru, na n’etiti ndikom.

13 Ma mb͕e ndi-Ju nke Tesalọnaika mara na Pọl nēkwusa kwa okwu Chineke na Beria, ha bia-kwa-ra ebe ahu, nākpali ìgwè madu nile, nēme kwa ka obi lọ ha miri.

14 Mb͕e ahu umu-nna nime Kraist we zipu Pọl ngwa ngwa iga rue oké osimiri: ma Sailas na Timọti nọgidere n’ebe ahu.

15 Ma ndi duru Pọl kuru ya rue Atens: mb͕e ha natasiri iwu inye Sailas na Timọti ka ha biakute ya ọsọsọ ka ike-ha ra, ha we la.

16 Ma mb͕e Pọl nēche ha n’Atens, oké iwe nēwe mọ-ya nime ya, mb͕e ọ huru ka obodo ahu juputara n’arusi.

17 Ya mere ọ nāgwa ndi-Ju na ndi nātu egwu Chineke okwu n’ulo-nzukọ, ọ nāgwa kwa ndi ọ nēzute n’ọma-ahia okwu kwa-ubọchi.

18 Ufọdu kwa nime ndi-Epikurean na ndi-Stoik, bú ndi nāhu amam-ihe n’anya, we zute ya. Ufọdu we si, Gini ka onye-ekwukwu a nāchọ ikwu? ndi ọzọ nāsi kwa, Ọ di ka onye nēkwusa ndi-mọ nke ala ọzọ: n’ihi na ọ nēzisa ozi ọma nke Jisus na nbilite-n’ọnwu-Ya.

19 Ha we jide ya, kuru ya je n’iru Areọpagọs, si, Àyi puru ima ihe ozizí ọhu nka bu, nke i nēkwu?

20 N’ihi na i nēweta na nti-ayi ihe ufọdu nke ala ọzọ: ya mere ayi nēzube ima isi ihe ndia.

21 (Ma ndi Atens nile na ndi ala ọzọ ndi nọ dika ọbìa n’ebe ahu enweghi oghere ime ihe ọzọ di iche, ma-ọbughi ikwu ma-ọbu inu ihe dikariri ọhu.)

22 Pọl we guzo n’etiti Areọpagọs, si,

Ndikom nke Atens, n’ihe nile ahuwom na unu nāsọpuru ndi-mọ-unu nke-uku.

23 N’ihi na mb͕e m’nāgabiga, nēkiri kwa ihe di iche iche unu nāsọpuru, m’we hu otù ebe-ichu-àjà nke edekwasiri ihe a n’elu ya, ENYERE CHI NKE ANĀMAGHI AMA. Ya mere ihe unu nāsọpuru nāmaghi ama, nka ka mu onwem nēkwusara unu.

24 Chineke Onye kère uwa na ihe nile di nime ya, ebe Ọ bu Onye-nwe elu-igwe na ala, Ya onwe-ya adighi-ebi n’ulo nsọ eji aka wu;

25 ejighi kwa aka madu jere ya ozi, dika o nwere ihe ọ bula di Ya nkpà, ebe Ya onwe-ya nēnye madu nile ndu, na ume, na ihe nile;

26 O we site n’otù onye kè mba nile n’otù n’otù nke madu, ka ha biri n’elu uwa nile, mb͕e O debesiri oge-ha akaworo àkà na ókè nile nke ebe-obibi-ha;

27 ka ha we chọ Chineke, ma eleghi anya ha gāsọ ìsì, we chọta Ya, ọ bu ezie na Ọ nọghi n’ebe di anya n’aru onye ọ bula nime ayi:

28 n’ihi na ọ bu nime Ya onwe-ya ka ayi nādi ndu, nējeghari kwa, nādi kwa; dika ufọdu ọbuná nime ndi nke unu ndi nēme abù kwuworo, si, N’ihi na ayi bu kwa ndi Ọ muru.

29 Ya mere ebe ayi bu ndi Chineke muru, o kwesighi ka ayi nēchè na Ihe akpọrọ Chineke yiri ọla-edo, ma-ọbu ọla-ọcha, ma-ọbu nkume, ihe apiri api site na ǹkà na ihe di n’obi madu.

30 Ya mere Chineke lefuru oge nile nke amaghi-ihe anya; ma ub͕u a Ọ nāgwa madu ka ha nile chègharia n’ebe nile:

31 ebe O debeworo otù ubọchi, nke Ọ gēkpe elu-uwa dum madu bi ikpé n’ezi omume nime ya site n’aka otù Nwoke Ọ kara àkà; O nye-kwa-ra madu nile ihe ha gēji kwere nka, ebe Ọ mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie.

32 Ma mb͕e ha nuru okwu bayere nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu, ufọdu were ya me ihe-ọchì; ma ndi ọzọ siri, Ayi gānu kwa olu-gi bayere nka ọzọ.

33 Otú a ka Pọl siri n’etiti ha pua.

34 Ma ndikom ufọdu rapara n’aru-ya, we kwere na Jisus: n’etiti ha Daiọnisiọs onye Areọpagọs di kwa, na otù nwanyi, aha-ya bu Damaris, ha na ndi ọzọ.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 18

1 Mb͕e ihe ndia gasiri o si n’Atens pua, bia rue Kọrint.

2 O we hu otù onye-Ju, aha-ya bu Akwila, onye Pọntọs n’ọmumu-ya, onye siworori n’Itali bia ọhu, ya na nwunye-ya Prisila, n’ihi na Klọdiọs nyereri iwu ka ndi-Ju nile si na Rom pua: o we biakute ha;

3 n’ihi na ya na ha nālu otù ọlu-ǹkà ahu, ya na ha we nọgide, nālu kwa ọlu; n’ihi na ọlu-ǹkà-ha bu ikpa ákwà ulo-ikwū.

4 O nēkwu kwa okwu n’ulo-nzukọ ubọchi-izu-ike nile n’otù n’otù, we nēme ka ndi-Ju na ndi-Grik kweye.

5 Ma mb͕e Sailas na Timọti si na Masedọnia ridata, okwu Chineke nēb͕u Pọl nb͕u n’obi, ọ nāgwasi ndi-Ju ike na Jisus bu Kraist-ha.

6 Ma mb͕e ha nēdo onwe-ha n’usoro imegide ya, nēkwulu kwa ya, o fecha uwe-ya, si ha, Ọbara-unu di n’isi-unu; mu onwem di ọcha: site n’ub͕u a m’gāgakuru ndi mba ọzọ.

7 O we si n’ebe ahu pua, ba n’ulo otù onye, aha-ya bu Taitọs Justọs, onye nāsọpuru Chineke, onye ulo-ya di ulo-nzukọ, ahu ezi nso.

8 Krispọs, onye-isi ulo-nzukọ, we kwere n’Onye-nwe-ayi, ya na èzí-na-ulo-ya dum; ọtutu madu n’etiti ndi Kọrint we kwere mb͕e ha nuru, ewe me ha baptism.

9 Onye-nwe-ayi we site n’ọhù gwa Pọl okwu n’abali, si, Atula egwu, kama nēkwu, ekpuchi-kwa-la ọnu-gi:

10 n’ihi na Mu onwem nọyere gi, ọ dighi kwa onye ọ bula gādakwasi gi ime gi ihe ọjọ: n’ihi na enwerem ọtutu madu n’obodo a.

11 O we nọdu n’ebe ahu otù arọ na ọnwa isi, nēzí okwu Chineke n’etiti ha.

12 Ma mb͕e Galio bu onye-isi nke Akaia, ndi-Ju were otù obi guzo imegide Pọl, we kuta ya n’iru oche-ikpé,

13 si, Onye a nārafu madu ka ha sọpuru Chineke n’uzọ megidere iwu-ayi.

14 Ma mb͕e Pọl gaje isaghe ọnu-ya, Galio siri ndi-Ju, Asi na ọ bu okwu nmejọ ma-ọbu ajọ ihe jọb͕uru onwe-ya, unu ndi-Ju, ọ gēkwesi ka m’nagide unu:

15 ma ọ buru na ha bu ajuju bayere okwu-ọnu di iche iche na aha di iche iche na iwu nke aka unu, unu onwe-unu le ha anya; mu onwem ezubeghi ibu onye-ikpé okwu ndia.

16 O we chupu ha n’iru oche-ikpé-ya.

17 Ha nile we jide Sostenis, bú onye-isi ulo-nzukọ, tie ya ihe n’iru oche-ikpé ahu. Ọ dighi kwa ihe ọ bula n’ihe ndia meturu Galio n’obi.

18 Mb͕e Pọl nọgidesiri ọtutu ubọchi ọzọ, ọ kele umu-nna nime Kraist ekele ikpe-azu, we si n’ebe ahu ba n’ub͕ọ ije Siria, Prisila na Akwila soro kwa ya; mb͕e ọ kpachasiri agiri-isi-ya na Kenkrei: n’ihi na ọ kwereri Chineke nkwa.

19 Ha we rue Efesọs, o we rapu ha n’ebe ahu: ma ya onwe-ya batara n’ulo-nzukọ-ha, we gwa ndi-Ju okwu.

20 Ma mb͕e ha kpere ya ka ọ nọgide oge dikariri anya, o kweghi;

21 ma mb͕e o kelesiri ha ekele ikpe-azu, si kwa, M’gālaghachikute unu ọzọ, ma Chineke kwe, o si n’Efesọs nupu ub͕ọ.

22 Mb͕e ọ puru n’ub͕ọ na Sisaria, ọ rigo kele nzukọ Kraist, we ridata n’Antiọk.

23 Mb͕e ọ nọsiri n’ebe ahu oge ufọdu, ọ pua, we nāgabiga nime ala Galetia na Frijia n’usoro, nēme ka ndi nile ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike.

24 Ma otù onye-Ju, aha-ya bu Apọlos, onye Aleksandria n’ọmumu, nke bu onye-ọ̀kà-okwu, biaruru Efesọs; ọ di kwa ike n’ihe nile edeworo n’akwukwọ nsọ.

25 Ejiri okwu-ọnu zí nwoke a uzọ Onye-nwe-ayi; ebe ọ di ọku na mọ-ya, o we nēkwu nēzí kwa nke-ọma ihe nile bayere Jisus, ọ bu ezie na ọ mara nání baptism nke Jọn:

26 onye ahu we malite ikwuwa okwu n’ulo-nzukọ. Ma mb͕e Prisila na Akwila nuru okwu-ya, ha kutara ya n’ebe ha nọ, we kọrọ ya uzọ Chineke nke-ọma kari.

27 Mb͕e o zubere igabiga n’ofè ka ọ ba n’Akaia, umu-nna nime Kraist we me ka obi di ya ike, we degara ndi nēso uzọ Jisus akwukwọ inara ya nke-ọma: mb͕e o ruru, o yere ha aka nke-uku, bú ndi. kwereri site n’amara:

28 n’ihi na o ji ike kwukpa ndi-Ju ọnu nke-uku, n’iru ọra madu, ebe ọ nēgosi na Jisus bu Kraist-ha site n’ihe edeworo n’akwukwọ nsọ.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 19

1 O we rue mb͕e Apọlos nọ na Kọrint, na Pọl, mb͕e ọ gabigasiri nime elu ala, ọ biaruru Efesọs, hu madu ufọdu ndi nēso uzọ Jisus:

2 o we si ha, Ùnu natara Mọ Nsọ mb͕e unu kwere? Ha si ya, É-è, kama ayi anughi ọbuná ma enyere Mọ Nsọ.

3 O we si, Ọ̀ bu ibà nime gini kwa ka emere unu baptism? Ha we si, Ibà nime baptism nke Jọn.

4 Pọl we si, Jọn ji baptism nke nchèghari eme baptism, nāsi ndi-Ju ka ha kwere n’Onye ahu Nke gaje ibia n’azu ya, nke ahu bu, na Jisus.

5 Mb͕e ha nuru nka, ewe me ha baptism ibà n’aha Onye-nwe-ayi Jisus.

6 Mb͕e Pọl bikwasisiri ha aka-ya abua n’isi, Mọ Nsọ we biakwasi ha; ha we kwue okwu n’asusu di iche iche ọzọ, bu kwa amuma.

7 Ha nile ra ka ndikom iri na abua.

8 O we ba n’ulo-nzukọ-ha, we nēkwuwa okwu ogologo ọnwa atọ, nāgwa ha okwu n’ihe nile bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka ha kweye ha.

9 Ma mb͕e obi madu ufọdu mere etili, mb͕e ha ghara kwa ikweye, nēkwu ihe ọjọ bayere Uzọ Jisus n’iru ọra madu, o we si n’ebe ha nọ pua, kewapu ndi nēso ụzọ Jisus, nēkwu okwu kwa-ubọchi n’ulo-akwukwọ Tiranọs.

10 Ewe nēme nka ogologo arọ abua; ya mere ndi nile ndi bi n’Esia nuru okwu Onye-nwe-ayi, ma ndi-Ju ma ndi-Grik.

11 Chineke nālu kwa ọlu di ike site n’aka Pọl dika anāhughi mb͕e ọ bula:

12 ya mere anēsi n’aru-ya wetara ndi aru-ha nādighi ike ichafọ ma-ọbu ákwà apron, ọria-ha we la n’aru-ha, ajọ mọ nile aputa kwa.

13 Ma ufọdu nime ndi-Ju ndi nējeghari, bú ndi si na ha nāchupu ndi ajọ mọ, tiye-kwa-ra-aka-ha ikpọkwasi aha Onye-nwe-ayi Jisus n’isi ndi nwere ajọ mọ ahu, nāsi, Ewerem Jisus Onye Pọl nēkwusa b͕a unu iyi.

14 Umu-ndikom asa nke otù onye-Ju, anākpọ Skiva, bú onye-isi-nchu-àjà, di, ndi mere nka.

15 Ajọ mọ ahu we za, si ha, Jisus ka m’matara, ama-kwa-ram Pọl; ma ùnu onwe-unu bu ole ndi?

16 Nwoke ahu onye ajọ mọ di nime ya we wukwasi ha, karia ha abua, o nwe-kwa-ra ike n’aru-ha, ya mere ha si n’ulo ahu b͕apu, b͕ara ọtọ, emeru kwa ha aru.

17 Ewe me ka ndi nile ndi bi n’Efesọs, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, mara nka; ha nile we tua egwu, eme-kwa-ra aha Onye-nwe-ayi Jisus ka ọ di uku.

18 Ọtutu madu n’etiti ndi kwereri na Jisus bia-kwa-ra, nēkwuputa, nākọ kwa ihe nile ha nēme.

19 Ọ dighi kwa madu ole-na-ole n’etiti ndi nēme mb͕asi kpokọtara akwukwọ-ha, rechapu ha ọku n’iru ọra madu: ha we gua ọnu-ahia-ha, we hu na ọ bu ọgu nnù ego ọla-ọcha isi na nnù ise.

20 Otú a ka okwu Onye-nwe-ayi were ike nāga n’iru n’iru nādi kwa irè.

21 Ma mb͕e ihe ndia mezuru, Pọl zubere na mọ-ya iga Jerusalem, mb͕e ọ gāgabigasi nime Masedọnia na Akaia, si, Mb͕e m’rusiri ebe ahu, aghaghm ihu kwa Rom.

22 Mb͕e o zigasiri na Masedọnia madu abua nime ndi nējere ya ozi, bú Timọti na Erastọs, ya onwe-ya we nọdu n’Esia nwa oge.

23 Ma ihe di ka oge ahu ọ bughi nkpasu ntà putara bayere Uzọ Jisus.

24 N’ihi na otù nwoke, aha-ya bu Dimitriọs, bú uzú ọla-ọcha, onye nākpu ulo nsọ ntà nke ọla-ọcha nke Daiana, ọ bughi ọlu ntà ka onye ahu nēwetara ndi-ọ̀kà;

25 ndi ọ kpọkọrọ, ha na ndi nālu ọlu di otú ahu, we si, Ndikom, unu mara na ayi nwere àkù-ayi site n’ọlu a.

26 Ma unu nāhu nānu kwa, na ọ bughi nání n’Efesọs kama ọ fọduru ihe ntà ka ọ buru n’Esia nile, ka Pọl nka rafuru oké ìgwè madu wepu kwa ha n’ezi uzọ, ebe ọ nāsi na ihe eji aka me abughi chi:

27 ọ bughi kwa nání na ihe-ize-ndu di na agēlelì ọlu-ayi nka; kama na agāgu kwa ulo nke oké chi-nwanyi ahu, bú Daiana, n’ihe-efu, na agaje kwa isi n’idi-uku-ya weda ya n’ala, onye Esia dum na elu-uwa dum madu bi nāsọpuru.

28 Mb͕e ha nuru nka, ha we juputa n’ọnuma, ti kwa nkpu, si, Daiana nke ndi Efesọs di uku.

29 Obodo ahu we juputa n’aghara ahu: ha we were otù obi nubà nime ebe anēkiri ihe, mb͕e ha jidesiri Gaiọs na Aristakọs, ndi Masedọnia, ndi nēso Pọl n’ije.

30 Ma mb͕e Pọl zubere ibakuru ọra madu ahu, ndi nēso uzọ Jisus ekweghi ya.

31 Ufọdu kwa n’etiti ndi-isi Esia, ebe ha bu ndi-eyì-ya, ha zigara ya ozi, we riọ ya ka ọ ghara inuye onwe-ya nime ebe ahu anēkiri ihe.

32 Ya mere ufọdu nēti nkpu otù ihe, ufọdu nēti kwa ihe ọzọ: n’ihi na nzukọ ahu nāb͕a aghara; ndi kariri n’ọnu-ọgugu n’etiti ha amataghi kwa ihe ha jiri zukọ.

33 Ha we si n’etiti ìgwè madu ahu nupu Aleksanda, ebe ndi-Ju nēnu ya ka o buru uzọ. Aleksanda we kpukpue ha aka, nāchọ ka ọ gọpuru ọra madu onwe-ya.

34 Ma mb͕e ha mazuru na ọ bu onye-Ju, ha nile were otù olu nēti nkpu ihe ra ka oge hour abua, si, Daiana nke ndi Efesọs di uku.

35 Ma mb͕e ode-akwukwọ-ha mesiri ka ìgwè madu ahu jurú, ọ si, Ndikom Efesọs, Ònye di n’etiti madu nke nāmaghi na obodo ndi Efesọs bu odozi-ulo-nsọ, oké Daiana ahu, na nke arusi nke si n’elu-igwe da?

36 Ya mere ebe anāpughi irughari ihe ndia uka, unu aghaghi ijurú, na ighara ime ihe nēchèghi echè.

37 N’ihi na unu kutara ndikom ndia n’ebe a, ndi nābughi ndi nēzu ihe ulo chi n’ori ma-ọbu ndi nēkwulu chi-nwanyi nke ayi.

38 Ya mere ọ buru na Dimitriọs, na ndi-ọ̀kà ndi soro ya, nwere okwu megide onye ọ bula, anēdebe ubọchi ikpé, ndi-isi nọ kwa: ka ha borita onwe-ha ebubo.

39 Ma ọ buru na unu nāchọ ihe ọ bula bayere okwu di iche, agēdozi ya na nzukọ ahu nke ziri ezi n’iwu.

40 N’ihi na ayi nọ n’ihe-ize-ndu na agēji ihe mere ta bo ayi ebubo na ayi biliri megide ndi-isi, ebe ọ nādighi ihe wetara ya: n’ihi ya ayi agaghi-apu kwa iza ajuju bayere nb͕akọ a.

41 Mb͕e o kwusiri okwu ndia, o we zilaga nzukọ ahu.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 20

1 Ma mb͕e ùzù ahu tubìri, mb͕e Pọl kpọtasiri ndi nēso uzọ Jisus, kasi kwa ha obi, o kele ha ekele ikpe-azu we pua iga ba na Masedọnia.

2 Mb͕e ọ gabigasiri n’akuku ahu nile, were kwa ọtutu okwu kasie ha obi, ọ bia na Gris.

3 Mb͕e ọ nọsiri ọnwa atọ n’ebe ahu, mb͕e ndi-Ju b͕a-kwa-ra ajọ ìzù megide ya, mb͕e ọ gaje inupu ub͕ọ ije Siria, o zubere isi uzọ Masedọnia laghachi.

4 Sopata, nwa Pirọs, onye Beria, we so ya; ya na Aristakọs na Sekundọs, nime ndi Tesalọnaika; na Gaiọs nke Dabe, na Timọti, na Tikikọs na Trọfimọs, bú ndi Esia.

5 Ma ndia bururi uzọ je, we nēche ayi na Troas.

6 Ayi onwe-ayi we si na Filipai ba n’ub͕ọ je, mb͕e ubọchi achicha ekoghi-eko gasiri, ayi we biakute ha na Troas ka o ruru ubọchi ise; ebe ayi nọgidere ubọchi asa.

7 N’ubọchi mbu n’ízù ubọchi asa, mb͕e ayi zukọrọ inyawa achicha, Pọl we gwa ha okwu, ebe ọ gaje ila echi-ya; o we kwugide okwu rue etiti abali.

8 Ọtutu ọku-ọwa di kwa n’ime-ulo nke di n’elu ulo, ebe ayi zukọrọ.

9 Ma otù okorọbia, aha-ya bu Yutikọs, nānọdu na window, onye oké ura nākwada; mb͕e Pọl nēkwu okwu rue oge dikari anya, ebe ura-ya kwadara ya o we si n’ulo elu nke-atọ di n’ulo ahu da n’ala, o mewo ozu mb͕e ha buliri ya.

10 Ma Pọl ridara, dakwasi ya, makua ya, si, Unu atula ùzù; n’ihi na ndu-ya di nime ya.

11 Mb͕e ọ rigosiri, nyawa achicha, ri kwa, mb͕e ya na ha kparitasi-kwa-ra ogologo oge, ọbuná rue chi-ọbubọ, o we pua otú a.

12 Ha we kuta nwa-okoro ahu na ndu, ọ bughi kwa nkasi-obi ntà akasiri ha.

13 Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi buru uzọ je ub͕ọ, ayi nupuru ub͕ọ ahu ije Asọs, n’ihi na ayi zubere iwere Pọl n’ub͕ọ n’ebe ahu: n’ihi na otú a ka ọ karari, ebe o zubere na ya onwe-ya gāga n’ukwu-ala.

14 Mb͕e o zutere ayi n’Asọs, ayi were ya n’ub͕ọ, we bia rue Mitilini.

15 Ayi we si n’ebe ahu ga, we rue na ncherita-iru Kaiọs n’ubọchi soni; ubọchi so ya ayi we rue ala na Samọs, we chere oge ufọdu na Trogilium; ubọchi soni ayi we bia rue Militọs.

16 N’ihi na Pọl zubereri igabiga Efesọs n’ub͕ọ, ka aghara ime ya ka ọ nọgide ogologo oge n’Esia; n’ihi na ọ nēme ngwa iru Jerusalem mb͕e ubọchi Pentikọst akērughi, ma ọ buru na ọ puru ime ya.

17 O we si na Militọs ziga n’Efesọs, kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya.

18 Mb͕e ha biakutere ya, ọ si ha,

Unu onwe-unu mara, site n’ubọchi mbu m’zọrọ ukwu n’Esia, otú m’nọ n’etiti unu oge ahu nile,

19 otú m’buru orù Onye-nwe-ayi n’obi di ume-ala nile, na anya-miri, na ọnwunwa di iche iche nke dakwasirim n’ajọ ìzù nile nke ndi-Ju:

20 otú egwu nēmeghm ka m’ghara ikọrọ unu otù ihe n’ihe nile bara unu urù, na izí unu ihe n’iru ọra madu, n’ulo nke aka unu kwa n’otù n’otù,

21 nāgwasi unu ike, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, okwu nchèghari n’ebe Chineke nọ, na okwukwe n’ebe Onye-nwe-ayi Jisus nọ.

22 Ma ub͕u a, le, mu onwem nāga Jerusalem n’ab͕u nime mọ nkem, nāmataghi ihe ọ bula gābiakwasim n’ebe ahu:

23 ọ bu nání na Mọ Nsọ nāgwasim ike n’obodo nile n’otù n’otù, nāsi na ab͕u na nkpab͕u nādigide nēchem.

24 Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n’ebe mu onwem nọ, ka m’we b͕azue ọsọm, jezu kwa ozi nke m’natara n’aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke.

25 Ma ub͕u a, le, mu onwem matara na unu onwe-unu nile, ndi m’jeghariri n’etiti unu nēkwusa ala-eze Chineke, na unu agaghi-ahu irum ọzọ.

26 N’ihi ya agwasim unu ike ubọchi ta, na adim ọcha n’ebe ọbara madu nile di.

27 N’ihi na egwu emeghm ka m’ghara ikọrọ unu ìzù nile nke Chineke.

28 Nēzenu onwe-unu na ìgwè aturu ntà nile, nke Mọ Nsọ mere unu ndi nēlekota ya anya n’etiti ya, ka unu nāzù nzukọ Chineke dika aturu, nke O ji ọbara nke Ya onwe-ya zutara Onwe-ya.

29 Mu onwem matara na mb͕e m’lasiri agu jọb͕uru onwe-ha gābà n’etiti unu, ghara imere ìgwè aturu ebere;

30 ndikom gēsite kwa n’etiti unu onwe-unu bilie, nēkwu ihe di iche iche nēduhie madu uzọ, ka ha dọpu ndi nēso uzọ Jisus iso ha n’azu.

31 N’ihi ya nēchenu nche, ebe unu chetara na ogologo arọ atọ arapughm iwere anya-miri nādu madu nile n’otù n’otù ọdú abali na ehihie.

32 Ub͕u a ararakwam unu nye n’aka Chineke na aka okwu amara-Ya, nke puru iwuli unu elu dika ulo, na inye unu ihe-nketa ahu n’etiti ndi nile edoworo nsọ.

33 Agu ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo ma-ọbu uwe nke onye ọ bula agughm.

34 Unu onwe-unu mara na akam ndia nālutara mu onwem na ndi mu na ha nọ ihe nākpà mu na ha.

35 N’ihe nile egosirim unu, na unu aghaghi idọb͕u onwe-unu n’ọlu otú a, na iyere ndi nādighi ike aka, na icheta okwu Onye-nwe-ayi Jisus, na Ya onwe-ya siri, Ọ di ngọzi inye ihe kari inara ihe.

36 Mb͕e o kwusiri ihe ndia, o b͕ue ikperè n’ala, ya na ha nile kpere Chineke.

37 Ha nile we kwa ákwá nke-uku, dakwasi Pọl n’olu, sutu kwa ya ọnu,

38 ihe nēb͕u ha nb͕u kari ihe nile bu okwu nke o kwururi, na ha agaghi-ahu iru-ya ọzọ. Ha we dupu ya n’ije-ya rue mb͕e ọ batara n’ub͕ọ.

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 21

1 Ma mb͕e o ruru na ayi dọpusiri onwe-ayi n’ebe ha nọ, nupu kwa ub͕ọ, ayi gara otù iru je Kos, ubọchi so ya ayi we rue Rodes, we si n’ebe ahu je rue Patara:

2 ebe ayi huru ub͕o nke nāgabiga ofè Finisia, ayi we ba nime ya, we nupu.

3 Mb͕e ayi hugasiri Saiprọs anya, rapu kwa ya n’aka-ekpe, ayi we ga Siria, we pua n’ub͕ọ na Taia: n’ihi na ebe ahu ka ub͕ọ gaje ikwapu ihe di ya.

4 Mb͕e ayi chọtasiri ndi nēso uzọ Jisus, ayi we nọgide n’ebe ahu ubọchi asa: ndi ahu we gwa Pọl site na Mọ Nsọ, ka ọ ghara izọbà ukwu na Jerusalem.

5 Ma mb͕e o ruru na ayi nọzuru ubọchi ahu, ayi pua ga ije; ha nile, ha na nwunye-ha, na umu-ha, we dupu ayi n’ije-ayi, rue azu obodo-ha: ayi we b͕ue ikperè n’ala n’ótú, kpere Chineke,

6 we kelerita ibe-ayi ekele ikpe-azu; ayi we ba n’ub͕ọ, ma ndi ahu laghachiri n’ulo-ha.

7 Mb͕e ayi onwe-ayi jedebesiri ije-ayi n’ub͕ọ site na Taia, ayi we rue Tọlemais; ayi we kele umu-nna nime Kraist, ayi na ha we nọgide otù ubọchi.

8 Echi-ya ayi we pua, je rue Sisaria: ayi we ba n’ulo Filip onye nēzisa ozi ọma, nke bu otù nime ndikom asa ahu, ayi na ya we nọgide.

9 Ma onye a nwere umu-nwanyi anọ, ndi nāmaghi nwoke, ndi nēbu amuma.

10 Mb͕e ayi nānọgide n’ebe ahu ọtutu ubọchi, otù onye-amuma, aha-ya bu Agabọs, we si na Judia ridata.

11 O we biakute ayi, chiri ihe-ọkiké Pọl, ke onwe-ya ukwú na aka, si, Okwu ndia ka Mọ Nsọ kwuru, si, Otú a ka ndi-Ju ndi nọ na Jerusalem gēke nwoke nwe ihe-ọkiké a, ha gārara kwa ya nye n’aka ndi mba ọzọ.

12 Mb͕e ayi nuru ihe ndia, ayi we riọ ya, ma ayi onwe-ayi ma ndi ebe ahu, ka ọ ghara irigoro Jerusalem.

13 Mb͕e ahu Pọl zara, si, Gini ka unu nēme, ebe unu nākwa ákwá nētiwa kwa obim? n’ihi na edoziwo mu onwem ọ bughi nání ka ewe kem ab͕u, kama inwu kwa ọnwu na Jerusalem n’ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus.

14 Mb͕e ọ juru ikweye, ayi we kpuchie ọnu, si, Ka eme ihe Onye-nwe-ayi nāchọ.

15 Mb͕e ubọchi ndia gasiri, ayi we kwakọ ihe-ayi, rigoro Jerusalem.

16 Ufọdu nime ndi nēso uzọ Jisus si na Sisaria so kwa ayi je, nēkuru otù Neson onye Saiprọs, onye sitere na mbu nēso uzọ Jisus, onye ayi gānọ n’ulo-ya dika ndi-ọbìa.

17 Mb͕e ayi ruru Jerusalem, umu-nna-ayi nime Kraist we were ọṅù nara ayi nke-ọma.

18 N’ubọchi soni Pọl soro ayi bakuru Jemes; ndi-okenye nile nọ kwa n’ebe ahu.

19 Mb͕e ọ kelerisi ha, o we kọ akukọ ihe nile n’otù n’otù nke Chineke lururi n’etiti ndi mba ọzọ site n’ije-ozi-ya.

20 Mb͕e ha nuru ya, ha we nye Chineke otuto, ha we si ya, Nwa-nna-ayi, i huwo ka ha ra, bú ọtutu madu riri nne n’etiti ndi-Ju ndi kweworo na Jisus; obi ha nile nānu kwa ọku nye iwu-ayi:

21 eji-kwa-ra okwu-ọnu zí ha ihe bayere gi, na i nēzí ndi-Ju nile ndi nọ n’etiti ndi mba ọzọ irapu Moses, ebe i nāgwa ha ka ha ghara ibì umu-ha úgwù, ka ha ghara kwa ijeso ọme-n’ala nile nke iwu-ayi.

22 Ọ̀ bu gini kwa? ha aghaghi inu na i biawo.

23 Ya mere, me nka nke ayi nāsi gi: Ayi nwere ndikom anọ ndi nkwa ha kwere Chineke di n’isi-ha;

24 kuru ndia tiyere onwe-gi, me ka gi na ha di ọcha, kwu-kwa-ra ha ugwọ ihe ha ji chu àjà, ka ha we kọpu isi: madu nile gāmara kwa na ezi-okwu adighi n’ihe ejiwo okwu-ọnu zí ha bayere gi; kama na gi onwe-gi nāgazi kwa, nēdebe iwu-ayi.

25 Ma ayi onwe-ayi zìri akwukwọ-ozi bayere ndi mba ọzọ ndi kweworo, nēnye iwu ka ha debe onwe-ha ghara imetu ihe achuru n’àjà nye arusi aka, ha na ọbara, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ikwa-iko.

26 Mb͕e ahu Pọl kuru ndikom ahu tiyere onwe-ya, n’ubọchi so ya o we me ka ya na ha di ọcha, we ba n’ulo uku Chineke, nēgosi nmezu ubọchi nile nke anēme ka ha di ọcha, rue mb͕e echere n’iru Chineke onyinye ahu n’ihi madu nile n’otù n’otù nime ha.

27 Ma mb͕e ubọchi asa ahu gaje izu, ndi-Ju ndi si n’Esia bia, mb͕e ha huru ya n’ulo uku Chineke, ha me ka ìgwè madu ahu nile b͕a aghara, ha we dakwasi ya aka,

28 nēti nkpu, si, Ndikom Israel, yere ayi aka: Nka bu nwoke ahu, onye nēzí madu nile n’ebe nile ihe megide ndi-Ju, na iwu-ayi, na ebe nka: tukwasi ya o dubata-kwa-ra ndi-Grik n’ulo uku Chineke, o meruwo kwa ebe nsọ a.

29 N’ihi na ha buri uzọ hu ya na Trọfimọs onye Efesọs n’obodo, onye ha nēchè na Pọl dubatarari n’ulo uku Chineke.

30 Obodo ahu dum we me uṅara, ndi-Ju we b͕akọta: ha we jide Pọl, dọkpupu ya n’ulo uku Chineke: ngwa ngwa ewe mechie ọnu-uzọ nile.

31 Mb͕e ha nāchọ uzọ ib͕u ya, akukọ we rigo rue nti onye-isi-ọchi-agha nke òtù ndi-agha, na Jerusalem dum nāb͕a aghara.

32 Ngwa ngwa o we chiri ndi-agha na ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, we b͕adakwasi ha: mb͕e ha huru onye-isi-ọchi-agha na ndi-agha, ha we rapu iti Pọl ihe.

33 Mb͕e ahu onye-isi-ọchi-agha biaruru nso, jide ya, si ka ewere nkpọrọ abua ke ya; ọ ju-kwa-ra onye ọ bu, na ihe o mereri.

34 Ufọdu nime ìgwè madu ahu we ti nkpu otù ihe, ndi ọzọ ti kwa ihe ọzọ: ma mb͕e ọ nāpughi imata okwu di itukwasi obi n’ihi ùzù ahu, ọ si ka ekuru ya ba n’ulo ndi-agha.

35 Mb͕e o ruru n’elu ihe eji arigo, o rue na ndi-agha buru ya n’ihi ihe-ike nke ìgwè madu ahu;

36 n’ihi na ọra ndi-Ju nēso n’azu, nēti nkpu, si, Wepu ya.

37 Mb͕e agaje ikubà Pọl nime ulo ndi- agha, ọ si onye-isi-ọchi-agha, Ì gēkwe ka m’gwa gi okwu? O we si, Ì mara asusu Grik?

38 Gì onwe-gi abughi kwa onye Ijipt ahu, onye mb͕e ubọchi ndia akērughi kpaliri nnù ndikom iri ahu n’etiti Ndi-ob͕u-madu, dupu kwa ha ba nime ọhia?

39 Ma Pọl siri, Mu onwem bu onye-Ju, nke Tasọs nime Silisia, onye amuru n’obodo amara aha-ya: ariọkwam i, kwe ka m’gwa ndi-Ju okwu.

40 Mb͕e o kwere ya, Pọl ka o guzoro n’elu ihe eji arigo, o we kpukpue ndi-Ju aka; mb͕e emere ka ha nile kpuchie nọ̄ ọnu nke-uku, o we gwa ha okwu n’asusu Hibru, si,

Categories
ỌLU NDI-OZI

ỌLU NDI-OZI 22

1 Umu-nnem na ndi bu nnam, nurunu ngọpum n’ebe unu nọ ub͕u a.

2 Mb͕e ha nuru na ọ nāgwa ha okwu n’asusu Hibru, ha we kpuchie ọnu-kari: o we si,

3 Mu onwem bu onye-Ju, nke amuru na Tasọs nke Silisia, ma azùputaram n’obodo a, n’ukwu Gameliel, ezíwo mu ihe, dika esi edebezu iwu nke nna-ayi-hà, obim nānu ọku nye Chineke, dika unu onwe-unu nile di ta:

4 esob͕u-kwa-ram Uzọ a rue ọnwu, nēke ma ndikom ma ndinyom ab͕u nārara kwa ha nye n’ulo-nkpọrọ di iche iche.

5 Dika onye-isi-nchu-àjà nāb͕a-kwa-ram àmà, ya na nb͕akọ ndi-okenye nile: ndi m’nata-kwa-ra akwukwọ-ozi n’aka-ha inye umu-nne-ayi, m’we ga Damaskọs, idọkputa kwa ndi nọ n’ebe ahu n’ab͕u bia na Jerusalem, ka ewe me ka ha hu ahuhu-nmehie.

6 O we rue, mb͕e m’nāga, nābiaru kwa Damaskọs nso, n’oge di ka etiti-ehihie, na mberede oké ìhè si n’elu-igwe b͕urum àmùmà buruburu.

7 M’we da n’ala, nu otù olu ka ọ nāsim, Sọl, Sọl, gini mere i nēsob͕um?

8 Mu onwem we za, si, Ì bu onye, Onye-nwe-ayi? O we sim, Mu onwem bu Jisus Onye Nazaret, Onye gi onwe-gi nēsob͕u.

9 Ma ndi mu na ha nọ kiliri ìhè ahu n’ezie, ma ha anughi olu Onye ahu nāgwam okwu.

10 M’we si, Gini ka m’gēme, Onye-nwe-ayi? Onye-nwe-ayi we sim, Bilie, ga ba na Damaskọs; n’ebe ahu ka agāgwa kwa gi okwu bayere ihe nile nke akaworo gi ka i me.

11 Mb͕e m’nāhughi uzọ site ebube ìhè ahu, ndi mu na ha nọ we jidem n’aka durum, m’we ba na Damaskọs.

12 Otù onye, bú Ananaias, nwoke nke nātu egwu Chineke dika iwu-ayi si di, onye ndi-Ju nile bi n’ebe ahu b͕ara ezi àmà,

13 o we biakutem, guzo n’akukum, sim, Sọl, nwa-nnam, ka eme ka i hu uzọ. N’otù oge hour ahu ewe me ka mu onwem hu uzọ, m’we le ya anya.

14 O we si, Chineke nke nna-ayi-hà rọputara gi imara ihe Ọ nāchọ, na ihu Onye Ezi Omume ahu, na inu olu si n’ọnu-Ya puta.

15 N’ihi na i gāburu Ya onye-àmà n’ebe madu nile nọ nke ihe nile i huworo nu kwa.

16 Ub͕u a kwa gini mere i nāla azu? bilie, ka eme gi baptism, sachapu kwa nmehie-gi nile, nākpọku aha-Ya.

17 O we rue, mb͕e m’laghachisiri na Jerusalem, mb͕e m’nēkpe kwa ekpere n’ulo uku Chineke, na ihe di ka inyoghi biaram n’anya,

18 m’we hu Ya ka Ọ nāsim, Me ngwa, si na Jerusalem pua ọsọsọ: n’ihi na ha agaghi-anara àmà bayerem n’aka-gi.

19 Mu onwem we si, Onye-nwe-ayi, ha onwe-ha mara na mu onwem nātubà ndi kwere na Gi n’ulo-nkpọrọ, nēti kwa ha ihe n’ulo-nzukọ nile n’otù n’otù:

20 mb͕e anāwusi ọbara Stifen onye-àmà-Gi, mu onwem guzo-kwa-ra nso, o we dim ezi nma, anamedebe kwa uwe nke ndi nēb͕u ya.

21 O we sim, Ga ije-gi: n’ihi na Mu onwem gēsi n’ebe a zipu gi jekuru ndi mba ọzọ n’ebe di anya.

22 Ha nānu kwa olu-ya rue okwu a; ha we welie olu-ha elu, si, Wepu onye di otú a n’uwa: n’ihi na o kwesighi ka ọ di ndu.

23 Mb͕e ha nēti nkpu, nēyipu kwa uwe-ha, nēkpoli kwa àjà elu,

24 onye-isi-ọchi-agha we si ka ekuru ya bata n’ulo ndi-agha, ọ gwa ha ka ewere ipia-ihe chọputa isi okwu n’ọnu-ya, ka o we mazu ihe mere ha ji ti nkpu megide ya otú a.

25 Ma mb͕e ha chiri udọ̀-akpukpọ kesia ya, Pọl siri ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nke guzoro n’ebe ahu, Ò ziri ezi n’iwu ka unu pia madu bu onye Rom ihe, nke bu kwa onye anāmaghi ikpé?

26 Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nuru ya, ọ jekuru onye-isi-ọchi-agha, kọrọ ya, si, Gini ka i gaje ime? n’ihi na nwoke a bu onye Rom.

27 Onye-isi-ọchi-agha ahu we biakute ya, si ya, Gwam, gì onwe-gi bu onye Rom? Ọ si, E.

28 Onye-isi-ọchi-agha we za, si, Oké ego ka mu onwem ji zuta ọnọdu onye amuru n’obodo Rom. Pọl we si, Ma amuru mu onwem onye Rom.

29 Ya mere ndi gaje ichọputa isi okwu n’ọnu-ya si n’ebe ọ nọ pua ngwa ngwa: onye-isi-ọchi-agha we tu kwa egwu, mb͕e ọ matara na ọ bu onye Rom, na n’ihi na o kere ya-ri ab͕u.

30 Ma n’echi-ya, ebe o nēzube imara isi okwu, ihe mere ndi-Ju nēbo ya ebubo, ọ tọpuru ya, we gwa ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé nile ka ha b͕akọ, ọ we kudata Pọl, guzo ya n’iru ha.